Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 18

Amamihe nke Dị ‘n’Okwu Chineke’

Amamihe nke Dị ‘n’Okwu Chineke’

1, 2. “Akwụkwọ ozi” dị aṅaa ka Jehova detawooro anyị, n’ihi gịnịkwa?

Ì CHETARA mgbe ikpeazụ i nwetara akwụkwọ ozi site n’aka onye ị hụrụ n’anya nke bi n’ebe dị anya? Ọ bụ nanị ihe ole na ole na-enye anyị obi ụtọ dị ka akwụkwọ ozi nke onye anyị hụrụ n’anya ji obi ya dum detara anyị. Anyị na-enwe obi ụtọ ịma otú o mere, otú ihe si agara ya, na atụmatụ ndị ọ na-eme. Nzirịta ozi dị otú ahụ na-eme ka anyị na ndị anyị hụrụ n’anya na-akpachikwu anya, ọ bụrụgodị na ha bi n’ebe dị anya.

2 Ya bụrụ otú ahụ, olee ihe pụrụ iwetara anyị obi ụtọ nke ga-akarị inweta ozi e dere ede site n’aka Chineke anyị hụrụ n’anya? N’otu echiche, Jehova edetaworo anyị “akwụkwọ ozi”—Okwu ya, bụ́ Bible. N’ime ya, ọ na-agwa anyị onye ọ bụ, ihe o meworo, ihe ndị ọ na-ezube ime, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Jehova enyewo anyị Okwu ya n’ihi na ọ chọrọ ka anyị na ya na-enwe mmekọrịta chiri anya. Chineke anyị nke maara ihe nile họọrọ ụzọ kasị mma, nke ọ pụrụ isi kwe mee ịgwa anyị okwu. E nwere amamihe na-enweghị atụ nke dị n’ụzọ e si dee Bible nakwa n’ihe ndị dị n’ime ya.

N’ihi Gịnị Ka E Ji Jiri Okwu E Dere Ede Mee Ihe?

3. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si nye Mozis Iwu ahụ?

3 Ụfọdụ ndị pụrụ iche, sị, ‘N’ihi gịnị ka Jehova na-ejighị jiri ụzọ dị ịrịba ama karị—dị ka, isi n’eluigwe kwuo okwu—gwa ụmụ mmadụ okwu?’ N’ezie, Jehova si n’eluigwe kwuo okwu mgbe ụfọdụ site n’ọnụ ndị mmụọ ozi na-anọchite anya ya. Dị ka ihe atụ, o mere otú ahụ mgbe o nyere ụmụ Izrel Iwu ahụ. (Ndị Galeshia 3:19) Olu ahụ sitere n’eluigwe bụ ihe na-emenye ụjọ—nke na ụmụ Izrel ahụ ụjọ ji rịọrọ Jehova ka ọ ghara ịgwa ha okwu otú a kama ka o si n’ọnụ Mozis na-agwa ha okwu.  (Ọpụpụ 20:18-20) N’ihi ya, e ji ọnụ nye Mozis Iwu ahụ, bụ́ nke nwere ihe dị ka ụkpụrụ 600, n’ewepụghị ihe ọ bụla na ya.

4. Kọwaa ihe mere iji ọnụ na-akọ iwu Chineke na-agaraghị eji abụ ụzọ a pụrụ ịdabere na ya nke isi nyefee ya ndị ọzọ.

4 Otú ọ dị, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na e deghị Iwu ahụ ede ma ọlị? Mozis ọ̀ gaara echetali kpọmkwem ihe nile e kwuru n’usoro iwu ahụ sara mbara ma gwazie ya mba ahụ nile n’ekwuhieghị ihe? Olee banyere ọgbọ na-abịa abịa? Hà gaara adaberewo nanị n’ihe e ji ọnụ gwa ha? Nke ahụ agaraghị abụ ma ọlị ụzọ a pụrụ ịdabere na ya nke isi nyefee iwu Chineke. Cheedị ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ị ga-akọrọ ọtụtụ ndị otu akụkọ site n’ịkọrọ ya otu onye, onye ahụ akọọrọ ya onye ọzọ, e si otú ahụ kọọrọ ya ndị ọzọ. Ihe onye ikpeazụ a ga-akọrọ ya ga-anụ yikarịrị ka ọ ga-adị nnọọ iche n’ihe onye mbụ a kọọrọ ya nụrụ. Ihe ndị e kwuru n’Iwu Chineke anọghị n’ụdị ihe ize ndụ dị otú ahụ.

5, 6. Gịnị ka Jehova gwara Mozis ka o mee okwu Ya, n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ ngọzi nye anyị inwe Okwu Jehova n’ụdị e deturu edetu?

5 Jehova ji amamihe kpebie ka e detuo okwu ya edetu. O nyere Mozis iwu, sị: “Deere onwe gị okwu ndị a n’ihe: n’ihi na dị ka okwu ndị a si dị ka M gbaworo ndụ n’etiti Mụ na gị, na n’etiti Mụ na ụmụ [Izrel].” (Ọpụpụ 34:27) Otú ahụ ka oge nke ide Bible si malite, na 1513 T.O.A. N’ime afọ 1,610 sochirinụ, Jehova gwara ihe dị ka ndị edemede 40 bụ́ mmadụ ‘okwu n’ọtụtụ oge na n’ọtụtụ ụzọ,’ bụ́ ndị detuziri Bible. (Ndị Hibru 1:1) Ka oge na-aga, ndị ndepụtaghachi tinyere obi ha n’ọrụ nke iji oké nlezianya depụtaghachi ha n’ụzọ ziri ezi iji chekwaa Akwụkwọ Nsọ.—Ezra 7:6; Abụ Ọma 45:1.

6 Jehova agọziwo anyị n’ezie n’ịgwa anyị okwu site n’idetu ya edetu. Ọ̀ dịtụwo mgbe ị natara akwụkwọ ozi tọgburu gị atọgbu—ikekwe, n’ihi na o nyere gị nkasi obi dị gị mkpa—nke na i debere ya nke ọma ma na-agụghachi ya ugboro ugboro? Ọ bụ otú ahụ ka “akwụkwọ ozi” Jehova detaara anyị dị. N’ihi na Jehova deturu ihe ndị o kwuru edetu, anyị na-enwe  ike ịgụ ha mgbe nile na ịtụgharị uche n’ihe ha na-ekwu. (Abụ Ọma 1:2) Anyị pụrụ inweta “nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ” mgbe ọ bụla ọ dị anyị mkpa.—Ndị Rom 15:4.

N’ihi Gịnị Ka E Ji Jiri Ụmụ Mmadụ Dee Ya?

7. Olee otú e si ahụ amamihe Jehova n’ojiji o ji ndị edemede bụ́ mmadụ mee ihe?

7 N’amamihe ya, Jehova ji ụmụ mmadụ detuo Okwu ya. Tụlee nke a: A sị Jehova ji ndị mmụọ ozi dee Bible, ọ̀ gaara na-akpali akpali otú o si akpali? N’eziokwu, ndị mmụọ ozi gaara akọwawo Jehova otú ha sị hụ ya site n’ụzọ dị elu ha si ele ihe anya, kwuo banyere nrara ha raara onwe ha nye ya, ma kọọ banyere ụmụ mmadụ bụ́ ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi. Ma, ànyị gaara aghọtawo otú ndị mmụọ e kere eke zuru okè si eche echiche, bụ́ ndị ihe ọmụma, ahụmahụ, na ike ha nwere karịrị nnọọ nke anyị?—Ndị Hibru 2:6, 7.

“Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke”

8. N’ụzọ dị aṅaa ka e si hapụ ndị dere Bible ka ha jiri ọgụgụ isi ha mee ihe? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.)

8 Site n’iji ndị edemede bụ́ mmadụ mee ihe, Jehova nyere anyị nnọọ ihe dị anyị mkpa—ihe ndekọ nke “sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke” ma ka nwee ihe gosiri na e ji ụmụ mmadụ dee ya. (2 Timoti 3:16) Olee otú o si mezuo nke a? N’ọtụtụ ọnọdụ, o doro anya na ọ hapụrụ ndị edemede ahụ ka ha jiri ọgụgụ isi ha mee ihe n’ịhọrọ “okwu nile na-atọ ụtọ, na ihe e deziri edezi, bụ́ okwu nile nke eziokwu.” (Eklisiastis 12:10, 11) Ọ bụ nke a mere ụzọ e si dee Bible ji dịgasịa iche iche; ihe odide ndị ahụ na-egosipụta nzụlite nke onye edemede nke ọ bụla nakwa ụdị onye ọ bụ. * Ma, ndị ikom a “sitere na Chineke kwuo okwu mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.” (2 Pita 1:21) N’ihi ya, ihe ha dere bụ n’ezie “okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

9, 10. N’ihi gịnị ka ojiji e ji ndị edemede bụ́ mmadụ mee ihe ji eme ka Bible na-adọrọ mmasị ma na-akpali akpali karị?

 9 Ojiji e ji ndị edemede bụ́ mmadụ mee ihe mere ka Bible na-adọrọ mmasị ma na-akpali akpali nke ukwuu. Ndị dere ya bụ ndị ikom nwere mmetụta ndị yiri nke anyị. Ebe ha bụ ndị na-ezughị okè, ha chere ule na nrụgide ndị yiri ndị anyị na-eche ihu ihu. N’ọnọdụ ụfọdụ, mmụọ Jehova kpaliri ha ide banyere mmetụta ndị ha nwere na ihe ndị ha onwe ha gbasoro mgba. (2 Ndị Kọrint 12:7-10) Ya mere, ha ji okwu ndị na-egosi na onye na-ede ihe ahụ na-ekwu banyere onwe ya mee ihe, bụ́ okwu ndị ọ na-adịghị mmụọ ozi ọ bụla gaara ejiworị ha mee ihe.

10 Were Eze Devid nke Izrel dị ka ihe atụ. Mgbe o mesịrị mmehie ụfọdụ dị oké njọ, Devid dere otu abụ ọma bụ́ nke ọ nọ na ya kwupụta ihe dị ya n’obi, na-arịọ mgbaghara Chineke. O dere, sị: “[Mee] ka m si ná mmehie m dị ọcha. N’ihi na mụ onwe m maara njehie m nile: mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe nile. Lee, n’ajọ omume ka a mụpụtara m; ọ bụkwa ná mmehie ka nne m tụụrụ ime m. Atụpụla m n’ihu Gị; anarakwala m Mmụọ Nsọ Gị. Àjà nile nke Chineke bụ mmụọ tiwara etiwa: obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, Ị dịghị eleda ya anya.” (Abụ Ọma 51:2, 3, 5, 11, 17) Ọ̀ bụ na ị hụghị obi erughị ala nke onye edemede ahụ nwere? Ònye, ma e wezụga mmadụ na-ezughị okè, pụrụ ikwupụta ụdị mmetụta dị otú ahụ?

Gịnị Mere O Ji Bụrụ Akwụkwọ Na-ekwu Maka Ndị Mmadụ?

11. Ụdị ihe atụ ndị dị aṅaa mere eme n’ezie ka e denyere na Bible “iji nye anyị ntụziaka”?

11 E nwere ihe ọzọ so eme ka Bible na-akpali akpali. Ruo n’ókè dị ukwuu, ọ bụ akwụkwọ na-ekwu maka ndị mmadụ—ndị dịrị ndụ n’ezie—ndị jeere Chineke ozi na ndị na-ejeghịrị ya ozi. Anyị na-agụ banyere ahụmahụ ha, ihe isi ike, na ọṅụ ndị ha nwere. Anyị na-ahụ ihe ndị si ná mkpebi ndị ha mere ná ndụ pụta. E denyere ihe ndekọ ndị dị otú ahụ “iji nye anyị ntụziaka.” (Ndị Rom 15:4) Site n’ihe atụ ndị a mere  eme n’ezie, Jehova na-ezi ihe n’ụzọ na-emetụ anyị n’obi. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

12. N’ụzọ dị aṅaa ka ihe ndekọ Bible banyere ụmụ mmadụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi si enyere anyị aka?

12 Bible na-akọ banyere ụmụ mmadụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ọbụna ndị bụ́ ndị ajọ omume, na ihe dakwasịrị ha. N’ihe ndekọ ndị a, a na-ahụ ka ha na-egosipụta àgwà ndị na-adịghị mma site n’omume ha, na-eme ka ọ dịrị anyị mfe karị ịghọta ha. Dị ka ihe atụ, olee iwu e nyere megide eguzosighị ike n’ihe nke ga-adị irè ka ihe atụ a hụrụ anya nke àgwà a nke Judas gosiri ka ọ nọ na-akpa nkata nrara ahụ ọ raara Jizọs nye? (Matiu 26:14-16, 46-50; 27:3-10) Ihe ndekọ ndị dị ka nke a na-emetụ anyị n’obi karị, na-enyere anyị aka ịmata nakwa ịjụ àgwà ndị jọgburu onwe ha.

13. N’ụzọ dị aṅaa ka Bible si enyere anyị aka ịghọta àgwà ndị dị mma?

13 Bible na-akọkwa banyere ọtụtụ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi. Anyị na-agụ banyere nraranye na iguzosi ike n’ihe ha. Anyị na-ahụ ezi ihe atụ nke àgwà ndị ọ dị mkpa ka anyị zụlite iji bịaruo Chineke nso. Were okwukwe dị ka ihe atụ. Bible na-akọwa ihe bụ́ okwukwe ma na-agwa anyị otú ọ dịruru mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-eme ihe ga-atọ Chineke ụtọ. (Ndị Hibru 11:1, 6) Ma Bible nwekwara ihe atụ ndị doro anya nke ebe ndị e gosipụtara okwukwe. Cheedị echiche banyere okwukwe Ebreham gosipụtara mgbe ọ nwara ịchụ Aịzik n’àjà. (Jenesis, isi 22; Ndị Hibru 11:17-19) Site n’ihe ndekọ ndị dị otú ahụ, okwu ahụ bụ́ “okwukwe” na-abịa nwekwuo ihe ọ pụtara ma dịkwuo mfe ịghọta. Lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya na ọ bụghị nanị na Jehova na-agba anyị ume ịzụlite àgwà ndị dị mma, kamakwa na ọ na-enye anyị ihe atụ ebe ndị e gosipụtara ha!

14, 15. Gịnị ka Bible na-agwa anyị banyere otu nwanyị nke bịara n’ụlọ nsọ, gịnịkwa ka anyị na-amụta banyere Jehova site n’ihe ndekọ a?

14 Ihe ndekọ ndị mere eme dị n’ime Bible na-akụziri anyị, ọtụtụ mgbe, ụdị onye Jehova bụ. Cheedị echiche n’ihe anyị gụrụ banyere otu nwanyị nke Jizọs hụrụ n’ụlọ nsọ. Ka Jizọs  nọ ọdụ n’ebe dịdewere ihe ntụnye ego, ọ nọ na-ekiri ka ndị mmadụ na-atụnye onyinye ha. Ọtụtụ ndị ọgaranya bịara, nye ihe ‘site n’ihe mafọọrọ ha.’ Ma Jizọs legidere otu nwanyị di ya nwụrụ anya, bụ́ onye ọ na-adịghị ka ọ hà ya. Onyinye o nyere bụ “obere mkpụrụ ego abụọ nke ihe ha ga-azụtali dị nnọọ nta.” * Ọ gwụla ego o nwere. Jizọs, bụ́ onye na-enwe ụdị echiche Jehova n’ụzọ zuru ezu n’okwu ọ bụla, kwuru, sị: “Nwanyị a di ya nwụrụ bụ́ onye dara ogbenye tụnyere karịa ndị nile ahụ na-atụnye ego n’ime ihe ntụnye ego ndị ahụ.” Dị ka okwu ndị ahụ na-egosi, ọ tụnyere ihe karịrị ihe ndị nke ọzọ nile tụnyere ma a gụkọta ihe ha nile tụnyere.—Mak 12:41-44; Luk 21:1-4; Jọn 8:28.

15 Ọ́ bụghị ihe dị ịrịba ama na n’ime ndị nile bịara n’ụlọ nsọ ahụ n’ụbọchị ahụ, na a họọrọ nwanyị a di ya nwụrụ ma kwuo banyere ya n’ime Bible? Site n’ihe atụ a, Jehova na-akụziri anyị na ya bụ Chineke nke na-enwe ekele. Ọ na-enwe obi ụtọ ịnara onyinye ndị anyị ji mkpụrụ obi anyị dum na-enye, n’agbanyeghị otú ha hà ma e jiri ha tụnyere ihe ndị ọzọ nwere ike inye. Ọ dịghị ụzọ ọzọ ka mma Jehova gaara esi kụziere anyị eziokwu a na-enye obi ụtọ!

Ihe Ndị Na-adịghị n’Ime Bible

16, 17. Olee otú e si ahụ amamihe Jehova ọbụna n’ihe ndị o kpebiri ịhapụ iwebata n’ime n’Okwu ya?

16 Mgbe ị na-edegara onye ị hụrụ n’anya akwụkwọ ozi, ị gaghị enwe ike idenyecha ihe nile. Ya mere, ị na-eji ezi uche họrọ ihe ndị ị ga-edenye. N’otu aka ahụ, Jehova kpebiri ikwu banyere mmadụ ụfọdụ na ihe omume ụfọdụ n’ime Okwu ya. Ma n’ihe ndekọ ndị a ndị bụ́ akụkọ, Bible adịghị akọcha ihe nile n’ozuzu ha. (Jọn 21:25) Dị ka ihe atụ, mgbe Bible na-ekwu banyere ikpe Chineke, ihe e kwuru maka ya nwere ike ọ gaghị azacha ajụjụ nile anyị nwere. A na-ahụ amamihe  Jehova ọbụna n’ihe ndị o kpebiri ịhapụ iwebata n’ime Okwu ya. N’ụzọ dị aṅaa?

17 Ụzọ e si dee Bible na-anwapụta ihe dị anyị n’obi. Ndị Hibru 4:12 na-ekwu, sị: “Okwu [ma ọ bụ, ozi] Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, na-amapukwa amapu ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ . . . o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ebumnuche nke obi.” Ozi Bible na-abami n’ime obi, na-ekpughe ihe bụ́ echiche anyị na ebumnobi anyị n’ezie. Ndị na-agụ ya iji hụ ihe ha ga-akatọ na-enwekarị ihe ịsụ ngọngọ mgbe ha gụrụ ihe ndekọ ndị na-enyeghị ihe ọmụma zuru ezu nke ga-eju ha afọ. Ndị dị otú ahụ pụrụ ọbụna ịdị na-arụ ụka ma Jehova ọ̀ bụ onye na-ahụ n’anya n’ezie, nke maara ihe ma na-ekpe ikpe ziri ezi.

18, 19. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ekwesịghị iji nye anyị nsogbu n’obi ma ọ bụrụ na otu ihe ndekọ Bible akpalite ajụjụ ndị anyị na-apụghị inweta azịza ha ozugbo? (b) Gịnị dị mkpa iji ghọta Okwu Chineke, oleekwa otú nke a si bụrụ ihe àmà nke oké amamihe Jehova?

18 N’ụzọ dị iche na nke ahụ, mgbe anyị ji ezi obi mụọ Bible nke ọma, anyị na-abịa mata Jehova otú ahụ Bible dum si kọwaa ya. N’ihi ya, ọ dịghị enye anyị nsogbu n’obi ma ọ bụrụ na otu ihe ndekọ akpalite ajụjụ ụfọdụ ndị anyị na-apụghị inweta azịza ha ozugbo. Anyị na-aghọta na mgbe anyị na-amụ Bible, nke nta nke nta anyị na-amụta ụdị Chineke Jehova bụ. Ọ bụrụgodị na anyị apụghị ịghọta otu ihe ndekọ ná mmalite ma ọ bụ hụ otú o si kwekọọ n’ụdị onye Chineke bụ, ọmụmụ anyị na-amụ Bible akụziwororị anyị ihe dị nnọọ ukwuu banyere Jehova, bụ́ ndị ga-eme ka anyị nwee ike ịhụ na ọ bụ Chineke nke na-ahụ n’anya ma na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe nile.

19 Ya mere, iji ghọta Okwu Chineke, anyị aghaghị iji ezi obi na-agụ ma na-amụ ya ma dị njikere ịnabata ihe ọmụma ọhụrụ. Nke a ọ́ bụghị ihe àmà nke na-egosi amamihe dị ukwuu Jehova nwere? Ụmụ mmadụ ndị nwere ọgụgụ isi pụrụ ide akwụkwọ ndị ọ bụ nanị “ndị amamihe na ndị nwere ọgụgụ isi” pụrụ ịghọta. Ma ide akwụkwọ ọ bụ nanị ndị obi ha ziri ezi pụrụ ịghọta—nke ahụ chọrọ amamihe Chineke!—Matiu 11:25.

 Akwụkwọ nke “Ezi Amamihe”

20. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị Jehova pụrụ ịgwa anyị ụzọ kasị mma isi bie ndụ, gịnịkwa dị n’ime Bible bụ́ nke pụrụ inyere anyị aka?

20 N’Okwu ya, Jehova na-agwa anyị ụzọ kasị mma isi bie ndụ. Dị ka Onye Okike anyị, ọ maara ihe ndị dị anyị mkpa karịa anyị. Ihe ndị bụ́ isi dịkwa ụmụ mmadụ mkpa—gụnyere ọchịchọ nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya, inwe obi ụtọ, na inwe mmekọrịta dị mma—agbanwebeghịkwa. E nwere ọtụtụ “ezi amamihe” ndị pụrụ inyere anyị aka ibi ndụ nwere nzube n’ime Bible. (Ilu 2:7, NW) Nkebi nke ọ bụla n’akwụkwọ a nwere isiakwụkwọ nke na-egosi otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Bible amamihe dị na ya n’ọrụ, ma ka anyị tụlee nanị otu ihe atụ ugbu a.

21-23. Olee ndụmọdụ amamihe dị na ya nke pụrụ inyere anyị aka izere ibu iwe n’obi?

21 Ị̀ chọpụtatụwo na ndị na-ebu iwe n’obi, ọtụtụ mgbe na-emerụ onwe ha ahụ́ n’ikpeazụ? Iwe bụ ibu dị arọ obubu ná ndụ. Mgbe anyị nọgidere buru ya n’obi, anyị ga na-eche banyere ya mgbe nile, ọ na-anapụ anyị udo na ọṅụ. Nchọpụta ndị ọkà mmụta sayensị mere na-ekwu na ibu iwe n’obi pụrụ ime ka anyị nọrọ n’ihe ize ka ukwuu nke ịrịa ọrịa obi nakwa ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ na-adịghị ala ala. Ogologo oge tupu ndị ọkà mmụta sayensị emee nchọpụta ndị dị otú ahụ, Bible kwuru n’ụzọ amamihe, sị: “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma.” (Abụ Ọma 37:8) Ma olee otú anyị pụrụ isi mee ya?

22 Okwu Chineke na-enye ndụmọdụ a amamihe dị na ya: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ; ọ bụkwa ịma mma ya ịgabiga njehie.” (Ilu 19:11) Ezi uche bụ ikike nke ịhụ ihe karịrị nanị ihe dị n’elu elu, ileba ihe anya n’ime. Ọ bụ ezi uche na-eme ka e nwee nghọta, n’ihi na ọ pụrụ inyere anyị aka ịmata ihe mere onye ọzọ ji kwuo okwu ma ọ bụ kpaa àgwà n’otu ụzọ. Ịgbalị ịghọta ihe bụ́ ebumnobi, mmetụta, na ọnọdụ ya n’ezie pụrụ inyere anyị aka ịghara inwe echiche na mmetụta na-ezighị ezi n’ebe ọ nọ.

23 Bible nyekwara ndụmọdụ a: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam.” (Ndị Kọlọsi  3:13) Okwu bụ́ “nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu” na-enye echiche nke inwe ndidi n’ebe ndị ọzọ nọ, idi omume ndị pụrụ ịdị na-agbakasị anyị ahụ́. Ụdị ndidi ahụ pụrụ inyere anyị aka izere ịdị na-ebu ụmụ obere iwe na-enweghị isi n’obi. “Ịgbaghara” na-enye echiche nke ịkwụsị iwe iwe. Chineke anyị nke maara ihe maara na ọ dị mkpa ka anyị na-agbaghara ndị ọzọ mgbe e nwere ezi ihe mere a ga-eji mee otú ahụ. Ọ bụghị nanị maka ọdịmma ha, kamakwa maka udo nke uche na obi anyị. (Luk 17:3, 4) Lee amamihe dị n’Okwu Chineke!

24. Gịnị na-esi na ya apụta mgbe anyị mere ka ndụ anyị kwekọọ n’amamihe Chineke?

24 N’ịbụ onye ịhụnanya ya a na-akparaghị ókè kpaliri, Jehova chọrọ ịgwa anyị okwu. Ọ họọrọ ụzọ kasị mma isi mee ya—“akwụkwọ ozi” nke ndị edemede bụ́ mmadụ dere site ná nduzi nke mmụọ nsọ. N’ihi ya, amamihe nke Jehova n’onwe ya dị n’ime ya. Amamihe a “kwesịrị ntụkwasị obi nke ukwuu.” (Abụ Ọma 93:5) Ka anyị na-eme ka ndụ anyị kwekọọ na ya ma soro ndị ọzọ na-ekerịta ya, dị ka o kwesịrị ịdị, anyị na-abịaru Chineke anyị nke maara ihe nile nso. N’isiakwụkwọ na-esonụ, anyị ga-atụle ihe atụ ọzọ pụtara ìhè nke amamihe Jehova nke na-egosi na ọ na-elepụ anya n’ihu: ikike o nwere ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu nakwa imezu nzube ya.

^ par. 8 Dị ka ihe atụ, Devid, bụ́ onye ọzụzụ atụrụ, ji ihe atụ ndị sitere ná ndụ nke ịzụ atụrụ mee ihe. (Abụ Ọma nke 23) Matiu, onye bụbu ọnaụtụ, zoro aka ọtụtụ ugboro n’ọnụ ọgụgụ nakwa n’ọnụ ego. (Matiu 17:27; 26:15; 27:3) Luk, bụ́ dibịa, jiri okwu ndị gosiri na ọ maara banyere nkà ọgwụ na ahụ́ ike mee ihe.—Luk 4:38; 14:2; 16:20.

^ par. 14 Nke ọ bụla n’ime mkpụrụ ego ndị a bụ otu lepton, bụ́ mkpụrụ ego kasị nta nke ndị Juu ji eme ihe n’oge ahụ. Lepton abụọ bụ 1 ụzọ n’ime ụzọ 64 nke ụgwọ ọrụ otu ụbọchị. Mkpụrụ ego abụọ a ezughị ọbụna iji zụta otu nza, bụ́ nnụnụ kasị ọnụ ala ndị ogbenye na-eri.