Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 13

“Iwu Jehova Zuru Okè”

“Iwu Jehova Zuru Okè”

1, 2. Gịnị mere na ọtụtụ mmadụ adịchaghị eji iwu akpọrọ ihe, n’agbanyeghị nke ahụ, olee mmetụta anyị pụrụ inwe banyere iwu Chineke?

“IWU bụ olulu na-enweghị nsọtụ, ọ . . . na-eloda ihe nile.” Okwu ahụ dị n’otu akwụkwọ e bipụtara laa azụ na 1712. Onye dere ya katọrọ usoro iwu nke okwu ikpe na-anọ n’ụlọikpe n’ebighị ebi ruo ọtụtụ afọ, na-erikpọ ego nke ndị na-achọ ikpe ziri ezi. N’ọtụtụ ala, usoro iwu na usoro ikpe dị nnọọ mgbagwoju anya, jupụta n’ikpe na-ezighị ezi, ajọ mbunobi, na emeghị ihe n’otu ụzọ ahụ nke na ilelị iwu agbasawo n’ebe nile.

2 N’ụzọ dị iche na nke ahụ, tụlee okwu ndị a e dere ihe dị ka afọ 2,700 gara aga: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya!” (Abụ Ọma 119:97) N’ihi gịnị ka ọbụ abụ ahụ ji hụ ya n’anya nke ukwuu otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na iwu ahụ ọ na-aja mma esiteghị n’aka ọchịchị ọ bụla nke ụmụ mmadụ, kama o sitere n’aka Jehova Chineke. Ka ị na-amụ iwu Jehova, ị pụrụ ịdị na-enwekwu ụdị mmetụta ahụ ọbụ abụ ahụ nwere. Ọmụmụ ihe dị otú ahụ ga-eme ka ị ghọta echiche nke onye kasị jiri iwu kpọrọ ihe n’eluigwe na ala.

Onye Kasị Ukwuu nke Na-enye Iwu

3, 4. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova siworo gosipụta na ọ bụ Onye Na-enye Iwu?

3 Bible na-agwa anyị, sị: “E nwere otu onye nke bụ onye na-enye iwu na onyeikpe.” (Jems 4:12) N’ezie, ọ bụ nanị Jehova bụ ezi Onye na-enye iwu. “Iwu nile nke eluigwe” na-achịkwa ọbụna ngagharị nke ihe ndị dị na mbara ígwé. (Job 38:33, The New Jerusalem Bible) N’otu aka ahụ, ọ bụ iwu Chineke na-achịkwa ọtụtụ iri puku ndị mmụọ ozi dị nsọ nke Jehova, n’ihi na a haziri ha n’ọkwá dị iche iche, ha na-ejekwa ozi n’okpuru nduzi Jehova dị ka ndị ozi ya.—Abụ Ọma 104:4; Ndị Hibru 1:7, 14.

4 Jehova enyewokwa ihe a kpọrọ mmadụ iwu. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere akọ na uche, nke bụ́ onyinyo nke ikpe ziri  ezi Jehova. Ebe akọ na uche bụ ihe yiri iwu nke e tinyere n’ime mmadụ, ọ pụrụ inyere anyị aka ịmata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ . (Ndị Rom 2:14) E ji akọ na uche zuru okè gọzie nne na nna anyị mbụ, ya mere ihe dị ha mkpa bụ nanị iwu ole na ole. (Jenesis 2:15-17) Otú ọ dị, ọnụ ọgụgụ iwu ka ukwuu dị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mkpa iji na-eduzi ha ime uche Chineke. Ndị nna ochie dị ka Noa, Ebreham, na Jekọb natara iwu dị iche iche site n’aka Jehova Chineke ma nye ndị ezinụlọ ha iwu ndị a. (Jenesis 6:22; 9:3-6; 18:19; 26:4, 5) Jehova mere ka ya onwe ya ghọọ Onye Na-enye Iwu n’ụzọ na-enweghị atụ mgbe o si n’aka Mozis nye mba Izrel otu usoro Iwu. Usoro iwu a na-eme ka anyị ghọtakwuo nke ukwuu otú Jehova si ele ikpe ziri ezi anya.

Iwu Mozis—Ntụle Dị Mkpirikpi

5. Iwu Mozis ọ̀ bụ ìgwè iwu dị mgbagwoju anya ma sie ike idebe, gịnịkwa mere i ji zaa otú ahụ?

5 Ọtụtụ ndị yiri ka ha na-eche na Iwu Mozis bụ otu ìgwè iwu nke dị mgbagwoju anya ma sie ike ndebe. Echiche dị otú ahụ abụtụghị eziokwu ma ọlị. E nwere ihe karịrị iwu 600 n’usoro iwu ahụ dum. Nke ahụ pụrụ iyi ka ha buru nnọọ ibu, ma chegodị echiche: Ka ọ na-erule January 1990, iwu obodo Nigeria juru ihe karịrị peeji dị 16,000 nke akwụkwọ iwu 25. N’agbata afọ ahụ na September 1999, a gbakwụnyere ihe dị ka iwu 540 ndị ọzọ! Ya mere, a bịa nanị n’ịdị ọtụtụ, Iwu Mozis dị nnọọ ntakịrị ma e jiri ya tụnyere ọtụtụ iwu ụmụ mmadụ tiri. Ma, Iwu Chineke chịkwara ụmụ Izrel n’akụkụ dị iche iche nke ndụ bụ́ ndị iwu nke oge a na-akpabedịghị aka. Chebara ntụle a dị mkpirikpi echiche.

6, 7. (a) Olee ihe dị iche n’Iwu Mozis na usoro iwu ọ bụla ọzọ, oleekwa iwu kasịnụ n’ime usoro Iwu ahụ? (b) Olee otú ụmụ Izrel pụrụ isi gosi nnakwere ha nakweere ọbụbụeze Jehova?

6 Iwu ahụ buliri ọbụbụeze Jehova elu. N’ihi ya, a pụghị iji usoro iwu ọ bụla ọzọ tụnyere Iwu Mozis. Nke kasịnụ n’ime iwu dị na ya bụ nke a: “Nụrụ, [Izrel]; Jehova, bụ́ Chineke anyị, Jehova bụ otu: ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.”  Olee otú ndị Chineke ga-esi gosipụta ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ? Ha ga-ejere ya ozi, na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze ya.—Deuterọnọmi 6:4, 5; 11:13.

7 Onye Izrel ọ bụla gosiri nnakwere ọ nakweere ọbụbụeze Jehova site n’ido onwe ya n’okpuru ndị e mere ka ha nwee ikike n’ebe ọ nọ. Ndị nne na nna, ndị isi, ndị ikpe, ndị nchụàjà nakwa, ka oge na-aga, ndị eze, nọchitechara anya ịbụisi Chineke. Jehova lere isi ọ bụla e nupụụrụ ndị nọ n’isi anya dị ka inupụrụ ya isi. N’aka nke ọzọ, ndị e nyere ikike pụrụ iwetara onwe ha ọnụma Jehova ma ọ bụrụ na ha emesoo ndị ya ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọ bụ ná mpako. (Ọpụpụ 20:12; 22:28; Deuterọnọmi 1:16, 17; 17:8-20; 19:16, 17) Ya mere, ma ndị e nyere ikike ma ndị nọ n’okpuru ndị ahụ e nyere ikike nwere ibu ọrụ nke ịkwado ọbụbụeze Chineke.

8. Olee otú Iwu ahụ si kwadoo ụkpụrụ ịdị nsọ Jehova?

8 Iwu ahụ kwadoro ụkpụrụ ịdị nsọ Jehova. Okwu bụ́ “nsọ” na “ịdị nsọ” pụtara ihe karịrị ugboro 280 n’Iwu Mozis. Iwu ahụ nyeere ndị Chineke aka ịmata ọdịiche dị n’etiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha, na-ezo aka n’ihe dị ka ihe 70 ndị pụrụ ime ka onye Izrel ghara ịdị ọcha n’ụzọ iwu chọrọ. Iwu ndị a kwuru banyere ịdị ọcha, ihe oriri, na ọbụna ikpofu unyi. Iwu ndị ahụ bara nnukwute uru maka ahụ́ ike. * Ma e nwere nzube karịrị nke ahụ e ji n’ihi ya nye ha—ime ka ndị ahụ nọgide na-enwe ihu ọma Jehova, na-anọpụ iche n’omume ọjọọ nke mba ndị rụrụ arụ, ndị gbara ha gburugburu. Tụlee otu ihe atụ.

9, 10. Olee iwu ndị dị n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’ihe banyere mmekọahụ na ịmụ nwa, olee uru ndị a na-erite n’iwu ndị ahụ?

9 Iwu ndị dị n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ kwuru na inwe mmekọahụ na ịmụ nwa—ọbụna n’etiti di na nwunye—na-eme ka mmadụ ghara ịdị ọcha ruo oge ụfọdụ. (Levitikọs 12:2-4; 15:16-18) Iwu ndị dị otú ahụ adịghị eweda onyinye ndị a dị ọcha sitere  n’aka Chineke ala. (Jenesis 1:28; 2:18-25) Kama nke ahụ, iwu ndị ahụ kwadoro ịdị nsọ Jehova, mee ka ndị na-efe ya ofufe ghara inwe mmerụ ọ bụla. Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na mba ndị gbara Izrel gburugburu gwakọtara ife ofufe na mmekọahụ nakwa ememe ọmụmụ. Okpukpe ndị Kenan gụnyere ndị ikom na ndị inyom ịgba akwụna. Nke a rụpụtara omume rụrụ arụ jọgburu onwe ya, ọ gbasakwara ebe nile. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Iwu ahụ doro nnọọ ofufe Jehova iche pụọ n’okwu ndị metụtara mmekọahụ. * E nwekwara uru ndị ọzọ a na-erite na ya.

10 Iwu ndị ahụ kụziri eziokwu dị oké mkpa. * E kwuwerị, olee otú e si ebufe ntụpọ nke mmehie Adam site n’otu ọgbọ gaa n’ọzọ? Ọ́ bụghị site n’inwe mmekọahụ na ịmụ nwa? (Ndị Rom 5:12) Ee, Iwu Chineke chetaara ndị ya na mmehie dị adị n’ezie. N’ezie, a mụrụ anyị nile n’ime mmehie. (Abụ Ọma 51:5) Mgbaghara mmehie na mgbapụta dị anyị mkpa iji bịaruo Chineke anyị dị nsọ nso.

11, 12. (a) Iwu ahụ kwalitere ụkpụrụ dị aṅaa dị oké mkpa nke ikpe ziri ezi? (b) Olee ihe ndị na-egbochi ikpe mmadụ ikpe mmegide ndị dị n’Iwu ahụ?

11 Iwu ahụ kwadoro ikpe zuru okè nke Jehova. Iwu Mozis kwadoro ụkpụrụ nke ịha nhata n’okwu ndị metụtara ikpe ziri ezi. N’ihi ya, Iwu ahụ kwuru, sị: “Ndụ laara ndụ, anya laara anya, ezé laara ezé, aka laara aka, ụkwụ laara ụkwụ.” (Deuterọnọmi 19:21) N’ihi ya, n’okwu ndị metụtara ime mpụ, ntaramahụhụ a ga-enye aghaghị ikwekọ na mpụ e mere. Akụkụ a nke ikpe ziri ezi Chineke pụtara ìhè n’akụkụ nile n’ime Iwu ahụ, ruokwa taa, ọ bụ ihe dị oké mkpa iji ghọta àjà mgbapụta Kraịst Jizọs, dị ka Isi nke 14 ga-egosi.—1 Timoti 2:5, 6.

 12 Iwu ahụ nwekwara ihe ndị na-egbochi ikpe mmadụ ikpe mkpegide. Dị ka ihe atụ, a chọrọ ndị àmà abụọ ma ọ dịkarịa ala, iji gosi na ebubo e boro mmadụ bụ eziokwu. A na-enye ntaramahụhụ siri ike maka ịṅụ iyi ụgha. (Deuterọnọmi 19:15, 18, 19) A machibidokwara nrụrụ aka na ịnara ihe iri ngo iwu kpam kpam. (Ọpụpụ 23:8; Deuterọnọmi 27:25) Ọbụna n’achụmnta ego ha, ndị Chineke aghaghị ịgbaso ụkpụrụ dị elu nke Jehova maka ikpe ziri ezi. (Levitikọs 19:35, 36; Deuterọnọmi 23:19, 20) Usoro iwu ahụ dị elu ma zie ezi bụụrụ Izrel nnukwute ngọzi!

Iwu Ndị Na-egosipụta Ebere na Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu n’Ikpe

13, 14. Olee otú Iwu ahụ si kwadoo ka e mesoo onye ohi na onye o zuru ohi ihe n’ụzọ ziri ezi ma kwesị ekwesị?

13 Iwu Mozis ọ̀ bụ usoro iwu nke a na-aghaghị ịgbasoru n’isi, nke ebere na-adịghị na ha? Ọ dịghị ma ọlị! E nyere Eze Devid ike mmụọ nsọ ide, sị: “Iwu Jehova zuru okè.” (Abụ Ọma 19:7) Dị ka ọ maara nke ọma, Iwu ahụ kwalitere ime ebere na eleghị mmadụ anya n’ihu. Olee otú o si mee otú ahụ?

14 N’ala ụfọdụ taa, o yiri ka iwu ọ̀ na-emere ndị mere mpụ ebere, na-emenyekwara ha karịa otú ọ na-egosi nchegbu maka ndị e mesoro mpụ. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ịtụ ndị ohi mkpọrọ ruo oge ụfọdụ. Ka ọ dịgodị, ndị e zuru ohi nwere ike ha enwetaghachibeghị ihe ha e zuru, n’agbanyeghị nke ahụ, ha aghaghị ịdị na-atụ ụtụ isi nke e ji ewuru ndị omekome dị otú ahụ ụlọ ma na-enye ha nri. N’Izrel oge ochie, e nweghị ụdị ụlọ mkpọrọ ndị e nwere taa. E nwere ókè a kapịrị ọnụ kpọmkwem a ga-enyeru mmadụ ntaramahụhụ. (Deuterọnọmi 25:1-3) Onye ohi aghaghị ịkwụ onye o zuru ohi ụgwọ ihe o zuuru. Tụkwasị na nke ahụ, onye ohi ahụ aghaghị ịkwụkwasị ihe ọzọ. Ihe hà aṅaa? Ọ dabeere n’ihe ụfọdụ. Dị ka ihe àmà na-egosi, e nyere ndị ikpe ohere ịtụle ihe dị iche iche, dị ka nchegharị onye mmehie ahụ nwere. Nke ahụ pụrụ ịbụ ihe mere ihe iti aka n’obi a chọrọ n’aka onye ohi dị ka Levitikọs 6:1-7 si kwuo ji dị nnọọ nta karịa nke e kwuru n’Ọpụpụ 22:7.

15. Olee otú Iwu ahụ si hụ na e meere onye gburu mmadụ n’ọghọm ebere ma kpee ya ikpe ziri ezi?

 15 N’obi ebere, Iwu ahụ gosiri na ọ ghọtara na ọ bụghị mmehie nile ka a na-akpachapụ anya eme. Dị ka ihe atụ, mgbe mmadụ gburu mmadụ n’amaghị ama, ọ gaghị adị mkpa na ọ ga-eji ndụ ya kwụọ ụgwọ ma ọ bụrụ na o mee ihe o kwesịrị ime site n’ịgbaga n’otu n’ime obodo mgbaba ndị dịgasị n’ebe dị iche iche n’Izrel. Mgbe ndị ikpe ruru eru lebasịrị anya n’okwu ya, ọ ghaghị ịnọgide n’obodo mgbaba ahụ ruo mgbe onyeisi nchụàjà nwụrụ. Mgbe ahụ, ọ ga-enwere onwe ya ibi n’ebe ọ bụla ọ chọrọ. N’ụzọ dị otú ahụ, o ritere uru n’ebere Chineke. N’otu mgbe ahụ, iwu a mere ka otú ndụ mmadụ si dị oké ọnụ ahịa pụta ìhè.—Ọnụ Ọgụgụ 15:30, 31; 35:12-25.

16. Olee otú Iwu ahụ si chebe ihe ụfọdụ ruuru mmadụ?

16 Iwu ahụ chebere ihe ndị ruuru mmadụ. Tụlee ụzọ dị iche iche o si chebe ndị ji ụgwọ. Iwu ahụ machibidoro mmadụ ịbanye n’ụlọ onye ji ya ụgwọ ma were ngwongwo ya n’ike dị ka ihe ibé maka ego a gbaziiri. Kama nke ahụ, onye ahụ e ji ụgwọ aghaghị ịnọrọ n’èzí chere ka onye ahụ ji ya ụgwọ wetara ya ihe ibé ahụ. N’ụzọ dị otú a, a dịghị awabanye n’ụlọ mmadụ. Ọ bụrụ na onye e ji ụgwọ chịịrị uwe mgbokwasị onye ahụ ji ya ụgwọ dị ka ihe ibé, ọ ghaghị iweghachite ya mgbe ọ na-erule n’uhuruchi, n’ihi na ma eleghị anya ọ ga-adị onye ahụ ji ya ụgwọ mkpa maka iji ya chụọ oyi n’abalị.—Deuterọnọmi 24:10-14.

17, 18. N’okwu metụtara ibu agha, olee otú ndị Izrel si dị iche ná mba ndị ọzọ, n’ihi gịnịkwa?

17 Iwu ahụ nyere ntụziaka nke chịkwara ọbụna ibu agha. Ndị Chineke ga-alụ agha, ọ bụghị nanị iji mejuo agụụ inweta ike ma ọ bụ mmeri, kama ọ bụ iji jee ozi dị ka ndị Chineke ji eme ihe ‘n’agha dị iche iche nke Jehova.’ (Ọnụ Ọgụgụ 21:14) Ọtụtụ mgbe, ụmụ Izrel aghaghị ibu ụzọ gwa ndị ahụ ka ha chịlie aka elu. Ọ bụrụ na obodo ahụ ajụ, mgbe ahụ, Izrel pụrụ ịnọchibido ya—ma ọ ga-abụ dị ka ụkpụrụ nduzi Chineke si dị. N’adịghị ka ọtụtụ ndị agha e nwere n’akụkọ ihe mere eme nile, e nyeghị ndị ikom so n’usuu ndị agha Izrel ohere idina ndị inyom n’ike ma ọ bụ igbu mmadụ aghara aghara. Ha aghaghị ọbụna  ịkwanyere gburugburu ebe ha gara agha ùgwù, ha agaghị egbutusị osisi ndị na-amị mkpụrụ nke ndị iro ha. * E nyeghị usuu ndị agha nke mba ndị ọzọ mmachibido iwu ndị dị otú ahụ.—Deuterọnọmi 20:10-15, 19, 20; 21:10-13.

18 Ọ̀ na-awụ gị akpata oyi n’ahụ́ ịnụ na n’ala ụfọdụ, a na-enye obere ụmụaka ọzụzụ ịghọ ndị agha? N’Izrel oge ochie, ọ dịghị nwoke ọ bụla na-erubeghị afọ 20 nke a ga-edeba aha ya n’usuu ndị agha. (Ọnụ Ọgụgụ 1:2, 3) A na-ahapụ ọbụna nwoke toruru ogo mmadụ ma ọ bụrụ ọ na-atụ ụjọ nke ukwuu. A na-agụpụ nwoke lụrụ nwanyị ọhụrụ ruo otu afọ, o nwee ike ịhụ na a mụtawo onye ga-anọchi ya tupu ya amalite ije ozi a dị ize ndụ. Iwu ahụ kọwara na n’ụzọ dị otú a, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ọhụrụ ga-enwe ike ime ka nwunye ọhụrụ ya “ṅụrịa ọṅụ.”—Deuterọnọmi 20:5, 6, 8; 24:5.

19. Olee ndokwa ndị iwu ahụ mere iji chebe ndị inyom, ụmụaka, ezinụlọ dị iche iche, ndị inyom di ha nwụrụ, na ụmụ mgbei?

19 Iwu ahụ chebekwara ndị inyom, ụmụaka, na ezinụlọ dị iche iche, na-eme ndokwa maka ha. O nyere ndị nne na nna iwu ka ha na-elebara ụmụ ha anya mgbe nile ma na-enye ha ntụziaka n’ihe ime mmụọ. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ọ machibidoro ụdị nile nke mmadụ idina onye ikwu iwu ya, kwuo na ọnwụ bụ ntaramahụhụ ya. (Levitikọs, isi 18) Ọ machibidokwara ịkwa iko nke ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, bụ́ nke na-etisakarị ezinụlọ ma na-ebibi ntụkwasị obi na ùgwù ha. Iwu ahụ mere ndokwa maka ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei, jirikwa okwu ndị dị ike machibido imegbu ha.—Ọpụpụ 20:14; 22:22-24.

20, 21. (a) N’ihi gịnị ka Iwu Mozis ji kwe ka ụmụ Izrel na-alụ ihe karịrị otu nwanyị? (b) N’okwu banyere ịgba alụkwaghịm, gịnị mere Iwu ahụ ji dị iche n’ụkpụrụ Jizọs mesịrị weghachite?

20 Otú ọ dị, n’ihe banyere nke a, ụfọdụ pụrụ iche, sị: ‘Gịnị  mere Iwu ahụ ji kwere ka a na-alụ ihe karịrị otu nwanyị?’ (Deuterọnọmi 21:15-17) Ọ dị anyị mkpa ịtụle iwu ndị ahụ na-adabere n’ọnọdụ e nwere n’oge ahụ. Ndị na-enyocha Iwu Mozis na-adabere n’ọnọdụ na ọdịbendị nke oge a ga-aghọtahierịrị ya. (Ilu 18:13) Ụkpụrụ Jehova, bụ́ nke o setịpụrụ laa azụ n’Iden, mere ka alụmdi na nwunye bụrụ njikọ na-adịgide adịgide n’etiti otu di na otu nwunye. (Jenesis 2:18, 20-24) Otú ọ dị, ka ọ na-erule n’oge Jehova nyere Izrel Iwu ahụ, omume ndị dị ka ịlụ ihe karịrị otu nwanyị agbanyewo mgbọrọgwụ kemgbe ọtụtụ narị afọ. Jehova maara nke ọma na, ‘ndị ya kwesiri olu ike’ agaghị na-erube isi ugboro ugboro n’ọbụna iwu ndị bụ́ isi, dị ka ndị machibidoro ikpere arụsị. (Ọpụpụ 32:9) Mgbe ahụ, n’ụzọ amamihe dị na ya, o wereghị ya na oge ahụ bụ oge iji gbanwee ihe nile ha na-eme n’ihe metụtara alụmdi na nwunye. Otú ọ dị, chetakwa na ọ bụghị Jehova guzobere ịlụ ihe karịrị otu nwanyị. Otú ọ dị, o sitere n’Iwu Mozis chịkwaa ịlụ ihe karịrị otu nwanyị n’etiti ndị ya iji gbochie ha iji ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.

21 N’otu aka ahụ, Iwu Mozis kwere ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ọtụtụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ. (Deuterọnọmi 24:1-4) Jizọs kpọrọ nke a ihe Chineke kwetara ka ndị Juu na-eme “n’ihi obi ịkpọ nkụ” ha. Otú ọ dị, ihe ndị ahụ o kwetara ka ha na-eme bụ nanị ruo nwa oge. N’ebe ụmụazụ ya nọ, Jizọs weghachitere ụkpụrụ mbụ nke Jehova maka alụmdi na nwunye.—Matiu 19:8.

Iwu ahụ Kwalitere Ịhụnanya

22. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Iwu Mozis si kwalite ịhụnanya, ọ̀ bụkwa n’ebe olee ndị nọ?

22 Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche usoro iwu nke oge a nke na-akwalite ịhụnanya? Iwu Mozis kwalitere ịhụnanya karịa ihe ọ bụla ọzọ. Leenụ, nanị n’akwụkwọ Deuterọnọmi, okwu a sụgharịrị ịbụ “ịhụnanya” pụtara ihe karịrị ugboro 20 n’ụdị dịgasị iche iche. “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị” bụ iwu nke abụọ kasịnụ n’Iwu ahụ dum. (Levitikọs 19:18; Matiu 22:37-40) Ndị Chineke gaje igosipụta ịhụnanya dị otú ahụ ọ bụghị nanị  n’ebe ibe ha nọ kamakwa n’ebe ndị ala ọzọ nọ n’etiti ha ndị bi dị ka ọbịa nọ, na-echeta na ụmụ Izrel n’onwe ha nwekwara mgbe ha bụ ndị ala ọzọ ndị na-ebi dị ka ọbịa. Ha aghaghị igosi ịhụnanya n’ebe ndị ogbenye na ndị na-ahụsi anya nọ, nyere ha aka n’ụzọ ihe onwunwe ma zere iji adịghị ike ha na-eme ihe maka ọdịmma nke aka ha. E nyere ha ntụziaka ọbụna ka ha jiri obiọma na nchebara echiche na-emeso anụmanụ na-ebu ibu ma ọ bụ ndị e ji arụ ọrụ.—Ọpụpụ 23:6; Levitikọs 19:14, 33, 34; Deuterọnọmi 22:4, 10; 24:17, 18.

23. Gịnị ka a kpaliri onye dere Abụ Ọma nke 119 ime, gịnịkwa ka anyị nwere ike ikpebisi ike ime?

23 Olee mba ọzọ e jiworo usoro iwu dị otú ahụ gọzie? Ka a sịkwa ihe mere ọbụ abụ ahụ ji dee, sị: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya!” Otú ọ dị, ịhụnanya o nwere abụghị nanị mmetụta nkịtị. Ọ kpaliri ya ime ihe, n’ihi na ọ gbalịsiri ike irube isi n’iwu ahụ na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya. Ọzọkwa, ọ gara n’ihu, sị: “Ogologo ụbọchị nile ka [iwu gị] bụ ihe m na-atụgharị n’uche.” (Abụ Ọma 119:11, 97) Ee, o wepụtara oge mgbe nile mụọ iwu Jehova. Obi abụọ adịghị ya na ka ọ na-eme otú ahụ, ịhụnanya o nwere maka ha mụbara. N’otu mgbe ahụ, ịhụnanya o nwere n’ebe Onye Na-enye Iwu, bụ́ Jehova Chineke, nọ mụbakwara. Ka ị na-anọgide na-amụ iwu Chineke, nọgidekwa na-abịarukwu Jehova, bụ́ Onye Ukwu Na-enye Iwu na Chineke nke ikpe ziri ezi, nso.

^ par. 8 Dị ka ihe atụ, iwu ndị kwuru ka a na-eli nsị́ mmadụ n’ala, ka a na-akpọpụ onye ọrịa iche, na ka onye ọ bụla metụrụ ozu aka saa ahụ́, ji ọtụtụ narị afọ tọọ nke ụmụ mmadụ.—Levitikọs 13:4-8; Ọnụ Ọgụgụ 19:11-13, 17-19; Deuterọnọmi 23:13, 14.

^ par. 9 Ọ bụ ezie na ụlọ nsọ ndị Kenan na-enwe ọnụ ụlọ ndị e doro iche maka inwe mmekọahụ, Iwu Mozis kwuru na ndị na-adịghị ọcha enwedịghị ike ịbanye n’ụlọ nsọ. N’ihi ya, ebe ọ bụ na inwe mmekọahụ na-eme ka mmadụ ghara ịdị ọcha ruo oge ụfọdụ, ọ dịghị onye pụrụ, n’ụzọ iwu kwadoro, ime ka mmekọahụ bụrụ akụkụ nke ofufe n’ụlọ Jehova.

^ par. 10 Izi ihe bụ nzube bụ́ isi e ji nye Iwu ahụ. N’ezie, akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica na-ekwu na okwu Hibru maka “iwu,” nke bụ́ toh·rahʹ, pụtara “ntụziaka.”

^ par. 17 Iwu ahụ jụrụ kpọmkwem, sị: “Osisi nke dị n’ọhịa, ọ̀ bụ mmadụ, ịba n’ihu gị ná nnọchigide n’agha ahụ?” (Deuterọnọmi 20:19) Philo, onye Juu bụ́ ọkà mmụta na narị afọ mbụ, hotara iwu a, na-akọwa na Chineke weere ya dị ka “ihe na-ezighị ezi na a ga-eweso ihe ndị ọ na-adịghị ihe ọjọọ ọ bụla ha mere iwe a na-ewere mmadụ.”