Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 7

Ike Nchebe—“Chineke Bụụrụ Anyị Ebe Mgbaba”

Ike Nchebe—“Chineke Bụụrụ Anyị Ebe Mgbaba”

1, 2. Ihe ize ndụ dị aṅaa ka ụmụ Izrel nọ na ya mgbe ha banyere n’ógbè Saịnaị na 1513 T.O.A., oleekwa otú Jehova si mesie ha obi ike?

ỤMỤ Izrel nọ n’ihe ize ndụ mgbe ha banyere n’ógbè Saịnaị ná mmalite afọ 1513 T.O.A. Ha na-aga iji ụkwụ mee njem na-emenye ụjọ, njem ha ga-eme gafere “n’ọzara ukwu ahụ nke dị egwu, nke agwọ nke yiri ọkụ na akpị dị n’ime ya.” (Deuterọnọmi 8:15) Ha nọkwa n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị mba bụ́ ndị iro ha wakporo. Ọ bụ Jehova kpọbatara ndị ya n’ọnọdụ a. Dị ka Chineke ha, ọ̀ ga-enwe ike ichebe ha?

2 Okwu Jehova mesiri ha nnọọ obi ike: “Unu onwe unu ahụwo ihe M mere ndị Ijipt, ebukwara m unu n’elu nku ugo, mee ka unu bịakwute m.” (Ọpụpụ 19:4) Jehova chetaara ndị ya na ya napụtara ha site n’aka ndị Ijipt, jiri ugo, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, bupụ ha gaa n’ebe dị nchebe. Ma e nwere ihe ndị ọzọ mere “nku ugo” ji bụrụ ihe atụ kwesịrị ekwesị nke nchebe Chineke.

3. N’ihi gịnị ka “nku ugo” ji bụrụ ihe atụ kwesịrị ekwesị nke nchebe Chineke?

3 Ugo na-eji nku ya sara mbara ma sie ike eme ihe ndị ọzọ tụkwasị n’iji ya efego n’elu elu. N’oge anwụ na-acha n’ụbọchị, nne ugo na-agbasa nku ya—nke pụrụ ịkarị mita abụọ n’ogologo—ka ọ ghọọ nche anwụ, wee jiri ya kpuchie ụmụ ọhụrụ ya ka anwụ ghara ịchagbu ha. N’oge ndị ọzọ, ọ na-eji nku ya ekpuchi ụmụ ya iji chebe ha pụọ n’ikuku oyi. Dị ka nne ugo si echebe ụmụ ya, otú ahụ ka Jehova siworo kpuchie ma chebe mba ọhụrụ a bụ́ Izrel. Ugbu a ha nọ n’ọzara, ndị ya ga-anọgide na-enweta nchebe n’okpuru ndo nku ya dị ike ma ọ bụrụhaala na ha anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. (Deuterọnọmi 32:9-11; Abụ Ọma 36:7) Ma ànyị pụrụ ịtụ anya nchebe Chineke taa n’ụzọ ziri ezi? Ànyị pụrụ izi ezi ịtụ anya nchebe Chineke?

 Nkwa Maka Nchebe Chineke

4, 5. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike zuru ezu ná nkwa Chineke kwere ichebe anyị?

4 N’ezie, Jehova nwere ikike ichebe ndị ohu ya. Ọ bụ “Chineke Nke pụrụ ime ihe nile”—utu aha na-egosi na o nwere ike a na-apụghị igbochi egbochi. (Jenesis 17:1) Dị ka idei mmiri nke a na-apụghị igbochi, a pụghị igbochi ike Jehova gosipụtara egosipụta egbochi. Ebe ọ bụ na o nwere ike ime ihe ọ bụla bụ́ uche ya, anyị pụrụ ịjụ, ‘Ọ̀ bụ uche Jehova iji ike ya echebe ndị ya?’

5 N’iji otu okwu zaa ya, azịza ya bụ ee! Jehova na-emesi anyị obi ike na ọ ga-echebe ndị ya. “Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, O mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile,” ka Abụ Ọma 46:1 na-ekwu. Ebe ọ bụ na Chineke ‘apụghị ịgha ụgha,’ anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu ná nkwa o kwere ichebe anyị. (Taịtọs 1:2) Ka anyị tụlee ụfọdụ ihe atụ doro anya ma na-emetụ n’ahụ́ ndị Jehova ji kọwaa nlekọta ya nke na-echebe mmadụ.

6, 7. (a) Olee otú onye ọzụzụ atụrụ n’oge Bible si echebe atụrụ ya? (b) Olee otú Bible si eme ihe atụ nke ọchịchọ sitere n’obi nke Jehova nwere ichebe na ilekọta atụrụ ya?

6 Jehova bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ, anyị bụkwa “ndị Ya, na ìgwè atụrụ nke ọzụzụ anụ Ya.” (Abụ Ọma 23:1; 100:3) Anụ na-enweghị ike ichebe onwe ha dị ka atụrụ dị ole na ole. Onye ọzụzụ atụrụ n’oge Bible aghaghị inwe obi ike iji chebe atụrụ ya pụọ n’aka ọdụm, nkịta ọhịa, na anụ ọhịa bea, nakwa n’aka ndị ohi. (1 Samuel 17:34, 35; Jọn 10:12, 13) Ma e nwere mgbe ichebe atụrụ na-achọ ka a dị nro. Mgbe atụrụ mụrụ nwa n’ebe dị anya site n’ebe ogige atụrụ dị, onye ọzụzụ atụrụ nke na-ahụ n’anya ga-eche nne atụrụ ahụ nche n’oge ahụ ọ chọrọ enyemaka ma kuru nwa ya nke na-enweghị onye nchebe bịa n’ogige atụrụ ahụ.

‘Ọ bụ n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha’

7 Site n’iji onwe ya tụnyere onye ọzụzụ atụrụ, Jehova  na-emesi anyị obi ike banyere ọchịchọ sitere n’obi o nwere ichebe anyị. (Ezikiel 34:11-16) Cheta otú e si kọwaa Jehova n’Aịsaịa 40:1, bụ́ nke a tụlere n’Isi nke 2 nke akwụkwọ a: “Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ka Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ Ya, n’ogwe aka Ya ka Ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha.” Olee otú nwa atụrụ si abịa nọrọ “n’obi”—ebe ndị fụkọrọ afụkọ n’uwe elu—nke onye ọzụzụ atụrụ? Nwa atụrụ ahụ pụrụ ịbịakwute onye ọzụzụ atụrụ, ọbụna chitụ ya ahụ́ n’ụkwụ. Otú ọ dị, ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ bụ onye na-aghaghị ihulata, kulite nwa atụrụ ahụ, ma jiri nwayọọ kukwasị ya n’ebe ọ ga-anọ ná nchebe n’obi ya dị nchebe. Lee ihe atụ na-emetụ n’ahụ́ nke njikere Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu anyị dị ikpuchi na ichebe anyị!

8. (a) Ole ndị ka Chineke na-ekwe nkwa nchebe, oleekwa otú e si gosipụta nke a n’Ilu 18:10? (b) Gịnị ka ịgbaba n’aha Chineke gụnyere?

8 Nkwa Chineke kwere inye nchebe bụ nanị ma e mee ihe ụfọdụ—ọ bụ nanị ndị bịaruru ya nso na-enweta ya. Ilu 18:10 na-ekwu, sị: “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, [e wee chebe ha, NW].” N’oge Bible, a na-ewu ụlọ elu mgbe ụfọdụ n’ọzara ka ọ bụrụ ebe mgbaba na-enye nchebe. Ma, ọ bụ onye nọ n’ihe ize ndụ ka ọ dịịrị ịgbaba n’ụlọ elu dị otú ahụ iji nweta nchebe. Otú ahụ ka ọ dị n’ịgbaba n’aha Chineke. Nke a na-agụnye ihe karịrị ịdị na-akpọghachi aha Chineke; aha Chineke n’onwe ya abụghị ọtụmọkpọ. Kama nke ahụ, ọ dị anyị mkpa ịmara na ịtụkwasị Onye Nwe aha ahụ obi ma na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume ya. Lee ka o si bụrụ obiọma n’akụkụ nke Jehova imesi anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị ejiri okwukwe chigharịkwute ya, na ya ga-abụrụ anyị ụlọ elu nchebe!

‘Chineke Anyị Pụrụ Ịnapụta Anyị’

9. Olee otú Jehova siworo mee ihe karịrị nanị ikwe nkwa nchebe?

9 Jehova emewo ihe karịrị nanị ikwe nkwa inye nchebe. N’oge Bible, o gosipụtara n’ụzọ ọrụ ebube na ya nwere ike ichebe ndị ya. N’akụkọ ihe mere eme nke ụmụ Izrel, ọtụtụ mgbe “aka” dị ike nke Jehova gbochiri ndị iro dị ike ịbịaru ha  nso. (Ọpụpụ 7:4) Otú ọ dị, Jehova jikwa ike nchebe ya mee ihe maka ndị mmadụ n’otu n’otu.

10, 11. Olee ihe atụ ndị sitere na Bible bụ́ ndị na-egosi otú Jehova si jiri ike nchebe ya mee ihe n’ihi ndị dị iche iche?

10 Mgbe ụmụ okorobịa atọ bụ́ ndị Hibru—Shedrak, Mishak, na Abednego—jụrụ ịkpọ isiala nye ihe oyiyi ọlaedo nke Eze Nebukadneza, eze ahụ iwe ji yiri egwu na ya ga-atụba ha n’ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. “Ònye bụkwa chi ahụ nke ga-anapụta unu n’aka m?” ka Nebukadneza, bụ́ eze kasị ike n’ụwa, kwuru n’ụzọ ịkwa emo. (Daniel 3:15) Ụmụ okorobịa atọ ahụ nwere obi ike zuru ezu n’ike Chineke ha nwere ichebe ha, ma ha ewereghị ya na ọ ga-emerịrị otú ahụ. N’ihi ya, ha zara, sị: “A sị na ọ dị ụzọ ọ bụla Chineke ahụ Onye anyị na-efe pụrụ ịnapụta anyị.” (Daniel 3:17) N’ezie, ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu, ọbụna mgbe e mere ka ọ dị ọkụ okpukpu asaa karịa ka ọ na-adịbu, abụrụghị Chineke ha nke nwere ike nile ihe siri oké ike. O chebere ha, a manyekwara eze ahụ ikweta, sị: “Ọ dịghị chi ọzọ nke pụrụ ịnapụta otú a.”—Daniel 3:29.

11 Jehova gosipụtakwara ike nchebe ya n’ụzọ dị ịrịba ama n’ezie mgbe o bufere ndụ nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’akpa nwa nke nwa agbọghọ onye Juu na-amaghị nwoke bụ́ Meri. Otu mmụọ ozi gwara Meri na ọ “ga-atụrụ ime n’akpa nwa [ya] ma mụọ nwa nwoke.” Mmụọ ozi ahụ kọwara, sị: “Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị.” (Luk 1:31, 35) O yiri ka Ọkpara Chineke anọtụbeghị n’ọnọdụ dị ize ndụ otú ahụ na mbụ. Mmehie na ezughị okè nke nne ya bụ́ mmadụ ọ̀ ga-eme ka nwa ahụ e bu n’afọ nweta mmerụ? Setan ọ̀ ga-enwe ike imerụ Ọkpara ahụ ahụ́ ma ọ bụ gbuo ya tupu a mụọ Ya? Ọ gaghị ekwe omume! Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Jehova mere ka e nwee mgbidi nchebe gburugburu Meri ka ihe ọ bụla—ezughị okè, mmetụta ọjọọ ọ bụla, ogbu mmadụ ọ bụla, ma ọ bụ mmụọ ọjọọ ọ bụla—ghara imerụ nwa ahụ na-eto n’afọ, malite na mgbe a tụụrụ ime ya. Jehova nọgidere na-echebe Jizọs mgbe ọ bụ okorobịa. (Matiu  2:1-15) Ruo mgbe oge Chineke kara aka ruru, ọ dịghị onye pụrụ ime Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ihe ọ bụla.

12. N’ihi gịnị ka Jehova ji chebe mmadụ ụfọdụ n’ụzọ ọrụ ebube n’oge Bible?

12 N’ihi gịnị ka Jehova ji chebe mmadụ ụfọdụ n’ụzọ ọrụ ebube otú ahụ? N’ọtụtụ ọnọdụ, Jehova chebere ndị mmadụ n’otu n’otu iji chebe ihe dị mkpa karị: mmezu nke nzube ya. Dị ka ihe atụ, nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jizọs ịnọgide na-adị ndụ dị oké mkpa maka mmezu nke nzube Chineke, bụ́ nke ga-emesịa baara ihe nile a kpọrọ mmadụ uru. Ihe ndekọ ndị ahụ banyere ọtụtụ ngosipụta nke ike nchebe so n’ihe mejupụtara Akwụkwọ Nsọ nke sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ nke “e dere iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na site ná nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Ee, ihe atụ ndị a na-ewusi okwukwe anyị ike n’ebe Chineke anyị nke nwere ike nile nọ. Ma nchebe dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya ya site n’aka Chineke taa?

Ihe Nchebe Chineke Na-apụtaghị

13. Iwu ò ji Jehova ịrụ ọrụ ebube n’ihi anyị? Kọwaa.

13 Nkwa Chineke kwere ichebe anyị apụtaghị na ọ bụ iwu na Jehova ga-arụ ọrụ ebube n’ihi anyị. Ee e, Chineke anyị adịghị ekwe anyị nkwa ndụ nke nsogbu na-adịghị na ya n’usoro ihe ochie a. Ọtụtụ ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi na-eche ahụhụ ndị tara akpụ ihu, gụnyere ịda ogbenye, agha, ọrịa, na ọnwụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya hoo haa na a pụrụ igbu ha n’otu n’otu n’ihi okwukwe ha. Ọ bụ ya mere Jizọs ji mesie ike mkpa ọ dị inwe ntachi obi ruo ọgwụgwụ. (Matiu 24:9, 13) Ọ bụrụ na Jehova ejiri ike ya mee ihe iji na-anapụta anyị n’ụzọ ọrụ ebube mgbe nile, Setan pụrụ inwe ihe ndabere ọ ga-eji taa Jehova ụta ma rụọ ụka ma nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke o si anyị n’obi n’ezie.—Job 1:9, 10.

14. Ihe atụ dịgasị aṅaa na-egosi na Jehova adịghị echebe ndị ohu ya nile mgbe nile n’otu ụzọ ahụ?

14 Ọbụna n’oge Bible, Jehova ejighị ike nchebe ya mee ihe  n’ichebe ndị ohu ya nile ka ha ghara ịnwụchu ọnwụ. Dị ka ihe atụ, Herọd gburu Jems onyeozi n’ihe dị ka na 44 O.A.; n’agbanyeghị nke ahụ, nwa oge ka nke ahụ gasịrị, a napụtara Pita “n’aka Herọd.” (Ọrụ 12:1-11) Jọn kwa, bụ́ nwanne Jems, dịtere ndụ aka karịa Pita na Jems. N’ụzọ doro anya, anyị apụghị ịtụ anya ka Chineke anyị chebe ndị ohu ya nile n’otu ụzọ ahụ. E wezụga nke ahụ, “mgbe na ihe ndapụta na-adabara” anyị nile. (Eklisiastis 9:11) Oleezi otú Jehova si echebe anyị taa?

Jehova Na-enye Nchebe Nkịtị

15, 16. (a) Olee ihe àmà e nwere nke na-egosi na Jehova na-echebe ndị na-efe ya ofufe n’ụzọ nkịtị dị ka otu ìgwè? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na Jehova ga-echebe ndị ohu ya ugbu a nakwa n’oge ‘oké mkpagbu ahụ’?

15 Nke mbụ, tụlee okwu banyere nchebe nkịtị. Dị ka ndị na-efe Jehova ofufe, anyị pụrụ ịtụ anya nchebe dị otú ahụ dị ka otu ìgwè. Ma ọ́ bụghị ya, anyị ga-abụrụ nnọọ Setan anụ oriri. Cheedị echiche banyere nke a: Ọ dịghị ihe ga-amasị Setan, bụ́ “onye na-achị ụwa a,” karịa ikpochapụ ezi ofufe. (Jọn 12:31; Mkpughe 12:17) Ụfọdụ n’ime ndị ọchịchị kasị ike n’ụwa amachibidowo ọrụ nkwusa anyị iwu, ha agbalịwokwa ikpochapụ anyị kpam kpam. Ma, ndị Jehova anọgidesiwo ike ma gaa n’ihu na-eme nkwusa n’esepụghị aka! N’ihi gịnị ka mba ndị dị ike na-enwebeghị ike ịkwụsị ọrụ nke ìgwè Ndị Kraịst a dị nnọọ ntakịrị, ndị yikwara ka ha enweghị ihe nchebe? Ọ bụ n’ihi na Jehova ejiriwo nku ya dị ike kpuchie anyị!—Abụ Ọma 17:7, 8.

16 Gịnị banyere nchebe nkịtị n’oge ‘oké mkpagbu’ na-abịanụ? Anyị ekwesịghị ịtụ egwu n’ihi mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe. E kwuwerị, “Jehova maara ụzọ e si agbapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa, ma na-edebe ndị ajọ omume maka ụbọchị ikpe ka e wee gbupụ ha.” (Mkpughe 7:14; 2 Pita 2:9) Ka ọ dịgodị, anyị pụrụ ijide ihe abụọ n’aka mgbe nile. Nke mbụ, ọ dịghị mgbe Jehova ga-ekwe ka e kpochapụ ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe n’ụwa. Nke abụọ, ọ  ga-eji ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ ya nke ezi omume kwụọ ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe ụgwọ ọrụ—ọ bụrụ na ọ dị mkpa, site n’ịkpọlite ha n’ọnwụ. Nye ndị nwụrụ anwụ, ọ dịghị ebe dị nchebe ịnọ karịa ịnọ n’ikike ncheta nke Chineke.—Jọn 5:28, 29.

17. Olee otú Jehova si echebe anyị site n’Okwu ya?

17 Ọbụna ugbu a, Jehova na-echebe anyị site ‘n’okwu’ ya dị ndụ, bụ́ nke nwere ike na-akpali akpali iji gwọọ obi ndị mmadụ ma gbanwee ndụ ha. (Ndị Hibru 4:12) Site n’itinye ụkpụrụ ya n’ọrụ, a pụrụ ichebe anyị n’ụzọ ụfọdụ pụọ ná mmerụ ahụ́ nkịtị. “Mụ onwe m bụ Jehova . . . Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru,” ka Aịsaịa 48:17 na-ekwu. N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Chineke pụrụ ime ka ahụ́ ike anyị ka mma ma mee ka anyị dịtekwuo ndụ aka. Dị ka ihe atụ, n’ihi na anyị na-agbaso ndụmọdụ Bible banyere izere ịkwa iko na ịsachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla, anyị na-ezere omume na-adịghị ọcha na àgwà ndị na-emerụ ahụ́ bụ́ ndị na-ebibi ihe nke ukwuu ná ndụ nke ọtụtụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. (Ọrụ 15:29; 2 Ndị Kọrint 7:1) Lee ekele anyị nwere maka nchebe nke Okwu Chineke na-enye!

Jehova Na-echebe Anyị n’Ụzọ Ime Mmụọ

18. Nchebe ime mmụọ dị aṅaa ka Jehova na-enye anyị?

18 Nke kasị mkpa, Jehova na-enye nchebe ime mmụọ. Chineke anyị na-ahụ n’anya na-echebe anyị pụọ ná mmerụ ahụ́ ime mmụọ site n’inye anyị ihe ndị dị anyị mkpa iji kwadebe anyị ịtachi obi n’ule dị iche iche ma chebe mmekọrịta anyị na ya. Jehova si otú a na-eme ihe iji chebe ndụ anyị, ọ bụghị nanị ruo afọ ole na ole dị mkpirikpi, kama ruo mgbe ebighị ebi. Tụlee ụfọdụ ndokwa ndị Chineke mere bụ́ ndị pụrụ ichebe anyị n’ụzọ ime mmụọ.

19. Olee otú mmụọ Jehova pụrụ isi mee ka anyị nwee ike ịnagide ule ọ bụla anyị pụrụ iche ihu?

19 Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Mgbe  nrụgide nke ndụ yiri ka hà karịrị anyị akụkụ, ịgwa ya ihe nile na-enye anyị nsogbu n’obi pụrụ ime ka ahụ́ ruo anyị ala nke ukwuu. (Ndị Filipaị 4:6, 7) O nwere ike ọ gaghị ewepụ ọnwụnwa anyị n’ụzọ ọrụ ebube, ma dị ka azịza nye ekpere anyị nke sitere n’obi, ọ pụrụ inye anyị amamihe iji mee ihe banyere ha. (Jems 1:5, 6) Ọzọkwa, Jehova na-enye ndị na-arịọ maka ya mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Mmụọ ahụ dị ike pụrụ ime ka anyị nwee ike ịnagide ọnwụnwa ma ọ bụ nsogbu ọ bụla anyị pụrụ iche ihu. Ọ pụrụ ime ka anyị nwee “ike karịrị ike nkịtị” iji tachie obi ruo mgbe Jehova ga-ewepụ nsogbu nile na-egbu mgbu n’obi n’ime ụwa ọhụrụ nke dị nnọọ ezi nso.—2 Ndị Kọrint 4:7.

20. Olee otú Jehova pụrụ isi site n’aka ndị anyị na ha na-efekọ ofufe gosipụta ike nchebe ya?

20 Mgbe ụfọdụ, a pụrụ igosipụta ike nchebe Jehova site n’aka ndị anyị na ha na-efekọ ofufe. Jehova adọkọtawo ndị ya ịbụ “òtù ụmụnna” zuru ụwa ọnụ. (1 Pita 2:17; Jọn 6:44) N’òtù ụmụnna ahụ nke ịhụnanya jupụtara na ya, anyị na-ahụ ihe àmà a na-ahụ anya nke ike mmụọ nsọ Chineke nwere inwe mmetụta dị mma n’ahụ́ ndị mmadụ. Mmụọ ahụ na-amịpụta mkpụrụ ya n’ime anyị—àgwà ndị mara mma ma dị oké ọnụ ahịa ndị na-agụnye ịhụnanya, obiọma,  na ịdị mma. (Ndị Galeshia 5:22, 23) N’ihi ya, mgbe anyị nọ n’ihe isi ike, o wee metụ onye kwere ekwe ibe anyị n’obi inye anyị ndụmọdụ bara uru ma ọ bụ ịgwa anyị okwu agbamume dị anyị mkpa nke ukwuu, anyị pụrụ ikele Jehova maka ngosipụta ndị dị otú ahụ nke nlekọta ya na-enye nchebe.

21. (a) Nri ime mmụọ dị aṅaa na-abịa n’oge ya ka Jehova na-enye anyị site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche”? (b) Olee otú i siworo rite uru n’onwe gị site ná ndokwa ndị Jehova meworo iji chebe anyị n’ụzọ ime mmụọ?

21 Ọ dị ihe ọzọ Jehova na-enye iji chebe anyị: nri ime mmụọ nke na-abịa n’oge ya. Iji nyere anyị aka inweta ike site n’Okwu ya, Jehova enyewo “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ọrụ inye nri ime mmụọ. Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-esite n’akwụkwọ ndị e biri ebi, gụnyere magazin Ụlọ Nche na Teta!, nakwa nzukọ na mgbakọ dị iche iche enye anyị ‘nri n’oge kwesịrị ekwesị’—ihe dị anyị mkpa, mgbe ọ dị anyị mkpa. (Matiu 24:45) Ị̀ nụtụla ihe ọ bụla e kwuru ná nzukọ Ndị Kraịst—n’azịza a zara, n’okwu e kwuru, ma ọ bụ n’ekpere e kpere—nke nyere gị kpọmkwem ike na agbamume dị gị mkpa? Ọ̀ dịtụwo otu isiokwu kpọmkwem nke e bipụtara n’otu n’ime magazin anyị nke metụtaworo ndụ gị? Cheta, ọ bụ Jehova na-enye ihe nile dị otú ahụ iji chebe anyị n’ụzọ ime mmụọ.

22. Jehova ọ̀ na-eji ike ya eme ihe mgbe nile n’ụzọ dị aṅaa, n’ihi gịnịkwa ka ya ime otú ahụ ji bụrụ maka ọdịmma anyị kasịnụ?

22 N’ezie, Jehova bụụrụ “ndị nile na-agbaba n’ime ya” ọta. (Abụ Ọma 18:30) Anyị maara na ọ dịghị eji ike ya echebe anyị pụọ n’ọdachi nile ugbu a. Otú ọ dị, ọ na-eji ike ya eme ihe mgbe nile iji hụ na nzube ya mezuru. Ka oge na-aga, ya ime otú ahụ na-abụ maka ọdịmma kasịnụ nke ndị ya. Ọ bụrụ na anyị abịaruo ya nso ma nọgide n’ịhụnanya ya, Jehova ga-enye anyị ndụ zuru okè nke ga-adiru ebighị ebi. N’iburu atụmanya ahụ n’uche, anyị pụrụ n’ezie ile ahụhụ ọ bụla anyị na-ata n’usoro ihe a anya dị ka ihe “na-adịru nwa oge, dịkwa mfe.”—2 Ndị Kọrint 4:17.