Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 9

“Kraịst Ike nke Chineke”

“Kraịst Ike nke Chineke”

1-3. (a) Ahụmahụ dị aṅaa na-emenye ụjọ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nwere n’Oké Osimiri Galili, gịnịkwa ka Jizọs mere? (b) N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Jizọs n’ụzọ ziri ezi, “Kraịst ike nke Chineke”?

OKÉ ụjọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha ji ụgbọ mmiri na-agafe Oké Osimiri Galili mgbe oké ifufe fekwasịrị ha na mberede. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha ahụla oké ifufe n’ọdọ mmiri a na mbụ—e kwuwerị, ụfọdụ n’ime ndị ikom ahụ bụ aka ochie n’ịkụ azụ̀. * (Matiu 4:18, 19) Ma nke a bụ “ajọ oké ifufe,” o mekwara ozugbo ka e nwee oké ebili mmiri n’oké osimiri ahụ. Ndị ikom ahụ gbalịsiri ike ịnọgide na-achịkwa ụgbọ ha, ma oké ifufe ahụ karịrị ha ike. Ebili mmiri nọ “na-etikwasị ụgbọ ahụ” nke na mmiri malitere ịbanye n’ime ya. N’agbanyeghị oké mkpọtụ ahụ, Jizọs nọ n’oké ụra n’azụ ụgbọ ahụ n’ihi na ike gwụrụ ya nnọọ mgbe ọ kụzisịịrị ìgwè mmadụ ihe n’ụbọchị ahụ. N’ịbụ ndị ụjọ ji maka ndụ ha, ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya, na-arịọ ya, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta anyị, anyị na-aga ịla n’iyi!”—Mak 4:35-38; Matiu 8:23-25.

2 Jizọs atụghị egwu. O ji obi ike zuru ezu baara ifufe na oké osimiri ahụ mba, sị: “Shịị! Daa jụụ!” Ngwa ngwa, ifufe na oké osimiri ahụ rubere isi—oké ifufe ahụ kwụsịrị, ebili mmiri ahụ dajụrụ, “ebe nile wee daa jụụ.” Oké egwu jideziri ndị na-eso ụzọ ya. “Ònye n’ezie ka onye a bụ?” ka ha takwụnyeere ibe ha. N’ezie, olee ụdị mmadụ pụrụ ịbara ifufe na oké osimiri mba dị ka à ga-asị na ọ na-agbazi nwa dị isi ike olu?—Mak 4:39-41; Matiu 8:26, 27.

 3 Ma Jizọs abụghị mmadụ nkịtị. E gosipụtara ike Jehova n’ebe ọ nọ nakwa site n’aka ya n’ụzọ ndị pụrụ nnọọ iche. Pọl onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ nwere ike izo aka n’ebe ọ nọ n’ụzọ ziri ezi dị ka “Kraịst ike nke Chineke.” (1 Ndị Kọrint 1:24) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka e si gosipụta ike Chineke n’ebe Jizọs nọ? Mmetụta dịkwa aṅaa ka otú Jizọs si eji ike eme ihe pụrụ inwe ná ndụ anyị?

Ike nke Ọkpara Chineke Mụrụ Nanị Ya

4, 5. (a) Ike na ikike dị aṅaa ka Jehova nyefere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya? (b) Olee otú e si kwadebe Ọkpara a imezu nzube Nna ya ji kee ihe?

4 Tụlee ike Jizọs nwere n’oge ndụ ya tupu ọ ghọọ mmadụ. Jehova gosipụtara “ike ebighị ebi” ya mgbe o kere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ onye a bịara mara dị ka Jizọs Kraịst. (Ndị Rom 1:20; Ndị Kọlọsi 1:15) Mgbe e mesịrị, Jehova nyefere Ọkpara a ike na ikike dị ukwuu, wee nye ya ọrụ imezu nzube mere O ji kee ihe. Banyere Ọkpara ahụ, Bible na-ekwu, sị: “Ihe nile sitere n’aka ya dịrị, ma ọ́ bụghịkwa site n’aka ya ọ dịghị ọbụna otu ihe e mere ka ọ dịrị.”—Jọn 1:3.

5 Ọ pụrụ isiri anyị ike ịghọta otú ọrụ ahụ bururu n’ibu. Cheedị echiche ụdị ike a chọrọ iji kee ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi dị ike, mbara ígwé na ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando ndị dị na ya, na ụwa na ọtụtụ ihe ndị dị ndụ dị na ya. Iji rụzuo ọrụ ndị ahụ, e nyere Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya ike kasị ike nile n’eluigwe na ala—mmụọ nsọ Chineke. Ọkpara a nwere obi ụtọ dị ukwuu n’ịbụ Onye Ọkà, onye Jehova ji mee ihe n’ike ihe nile ọzọ.—Ilu 8:22-31.

6. Mgbe ọnwụ ya n’ụwa na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, olee ike na ikike e nyere Jizọs?

6 Ọkpara ahụ a mụrụ nanị ya ọ̀ pụrụ inweta ọbụna ike na ikike ka ukwuu? Mgbe ọnwụ Jizọs n’ụwa na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, o kwuru, sị: “E nyewo m ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Matiu 28:18) Ee, e nyewo Jizọs ikike ka o jiri ike mee ihe n’eluigwe na ụwa. Dị ka “Eze nke ndị eze na Onyenwenụ nke ndị nwenụ,” e nyewo ya ikike ime ka  “ọchịchị nile na ikike na ike nile ghara ịdị irè”—ndị a na-ahụ anya na ndị a na-adịghị ahụ anya—bụ́ ndị na-emegide Nna ya. (Mkpughe 19:16; 1 Ndị Kọrint 15:24-26) Chineke “ahapụghị ihe ọ bụla n’edoghị ya n’okpuru” Jizọs—ya bụ, ma e wezụga Jehova n’onwe ya.—Ndị Hibru 2:8; 1 Ndị Kọrint 15:27.

7. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ọ dịghị mgbe Jizọs ga-eji ike Jehova nyere ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi?

7 Ọ̀ dị anyị mkpa ichegbuwe onwe anyị ma Jizọs ò nwere ike iji ike ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi? Ọ dịghị ma ọlị! Jizọs hụrụ Nna ya n’anya n’ezie, ọ dịghịkwa mgbe ọ ga-eme ihe ọ bụla iji kpasuo ya iwe. (Jọn 8:29; 14:31) Jizọs maara nke ọma na Jehova adịtụghị eji ike ya kasịnụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Jizọs ejiriwo anya ya hụ na Jehova na-achọ ohere ndị ọ ga-eji “[gosi] Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) N’ezie, Jizọs hụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’anya otú Nna ya si hụ ha n’anya, n’ihi ya anyị pụrụ inwe ntụkwasị obi na Jizọs ga-eji ike ya na-eme ihe mgbe nile n’ụzọ dị mma. (Jọn 13:1) A marawo Jizọs amara na nke a. Ka anyị tụlee ike o nwere mgbe ọ nọ n’ụwa na otú a kwaliri ya isi jiri ya mee ihe.

‘Onye Dị Ike n’Okwu’

8. Mgbe e tesịrị Jizọs mmanụ, gịnị ka e nyere ya ike ime, oleekwa otú o si jiri ike ya mee ihe?

8 Dị ka ihe àmà na-egosi, Jizọs arụghị ọrụ ebube ọ bụla mgbe ọ bụ nwa okoro na-etolite etolite na Nazaret. Ma nke ahụ gbanwere mgbe e mesịrị ya baptizim na 29 O.A., mgbe ọ dị ihe dị ka afọ 30. (Luk 3:21-23) Bible na-agwa anyị, sị: “Chineke [ji] mmụọ nsọ na ike tee ya mmanụ, o wee gazuo ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị nile Ekwensu na-emekpọ ọnụ.” (Ọrụ 10:38) “Na-eme ihe ọma”—nke ahụ ọ́ dịghị egosi na Jizọs ji ike ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi? Mgbe e tesịrị ya mmanụ, ọ “ghọrọ onye amụma dị ike n’ọrụ na n’okwu.”—Luk 24:19.

9-11. (a) N’ebee ka Jizọs nọ zie ihe ka ukwuu n’ozizi ya, ihe ịma aka dịkwa aṅaa chere ya ihu? (b) Gịnị mere ụzọ Jizọs si zie ihe ji ju ìgwè mmadụ ahụ anya?

 9 Olee otú Jizọs si dị ike n’okwu? O ziri ihe mgbe mgbe n’èzí nkịtị—n’akụkụ ọdọ mmiri na n’akụkụ ugwu nakwa n’okporo ámá nakwa n’ọmà ahịa. (Mak 6:53-56; Luk 5:1-3; 13:26) Ndị na-ege ya ntị nwere ike ịgawara nnọọ onwe ha ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ekwu amasịghị ha. N’oge a na-enwebeghị akwụkwọ e biri ebi, ndị ji mmasị na-ege ntị aghaghị iburu ihe ndị ha nụrụ n’ọnụ ya n’uche ha na n’obi ha. Ya mere, ọ dị mkpa ka ihe Jizọs na-ezi bụrụ nke na-adọrọ nnọọ mmasị, nke a na-aghọta nke ọma, na nke dị mfe ncheta. Ma ihe ịma aka a abụghịrị Jizọs nsogbu. Dị ka ihe atụ, tụlee Ozizi Elu Ugwu ya.

10 N’otu ụtụtụ ná mmalite afọ 31 O.A., ìgwè mmadụ gbakọtara n’akụkụ otu ugwu nke dị nso n’Oké Osimiri Galili. Ụfọdụ si Judia na Jeruselem bịa, bụ́ ebe ndị dị 100 kilomita ruo kilomita 110 site n’ebe ahụ. Ndị ọzọ si n’ógbè dị n’ụsọ mmiri bụ́ Taịa na Saịdọn, ndị dị n’ebe ugwu, bịa. Ọtụtụ ndị ọrịa bịaruru Jizọs nso imetụ ya aka, ọ gwọkwara ha nile. Mgbe ọ na-adịghịzi ọbụna otu onye na-arịasi ọrịa ike fọrọ n’etiti ha, ọ malitere izi ha ihe. (Luk 6:17-19) Mgbe o kwusịrị okwu ka oge ụfọdụ gasịrị, ihe ha nụrụ tụrụ ha n’anya. N’ihi gịnị?

11 Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, otu onye n’ime ndị nụrụ ozizi ahụ dere, sị: “Ụzọ o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya; n’ihi na ọ nọ na-ezi ha ihe dị ka onye nwere ikike.” (Matiu 7:28, 29) Jizọs ji ikike ruru ha n’ahụ́ kwuo okwu. O kwuchiteere Chineke okwu ma jiri ikike nke Okwu Chineke kwado ozizi ya. (Jọn 7:16) Ihe Jizọs kwuru doro anya, agbamume ya na-akwali mmadụ ime ihe, arụmụka ya enweghị mgbagha. Okwu ya gara kpọmkwem n’ihe a na-ekwu, ruokwa ndị na-ege ya ntị n’obi. Ọ kụziiri ha ụzọ isi chọta obi ụtọ, ụzọ isi na-ekpe ekpere, otú e si achọ Alaeze Chineke, ụzọ isi mee atụmatụ maka ọdịnihu e ji n’aka. (Matiu 5:3–7:27) Okwu ya kpaliri obi nke ndị agụụ eziokwu na ezi omume na-agụ. Ndị dị otú  ahụ dị njikere ‘ịjụ’ onwe ha na ịgbahapụ ihe nile iji soro ya. (Matiu 16:24; Luk 5:10, 11) Lee ihe akaebe nke a bụ banyere ike nke okwu Jizọs nwere!

Onye “Dị Ike n’Ọrụ”

12, 13. N’echiche dị aṅaa ka Jizọs “dị ike n’ọrụ,” oleekwa otú ọrụ ebube ya si dịgasịa iche iche?

12 Jizọs ‘dịkwa ike n’ọrụ.’ (Luk 24:19) Oziọma ndị ahụ na-akọ banyere ihe karịrị ọrụ ebube 30 a kpọrọ aha kpọmkwem ndị ọ rụrụ—o ji “ike Jehova” rụọ ha nile. * (Luk 5:17) Ọrụ ebube Jizọs nwere mmetụta ná ndụ nke ọtụtụ puku mmadụ. Nanị ọrụ ebube abụọ—inye ndị ikom 5,000, e mesịakwa ndị ikom 4,000, nri, “ma e wezụga ndị inyom na ụmụntakịrị”—gụnyere ìgwè mmadụ ndị ngụkọta ọnụ ọgụgụ ha ruru ihe dị ka mmadụ 20,000 ma eleghị anya!—Matiu 14:13-21; 15:32-38.

“Ha hụrụ Jizọs ka ọ na-eje ije n’elu oké osimiri”

13 Ọrụ ebube Jizọs rụrụ dịgasị nnọọ iche iche. O nwere ikike n’ebe ndị mmụọ ọjọọ nọ, na-achụpụ ha n’ụzọ dị mfe. (Luk 9:37-43) O nwere ike n’ebe ihe ndị a na-ahụ anya dị, o mere ka mmiri ghọọ mmanya. (Jọn 2:1-11) N’ụzọ juru ndị na-eso ụzọ ya anya, o jere ije n’elu Oké Osimiri Galili nke oké ifufe na-efe na ya. (Jọn 6:18, 19) O nwere ike n’ebe ọrịa dị, ọ gwọrọ nkwarụ dị iche iche, ọrịa na-adịghị ala ala, na ọrịa na-eyi ndụ egwu. (Mak 3:1-5; Jọn 4:46-54) Ọ gwọrọ ọrịa ndị ahụ n’ụzọ dịgasị iche iche. Jizọs nọ n’ebe dị nnọọ anya gwọọ ụfọdụ ndị, ebe o metụrụ ndị ọzọ aka. (Matiu 8:2, 3, 5-13) A gwọrọ ụfọdụ ndị ozugbo, ndị ọzọ ji nwayọọ nwayọọ gbakee.—Mak 8:22-25; Luk 8:43, 44.

14. N’ọnọdụ dịgasị aṅaa ka Jizọs gosipụtara na ya nwere ike iwepụ ọnwụ?

14 N’ụzọ pụtara ìhè, Jizọs nwere ike iwepụ ọnwụ. N’oge atọ e dekọrọ maka ha, ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, kpọrọ otu nwatakịrị nwanyị dị afọ 12 kpọnyeghachi ndị mụrụ ya,  kpọnyeghachi otu nne bụ́ nwanyị di ya nwụrụ otu nwa nwoke ọ mụrụ nanị ya, kpọnyeghachikwa ụmụnne nwanyị abụọ nwanne ha nwoke ha hụrụ n’anya. (Luk 7:11-15; 8:49-56; Jọn 11:38-44) Ọ dịghị ọnọdụ taara ya akpụ gabiga ókè. Ọ kpọlitere nwatakịrị nwanyị ahụ dị afọ 12 n’àkwà o dina nwụọ ntakịrị oge ka ọ nwụsịrị. Ọ kpọlitere nwa nwoke ahụ nke nwanyị di ya nwụrụ n’ihe e ji buru ya na-aga ili, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọ bụ n’ụbọchị ahụ ọ nwụrụ. Ọ kpọlitekwara Lazarọs n’ili mgbe ọ gasịworo ụbọchị anọ ọ nwụrụ.

Iji Ike Eme Ihe n’Ụzọ Achọghị Ọdịmma Onwe Onye Nanị, Nghọta, na Ichebara Ndị Ọzọ Echiche

15, 16. Olee ihe àmà na-egosi na Jizọs ejighị ike ya mee ihe n’ụzọ ịchọ ọdịmma onwe ya nanị?

15 Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche otú onye ọchịchị na-ezughị okè gaara esi jiri ike ahụ e nyere Jizọs mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma a sị na ọ bụ ya ka e nyere ya? Ma Jizọs emeghị mmehie. (1 Pita 2:22) O kweghị ka ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, oké ọchịchọ, na anyaukwu bụ́ ihe ndị na-akpali ụmụ mmadụ na-ezughị okè iji ike ha na-emegbu ndị ọzọ, merụọ ya.

16 Jizọs ji ike ya mee ihe n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe ya nanị, ọ dịghị mgbe o ji ya mee ihe maka uru nke onwe ya. Mgbe agụụ gụrụ ya, ọ jụrụ ime ka nkume ghọọrọ ya achịcha. (Matiu 4:1-4) Ihe onwunwe ole na ole o nwere bụ ihe àmà na-egosi na o jighị ike ya mee ihe iji nweta ihe onwunwe. (Matiu 8:20) E nwere ihe àmà ọzọ na-egosi na ọ bụghị ịchọ ọdịmma onwe onye kpaliri ya ịrụ ọrụ ndị dị ike ọ rụrụ. Mgbe ọ rụrụ ọrụ ebube, o furu ya ihe. Mgbe ọ gwọrọ ndị ọrịa, ike si n’ahụ́ ya pụọ. Ọ maara banyere ike a nke na-apụ ya n’ahụ́, ọbụna mgbe ọ gwọrọ nanị otu onye. (Mak 5:25-34) N’agbanyeghị nke ahụ, o kwere ka ìgwè mmadụ metụ ya aka, ọ gwọkwara ha. (Luk 6:19) Lee mmụọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị nke ahụ bụ!

17. Olee otú Jizọs si gosipụta na o ji nghọta mee ihe n’ụzọ o si jiri ike ya mee ihe?

17 Jizọs ji nghọta mee ihe n’ụzọ o si jiri ike ya mee ihe. Ọ  dịghị mgbe ọ bụla ọ rụrụ ọrụ dị ike ka e wee kiriwe ya ma ọ bụ iji mee ihe ngosi na-enweghị isi. (Matiu 4:5-7) Ọ dịghị njikere ime ihe ịrịba ama nanị iji mejuo ọchịchọ ịmata ihe nke Herọd, nke sitere ná nzube na-ezighị ezi. (Luk 23:8, 9) Kama ime ka a mata na o nwere ike, ọtụtụ mgbe Jizọs na-agwa ndị ọ gwọrọ ka ha ghara ịkọrọ ya onye ọ bụla. (Mak 5:43; 7:36) Ọ chọghị ka ndị mmadụ kpebie onye ọ bụ dabere n’akụkọ ndị e tinyere nnu na ose.—Matiu 12:15-19.

18-20. (a) Gịnị chịkwara ụzọ Jizọs si jiri ike ya mee ihe? (b) Olee ihe i chere banyere ụzọ Jizọs si gwọọ otu nwoke ntị chiri?

18 Nwoke a dị ike, bụ́ Jizọs, dị nnọọ iche ná ndị ọchịchị bụ́ ndị jiworo ike ha mee ihe n’ụzọ echebatụrụghị mkpa na nhụjuanya nke ndị ọzọ echiche. Ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ Jizọs n’ahụ́. Nanị anya ọ hụrụ ndị nọ ná mmekpa ahụ́ metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu nke na a kwaliri ya ime ka ahụhụ ha na-ata kwụsị. (Matiu 14:14) O chebaara mmetụta na mkpa ha echiche, nchegbu ọmịiko a nwekwara mmetụta n’otú o si jiri ike ya mee ihe. A na-achọta otu ihe atụ na-emetụ n’ahụ́ na Mak 7:31-37.

19 N’oge a, oké ìgwè mmadụ hụrụ Jizọs ma kpọtara ya ọtụtụ ndị ọrịa, ọ gwọkwara ha nile. (Matiu 15:29, 30) Ma Jizọs họọrọ otu nwoke ma lebara ya anya n’ụzọ pụrụ iche. Ntị chiri nwoke ahụ, o nwekwara nsogbu ikwu okwu. O nwere ike ịbụ na Jizọs chọpụtara ahụ́ erughị ala ma ọ bụ ihere pụrụ iche nke nwoke a. N’iji ezi uche mee ihe, Jizọs kpọpụrụ nwoke ahụ n’akụkụ—pụọ n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ—kpọrọ ya gaa n’ebe nanị ha abụọ nọdụrụ. E mesịa, Jizọs ji aka gwa nwoke ahụ ihe ọ na-aga ime. O “[tinyere] mkpịsị aka ya n’ime ntị abụọ nke nwoke ahụ, mgbe ọ gbụpụsịrị ọnụ mmiri, o bitụkwara ire ya aka.” * (Mak 7:33) Jizọs leliziri anya n’eluigwe ma sụọ ude nke bụ́ arịrịọ. Ihe ndị a  o mere ga-agwa nwoke ahụ, sị, ‘Ihe m na-aga imere gị bụ site n’ike Chineke.’ N’ikpeazụ, Jizọs sịrị: “Meghee.” (Mak 7:34) Ozugbo ahụ, nwoke ahụ malitere ịnụ ihe, nweekwa ike ikwu okwu nke ọma.

20 Lee ka o si emetụ n’ahụ́ iche n’echiche na ọbụna mgbe o ji ike ịgwọ ọrịa nke Chineke nyere ya na-agwọ ndị nọ n’ahụhụ, Jizọs gosiri nchebara echiche sitere n’ọmịiko maka mmetụta ha! Ọ́ bụghị ihe na-emesi obi ike ịmara na Jehova ewerewo Alaeze Mezaịa nyefee n’aka Onye Ọchịchị dị otú ahụ dị ọmịiko, nke na-echebakwara ndị ọzọ echiche?

Mgbaàmà nke Ihe Ndị Gaje Ịbịa

21, 22. (a) Gịnị ka ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ na-agba àmà ya? (b) Ebe ọ bụ na Jizọs pụrụ ịchịkwa ike ndị sitere n’okike, gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya n’okpuru ịchịisi Alaeze ya?

21 Ọrụ dị ike ndị Jizọs rụrụ n’ụwa bụ nanị ihe atụ nke ngọzi ndị dị ebube ọbụna karị a ga-enweta n’oge ọchịchị ya. N’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke, Jizọs ga-arụkwa ọrụ ebube ọzọ—ma ọ ga-abụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ! Tụlee ụfọdụ n’ime atụmanya na-akpali akpali ndị e nwere maka ọdịnihu.

22 Jizọs ga-eme ka njikọ nke ihe ndị dị ndụ n’ụwa na gburugburu ha nweghachi nkwekọrịta zuru okè. Cheta na o gosipụtara na ya pụrụ ịchịkwa ike ndị sitere n’okike site n’ime ka oké ifufe dajụọ. Mgbe ahụ, n’okpuru ịchịisi Alaeze Kraịst, ọ gaghị adị mkpa ka ihe a kpọrọ mmadụ na-atụ ụjọ ịbụ ndị oké ifufe, ala ọma jijiji, ugwu na-agbọpụta ọkụ, ma ọ bụ ọdachi ndị ọzọ na-emere onwe ha ga-emerụ ahụ́. Ebe ọ bụ Jizọs bụ Onye Ọkà, onye Jehova ji kee ụwa na ihe nile dị ndụ dị n’ime ya, ọ ghọtara ihe ndị mejupụtara ụwa nke ọma. Ọ maara ụzọ isi jiri ihe ndị dị n’ime ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’okpuru ịchịisi ya, a ga-agbanwe ụwa a dum ịghọ Paradaịs.—Luk 23:43.

23. Dị ka Eze, olee otú Jizọs ga-esi gboo mkpa nke ihe a kpọrọ mmadụ?

23 Gịnị banyere ihe ndị dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa? Ikike Jizọs nwere iji ntakịrị ihe oriri nyejuo ọtụtụ puku mmadụ  afọ na-emesi anyị obi ike na ịchịisi ya ga-eweta nnwere onwe pụọ n’agụụ. N’ezie, ụba ihe oriri, nke a ga-ekesa n’ụzọ ziri ezi, ga-eme ka agụụ kwụsị ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 72:16) Ikike o nwere n’ebe ọrịa na nrịanrịa dị na-agwa anyị na a ga-agwọ ndị ọrịa, ndị ìsì, ndị ntị chiri, ndị nwere nkwarụ, na ndị ngwụrọ—kpam kpam nakwa n’ụzọ na-adịgide adịgide. (Aịsaịa 33:24; 35:5, 6) Ikike o nwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ na-eme ka e jide n’aka na ịdị ike ya dị ka Eze eluigwe ga-agụnye ike o nwere ịkpọlite ọtụtụ nde ndị Nna ya chọrọ, n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.

24. Ka anyị na-atụgharị uche n’ike Jizọs, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche, n’ihi gịnịkwa?

24 Ka anyị na-atụgharị uche n’ike Jizọs, ka anyị buru n’uche na Ọkpara a na-eṅomi Nna ya n’ụzọ zuru okè. (Jọn 14:9) Otú Jizọs si jiri ike mee ihe na-eme ka anyị ghọta nke ọma otú Jehova si eji ike eme ihe. Dị ka ihe atụ, cheedị echiche otú Jizọs si gwọọ otu onye ekpenta n’ụzọ ọmịiko. N’ịbụ onye ọmịiko kpaliri, Jizọs metụrụ nwoke ahụ aka ma kwuo, sị: “Achọrọ m.” (Mak 1:40-42) Site n’ihe ndekọ ndị dị ka nke a, Jehova na-ekwu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị: ‘Otú ahụ ka m si eji ike m eme ihe!’ Ọ̀ bụ na a dịghị akpali gị ito Chineke anyị pụrụ ime ihe nile na inye ya ekele na ọ na-eji ike ya eme ihe n’ụzọ ịhụnanya dị otú ahụ?

^ par. 1 Oké ifufe mberede na-efekarị n’Oké Osimiri Galili. N’ihi otú ebe oké osimiri ahụ dị si dị ala (ihe ji ihe dị ka mita 200 dị ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri), ikuku dị n’ebe ahụ na-ekpo ọkụ karịa n’ebe ndị gbara ya gburugburu, nke a na-akpatakwa oké ifufe. Oké ifufe na-esi n’Ugwu Hemọn, nke dị n’ebe ugwu, na-efedasi ike na Ndagwurugwu Jọdan. Ihu igwe dị jụụ nwere ike ịgbanwe na mberede ghọọ oké ifufe.

^ par. 12 Ọzọkwa, mgbe ụfọdụ Oziọma ndị ahụ na-achịkọta ọtụtụ ọrụ ebube ọnụ ma kọọ ha dị ka otu. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, otu ‘obodo dum’ bịara ịhụ ya, ọ gwọkwara “ọtụtụ” ndị ọrịa.—Mak 1:32-34.

^ par. 19 Ịgbụpụ ọnụ mmiri bụ otu ụzọ nke ma ndị Juu ma ndị Jentaịl nakweere e si agwọ ọrịa, a kọkwara banyere iji ọnụ mmiri agwọ ọrịa n’ihe odide ndị rabaị. Ọ pụrụ ịbụ na Jizọs gbụpụrụ ọnụ mmiri nanị iji gwa nwoke ahụ na a na-aga ịgwọ ya. N’agbanyeghị nke ọ bụ, Jizọs ejighị ọnụ mmiri ya mee ihe dị ka ọgwụ e ji agwọ ọrịa.