Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 10

“Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke” n’Ụzọ Unu Si Eji Ike Eme Ihe

“Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke” n’Ụzọ Unu Si Eji Ike Eme Ihe

1. N’ọnyà dị aṅaa zoro ezo ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-adabakarị nnọọ ngwa ngwa?

“Ọ DỊGHỊ ike nke ọ na-adịghị ọnyà zoro ezo nke dị na ya.” Okwu a onye na-ede uri na narị afọ nke 19 kwuru na-echetara anyị otu ihe ize ndụ zoro ezo: iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ụzọ dị mwute, ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-adabakarị nnọọ ngwa ngwa n’ọnyà a. N’ezie, n’akụkọ ihe mere eme nile, ‘mmadụ enwewo ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.’ (Eklisiastis 8:9) Iji ike eme ihe n’ụzọ enweghị ịhụnanya akpataworo ụmụ mmadụ oké nhụjuanya.

2, 3. (a) Gịnị dị ịrịba ama banyere ụzọ Jehova si eji ike eme ihe? (b) Gịnị ka ike anyị nwere pụrụ ịgụnye, oleekwa otú anyị kwesịrị isi jiri ike nile dị otú ahụ na-eme ihe?

2 Otú ọ dị, ọ́ bụghị ihe kwesịrị ịrịba ama na Jehova Chineke, bụ́ onye nwere ike a na-akparaghị ókè, enweghị mgbe ọ na-eji ike ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi? Dị ka anyị kwuru n’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ, ọ na-eji ike ya—ma ọ bụ nke ike ihe, nke mbibi, nke nchebe, ma ọ bụ nke mweghachi ihe—eme ihe mgbe nile n’ụzọ kwekọrọ ná nzube ịhụnanya ya. Mgbe anyị tụgharịrị uche n’ụzọ o si eji ike ya eme ihe, a na-akpali anyị ịbịaru ya nso. Nke ahụ, n’aka nke ya, pụrụ ịkwali anyị ‘ịghọ ndị na-eṅomi Chineke’ n’ụzọ anyị onwe anyị si eji ike eme ihe. (Ndị Efesọs 5:1) Ma ụdị ike dị aṅaa ka anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-adịghị ike nwere?

3 Cheta na e kere mmadụ “n’onyinyo” na n’oyiyi Chineke. (Jenesis 1:26, 27) N’ihi ya, anyị onwe anyị kwa nwere ike—ma ọ dịghị ihe ọzọ, ike ụfọdụ. Ike anyị pụrụ ịgụnye ikike imezu ihe dị iche iche, ịrụ ọrụ; ịchịkwa ma ọ bụ inwe ikike n’ebe ndị ọzọ nọ; ikike inwe mmetụta n’ahụ́ ndị ọzọ, karịsịa ndị hụrụ anyị n’anya; ike ọkpụkpụ aka (ume); ma ọ bụ ihe onwunwe. Banyere Jehova, ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “N’ebe Ị nọ ka isi iyi ndụ dị.”  (Abụ Ọma 36:9) N’ihi ya, n’ụzọ pụtara ìhè ma ọ bụ n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè, ọ bụ n’aka Chineke ka ike ọ bụla ziri ezi ọ pụrụ ịbụ na anyị nwere sitere. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ya na-eme ihe n’ụzọ na-amasị ya. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ?

Ịhụnanya Bụ Isi Ihe Dị Mkpa

4, 5. (a) Gịnị bụ isi ihe dị mkpa iji jiri ike na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi, oleekwa otú ihe nlereanya nke Chineke n’onwe ya si egosi nke a? (b) Olee otú ịhụnanya ga-esi nyere anyị aka iji ike anyị na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi?

4 Isi ihe dị mkpa iji jiri ike na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi bụ ịhụnanya. Ọ̀ bụ na ihe nlereanya nke Chineke n’onwe ya adịghị egosipụta nke a? Cheta ntụle a tụlere àgwà anọ bụ́ isi nke Chineke—ike, ikpe ziri ezi, amamihe, na ịhụnanya—n’Isi nke 1. N’ime àgwà anọ ahụ, olee nke kasị pụta ìhè? Ịhụnanya. “Chineke bụ ịhụnanya,” ka 1 Jọn 4:8 na-ekwu. Ee, Jehova bụ ịhụnanya n’onwe ya; ọ na-emetụta ihe nile ọ na-eme. Ya mere, ọ bụ ịhụnanya na-akpali ya mgbe ọ bụla ọ na-egosipụta ike ya, n’ikpeazụkwa, ọ na-abụ maka ọdịmma nke ndị hụrụ ya n’anya.

5 Ịhụnanya ga-enyekwara anyị aka iji ike anyị na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi. E kwuwerị, Bible na-agwa anyị na ịhụnanya nwere “obiọma” nakwa na “ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya.” (1 Ndị Kọrint 13:4, 5) N’ihi ya, ịhụnanya agaghị ekwe ka anyị mesoo ndị anyị nwere ikike ụfọdụ n’ebe ha nọ ihe n’obi ọjọọ. Kama nke ahụ, anyị ga na-emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ nkwanye ùgwù ma na-ebute mkpa ha na mmetụta ha ụzọ tupu nke anyị.—Ndị Filipaị 2:3, 4.

6, 7. (a) Gịnị bụ egwu Chineke, n’ihi gịnịkwa ka àgwà a ga-eji nyere anyị aka izere iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi? (b) Nye ihe atụ nke njikọ dị n’etiti ịtụ egwu imejọ Chineke na ịhụ Chineke n’anya.

6 E nwere àgwà ọzọ ya na ịhụnanya na-agakọ bụ́ nke pụrụ inyere anyị aka izere iji ike na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi: egwu Chineke. Olee uru àgwà a bara? “Egwu Jehova ka mmadụ ji esi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya,” ka Ilu 16:6 na-ekwu. N’ezie, iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi so n’ụzọ ọjọọ ndị anyị kwesịrị isi na ha wezụga onwe anyị. Egwu Chineke ga-egbochi  anyị imeso ndị anyị nwere ikike n’ebe ha nọ ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’ihi gịnị? Otu ihe bụ na anyị maara na anyị ga-aza Chineke ajụjụ banyere otú anyị si emeso ndị dị otú ahụ. (Nehemaịa 5:1-7, 15) Ma egwu Chineke na-agụnye ihe karịrị nke ahụ. Okwu ndị e ji mee ihe maka “egwu” n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible na-ezokarị aka n’inwe egwu na nsọpụrụ miri emi na ụjọ maka Chineke. N’ụzọ dị otú a, Bible na-ejikọta egwu na ịhụ Chineke n’anya. (Deuterọnọmi 10:12, 13) Ụjọ nsọpụrụ a na-agụnye egwu kwesịrị ekwesị maka imejọ Chineke—ọ bụghị nnọọ n’ihi na anyị na-atụ egwu ihe ndị ga-esi na ya pụta kama n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya n’ezie.

7 Iji maa atụ: Cheedị echiche banyere mmekọrịta dị mma nke dị n’etiti obere nwa na nna ya. Nwatakịrị ahụ chọpụtara mmasị ịhụnanya nke na-ekpo ọkụ nna ya nwere n’ebe ọ nọ. Ma nwa ahụ makwaara ihe nna ya chọrọ ya n’aka, ọ makwaara na nna ya ga-enye ya ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na ọ kpaa àgwà ọjọọ. Nwatakịrị ahụ adịghị atụ nna ya egwu na-ekwesịghị ekwesị. Kama nke ahụ, ọ hụrụ nna ya n’anya nke ukwuu. Ọ na-atọ nwata ahụ ụtọ ime ihe ga-amasị nna ya. Otú ahụ ka ọ dị n’egwu Chineke. N’ihi na anyị hụrụ Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, n’anya, anyị na-atụ egwu ime ihe ọ bụla ‘ga-ewute Ya n’obi.’ (Jenesis 6:6) Kama nke ahụ, ọ na-agụsi anyị agụụ ike ime ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji jiri ike anyị na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi. Ka anyị nyobakwuo anya n’otú anyị pụrụ isi mee nke a.

N’ime Ezinụlọ

8. (a) Ikike dị aṅaa ka ndị bụ́ di nwere n’ezinụlọ, oleekwa otú ha ga-esi jiri ya na-eme ihe? (b) Olee otú di pụrụ isi gosipụta na ọ na-asọpụrụ nwunye ya?

8 Nke mbụ, tụlee n’ime ezinụlọ. Ndị Efesọs 5:23 na-ekwu, sị: “Di bụ isi nke nwunye ya.” Olee otú di kwesịrị isi jiri ikike a Chineke nyere ya na-eme ihe? Bible na-agwa ndị bụ́ di ka ha soro nwunye ha na-ebi “dị ka ihe ọmụma si dị, na-ekenye ha nsọpụrụ dị ka ihe ka bụrụ nke na-esighị ike.” (1 Pita 3:7) Mkpọaha Grik a sụgharịrị ịbụ “nsọpụrụ” pụtara “ọnụ ahịa  ihe, uru ihe bara, . . . nkwanye ùgwù.” A na-asụgharị ụdị ụfọdụ nke okwu a ịbụ “onyinye” na “ihe dị oké ọnụ ahịa.” (Ọrụ 28:10; 1 Pita 2:7) Di nke na-asọpụrụ nwunye ya enweghị mgbe ọ ga-eti ya ihe; ọ gaghịkwa eweda ya ala ma ọ bụ kparịa ya, mee ka ọ na-eche na ọ baghị uru. Kama nke ahụ, ọ na-aghọta uru ọ bara ma na-emeso ya ihe n’ụzọ nkwanye ùgwù. Ọ na-egosi site n’okwu ọnụ ya na n’omume ya—mgbe nanị ha nọ na n’ihu ọha—na ọ dị oké ọnụ ahịa nye ya. (Ilu 31:28) Ọ bụghị nanị na di dị otú ahụ ga-abụ onye nwunye ya hụrụ n’anya ma na-akwanyere ùgwù kama, nke ka mkpa, ọ ga-enweta ihu ọma Chineke.

Ndị di na nwunye na-eji ike ha eme ihe n’ụzọ ziri ezi site n’iji ịhụnanya na nkwanye ùgwù na-emesorịta onwe ha ihe

9. (a) Ndị nwunye nwere ike dị aṅaa n’ezinụlọ? (b) Gịnị pụrụ inyere nwunye aka iji nkà ya na-eme ihe n’ịkwado di ya, gịnịkwa na-esi na ya apụta?

9 Ndị nwunye nwekwara ike ụfọdụ n’ezinụlọ. Bible na-akọ banyere ndị inyom na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị, n’enupụghị isi megide ịbụisi kwesịrị ekwesị, buru ụzọ mee ihe iji kpalie di ha ime ihe n’ụzọ dị mma ma ọ bụ nyere ha aka izere ime mkpebi na-ezighị ezi. (Jenesis 21:9-12; 27:46–28:2) Nwunye pụrụ inwe uche dị nkọ karịa di ya, ma ọ bụkwanụ nwee nkà ndị ọzọ di ya na-enweghị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ga-enwe “nkwanye ùgwù miri emi” maka di ya ma “na-edo onwe [ya] n’okpuru” ya “dị ka n’okpuru Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 5:22, 33) Iburu n’uche ime ihe na-atọ Chineke ụtọ pụrụ inyere nwunye aka iji nkà ya na-eme ihe iji na-akwado di ya kama ịdị na-ewetu ya ala ma ọ bụ na-anwa ịchị ya. ‘Nwanyị dị otú ahụ nke maara ihe’ n’ezie na-akwado di ya nke ọma iji wulite ezinụlọ ha. N’ụzọ dị otú a, ọ na-eme ka ya na Chineke nọgide na-adị n’udo.—Ilu 14:1.

10. (a) Chineke enyewo ndị nne na nna ikike dị aṅaa? (b) Gịnị ka okwu bụ́ “ọzụzụ” pụtara, oleekwa otú e kwesịrị isi na-enye ya? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.)

10 Ndị nne na nna nwekwara ikike Chineke nyere ha. Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Na Bible, okwu ahụ  bụ́ “ọzụzụ” pụrụ ịpụta “nzụlite, ntụziaka.” Ọzụzụ dị ụmụaka mkpa; ha na-eme nke ọma mgbe e nyere ha ụkpụrụ nduzi ndị doro anya ma gwa ha kpọmkwem ihe ndị ha nwere ike ime na ndị ha na-agaghị eme. Bible na-ejikọta ọzụzụ ma ọ bụ ntụziaka dị otú ahụ, na ịhụnanya. (Ilu 13:24) N’ihi ya, e kwesịtụghị iji “mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị” mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi—n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ anụ ahụ́. * (Ilu 22:15; 29:15) Ọzụzụ nke sibigara ike ókè ma ọ bụ nke e ji aka ike na-enye n’ụzọ na-egositụghị ịhụnanya bụ iji ikike e nyere ndị nne na nna na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ọ pụkwara igbu mmụọ nwatakịrị. (Ndị Kọlọsi 3:21) N’aka nke ọzọ, ọzụzụ ziri ezi, bụ́ nke a na-enye n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-eme ka ụmụaka ghọta na ndị mụrụ ha hụrụ ha n’anya ma na-enwe nchegbu banyere ụdị mmadụ ha na-aghọ.

11. Olee otú ụmụaka pụrụ isi jiri ike ha na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi?

11 Gịnị banyere ụmụaka? Olee otú ha pụrụ isi jiri ike ha mee ihe n’ụzọ ziri ezi? “Ịma mma ụmụ okorobịa ka ike ha bụ,” ka Ilu 20:29 na-ekwu. N’ezie, ọ dịghị ụzọ ka mma ndị ntorobịa ga-esi jiri ike ha na-eme ihe karịa iji ya na-ejere ‘Onye Okike Ukwu’ anyị ozi. (Eklisiastis 12:1) Ndị na-eto eto kwesịrị icheta na omume ha pụrụ imetụta ndị mụrụ ha. (Ilu 23:24, 25) Mgbe ụmụaka na-erubere ndị mụrụ ha isi bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke ma na-agbaso ụzọ ziri ezi, ha na-eme ka obi ndị mụrụ ha ṅụrịa. (Ndị Efesọs 6:1) Àgwà dị otú ahụ “na-amasị Onyenwe anyị.”—Ndị Kọlọsi 3:20.

N’ime Ọgbakọ

12, 13. (a) Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-ele ikike ha nwere n’ọgbakọ anya? (b) Nye ihe atụ iji gosi ihe mere ndị okenye kwesịrị iji na-emeso ìgwè atụrụ ahụ ihe n’ụzọ dị nro.

12 Jehova emewo ka e nwee ndị nlekọta maka ịdị na-edu ndú  n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ndị Hibru 13:17) Ndị ikom a ruru eru kwesịrị iji ikike Chineke nyere ha na-eme ihe iji na-enye aka ahụ dị mkpa na iji na-eme òkè nke ha maka ọdịmma nke ìgwè atụrụ ahụ. Ọnọdụ ndị okenye nọ na ya ò nyere ha ikike ime ndị kwere ekwe ibe ha ka ọ bụ ha bụ ndị nwe ha? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ dị mkpa ka ndị okenye jiri ịdị umeala n’obi na-ele ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (1 Pita 5:2, 3) Bible na-agwa ndị nlekọta, sị: “[Na-azụnụ] ọgbakọ Chineke dị ka atụrụ, bụ́ nke o ji ọbara nke Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:28) Nke a bụ ezigbo ihe mere ha ga-eji na-emeso onye ọ bụla so n’ìgwè atụrụ ahụ ihe n’ụzọ dị nro.

13 Anyị pụrụ isi otú a maa atụ ya. Otu ezigbo enyi gị gwara gị ka i lekọtara ya otu ihe onwunwe ya dị oké ọnụ ahịa. Ị maara na enyi gị mefuru ego buru ibu maka ihe ahụ. Ọ̀ bụ na ị gaghị eji ezi nlezianya lekọta ya ka ọ ghara imebi? N’otu aka ahụ, Chineke enyewo ndị okenye ọrụ ilekọta ihe onwunwe dị oké ọnụ ahịa n’ezie: ọgbakọ ya, bụ́ nke e ji ndị nọ na ya tụnyere atụrụ. (Jọn 21:16, 17) Jehova hụrụ atụrụ ya n’anya—n’ezie, ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu nke na o ji ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jizọs Kraịst, zụta ha. Ọ dịghị ọnụ ahịa karịrị nke ahụ Jehova pụrụ ịkwụworị maka atụrụ ya. Ndị okenye dị obi umeala na-eburu nke ahụ n’uche ma na-emeso atụrụ Jehova ihe n’ụzọ kwekọrọ na ya.

‘Ike nke Ire’

14. Ụdị ike dị aṅaa ka ire nwere?

14 “Ọnwụ na ndụ dị n’ike nke ire,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 18:21, NW) N’ezie, ire pụrụ imebi ọtụtụ ihe. Ònye n’ime anyị ka okwu a na-echeghị echiche kwuo ma ọ bụ ọbụna okwu mkparị na-agbatụbeghị ka akpị? Ma, ire nwekwara ike nke imezi ihe. “Ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ,” ka Ilu 12:18 na-ekwu. Ee, okwu ọma ndị na-agba ume pụrụ ịdị ka ite ọgwụ nke na-ebelata ihe mgbu n’obi. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

15, 16. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi jiri ire anyị na-agba ndị ọzọ ume?

15 “Na-agụgụnụ mkpụrụ obi ndị dara mbà,” ka 1 Ndị  Tesalonaịka 5:14 na-agba ume ya. Ee, ọbụna ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi pụrụ inwe ịda mbà n’obi mgbe ụfọdụ. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị dị otú ahụ aka? Gwa ha ezigbo okwu ịja mma, nke kpọrọ okwu aha iji nyere ha aka ịhụ uru ha onwe ha bara n’anya Jehova. Soro ha tụlee okwu ndị nwere mmetụta dị ike dị n’ime Bible bụ́ ndị na-egosi na Jehova na-eche banyere ma nwee ịhụnanya n’ezie n’ebe ndị “obi ha tiwara etiwa” na ndị “a zọpịaworo n’ime mmụọ ha” nọ. (Abụ Ọma 34:18) Mgbe anyị ji ike nke ire anyị na-agụgụ ndị ọzọ, anyị na-egosi na anyị na-eṅomi Chineke anyị nke nwere ọmịiko, bụ́ “onye na-akasi ndị dara mbà n’obi obi.”—2 Ndị Kọrint 7:6, New American Standard Bible.

16 Anyị pụkwara iji ike nke ire anyị nye ndị ọzọ agbamume dị ha oké mkpa. Ọ̀ dị onye kwere ekwe ibe anyị nke onye ọ hụrụ n’anya nwụnahurụ? Okwu ọmịiko ndị na-egosi na ihe banyere ya na-emetụ anyị n’obi nakwa na anyị na-eche banyere ya pụrụ ịkasi onye na-eru újú obi. Nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị meworo agadi ọ̀ na-eche na ya adịghịzi mkpa? Okwu e ji ezi uche kwuo pụrụ imesighachi ndị agadi obi ike  na e ji ha kpọrọ ihe nakwa na a hụrụ ha n’anya. Ò nwere onye na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala? Okwu dị nrò ndị a gwara ya site na fon ma ọ bụ ihu na ihu pụrụ inye aka nke ukwuu n’iwulite mmụọ nke onye na-arịa ọrịa. Lee ka obi na-aghaghị isi dị Onye Okike anyị ụtọ mgbe anyị ji ikike ikwu okwu na-eme ihe n’ikwu ihe ndị “dị mma maka iwuli elu”!—Ndị Efesọs 4:29.

Izisa ozi ọma ahụ—ụzọ magburu onwe ya nke isi jiri ike anyị na-eme ihe

17. N’ụzọ dị aṅaa dị mkpa ka anyị pụrụ isi jiri ire anyị mee ihe n’ụzọ ga-abara ndị ọzọ uru, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji mee otú ahụ?

17 Ọ dịghị ụzọ ọzọ ka mkpa anyị ga-esi jiri ike nke ire na-eme ihe karịa n’isoro ndị ọzọ na-ekerịta ozi ọma nke Alaeze Chineke. “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya,” ka Ilu 3:27 na-ekwu. Anyị ji ndị ọzọ ụgwọ isoro ha na-ekerịta ozi ọma ahụ na-azọpụta ndụ. Ọ gaghị abụ ihe ziri ezi ijichi ozi ahụ dị ngwa nke Jehova jiworo obiọma nye anyị.  (1 Ndị Kọrint 9:16, 22) Ma ruo n’ókè ha aṅaa ka Jehova na-atụ anya ka anyị kere òkè n’ọrụ a?

Iji ‘Ike Anyị Dum’ Na-ejere Jehova Ozi

18. Gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị?

18 Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-akwali anyị ikere òkè zuru ezu n’ozi Ndị Kraịst. Gịnị ka Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị n’akụkụ a? Ọ bụ ihe anyị nile, n’agbanyeghị ọnọdụ anyị ná ndụ, pụrụ inye: “Ihe ọ bụla unu na-eme, jirinụ mkpụrụ obi dum na-arụ ya dị ka ọ bụ nye Jehova, ọ bụghịkwa nye ndị mmadụ.” (Ndị Kọlọsi 3:23) Mgbe ọ na-ekwupụta ihe kasịnụ e nyere n’iwu, Jizọs sịrị: “Ị ghaghịkwa iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:30) Ee, Jehova na-atụ anya ka onye ọ bụla n’ime anyị jiri mkpụrụ obi ya dum hụ ya n’anya ma jeere ya ozi.

19, 20. (a) Ebe ọ bụ na mkpụrụ obi gụnyere obi, uche, na ike, n’ihi gịnị ka e ji kpọtụ ihe ndị ọzọ a aha na Mak 12:30? (b) Gịnị ka iji mkpụrụ obi dum na-ejere Jehova ozi pụtara?

19 Gịnị ka iji mkpụrụ obi dum na-ejere Chineke ozi pụtara? Mkpụrụ obi na-ezo aka ná mmadụ n’ozuzu ya, gụnyere ikike anụ ahụ́ na nke uche ya dum. Ebe ọ bụ na mkpụrụ obi gụnyere obi, uche, na ike, gịnị mere e ji kpọtụ ihe ndị a aha na Mak 12:30? Tụlee otu ihe atụ. N’oge Bible, mmadụ pụrụ irenye onwe ya (mkpụrụ obi ya) n’ịbụ ohu. Ma, ohu ahụ nwere ike ọ gaghị eji obi ya dum jeere nna ya ukwu ozi; o nwere ike ọ gaghị eji ike ya nile ma ọ bụ ikike uche ya nile na-akwalite ihe ndị metụtara nna ya ukwu. (Ndị Kọlọsi 3:22) N’ihi ya, o doro anya na Jizọs kpọtụrụ ikike ndị ọzọ a aha iji mesie ya ike na anyị aghaghị iji ihe nile anyị nwere jeere Chineke ozi. Iji mkpụrụ obi dum na-ejere Chineke ozi pụtara inye onwe anyị, iji ike na ume anyị na-ejere ya ozi ruo n’ókè kasịnụ o kwere mee.

20 Iji mkpụrụ obi dum na-eje ozi ọ̀ pụtara na anyị nile aghaghị itinye oge na ume há nhata n’ozi ahụ? Nke ahụ agaghị ekwe omume, n’ihi na ọnọdụ na ikike mmadụ nile abụghị otu. Dị ka ihe atụ, onye na-eto eto nke nwere ezi ahụ́ ike na ike  ọkpụkpụ aka pụrụ itinye oge dị ukwuu n’ime nkwusa karịa otú onye ime agadi meworo ka ike gwụ pụrụ itinye. Onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nke na-enweghị ibu ọrụ ezinụlọ nwere ike ime ihe karịa otú onye nwere ezinụlọ ọ na-elekọta ga-enwe ike ime. Ọ bụrụ na anyị nwere ike ma nọrọ n’ọnọdụ nke ga-eme ka anyị nwee ike ime ihe dị ukwuu n’ozi ahụ, lee ekele anyị kwesịrị inwe! N’ezie, anyị ekwesịghị inwe mmụọ nkatọ ma ọlị, jiri onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ ma a bịa na nke a. (Ndị Rom 14:10-12) Kama nke ahụ, anyị kwesịrị iji ike anyị na-agba ndị ọzọ ume.

21. Olee ụzọ kasị mma na nke kasị mkpa isi jiri ike anyị na-eme ihe?

21 Jehova esetịpụwo ihe nlereanya zuru okè n’iji ike ya eme ihe n’ụzọ ziri ezi. Anyị kwesịrị iṅomi ya ruo n’ókè anyị nwere ike dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Anyị pụrụ iji ike anyị mee ihe n’ụzọ ziri ezi site n’imeso ndị anyị nwetụrụ ikike n’ebe ha nọ ihe n’uzọ nkwanye ùgwù. Ọzọkwa, anyị kwesịrị iji mkpụrụ obi anyị dum na-arụ ọrụ nkwusa ahụ na-azọpụta ndụ nke Jehova nyeworo anyị ịrụ. (Ndị Rom 10:13, 14) Cheta, Jehova na-enwe obi ụtọ mgbe ị na-enye, ya bụ, mkpụrụ obi gị, na-enye ihe nile ị pụrụ inye. Ọ̀ bụ na obi gị adịghị akpali gị ịchọ ime ihe nile i nwere ike ime n’ijere Chineke dị otú ahụ ozi, bụ́ onye nwere nghọta ma na-ahụ n’anya? Ọ dịghị ụzọ ka mma ma ọ bụ nke ka mkpa isi jiri ike gị na-eme ihe.

^ par. 10 N’oge Bible, okwu Hibru maka “mkpanaka” pụtara osisi ma ọ bụ mkpara, dị ka nke onye ọzụzụ atụrụ na-eji eduzi atụrụ ya. (Abụ Ọma 23:4) N’ụzọ yiri nke ahụ, “mkpanaka” nke ikike nne na nna nwere na-enye echiche nduzi ịhụnanya, ọ bụghị nke ntaramahụhụ e ji aka ike ma ọ bụ obi ọjọọ na-enye.