Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 15

Jizọs ‘Edoo Ikpe Ziri Ezi n’Ụwa’

Jizọs ‘Edoo Ikpe Ziri Ezi n’Ụwa’

1, 2. N’oge dị aṅaa ka iwe were Jizọs, n’ihi gịnịkwa?

A PỤRỤ ịhụ na ezigbo iwe ji Jizọs—e nwekwara ezi ihe kpatara ya. Ọ pụrụ isiri gị ike ichetụ n’echiche na ọ ga-eme otú ahụ, n’ihi na ọ bụ nwoke dị nnọọ nwayọọ n’obi. (Matiu 21:5) Otú ọ dị, o nwere njide onwe onye zuru okè, n’ihi na iwe ya bụ nke ezi omume. * Ma, olee ihe kpasuru nwoke a hụrụ udo n’anya iwe otú a? Ọ bụ ikpe na-ezighị ezi jọgburu onwe ya e kpere.

2 Jizọs ji ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem kpọrọ ihe nke ukwuu. N’ụwa nile, ọ bụ nanị ebe dị nsọ a raara nye maka ofufe nke Nna ya nke eluigwe. Ndị Juu na-esi n’ọtụtụ ala dị anya aga n’ebe ahụ ịga fee ofufe. Ọbụna ndị Jentaịl na-atụ egwu Chineke na-agakwa, na-abanye n’ogige ụlọ nsọ ahụ nke e debere maka ha. Ma ná mmalite ozi ya, Jizọs banyere n’ogige ụlọ nsọ ahụ ma hụ ihe dị nnọọ mwute. Leenụ, ebe ahụ yiri ọmà ahịa kama ịbụ ụlọ a na-anọ efe ofufe! O jupụtara ná ndị ahịa na ndị na-agbanwe ego. Otú ọ dị, oleekwanụ ikpe na-ezighị ezi dị na ya? Nye ndị ikom a, ụlọ nsọ Chineke bụ nanị ebe ịnọ rigbuo ndị mmadụ—ọbụna ebe ịnọ pụnara ha ihe. N’ụzọ dị aṅaa?—Jọn 2:14.

3, 4. Olee nrigbu e ji anyaukwu na-erigbu ndị mmadụ n’ụlọ Jehova, gịnịkwa ka Jizọs mere iji dozie ọnọdụ ahụ?

3 Ndị ndú okpukpe tiri iwu na ọ bụ nanị otu ụdị mkpụrụ ego ka a ga-eji na-atụ ụtụ ụlọ nsọ. Ndị si esi bịa aghaghị ịgbanwe ego ha iji nweta ụdị mkpụrụ ego ahụ. N’ihi ya, ndị na-agbanwe ego dọbara tebụl ha n’ime ụlọ nsọ ahụ kpọmkwem, na-ana ego maka ego ọ bụla ha gbanwere. Uru dịkwa n’ire ụmụ anụmanụ. Ndị si esi bịa, bụ́ ndị chọrọ ịchụ àjà pụrụ ịzụta anụmanụ n’aka onye nke ọ bụla n’ime ndị na-ere ya n’ime obodo ahụ, ma ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ ahụ pụkwara nnọọ ịjụ anụmanụ ha chọrọ iji chụọ àjà dị ka nke na-ekwesịghị ekwesị. Otú ọ dị, a ga-anakwererịrị anụmanụ ọ bụla a zụtara kpọmkwem n’ogige ụlọ nsọ ahụ. Ebe ọ bụ ihe ha kwuru ka ndị ahụ na-aghaghị ime, mgbe ụfọdụ ndị ahịa ahụ na-ere ihe oké ọnụ. * Nke a dị njọ karịa ịchọbiga uru ókè. Ọ bụ ịpụnara mmadụ ihe n’ezie!

“Wepụsịanụ ihe ndị a n’ebe a!”

4 Jizọs apụghị ịgbachi ikpe na-ezighị ezi dị otú ahụ nkịtị. Ebe a bụ ụlọ Nna ya! O ji ụdọ mere ụtarị wee chụpụ ìgwè ehi na atụrụ ahụ n’ụlọ nsọ. Ọ gakwuziiri ndị ahụ na-agbanwe ego, kpuo tebụl ha ihu. Weredị nnọọ anya nke uche gị hụ ka mkpụrụ ego ahụ nile ghasasịrị n’ala ụlọ ahụ e ji nkume mabụl mee! O ji olu siri ike nye ndị ikom ahụ na-ere nduru iwu, sị: “Wepụsịanụ ihe ndị a n’ebe a!” (Jọn 2:15, 16) O yiri ka ọ dịghị onye obi kara ịma nwoke a nwere obi ike aka.

“Ome Ka Nna Ya”

5-7. (a) Olee otú ịdị adị Jizọs tupu ọ ghọọ mmadụ si metụta otú o si ele ikpe ziri ezi anya, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ịmụ ihe nlereanya ya? (b) Olee otú Kraịst siworo lụọ ọgụ megide ikpe na-ezighị ezi ndị metụtara ọbụbụeze na aha Jehova?

5 Otú ọ dị, ndị ahịa ahụ laghachiri. Ihe dị ka afọ atọ mgbe e mesịrị, Jizọs mekwara ihe banyere otu ikpe na-ezighị ezi ahụ, na nke ugbu a, o hotara ihe Jehova n’onwe ya kwuru nke na-akatọ ndị mere ka ụlọ Ya bụrụ “ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Matiu 21:13; Jeremaịa 7:11) Ee, mgbe Jizọs hụrụ otú e si jiri anyaukwu na-erigbu ndị mmadụ nakwa mmetọ a na-emetọ ụlọ nsọ Chineke, o nwere mmetụta yiri nke Nna ya. Ọ bụghịkwa ihe ijuanya! Ruo ọtụtụ nde afọ, Jizọs bụ onye Nna ya nke eluigwe ziri ihe. N’ihi ya, ọ mụtara ile ikpe ziri ezi anya otú Jehova si ele ya. Ọ ghọrọ ihe atụ a na-ahụ anya nke okwu ahụ bụ́, “Ome ka nna ya.” Ya mere, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta ọdịdị nke ikpe ziri ezi Jehova nke ọma, ụzọ kasị mma isi mee ya bụ ịtụgharị uche n’ihe nlereanya Jizọs Kraịst.—Jọn 14:9, 10.

6 Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya nọ ya mgbe Setan, n’ụzọ na-ezighị ezi, kpọrọ Jehova Chineke onye ụgha ma maa izi ezi nke ịchịisi Ya aka. Lee nkwutọ jọgburu onwe ya nke ahụ bụ! Ọkpara ahụ nụkwara aka Setan mara ka oge na-aga, nke bụ́ na ọ dịghị onye ga-ejere Jehova ozi n’ịhụnanya, n’achọghị ọdịmma onwe ya nanị. O doro anya na ebubo ụgha ndị a nyere obi ezi omume nke Ọkpara ahụ nsogbu. Lee otú ọ na-aghaghị isiworị nwee obi ụtọ ịmara na ya ga-ekere òkè bụ́ isi n’ime ka ihe bụ́ eziokwu pụta ìhè! (2 Ndị Kọrint 1:20) Olee otú ọ ga-esi mee ya?

7 Dị ka anyị mụtara n’Isi nke 14, Jizọs Kraịst nyere azịza bụ o kwuchaa o bie, nke na-enweghị mgbagha n’ebubo Setan nke mere ka a na-enyo iguzosi ike n’ezi ihe nke ihe ndị Jehova kere eke enyo. Jizọs si otú a tọọ ntọala maka igosi n’ikpeazụ oruru o ruuru Jehova ịbụ eze nakwa ido aha Ya nsọ. Dị ka Onye Nnọchiteanya Ukwu nke Jehova, Jizọs ga-eme ka e nwee ikpe ziri ezi nke Chineke n’eluigwe na ala. (Ọrụ 5:31) Ụzọ o si bie ndụ n’ụwa gosipụtakwara n’otu aka ahụ ikpe ziri ezi nke Chineke. Jehova kwuru banyere ya, sị: “M ga-eme ka mmụọ m dịkwasị ya, ọ ga-eme ka ihe bụ ikpe ziri ezi doo mba nile anya.” (Matiu 12:18) Olee otú Jizọs si mezuo okwu ndị ahụ?

Jizọs Emee Ka “Ihe Bụ Ikpe Ziri Ezi” Doo Anya

8-10. (a) Olee otú iwu ọdịnala a na-edeghị ede nke ndị ndú okpukpe ndị Juu si akwalite ileda ndị na-abụghị ndị Juu nakwa ụmụ nwanyị anya? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka iwu ndị a na-edeghị ede si mee ka iwu Ụbọchị Izu Ike nke Jehova nyere ghọọ ibu arọ?

8 Jizọs hụrụ Iwu Jehova n’anya, o bikwara ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya. Ma ndị ndú okpukpe nke oge ya kpọdoro Iwu ahụ isi n’ala ma kọwahie ya. Jizọs sịrị ha: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! . . . Unu na-eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya, ya bụ, ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi.” (Matiu 23:23) N’ụzọ doro anya, ndị ahụ na-akụzi Iwu Chineke adịghị eme ka “ihe bụ ikpe ziri ezi” doo anya. Kama nke ahụ, ha nọ na-ekpuchi ikpe ziri ezi nke Chineke. N’ụzọ dị aṅaa? Tụlee ihe atụ ole na ole.

9 Jehova nyere ndị ya iwu ka ha doo onwe ha iche pụọ ná mba ndị na-ekpere arụsị gbara ha gburugburu. (1 Ndị Eze 11:1, 2) Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ndú okpukpe na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè gbara ndị mmadụ ume ịdị na-eleda ndị nile na-abụghị ndị Juu anya. Iwu a so ọbụna n’ime iwu ndị dị na Mishnah: “A pụghị ịhapụ ehi n’ụlọ ndị njem nke ọ bụ ndị jentaịl nwe, ebe ọ bụ na a na-enyo ha enyo na ha na-edina anụmanụ.” Ajọ mbunobi dị otú ahụ megide ndị nile na-abụghị ndị Juu ezighị ezi, o megidekwara nnọọ nzube nke Iwu Mozis. (Levitikọs 19:34) Iwu ndị ọzọ ụmụ mmadụ ji aka ha tie wedara ndị inyom ala. Iwu ahụ a na-edeghị ede kwuru na nwanyị kwesịrị ịdị na-eso di ya n’azụ, ọ bụghị ya na ya ịga ụkwụ na ụkwụ. A dọrọ nwoke aka ná ntị ka ya na nwanyị ghara inwe mkparịta ụka n’ihu ọha, ọbụna ya na nwunye ya. Dị ka ndị ohu, a dịghị ekwe ka ụmụ nwanyị gbaa akaebe n’ụlọikpe. E nwere ọbụna ekpere a tụpụtara nke ụmụ nwoke na-ekele Chineke na ya na ha abụghị ụmụ nwanyị.

10 Ndị ndú okpukpe ji ọtụtụ ụkpụrụ nduzi na iwu nchịkwa ndị mmadụ mere kpuchie Iwu Chineke. Dị ka ihe atụ, nanị ihe iwu Ụbọchị Izu Ike kwuru bụ ka a ghara ịrụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike, debe ụbọchị ahụ iche maka ife ofufe, inwetaghachi ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ, na izuru ike. Ma ndị Farisii mere ka iwu ahụ ghọọ ibu arọ. Ha ji aka ha na-ekpebi ihe bụ “ọrụ.” Ha kpọrọ ihe omume 39, dị ka iwere ihe ubi ma ọ bụ ịchụ nta, ọrụ. Otú a ha si kewaa ya kpaliri ọtụtụ ajụjụ. Ọ bụrụ na mmadụ egbuo akpịrị n’Ụbọchị Izu Ike, ọ̀ bụ nta ka ọ na-achụ? Ọ bụrụ na ọ ghọrọ ọka juru aka ya taa ka ọ nọ na-agafe agafe, ọ̀ bụ ihe ubi ka ọ na-ewe? Ọ bụrụ na ọ gwọọ onye ahụ́ na-adịghị, ọ̀ bụ ọrụ ka ọ na-arụ? A zara ajụjụ ndị dị otú a site n’inye ụkpụrụ nduzi sara mbara, ndị a na-aghaghị ịgbasosi ike.

11, 12. Olee otú Jizọs si gosipụta mmegide ọ na-emegide ọdịnala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nke ndị Farisii?

11 N’ụdị ọnọdụ dị otú ahụ, olee otú Jizọs ga-esi nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe bụ́ ikpe ziri ezi? N’ihe ndị ọ kụziri nakwa n’ụzọ o si bie ndụ, o ji obi ike guzogide ndị ndú okpukpe ahụ. Buru ụzọ tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ kụziri. Ozugbo, ọ katọrọ ọtụtụ iwu ha ji aka ha tie, na-asị: “Unu na-esite n’ọdịnala unu, bụ́ nke unu nyefere ndị ọzọ, na-eme ka okwu Chineke ghara ịdị irè.”—Mak 7:13.

12 Jizọs kụziri n’ụzọ nwere mmetụta dị ike na ihe ndị Farisii na-akụzi banyere iwu Ụbọchị Izu Ike ezighị ezi—na, n’ezie, ha aghọtaghị nzube nke iwu ahụ. Ọ kọwara na Mezaịa ahụ bụ “Onyenwe ụbọchị izu ike,” n’ihi ya kwa na o nwere ikike ịgwọ ndị mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike. (Matiu 12:8) Iji mesie ya ike, ọ gwọrọ ndị mmadụ n’ụzọ ọrụ ebube n’Ụbọchị Izu Ike n’ihu ọha. (Luk 6:7-10) Ọgwụgwọ ndị dị otú ahụ bụ ihe atụ nke ọgwụgwọ ọ ga-eme ka o were ọnọdụ n’ụwa nile n’oge Ọchịchị Puku Afọ ya. Narị Afọ Iri ahụ n’onwe ya ga-abụ Ụbọchị Izu Ike kasịnụ, mgbe ihe nile a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-ezu ike n’ikpeazụ ná ndọgbu ha nọworo na-adọgbu onwe ha n’ọrụ eri ọtụtụ narị afọ, na-ebu ibu arọ nke mmehie na ọnwụ.

13. Olee iwu e guzobere n’ihi ozi elu ala nke Kraịst, oleekwa otú o si dị iche na nke bu ya ụzọ?

13 Jizọs mekwara ka ihe bụ́ ikpe ziri ezi doo anya n’ihi na e guzobere iwu ọhụrụ, bụ́ “iwu nke Kraịst ahụ,” mgbe o jesịrị ozi elu ala ya. (Ndị Galeshia 6:2) N’adịghị ka nke bu ya ụzọ, bụ́ Iwu Mozis, iwu ọhụrụ a dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’ụkpụrụ dị iche iche, ọ bụghị n’usoro iwu ndị e deturu edetu. Otú ọ dị, iwu ụfọdụ a kpọrọ aha kpọmkwem so n’ime ya. Jizọs kpọrọ otu n’ime iwu ndị a “iwu ọhụrụ.” Jizọs kụziiri ndị nile na-eso ụzọ ya ka ha hụrịta ibe ha n’anya dị nnọọ ka ọ hụrụ ha n’anya. (Jọn 13:34, 35) Ee, ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà gaje ịbụ ihe a ga-eji mara ndị nile na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ‘n’iwu nke Kraịst ahụ.’

Ihe Nlereanya A Hụrụ Anya nke Ikpe Ziri Ezi

14, 15. Olee otú Jizọs si gosi na ọ maara ebe ikike ya jedebere, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji bụrụ ihe mmesi obi ike?

14 Ọ bụghị nanị nkụzi ka Jizọs kụziri ịhụnanya. O biri ndụ n’ụzọ kwekọrọ ‘n’iwu nke Kraịst.’ Ọ pụtara nnọọ ìhè n’ụzọ ndụ ya. Tụlee ụzọ atọ ihe nlereanya Jizọs si mee ka ihe bụ́ ikpe ziri ezi doo anya.

15 Nke mbụ, Jizọs kpachapụrụ nnọọ anya zere ikpe ikpe na-ezighị ezi kpam kpam. Ikekwe ị chọpụtawo na ọ bụ mgbe ụmụ mmadụ na-ezughị okè dịwara mpako ma na-agafe ebe kwesịrị ekwesị ikike ha jedebere ka ọtụtụ ikpe na-ezighị ezi na-ewere ọnọdụ. Jizọs emeghị otú ahụ. N’otu oge, otu nwoke bịakwutere Jizọs, sị: “Onye Ozizi, gwa nwanne m nwoke ka mụ na ya kee ihe nketa anyị.” Gịnị ka Jizọs zara ya? “Nwoke m, ònye mere m ọkàikpe ma ọ bụ onye na-ekere unu ihe?” (Luk 12:13, 14) Nke ahụ ọ́ bụghị ihe kwesịrị ịrịba ama? Ọgụgụ isi Jizọs, ikike nghọta ya, na ọbụna otú ikike Chineke nyere ya hà karịrị nke mmadụ nile n’ụwa; n’agbanyeghị nke ahụ, ọ jụrụ itinye aka n’okwu a, ebe ọ bụ na e nyeghị ya ikike kpọmkwem ime otú ahụ. Otú a ka Jizọs si egosi mgbe nile na ọ maara ebe ike ya jedebere, ọbụna n’ime ọtụtụ narị afọ iri ndị ọ dịrị ndụ tupu ọ ghọọ mmadụ. (Jud 9) Ọ na-egosi n’ụzọ dị ukwuu na Jizọs ji ịdị umeala n’obi na-atụkwasị Jehova obi ikpebi ihe ziri ezi.

16, 17. (a) Olee otú Jizọs si gosipụta ikpe ziri ezi ná nkwusa nke ozi ọma Alaeze Chineke? (b) Olee otú Jizọs si gosi na otú o si ele ikpe ikpe ziri ezi anya na-egosipụta obi ebere?

16 Nke abụọ, Jizọs gosipụtara ikpe ziri ezi n’ụzọ o si kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ kpaghị ókè. Kama nke ahụ, ọ gbalịsiri ike ijekwuru ụdị mmadụ nile, ma ndị bara ọgaranya ma ndị dara ogbenye. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ndị Farisii ejighị ndị nkịtị, bụ́ ụmụ ogbenye kpọrọ ihe, na-akpọ ha aha nlelị bụ́ ʽam-ha·ʼaʹret, ma ọ bụ “ndị nke ala.” Jizọs ji obi ike mee ihe banyere ikpe ahụ na-ezighị ezi. Mgbe o ziri ndị mmadụ ozi ọma ahụ—ma ọ bụ ọbụnadị, mgbe ya na ndị mmadụ na-eri nri, mgbe o nyere ha ihe oriri, gwọọ ha, ma ọ bụ ọbụna kpọlite ha n’ọnwụ—ọ kwalitere ikpe ziri ezi nke Chineke bụ́ onye chọrọ ka “ụdị mmadụ nile” bịaruo ya nso. *1 Timoti 2:4.

17 Nke atọ, otú Jizọs si ele ikpe ziri anya na-egosipụta obi ebere dị ukwuu. O mere mgbalị dị ukwuu iji nyere ndị mmehie aka. (Matiu 9:11-13) O ji obi ya nile gbatara ndị na-adịghị ike ịzọ onwe ha ọsọ enyemaka. Dị ka ihe atụ, Jizọs esonyereghị ndị ndú okpukpe n’ime ka a na-enyo ndị Jentaịl nile enyo. O ji obi ebere nyere ụfọdụ n’ime ha aka ma kụziere ha ihe, ọ bụ ezie na ozi ya bụ kpọmkwem maka ndị Juu. O kwetara ịgwọrọ otu onyeisi ndị agha Rom otu onye n’ụzọ ọrụ ebube, na-asị: “Ahụbeghị m onye nwere okwukwe dị ukwuu otú a n’Izrel.”—Matiu 8:5-13.

18, 19. (a) Ụzọ dịgasị aṅaa ka Jizọs si kwalite ùgwù ụmụ nwanyị? (b) Olee otú ihe nlereanya Jizọs si enyere anyị aka ịhụ njikọ dị n’etiti obi ike na ikpe ziri ezi?

18 N’otu aka ahụ, Jizọs akwadoghị echiche e nwere n’ebe nile n’oge ahụ banyere ụmụ nwanyị. Kama nke ahụ, o ji obi ike mee ihe ziri ezi. A na-ewere ụmụ nwanyị Sameria dị ka ndị na-adịghị ọcha dịkwa ka ndị Jentaịl. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs alaghị azụ n’ikwusara nwanyị Sameria ozi ọma n’akụkụ olulu mmiri dị na Saịka. N’ezie, ọ bụ nwanyị a bụ onye mbụ Jizọs gwara hoo haa na ya bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa. (Jọn 4:6, 25, 26) Ndị Farisii sịrị na e kwesịghị ịkụziri ụmụ nwanyị Iwu Chineke, ma Jizọs tinyere oge na ume dị ukwuu n’ịkụziri ụmụ nwanyị ihe. (Luk 10:38-42) Ọ bụkwa ezie na ọdịnala kwuru na a pụghị ịtụkwasị ụmụ nwanyị obi na ha ga-agba akaebe a pụrụ ịdabere na ya, Jizọs kwanyeere ọtụtụ ụmụ nwanyị ùgwù site n’ime ka ha nwee ihe ùgwù nke ịbụ ndị mbụ hụrụ ya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ. Ọ gwara ha ọbụna ka ha gaa gwa ndị na-eso ụzọ ya bụ́ ụmụ nwoke banyere ihe a dị oké mkpa merenụ!—Matiu 28:1-10.

19 Ee, Jizọs mere ka ihe bụ́ ikpe ziri ezi doo mba nile anya. Ọtụtụ mgbe, o tinyere onwe ya n’ihe ize ndụ dị ukwuu iji mee ya. Ihe nlereanya Jizọs na-enyere anyị aka ịhụ na ịkwalite ikpe ziri ezi na-achọ obi ike. N’ụzọ dabara adaba, a kpọrọ ya “Ọdụm nke sitere n’ebo Juda.” (Mkpughe 5:5) Cheta na ọdụm bụ ihe nnọchiteanya nke ikpe ziri ezi sitere n’obi ike. Otú ọ dị, n’ọdịnihu dị nso, Jizọs ga-eme ka e nwee ọbụna ikpe ziri ezi ka ukwuu. N’echiche kasị zuo ezuo, ọ ga-edo “ikpe [ziri ezi] n’ụwa.”—Aịsaịa 42:4.

Eze ahụ Bụ́ Mezaịa ‘Edoo Ikpe Ziri Ezi n’Ụwa’

20, 21. N’oge nke anyị, olee otú Eze bụ́ Mezaịa ahụ siworo kwalite ikpe ziri ezi n’ụwa nile nakwa n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst?

20 Kemgbe ọ ghọrọ Eze bụ́ Mezaịa na 1914, Jizọs akwalitewo ikpe ziri ezi n’ụwa. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ hụwo maka mmezu nke amụma o buru nke dị na Matiu 24:14. Ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị nọ n’ụwa, akụziworo ndị sitere ná mba nile eziokwu banyere Alaeze Jehova. Dị ka Jizọs, ha ekwusawo ozi ọma ahụ n’akpaghị ókè nakwa n’ụzọ ziri ezi, na-agbalị inye mmadụ nile—ma nwata ma okenye, ma ndị bara ọgaranya ma ndị ogbenye, ma nwoke ma nwanyị—ohere ịbịa mara Jehova, bụ́ Chineke nke ikpe ziri ezi.

21 Jizọs na-akwalitekwa ikpe ziri ezi n’ime ọgbakọ Ndị Kraịst nke ọ bụ Isi ya. Dị ka e buru n’amụma, ọ na-enye “onyinye n’ụdị mmadụ,” bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ekwesị ntụkwasị obi, ndị na-edu ndú n’ọgbakọ. (Ndị Efesọs 4:8-12) N’ịzụ ìgwè atụrụ ahụ dị oké ọnụ ahịa nke Chineke, ndị ikom dị otú ahụ na-agbaso ihe nlereanya Jizọs Kraịst n’ịkwalite ikpe ziri ezi. Ha na-eburu n’uche mgbe nile na Jizọs chọrọ ka a na-emeso atụrụ ya n’ụzọ ziri ezi—n’agbanyeghị ọkwá ha, otú ha bụruru ndị a ma ama, ma ọ bụ otú ihe onwunwe ha nwere hà.

22. Olee otú ikpe na-ezighị ezi juru n’ụwa taa dị Jehova, gịnịkwa ka ọ họpụtaworo Ọkpara ya ime banyere ya?

22 Otú ọ dị, n’ọdịnihu dị nso, Jizọs ga-edo ikpe ziri ezi n’ụwa n’ụzọ a na-ahụtụbeghị ụdị ya. Ikpe na-ezighị ezi juru ebe nile n’ụwa a rụrụ arụ. Nwatakịrị ọ bụla agụụ gụgburu nwụrụ n’ihi ikpe na-ezighị ezi nke na-enweghị ezi ihe kpatara ya, karịsịa mgbe anyị chere echiche banyere ego na oge a na-etinye n’imepụta ngwá agha nakwa n’imejụ ọchịchọ onwe onye nanị nke ndị na-achọ ihe ụtọ. Ọtụtụ nde mmadụ ndị na-anwụ kwa afọ n’enweghị ezi ihe kpatara ya bụ otu n’ime ụdị dịgasị iche iche nke ikpe na-ezighị ezi, bụ́ ndị na-eme ka Jehova wee iwe ezi omume. Ọ họpụtawo Ọkpara ya ibu agha ziri ezi megide ajọ usoro ihe a dum iji kwụsị ikpe na-ezighị ezi kpam kpam.—Mkpughe 16:14, 16; 19:11-15.

23. Mgbe Amagedọn gasịrị, olee otú Kraịst ga-esi akwalite ikpe ziri ezi ruo mgbe ebighị ebi?

23 Otú ọ dị, ikpe ziri ezi Jehova na-achọ ka e mee ihe karịrị nanị ibibi ndị ajọ omume. Ọ họpụtawokwa Ọkpara ya ịchị achị dị ka “Onyeisi Udo.” Mgbe agha Amagedọn gasịrị, ọchịchị Jizọs ga-eme ka e nwee udo n’ụwa nile, ọ ga-achịkwa “n’ikpe ziri ezi.” (Aịsaịa 9:6, 7) Mgbe ahụ, Jizọs ga-enweta obi ụtọ n’ịgbazi ikpe na-ezighị ezi nile nke kpataworo oké nhụjuanya na ịta ahụhụ n’ụwa. Ruo mgbe ebighị ebi, ọ ga-eji ikwesị ntụkwasị obi na-akwalite ikpe ziri ezi Jehova, bụ́ nke zuru okè. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka anyị gbalịa iṅomi ikpe ziri ezi Jehova ugbu a. Ka anyị lee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ.

^ par. 1 N’iwe iwe ezi omume, Jizọs yiri Jehova, bụ́ onye ‘na-enwe ọnụma’ megide ajọ omume nile. (Nehum 1:2) Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova gwasịrị ndị ya dị isi ike na ha emewo ụlọ ya ka ọ bụrụ “ọgba ndị na-eme ihe ike,” ọ sịrị: “Iwe m na ọnụma m ka a na-awụsị n’ebe a.”—Jeremaịa 7:11, 20.

^ par. 3 Dị ka Mishnah si kwuo, mgbe afọ ole na ole gasịrị, e nwere mkpesa n’ihi ịdị oké ọnụ nke nduru a na-ere n’ụlọ nsọ ahụ. E ji ihe dị ka pasent 99 gbutuo ihe a na-ere ya ozugbo! Olee ndị ritere uru karịsịa n’azụmahịa a na-enye ego? Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ọ bụ ezinụlọ Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Anas nwe ahịa ahụ a na-azụ n’ụlọ nsọ, na-ewetara ezinụlọ ahụ bụ́ ndị nchụàjà akụ̀ na ụba buru ibu.—Jọn 18:13.

^ par. 16 Ndị Farisii na-ekwu na ndị e wedara ala, ndị na-amaghị Iwu ahụ, bụ “ndị a bụrụ ọnụ.” (Jọn 7:49) Ha kwuru na mmadụ ekwesịghị ịkụziri ndị dị otú ahụ ihe ma ọ bụ soro ha zụkọọ ahịa ma ọ bụ soro ha rie nri ma ọ bụ soro ha kpee ekpere. Mmadụ ikwe ka otu n’ime ha lụọ nwa ya nwanyị ga-abụ ihe jọgburu onwe ya karịa ịgbahapụ ya nye anụ ọhịa. Ha weere ya na ndị dị otú ahụ e wedara ala esoghị ná ndị ga-enweta olileanya mbilite n’ọnwụ.