Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 17

‘Lee Ịdị Omimi nke Amamihe Chineke!’

‘Lee Ịdị Omimi nke Amamihe Chineke!’

1, 2. Gịnị bụ nzube Jehova maka ụbọchị nke asaa ahụ, oleekwa otú e si lee amamihe Chineke ule ná mmalite nke ụbọchị a?

E BIBIWO YA! Mmadụ, nke bụ́ ihe kasị ebube e kere n’ụbọchị nke isii nke okike, si n’ọnọdụ ahụ dị elu daruo ala na mberede. Jehova ekwuworị na “ihe nile ọ bụla O mere,” gụnyere ihe a kpọrọ mmadụ, “dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Ma ná mmalite nke ụbọchị nke asaa, Adam na Iv kpebiri isoro Setan nupụ isi. Ha dabara ná mmehie, ezughị okè, nakwa n’ọnwụ.

2 Ọ pụrụ iyiworị ka e wezụgawo nzube Jehova maka ụbọchị nke asaa ahụ n’ụsọ n’ụzọ olileanya na-adịghị na ya. Ụbọchị ahụ, dị ka ụbọchị isii ndị bu ya ụzọ, gaje ịdị ọtụtụ puku afọ n’ogologo. Jehova ekwuwo na ọ dị nsọ, ọ bụkwa n’ụbọchị ahụ ka a ga-emesịa mee ka ụwa dum ghọọ paradaịs nke ezinụlọ zuru okè nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-ejupụta. (Jenesis 1:28; 2:3) Ma mgbe nnupụisi ahụ kpatara ọdachi gasịrị, olee otú ihe dị otú ahụ ga-esi mezuo? Gịnị ka Chineke ga-eme? Nke a bụ ule dị ịrịba ama nke amamihe Jehova—ma eleghị anya ule kasịnụ.

3, 4. (a) N’ihi gịnị ka ihe Jehova mere banyere nnupụisi ahụ weere ọnọdụ n’Iden ji bụrụ ihe atụ na-anwụ ibobo n’ahụ́ banyere amamihe ya? (b) Ịdị umeala n’obi kwesịrị ịkpali anyị iburu eziokwu dị aṅaa n’uche ka anyị na-amụ banyere amamihe Jehova?

3 Jehova mere ihe ozugbo. Ọ mara ndị nnupụisi ahụ ikpe n’Iden, n’otu oge ahụkwa, o mere ka a hụperetụ otu ihe dị ebube: nzube ya nke idozi nsogbu ndị ahụ ha ka malitere. (Jenesis 3:15) Ihe Jehova ji ilepụ anya n’ihu zube si n’Iden gbasapụ ruo ọtụtụ puku afọ nile nke akụkọ ihe mere eme mmadụ ma gafere ya, ruo n’ọdịnihu dị anya. Ọ dị nnọọ mfe n’ụzọ magburu onwe ya ma ọ dị omimi nke na onye na-agụ Bible pụrụ iji oge ndụ ya nile mụọ ya ma tụgharịa uche na ya n’ụzọ na-eweta afọ ojuju. Ọzọkwa, nzube Jehova ga-emezurịrị. Ọ ga-eweta ajọ omume nile, mmehie, na ọnwụ ná njedebe. Ọ ga-eme ka ihe a  kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi zuo okè. Ihe a nile ga-emezu tupu ụbọchị nke asaa ahụ abịa ná njedebe, ka o wee bụrụ na, n’agbanyeghị ihe nile, Jehova ga-emezuworị nnọọ nzube ya maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ n’oge ya kpọmkwem!

4 Amamihe dị otú ahụ na-anwụ ibobo n’ahụ́, ọ̀ bụ na ọ dịghị anwụ? A kpaliri Pọl onyeozi ide, sị: ‘Lee ịdị omimi nke amamihe Chineke!’ (Ndị Rom 11:33) Ka anyị na-amụ akụkụ dị iche iche nke àgwà a nke Chineke, ịdị umeala n’obi kwesịrị ịkpali anyị iburu otu eziokwu dị oké mkpa n’uche—na, anyị gbalịkarịa, nanị ihe anyị pụrụ ime bụ ịkpatụ oké amamihe nke Jehova nwere aka elu elu. (Job 26:14) Nke mbụ, ka anyị kọwaa ihe àgwà a dị ebube bụ.

Gịnị Bụ Amamihe Chineke?

5, 6. Olee njikọ dị n’agbata ihe ọmụma na amamihe, oleekwa otú ihe ọmụma Jehova bururu ibu?

5 Amamihe na ihe ọmụma abụghị otu ihe. Kọmputa pụrụ ichekwa ihe ọmụma buru nnọọ ibu, ma o siri ike iche na mmadụ ọ bụla ga-asị na ígwè ọrụ dị otú ahụ maara ihe. Ka o sina dị, ihe ọmụma na amamihe nwere njikọ. (Ilu 10:14) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ inweta ndụmọdụ amamihe dị na ya banyere otú ị ga-esi gwọọ otu nsogbu ahụ́ ike tara akpụ, ị̀ ga-agakwuru onye na-amakebeghị banyere nkà ọgwụ na ahụ́ ike ma ọ bụ onye na-amadịghị ihe ọ bụla banyere ya? Ọ dịghị ma ọlị! Ya mere, ezi ihe ọmụma dị oké mkpa iji nwee ezi amamihe.

6 Jehova nwere ihe ọmụma n’ụba n’ụzọ a na-akparaghị ókè. Dị ka “Eze mgbe ebighị ebi,” ọ bụ nanị ya bụ onye dị ndụ eri mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 15:3) N’oge ahụ nile kwa a na-apụghị ịgụta ọnụ, ọ maara ihe nile. Bible na-ekwu, sị: “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya, ma ihe nile gba ọtọ ma bụrụ ndị e kpughepụrụ ekpughepụ n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (Ndị Hibru 4:13; Ilu 15:3) Dị ka Onye Okike, Jehova maara ihe ndị o mere n’ụzọ zuru ezu, ọ nọwokwa na-ele ihe nile ụmụ mmadụ na-eme site ná mmalite. Ọ na-enyocha obi onye ọ bụla bụ́ mmadụ, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla nke ọ na-adịghị ahụ. (1 Ihe E Mere 28:9) Ebe o kere  anyị dị ka ndị nweere onwe ha ime nhọrọ, ọ na-enwe obi ụtọ mgbe ọ na-ahụ na anyị na-eme nhọrọ ndị amamihe dị na ha ná ndụ. Dị ka “Onye na-anụ ekpere,” ọ na-ege ntị n’ọtụtụ ekpere n’otu mgbe! (Abụ Ọma 65:2) Ọ baghịkwa uru ikwuwe ya, Jehova nwere ikike ncheta ihe nke zuru okè.

7, 8. Olee otú Jehova si egosipụta nghọta na amamihe?

7 Jehova nwere ihe karịrị ihe ọmụma. Ọ na-ahụkwa otú ihe ndị na-emenụ na ibe ha si agakọ ma na-aghọta onyinyo nke ọtụtụ ụmụ irighiri ihe dị iche iche na-emenụ na-ese. Ọ na-atụle ma na-ekpebi ihe, na-amata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ, n’etiti ihe dị mkpa na ihe na-adịghị mkpa. Ọzọkwa, ọ na-ahụ ihe karịrị ihe anya nkịtị na-ahụ, na-enyobakwa anya kpọmkwem n’ime obi. (1 Samuel 16:7) N’ihi ya, Jehova nwere nghọta, bụ́ àgwà nke karịrị ihe ọmụma. Ma amamihe karịrị ha.

8 Amamihe na-ejikọta ihe ọmụma na nghọta ma jiri ha na-eme ihe iji rụzuo ihe a chọrọ. N’ezie, ụfọdụ n’ime okwu Bible ndị a sụgharịrị ịbụ “amamihe” pụtara n’ụzọ nkịtị “ịrụ ọrụ n’ụzọ dị irè” ma ọ bụ “ezi amamihe.” Ya mere amamihe Jehova abụghị nanị ihe a na-ekwu n’ọnụ. Ọ na-arụpụta ihe, dịkwa irè. N’iji ihe ọmụma dị ukwuu na nghọta miri emi o nwere eme ihe, Jehova na-eme mkpebi ndị kasị mma mgbe nile, na-emezu ihe ndị ahụ o kpebiri n’ụzọ kasị mma a pụrụ icheta n’echiche. Nke ahụ bụ ezi amamihe! Jehova na-egosipụta ịbụ eziokwu nke okwu Jizọs: “A na-anwapụta na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Matiu 11:19) Ihe dị iche iche Jehova rụrụ n’eluigwe nakwa n’ụwa nile bụ ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ nke amamihe ya.

Ihe Àmà Dị Iche Iche nke Amamihe Chineke

9, 10. (a) Jehova na-egosipụta na o nwere ụdị amamihe dị aṅaa, oleekwa ụzọ o siworo gosipụta ya? (b) Olee otú mkpụrụ ndụ si enye ihe àmà nke amamihe Jehova?

9 Ì nwetụwo ihe ijuanya banyere nkà nke onye ọrụ aka bụ́ onye na-emepụta ihe ndị mara mma, ndị na-arụ ọrụ nke ọma? Nke ahụ bụ otu ụdị amamihe nke na-akpali mmasị. (Ọpụpụ 31:1-3) Ọ bụ Jehova n’onwe ya bụ isi iyi nakwa onye kasị nwee amamihe dị otú ahụ. Eze Devid kwuru banyere Jehova, sị: “M ga-ekele Gị; n’ihi na e jiwo ihe dị iche iche dị egwu  mee ka m bụrụ oké ọrụ: oké ọrụ ka ọrụ Gị nile dị; mkpụrụ obi m makwaara ya nke ọma.” (Abụ Ọma 139:14) N’ezie, ka anyị na-amụtakwu banyere ahụ́ mmadụ, otú ahụ ka ibobo na-anwụkwu anyị n’ahụ́ banyere amamihe Jehova.

10 Iji maa atụ: Ndụ gị malitere dị ka otu mkpụrụ ndụ—otu mkpụrụ àkwá nke sitere n’ahụ́ nne gị nke ọbara ọcha sitere n’ahụ́ nna gị mere ka ọ ghọọ nwa. N’oge na-adịghị anya, mkpụrụ ndụ ahụ malitere ikewa. Ihe mejupụtara gị, bụ́ ihe si na ya pụta, bụ ihe dị ka 100 puku ijeri mkpụrụ ndụ. Ha dị irighiri irighiri. Ihe dị ka mkpụrụ ndụ 10,000 ga-aba n’otu isi agá. Ma, nke ọ bụla n’ime ha bụ ihe e kere eke dị nnọọ mgbagwoju anya. Mkpụrụ ndụ dị nnọọ mgbagwoju anya karịa ígwè ọrụ ma ọ bụ ụlọ mmepụta ihe ọ bụla mmadụ rụrụ. Ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na otu mkpụrụ ndụ yiri obodo nwere mgbidi gburugburu ya—nke nwere ọnụ ụzọ ndị a na-eche nche na ha, ebe ndị e si abanye ma na-apụ na ya, usoro ime njem, usoro nzirịta ozi, ebe e si enweta eletrik, ụlọ ọrụ mmepụta ihe, ebe ndị a na-ekpofu ihe ma jiri ha na-emepụta ihe ndị ọzọ, usoro nchebe, nakwa ọbụna ihe yiri gọọmenti etiti n’etiti ya. Ọzọkwa, nanị n’ime awa ole na ole mkpụrụ ndụ pụrụ imepụta mkpụrụ ndụ yiri ya n’ụzọ nile!

11, 12. (a) Gịnị na-eme ka mkpụrụ ndụ nke nwa a ka tụtara ime ya atụta gbanwee ghọọ akụkụ ahụ́ dị iche iche, olee otú nke a si kwekọọ n’Abụ Ọma 139:16? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ụbụrụ mmadụ si egosi na anyị bụ “oké ọrụ”?

11 Otú ọ dị, mkpụrụ ndụ nile abụghị otu. Ka mkpụrụ ndụ nke nwa a ka tụtara ime ya atụta na-aga n’ihu na-ekewa, ha na-amalite ịghọ akụkụ ahụ́ dịgasị nnọọ iche iche. Ụfọdụ ga-aghọ mkpụrụ ndụ na-ebu ozi; ndị ọzọ aghọọ ọkpụkpụ, uru ahụ́, ọbara, ma ọ bụ mkpụrụ ndụ nke anya. E kenyere usoro mgbanwe a n’ime “ọ́bá akwụkwọ” nke mkpụrụ ndụ ihe nketa, nke bụ́ DNA. N’ụzọ na-akpali mmasị, e nyere Devid ike mmụọ nsọ ịgwa Jehova, sị: “Anya Gị abụọ hụrụ ahụ́ m mgbe ọ ka-ezughị okè, ọ bụkwa n’akwụkwọ Gị ka e dere ihe nile dị m n’ahụ́.”—Abụ Ọma 139:16.

12 Akụkụ ahụ́ ụfọdụ dị mgbagwoju anya nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, cheedị echiche banyere ụbụrụ mmadụ. Ụfọdụ ndị akpọwo  ya ihe kasị dị mgbagwoju anya a chọpụtaworo n’ụwa. O nwere ihe dị ka 100 ijeri mkpụrụ ndụ na-ebu ozi—ihe ha ka ọnụ ọgụgụ kpakpando ndị dị n’ụyọkọ kpakpando anyị. Nke ọ bụla n’ime mkpụrụ ndụ ndị ahụ wara ọtụtụ puku alaka ebe ya na mkpụrụ ndụ ndị ọzọ na-ejikọta. Ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na ụbụrụ mmadụ pụrụ ibu ihe ọmụma nile dị n’ọ́bá akwụkwọ nile dị n’ụwa nakwa na ọ pụrụ ịbụ n’ezie na a pụghị ịmata ikike o nwere ịnagide ihe ọmụma. N’agbanyeghị ọtụtụ iri afọ e tinyeworo n’ịmụ akụkụ ahụ́ a nke bụ́ “oké ọrụ,” ndị ọkà mmụta sayensị na-ekweta na ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị mgbe ha ga-aghọtacha n’ụzọ zuru ezu otú o si arụ ọrụ.

13, 14. (a) Olee otú ụmụ ahụhụ na ihe ndị ọzọ e kere eke si egosi na ha “maara ihe nke ukwuu,” gịnịkwa ka nke ahụ na-akụziri anyị banyere Onye kere ha? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ọ bụ “n’amamihe” ka e kere ihe ndị dị ka ọnyà ududo?

13 Otú ọ dị, ụmụ mmadụ bụ nanị otu ihe atụ nke amamihe ike ihe nke Jehova. Abụ Ọma 104:24 na-ekwu, sị: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka I meworo ha nile: ụwa jupụtara n’ihe I nwetara.” Amamihe Jehova na-apụta ìhè n’ihe nile e kere eke gbara anyị gburugburu. Dị ka ihe atụ, ahụhụ “maara ihe nke ukwuu.” (Ilu 30:24) N’ezie, a haziri ìgwè ụmụ ahụhụ ahazi n’ụzọ dị egwu. Ụfọdụ ìgwè ụmụ ahụhụ na-elekọta, na-echebe, ma na-enweta ihe oriri site n’ụmụ ahụhụ ndị a na-akpọ aphid, dị ka à ga-asị na ha bụ anụ a na-azụ azụ. Ụmụ ahụhụ ndị ọzọ na-eme ka ndị ọrụ ugbo, na-azụ ma na-akọ “ùkwù” ero. E kenyewo ọtụtụ ihe ndị ọzọ e kere eke ikike iji amamihe ha bu pụta ụwa na-eme ihe ndị dị ịrịba ama. Ijiji nkịtị na-atụgharị n’ikuku n’ụzọ ụgbọelu ndị kasị bụrụ ọkpọka, ndị mmadụ mere, na-apụghị ịtụgharị. Nnụnụ ndị na-esi n’otu akụkụ nke ụwa efega n’akụkụ ọzọ na-adabere na kpakpando, ikike ndọda nke si n’ala, ma ọ bụ ihe yiri map nke e kenyere ha n’ime. Ndị ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ na-etinye ọtụtụ afọ n’ịmụ banyere omume ndị dị mgbagwoju anya e kenyeworo n’ime ihe ndị a e kere eke. Lezienụ otú Chineke, bụ́ Onye kenyere ha n’ime ha, na-aghaghị isiworị nwee amamihe!

14 Ndị ọkà mmụta sayensị amụtawo ihe dị ukwuu site n’amamihe Jehova ji kee ihe. E nwere ọbụna ngalaba ihe ọmụmụ ọrụ  injinia a na-akpọ nkà nṅomi ihe ndị dị ndụ, bụ́ nke na-anwa iṅomi ọdịdị ndị a na-ahụ n’ihe ndị e kere eke. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịnọwo na-ele anya ná mgbagwoju anya n’ịma mma nke ọnyà ududo. Ma onye injinia na-ewere ya dị ka ọrụ nkà dị ebube. Ụfọdụ n’ime eriri ya ndị yiri ka ha esighị ike siri nnọọ ike karịa ígwè ma i jiri ha tụnyere ígwè ha otú ahụ, sie ike karịa eriri ndị e ji kpaa uwe ndị mgbọ na-apụghị ịtụpu. Olee nnọọ otú o siruru n’ike? Cheedị echiche banyere ọnyà ududo e mere ka ọ saa mbara ma gbaa okpotokpo ruo mgbe ọ hazi ka ụgbụ e ji egbu azụ̀ n’ụgbọ mmiri. Ọnyà ududo dị otú ahụ pụrụ ijide ụgbọelu na-efe efe! Ee, ọ bụ “n’amamihe” ka Jehova meworo ihe nile dị otú ahụ.

Ònye nyere ụmụ anụmanụ amamihe n’ụdị nke ha?

Amamihe Na-abụghị Nanị n’Ụwa

15, 16. (a) Olee otú mbara ígwé nke jupụtara na kpakpando si na-enye ihe àmà nke amamihe Jehova? (b) Olee otú ọkwá Jehova dị ka Ọchịagha Kasịnụ nke na-achị ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị mmụọ ozi si na-enye ihe àmà nke amamihe nke Onye Ọchịchị a?

15 Amamihe Jehova na-apụta ìhè n’ọrụ ya ndị dị n’eluigwe na ala dum. Mbara ígwé nke jupụtara na kpakpando, bụ́ nke anyị tụlere n’ụzọ satụrụ mbara n’Isi nke 5, adịsasịghị aghara aghara. N’ihi amamihe dị “n’iwu ndị na-achịkwa mbara igwe” bụ́ ndị Jehova nyere, a haziri kpakpando ndị dị na mbara ígwé n’ụzọ magburu onwe ya n’ụyọkọ n’ụyọkọ, a hazikwara ụyọkọ ndị a n’ìgwè dị iche iche ndị jikọtakwara ọnụ n’aka nke ha wee ghọọ nnukwute ìgwè ụyọkọ dị iche iche. (Job 38:33, The New Jerusalem Bible) Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji ezo aka n’ihe ndị dị n’eluigwe dị ka “usuu”! (Aịsaịa 40:26) Otú ọ dị, e nwere usuu ọzọ nke na-egosipụta amamihe Jehova ọbụna n’ụzọ pụtara ìhè karị.

16 Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 4, Chineke nwere utu aha bụ́ “Jehova nke usuu nile nke ndị agha” n’ihi ọkwá ya dị ka Ọchịagha Kasịnụ nke usuu bara ụba nke ndị mmụọ e kere eke dị nde kwuru nde. Nke a bụ ihe àmà nke ike Jehova. Otú ọ dị,  olee otú amamihe ya si bata na ya? Cheedị echiche: O nwetụghị mgbe Jehova na Jizọs na-anọ nkịtị. (Jọn 5:17) Ya mere, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na ndị mmụọ ozi na-ejere Onye Kasị Ihe Nile Elu ozi na-eji ọrụ n’aka mgbe nile n’otu aka ahụ. Chetakwa na ha karịrị ụmụ mmadụ, ha nwekwara amamihe na ike karịrị nke mmadụ. (Ndị Hibru 1:7; 2:7) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova emewo ka ndị mmụọ ozi ahụ na-arụ ọrụ mgbe nile, jiri obi ụtọ na-arụ ọrụ na-eweta afọ ojuju—“na-eme okwu Ya” ma “na-eme ihe na-atọ Ya ụtọ”—eri ọtụtụ ijeri afọ. (Abụ Ọma 103:20, 21) Lee otú amamihe nke Onye Ọchịchị a na-aghaghị isi na-anwụ ibobo n’ahụ́!

Ọ Bụ ‘Nanị Jehova Maara Ihe’

17, 18. N’ihi gịnị ka Bible ji kwuo na ọ bụ ‘nanị Jehova maara ihe,’ n’ihi gịnịkwa ka amamihe ya kwesịrị iji mee ka ibobo nwụọ anyị n’ahụ́?

17 N’ihi ihe àmà dị otú ahụ, ọ̀ bụ ihe ijuanya na Bible na-ekwu na amamihe Jehova kasị elu? Dị ka ihe atụ, ọ na-ekwu na ọ bụ ‘nanị Jehova maara ihe.’ (Ndị Rom 16:27) Ọ bụ nanị Jehova nwere amamihe n’echiche kasịnụ. Ọ bụ isi iyi nke ezi amamihe nile. (Ilu 2:6) Ọ bụ ya mere na Jizọs adabereghị n’amamihe nke ya, ọ bụ ezie na ọ bụ ya bụ onye kasị mara ihe n’ime ihe nile Jehova kere, kama o kwuru ihe Nna ya gwara ya ka o kwuo.—Jọn 12:48-50.

18 Rịba ama otú Pọl onyeozi si kọwaa ịpụ iche nke amamihe Jehova: “Lee ịdị omimi nke akụ̀ na amamihe na ihe ọmụma nke Chineke! Lee otú ikpe ya si bụrụ ndị a na-apụghị inyochapụta enyochapụta na otú ụzọ ya si bụrụ ndị a na-apụghị ịchọpụta achọpụta!” (Ndị Rom 11:33) Site n’iji okwu iti mkpu bụ́ “Lee,” meghee amaokwu a, Pọl gosipụtara oké mmetụta o nwere—n’ebe a, egwu nsọpụrụ dị omimi. Okwu Grik ọ họọrọ iji mee ihe maka “ịdị omimi” na okwu e ji eme ihe maka “abis” nwere njikọ chiri anya. N’ihi ya, okwu ya na-akpali mmadụ iji anya nke uche ya na-ese onyinyo doro anya. Mgbe anyị na-atụgharị uche n’amamihe Jehova, ọ na-adị ka à ga-asị na anyị na-enyobanye anya n’olulu nke na-enweghị nsọtụ, nke na-enweghị njedebe, ógbè miri nnọọ emi, nke sara nnọọ mbara  nke na ọ dịghị mgbe anyị ga-enwe ike ịghọta otú o bururu n’ibu, ka ọ fọdụzie ịkọwa ya ma ọ bụ isepụta ya nke ọma. (Abụ Ọma 92:5) Nke ahụ ọ́ bụghị echiche na-eme ka mmadụ wetuo onwe ya ala?

19, 20. (a) N’ihi gịnị ka ugo ji bụrụ ihe nnọchiteanya kwesịrị ekwesị nke amamihe Chineke? (b) Olee otú Jehova siworo gosipụta ikike o nwere inyobanye anya n’ọdịnihu?

19 Ọ bụ ‘nanị Jehova maara ihe’ n’echiche ọzọ: Ọ bụ nanị ya nwere ike inyobanye anya n’ọdịnihu. Cheta na Jehova ji ugo nke na-ahụ ihe dị n’ebe dị anya nọchite anya amamihe Ya. Ugo nke na-acha odo odo pụrụ ịdị nanị kilogram ise n’ịdị arọ, ma anya ya na-ebu ibu karịa anya nwoke toruworo ogo mmadụ. Anya ugo na-ahụ nnọọ ụzọ n’ụzọ na-eju anya, na-eme ka nnụnụ ahụ nwee ike ịnọ ọtụtụ narị mita, ma eleghị anya ọbụna ọtụtụ kilomita n’elu hụ obere ihe ọ chọrọ iburu! Jehova n’onwe ya kwuru n’otu oge banyere ugo, sị: “Anya ya abụọ na-esi n’ebe dị anya legide ya.” (Job 39:29) N’echiche yiri nke ahụ, Jehova pụrụ ilepụ anya n’oge “dị anya”—n’ọdịnihu!

20 Bible jupụtara n’ihe àmà ndị na-egosi na nke a bụ eziokwu. Ọtụtụ narị amụma, ma ọ bụ akụkọ ihe mere eme e dere tupu ha emee, dị n’ime ya. N’ime Bible, e buru amụma banyere ihe ndị ga-esi n’agha dị iche iche pụta, banyere mbili na ọdịda nke ike ụwa dị iche iche, na ọbụna banyere atụmatụ agha ndị  ọchịagha ga-eji mee ihe kpọmkwem—mgbe ụfọdụ, ọtụtụ narị afọ tupu ha emee.—Aịsaịa 44:25–45:4; Daniel 8:2-8, 20-22.

21, 22. (a) N’ihi gịnị ka a na-enweghị ihe mgbakwasị ụkwụ ọ bụla iji kwubie na Jehova ebuwo ụzọ hụ mkpebi nile ị ga-eme ná ndụ? Nye ihe atụ. (b) Olee otú anyị si mara na amamihe Jehova abụghị nke obi tara mmiri ma ọ bụ nke ịhụnanya na-adịghị na ya?

21 Otú ọ dị, nke a ọ̀ pụtara na Chineke eburularị ụzọ hụ mkpebi ndị ị ga-eme ná ndụ? Ụfọdụ ndị na-ekwusa banyere ozizi akara aka na-ekwusi ike na azịza ya bụ ee. Otú ọ dị, echiche ahụ n’ezie na-ewetu amamihe Jehova ala, n’ihi na ọ pụtara na Chineke apụghị ịchịkwa ikike o nwere ilenye anya n’ọdịnihu. Iji maa atụ: Ọ bụrụ na i nwere olu mara nnọọ mma iji gụọ egwú, ọ̀ pụtara na ọ bụ nanị egwú ka ị ga na-agụ mgbe nile? Ezi uche adịghị na nke ahụ! N’otu aka ahụ, Jehova nwere ikike nke ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu tupu o mee, ma ọ dịghị eji ya eme ihe mgbe nile. Ime otú ahụ pụrụ imegide ikike ime nhọrọ anyị nwere, bụ́ onyinye dị oké ọnụ ahịa Jehova na-agaghị anapụ anyị ma ọlị.—Deuterọnọmi 30:19, 20.

22 Nke kadị njọ bụ na ozizi banyere akara aka na-enye echiche na obi tara amamihe Jehova mmiri, na ịhụnanya, ebere, ma ọ bụ ọmịiko adịghị na ya. Ma nke ahụ abụghị eziokwu ma ọlị! Bible na-akụzi na Jehova “nwere obi nke maara ihe.” (Job 9:4, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ọ bụghị na o nwere obi nkịtị, kama Bible na-ejikarị okwu ahụ eme ihe n’ihe banyere ụdị onye mmadụ bụ n’ime, bụ́ nke na-agụnye mkpali na mmetụta, ndị dị ka ịhụnanya. Ya mere, amamihe Jehova, dịkwa ka àgwà ya ndị ọzọ, bụ nke ịhụnanya na-achịkwa.—1 Jọn 4:8.

23. Ịdị elu nke amamihe Jehova kwesịrị ịkpali anyị ime gịnị?

23 Dị ka o kwesịrị ịdị, amamihe Jehova bụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi n’ụzọ zuru ezu. Ọ karịrị nnọọ amamihe nke anyị nke na Okwu Chineke ji ịhụnanya na-agba anyị ume, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.” (Ilu 3:5, 6) Ugbu a, ka anyị leba anya n’amamihe Jehova ka anyị wee nwee ike ịbịarukwu Chineke anyị nke kasị mara ihe nso.