Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 16

‘Na-eme Ihe n’Ikpe Ziri Ezi’ n’Iso Chineke Na-eje Ije

‘Na-eme Ihe n’Ikpe Ziri Ezi’ n’Iso Chineke Na-eje Ije

1-3. (a) Gịnị mere anyị ji jiri Jehova ụgwọ ekele? (b) Gịnị ka Onye Nnapụta anyị na-ahụ n’anya na-achọ n’aka anyị maka nnapụta ọ napụtara anyị?

KA E were ya na ị tọrọ atọ n’ime ụgbọ mmiri na-ekpu ekpu. N’oge ahụ nnọọ i chere na olileanya adịkwaghị, otu onye na-azọpụta ndị mmadụ abịa dọpụta gị gaa n’ebe na-adịghị ize ndụ. Lee otú obi ga-esi ruo gị ala ka onye ahụ zọpụtara gị kpọ gị si n’ebe ahụ dị ize ndụ na-apụ wee sị gị: “Ọ dịghịzi ihe ga-eme gị”! Ị́ gaghị ewere ya na i ji onye ahụ ụgwọ ekele? N’ezie, ọ bụ ya mere ka ị dị ndụ.

2 N’ụzọ ụfọdụ, nke a bụ ihe atụ nke ihe Jehova mewooro anyị. N’ezie, anyị ji ya ụgwọ ekele. E kwuwerị, o nyere ihe mgbapụta ahụ, wee mee ka o kwe mee ịnapụta anyị n’aka ọjọọ mmehie na ọnwụ ji anyị. Anyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị na-anọghị n’ihe ize ndụ ebe anyị maara na ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-egosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ dị oké ọnụ ahịa, na a na-agbaghara anyị mmehie anyị, na ọdịnihu ebighị ebi anyị bụkwa nke e ji n’aka. (1 Jọn 1:7; 4:9) Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 14, ihe mgbapụta ahụ bụ ngosipụta kasịnụ nke ịhụnanya Jehova na ikpe ziri ezi ya. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume?

3 O kwesịrị ekwesị ka anyị chee echiche ihe Onye Nnapụta anyị nke na-ahụ n’anya n’onwe ya na-achọ n’aka anyị maka nnapụta ọ napụtara anyị. Jehova na-ekwu site n’ọnụ Maịka onye amụma, sị: “Gị mmadụ, O gosiwo gị ihe dị mma; ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị [ikpe ikpe ziri ezi, NW], na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” (Maịka 6:8) Rịba ama na otu n’ime ihe ndị Jehova na-achọ n’aka anyị maka nnapụta ọ napụtara anyị bụ ka anyị ‘na-ekpe ikpe ziri ezi.’ Olee otú anyị pụrụ isi mee otú ahụ?

 Ịchụso “Ezi Omume”

4. Olee otú anyị si mara na Jehova na-atụ anya n’aka anyị ka anyị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume ya?

4 Jehova na-atụ anya n’aka anyị ka anyị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya nke ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. Ebe ọ bụ na ụkpụrụ ya ziri ezi, bụrụkwa nke ezi omume, anyị na-achụso ikpe ziri ezi na ezi omume mgbe anyị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ha. “Mụtanụ ime ezi ihe; chọọnụ ikpe ziri ezi,” ka Aịsaịa 1:17 na-ekwu. Okwu Chineke na-agba anyị ume ‘ịchọ ezi omume.’ (Zefanaịa 2:3) Ọ na-agbakwa anyị ume ‘iyikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume.’ (Ndị Efesọs 4:24) Ezigbo ezi omume—ezigbo ikpe ziri ezi—na-akagbu ime ihe ike, adịghị ọcha, na omume rụrụ arụ, n’ihi na ihe ndị a na-emerụ ihe dị nsọ.—Abụ Ọma 11:5; Ndị Efesọs 5:3-5.

5, 6. (a) N’ihi gịnị ka ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Jehova na-ejighị bụụrụ anyị ibu arọ? (b) Olee otú Bible si egosi na ịchụso ezi omume bụ ihe a na-anọgide na-eme?

5 Ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Jehova ọ̀ bụụrụ anyị ibu arọ? Ee e. Obi nke a dọtara n’ebe Jehova nọ adịghị ele ihe ndị Ọ chọrọ anya dị ka ibu arọ. N’ihi na anyị hụrụ Chineke anyị n’anya, nweekwa mmasị n’ụdị onye ọ bụ, anyị chọrọ ibi ndụ n’ụzọ na-atọ ya ụtọ. (1 Jọn 5:3) Cheta na Jehova ‘hụrụ ezi omume n’anya.’ (Abụ Ọma 11:7) Ọ bụrụ na anyị ga-eṅomi ikpe ziri ezi, ma ọ bụ ezi omume nke Chineke n’ezie, anyị aghaghị ịhụ ihe ndị Jehova hụrụ n’anya n’anya ma kpọọ ihe ndị ọ kpọrọ asị asị.—Abụ Ọma 97:10.

6 Ọ dịghịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mfe ịchụso ezi omume. Anyị aghaghị iyipụ ụdị mmadụ ochie ahụ ya na omume mmehie ya dị iche iche ma yikwasị nke ọhụrụ. Bible na-ekwu na ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ nke a “na-eme ka ọ dị ọhụrụ” site n’ezi ihe ọmụma. (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Okwu bụ́ a “na-eme ka ọ dị ọhụrụ” na-egosi na iyikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ ihe a na-anọgide na-eme, ihe chọrọ mgbalị siri ike. Otú ọ sọkwara anyị gbalisie ike ime ihe ziri ezi, e nwere oge mgbe ọdịdị ime mmehie anyị na-eme ka anyị sụọ ngọngọ n’echiche, n’okwu, ma ọ bụ n’omume.—Ndị Rom 7:14-20; Jems 3:2.

7. Olee otú anyị kwesịrị isi lee oge ndị anyị dara ada ná mgbalị anyị na-eme ịchụso ezi omume anya?

 7 Olee otú anyị kwesịrị isi lee oge ndị anyị dara ada ná mgbalị anyị na-eme ịchụso ezi omume anya? N’ezie, anyị ekwesịghị iwetulata ịdị njọ nke mmehie. N’otu oge ahụ, anyị ekwesịghị inwe ịda mbà n’obi ma ọlị, na-eche na mmehie anyị na-eme ka anyị bụrụ ndị na-erughị eru ijere Jehova ozi. Chineke anyị nke na-eme amara emewo ndokwa ka ndị nwere ezi nchegharị nwetaghachi ihu ọma ya. Chebara okwu ndị na-eme ka obi sie mmadụ ike echiche bụ́ ndị ndị Jọn onyeozi kwuru: “M na-edetara unu ihe ndị a ka unu wee ghara ime mmehie.” Ma ọ gbakwụnyekwara ihe bụ́ nnọọ eziokwu, sị: “Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie [n’ihi ezughị okè e ketara eketa], anyị nwere onye inyeaka nọ n’ebe Nna ahụ nọ, bụ́ Jizọs Kraịst.” (1 Jọn 2:1) Ee, Jehova enyewo àjà mgbapụta nke Jizọs ka anyị wee nwee ike ijere Ya ozi n’ụzọ ọ na-anakwere n’agbanyeghị ọdịdị anyị nke ime mmehie. Nke ahụ ọ́ dịghị akpali anyị ịchọ ime ihe nile anyị nwere ike ime iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ?

Ozi Ọma ahụ na Ikpe Ziri Ezi nke Chineke

8, 9. Olee otú mkpọsa nke ozi ọma ahụ si egosi ikpe ziri ezi nke Jehova?

8 Anyị pụrụ ikpe ikpe ziri ezi—n’ezie, iṅomi ikpe ziri ezi nke Chineke—site n’ikere òkè zuru ezu n’ikwusara ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke. Olee ihe jikọrọ ikpe ziri ezi Jehova na ozi ọma?

9 Jehova agaghị ebibi ajọ usoro ihe a n’ebughị ụzọ mee ka e nye ịdọ aka ná ntị. N’amụma ya banyere ihe ga-ewere ọnọdụ n’oge ọgwụgwụ, Jizọs sịrị: “A ghaghị ibu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ ná mba nile.” (Mak 13:10; Matiu 24:3) Ojiji e ji okwu bụ́ “ibu ụzọ” mee ihe na-egosi na ihe ndị ọzọ ga-ewere ọnọdụ mgbe a rụsịworo ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ. Ihe ndị ahụ na-agụnye oké mkpagbu ahụ e buru n’amụma, nke ga-ewetara ndị ajọ omume mbibi ma dozie ụzọ maka ụwa ọhụrụ ezi omume. (Matiu 24:14, 21, 22) N’ezie, ọ dịghị onye pụrụ ibo Jehova ebubo n’ụzọ ziri ezi na o kpere ndị ajọ omume ikpe na-ezighị ezi. Site n’ime ka e nye ịdọ aka ná ntị, ọ na-enye ndị  dị otú ahụ ohere zuru ezu ịgbanwe ụzọ ndụ ha ma si otú ahụ gbanahụ mbibi.—Jona 3:1-10.

Anyị na-egosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke mgbe anyị na-ezisara ndị ọzọ ozi ọma ahụ n’eleghị mmadụ anya n’ihu

10, 11. Olee otú anyị ikere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ si egosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke?

10 Olee otú anyị ikwusa ozi ọma si egosi ikpe ziri ezi nke Chineke? Nke mbụ, ọ bụ nnọọ ihe ziri ezi ka anyị mee ihe nile anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka inweta nzọpụta. Tụleghachi ihe atụ ahụ nke ịbụ onye a napụtara n’ụgbọ mmiri na-ekpu ekpu. Ebe ị nọ n’ebe na-adịghị ize ndụ n’ime ụgbọ epeepe e ji azọpụta ndị mmadụ, n’ezie ị ga-achọ inyere ndị ọzọ ka nọ n’ime mmiri aka. N’otu aka ahụ, anyị nwere ọrụ dịịrị anyị n’ebe ndị ka na-agba lịka lịka n’ime “mmiri” nke ajọ ụwa a nọ. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ na-ajụ ozi anyị. Ma ọ bụrụhaala na Jehova anọgide na-enwe ndidi, anyị nwere ibu ọrụ nke ime ka ha nwee ohere ‘iru nchegharị’ wee bụrụ ndị a ga-azọpụta.—2 Pita 3:9.

11 Site n’ikwusara ndị nile anyị na-ezute ozi ọma, anyị na-egosipụta ikpe ziri ezi n’ụzọ ọzọ dị mkpa: Anyị na-egosi eleghị mmadụ anya n’ihu. Cheta na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ọ bụrụ na anyị ga-eṅomi ikpe ziri ezi Ya, anyị agaghị ebu ụzọ kpebie ihe ndị mmadụ ga-abụ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ikwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ n’agbanyeghị agbụrụ ha si na ya, ọkwá ha, ma ọ bụ otú ha nweruru ego. N’ụzọ dị otú a, anyị na-enye ndị nile ga-ege ntị ohere ịnụ na ịnakwere ozi ọma ahụ.—Ndị Rom 10:11-13.

Otú Anyị Si Emeso Ndị Ọzọ

12, 13. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji dị ngwa n’ikpe ndị ọzọ ikpe? (b) Gịnị ka ndụmọdụ Jizọs nke bụ́ “kwụsịnụ ikpe ikpe” na “kwụsịkwanụ ịma ikpe” pụtara? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.)

12 Anyị pụkwara ime ihe n’ikpe ziri ezi site n’imeso ndị ọzọ otú Jehova si emeso anyị. Ọ na-adịkwa nnọọ mfe ịdị na-ekpe ndị ọzọ ikpe, na-akatọ mmejọ ha na ịdị na-enyo ebumnobi ha enyo. Ma ònye n’ime anyị ga-achọ ka Jehova na-atụchasị ebumnobi anyị na mmejọ anyị n’emeghị ebere ọ bụla? Ọ bụghị otú ahụ ka Jehova si emeso anyị. Onye ọbụ abụ ahụ  kwuru, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Ja, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Ọ̀ bụ na anyị enweghị obi ụtọ na Chineke anyị nke na-ekpe ikpe ziri ezi, onye nwekwara obi ebere kpebiri na ya agaghị na-elekwasị anya ná mmejọ anyị? (Abụ Ọma 103:8-10) Ya bụrụ otú ahụ, olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ?

13 Ọ bụrụ na anyị aghọta obi ebere nke dị n’ikpe ziri ezi Chineke, anyị agaghị adị ngwa n’ikpe ndị ọzọ ikpe n’okwu ndị na-agbasachaghị anyị ma ọ bụ ndị na-adịchaghị mkpa. N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe ka e wee ghara ikpe unu ikpe.” (Matiu 7:1) Dị ka ihe ndekọ Luk si kwuo, Jizọs kwukwara, sị: “Kwụsịkwanụ ịma ikpe, a gaghịkwa ama unu ikpe ma ọlị.” * (Luk 6:37) Jizọs gosiri na ọ maara na ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ekpekarị ndị ọzọ ikpe. Onye ọ bụla na-ege ya ntị nke nwere àgwà ikpe ndị ọzọ ikpe n’obi ọjọọ ga-akwụsị ya.

14. N’ihi ihe ndị dịgasị aṅaa ka anyị na-aghaghị ‘ịkwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe’?

14 N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji ‘kwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe’? Otu ihe bụ na a kpaara ikike anyị nwere ókè. Jems onye na-eso ụzọ na-echetara anyị, sị: “E nwere otu onye nke bụ onye na-enye iwu na onyeikpe”—Jehova. Ya mere Jems jụrụ kpọmkwem, sị: “Ònye ka ị bụ na ị ga na-ekpe onye agbata obi gị ikpe?” (Jems 4:12; Ndị Rom 14:1-4) Tụkwasị na nke a, ọdịdị anyị nke ime mmehie pụrụ ime n’ụzọ dị mfe ka anyị na-ekpe ikpe na-ezighị ezi. Ọtụtụ àgwà na ebumnobi—gụnyere ajọ mbunobi, iwe iwe n’ihi ịbụ onye e mejọrọ, ekworo, na ịbụ onye ezi omume n’anya onwe onye—pụrụ ime ka ụzọ anyị si ele ụmụ mmadụ ibe anyị anya gbagọọ agbagọọ. Anyị nwekwara adịghị ike ndị ọzọ, ịtụgharị uche na ha kwesịkwara  igbochi anyị ịdị ngwa n’ịhụta mmejọ nke ndị ọzọ. Anyị apụghị ịchọpụta ihe dị mmadụ n’obi; anyị apụghịkwa ịmata ọnọdụ nile banyere ndị ọzọ. Mgbe ahụ, ònye ka anyị bụ ikwu na ndị kwere ekwe ibe anyị bu ihe na-adịghị mma n’obi ma ọ bụ ịkatọ mgbalị ha na-eme n’ozi Chineke? Lee ka o si ka mma iṅomi Jehova site n’ile anya n’akụkụ ụmụnna anyị na-eme nke ọma kama ilekwasị anya ná mmejọ ha!

15. Okwu na mmeso dị aṅaa ka a na-adịghị anabata n’etiti ndị na-efe Chineke, n’ihi gịnịkwa?

15 Olee banyere ndị òtù ezinụlọ anyị? N’ụzọ dị mwute, n’ime ụwa taa, a na-ekpe ụfọdụ n’ime ikpe kasị jọgbuo onwe ha n’ebe kwesịrị ịbụ ebe udo jupụtara—ebe obibi. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịnụ banyere ndị di, ndị nwunye, ma ọ bụ ndị nne na nna na-agwakasị ndị ezinụlọ ha ahụ́ ma ọ bụ na-eti ha ihe mgbe nile. Ma a dịghị anabata okwu ọjọọ, okwu na-afụ ụfụ n’ahụ́, na iti ihe n’etiti ndị na-efe Chineke. (Ndị Efesọs  4:29, 31; 5:33; 6:4) Ndụmọdụ Jizọs nke bụ́ “kwụsịnụ ikpe ikpe” na “kwụsịkwanụ ịma ikpe” adịghị akwụsị ịdị irè mgbe anyị nọ n’ebe obibi anyị. Cheta na ikpe ikpe ziri ezi na-agụnye imeso ndị ọzọ otú Jehova si emeso anyị. Ọ dịghịkwa mgbe Chineke anyị na-eji aka ike ma ọ bụ obi ọjọọ na-emeso anyị ihe. Kama nke ahụ, o “nwere mmetụta dị nnọọ nro” n’ebe ndị hụrụ ya n’anya nọ. (Jems 5:11) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya anyị kwesịrị iṅomi nke ahụ bụ!

Ndị Okenye Bụ́ Ndị Na-eje Ozi “n’Ikpe Ziri Ezi”

16, 17. (a) Gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka ndị okenye? (b) Gịnị ka a na-aghaghị ime mgbe onye mmehie na-egosighị ezi nchegharị, n’ihi gịnịkwa?

16 Ọ bụ ọrụ anyị nile ikpe ikpe ziri ezi, ma ọ bụ ọrụ ndị okenye nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst karịsịa ma a bịa n’akụkụ a. Rịba ama otú e si kọwaa “ndị isi,” ma ọ bụ ndị okenye n’ụzọ amụma, dị ka Aịzaịa si dekọọ ya: “Lee, n’ezi omume ka otu eze ga-abụ eze, ndị isi kwa, n’ikpe ziri ezi ka ha ga-abụ ndị isi.” (Aịsaịa 32:1) Ee, Jehova na-atụ anya ka ndị okenye na-eje ozi iji na-akwalite ikpe ziri ezi. Olee otú ha pụrụ isi mee nke a?

17 Ndị ikom a ruru eru n’ụzọ ime mmụọ maara nke ọma na ikpe ziri ezi, ma ọ bụ ezi omume, chọrọ ka a na-edebe ọgbakọ ọcha. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ iwu na ndị okenye aghaghị ikpe ikpe metụtara ime mmehie ndị dị oké njọ. Mgbe ha na-eme otú ahụ, ha na-echeta na ikpe ziri ezi nke Chineke na-achọ ụzọ isi mee ebere ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume ma ọlị. N’ihi ya, ha na-agbalị inyere onye mmehie aka inwe nchegharị. Ma gịnị ma ọ bụrụ na onye mmehie ahụ egosighị ezi nchegharị n’agbanyeghị mgbalị ndị dị otú ahụ e mere iji nyere ya aka? N’ikpe ziri nnọọ ezi, Okwu Jehova na-enye ntụziaka ka e mee ihe siri ike: “Wepụnụ onye ọjọọ ahụ n’etiti onwe unu.” Nke ahụ pụtara ịchụpụ ya n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 5:11-13; 2 Jọn 9-11) Ọ na-ewute ndị okenye ime otú ahụ, ma ha maara na ọ dị mkpa iji chebe ịdị ọcha ime mmụọ na nke omume nke ọgbakọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-enwe olileanya na otu ụbọchị, onye mmehie ahụ ga-aghọta onwe ya ma laghachite n’ọgbakọ.—Luk 15:17, 18.

18. Gịnị ka ndị okenye na-eburu n’uche mgbe ha na-enye ndị ọzọ ndụmọdụ dabeere na Bible?

 18 Ije ozi iji na-akwalite ikpe ziri ezi na-agụnyekwa inye ndụmọdụ dabeere na Bible mgbe ọ dị mkpa. Otú ọ dị, ndị okenye adịghị achọ inyochata mmejọ nke ndị ọzọ. Ha adịghịkwa achọ iji ohere ọ bụla enye mgbazi. Ma onye kwere ekwe ibe ha pụrụ ‘ịzọhie ụkwụ tupu ya amara banyere ya.’ Icheta na ikpe ziri ezi nke Chineke adịghị obi ọjọọ na ọ bụghịkwa nke obi tara mmiri ga-akwali ndị okenye ịgbalị “ịgbazigharị onye dị otú ahụ na mmụọ nke ịdị nwayọọ.” (Ndị Galeshia 6:1) N’ihi ya, ndị okenye agaghị abara onye mehierenụ mba ma ọ bụ gwa ya okwu ọjọọ. Kama nke ahụ, ndụmọdụ e ji ịhụnanya nye na-agba onye a na-enye ya ume. Ọbụna mgbe ha na-adọ aka ná ntị banyere otu omume kpọmkwem—na-ekwupụta hoo haa ihe ndị na-esi n’otu omume nke amamihe na-adịghị na ya apụta—ndị okenye na-eburu n’uche na onye kwere ekwe ibe ha nke mehieworonụ bụ atụrụ nke so n’ìgwè atụrụ Jehova. * (Luk 15:7) Mgbe o doro anya na ihe kpaliri ndụmọdụ ma ọ bụ ịba mba bụ ịhụnanya, mgbe e jikwa ịhụnanya mee ya, o yikarịrị ka ọ̀ ga-agbazi onye ahụ mehierenụ.

19. Mkpebi dịgasị aṅaa ka a na-achọ ka ndị okenye mee, ọ bụkwa na gịnị ka ha na-aghaghị ime ka mkpebi ha dabere?

19 Ọtụtụ mgbe, ndị okenye aghaghị ime mkpebi ndị na-emetụta ndị kwere ekwe ibe ha. Dị ka ihe atụ, site n’oge ruo n’oge ndị okenye na-ezukọ iji tụlee ma ụmụnna nwoke ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ hà ruru eru ka a tụọ aro ka a họpụta ha ịbụ ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi. Ndị okenye maara mkpa ọ dị ịbụ ndị na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu. Ha na-ekwe ka ihe ndị Chineke chọrọ iji ruo eru maka nhọpụta ndị dị otú ahụ duzie ha mgbe ha na-eme mkpebi, ha adịghị adabere n’echiche nkịtị nke ha. N’ụzọ dị otú a ha na-eme ihe  “n’ebughị ụzọ mee mkpebi na ha, ghara ịdị na-eme ihe ọ bụla dị ka echiche hiere ụzọ si dị.”—1 Timoti 5:21.

20, 21. (a) Olee ihe ndị okenye na-agbalịsi ike ịbụ, n’ihi gịnịkwa? (b) Gịnị ka ndị okenye pụrụ ime iji nyere “mkpụrụ obi ndị dara mbà” aka?

20 Ndị okenye na-ekpe ikpe ziri ezi Chineke n’ụzọ ndị ọzọkwa. Mgbe o busịrị amụma na ndị okenye ga-eje ozi “n’ikpe ziri ezi,” Aịzaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Otu onye ga-adịkwa ka ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” (Aịsaịa 32:2) Ya mere, ndị okenye na-agbalị ịbụ ndị na-enye ndị ha na ha na-efekọ ofufe nkasi obi na ume ọhụrụ.

21 Taa, n’ihi nsogbu nile na-ewetakarị nkụda mmụọ, agbamume dị ọtụtụ ndị mkpa. Ndị okenye, olee ihe unu pụrụ ime iji nyere “mkpụrụ obi ndị dara mbà” aka? (1 Ndị Tesalonaịka  5:14) Jiri mmetụta ọmịiko gee ha ntị. (Jems 1:19) Ọ pụrụ ịbụ na ọ dị ha mkpa ịkọrọ onye ha pụrụ ịtụkwasị obi “nchegbu” ha. (Ilu 12:25) Mesie ha obi ike na Jehova nakwa ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị chọrọ ha, jiri ha kpọrọ ihe, ma hụ ha n’anya. (1 Pita 1:22; 5:6, 7) Ọzọkwa, gị na ndị dị otú ahụ pụrụ ikpekọ ekpere, ị pụkwara ikpe ekpere maka ha. Ịnụ ka onye okenye na-ekpe ekpere si n’ala ala obi maka ha pụrụ ịbụ ihe na-enye nnukwute nkasi obi. (Jems 5:14, 15) Chineke nke ikpe ziri ezi ga-arịba mgbalị i ji ịhụnanya na-eme iji nyere ndị dara mbà n’obi aka ama.

Ndị okenye na-egosipụta ikpe ziri ezi Jehova mgbe ha na-agba ndị dara mbà n’obi ume

22. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi ṅomie ikpe ziri ezi Jehova, gịnịkwa ga-esi na ya pụta?

22 N’ezie, anyị na-abịarukwu Jehova nso site n’iṅomi ikpe ziri ezi ya! Mgbe anyị na-agbasosi ụkpụrụ ezi omume ya ike, mgbe anyị na-ezisara ndị ọzọ ozi ọma ahụ nke na-azọpụta ndụ, nakwa mgbe anyị kpebiri ilekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma kama ịhụta mmejọ ha, anyị na-egosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke. Ndị okenye, mgbe unu na-echebe ịdị ọcha nke ọgbakọ, mgbe unu na-enye ndụmọdụ na-ewuli elu nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, mgbe unu na-eme mkpebi n’eleghị mmadụ anya n’ihu, na mgbe unu na-agba ndị dara mbà n’obi ume, unu na-egosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke. Lee ka ọ na-aghaghị isi na-atọ Jehova ụtọ isi n’eluigwe ledata anya ma hụ ka ndị ya na-eme ike ha nile “ikpe ikpe ziri ezi” n’iso Chineke ha na-eje ije!

^ par. 13 Nsụgharị ụfọdụ na-asị “unu ekpela ikpe” na “unu amakwala ikpe.” Nsụgharị ndị dị otú ahụ na-enye echiche bụ́ “unu amalitela ikpe ikpe amalite” na “unu amalitela ịma ikpe amalite.” Otú ọ dị, ndị dere akụkụ Bible a ji okwu na-enye iwu ka a ghara ime ihe mee ihe n’ebe a, bụ́ okwu ndị na-egosi ihe nọ na-eme na-aga n’ihu. N’ihi ya, ihe ndị ahụ a kọwara nọ na-eme na-aga n’ihu ma ha aghaghị ịkwụsị.

^ par. 18 Na 2 Timoti 4:2, Bible na-ekwu na mgbe ụfọdụ, ndị okenye aghaghị ‘ịdọ aka ná ntị, ịba mba, ịgba ume.’ Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “gbaa ume” bụ pa·ra·ka·leʹo. Okwu Grik yiri ya, bụ́ pa·raʹkle·tos, pụrụ izo aka n’onye na-ekpechitere mmadụ ọnụ ya n’okwu ikpe. N’ihi ya, ọbụna mgbe ndị okenye na-enye mmadụ ịdọ aka ná ntị siri ike, ha ga-abụ ndị na-enyere ndị enyemaka ime mmụọ dị mkpa aka.