Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 4

‘Jehova Dị Ukwuu n’Ike’

‘Jehova Dị Ukwuu n’Ike’

1, 2. Ihe dịgasị aṅaa dị ịtụnanya ka Ịlaịja hụtụrụla ná ndụ ya, ma ihe ndị dị aṅaa dị ịrịba ama ka ọ nọ n’ọgba dị n’Ugwu Horeb hụ?

ỊLAỊJA ahụla ihe ndị dị ịtụnanya na mbụ. Ọ hụla mgbe ugoloọma na-ebutere ya nri ugboro abụọ n’ụbọchị n’oge ọ nọ na-ezo ezo. Ọ hụla ka a nọgidere na-enweta ntụ ọka na mmanụ site n’arịa abụọ n’oge nile otu ụnwụ nri nke dịtere aka dịruru, n’enweghị mgbe ihe kọrọ n’ime ha. Ọ hụla ọbụna ka ọkụ si n’eluigwe daa iji zaa ekpere o kpere. (1 Ndị Eze, isi 17-18) N’agbanyeghị nke ahụ, Ịlaịja ahụtụbeghị ụdị ihe a.

2 Ka o tukwuuru ala n’ụjọ n’ọnụ otu ọgba nke dị n’Ugwu Horeb, ọ hụrụ ọtụtụ ihe dị ịtụnanya. Nke mbụ, ifufe fere. Ọ ghaghị ịbụ na ọ na-efesi nnọọ ike ma na-adachi ntị, n’ihi na ọ na-efesi ike nke na o mere ka ugwu gbawasịa ma gbarisie oké nkume dị iche iche. Mgbe nke ahụ gasịrị, e nwere ala ọma jijiji, bụ́ nke nupụtara ike dị nnọọ ukwuu nke dị n’ime ala. Ọkụ sochiziri. Ka ọ nọ na-agba n’ógbè ahụ dum, ikekwe ikuku ọkụ ya nke na-achakpọ ahụ́ kusara Ịlaịja.—1 Ndị Eze 19:8-12.

“Lee, Jehova na-agabiga”

3. Ihe àmà nke àgwà dị aṅaa nke Chineke ka Ịlaịja hụrụ, ebeekwa ka anyị pụrụ ịhụ ihe àmà nke otu àgwà a?

3 Ihe ndị a nile dịgasị iche iche nwere otu ihe ha nwekọrọ ọnụ—ha bụ ngosipụta nke ike dị ukwuu nke Jehova Chineke. N’ezie, ọ dịghị anyị mkpa ịhụ ọrụ ebube tupu anyị aghọta na Chineke nwere àgwà a. Ọ pụtara nnọọ ìhè. Bible na-agwa anyị na ihe e kere eke na-enye ihe àmà nke “ike ebighị ebi na ịbụ Chineke” nke Jehova. (Ndị Rom 1:20) Cheedị nnọọ echiche banyere àmụ̀mà na-egbu anya na égbè eluigwe ndị na-adachi ntị, mwụdata mmiri na-awụdata n’ụzọ dị ebube n’ebe e nwere nnukwute nsụda mmiri, na otú eluigwe jupụtara na kpakpando si saa oké mbara! Ọ̀ bụ na ị dịghị ahụ ike Chineke n’ihe ndị dị otú ahụ? N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ mmadụ  ole na ole n’ụwa taa na-egosi na ha maara n’ezie ike Chineke nwere. Ọ bụkwa ọbụna mmadụ ole na ole karị na-ele ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, ịghọta àgwà a nke Chineke na-eme ka anyị nwee ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji bịarukwuo Jehova nso. Ya mere, ná nkebi nke a, anyị ga-enyocha n’ụzọ miri emi ike Jehova nke na-enweghị atụ.

Àgwà Dị Oké Mkpa nke Jehova

4, 5. (a) Olee njikọ dị n’agbata aha Jehova na ịdị ukwuu ya, ma ọ bụ ike ya? (b) N’ihi gịnị ka o ji daba adaba na Jehova kpebiri iji oké ehi maa atụ ike ya?

4 Jehova nwere ike pụrụ iche. Jeremaịa 10:6 na-ekwu, sị: “Ọ dịghị [onye] dị ka Gị ma ọlị, Jehova; Onye ukwu ka Ị bụ, ihe dị ukwuu ka aha Gị dịkwa n’ịdị ike.” Rịba ama na e jikọtara ịdị ike, ma ọ bụ ike, na aha Jehova. Cheta na aha a pụtara “Ọ Na-abụ Ihe Ọ Bụla Ọ Chọrọ Ịbụ.” Gịnị na-eme ka Jehova nwee ike ike ihe ọ bula ọ chọrọ ma bụrụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịbụ? Otu n’ime ha bụ ike. Ee, ikike Jehova nwere ime ihe, imezu uche ya, bụ nke a na-akparaghị ókè. Ike dị otú ahụ bụ otu n’ime àgwà ya ndị dị oké mkpa.

5 N’ihi na ọ dịghị mgbe anyị ga-enwe ike ịghọtazu otú ike ya hà, Jehova na-eji ihe atụ eme ihe iji nyere anyị aka. Dị ka anyị hụworo, o ji oké ehi mee ihe atụ nke ike ya. (Ezikiel 1:4-10) Ihe ahụ o kpebiri iji mee ihe atụ dabara adaba, n’ihi na ọbụna oké ehi a na-azụ n’ụlọ bụ nnukwute anụmanụ nke dị ike. Ndị biri na Palestaịn n’oge e dere Bible adịghị ezutekebe anụ ka ya ike, ma ọ bụrụ na ha ezutetụla ya. Ma ha maara na e nwere ụdị oké ehi a na-atụ ụjọ karị—otu ụdị oké ehi ọhịa nke na-adịkwaghị adị eri oge. (Job 39:9-12) Eze Ukwu Rom bụ́ Julius Caesar kwuru otu mgbe na oké ehi ndị a fọrọ nke nta ka ha hara ka enyí. “Ha dị ike nke ukwuu,” ka o dere, “ha na-agbakwa oké ọsọ.” Cheedị otú ị ga-esi dị ntakịrị ma yie onye na-adịghị ike ma ọ bụrụ na ị kwụrụ n’akụkụ anụmanụ dị otú ahụ!

6. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị Jehova ka a na-akpọ “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile”?

 6 N’otu aka ahụ, mmadụ dị ntakịrị, ọ dịghịkwa ike ma e jiri ya tụnyere Chineke nke ike, bụ́ Jehova. N’anya ya, ọbụna mba ndị dị ike dị ka nanị uzuzu nke dị n’elu ihe ọ̀tụ̀tụ̀. (Aịsaịa 40:15) N’adịghị ka ihe ọ bụla e kere eke, Jehova nwere ike a na-akparaghị ókè, n’ihi na ọ bụ nanị ya ka a na-akpọ “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” * (Mkpughe 15:3) Jehova “nwere ume n’ike,” o nwekwara ‘ike bara ụba.’ (Aịsaịa 40:26) Ọ bụ isi iyi na-adịghị ata ata nke ike. Ọ dịghị adabere n’ebe onye ọzọ nọ maka ume, n’ihi na “ike nile bụ ihe Chineke nwere.” (Abụ Ọma 62:11, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Otú ọ dị, n’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova si egosipụta ike ya?

Ụzọ Jehova Si Egosipụta Ike Ya

7. Gịnị bụ mmụọ nsọ Jehova, gịnịkwa ka okwu ndị e ji mee ihe n’asụsụ mbụ ndị e ji dee Bible na-atụ aro ya?

7 Mmụọ nsọ na-esi n’ebe Jehova nọ apụta n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-akparaghị ókè. Ọ bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ. N’ezie, na Jenesis 1:2, (NW), Bible na-ezo aka na ya dị ka ‘ike Chineke nke nọ n’ọrụ.’ N’ebe ndị ọzọ, a pụrụ ịsụgharị okwu Hibru na okwu Grik e ji mee ihe na mbụ, bụ́ ndị a sụgharịrị ịbụ “mmụọ,” dị ka “ifufe,” “ume,” na “oké ifufe.” Dị ka ndị na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo, okwu ndị e ji mee ihe na mbụ na-atụ aro ikike a na-adịghị ahụ anya nke nọ n’ọrụ. Dị ka anyị na-apụghị ịhụ ifufe, anyị apụghị ịhụ mmụọ Chineke anya, ma a pụrụ ihụ ihe ọ na-arụ, ha dịkwa adị n’ezie.

8. N’ime Bible, gịnị ka a kpọrọ mmụọ nsọ Chineke n’ụzọ ihe atụ, n’ihi gịnịkwa ka ihe ndị a e ji ya tụnyere ji daba adaba?

8 Mmụọ nsọ Chineke na-arụ ọtụtụ ihe dịgasị iche iche. Jehova pụrụ iji ya mezuo nzube ọ bụla o bu n’uche. Mgbe ahụ, n’ụzọ dabara nnọọ adaba, n’ime Bible, a kpọrọ mmụọ Chineke “mkpịsị aka” ya, ‘aka ya dị ike,’ ma ọ bụ ‘ogwe aka ya o setịrị esetị,’ n’ụzọ ihe atụ. (Luk 11:20; Deuterọnọmi 5:15; Abụ  Ọma 8:3) Dị nnọọ ka mmadụ pụrụ iji aka ya rụọ ọtụtụ ọrụ nke chọrọ ike ma ọ bụ nkà dịgasị iche iche, otú a ka Chineke pụrụ iji mmụọ ya mezuo nzube ọ bụla—dị ka ike atọm, nke bụ́ ụmụ irighiri ihe dị nnọọ ntakịrị ndị dị n’ihe ndị e kere eke, ma ọ bụ ikewa Oké Osimiri Uhie ma ọ bụ ime ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ nwee ike ikwu okwu n’asụsụ ndị mba ọzọ.

9. Olee otú ike ịchịisi Jehova hà?

9 Jehova na-egosipụta ike ya site n’ikike o nwere dị ka Eze Eluigwe na Ala. Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche inwe nde kwuru nde ndị ị na-achị, ndị nwere ọgụgụ isi, ndị pụkwara ime ihe ị chọrọ? Jehova nwere ike ịchịisi dị otú ahụ. O nwere ndị ohu bụ́ mmadụ, bụ́ ndị e jikarị atụnyere usuu ndị agha n’ime Akwụkwọ Nsọ. (Abụ Ọma 68:11; 110:3) Otú ọ dị, mmadụ bụ ihe e kere eke na-adịghị ike ma e jiri ya tụnyere mmụọ ozi. Leenụ, mgbe ndị agha Asiria wakporo ndị Chineke, otu mmụọ ozi gburu mmadụ 185,000 n’ime ndị agha ahụ n’otu abalị! (2 Ndị Eze 19:35) Ndị mmụọ ozi Chineke bụ “ndị dike dị ike.”—Abụ Ọma 103:19, 20.

10. (a) Gịnị mere e ji akpọ Onye ahụ Pụrụ Ime Ihe Nile Jehova nke usuu nile nke ndị agha? (b) Ònye kasị ike n’ime ihe nile Jehova kere?

10 Ndị mmụọ ozi ole ka e nwere? Daniel onye amụma hụrụ eluigwe n’ọhụụ bụ́ ebe ọ hụrụ ihe karịrị 100 nde ndị mmụọ e kere eke n’ihu ocheeze Jehova, ma o nweghị ihe na-egosi na ọ hụrụ ndị mmụọ ozi nile e kere eke. (Daniel 7:10) Ya mere, ọ pụrụ ịbụ na e nwere ọtụtụ narị nde ndị mmụọ ozi. N’ihi ya, a na-akpọ Chineke Jehova nke usuu nile nke ndị agha. Utu aha a na-akọwa ọkwá ya dị oké mkpa dị ka Ọchịagha nke usuu ndị mmụọ ozi dị ike a haziri ahazi. O mere otu n’ime ndị mmụọ nile e kere eke, bụ́ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, “onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke,” onye nlekọta nke ha nile. (Ndị Kọlọsi 1:15) Dị ka onyeisi ndị mmụọ ozi—onye na-elekọta ndị mmụọ ozi, ndị seraf, na ndị cherub nile —Jizọs kasị ike n’ime ihe nile Jehova kere.

11, 12. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka okwu Chineke si akpa ike? (b) Olee otú Jizọs si gbaa akaebe banyere otú ike Jehova hà?

11 Jehova nwekwara ụzọ ọzọ o si egosipụta ike ya. Ndị Hibru  4:12 na-ekwu, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike.” Ị̀ chọpụtawo ike dị egwu nke okwu Chineke, ma ọ bụ ozi sitere n’ike mmụọ nsọ, nke e chekwaworo ugbu a n’ime Bible, nwere? Ọ pụrụ iwusi anyị ike, wulie okwukwe anyị elu, ma nyere anyị aka ime nnukwute mgbanwe ná ndụ anyị. Pọl onyeozi dọrọ ndị kwere ekwe ibe ya aka ná ntị banyere mmadụ ndị na-ebi ndụ rụrụ nnọọ arụ. Ọ gbakwụnyeziri: “Ma nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu.” (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Ee, okwu Chineke akpawo ike n’ahụ́ ha ma nyere ha aka ime mgbanwe.

12 Ike Jehova nwere dị nnọọ ukwuu, ụzọ o sikwa egosipụta ya dị nnọọ irè nke na ọ dịghị ihe ọ bụla pụrụ igbochi ya. Jizọs sịrị: “N’ebe Chineke nọ ihe nile kwere omume.” (Matiu 19:26) Nzube ndị dị aṅaa ka Jehova ji ike ya na-emezu?

Ike nke Nzube Na-eduzi

13, 14. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jehova abụghị isi iyi nke ike, nke na-abụghị onye? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova si eji ike ya eme ihe?

13 Mmụọ Jehova karịrị nnọọ ike nkịtị ọ bụla; Jehova abụghịkwa ikike nke na-abụghị onye, nanị isi iyi nke ike. Ọ bụ Chineke bụ́ onye, onye na-achịkwa ike ya n’ụzọ zuru ezu. Otú ọ dị, gịnị na-akpali ya iji ya eme ihe?

14 Dị ka anyị ga-ahụ, Chineke na-eji ike ya eke ihe, ebibi ihe, echebe ihe, eweghachi ihe—n’igbu ya nkenke, eme ihe ọ bụla kwekọrọ ná nzube ya zuru okè. (Aịsaịa 46:10) N’ọnọdụ ụfọdụ, Jehova na-eji ike ya ekpughe akụkụ ndị dị mkpa nke ụdị onye ọ bụ nakwa ụkpụrụ ya. Karịsịa, ọ na-eji ike ya emezu uche ya—igosipụta oruru o ruuru ya ịbụ eze na ido aha nsọ ya nsọ site n’Alaeze Mezaịa ahụ. Ọ dịghị ihe ọ bụla pụrụ igbochi nzube ahụ ma ọlị.

15. Jehova na-eji ike ya eme n’ihi nzube dị aṅaa n’ebe ndị ohu ya nọ, oleekwa otú e si gosipụta nke a n’ihe banyere Ịlaịja?

15 Jehova na-ejikwa ike ya eme ihe ga-abara anyị uru n’otu n’otu. Rịba ama ihe 2 Ihe E Mere 16:9 na-ekwu: “N’ihi na Jehova, anya Ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” Ahụmahụ Ịlaịja,  bụ́ nke a kpọtụrụ uche ná mmalite, bụ otu ihe atụ. N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ka ọ hụ ngosipụta ahụ dị egwu nke ike Chineke? Ọ bụ n’ihi na ajọ Eze Nwanyị Jezibel aṅụwo iyi ịhụ na e gburu Ịlaịja. Onye amụma ahụ na-agba ọsọ, na-agba ọsọ maka ndụ ya. Ọ dị ya ka ọ bụ nanị ya fọdụrụ, ụjọ ji ya, o nwekwara nkụda mmụọ—dị ka a ga-asị na ndọgbu nile ọ dọgburu onwe ya n’ọrụ abụrụwo n’efu. Iji kasie nwoke ahụ na-echegbu onwe ya obi, Jehova chetaara Ịlaịja n’ụzọ doro anya ike Chineke. Ifufe, ala ọma jijiji, na ọkụ ahụ gosiri na Onye kasị ike n’eluigwe na ala nọnyeere Ịlaịja n’ebe ahụ. Gịnị na-atụ ya ụjọ n’ebe Jezibel nọ, ebe Chineke pụrụ ime ihe nile nọnyeere ya?—1 Ndị Eze 19:1-12. *

16. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nweta nkasi obi n’ịtụgharị uche n’ike dị ukwuu nke Jehova nwere?

16 Ọ bụ ezie na ugbu a abụghị oge ọrụ ebube, Jehova agbanwebeghị kemgbe oge Ịlaịja. (1 Ndị Kọrint 13:8) Ọ dị njikere taa iji ike ya mee ihe maka ndị hụrụ ya n’anya dị nnọọ ka ọ dị n’oge ahụ. N’eziokwu, o bi n’ebe dị elu n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, ma ọ nọghị anyị n’ebe dị anya. A kparaghị ike ya ókè, n’ihi ya, ịdị anya abụghị ihe mgbochi. Kama nke ahụ, “Jehova [nọ] nso ndị nile na-akpọku Ya.” (Abụ Ọma 145:18) N’otu oge, mgbe Daniel onye amụma kpọkuru Jehova maka enyemaka, otu mmụọ ozi bịara ọbụna tupu o kpesịa ekpere! (Daniel 9:20-23) Ọ dịghị ihe pụrụ igbochi Jehova inyere ndị ọ hụrụ n’anya aka na iwusi ha ike.—Abụ Ọma 118:6.

Ike Chineke Ọ̀ Na-eme Ka Ọ Bụrụ Onye A Na-apụghị Ịbịaru Nso?

17. N’echiche dị aṅaa ka ike Jehova na-akpali egwu n’ime anyị, ma ụdị egwu dị aṅaa ka ọ na-adịghị akpali?

17 Ike Chineke ò kwesịrị ime ka anyị na-atụ ya egwu? Anyị  aghaghị ịza ma ee ma ee e. Ee, n’ihi na àgwà a na-eme ka anyị nwee ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-atụ Chineke egwu, bụ́ ụjọ na nkwanye ùgwù miri emi nke anyị tụlere ná mkpirikpi n’isiokwu bu ụzọ. Bible na-agwa anyị na egwu dị otú ahụ bụ “mmalite amamihe.” (Abụ Ọma 111:10) Otú ọ dị, anyị na-azakwa ee e n’ihi na ike Chineke ekwesịghị ime ka anyị na-atụ ya egwu na-adịghị mma ma ọ bụ na-agbara ya ọsọ.

18. (a) N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị na-ejighị atụkwasị ndị nwere ike ọchịchị obi? (b) Olee otú anyị si mara na ike Jehova apụghị imerụ ya?

18 “Ike na-emerụ emerụ; ike a na-akparaghị ókè na-emerụkwa emerụ n’ụzọ a na-akparaghị ókè.” Nke a bụ ihe onye England nọ n’ọkwá dị elu bụ́ Lord Acton dere na 1887. E kwughachiwo ihe ahụ o kwuru ọtụtụ ugboro, ikekwe n’ihi na ọtụtụ ndị chọpụtara na ọ bụ eziokwu nke na-enweghị mgbagha. Ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ejikarị ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, dị ka akụkọ ihe mere eme gosipụtaworo ugboro ugboro. (Eklisiastis 4:1; 8:9) N’ihi nke a, ọtụtụ ndị adịghị atụkwasị ndị nwere ike ọchịchị obi, ha na-agbakwara ha ọsọ. Ma, Jehova nwere ike a na-akparaghị ókè. Ò merụwo Jehova n’ụzọ ọ bụla? Ọ dịghị ma ọlị! Dị ka anyị hụworo, ọ dị nsọ, ọ bụkwa onye a na-apụghị imerụ emerụ. Jehova adịghị ka ndị ikom na ndị inyom na-ezughị okè ndị nwere ike n’ụwa a rụrụ arụ. O jitụbeghị ike ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ọ dịghịkwa mgbe ọ ga-eji ya mee ihe otú ahụ.

19, 20. (a) Jehova na-egosipụta ike ya mgbe nile n’ikwekọ n’àgwà ndị ọzọ dị aṅaa, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji bụrụ ihe na-emesi obi ike? (b) Olee otú ị pụrụ isi maa atụ njide onwe onye nke Jehova, n’ihi gịnịkwa ka o ji na-adọrọ mmasị gị?

19 Cheta, ike abụghị nanị àgwà Jehova nwere. Anyị ka ga-amụ banyere ikpe ziri ezi ya, amamihe ya, na ịhụnanya ya. Ma anyị ekwesịghị iwere ya na Jehova na-egosipụta àgwà ya dị iche iche n’ụzọ enweghị mmetụta na nke na-adịghị agbanwetụ agbanwe, dị ka a ga-asị na ọ bụ nanị otu àgwà ka ọ na-egosipụta n’otu oge. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, anyị ga-ahụ n’isiokwu ndị na-esonụ na Jehova na-eji ike ya eme ihe mgbe nile n’ụzọ kwekọrọ n’ikpe ziri ezi ya, amamihe ya, na ịhụnanya ya.  Chee echiche banyere àgwà ọzọ Chineke nwere, nke a na-adịghị ahụkebe n’ebe ndị ọchịchị ụwa nke oge a nọ—njide onwe onye.

20 Cheedị echiche izute otu nwoke nke gbara nnọọ dimkpa ma dị ike nke na egwu ya jidere gị. Otú ọ dị, ka oge na-aga, i wee chọpụta na o yiri ka ọ dị nwayọọ. Ọ dị njikere mgbe nile ma na-achọsi ike iji ike ya nyere ndị mmadụ aka ma chebe ha, karịsịa ndị na-enweghị onye ga-agbachitere ha na ndị a pụrụ imerụ ahụ́ ngwa ngwa. Ọ dịtụghị eji ike ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ị hụrụ ka a na-ekwutọ ya n’enweghị ihe o mere, ma o weghị iwe, kama ọ nọ jụụ, na-eme ihe n’ụzọ nkwanye ùgwù, ọbụna nwee obiọma. Ị nọ na-eche ma ị̀ ga-enwekwa ike ịdị nwayọọ ma nwee njide onwe onye dị otú ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na i siri ike ka ya! Ka ị na-amatakwu nwoke ahụ, ọ̀ bụ na ị gaghị amalite inwe mmasị ịbịaru ya nso? Anyị nwere nnọọ ihe ka nke ahụ mere anyị ga-eji bịaruo Jehova, bụ́ onye pụrụ ime ihe nile nso. Tụlee n’ozuzu ya, ahịrịokwu ahụ e si na ya were isiokwu nke isiakwụkwọ a: “Jehova adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ dịkwa ukwuu n’ike.” (Nehum 1:3, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Jehova anaghị adị ngwa n’iji ike ya eme ihe megide ndị mmadụ, ọbụna megide ndị ajọ omume. Ọ dị nwayọọ n’obi ma nwee obiọma. O gosipụtawo na ọ ‘dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ’ n’agbanyeghị ọtụtụ mkpasu iwe.—Abụ Ọma 78:37-41.

21. N’ihi gịnị ka Jehova na-ejighị amanye ndị mmadụ ime uche ya, gịnịkwa ka nke a na-akụziri anyị banyere ya?

 21 Tụlee njide onwe onye nke Jehova site n’akụkụ ọzọ. Ọ bụrụ na i nwere ike a na-akparaghị ókè, ì chere na ị pụrụ mgbe ụfọdụ ịchọ ime ka ndị mmadụ mee ihe otú i si chọọ? N’agbanyeghị ike ya nile, Jehova adịghị amanye ndị mmadụ ijere ya ozi. Ọ bụ ezie na ijere Chineke ozi bụ nanị ụzọ isi nweta ndụ ebighị ebi, Jehova adịghị amanye anyị ije ozi dị otú ahụ. Kama nke ahụ, o ji obiọma na-akwanyere onye ọ bụla ùgwù site n’inye ha nnwere onwe ime nhọrọ. Ọ na-adọ aka ná ntị banyere ihe ndị ga-esi n’ime nhọrọ na-ezighị ezi pụta ma na-ekwu ihe bụ́ ụgwọ ọrụ nke ime ezi nhọrọ. Ma ọ na-ahapụ anyị ime nhọrọ ahụ n’onwe anyị. (Deuterọnọmi 30:19, 20) Jehova enweghị mmasị ọ bụla n’ozi a na-eje ná mmanye ma ọ bụ n’ihi egwu na-adịghị mma a na-atụ ike ya dị egwu. Ọ na-achọ ndị ga-eji ọchịchọ obi ha jeere ya ozi, n’ihi ịhụnanya.—2 Ndị Kọrint 9:7.

22, 23. (a) Gịnị na-egosi na Jehova na-enwe obi ụtọ inye ndị ọzọ ike? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

22 Ka anyị leba anya n’ihe ikpeazụ mere anyị na-ekwesịghị iji na-atụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile oké egwu. Ụmụ mmadụ ndị nwere ike ọchịchị na-atụkarị egwu ikenyetụ ndị ọzọ ike ha. Ma, Jehova na-enwe obi ụtọ inye ndị ji iguzosi ike n’ihe na-efe ya ofufe ike. Ọ na-enye ndị ọzọ, dị ka Ọkpara ya, ikike dị ukwuu. (Matiu 28:18) Jehova na-enyekwa ndị ohu ya ike n’ụzọ ọzọ. Bible na-akọwa, sị: “Jehova, Gị nwe ịdị ukwuu, na ịdị ike, na ịma mma, na mmeri, na ebube: n’ihi na ihe nile dị n’eluigwe na n’ụwa bụ nke Gị . . . ọ bụkwa n’aka Gị ka ume na ịdị ike dị; n’aka Gị ka ọ dịkwa ime ukwuu, na ime ka ihe nile dị ike.”—1 Ihe E Mere 29:11, 12.

23 Ee, Jehova ga-enwe obi ụtọ inye gị ume. Ọbụna na ọ na-enye ndị chọrọ ijere ya ozi “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọ̀ bụ na a dịghị adọta gị n’ebe Chineke a dị ike nọ, bụ́ onye na-eji ike ya eme ihe n’ụzọ obiọma na n’ụzọ ụkpụrụ na-achịkwa? N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-elekwasị anya n’otú Jehova si eji ike ya eke ihe.

^ par. 6 Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” pụtara n’ụzọ nkịtị “Onye Na-achị Ihe Nile; Onye Nwere Ike Nile.”

^ par. 15 Bible na-ekwu na “Jehova anọghị n’ifufe ahụ . . .  n’ala ọma jijiji ahụ . . .  n’ọkụ ahụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) N’adịghị ka ndị na-efe chi ndị bụ́ ihe e kere eke, ndị a na-akọ n’akụkọ ifo, ndị ohu Jehova adịghị achọ ya n’ike ndị sitere n’okike. Ọ dị nnọọ ukwuu ịnọ n’ime ihe ọ bụla o kere eke.—1 Ndị Eze 8:27.