Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 5

Ike Ike Ihe—“Onye Meworo Eluigwe na Ụwa”

Ike Ike Ihe—“Onye Meworo Eluigwe na Ụwa”

1, 2. Olee otú anyanwụ si egosipụta ike Jehova nwere ike ihe?

Ọ̀ DỊTỤWO oge ị nọ na-anya ọkụ n’abalị oyi na-atụ? Ikekwe ị gbatịpụrụ aka gị otú kwesịrị ekwesị gaa n’ebe ọkụ ahụ dị iji na-enweta okpomọkụ si na ya apụta. Ọ bụrụ na ị bịaruo ya nso nke ukwuu, okpomọkụ ya ga na-achasi gị ike. Ọ bụrụ na ị laa azụ nke ukwuu, ikuku abalị ahụ nke jụrụ oyi ga-ekusa gị, oyi ga-atụwakwa gị.

2 Ọ dị “ọkụ” nke na-eme ka akpụkpọ ahụ́ anyị na-enweta okpomọkụ n’ehihie. “Ọkụ” ahụ na-ere n’ebe dị ihe dị ka nde kilomita 150 site n’ebe anyị nọ! * Lee ike anyanwụ na-aghaghị inweworị nke mere i ji na-enweta okpomọkụ ya site n’ebe dị anya otú ahụ! Ma, ụwa nọ n’ebe kwesịrị nnọọ ekwesị site n’ebe nnukwute ite ọkụ ahụ dị ma na-agba ya gburugburu. Ọ bụrụ na ụwa anọdewe ya nke ukwuu, ọ ga-eme ka mmiri nile dị n’ụwa ghọọ uzu ọkụ wee kupụsịa; ọ bụrụ na ọ nọrọ ya n’ebe dị anya nke ukwuu, mmiri nile dị na ya ga-akpụkọta. Ma ịnọdewe ya nso gabiga ókè ma ịnọ ya n’ebe dị anya gabiga ókè ga-eme ka a ghara inwe ihe dị ndụ n’ụwa anyị. N’ịbụ nke dị ihe ndị dị ndụ n’ụwa oké mkpa, ìhè anyanwụ adịghị emetọ ikuku, ọ dịghịkwa emefu ike n’ụzọ na-enweghị isi, tụkwasị na ọ na-enye obi ụtọ.—Eklisiastis 11:7.

Jehova “edoziwo ihe na-enye ìhè na anyanwụ”

3. Eziokwu dị aṅaa dị mkpa ka anyanwụ na-agba akaebe ya?

3 Otú o sina dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ ejighị anyanwụ kpọrọ ihe ọ bụla, n’agbanyeghị na ndụ ha dabeere na ya. N’ihi ya, ha adịghị amụta ihe ahụ anyanwụ pụrụ ịkụziri anyị. Bible na-ekwu banyere Jehova, sị: “Gị onwe gị edoziwo ihe na-enye ìhè na anyanwụ.” (Abụ Ọma 74:16) Ee, anyanwụ na-ewetara Jehova, bụ́ “Onye meworo eluigwe na ụwa,” otuto.  (Abụ Ọma 19:1; 146:6) Nke ahụ bụ nanị otu n’ime ihe ndị dị na mbara ígwé ndị na-akụziri anyị banyere ike dị ukwuu Jehova nwere ike ihe. Ka anyị nyochakwuo ụfọdụ n’ime ha ma lekwasịzie anya n’ụwa na ndụ dị n’ime ya.

“Welienụ Anya Unu Elu, Hụ”

4, 5. Olee otú anyanwụ dịruru n’ike ma buruo ibu, n’agbanyeghị nke ahụ, olee otú ọ hà ma e jiri ya tụnyere kpakpando ndị ọzọ?

4 Dị ka ị pụrụ ịma, anyanwụ anyị bụ kpakpando. Ọ na-eyi ka o buru ibu karịa kpakpando ndị anyị na-ahụ n’abalị n’ihi na, ọ bụrụ na e jiri ya tụnyere ha, ọ dị anyị nnọọ nso. Olee otú ọ dịruru n’ike? N’etiti ya, ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ nke anyanwụ bụ ihe dị ka 15,000,000 degree Celsius. Ọ bụrụ na ị ga-enwe ike isi n’etiti anyanwụ wepụta ihe ha ka isi ndụdụ ma debe ya n’ụwa ebe a, ị pụghị ịnọ ihe dị ka kilomita 140 site n’ebe ị tụsara ntakịrị nke ahụ i si n’etiti anyanwụ wepụta n’enweghị ihe ga-eme gị! Kwa sekọnd, anyanwụ na-emepụta ike hà ka nke mgbawa ọtụtụ narị nde bọmbụ nuklia.

5 Anyanwụ buru nnọọ ibu nke na ọ bụrụ na e weta ụwa anyị ihe karịrị 1,300,000 ha pụrụ ịba n’ime ya. Anyanwụ ọ̀ bụ kpakpando  buru oké ibu? Ee e, ndị na-enyocha mbara ígwé na-akpọ ya akakpọ na-acha odo odo. Pọl onyeozi dere na “kpakpando dịgasị iche iche n’ebube ha.” (1 Ndị Kọrint 15:41) Ọ maghị otú okwu ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụruru eziokwu. E nwere kpakpando buru nnọọ ibu nke na ọ bụrụ na e debe ya n’ebe anyanwụ dị, ụwa anyị ga-abanye n’ime ya. Ọ bụrụ na e debe nnukwu kpakpando nke ọzọ n’otu ebe ahụ, ọ ga-eru n’ụwa mbara ígwé bụ́ Saturn—ọ bụ ezie na ụwa mbara ígwé ahụ dị nnọọ anya site n’ụwa nke na o were otu ụgbọ mbara ígwé nke ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ya ji ihe karịrị okpukpu 40 karịa nke mgbọ e ji obere egbe gbapụ afọ anọ iji ruo ya!

6. Olee otú Bible si egosi na ọnụ ọgụgụ kpakpando dịnụ buru nnọọ ibu n’otú mmadụ si ele ihe anya?

6 Ọnụ ọgụgụ kpakpando e nwere na-emenye ụjọ ọbụna karịa otú ha hà n’ibu. N’ezie, Bible na-enye echiche na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a pụghị ịgụta kpakpando dịnụ ọnụ, o siri ike ịgụta ha  ọnụ dịkwa ka o siri ike ịgụta “ájá nke oké osimiri” ọnụ. (Jeremaịa 33:22) Okwu a na-egosi na e nwere ọtụtụ kpakpando karịa otú a pụrụ iji anya nkịtị hụ. E kwuwerị, ọ bụrụ na onye so dee Bible, dị ka Jeremaịa, lere anya n’ígwé n’abalị ma gbalịa ịgụ kpakpando ndị ọ hụrụ ọnụ, ọ gaara agụtawo nanị ihe dị ka puku atọ, n’ihi na nke ahụ bụ ọnụ ọgụgụ anya mmadụ nkịtị pụrụ ịhụ n’abalị ihu ígwé gbachapụrụ agbachapụ. A pụrụ iji ọnụ ọgụgụ ahụ tụnyere nnọọ ọnụ ọgụgụ mkpụrụ ájá ndị dị n’ájá e kpo n’aka. Otú ọ dị, n’ezie, ọnụ ọgụgụ nke kpakpando dịnụ buru nnọọ ibu, dị ka ájá nke oké osimiri. * Olee onye pụrụ ịgụta ya ọnụ?

“Ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ”

7. (a) Ihe dị ka kpakpando ole dị n’ụyọkọ kpakpando anyị bụ́ Milky Way, oleekwa otú ọnụ ọgụgụ ahụ bururu n’ibu? (b) Gịnị mere o ji dị ịrịba ama na ọ na-esiri ndị na-enyocha mbara ígwé ike ikwu ọnụ ọgụgụ ụyọkọ kpakpando ole e nwere, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị banyere ike ike ihe nke Jehova nwere?

7 Aịsaịa 40:26 na-aza, sị: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a? ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ.” Abụ Ọma 147:4 na-ekwu, sị: “Ọ na-agụta ọnụ ọgụgụ kpakpando.” Gịnị bụ “ọnụ ọgụgụ kpakpando”? Nke ahụ abụghị ajụjụ dị mfe ọzịza. Ndị na-enyocha mbara ígwé na-eme atụmatụ na e nwere ihe karịrị 100 ijeri kpakpando nanị n’ụyọkọ kpakpando anyị bụ́ Milky Way. * Ma ụyọkọ kpakpando nke anyị bụ́ Milky Way bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ụyọkọ kpakpando ndị e nwere, ọtụtụ n’ime ha nwekwara ọbụna ọtụtụ kpakpando karị. Ụyọkọ kpakpando ole ka e nwere? Ụfọdụ ndị na-enyocha mbara ígwé ekwuwo na e nwere ihe dị ka ijeri 50. Ndị ọzọ ekwuwo na a pụrụ inwe ihe ruru ijeri 125.  Ya mere, ụmụ mmadụ apụghị ikwu kpọmkwem ụyọkọ kpakpando ole e nwere ma ya fọdụzie ikwu kpọmkwem ngụkọta nke ijeri kpakpando ole dị na ha nile. Ma, Jehova maara ole ha dị. Ọzọkwa, o nyere kpakpando nke ọ bụla aha!

8. (a) Ị̀ ga-esi aṅaa kọwaa otú ụyọkọ kpakpando anyị bụ́ Milky Way hà n’ibu? (b) Olee ụzọ Jehova si na-ahazi ngagharị nke ihe ndị dị na mbara ígwé n’usoro?

8 Ọ pụrụ nanị imenyekwu anyị ụjọ mgbe anyị tụgharịrị uche n’otú ụyọkọ kpakpando hà n’ibu. Ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ nke ìhè kwa sekọnd bụ kilomita 300,000. Chegodị echiche, ọ bụrụ na ìhè ji ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ahụ na-aga, ọ ga-ewe ya 100,000 afọ iji si n’otu akụkụ nke ụyọkọ kpakpando anyị ruo n’akụkụ ya nke ọzọ! Ụfọdụ ụyọkọ kpakpando bukwara ibu karịa ụyọkọ kpakpando anyị ọtụtụ okpukpu. Bible na-ekwu na Jehova “na-esetị” eluigwe ndị a sara mbara dị ka a ga-asị na bụ ákwà nkịtị. (Abụ Ọma 104:2) Ọ na-ahazikwa ngagharị nke ihe ndị a e kere eke n’usoro. Malite na kpakpando ndị kasị nta ruo n’ụyọkọ kpakpando kasị ukwuu, ihe nile na-aga dị ka iwu okike ndị Chineke guzobere ma tinye ha n’ọrụ si dị. (Job 38:31-33) N’ihi ya, ndị ọkà mmụta sayensị ejiriwo otú ihe ndị dị na mbara ígwé si aga kpọmkwem otú e si hazie ha tụnyere ịzọtacha ụkwụ egwú nke dị mgbagwoju anya! Chezienụ echiche banyere Onye kere ihe ndị a. Ị́ dịghị atụ Chineke egwu, bú onye nwere ike ukwu dị otú ahụ nke ike ihe?

“Onye Jiworo Ike Ya Mee Ụwa”

9, 10. Olee otú ike Jehova si pụta ìhè n’ihe banyere ebe o debere anyanwụ na ụwa mbara ígwé ndị na-agba ya gburugburu, bụ́ Jupita, ụwa, na ọnwa?

9 A na-ahụ ike Jehova nwere ike ihe n’ebe obibi anyị, bụ́ ụwa. O jiriwo nlezianya debe ụwa n’ebe ọ dị na mbara ígwé a sara mbara. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị kwenyere na ọtụtụ ụyọkọ kpakpando pụrụ ịbụ ebe na-agaghị ekwe obibi ma e jiri ha tụnyere ụwa mbara ígwé ihe ndị dị ndụ jupụtara na ya dị ka ụwa anyị a. Ihe àmà na-egosi na e keghị ihe ka ukwuu n’ụyọkọ kpakpando anyị bụ́ Milky Way maka ihe ndị dị ndụ ibi n’ime ha. Kpakpando jupụtara ejupụta n’etiti ụyọkọ kpakpando a. A na-enwe ụzarị ọkụ dị ukwuu na ya, ọ na-afọkarịkwa nke nta ka kpakpando  ndị dị na ya na ibe ha kụkọta. Akụkụ ndị dị ná mpụga nke ụyọkọ kpakpando a enweghị ọtụtụ n’ime ihe ndị dị mkpa maka ndụ. E debere anyanwụ na ụwa mbara ígwé ndị na-agba ya gburugburu n’ebe dị nnọọ mma, n’ebe ọ na-agaghị na-enweta ụzarị ọkụ dị ukwuu na ebe ihe ndị dị mkpa maka ndụ dị.

10 Ụwa na-erite uru site n’otu ihe nchebe buru ibu nke dịkwa ya n’ebe dị anya—ụwa mbara ígwé bụ́ Jupita. N’ịbụ nke ji ihe karịrị otu puku okpukpu buo ibu karịa Ụwa, Jupita nwere ike ndọda dị ukwuu. Gịnị si na ya apụta? Ọ na-adọrọ ma ọ bụ na-echigharị ihe ndị na-agba n’etiti mbara ígwé ihu gaa n’ebe ọzọ. Ndị ọkà mmụta sayensị na-eche na a sị na ọ bụghị Jupita, na ọtụtụ n’ime nnukwute ihe ndị na-esi na mbara ígwé ada n’ụwa gaara enwewo mmetụta ji okpukpu 10,000 dị njọ karịa otú ha na-enwe ugbu a. N’ebe dịdewere ụwa, e ji ntakịrị ihe ọzọ pụrụ iche nke dị na mbara ígwé—ọnwa—gọzie ụwa anyị. Ọ bụghị nanị na ọ mara mma ma bụrụ “ọkụ abalị,” ọnwa na-emekwa ka ụwa nọgide na-ehulata otú o hulatara. Nhulata ahụ na-eme ka ụwa na-enwe oge ọkọchị na udu mmiri bụ́ ndị a pụrụ ịmata mgbe ha ga-abịa—ihe ọzọ dị mkpa maka ịdị ndụ n’ebe a.

11. È si aṅaa mee mbara ikuku ụwa ịbụ ihe nchebe?

11 A na-ahụ ike Jehova nwere ike ihe n’akụkụ nile nke ọdidị ụwa. Cheedị echiche banyere mbara ikuku, bụ́ nke na-arụ ọrụ dị ka ọta na-enye nchebe. Anyanwụ na-emepụta ụzarị ọkụ ndị dị mma na ndị na-egbu egbu. Mgbe ụzarị ọkụ ndị ahụ na-egbu egbu rutere na mbara ikuku nke ụwa nke dị n’elu elu, ha na-eme ka ikuku oxygen nkịtị ghọọ ikuku ozone. N’aka nke ya, nkebi ozone ahụ nke ọ kpatara na-amịkọrọ ihe ka ukwuu n’ụzarị ọkụ ndị ahụ. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, e mere ka ụwa anyị nwee nche anwụ nke ya bụ́ nke na-echebe ya!

12. Olee otú nrugharị nke mmiri dị na mbara ikuku si egosipụta ike Jehova nwere ike ihe?

12 Nke ahụ bụ nanị otu akụkụ nke mbara ikuku anyị, bụ́ ngwakọta nke ikuku dị iche iche ndị dị nnọọ mma maka ịkwado ihe ndị e kere eke bi n’elu ala ma ọ bụ n’ebe dịdewere ya. Otu n’ime ihe ndị dị ịtụnanya banyere mbara ikuku anyị bụ nrugharị nke mmiri. Kwa afọ, anyanwụ na-eme ka mmiri dị ihe karịrị cubic kilomita 400,000 site n’oké osimiri ndị dị n’ụwa laa n’ígwé  site n’úzù ndị na-ekupụsị. Mmiri ahụ na-aghọ urukpuru, bụ́ nke ikuku ndị dị na mbara ígwé na-ekusasị ebe nile. Mmiri a, bụ́ nke a zara aza ma mee ka ọ dị ọcha ugbu a, na-ezo ka mmiri, snow, na ice, na-eme ka mmiri dịkwuo. Ọ dị nnọọ otú ahụ Eklisiastis 1:7 si kwuo ya: “Osimiri nile na-erudaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughị eju, ruo ebe osimiri na-eruda, ruo ebe ahụ ka osimiri ahụ na-erughachi ọzọ.” Ọ bụ nanị Jehova pụrụ ime ka e nwee ụdị usoro nrugharị ahụ.

13. Ihe àmà dị aṅaa nke ike Onye Okike nwere ka anyị na-ahụ n’ihe ọkụkụ ndị dị n’ụwa nakwa n’ala ya?

13 Ebe ọ bụla anyị hụrụ ihe dị ndụ, anyị na-ahụ ihe àmà nke ike Onye Okike nwere. A na-ahụ ike Jehova nwere ike ihe malite n’osisi ndị na-ebu oké ibu a na-akpọ redwood, ndị na-eto ogologo karịa ụlọ elu dị okpukpu 30 ruo n’ihe ọkụkụ ndị a na-adịghị eji anya nkịtị ahụ bụ́ ndị jupụtara n’oké osimiri ma na-emepụta ihe dị ukwuu n’ikuku oxygen anyị na-ekuru. Ihe ndị dị ndụ jupụtara n’ime ala—idide, ụdị ero dị iche iche bụ́ fungus, na ụmụ irighiri ihe ndị a na-apụghị iji anya nkịtị hụ, ha nile na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ụzọ dị mgbagwoju anya nke na-enyere ihe ọkụkụ aka ito eto. N’ụzọ dabara adaba, Bible na-ekwu okwu banyere ala dị ka ihe nwere ike.—Jenesis 4:12.

14. Olee ike dị ọbụna n’ime atọm nke pere nnọọ mpe?

14 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova bụ “Onye jiworo ike Ya mee ụwa.” (Jeremaịa 10:12) A na-ahụ ike Chineke ọbụna n’ihe ndị kasị nta o kere. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e debe otu nde atọm, nke bụ́ ụmụ irighiri ihe dị nnọọ ntakịrị ndị dị n’ihe ndị e kere eke, otu n’akụkụ ibe ha, ha agaghị aharu ka otu agịrị isi mmadụ. Ọzọkwa, irighiri ihe nke dị n’etiti atọm dị nnọọ ike nke na e jiriwo ya mee ihe dị ka ihe e ji emepụta bọmbụ ndị dị ike!

“Ihe Ọ Bụla nke Na-eku Ume”

15. Site n’ịtụle banyere anụ ọhịa dịgasị iche iche, gịnị ka Jehova kụziiri Job?

15 Ihe àmà ọzọ doro anya nke ike Jehova nwere ike ihe bụ ọtụtụ anụmanụ ndị dị ndụ n’ụwa. N’Abụ Ọma nke 148, e depụtara ọtụtụ n’ime ihe ndị na-eto Jehova, amaokwu nke 10 na-agụnyekwa “anụ ọhịa na anụ ụlọ nile.” Iji gosi ihe ụmụ mmadụ  kwesịrị iji na-atụ Onye Okike egwu, Jehova gwara Job okwu n’otu oge banyere anụmanụ ndị dị ka ọdụm, ịnyịnya ọhịa, atụ́, òtòbò (ma ọ bụ, enyi mmiri), na Leviathan (nke ihe àmà na-egosi na ọ bụ agụ iyi). Gịnị ka Jehova na-eme ka ọ pụta ìhè? Ọ bụrụ na mmadụ na-atụ ihe ndị a e kere eke dị ike, ndị na-emenye ụjọ, ndị a na-apụghị ịzụta azụta egwu, olee mmetụta o kwesịrị ịdị na-enwe banyere Onye Okike ha?—Job, isi nke 38-41.

16. Gịnị na-adọrọ mmasị gị banyere ụfọdụ n’ime nnụnụ ndị Jehova kere?

16 Abụ Ọma 148:10 kwukwara banyere “nnụnụ nwere nku.” Chegodị echiche banyere ụdị ha dịgasị iche iche! Jehova gwara Job banyere enyí nnụnụ, bụ́ nke “na-achị ịnyịnya, na-achịkwa onye ọ na-ebu, ọchị.” N’ezie, n’agbanyeghị na nnụnụ a na-etoru mita 2.5 n’ogologo adịghị efe efe, ọ pụrụ ịgba kilomita 65 n’otu awa, na-aga ihe ruru mita 4.5 n’otu nzọụkwụ! (Job 39:13, 18) N’aka nke ọzọ, nnụnụ mmiri bụ́ albatross na-eji ihe ka ukwuu ná ndụ ya efegharị n’elu oké osimiri. N’ịbụ ọkà n’ifegharị n’elu n’etighị nku ha eti, nnụnụ a nwere nku dị ihe dị ka mita atọ n’obosara site n’ọnụ ọnụ nke otu nku ya ruo n’ọnụ ọnụ nku nke ọzọ. Ọ pụrụ ịdị na-efegharị n’elu ruo ọtụtụ awa n’etighị nku ya eti. N’ụzọ dị nnọọ iche na nke ahụ, n’ịbụ nke dị nanị sentimita ise n’ogologo, nnụnụ bụ́ bee hummingbird bụ nnụnụ kasị nta n’ụwa. Ọ pụrụ iti nku ya ihe ruru ugboro 80 n’otu sekọnd! Nnụnụ hummingbird, bụ́ ndị na-egbuke ka obere ola nke nwere nku, pụrụ ịnọ otu ebe n’elu na-eti nku ya dị ka helikọpta, ọ pụkwara ọbụna ifela azụ.

17. Olee otú azụ̀ blue whale bururu n’ibu, nkwubi okwu dịkwa aṅaa ka anyị na-eru n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe anyị tụgharịsịrị uche n’anụmanụ dị iche iche Jehova kere?

17 Abụ Ọma 148:7 na-ekwu na ọbụna “ogologo anụ mmiri” na-eto Jehova. Cheedị echiche banyere ihe a na-ewerekarị dị ka anụ kasị buo ibu nke bitụworo n’ụwa a, blue whale. Nnukwute “ogologo anụ” a na-ebi n’ime oké osimiri, pụrụ iru mita 30 ma ọ bụ karịa n’ogologo. Ịdị arọ ya pụrụ iru ka nke ìgwè enyí 30 tozuworo etozu. Nanị ire ya ha ka otu enyí n’ịdị arọ. Obi ya hà ka obere ụgbọala. Akụkụ ahụ́ a buru ibu na-akụ nanị ugboro 9 kwa minit—n’ụzọ dị nnọọ iche n’obi nnụnụ hummingbird, bụ́ nke nwere  ike ịkụ ihe ruru ugboro 1,200 kwa minit. Ma ọ dịkarịa ala, otu n’ime akwara ọbara nke azụ̀ blue whale buru nnọọ ibu nke na obere nwa pụrụ igbe igbe n’ime ya. N’ezie, obi anyị na-akpali anyị ikwughachi okwu agbamume ahụ e ji mechie akwụkwọ Abụ Ọma: “Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Jaa.”—Abụ Ọma 150:6.

Ịmụta Ihe Site n’Ike Ike Ihe nke Jehova

18, 19. Ruo ókè ha aṅaa ka ihe ndị dị ndụ Jehova kere n’ụwa a baruru ụba, gịnịkwa ka ihe ndị e kere eke na-akụziri anyị banyere ọbụbụeze ya?

18 Gịnị ka anyị na-amụta site n’otú Jehova si eji ike ike ihe o nwere eme ihe? Ụjọ na-ejide anyị n’ihi ụdị ihe dịgasị iche iche e kere eke. Otu onye ọbụ abụ ji oké olu kwuo, sị: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! . . . Ụwa jupụtara n’ihe I nwetara.” (Abụ Ọma 104:24) Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu! Ndị ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ achọpụtawo ihe karịrị nnọọ otu nde ụdị ihe dịgasị iche iche dị ndụ n’ụwa; n’agbanyeghị nke ahụ, ha nwere echiche dịgasị iche iche banyere ma hà nwere ike iru ihe dị ka nde 10, nde 30, ma ọ bụ karịa. Omenkà bụ́ mmadụ pụrụ ịchọpụta mgbe ụfọdụ na ọ pụghịzi ichepụta ihe ọhụrụ. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, o doro anya na ike nchepụta ihe nke Jehova—ike o nwere ichepụta na ike ihe ọhụrụ dịgasị iche iche—enweghị mgbe ọ na-abịaru na nsọtụ.

19 Otú Jehova si eji ike ike ihe o nwere eme ihe na-akụziri anyị banyere ọbụbụeze ya. Okwu ahụ bụ́ “Onye Okike” na-eme ka  Jehova dị iche n’ebe ihe ọ bụla ọzọ nọ n’eluigwe na ala dị, ndị bụ́cha ‘ihe e kere eke.’ Ọbụna Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya, bụ́ onye jere ozi dị ka “onye ọkà” n’oge a na-eke ihe, adịghị mgbe ọ bụla a kpọrọ ya Onye Okike n’ime Bible. (Ilu 8:30; Matiu 19:4) Kama nke ahụ, ọ bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Ọkwá Jehova dị ka Onye Okike na-eme ka nanị ya ruo nnọọ eru ịchị eluigwe na ala dum.—Ndị Rom 1:20; Mkpughe 4:11.

20. N’echiche dị aṅaa ka Jehova zuworo ike kemgbe o kesịrị ihe ndị dị n’ụwa?

20 Jehova ọ̀ kwụsịwo iji ike ike ihe ya eme ihe? Bible kwuru na mgbe Jehova rụsịrị ọrụ ya nke ike ihe n’ụbọchị nke isii nke ike ihe, o “wee zuo ike n’ụbọchị nke asaa ahụ n’ọrụ Ya nile nke ọ rụrụ.” (Jenesis 2:2, NW) Pọl onyeozi gosiri na ‘ụbọchị’ nke asaa a dị ọtụtụ puku afọ n’ogologo, n’ihi na ọ ka nọ na-aga n’ihu n’oge nke ya. (Ndị Hibru 4:3-6) Ma ‘izu ike’ ọ̀ pụtara na Jehova akwụsịla ịrụ ọrụ kpam kpam? Ee e, Jehova adịghị akwụsị ịrụ ọrụ. (Abụ Ọma 92:4; Jọn 5:17) Mgbe ahụ, izu ike ya aghaghị ịdị na-ezo aka nanị ná nkwụsị ọ kwụsịrị ọrụ ike ihe ndị a na-ahụ anya n’ụwa. Otú ọ dị, ọ kwụsịbeghị ọrụ ya nke imezu nzube ya. Ọrụ ahụ agụnyewo iji ike mmụọ nsọ ya kpalie odide nke Akwụkwọ Nsọ. Ọrụ ya agụnyewo ọbụna imepụta “ihe e kere ọhụrụ,” bụ́ nke a ga-atụle n’Isi nke 19.—2 Ndị Kọrint 5:17.

21. Olee otú ike ike ihe nke Jehova ga-esi emetụta ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ruo mgbe nile ebighị ebi?

21 Mgbe ụbọchị izu ike Jehova ga-emesịa bịa ná njedebe, ọ ga-enwe ike ikwu na ọrụ nile ọ rụrụ n’ụwa “dị mma nke ukwuu,” dị nnọọ ka o mere ná ngwụsị nke ụbọchị isii ahụ nke ike ihe. (Jenesis 1:31) Anyị ka ga-ahụ otú ọ pụrụ ikpebi isi jiri ike ike ihe ya na-enweghị nsọtụ mee ihe mgbe nke ahụ gasịrị. Ka o sina dị, anyị pụrụ inwe obi ike na otú Jehova ga-esi eji ike ike ihe o nwere eme ihe ga-anọgide na-adọrọ mmasị anyị. Ruo mgbe nile ebighị ebi, anyị ga-amụtakwu banyere Jehova site n’ihe ndị o kere eke. (Eklisiastis 3:11) Ka anyị na-amụtakwu banyere ya, otú ahụ ka egwu anyị na-atụ ya ga na-emikwu emi—otú ahụkwa ka anyị ga na-abịarukwu Onye Okike Ukwu anyị nso.

^ par. 2 Iji mee ka a ghọtakwuo ọnụ ọgụgụ ahụ dị ukwuu nke ọma, chee echiche banyere nke a: Ọ bụrụ na i ji ụgbọala na-aga ebe dị anya otú ahụ—ọ bụrụgodị na ị na-agba kilomita 160 kwa awa, n’akwụsịtụghị akwụsị ma ọlị—ọ ga-ewe gị ihe karịrị otu narị afọ iji garuo!

^ par. 6 Ụfọdụ na-eche na ndị mgbe ochie ndị dịrị ndụ n’oge Bible aghaghị ijiwo ụdị teliskop mgbe ochie mee ihe. Ha na-eche, sị, olee ụzọ ọzọ ndị biri ndụ n’oge ahụ siworị mara na e nwere ọnụ ọgụgụ buru nnọọ ibu nke kpakpando, nke a na-apụghị ịgụta ọnụ, n’otú mmadụ si ele ihe anya? Echiche dị otú ahụ na-enweghị ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ adịghị egosi na ha na-echeta na Jehova, bụ́ Onye Chepụtara Bible, nọ.—2 Timoti 3:16.

^ par. 7 Cheedị echiche ogologo oge ọ ga-ewe gị nanị iji gụọ 100 ijeri kpakpando. Ọ bụrụ na ị ga-agụtali otu kwa sekọnd—ma nọgide na-agụ ya n’akwụsịghị akwụsị ruo awa 24 n’ụbọchị ọ bụla—ọ ga-ewe gị afọ 3,171!