Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 11

“Ụzọ Ya Nile Bụ Ikpe Ziri Ezi”

“Ụzọ Ya Nile Bụ Ikpe Ziri Ezi”

1, 2. (a) Ajọ ikpe na-ezighị ezi dị aṅaa ka e kpere Josef? (b) Olee otú Jehova si dozie ikpe ahụ na-ezighị ezi?

Ọ BỤ nnọọ ikpe na-ezighị ezi. Ọ dịghị ihe ọjọọ nwa okorobịa ahụ mara mma mere, n’agbanyeghị nke ahụ a tụbara ya n’ụlọ mkpọrọ dị n’okpuru ala, bo ya ebubo ụgha na ọ nwara idina mmadụ n’ike. Ma nke a abụghị nke mbụ e kpere ya ikpe na-ezighị ezi. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, mgbe nwa okorobịa a bụ́ Josef dị afọ 17, ụmụnne ya, bụ́ ndị ọ fọrọ nke nta ka ha gbuo ya, raara ya nye. N’oge ahụ, ha renyere ya n’ịbụ ohu n’ala ọzọ. N’ebe ahụ, ọ jụrụ mgbalị nwunye nna ya ukwu na-eme ka ya na ya nwee mmekọahụ. Nwanyị ahụ ọ jụrụ iso nwee mmekọahụ kpara nkata ma bo ya ebubo ụgha, ọ bụkwa otú ahụ ka o si banye n’ụlọ mkpọrọ. N’ụzọ dị mwute, o yiri ka ọ dịghị onye ga-arịọchitere Josef arịrịọ.

Josef tara ahụhụ n’ụzọ na-ezighị ezi “n’olulu” ụlọ mkpọrọ

2 Otú ọ dị, Chineke bụ́ onye “na-ahụ ezi omume na ezi ikpe n’anya” nọ na-ele ihe na-emenụ. (Abụ Ọma 33:5) Jehova mere ihe iji dozie ikpe ahụ na-ezighị ezi, gbanwegharịa ihe, nke mere na e mesịrị tọhapụ Josef. Tụkwasị na nke ahụ, e mesịrị mee ka Josef—nwoke a tụkpuburu “n’olulu” ụlọ mkpọrọ—nọrọ n’ọkwá dị nnọọ elu, na nke oké nsọpụrụ dị na ya. (Jenesis 40:15; 41:41-43; Abụ Ọma 105:17, 18) N’ikpeazụ, e gosipụtara na aka Josef dị ọcha, o jikwa ọkwá ya dị elu mee ka nzube Chineke mezuo.—Jenesis 45:5-8.

3. Gịnị mere na ọ bụghị ihe ijuanya na anyị nile na-achọ ka a na-emeso anyị ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi?

3 Ihe ndekọ dị otú ahụ na-emetụ anyị n’ahụ́, ka ọ́ dịghị emetụ? Olee onye n’ime anyị nke na-ahụbeghị ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ nke a na-ekpebeghị ikpe na-ezighị ezi? N’ezie, ọ na-agụsi anyị nile agụụ ike ka a na-emeso anyị ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi, n’eleghị mmadụ anya n’ihu. Nke a abụghị ihe ijuanya n’ihi na Jehova kenyere n’ime anyị àgwà ndị na-egosipụta ụdị onye ọ bụ, ikpe ziri ezi bụkwa otu n’ime  àgwà ya ndị bụ́ isi. (Jenesis 1:27) Iji mara Jehova nke ọma, ọ dị anyị mkpa ịghọta echiche ya banyere ikpe ziri ezi. N’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ ịghọtakwu ụzọ ya ndị magburu onwe ha ọbụna karị ma bụrụ ndị a kpaliri ịbịarukwu ya nso.

Gịnị Bụ Ikpe Ziri Ezi?

4. Dị ka mmadụ si ele ihe anya, olee otú e si aghọtakarị ikpe ziri ezi?

4 Dị ka mmadụ si ele ihe anya, a na-aghọtakarị ikpe ziri ezi nanị dị ka iji ụkpụrụ iwu eme ihe n’ụzọ eleghị mmadụ anya n’ihu. Akwụkwọ bụ́ Right and Reason—Ethics in Theory and Practice na-ekwu na “e jikọtara ikpe ziri ezi na iwu, ibu ọrụ, ihe ndị ruuru mmadụ, na ọrụ dị iche iche, na-enyekwa ụgwọ ọrụ ya n’ụzọ há nhata ma ọ bụ dị ka ihe mmadụ metara si dị.” Otú ọ dị, ikpe ziri ezi Jehova na-agụnye ihe karịrị iji ụkpụrụ eme ihe n’eleghị anya n’azụ n’ihi na ọ bụ ibu ọrụ ma ọ bụ ihe a ga-emerịrị.

5, 6. (a) Gịnị ka okwu ndị e ji mee ihe n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible bụ́ ndị a sụgharịrị ịbụ “ikpe ziri ezi” pụtara? (b) Gịnị ka ọ pụtara na Chineke na-eme ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi?

5 A pụrụ ịghọta akụkụ nile nke ikpe ziri ezi Jehova nke ọma karị site n’ịtụle okwu ndị e ji mee ihe n’ime Bible n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya. N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e ji okwu atọ bụ́ isi mee ihe. A pụkwara ịsụgharị okwu a na-asụgharịkarị “ikpe ziri ezi” ka ọ bụrụ “ihe ziri ezi.” (Jenesis 18:25, NW) A na-asụgharịkarị okwu abụọ ndị ọzọ ịbụ “ezi omume.” N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, a na-akọwa okwu a sụgharịrị ịbụ “ezi omume” dị ka “àgwà nke ime ihe ziri ezi ma ọ bụ ime ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi.” Mgbe ahụ, n’ụzọ bụ́ isi, e nweghị ọdịiche dị n’etiti ezi omume na ikpe ziri ezi.—Emọs 5:24.

6 Ya mere, mgbe Bible na-ekwu na Chineke na-eme ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi, ọ na-agwa anyị na ọ na-eme ihe ziri ezi, na-akwụwakwa aka ọtọ nakwa na ọ na-eme otú ahụ mgbe nile, n’eleghị mmadụ anya n’ihu. (Ndị Rom 2:11) N’ezie, ọ bụ ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche na ọ ga-eme ihe dị iche na nke ahụ. Elaịhu kwesịrị ntụkwasị obi kwuru, sị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ, bụ́ imebi iwu; ya bụrụkwa Onye pụrụ ime  ihe nile ihe arụ, bụ́ ime ajọ omume.” (Job 34:10) N’ezie, ọ bụ ihe na-apụghị ikwe omume Jehova “ime ajọ omume.” N’ihi gịnị? N’ihi ihe abụọ dị mkpa.

7, 8. (a) Gịnị mere na Jehova enweghị ike ime ihe n’ụzọ ikpe na-ezighị ezi? (b) Gịnị na-akwali Jehova ime ezi omume, ma ọ bụ ime ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi, n’otú o si eme ihe?

7 Nke mbụ, ọ dị nsọ. Dị ka anyị rịbara ama n’Isi nke 3, Jehova dị ọcha ma zie ezi n’ụzọ na-enweghị nsọtụ. N’ihi ya, o nweghị ike ime ajọ omume, ma ọ bụ ime ihe n’ụzọ ikpe na-ezighị ezi. Tụlee ihe nke ahụ pụtara. Ịdị nsọ nke Nna anyị nke eluigwe na-eme ka anyị nwee ezi ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na ọ dịghị mgbe ọ ga-emegbu ụmụ ya. Jizọs nwere obi ike dị otú ahụ. N’abalị ikpeazụ nke ndụ ya n’elu ala, o kpere ekpere, sị: “Nna dị nsọ, chee ha [ndị na-eso ụzọ ya] nche n’ihi aha gị.” (Jọn 17:11) N’Akwụkwọ Nsọ, ọ bụ nanị Jehova nwe utu aha ahụ—“Nna dị nsọ.” Nke a kwesịrị ekwesị, n’ihi na ọ dịghị nna bụ́ mmadụ nke a pụrụ iji tụnyere Ya n’ịdị nsọ. Jizọs nwere obi ike zuru ezu na Nna ya, bụ́ onye dị ọcha n’ụzọ nile, onye dokwara onwe ya iche pụọ ná mmehie nile ga-echebe ndị na-eso ụzọ ya.—Matiu 23:9.

8 Nke abụọ, ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị bụ akụkụ nke ụdị onye Chineke bụ. Ịhụnanya dị otú ahụ na-akwali ya ime ezi omume, ma ọ bụ ime ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi, mgbe ọ na-emeso ndị ọzọ ihe. Ma ihe ndị na-akpatakarị ikpe na-ezighị ezi n’ụdị ya dị iche iche—gụnyere ịkpa ókè agbụrụ, nkewa, na ile mmadụ anya n’ihu—bụ anyaukwu na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, bụ́ ihe ndị na-emegide ịhụnanya. Banyere Chineke nke ịhụnanya, Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Onye ezi omume ka Jehova bụ; ezi omume ka Ọ hụrụ n’anya.” (Abụ Ọma 11:7) Jehova na-ekwu banyere onwe ya, sị: “Mụ onwe m, Jehova, na-ahụ ikpe ziri ezi n’anya.” (Aịsaịa 61:8) Ọ́ bụghị ihe na-akasi obi ịmara na ọ na-atọ Chineke anyị ụtọ ime ihe ziri ezi, ma ọ bụ n’ụzọ ikpe ziri ezi?—Jeremaịa 9:24.

 Ebere na Ikpe Zuru Okè nke Jehova

9-11. (a) Olee njikọ dị n’agbata ikpe ziri ezi Jehova na ebere ya? (b) Olee otú ikpe ziri ezi Jehova na ebere ya si pụta ìhè n’ụzọ o si emeso ụmụ mmadụ na-eme mmehie?

9 Ikpe ziri ezi nke Jehova, dịkwa ka akụkụ ọ bụla ọzọ nke ụdị onye na-enweghị atụ ọ bụ, zuru okè, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ na ya. N’ito Jehova, Mozis dere, sị: “Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:3, 4) Ngosipụta ọ bụla nke ikpe ziri ezi nke Jehova enweghị ntụpọ—ọ dịghị eme ebere gabiga ókè, ọ dịghịkwa enye ntaramahụhụ gabiga ókè.

10 E nwere njikọ chiri anya n’agbata ikpe ziri ezi Jehova na ebere ya. Abụ Ọma 116:5 na-ekwu, sị: “Onye amara na onye ezi omume [“onye na-eme ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi,” The New American Bible] ka Jehova bụ; ee, Chineke anyị nwere obi ebere.” Ee, Jehova na-eme ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi, nweekwa obi ebere. Àgwà abụọ ahụ adịghị emegide onwe ha. Ya ime ebere abụghị imebi ikpe ziri ezi ya, dị ka à ga-asị na ma ọ́ bụghị otú ahụ ikpe ziri ezi ya gaara abụ nke obi ịta mmiri. Kama nke ahụ, ọ na-egosipụtakarị àgwà abụọ ahụ otu mgbe, ọbụna n’otu ihe omume. Tụlee otu ihe atụ.

11 Mmadụ nile ketara mmehie, n’ihi ya kwa, ha kwesịrị inweta ntaramahụhụ mmehie—ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Ma ọnwụ ndị mmehie adịghị atọ Jehova ụtọ. Ọ bụ “Chineke nke mgbaghara mmehie, Onye na-eme amara nweekwa obi ebere.” (Nehemaịa 9:17) N’agbanyeghị nke ahụ, ebe ọ bụ na ọ dị nsọ, ọ pụghị ịgbachi ajọ omume nkịtị. Oleezi otú ọ ga-esi nwee ike imere ụmụ mmadụ ketara mmehie eketa ebere? A na-achọta azịza ya n’otu n’ime eziokwu dị oké ọnụ ahịa karịsịa, ndị dị n’Okwu Chineke: ndokwa Jehova mere maka ihe mgbapụta maka nzọpụta nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’Isi nke 14, anyị ga-amụtakwu banyere ndokwa ịhụnanya a. N’otu oge ahụkwa, ọ bụ nnọọ ime ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi,  bụrụkwa ebere na-enweghị atụ. Site na ya, Jehova pụrụ imere ndị mmehie nwere nchegharị ebere n’emebighị ụkpụrụ ikpe ziri ezi ya nke zuru okè.—Ndị Rom 3:21-26.

Ikpe Ziri Ezi nke Jehova Na-enye Obi Ụtọ

12, 13. (a) N’ihi gịnị ka ikpe ziri ezi Jehova ji adọta anyị n’ebe ọ nọ? (b) Nkwubi okwu dị aṅaa ka Devid ruru banyere ikpe ziri ezi Jehova, oleekwa otú nke a pụrụ isi kasie anyị obi?

12 Ikpe ziri ezi nke Jehova abụghị àgwà obi ịta mmiri, nke na-eme ka anyị na-agbara ya ọsọ, kama ọ bụ àgwà na-adọrọ adọrọ nke na-eme ka anyị bịaruo ya nso. Bible na-akọwa n’ụzọ doro anya otú ikpe ziri ezi ma ọ bụ ezi omume Jehova si bụrụ nke ọmịiko. Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ na-enye obi ụtọ Jehova si egosipụta ikpe ziri ezi ya.

13 Ikpe zuru okè nke Jehova na-akwali ya igosi ikwesị ntụkwasị obi na iguzosi ike n’ihe nye ndị ohu ya. Ọbụ abụ bụ́ Devid ghọtara akụkụ a nke ikpe ziri ezi Jehova site n’ahụmahụ o nwere n’onwe ya. Gịnị ka Devid kwubiri dabere n’ahụmahụ o nwere n’onwe ya nakwa site n’ịmụ banyere ụzọ Chineke si eme ihe? O kwupụtara, sị: “Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, Ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere Ya; ruo mgbe ebighị ebi ka a na-edebe ha.” (Abụ Ọma 37:28) Lee mmesi obi ike nke na-enye nkasi obi nke ahụ bụ! Ọ dịtụghị mgbe ọ bụla Chineke anyị ga-agbahapụ ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya. N’ihi ya, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-anọ anyị nso ma jiri ịhụnanya na-elekọta anyị. Ikpe ziri ezi ya na-eme ka e jide nke a n’aka!—Ilu 2:7, 8.

14. Olee otú nchegbu Jehova na-enwe maka ndị ụwa na-atụ n’ọnụ si pụta ìhè n’Iwu ahụ o nyere Izrel?

14 Ikpe ziri ezi nke Chineke na-agụnye ịmata nnọọ mkpa nke ndị na-ata ahụhụ. Nchegbu Jehova na-enwe maka ndị ụwa na-atụ n’ọnụ pụtara ìhè n’Iwu ahụ o nyere Izrel. Dị ka ihe atụ, Iwu ahụ mere ndokwa pụrụ iche iji hụ na e lekọtara ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ. (Deuterọnọmi 24:17-21) N’ịmata otú ndụ pụrụ isi siere ezinụlọ ndị dị otú ahụ ike, Jehova n’onwe ya ghọrọ Onyeikpe na Onye Nchebe ha  nke na-emeso ha dị ka nna, onye “na-eme ihe e kpere n’ikpe banyere nwa mgbei na nwanyị di ya nwụrụ.” (Deuterọnọmi 10:18; Abụ Ọma 68:5) Jehova dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị na ọ bụrụ na ha emegbuo ndị inyom na ụmụaka na-apụghị ịzọ onwe ha, na ya ga-anụrịrị mkpu ákwá nke ndị dị otú ahụ. O kwuru, sị: “Iwe m ga-adị ọkụ.” (Ọpụpụ 22:22-24) Ọ bụ ezie na iwe esoghị n’àgwà ndị bụ́ isi nke Jehova, a na-akpali ya iwe iwe ezi omume ma ọ bụrụ na a mara ụma mee omume ikpe na-ezighị ezi, karịsịa mgbe ndị e mesoro ya bụ ndị dị ala na ndị na-enweghị onye inyeaka.—Abụ Ọma 103:6.

15, 16. Gịnị bụ ihe àmà dị ịrịba ama n’ezie nke eleghị mmadụ anya n’ihu nke Jehova?

15 Jehova na-emesikwa anyị obi ike na ya ‘adịghị ahụ mmadụ ihu ọma n’ikpe, na ya adịghịkwa anara ihe iri ngo.’ (Deuterọnọmi 10:17) N’adịghị ka ọtụtụ ụmụ mmadụ bụ́ ndị nwere ike ma ọ bụ ikike, ihe onwunwe ma ọ bụ ọdịdị elu ahụ́ adịghị emegharị Jehova anya. Ọ dịghị enwe ajọ mbunobi, ọ naghịkwa emelara otu onye ihe ma ọlị. Tụlee otu ihe àmà dị nnọọ ịrịba ama nke eleghị mmadụ anya n’ihu nke Jehova. Ọ bụghị nanị mmadụ ole na ole nọ n’ọkwá dị elu nwere ohere nke ịghọ ndị na-efe ya ezi ofufe, na-enwe olileanya nke ịdị ndụ na-enweghị ọgwụgwụ. Kama nke ahụ, “ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ohere a magburu onwe ya dịịrị mmadụ nile n’agbanyeghị ọnọdụ ha ná ndụ, ụcha akpụkpọ ahụ́ ha, ma ọ bụ mba ha bi na ya. Nke ahụ ọ́ bụghị ikpe ziri ezi kasị ukwuu?

16 E nwere ihe ọzọ banyere ikpe ziri ezi Jehova bụ́ nke zuru okè nke ọ dị mkpa ka anyị tụlee ma kwanyere ùgwù: ụzọ o si emeso ndị mebiri ụkpụrụ ezi omume ya.

Ọ Dịghị Mgbe A Ga-agụ Ndị Ikpe Mara ná Ndị Ikpe Na-amaghị

17. Kọwaa ihe mere ikpe na-ezighị ezi ndị dị n’ụwa a na-adịghị eme ma ọlị ka a na-enyo ikpe ziri ezi Jehova enyo.

17 Ụfọdụ pụrụ ịdị na-eche sị: ‘Ebe ọ bụ na Jehova adịghị  agbachi ajọ omume nkịtị, olee ihe kpatara nhụjuanya na-ezighị ezi na omume rụrụ arụ ndị juru ebe nile n’ụwa taa?’ Ikpe na-ezighị ndị dị otú ahụ adịghị eme ma ọlị ka a na-enyo ikpe ziri ezi Jehova enyo. Ọtụtụ ikpe na-ezighị ezi ndị e nwere n’ime ajọ ụwa a bụ n’ihi mmehie ụmụ mmadụ ketara site n’aka Adam. N’ime ụwa ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè họrọwooro ụzọ mmehie nke ha, ikpe na-ezighị ezi juru ebe nile—ma ọ gaghị adịte aka.—Deuterọnọmi 32:5.

18, 19. Gịnị na-egosi na Jehova agaghị agbachi ndị ma ụma na-emebi iwu ezi omume ya nkịtị ruo mgbe ebighị ebi?

18 Ọ bụ ezie na Jehova na-egosipụta obi ebere dị ukwuu n’ebe ndị ji obi eziokwu na-abịaru ya nso nọ, ọ gaghị agbachi nkịtị ka ọnọdụ nke na-ewetara aha nsọ ya nkọcha dịgide ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 74:10, 22, 23) Chineke nke ikpe ziri ezi abụghị onye a ga-akwa emo; ọ gaghị egbochi ndị ma ụma na-eme mmehie ịnata ikpe ọmụma nke kwesịrị ụzọ ndụ ha. Jehova bụ “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; . . . ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” (Ọpụpụ 34:6, 7) N’ikwekọ n’okwu ndị a, mgbe ụfọdụ Jehova ahụwo na ọ dị mkpa imezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ ndị ma ụma na-emebi iwu ezi omume ya.

19 Were dị ka ihe atụ, otú Chineke si mesoo ndị Izrel oge ochie ihe. Ọbụna mgbe ha biriwooro n’Ala Nkwa ahụ, ụmụ Izrel gosipụtara ekwesịghị ntụkwasị obi ugboro ugboro. Ọ bụ ezie na ụzọ ha rụrụ arụ ‘wutere’ Jehova, ọ gbahapụghị ha ozugbo. (Abụ Ọma 78:38-41) Kama nke ahụ, o ji obi ebere nyekwuo ha ohere ịgbanwe ụzọ ha. Ọ rịọrọ, sị: “Ọnwụ nke onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ ma ọlị; kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ: chigharịanụ, sinụ n’ụzọ ọjọọ nile unu chigharịa; ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka unu ga-anwụ, ụlọ Izrel?” (Ezikiel 33:11) N’ile ndụ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, Jehova zigara ndị amụma  ya ugboro ugboro ka ndị Izrel wee nwee ike isi n’ụzọ ọjọọ ha chigharịa. Ma n’ozuzu ha, ndị ahụ kpọrọ ekwo nkụ jụrụ ige ntị ma chegharịa. N’ikpeazụ, n’ihi aha nsọ ya na ihe nile ọ gụnyere, Jehova nyefere ha n’aka ndị iro ha.—Nehemaịa 9:26-30.

20. (a) Gịnị ka ụzọ Jehova si mesoo Izrel ihe na-akụziri anyị banyere ya? (b) N’ihi gịnị ka ọdụm ji bụrụ ihe atụ dabara adaba nke ikpe ziri ezi Jehova?

20 Otú Jehova si mesoo ndị Izrel na-akụziri anyị ọtụtụ ihe banyere ya. Anyị na-amụta na anya ya nke na-ahụ ihe nile na-ahụ ajọ omume nakwa na ihe ọ na-ahụ na-emetụta ya nke ukwuu. (Ilu 15:3) Ọ bụkwa ihe na-emesi obi ike ịmara na ọ na-achọ ime ebere ma ọ bụrụ na e nwere ihe mere ọ ga-eji mee otú ahụ. Ọzọkwa, anyị na-amụta na ọ dịghị ekpe ikpe ziri ezi ya ọkụ ọkụ. N’ihi ndidi na ogologo ntachi obi Jehova, ọtụtụ ndị na-ekwubi n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ dịghị mgbe ọ ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ ndị ajọ omume. Ma nke ahụ abụghị eziokwu ma ọlị, n’ihi na ụzọ Chineke si mesoo Izrel ihe na-akụzikwara anyị na ndidi Chineke nwere ebe ọ ga-ejedebe. Jehova na-akwụsi ike maka ezi omume. N’adịghị ka ụmụ mmadụ, bụ́ ndị na-alakarị azụ n’ikpe ikpe ziri ezi, ọ dịghị mgbe ọ na-enweghị obi ike iji mee ihe ziri ezi. N’ụzọ dabara adaba, e jikọtara ọdụm, bụ́ ihe atụ nke ikpe ziri ezi e ji obi ike na-ekpe, na ihu Chineke nakwa  ocheeze ya. * (Ezikiel 1:10; Mkpughe 4:7) N’ihi ya, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-emezu nkwa o kwere nke bụ́ ikpochapụ ikpe na-ezighị ezi n’ụwa a. Ee, a pụrụ isi otú a chịkọta ụzọ o si ekpe ikpe: ịkwụsi ike n’ebe ọ bụla ọ dị mkpa, ebere n’ebe ọ bụla o kwere mee.—2 Pita 3:9.

Ịbịaru Chineke nke Ikpe Ziri Ezi Nso

21. Mgbe anyị tụgharịrị uche n’otú Jehova si ekpe ikpe ziri ezi, olee otú anyị kwesịrị isi were ya, n’ihi gịnịkwa?

21 Mgbe anyị tụgharịrị uche n’otú Jehova si ekpe ikpe ziri ezi, anyị ekwesịghị iwere ya dị ka onyeikpe nke na-enweghị obi ebere, onye obi tara mmiri, onye ihe dị ya mkpa bụ nanị ịma ndị mere ihe ọjọọ ikpe. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị iwere ya dị ka Nna na-ahụ n’anya ma na-akwụsi ike n’ihe, onye na-emeso ụmụ ya ihe mgbe nile n’ụzọ kasị mma dị ka o kwere mee. Dị ka Nna nke na-eme ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi ma ọ bụ nke na-eme ezi omume, Jehova na-eji ọmịiko o nwere n’ebe ụmụ ya nọ n’ụwa nọ, bụ́ ndị enyemaka ya dị mkpa, ndị ọ dịkwa mkpa ka ọ gbaghara ha mmehie ha, na-atụgwa ịkwụsi ike ya maka ezi ihe.—Abụ Ọma 103:10, 13.

22. N’ịbụ onye ikpe ziri ezi ya na-eduzi, olileanya dị aṅaa ka Jehova meworo ka o kwe anyị omume inwe, n’ihi gịnịkwa ka o ji na-emeso anyị ihe otú a?

22 Lee ka anyị kwesịrị isi nwee ekele na ikpe ziri ezi nke Chineke na-agụnye ihe karịrị ịma ndị mere ihe ọjọọ ikpe! N’ịbụ onye ikpe ziri ezi ya na-eduzi, Jehova emewo ka o kwe anyị omume inwe olileanya na-akpali akpali n’ezie—ndụ zuru okè, nke na-enweghị ọgwụgwụ n’ime ụwa nke ‘ezi omume gaje ibi n’ime ya.’ (2 Pita 3:13) Chineke anyị na-emeso anyị ihe n’ụzọ dị otú a n’ihi na ikpe ziri ezi ya na-akwali ya ịchọ ụzọ isi zọpụta azọpụta kama ịchọ ụzọ isi maa ikpe. N’ezie, ịghọtakwu otú ikpe ziri ezi nke Jehova bururu ibu na-eme ka anyị bịaruo ya nso! N’isiakwụkwọ ndị na-esonụ, anyị ga-elerukwu anya n’otú Jehova si egosipụta àgwà a magburu onwe ya.

^ par. 20 N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Jehova ji onwe ya tụnyere ọdụm n’imezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi.—Jeremaịa 25:38; Hosea 5:14.