Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 12

“Chineke Ọ̀ Na-ekpe Ikpe Na-ezighị Ezi?”

“Chineke Ọ̀ Na-ekpe Ikpe Na-ezighị Ezi?”

1. Olee otú ihe atụ dị iche iche nke ikpe na-ezighị ezi pụrụ isi metụta anyị?

NDỊ na-egwu wayo egwunara otu agadi nwanyị di ya nwụrụ ego nile o nwere. Otu nne obi tara mmiri agbahapụ nwa ọ mụrụ ọhụrụ. A tụọ otu nwoke mkpọrọ maka mpụ ọ na-emeghị. Olee otú ihe ndị a a kọrọ merenụ dị gị? Ikekwe, nke ọ bụla n’ime ha wutere gị, nke ahụ kwekwara nghọta. Anyị bụ́ ụmụ mmadụ maara nke ọma ihe bụ́ ihe ziri ezi na ihe bụ́ ihe na-ezighị ezi. Mgbe e kpere ikpe na-ezighị ezi, ọ na-ewe anyị iwe. Anyị na-achọ ka e nye onye ahụ e kpere ikpe na-ezighị ezi ihe iti aka n’obi ma taa onye ahụ kpere ya ikpe na-ezighị ezi ahụhụ. Ọ bụrụ na e meghị nke a, anyị pụrụ iche, sị: ‘Chineke ọ̀ na-ahụkwa ihe na-emenụ? Gịnị mere o ji gbachi nkịtị?’

2. Olee otú Habakuk si meghachi omume n’ikpe na-ezighị ezi, n’ihi gịnịkwa ka Jehova na-ejighị baara ya mba maka nke a?

2 N’akụkọ ihe mere eme nile, ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi ajụwo ajụjụ ndị yiri ha. Dị ka ihe ahụ, Habakuk onye amụma kpegaara Chineke ekpere, sị: “N’ihi gịnị ka i ji eme ka m na-ekiri ajọ ikpe na-ezighị ezi dị otú a? N’ihi gịnị ka i ji ekwe ka ime ihe ike, mmebi iwu, mpụ, na obi ọjọọ gbasaa ebe nile?” (Habakuk 1:3, Contemporary English Version) Jehova abaraghị Habakuk mba maka ajụjụ ndị a o ji obi ọcha jụọ, n’ihi na ọ bụ Ya kenyere n’ime ụmụ mmadụ echiche nke ikpe ziri ezi. Ee, Jehova kenyere anyị ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke ikike ikpe ikpe ziri ezi.

Jehova Kpọrọ Ikpe Na-ezighị Ezi Asị

3. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jehova maara banyere ikpe na-ezighị ezi karịa otú anyị maara?

3 Ọ bụghị na Jehova amaghị na ikpe na-ezighị ezi dị. Ọ na-ahụ  ihe na-emenụ. Banyere oge Noa, Bible na-agwa anyị, sị: “Jehova wee hụ na ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, Ọ hụkwa na nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.” (Jenesis 6:5) Cheedị echiche ihe okwu ahụ pụtara. Ọtụtụ mgbe, ihe anyị na-ewere dị ka ikpe na-ezighị ezi na-adabere n’ihe ole na ole merenụ ndị anyị nụrụ ma ọ bụ hụ n’onwe anyị. N’ụzọ dị iche, Jehova maara banyere ikpe na-ezighị ezi ndị a na-ekpe n’ụwa nile. Ọ na-ahụ ha nile! Ọzọkwa, ọ pụrụ ịtụpụta echiche nile nke obi—echiche ọjọọ nke na-akpata ime ihe na-ezighị ezi.—Jeremaịa 17:10.

4, 5. (a) Olee otú Bible si egosi na ihe banyere ndị e mesoro ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-emetụ Jehova n’ahụ́? (b) Olee otú ikpe na-ezighị ezi siworo metụta Jehova n’onwe ya?

4 Ma Jehova na-eme ihe karịrị nanị ịhụ ikpe na-ezighị ezi. Ihe banyere ndị e kpere ikpe na-ezighị ezi na-emetụkwa ya n’ahụ́. Mgbe mba ndị bụ́ ndị iro nke ndị ya ji obi ọjọọ mesoo ndị ya ihe, Jehova nwere mwute “n’ihi ịsụ ude ha n’ihu ndị na-emegbu ha na-akpagbukwa ha.” (Ndị Ikpe 2:18) Ikekwe ị chọpụtawo na ka ndị ụfọdụ na-ahụkwu ikpe na-ezighị ezi, otú ahụ ka ọ na-adịghịzi emetụ ha n’ahụ́. Ọ dịghị otú ahụ n’ebe Jehova nọ! Ọ nọwo na-ahụ ikpe na-ezighị ezi n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya nile ruo ihe dị ka afọ 6,000, ma asị ọ kpọrọ ya agbanwebeghị. Kama nke ahụ, Bible na-emesi anyị obi ike na ihe ndị dị ka “ire okwu ụgha,” “aka na-awụsị ọbara na-emeghị ihe ọjọọ,” na “onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume,” bụ ihe arụ n’anya ya.—Ilu 6:16-19.

5 Cheekwa echiche banyere nkatọ siri ike Jehova katọrọ ndị ndú na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi n’Izrel. “Ọ́ bụghị ihe dịịrị unu, bụ́ ịmara ikpe [ziri ezi]?” ka ọ kpaliri onye amụma ya ịjụ ha. Mgbe ọ kọwasịrị n’ụzọ doro anya otú ha si eji ike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, Jehova buru amụma ihe nke ahụ gaje ịrụpụtara ndị ikom a rụrụ arụ: “Ha ga-etiku Jehova mkpu, ma Ọ gaghị aza ha: Ọ ga-ezonahụkwa ha ihu Ya na mgbe ahụ, dị ka ha meworo ka omume nile ha jọọ njọ.” (Maịka 3:1-4) Lee ka Jehova si kpọọ ikpe na-ezighị ezi asị!  Leenụ, o metụtawo ya onwe ya! Eri ọtụtụ puku afọ, Setan anọwo na-akwa ya emo n’ụzọ na-ezighị ezi. (Ilu 27:11, NW) Ọzọkwa, ikpe na-ezighị ezi kasị njọ e kpetụrụla metụtara Jehova mgbe e gburu Ọkpara ya, bụ́ onye ‘na-adịghị mmehie o mere,’ dị ka onye omekome. (1 Pita 2:22; Aịsaịa 53:9) O doro anya na Jehova emechighị anya ya emechi ịhụ ahụhụ ndị a na-ekpe ikpe na-ezighị ezi na-ata, ọ dịghịkwa eme ka ọ gbasaghị ya.

6. Olee otú anyị pụrụ isi meghachi omume mgbe e kpere anyị ikpe na-ezighị ezi, n’ihi gịnịkwa?

6 N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe anyị hụrụ ikpe na-ezighị ezi—ma ọ bụ mgbe e mesoro anyị onwe anyị mmeso ọjọọ—ọ bụ nnọọ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ anyị iji iwe meghachi omume. E kere anyị n’onyinyo Chineke, ikpe na-ezighị ezi dịkwa nnọọ iche n’ihe nile e ji mara Jehova. (Jenesis 1:27) Gịnịzi mere Chineke ji ekwe ka a na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?

Okwu Banyere Ọbụbụeze Chineke

7. Kọwaa otú e si maa ọbụbụeze Jehova aka.

7 Azịza nye ajụjụ a metụtara okwu banyere ọbụbụeze. Dị ka anyị hụworo, ọ bụ ihe ruuru Onye Okike ịchị ụwa na ndị nile bi n’ime ya. (Abụ Ọma 24:1; Mkpughe 4:11) Otú ọ dị, ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, a mara ọbụbụeze Jehova aka. Olee otú nke a si mee? Jehova nyere nwoke mbụ, bụ́ Adam, iwu ka ọ ghara iri mkpụrụ sitere n’otu osisi dị n’ogige ahụ o bi na ya nke bụ́ Paradaịs. Ọ́ bụrụkwanụ na o nupụ isi? Chineke gwara ya, sị: “Ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:17) Iwu Chineke abụghịrị Adam ma ọ bụ nwunye ya, bụ́ Iv, ihe siri ike. Ka o sina dị, Setan mere ka Iv kweta na Chineke na-amachibido ha iwu n’ụzọ na-enweghị isi. Gịnị ga-eme ma o rie mkpụrụ sitere n’osisi ahụ? Setan gwara Iv hoo haa, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu [ga-anwụ]: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.)—Jenesis 3:1-5.

8. (a) Gịnị ka Setan na-egosi site n’ihe ọ gwara Iv? (b) Gịnị ka Setan mara aka n’ihe banyere ọbụbụeze Chineke?

 8 N’okwu a, Setan na-egosi ọ bụghị nanị na Jehova zochiiri Iv ihe ọmụma dị mkpa kamakwa na Ọ ghaara ya ụgha. Setan leziri anya hụ na ọ maghị eziokwu ahụ bụ́ na Chineke bụ eze aka. Ma ọ mara ya ịbụ onye o ruuru, onye o kwesịịrị, na onye ziri ezi ịchị achị aka. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, o kwuru na Jehova adịghị achị isi n’ụzọ ziri ezi nakwa n’ụzọ ga-akasị baara ndị Ọ na-achị uru.

9. (a) Gịnị ka nnupụisi rụpụtaara Adam na Iv, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa dị oké mkpa ka nke a kpalitere? (b) N’ihi gịnị ka Jehova na-ejighị nnọọ bibie ndị nnupụisi ahụ?

9 Ka oge na-aga, ma Adam ma Iv nupụụrụ Jehova isi site n’iri mkpụrụ sitere n’osisi ahụ a machibidoro iwu. Nnupụisi ha mere ka ha bụrụ ndị ga-enweta ntaramahụhụ ọnwụ, dị nnọọ ka Chineke kwuworo. Ụgha Setan kpalitere ajụjụ ụfọdụ dị oké mkpa. Ò ruuru Jehova n’ezie ịchị ihe a kpọrọ mmadụ, ka ụmụ mmadụ hà kwesịrị ịchịwa onwe ha? Jehova ọ̀ na-achị isi n’ụzọ kasị mma? Jehova gaara ejiwo ike o nwere ime ihe nile bibie ndị nnupụisi ahụ ozugbo ahụ. Ma ajụjụ ndị e welitere bụ banyere ịchịisi Chineke, ọ bụghị banyere ike ya. Ya mere, igbu Adam, Iv, na Setan agaraghị egosi na ịchịisi Chineke bụ nke ezi omume. Kama nke ahụ, ọ gaara emewo ka e nyowekwuo ịchịisi ya enyowe. Nanị ụzọ isi mata ma ụmụ mmadụ hà pụrụ ịchị onwe ha nke ọma, n’adabereghị n’ebe Chineke nọ, bụ inye oge.

10. Gịnị ka akụkọ ihe mere eme kpugheworo banyere ọchịchị ụmụ mmadụ?

10 Gịnị ka oge gafeworonụ kpugheworo? Eri ọtụtụ puku afọ, ndị mmadụ anwalewo ụdị ọchịchị dị iche iche, gụnyere ọchịchị aka ike, ọchịchị onye kwuo uche ya, ọchịchị ọha na eze, na ọchịchị kọmunist. A chịkọtara ha nile ọnụ n’okwu Bible kwuru n’ezoghị ọnụ, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) N’inwe ezi ihe kpatara ya, Jeremaịa onye amụma kwuru, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye  ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.

11. N’ihi gịnị ka Jehova ji kwere ka agbụrụ ụmụ mmadụ nọrọ ná nhụjuanya?

11 Jehova maara site ná mmalite na ihe a kpọrọ mmadụ inwere onwe ha, ma ọ bụ iji aka ha na-achị onwe ha, ga-akpata oké nhụjuanya. Mgbe ahụ, ọ̀ bụ ikpe na-ezighị ezi bụ́ ya ikwe ka ọdachi ahụ nke na-aghaghị ịbịa were ọnọdụ? Ọ dịghị ma ọlị! Iji maa atụ: Were ya na i nwere nwatakịrị nke ọ dị mkpa ka a waa ahụ́ iji gwọọ ya ọrịa pụrụ igbu ya. Ị maara nke ọma na ahụ́ a a na-aga ịwa nwa gị ga-akpatara ya ihe mgbu ụfọdụ, nke a na-ewutekwa gị. N’otu mgbe ahụ, ị maara na ihe ahụ a na-aga ime nwa gị ga-eme ka o nwee ahụ́ ike ka mma mgbe oge na-aga ná ndụ ya. N’otu aka ahụ, Chineke maara—ọbụnakwa buo amụma—na ya ikwe ka ọchịchị ụmụ mmadụ dịrị ga-akpata ihe mgbu na nhụjuanya ụfọdụ. (Jenesis 3:16-19) Ma ọ makwaara na inweta ahụ́ efe nke na-adịgide adịgide, nke bakwara uru ga-ekwe omume nanị ma ọ bụrụ na o kwe ka ihe nile a kpọrọ mmadụ hụ mkpụrụ ọjọọ nnupụisi mịpụtaworo. N’ụzọ dị otú a, a ga-edozi ihe iseokwu ahụ n’ụzọ na-adịgide adịgide, ruo mgbe nile ebighị ebi.

Ihe Iseokwu Banyere Iguzosi Ike n’Ezi Ihe nke Mmadụ

12. Dị ka e gosiri n’ihe banyere Job, ebubo dị aṅaa ka Setan boworo ụmụ mmadụ?

12 E nwere akụkụ ọzọ n’okwu a. N’ịma oruru o ruuru Chineke ịchị na izi ezi nke ịchịisi ya aka, ọ bụghị nanị na Setan ekwutọwo Jehova n’ihe banyere ọbụbụeze Ya; o kwutọwokwa ndị ohu Chineke banyere iguzosi ike n’ezi ihe ha. Dị ka ihe atụ, rịba ama ihe Setan gwara Jehova banyere nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job: “Ọ́ bụghị Gị onwe gị gbaworo ya, gbaakwara ụlọ ya, gbaakwara ihe nile o nwere, ogige  gburugburu? Ị gọziwo ọrụ aka ya abụọ, ihe nnweta ya agbasawokwa n’ala. Ma otú ọ dị, biko, setịpụ aka Gị, metụ ihe nile o nwere, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.”—Job 1:10, 11.

13. Site n’ebubo o boro Job, gịnị ka Setan chọrọ ka a ghọta, oleekwa otú nke a si emetụta mmadụ nile?

13 Setan kwusiri ike na Jehova ji ike Ya nke inye nchebe na-azụrụ ofufe Job. N’aka nke ọzọ, nke a pụtara na iguzosi ike n’ezi ihe Job bụ nanị nke ihu abụọ, na ọ na-efe Chineke nanị n’ihi ihe ọ pụrụ inweta site n’ime otú ahụ. Setan kwusiri ike na ọ bụrụ na a napụ Job ngọzi Chineke, ọbụna nwoke ahụ ga-akọcha Onye Okike ya. Setan maara na Job kwesịrị ịrịba ama dị ka onye “zuru okè, ziekwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” * Ya mere, ọ bụrụ na Setan ga-enwe ike imebi iguzosi ike n’ezi ihe Job, gịnị ka nke ahụ ga-egosi banyere ihe fọdụrụnụ n’ihe a kpọrọ mmadụ? N’ihi ya, Setan na-eme n’ezie ka a na-enyo iguzosi ike n’ihe nke ndị nile chọrọ ijere Chineke ozi enyo. N’ezie, n’ime ka ihe iseokwu ahụ sakwuo mbara, Setan sịrị Jehova: “Ihe nile nke mmadụ [ọ bụghị nanị Job] nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.)—Job 1:8; 2:4.

14. Gịnị ka akụkọ ihe mere eme gosiworo banyere ebubo Setan boro ụmụ mmadụ?

14 Akụkọ ihe mere eme egosiwo na ọtụtụ ndị, dị ka Job, anọgidewo na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova n’agbanyeghị ọnwụnwa—n’ụzọ megidere ihe Setan kwuru. Ha emewo ka obi Jehova ṅụrịa site n’ụzọ ndụ ha nke ikwesị ntụkwasị obi, nke a emewokwa ka Jehova nwee ihe ọ ga-azaghachi Setan n’aka ahụ o ji itu ọnụ maa na ụmụ mmadụ ga-akwụsị ijere Chineke ozi mgbe e mere ka ha nọrọ n’ihe isi ike. (Ndị Hibru 11:4-38) Ee, ndị nwere obi ziri ezi ajụwo ịgbakụta Chineke  azụ. Ọbụna mgbe ha nọ n’ọnọdụ dị oké njọ, ha adaberewo na Jehova ọbụna karị maka inweta ume iji tachie obi.—2 Ndị Kọrint 4:7-10.

15. Ajụjụ dị aṅaa ka a pụrụ ịjụ banyere ikpe ndị Chineke kpere n’oge gara aga na ndị ọ ga-ekpe n’ọdịnihu?

15 Ma ikpe ziri ezi nke Jehova na-agụnye ihe karịrị okwu banyere ọbụbụeze na iguzosi ike n’ezi ihe nke mmadụ. Bible na-enye anyị ihe ndekọ nke ikpe Jehova kpere ndị mmadụ n’otu n’otu na ọbụna mba dị iche iche. E dekọkwara n’ime ya amụma banyere ikpe ndị ọ ga-ekpe n’ọdịnihu. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na Jehova anọwo na-ekpe ikpe ziri ezi nakwa na ọ ga-anọgide na-eme otú ahụ?

Ihe Mere Ikpe Chineke Ji Ka Mma

Ọ dịghị mgbe Jehova “ga-ekpochapụ ndị ezi omume tinyere ndị na-emebi iwu”

16, 17. Ihe atụ dịgasị aṅaa na-egosi na a kpaara ụzọ ụmụ mmadụ si ele ihe anya ókè n’ihe banyere ezi ikpe ziri ezi?

16 Banyere Jehova, a pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi.” (Deuterọnọmi 32:4) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke pụrụ ikwu ihe dị otú ahụ banyere onwe ya, n’ihi na ọtụtụ mgbe, ụzọ anyị si ele ihe anya bụ́ nke a kpaara ókè na-eme ka anyị ghara ịghọtacha ihe bụ́ ihe ziri ezi. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Ebreham. Ọ rịọrọ Jehova arịrịọ n’ihe banyere mbibi nke Sọdọm—n’agbanyeghị ajọ omume jupụtara ebe ahụ. Ọ jụrụ Jehova, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Ị ga-ekpochapụ ndị ezi omume tinyere ndị na-emebi iwu?” (Jenesis 18:23-33) N’ezie, azịza ya bụ ee e. Ọ bụ nanị mgbe Lọt bụ́ onye ezi omume na ụmụ ya ndị inyom ruru obodo Zoa n’udo ka Jehova “[mere] ka brimstone na ọkụ si n’eluigwe zokwasị” Sọdọm. (Jenesis 19:22-24) N’ụzọ dị iche, Jona ‘were iwe dị ọkụ’ mgbe Chineke meere ndị Nineve ebere. Ebe Jona maworo ọkwa na a ga-ebibi ha, obi gaara adịwo ya ụtọ ịhụ mgbe a ga-ekpochapụ ha—n’agbanyeghị nchegharị ha nke sitere n’obi.—Jona 3:10–4:1.

17 Jehova mesighachiri Ebreham obi ike na ikpe ikpe Ya ziri ezi adịghị agụnye nanị ibibi ndị ajọ omume kamakwa ịzọpụta ndị ezi omume. N’aka nke ọzọ, e mere ka Jona mụta na  Jehova dị ebere. Ọ bụrụ na ndị na-emebi iwu agbanwee ụzọ ha, ọ “na-agbaghara mmehie” ha. (Abụ Ọma 86:5) N’adịghị ka ụmụ mmadụ na-adị na-atụwa ụjọ maka ọkwá ha, Jehova adịghị ama ikpe nanị iji mee nnọọ ka a mara na ọ dị ike, ọ dịghịkwa ahapụ igosi ọmịiko n’ihi ụjọ na a ga-elewe ya anya dị ka onye na-adịghị ike. Ụzọ o si eme ihe bụ ime ebere mgbe ọ bụla e nwere ihe ndabere maka ya.—Aịsaịa 55:7; Ezikiel 18:23.

18. Jiri Bible gosi na Jehova adịghị eme ihe na-adabere ná mmetụta uche efu.

18 Otú ọ dị, mmetụta uche efu adịghị emegharị Jehova anya. Mgbe ndị ya mikpuru onwe ha n’ikpere arụsị, Jehova kwupụtara n’eleghị anya n’azụ, sị: “[M ga-ekpe] gị ikpe dị ka ụzọ gị nile si dị; M ga-etinyekwasịkwa gị ihe arụ gị nile. Anya m agaghị emekwara gị ebere, M gaghị enwekwa ọmịiko: kama ụzọ nile gị ka M ga-etinyekwasị gị.” (Ezikiel 7:3, 4) Ya mere, mgbe ndị mmadụ kpọrọ ekwo nkụ n’omume ha, Jehova na-ekpe ha ikpe dị ka ụzọ ha si dị. Ma ikpe ya na-adabere n’ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ. N’ihi ya, mgbe oké “iti mkpu” banyere Sọdọm na Gọmọra ruru ya ntị, Jehova kwuru, si: “Ka M rịdaakwa, hụ ma ọ̀ bụ dị ka iti mkpu ya si dị, nke ruru m ntị, ka ha mezuworo.” (Jenesis 18:20, 21) Lee ka anyị kwesịrị isi nwee ekele na Jehova adịghị ka ọtụtụ ụmụ mmadụ bụ́ ndị na-eru nkwubi okwu tupu ha anụ ihe nile merenụ! N’eziokwu, Jehova bụ, dị ka Bible si kọwaa ya, “Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume.”—Deuterọnọmi 32:4.

Nwee Obi Ike n’Ikpe Ziri Ezi nke Jehova

19. Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị nwere ajụjụ ndị na-agbagwoju anyị anya banyere otú Jehova si ekpe ikpe ziri ezi?

19 Bible adịghị aza ajụjụ nile banyere ihe ndị Jehova mere n’oge gara aga; ọ dịghịkwa akọwa ihe nile banyere otú Jehova ga-esi kpee ndị mmadụ n’otu n’otu na ìgwè dị iche iche ikpe n’ọdịnihu. Mgbe ihe ndekọ ma ọ bụ amụma dị iche iche dị n’ime Bible gbagwojuru anyị anya n’ebe ndị a na-enyeghị  nkọwa dị otú ahụ, anyị pụrụ igosipụta otu ụdị iguzosi ike n’ihe ahụ Maịka onye amụma gosiri, bụ́ onye dere, sị: “M ga-echere Chineke nke nzọpụta m.”—Maịka 7:7.

20, 21. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na Jehova ga-eme ihe ziri ezi mgbe nile?

20 Anyị pụrụ inwe obi ike na n’ọnọdụ ọ bụla, Jehova ga-eme ihe ziri ezi. Ọbụna mgbe o yiri ka ụmụ mmadụ ha na-eleghara ikpe na-ezighị ezi anya, Jehova na-ekwe nkwa, sị: “Ịbọ ọbọ bụ nke m; m ga-akwụghachi.” (Ndị Rom 12:19) Ọ bụrụ na anyị egosi àgwà ichere echere, anyị ga-ekwughachi okwu ahụ na-egosi nkwenye siri ike bụ́ nke Pọl onyeozi kwuru: “Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Tụfịakwa!”—Ndị Rom 9:14.

21 Ka ọ dịgodị, anyị na-ebi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1) Ikpe na-ezighị ezi na “mmegbu” akpatawo ọtụtụ mmegbu obi ọjọọ. (Eklisiastis 4:1) Otú ọ dị, Jehova agbanwebeghị. Ọ ka kpọrọ ikpe na-ezighị ezi asị, ihe banyere ndị e kpere ikpe na-ezighị ezi na-emetụkwa ya n’ahụ́ nke ukwuu. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova na ọbụbụeze ya, ọ ga-enye anyị ume iji tachie obi ruo oge ahụ a kara aka bụ́ mgbe ọ ga-edozi ikpe na-ezighị ezi nile n’oge ịchịisi Alaeze ya.—1 Pita 5:6, 7.

^ par. 13 Jehova kwuru banyere Job, sị: “Ọ dịghị onye dị ka ya n’ụwa.” (Job 1:8) Mgbe ahụ, o yiri ka Job ò biri ndụ mgbe Josef nwụsịworo nakwa tupu Mozis aghọọ onye a họpụtara ịbụ onye ndú Izrel. N’ihi ya, a pụrụ ikwu na n’oge ahụ ọ dịghị onye na-eguzosi ike n’ezi ihe dị ka Job.