Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 14

Jehova Enye “Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ”

Jehova Enye “Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ”

1, 2. Olee otú Bible si kọwaa ọnọdụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, oleekwa nanị ụzọ e nwere nke isi si na ya pụọ?

“IHE nile e kere eke nọgidere na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu.” (Ndị Rom 8:22) Pọl onyeozi ji okwu ndị ahụ kọwaa ọnọdụ dị mwute anyị nọ n’ime ya. Dị ka mmadụ si ele ihe anya, o yiri ka e nweghị ụzọ anyị ga-esi nwere onwe anyị pụọ ná nhụjuanya, mmehie, na ọnwụ. Ma Jehova enweghị adịghị ike ndị ụmụ mmadụ nwere. (Ọnụ Ọgụgụ 23:19) Chineke nke ikpe ziri ezi enyewo anyị ụzọ isi nwere onwe anyị pụọ ná nsogbu anyị nọ n’ime ya. A na-akpọ ya ihe mgbapụta.

2 Ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye kasịnụ Jehova nyeworo ihe a kpọrọ mmadụ. O mere ka o kwe mee ịnapụta anyị ná mmehie na ọnwụ. (Ndị Efesọs 1:7) Ọ bụ ihe ndabere maka olileanya nke ndụ ebighị ebi, ma ọ̀ bụ n’eluigwe ma ọ̀ bụ n’ụwa paradaịs. (Luk 23:43; Jọn 3:16; 1 Pita 1:4) Ma gịnị kpọmkwem bụ ihe mgbapụta ahụ? Olee otú o si akụziri anyị banyere ikpe ziri ezi Jehova nke na-enweghị atụ?

Otú E Si Bịa Nwee Mkpa Maka Ihe Mgbapụta

3. (a) N’ihi gịnị ka ihe mgbapụta ji bịa dị mkpa? (b) N’ihi gịnị ka Chineke na-apụghị nnọọ iji gbanwee ikpe ọnwụ ahụ a mara ụmụ Adam?

3 Ihe mgbapụta ahụ bịara dị mkpa n’ihi mmehie Adam. Site n’inupụrụ Chineke isi, Adam hapụụrụ ụmụ ya ihe nketa nke bụ́ ọrịa, iru újú, ihe mgbu, na ọnwụ. (Jenesis 2:17; Ndị Rom 8:20) Chineke agaghị ekwe ka mmetụta mee ya ka ọ gbanwee amamikpe ọnwụ ahụ. Ime otú ahụ ga-abụ ileghara iwu ya onwe ya nyere anya: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Ọ bụrụkwa na Jehova emee ka ụkpụrụ ya nke ikpe ziri ezi gharazie ịdị irè, mgbe ahụ, a ga-enwe ọgba aghara na mmebi iwu ma n’eluigwe ma n’ụwa!

4, 5. (a) Olee otú Setan si bo Chineke ebubo ụgha, n’ihi gịnịkwa ka Jehova na-aghaghị iji zaghachi ihe ịma aka ndị ahụ? (b) Olee ihe Setan kwuru banyere ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe?

 4 Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 12, nnupụisi ahụ nke weere ọnọdụ n’Iden welitere ihe iseokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ ọbụna karị. Setan metọrọ aha ọma Chineke. Ya bụ, o boro Jehova ebubo na ọ bụ onye ụgha nakwa onye ọchịchị aka ike nke nwere obi ọjọọ, onye napụrụ ihe ndị o kere eke nnwere onwe. (Jenesis 3:1-5) Site n’ime ihe nke yiri ka o mebiela nzube Chineke nke bụ́ ime ka ndị ezi omume mejupụta ụwa, Setan kpọkwara Chineke onye na-apụghị imezu nzube ya. (Jenesis 1:28; Aịsaịa 55:10, 11) A sị na Jehova gbachiri nkịtị n’ihe ịma aka ndị a, ọtụtụ n’ime ihe ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi agaraghị enwekwa obi ike zuru ezu n’ịchịisi ya.

5 Setan bokwara ndị ohu Jehova na-eguzosi ike n’ihe ebubo ụgha, na-ekwu na ha na-ejere Ya ozi n’ihi ọchịchọ ọdịmma onwe ha nanị nakwa na ọ bụrụ na ha anọrọ n’oké ihe isi ike, na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. (Job 1:9-11) Ihe iseokwu ndị a dị nnọọ mkpa karịa ọnọdụ ọjọọ nke ụmụ mmadụ nọ n’ime ya. N’ụzọ ziri ezi, Jehova chere na ya aghaghị ịzaghachi ebubo ụgha ndị ahụ nke Setan. Ma olee otú Chineke pụrụ isi dozie ihe iseokwu ndị a ma zọpụtakwa ihe a kpọrọ mmadụ?

Ihe Mgbapụta—Ihe Ya na Ihe Hà Nhata

6. Olee ụfọdụ n’ime okwu ndị e ji mee ihe na Bible iji kọwaa ụzọ Chineke nke isi zọpụta ihe a kpọrọ mmadụ?

6 Ihe ngwọta Jehova nyere na-egosipụta ma obi ebere kasị ukwuu ma ikpe ziri ezi na-enweghị atụ—nke ọ na-adịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ichepụta ya n’echiche. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị nnọọ mfe n’ụzọ magburu onwe ya. E zogasịrị aka na ya dị ka ịzụrụ ihe, ịdịghachi ná mma, mgbapụta, ime udo, na ihe mkpuchi mmehie. (Abụ Ọma 49:8; Daniel 9:24; Ndị Galeshia 3:13; Ndị Kọlọsi 1:20; Ndị Hibru 2:17) Ma okwu nke kọwara ya n’ụzọ kasị mma, ma eleghị anya, bụ okwu ahụ Jizọs n’onwe ya ji mee ihe. Ọ sịrị: “Nwa nke  mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi nakwa ka o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta [Grik, lyʹtron] n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”—Matiu 20:28.

7, 8. (a) Gịnị ka okwu bụ́ “ihe mgbapụta” pụtara n’Akwụkwọ Nsọ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ihe mgbapụta si agụnye ihe na ihe ịha nhata?

7 Gịnị bụ ihe mgbapụta? E si na ngwaa nke pụtara “ịtọhapụ” nweta okwu Grik e ji mee ihe n’ebe a. E ji okwu a akọwa ego a kwụrụ iji tọhapụ ndị a dọọrọ n’agha. Ya mere, a pụrụ ịkọwa ihe mgbapụta n’ụzọ bụ́ isi dị ka ihe a kwụrụ iji zụtaghachi ihe. N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, okwu e ji eme ihe maka “ihe mgbapụta” (koʹpher) sitere na ngwaa nke pụtara “ikpuchi.” Nke a na-enyere anyị aka ịghọta na ịgbapụta pụtakwara ikpuchi mmehie.—Abụ Ọma 65:3.

8 N’ụzọ kwesịrị ịrịba ama, akwụkwọ bụ́ Theological Dictionary of the New Testament na-ekwu na okwu a (koʹpher) “na-egosi mgbe nile ihe ya na ihe hà nhata,” ma ọ bụ ihe na ihe ikwekọ. N’ihi ya, ihe mkpuchi nke igbe ọgbụgba ndụ ahụ nwere ọdịdị nke kwekọrọ n’igbe ahụ n’onwe ya. N’otu aka ahụ, iji gbapụta, ma ọ bụ kpuchie, mmehie, a ghaghị ịkwụ ihe kwekọrọ n’ụzọ zuru ezu, ma ọ bụ nke kpuchiri n’ụzọ zuru ezu, ihe mmehie ahụ mebiri. N’ihi ya, Iwu Chineke nyere Izrel kwuru, sị: “Ndụ laara ndụ, anya laara anya, ezé laara ezé, aka laara aka, ụkwụ laara ụkwụ.”—Deuterọnọmi 19:21.

9. N’ihi gịnị ka ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi ji jiri ụmụ anụmanụ chụọ àjà, oleekwa otú Jehova si lee àjà ndị dị otú ahụ anya?

9 Ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi malite n’Ebel gaa n’ihu ji ụmụ anụmanụ chụọrọ Chineke àjà. Site n’ime otú ahụ, ha gosipụtara na ha maara ihe banyere mmehie nakwa mkpa mgbapụta dị, ha gosikwara okwukwe ha nwere ná ntọhapụ Chineke kwere nkwa ya site n’aka “mkpụrụ” ya. (Jenesis 3:15; 4:1-4; Levitikọs 17:11; Ndị Hibru 11:4) Jehova nakweere àjà ndị dị otú ahụ ma gụọ ndị a na-efe ofufe ná ndị nwere nguzo dị mma. Ka o sina dị, àjà ndị e ji ụmụ anụmanụ chụọ bụ nanị, ma ọ karịsịa, ihe ngosipụta. Ụmụ anụmanụ apụghị  n’ezie ikpuchi mmehie ụmụ mmadụ, n’ihi na ha dị ala ma e jiri ha tụnyere ụmụ mmadụ. (Abụ Ọma 8:4-8) N’ihi ya, Bible na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ekwe ọbara ụmụ oké ehi na nke ewu omume iwepụ mmehie.” (Ndị Hibru 10:1-4) Àjà ndị dị otú ahụ na-ese nanị onyinyo, ma ọ bụ bụrụ ihe atụ, nke ezi àjà mgbapụta gaje ịbịa.

“Ihe Mgbapụta Kwekọrọ Ekwekọ”

10. (a) Ònye ka ya na onye mgbapụta ahụ na-aghaghị ikwekọ, n’ihi gịnịkwa? (b) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị otu mmadụ ka ọ dị mkpa ka e jiri chụọ àjà?

10 “Mmadụ nile na-anwụ n’ime Adam,” ka Pọl onyeozi kwuru. (1 Ndị Kọrint 15:22) N’ihi ya, ihe mgbapụta ahụ aghaghị ịgụnye ọnwụ nke onye ya na Adam hà nnọọ nhata—mmadụ zuru okè. (Ndị Rom 5:14) Ọ dịghị ụdị ihe ọzọ e kere eke pụrụ imezu ihe ikpe ziri ezi chọrọ. Ọ bụ nanị mmadụ zuru okè, onye na-anọghị n’okpuru ikpe ọnwụ ahụ a mara Adam, pụrụ inye “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ”—nke ya na Adam kwekọrọ nnọọ n’ụzọ zuru okè. (1 Timoti 2:6) Ọ gaghị adị mkpa ka e jiri ọtụtụ nde mmadụ chụọ àjà iji kwekọọ n’onye nke ọ bụla Adam mụrụ. Pọl onyeozi kọwara, sị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ [Adam] bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie.” (Ndị Rom 5:12) “Ebe ọnwụ [sitekwara] n’aka otu onye,” Chineke mere ndokwa maka mgbapụta nke ihe a kpọrọ mmadụ ‘site n’aka otu onye.’ (1 Ndị Kọrint 15:21) N’ụzọ dị aṅaa?

“Ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ maka mmadụ nile”

11. (a) Olee otú onye mgbapụta ahụ ga-esi “detụ ọnwụ ire maka mmadụ nile”? (b) N’ihi gịnị ka Adam na Iv na-apụghị iriteworị uru n’ihe mgbapụta ahụ? (Lee ihe odide ala ala peeji.)

11 Jehova mere ndokwa ka mmadụ zuru okè jiri ndụ ya chụọ àjà n’afọ ofufo. Dị ka Ndị Rom 6:23 si kwuo, “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” N’ịchụ ndụ ya n’àjà, onye mgbapụta ahụ ‘ga-edetụ ọnwụ ire maka mmadụ nile.’ N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ ga-akwụ ụgwọ mmehie nke Adam. (Ndị Hibru 2:9; 2 Ndị Kọrint 5:21; 1 Pita 2:24) Nke a ga-enwe ihe ndị dị ukwuu metụtara iwu ọ gụnyere. Site n’ịkagbu ikpe ọnwụ ahụ a mara ụmụ Adam na-erube isi, ihe mgbapụta ahụ ga-ewepụ  site na mkpọrọgwụ ya, ike mbibi ahụ mmehie nwere. *Ndị Rom 5:16.

12. Nye ihe atụ iji gosi otú ịkwụ otu ụgwọ e ji pụrụ isi baara ọtụtụ mmadụ uru.

12 Iji maa atụ: Ka e were ya na i bi n’otu obodo ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ime ya na-arụ ọrụ n’otu nnukwu ụlọ ọrụ na-emepụta ihe. A na-akwụ gị na ndị agbata obi gị ezigbo ụgwọ maka ọrụ unu na-arụ, unu na-ebikwa ndụ ntụsara ahụ́. Ọ dịgidere otú ahụ ruo ụbọchị ụlọ ọrụ ahụ kwụsịrị ịrụ ọrụ. N’ihi gịnị? N’ihi na manịja ụlọ ọrụ ahụ malitere ịrụrụ aka, wee mee ka ụlọ ọrụ ahụ baa n’ụgwọ. Na mberede, n’ihi na unu enwekwaghị ọrụ, gị na ndị agbata obi gị enweghị ike ịkwụ ụgwọ ndị unu ji. Ndị di ma ọ bụ nwunye unu, ụmụaka unu, na ndị unu ji ụgwọ nọ na-ata ahụhụ n’ihi nrụrụ aka nke otu onye ahụ. Ọ̀ dị ihe ngwọta ọ bụla dịnụ? Ee! Otu onye bara ọgaranya nke na-emesapụ aka kpebiri ime ihe. Ọ ghọtara uru ụlọ ọrụ ahụ bara. O nwekwara ọmịiko n’ahụ́ ọtụtụ ndị e were n’ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ tinyere ndị ezinụlọ ha. N’ihi ya, o mere ndokwa ịkwụchapụ ụgwọ nile ụlọ ọrụ ahụ ji ma mee ka ụlọ ọrụ ahụ maliteghachi ịrụ ọrụ. Ọkwụkwụ ọ kwụrụ otu ụgwọ ahụ e ji mere ka ahụhụ ọtụtụ ndị ahụ e were n’ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ na ndị ezinụlọ ha tinyere ndị ha ji ụgwọ na-ata belata. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọkwụkwụ a kwụrụ ụgwọ Adam ji baara ọtụtụ nde mmadụ uru.

Ònye Nyere Ihe Mgbapụta Ahụ?

13, 14. (a) Olee otú Jehova si nye ihe mgbapụta ahụ maka ihe a kpọrọ mmadụ? (b) Ònye ka a kwụrụ ihe mgbapụta ahụ, n’ihi gịnịkwa ka ịkwụ ụgwọ dị otú ahụ ji dị mkpa?

13 Ọ bụ nanị Jehova pụrụ inye “Nwa Atụrụ [ahụ] . . . nke na-ewepụ mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29) Ma Chineke eziteghị  nnọọ mmụọ ozi ọ bụla ọ hụrụ ka ọ bịa napụta ihe a kpọrọ mmadụ. Kama nke ahụ, o zitere Onye ahụ nke pụrụ inye azịza ga-abụ nkwubi okwu nye ebubo Setan boro ndị ohu Jehova. Ee, Jehova chụrụ àjà kasị ukwuu nke bụ́ izite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ onye “ihe [ya] na-atọ Ya ụtọ.” (Ilu 8:30) Ọkpara Chineke ji ọchịchọ obi ya ‘mee onwe ya ihe efu’ ma hapụ ọdịdị o nwere n’eluigwe. (Ndị Filipaị 2:7) N’ụzọ ọrụ ebube, Jehova bufere n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ onye Juu nke aha ya bụ Meri, ndụ nke Ọkpara ya n’eluigwe, bụ́ onye o bu ụzọ mụọ, na ụdị onye ọ bụ. (Luk 1:27, 35) Dị ka mmadụ, a ga-akpọ ya Jizọs. Ma a bịa n’ụzọ iwu, a pụrụ ịkpọ ya Adam nke abụọ, n’ihi na ya na Adam kwekọrọ n’ụzọ nile. (1 Ndị Kọrint 15:45, 47) Ya mere, Jizọs pụrụ iji onwe ya chụọ àjà dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie.

14 Ònye ka a ga-akwụ ihe mgbapụta ahụ? Abụ Ọma 49:7 kwuru kpọmkwem na ọ bụ “Chineke” ka a ga-akwụ ihe mgbapụta ahụ. Ma, ọ́ bụghị Jehova mere ndokwa maka ihe mgbapụta ahụ ma e kwuwerị? Ee, ma nke a adịghị eme ka ihe mgbapụta ahụ ghọzie nanị mgbanwerịta ihe nke na-enweghị isi, nke e mere nanị iji mezuo iwu—dị ka isi n’otu akpa uwe wepụta ego tinye ya n’ọzọ. E kwesịrị ịghọta na ihe mgbapụta ahụ abụghị mgbanwerịta ihe nkịtị, kama ọ bụ mgbanwere ihe n’ụzọ iwu. Site n’ikwu ka a kwụọ ihe mgbapụta ahụ, ọbụna n’agbanyeghị na o furu ya ihe dị ukwuu, Jehova gosipụtara mgbaso ọ na-agbasosi ikpe ya ziri ezi ike.—Jenesis 22:7, 8, 11-13; Ndị Hibru 11:17; Jems 1:17.

15. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka Jizọs taa ahụhụ ma nwụọ?

15 N’oge opupu ihe ubi nke 33 O.A., Jizọs Kraịst ji obi ya dum kweta idi nhụsianya nke dugara n’ọkwụkwụ nke ihe mgbapụta ahụ. O kwere ka e jide ya n’ihi ebubo ụgha dị iche iche, maa ya ikpe, ma kpọgide ya n’elu osisi e ji egbu mmadụ. Ọ̀ dị mkpa n’ezie ka Jizọs taa nnukwute ahụhụ dị otú ahụ? Ee, n’ihi na a ghaghị idozi ihe iseokwu metụtara iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ohu Chineke. N’ụzọ kwesịrị ịrịba ama, Chineke ekweghị ka Herọd gbuo nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jizọs. (Matiu 2:13-18) Ma mgbe Jizọs ghọrọ dimkpa, ọ nagideliri mwakpo  ọjọọ nile nke Setan, na-aghọta ihe iseokwu ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu. * Site n’ịnọgide “na-eguzosi ike n’ihe, [bụrụ] onye na-adịghị aghụghọ, onye a na-emerụghị emerụ, onye e kewapụrụ n’ebe ndị mmehie nọ” n’agbanyeghị mmeso ọjọọ e mesoro ya, Jizọs gosipụtara n’ụzọ wetara okwu ahụ ná njedebe na Jehova nwere ndị ohu bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe ha nọ n’ule. (Ndị Hibru 7:26) Ka a sịkwa ihe mere na kpọmkwem tupu ya anwụọ, Jizọs tiri mkpu mmeri, sị: “E mechawo ya!”—Jọn 19:30.

Ịrụzu Ọrụ Mgbapụta Ya

16, 17. (a) Olee otú Jizọs si gaa n’ihu n’ịrụ ọrụ mgbapụta ya? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka Jizọs chee onwe ya “n’ihu Chineke n’onwe ya maka anyị”?

16 Jizọs arụchabeghị ọrụ mgbapụta ya. N’ụbọchị nke atọ mgbe Jizọs nwụsịrị, Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ. (Ọrụ 3:15; 10:40) Site n’ihe a dị mkpa O mere, ọ bụghị nanị na Jehova kwụghachiri Ọkpara ya ụgwọ maka ozi o ji ikwesị ntụkwasị obi jee kama o nyere ya ohere ịrụzu ọrụ mgbapụta ya dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà Chineke. (Ndị Rom 1:4; 1 Ndị Kọrint 15:3-8) Pọl onyeozi na-akọwa, sị: “Mgbe Kraịst bịara dị ka nnukwu onye nchụàjà . . . , ee e, o jighị ọbara ewu na nke ụmụ oké ehi banye, kama o ji ọbara nke ya, nanị otu ugboro n’ime ebe nsọ ahụ wee nwetara anyị mgbapụta ebighị ebi. N’ihi na Kraịst banyere, ọ bụghị n’ebe nsọ e ji aka mee, bụ́ ihe atụ nke ihe bụ ezie, kama n’ime eluigwe n’onwe ya, ịpụta ugbu a n’ihu Chineke n’onwe ya maka anyị.”—Ndị Hibru 9:11, 12, 24.

17 Kraịst apụghị iji ọbara nkịtị ya gaa eluigwe. (1 Ndị Kọrint 15:50) Kama nke ahụ, o ji ihe ọbara ahụ nọchitere anya ya:  ọnụ ahịa iwu kwadoro nke ndụ ya dị ka mmadụ zuru okè bụ́ nke a chụrụ n’àjà. Mgbe ahụzi, n’ihu Chineke n’onwe ya, o chere ọnụ ahịa nke ndụ ahụ dị ka ihe mgbapụta iji gbanwere ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie. Jehova ọ̀ nakweere àjà ahụ? Ee, nke a pụtakwara ìhè na Pentikọst 33 O.A., mgbe a wụkwasịrị mmadụ 120 bụ́ ndị na-eso ụzọ nọ na Jeruselem mmụọ nsọ. (Ọrụ 2:1-4) Ọ bụ ezie na nke ahụ bụ ihe na-akpali akpali, abamuru ndị magburu onwe ha ihe mgbapụta ahụ ga-eweta ka na-amalite amalite.

Abamuru nke Ihe Mgbapụta Ahụ

18, 19. (a) Ìgwè mmadụ abụọ dị aṅaa na-erite uru n’ime ka a dịghachi ná mma ahụ nke ọbara Kraịst mere ka o kwe omume? (b) Nye ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ ahụ,’ olee ụfọdụ n’ime abamuru nke ihe mgbapụta ahụ n’oge a nakwa n’ọdịnihu?

18 N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọlọsi, Pọl kọwara na Chineke hụrụ na ọ dị mma isite n’aka Kraịst mee ka Ya na ihe ndị ọzọ nile dịghachi ná mma site n’iji ọbara ahụ Jizọs wụsịrị n’osisi ịta ahụhụ mee udo. Pọl kọwakwara na ime ka a dịghachi ná mma a na-agụnye ìgwè mmadụ abụọ dịwagara nnọọ iche, nke bụ́, “ihe ndị dị n’eluigwe” na “ihe ndị dị n’elu ụwa.” (Ndị Kọlọsi 1:19, 20; Ndị Efesọs 1:10) Ndị mejupụtara ìgwè nke mbụ ahụ bụ Ndị Kraịst dị 144,000, bụ́ ndị e nyere olileanya nke ije ozi dị ka ndị nchụàjà n’eluigwe na iso Kraịst Jizọs chịa ụwa dị ka ndị eze. (Mkpughe 5:9, 10; 7:4; 14:1-3) Site n’aka ha, a ga-eji nke nta nke nta jiri uru nke ihe mgbapụta ahụ mee ihe n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi nọ ruo otu puku afọ.—1 Ndị Kọrint 15:24-26; Mkpughe 20:6; 21:3, 4.

19 “Ihe ndị dị n’elu ụwa” bụ ndị ahụ gaje ịdị ndụ zuru okè n’ime Paradaịs n’elu ala. Mkpughe 7:9-17 na-akọwa ha dị ka “oké ìgwè mmadụ” bụ́ ndị ga-adị ndụ gabiga “oké mkpagbu” ahụ na-abịanụ. Ma ọ dịghị mkpa na ha ga-echere ruo mgbe ahụ tupu ha amalite inweta uru ndị ihe mgbapụta ahụ ga-eweta. Ha ‘asaworị uwe mwụda ha ma mee ka ha na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’ N’ihi na ha nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, ha na-enweta ọbụna ugbu a uru  ime mmụọ site ná ndokwa ịhụnanya ahụ. A gụwo ha ná ndị ezi omume dị ka ndị enyi Chineke! (Jems 2:23) N’ihi àjà Jizọs chụrụ, ha pụrụ “[iji] nkwuwa okwu na-abịaru nso n’ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ.” (Ndị Hibru 4:14-16) Mgbe ha mehiere, a na-agbaghara ha mmehie ha n’ezie. (Ndị Efesọs 1:7) N’agbanyeghị na ha bụ ndị na-ezughị okè, ha nwere akọ na uche dị ọcha. (Ndị Hibru 9:9; 10:22; 1 Pita 3:21) N’ihi ya, ha ịbụ ndị ha na Chineke dịghachiri ná mma abụghị ihe a na-atụ anya ya ka ga-eme eme, kama ọ bụ ihe meworo eme ugbu a! (2 Ndị Kọrint 5:19, 20) N’ime Narị Afọ Iri ahụ, a ga-eji nke nta nke nta mee ka ha “nwere onwe [ha] pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure,” ha ga-emesịkwa “nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:21.

20. Olee otú ịtụgharị uche n’ihe mgbapụta ahụ si emetụta gị onwe gị?

20 ‘Ekele dịrị Chineke site na Jizọs Kraịst’ maka ihe mgbapụta ahụ! (Ndị Rom 7:25, Bible Nsọ nke Union Version) Ọ dị mfe ịkọwa ihe ndị ọ gụnyere ma ọ dị nnọọ omimi nke na ọ na-emetụ anyị n’ahụ́. (Ndị Rom 11:33) Sitekwa n’ịtụgharị uche na ya n’ụzọ na-egosi ekele, ihe mgbapụta ahụ na-emetụ anyị n’obi, na-eme ka anyị nọgide na-abịarukwu Chineke nke ikpe ziri ezi nso. Dị ka ọbụ abụ ahụ, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-eto Jehova dị ka ‘onye na-ahụ ezi omume na ezi ikpe n’anya.’—Abụ Ọma 33:5.

^ par. 11 Adam na Iv apụghị iriteworị uru n’ihe mgbapụta ahụ. Iwu Mozis kwupụtara ụkpụrụ a banyere onye ma ụma gbuo mmadụ: “Unu anarakwala ihe mgbapụta n’ọnọdụ ndụ ogbu mmadụ, nke ikpe ịnwụ ọnwụ maworo.” (Ọnụ Ọgụgụ 35:31) N’ụzọ doro anya, Adam na Iv kwesịrị ịnwụ n’ihi na ha ji ọchịchọ obi ha mara ụma nupụrụ Chineke isi. Ha si otú ahụ tụfuo ohere ha nwere ịdị ndụ ebighị ebi.

^ par. 15 Iji kagbuo mmehie Adam, Jizọs nwụrụ, ọ bụghị dị ka nwatakịrị zuru okè, kama dị ka nwoke zuru okè. Chetakwa, Adam ma ụma mehie, ọ maara nke ọma otú omume ahụ dịruru ná njọ nakwa ihe ndị ga-esi na ya pụta. Ya mere, iji ghọọ “Adam ikpeazụ” ma kpuchie mmehie ahụ, Jizọs mere mkpebi o chebaara echiche nke ọma, nke ọ ma ụma mee, ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova. (1 Ndị Kọrint 15:45, 47) N’ihi ya, ụzọ ndụ Jizọs nile—gụnyere ọnwụ ọ nwụrụ iji chụọ àjà—bụ ‘otu ime ihe ziri ezi.’—Ndị Rom 5:18, 19.