Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 8

Ike Iweghachi Ihe—Jehova ‘Na-eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ’

Ike Iweghachi Ihe—Jehova ‘Na-eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ’

1, 2. Olee ihe ndị na-efunahụ ezinụlọ mmadụ taa, mmetụta dịkwa aṅaa ka ha na-enwe n’ahụ́ anyị?

NWATAKỊRỊ tụfuru ma ọ bụ mebie ihe o ji egwuri egwu nke o nwere mmasị dị ukwuu na ya wee bee ákwá n’ụzọ dị mwute. Mkpu ákwá ya na-agbawa obi! Otú ọ dị, ị̀ hụtụla otú ihu si atọ nwatakịrị ọchị mgbe nne ya ma ọ bụ nna ya weghachiiri ya ihe ahụ funahụrụ ya? Nye nne ma ọ bụ nna ahụ, ịchọta ma ọ bụ ọbụna idozi ihe ahụ e ji egwuri egwu pụrụ ịbụ ntakịrị ihe. Ma obi na-atọgbu nwa ahụ atọgbu, ọ na-ejukwa ya anya. E weghachila ihe yiri ka ọ dịkwaghị otú a ga-esi nwetaghachi ya!

2 Jehova, bụ́ Nna kasị ukwuu, nwere ike iweghachi ihe ụmụ ya nọ n’ụwa pụrụ iwere na ọ dịkwaghị ka a ga-esi nwetaghachi ya. N’ezie, anyị adịghị ekwu banyere ihe nkịtị e ji egwuri egwu. ‘N’oge ndị a pụrụ iche nke siri ike obibi,’ ihe ndị dị nnọọ mkpa karị na-efunahụ anyị. (2 Timoti 3:1-5) Ọtụtụ n’ime ihe ndị mmadụ ji kpọrọ ihe nke ukwuu yiri ka ha nọ n’ihe ize ndụ mgbe nile—ebe obibi, ihe onwunwe, ọrụ, ọbụna ahụ́ ike. Obi pụkwara ịmapụ anyị mgbe anyị tụgharịrị uche ná mbibi a na-ebibi gburugburu ebe obibi site n’igbuchapụ ọtụtụ n’ime ụdị ihe dị iche iche dị ndụ, nakwa mfu ndị na-esi na ya apụta. Otú ọ dị, ọ dịghị ihe na-emetụ anyị n’ahụ́ ka ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya. Mmetụta nke ịbụ onye ihe funahụrụ na onye na-apụghị ime ihe ọ bụla pụrụ iri anyị ọnụ.—2 Samuel 18:33.

3. Atụmanya dị aṅaa na-enye nkasi obi ka e depụtara n’Ọrụ 3:21, oleekwa ihe Jehova ga-eji emezu ya?

3 Mgbe ahụ, lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmata banyere ike mweghachi ihe nke Jehova! Dị ka anyị ga-ahụ, ihe ndị Chineke ga-enwe ike iweghachi nakwa ihe ndị ọ ga-eweghachiri ụmụ ya ndị nọ n’ụwa buru nnọọ ibu. N’ezie, Bible na-egosi na Jehova na-ezube “mweghachi nke ihe nile.” (Ọrụ 3:21) Iji mezuo nke a, Jehova ga-eji Alaeze Mezaịa, nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-abụ  eze na ya mee ihe. Ihe àmà na-egosi na Alaeze a malitere ịchị n’eluigwe na 1914. * (Matiu 24:3-14) Gịnị ka a ga-eweghachi? Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ọrụ mweghachi dị ebube ndị Jehova rụrụ. Anyị ahụwalarị otu n’ime ha ma na-anụ ụtọ ya. Ndị ọzọ ga-ewere ọnọdụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu n’ọdịnihu.

Mweghachi nke Ofufe Dị Ọcha

4, 5. Gịnị mere ndị Chineke na 607 T.O.A., olileanya dịkwa aṅaa ka Jehova mere ka ha nwee?

4 Otu ihe Jehova weghachiwororị bụ ofufe dị ọcha. Iji ghọta ihe nke a pụtara, ka anyị nyochaa ná mkpirikpi akụkọ ihe mere eme nke alaeze Juda. Inyocha ya ga-eme ka anyị ghọta n’ụzọ na-akpali akpali otú Jehova siworo jiri ike mweghachi ya na-eme ihe.—Ndị Rom 15:4.

5 Cheedị echiche otú obi dị ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi na 607 T.O.A., mgbe e bibiri Jeruselem. E bibiri obodo ha ha hụrụ n’anya, kụtuo mgbidi ya. Nke ka njọ, ụlọ nsọ ahụ dị ebube nke Solomọn wuru, bụ́ ebe ofufe dị ọcha nke Jehova hiwere isi n’ụwa nile, ghọrọ mkpọmkpọ ebe. (Abụ Ọma 79:1) A dọọrọ ndị fọdụrụ ndụ n’agha gaa Babilọn, wee hapụ ala nna ha ka ọ bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu nke anụ ọhịa bi na ya. (Jeremaịa 9:11) N’ụzọ mmadụ si ele ihe anya, o yiri ka ihe nile ò fuola. (Abụ Ọma 137:1) Ma Jehova, bụ́ onye buru mbibi a n’amụma eri ogologo oge gara aga, mere ka e nwee olileanya na oge mweghachi na-abịa.

6-8. (a) Olee isiokwu pụtara ugboro ugboro n’ihe odide nke ndị amụma bụ́ ndị Hibru, oleekwa otú amụma ndị dị otú ahụ si nwee mmezu mbụ ha? (b) N’oge a, olee otú ndị Chineke siworo hụ mmezu nke ọtụtụ amụma mweghachi?

6 N’ezie, mweghachi bụ isiokwu pụtara ugboro ugboro n’ihe  odide nke ndị amụma bụ́ ndị Hibru. * Site n’aka ha, Jehova kwere nkwa ala a ga-eweghachi ma birighachi na ya, nke ga na-eme nri nke ọma, nke anụ ọhịa na ndị iro na-agaghị awakpo mmadụ na ya. Ọ kọwara ala ha e weghachiri eweghachi dị ka nke bụ́ paradaịs n’ezie! (Aịsaịa 65:25; Ezikiel 34:25; 36:35) Nke kasịnụ, a ga-eguzobeghachi ofufe dị ọcha, a ga-ewughachikwa ụlọ nsọ ahụ. (Maịka 4:1-5) Amụma ndị a mere ka ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ nwee olileanya, na-nyekwara ha aka ịtachi obi ruo afọ 70 ahụ ha nọrọ ná ndọrọ n’agha na Babilọn.

7 N’ikpeazụ, oge mweghachi ahụ ruru. Ebe e meworo ka ha nwere onwe ha pụọ n’aka Babilọn, ndị Juu laghachiri Jeruselem ma wughachi ụlọ nsọ Jehova n’ebe ahụ. (Ezra 1:1, 2) Ruo oge nile ha nọgidere na-efe ofufe dị ọcha, Jehova gọziri ha ma mee ka ala ha mee nri ma mịa mkpụrụ nke ukwuu. O chebere ha pụọ n’aka ndị iro nakwa n’aka anụ ọhịa ndị wegharawooro ala ha ruo ọtụtụ iri afọ. Lee ka ha na-aghaghị isiwo ṅụrịa ọṅụ n’ike mweghachi ihe nke Jehova! Ma ihe ndị ahụ merenụ bụ nanị mmezu mbụ, nke a kpaara ókè nke amụma mweghachi ndị ahụ. Mmezu ka ukwuu gaje iwere ọnọdụ “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” n’oge anyị, mgbe a ga-eme ka Onye Nketa nke Eze Devid ahụ e kwere nkwa ya eri oge nọkwasị n’ocheeze.—Aịsaịa 2:2-4; 9:6, 7.

8 Ntakịrị oge ka e mesịrị ka Jizọs nọkwasị n’ocheeze n’Alaeze eluigwe na 1914, o lebaara mkpa ime mmụọ nke ndị Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’ụwa anya. Dị nnọọ ka onye Peasia ahụ nwere mmeri bụ́ Saịrọs si mee ka ihe fọdụrụ ná ndị Juu nwere onwe ha pụọ n’aka Babilọn na 537 T.O.A., Jizọs mere ka ihe fọdụrụ ná ndị Juu ime mmụọ—ụmụazụ ya—nwere onwe ha pụọ ná mmetụta nke Babilọn nke oge a, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Ndị Rom 2:29; Mkpughe 18:1-5) Malite na 1919 gaa n’ihu, e weghachiwo ofufe dị ọcha n’ọnọdụ ya kwesịrị ekwesị ná ndụ ezi Ndị Kraịst. (Malakaị 3:1-5) Kemgbe ahụ, ndị Jehova efewo Ya ofufe n’ụlọ nsọ ime mmụọ ya e mere ka ọ dị ọcha, ya bụ, ndokwa Chineke maka ife ofufe dị ọcha. N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa nye anyị taa?

 Mweghachi Ime Mmụọ—Ihe Mere O Ji Dị Mkpa

9. Mgbe oge ndịozi gasịrị, gịnị ka chọọchị dị iche iche nke Krisendọm mere ofufe nke Chineke, ma gịnị ka Jehova meworo n’oge anyị?

9 Leghachi anya n’akụkọ ihe mere eme. Ndị Kraịst nọ laa azụ na narị afọ mbụ nwetara ọtụtụ ngọzi ime mmụọ. Ma Jizọs na ndịozi ya buru amụma na a ga-emerụ ezi ofufe, na ọ ga-apụkwa n’anya. (Matiu 13:24-30; Ọrụ 20:29, 30) Mgbe oge ndịozi gasịrị, Krisendọm bilitere. Ndị ụkọchukwu ya nakweere ozizi na ihe omume nke ndị na-ekpere arụsị. Ha mekwara ka ijekwuru Chineke fọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-agaghị ekwe omume, na-akọwa Ya dị ka Atọ n’Ime Otu nke siri ike nghọta ma na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-ekwupụtara ndị ụkọchukwu mmehie ha ma na-ekpegara Meri na “ndị senti” dịgasị iche iche ekpere kama ịdị na-ekpegara ya Jehova. Ugbu a, mgbe ọtụtụ narị afọ nke mmerụ dị otú ahụ gasịrị, gịnị ka Jehova meworo? N’ime ụwa nke taa—ụwa nke ụgha okpukpe jubigara ókè na ya na nke omume asọpụrụghị Chineke metọworo—o mewo ihe wee weghachi ofufe dị ọcha! N’ikwu ya nnọọ otú ọ dị, anyị pụrụ ikwu na mweghachi a bụ otu n’ime ihe ndị kasị mkpa meworo n’oge anyị.

10, 11. (a) Olee ụzọ ihe abụọ paradaịs ime mmụọ na-agụnye, oleekwa otú o si metụta gị? (b) Olee ụdị ndị Jehova chịkọbataworo n’ime paradaịs ime mmụọ ahụ, gịnịkwa ka ha ga-enwe ihe ùgwù ịhụ?

10 N’ihi ya, ezi Ndị Kraịst taa nọ na paradaịs ime mmụọ. Gịnị ka paradaịs a na-agụnye? N’ụzọ bụ́ isi, ọ dị ụzọ ihe abụọ. Nke mbụ bụ ofufe dị ọcha nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. O jiriwo ụzọ ife ofufe nke ụgha na mgbanwe eziokwu na-adịghị na ya gọzie anyị. O jiriwo nri ime mmụọ gọzie anyị. Nke a na-eme ka anyị nwee ike ịmụta banyere Nna anyị nke eluigwe, ime ihe na-atọ ya ụtọ, na ịbịaru ya nso. (Jọn 4:24) Akụkụ nke abụọ nke paradaịs ime mmụọ ahụ metụtara ndị mmadụ. Dị ka Aịzaịa buru n’amụma, “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a,” Jehova akụziworo ndị na-efe ya ofufe ụzọ nke udo. O mewo ka agha ghara ịdị n’etiti anyị. N’agbanyeghị ezughị okè anyị, ọ na-enyere anyị aka iyikwasị “mmadụ ọhụrụ ahụ.” Ọ na-eji mmụọ nsọ ya, bụ́ nke na-amị mkpụrụ mara mma n’ime anyị, agọzi mgbalị anyị.  (Ndị Efesọs 4:22-24; Ndị Galeshia 5:22, 23) Mgbe ị na-arụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ ná mmụọ Chineke, ị bụ n’ezie akụkụ nke paradaịs ime mmụọ ahụ.

11 Jehova achịkọbatawo n’ime paradaịs ime mmụọ a ụdị ndị ọ hụrụ n’anya—ndị hụrụ ya n’anya, ndị hụrụ udo n’anya, na ndị “maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Ọ bụ ụdị ndị ahụ ga-enwe ihe ùgwù nke ịhụ mweghachi dị ịrịba ama ọbụna karị—nke ihe a kpọrọ mmadụ na nke ụwa dum.

“Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ”

12, 13. (a) N’ihi gịnị ka amụma mweghachi ndị ahụ ka ga-eji nwee mmezu ọzọ? (b) Gịnị bụ nzube Jehova banyere ụwa dị ka e kwuru n’Iden, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji eme ka anyị nwee olileanya maka ọdịnihu?

12 Ọtụtụ n’ime amụma mweghachi ndị ahụ na-ekwu okwu banyere ihe karịrị mweghachi ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, Aịzaịa dere banyere oge a ga-agwọ ndị ọrịa, ndị ngwụrọ, ndị ìsì, ndị ntị chiri na oge a ga-eloda ọbụna ọnwụ n’onwe ya ruo mgbe ebighị ebi. (Aịsaịa 25:8; 35:1-7) Nkwa ndị dị otú ahụ emezughị n’ụzọ nkịtị n’Izrel oge ochie. Ọ bụkwa ezie na anyị ahụwo mmezu amụma ndị a n’ụzọ ime mmụọ n’oge anyị, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kwere na n’ọdịnihu, ha ga-enwe mmezu nkịtị n’ụzọ zuru ezu. Olee otú anyị si mara nke ahụ?

13 Laa azụ n’Iden, Jehova mere ka nzube ya maka ụwa doo anya: Ọ bụ ka ezinụlọ ihe a kpọrọ mmadụ nke nwere obi ụtọ, nke ahụ́ siri ike, nke dịkwa n’otu biri n’ime ya. Nwoke na nwanyị gaje ilekọta ụwa na ihe nile e kere eke dị na ya, ime ka mbara ala dum ghọọ paradaịs. (Jenesis 1:28) Nke ahụ dị nnọọ iche n’otú ihe dị n’oge a. Otú ọ dị, jide n’aka na a dịghị emebi nzube Jehova emebi. (Aịsaịa 55:10, 11) Jizọs, dị ka Eze Mezaịa nke Jehova họpụtara, ga-eme ka e nwee Paradaịs a ga-ezu ụwa ọnụ.—Luk 23:43.

14, 15. (a) Olee otú Jehova ga-esi mee ka “ihe nile dị ọhụrụ”? (b) Olee otú ndụ ga-adị na Paradaịs, oleekwa akụkụ kasị adọrọ mmasị gị?

14 Cheedị echiche ịhụ ka ụwa nile ghọrọ Paradaịs! Jehova  kwuru banyere oge ahụ, sị: “Lee! Ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.” (Mkpughe 21:5) Cheedị echiche ihe nke ahụ ga-apụta. Mgbe Jehova jiworo ike mbibi ihe ya mechaa ihe megide ajọ usoro ihe a, ọ ga-afọdụ “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” Nke a pụtara na ọchịchị ọhụrụ ga-esi n’eluigwe na-achị ọha mmadụ ọhụrụ nọ n’ụwa nke ihe ga-emejupụta ya bụ ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-eme uche ya. (2 Pita 3:13) A ga-eme ka Setan, nakwa ndị mmụọ ọjọọ ya, kwụsị ịrụ ọrụ. (Mkpughe 20:3) Na nke mbụ ya eri ọtụtụ puku afọ, ihe a kpọrọ mmadụ ga-enwere onwe ya pụọ ná mmetụta ọjọọ ahụ rụrụ arụ, nke na-akpali ịkpọasị. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mmetụta nke inwe ahụ́ efe agaghị enye ndị mmadụ ọnụ okwu.

15 N’ikpeazụ, anyị ga-enwe ike ilekọta mbara ala a mara mma dị ka e zubere ná mmalite ka anyị mee. Ụwa nwere ike ime onwe ya ka ọ dịghachi mma. Ọdọ mmiri na osimiri ndị e metọrọ emetọ pụrụ ịdịghachi ọcha n’onwe ha ma ọ bụrụ na e wepụ ihe na-emetọ ha; ala ndị agha mebisịrị pụrụ ịdịghachi mma ma ọ bụrụ na agha akwụsị. Lee ihe obi ụtọ ọ ga-abụ ịrụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’otú e si kee ụwa, na-enye aka ime ka ọ ghọọ ogige yiri ubi, Iden zuru ụwa ọnụ nke nwere ụdị anụmanụ na ihe ọkụkụ dị iche iche! Kama ịdị na-egbukpọ ụdị anụmanụ na ihe ọkụkụ dị iche iche n’ajụghị ase, mmadụ na ihe nile e kere eke dị n’ụwa ga-adị n’udo. Ọbụna ụmụaka agaghị enwe ihe ha ga-atụ egwu ya n’ebe anụ ọhịa nọ.—Aịsaịa 9:6, 7; 11:1-9.

16. Na Paradaịs, olee mweghachi nke ga-emetụta onye ọ bụla na-ekwesị ntụkwasị obi?

16 Anyị ga-ahụkwa mweghachi n’ahụ́ anyị n’otu n’otu. Mgbe Amagedọn gasịrị, ndị dị ndụ ga-ahụ ọgwụgwọ ọrụ ebube nke ga-ezu ụwa ọnụ. Dị ka Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ ga-eji ike Chineke nyere ya mee ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ, mee ka ndị ntị chiri malite ịnụ ihe, mee ka ahụ́ dị ndị ngwụrọ na ndị na-adịkwaghị ike mma. (Matiu 15:30) Ndị agadi ga-enwe obi ụtọ maka ike, ahụ́ ike, na ume okorobịa a ga-eme ka ha nweghachi. (Job 33:25) Ahụ́ dọlịrị adọlị agakwaghị adị, aka na ụkwụ ga-agbatị, uru ahụ́ ga-eji ike ọhụrụ na-afụli elu. Ihe nile a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi ga-ahụ na mmetụta nke mmehie na ezughị okè ji nke  nta nke nta na-ebelata, na-enye ohere. Lee ka anyị ga-esi nye Jehova Chineke ekele maka ike mweghachi ihe ya dị ebube! Ka anyị lekwasị anya ugbu a n’otu akụkụ na-enye obi ụtọ karịsịa banyere oge mweghachi a na-akpali akpali.

Ime Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Dịghachi Ndụ

17, 18. (a) N’ihi gịnị ka Jizọs ji baara ndị Sadusii mba? (b) Olee ihe ndị dugara n’Ịlaịja ịrịọ Jehova ka ọ kpọlite mmadụ n’ọnwụ?

17 Na narị afọ mbụ O.A., ụfọdụ ndị ndú okpukpe a na-akpọ ndị Sadusii ekweghị ná mbilite n’ọnwụ. Jizọs baara ha mba site n’ikwu, sị: “Unu ehiewo ụzọ, n’ihi na unu amaghị Akwụkwọ Nsọ, unu amaghịkwa ike nke Chineke.” (Matiu 22:29) Ee, Akwụkwọ Nsọ na-ekpughe na Jehova nwere ike mweghachi dị otú ahụ. N’ụzọ dị aṅaa?

18 Were anya nke uche lee ihe mere n’oge Ịlaịja. Otu nwanyị di ya nwụrụ ku nanị otu nwa ọ mụrụ nke na-adịghịzi emegharị ahụ́. Nwa okoro ahụ anwụọla. Ọ ghaghị ijuwo Ịlaịja onye amụma anya, bụ́ onye biwororị dị ka ọbịa n’ụlọ nwanyị a di ya nwụrụ ruo oge ụfọdụ. Tupu mgbe ahụ, o nyere aka mee ka agụụ ghara ịgụgbu nwata a. Ọ pụrụ ịbụ na Ịlaịja abịala nwee ịhụnanya buru ibu n’ebe obere nwa ahụ nọ. Obi gbawara nnọọ nne ya. Nwa okoro a bụ nanị onye dị ndụ o ji na-echeta di ya nwụrụ anwụ. Ọ pụrụ ịbụ na ọ nọwo na-atụ anya na nwa ya nwoke ga-elekọta ya mgbe ya mere agadi. N’ịbụ onye isi na-agba ghara ghara, nwanyị ahụ di ya nwụrụ chewara na a na-ata ya ahụhụ n’ihi mmehie ụfọdụ o mere n’oge gara aga. Ịlaịja agbachilighị nkịtị nọrọ na-ele ọdachi a ka o si otú ahụ na-ajọwanye njọ. O ji nwayọọ kuru ozu nwa ahụ n’ebe nne ya ku ya n’obi ya, kuru ya rịgoo n’ọnụ ụlọ nke ya, ma rịọ Jehova Chineke ka o weghachite mkpụrụ obi, ma ọ bụ ndụ, nwata ahụ.—1 Ndị Eze 17:8-21.

19, 20. (a) Olee otú Ebreham si gosi na ya nwere okwukwe n’ike mweghachi ihe nke Jehova, gịnịkwa mere o ji nwee okwukwe dị otú ahụ? (b) Olee otú Jehova si kwụghachi okwukwe Ịlaịja ụgwọ?

19 Ịlaịja abụghị onye mbụ kwenyere ná mbilite n’ọnwụ. Ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, Ebreham kwenyere na Jehova nwere ike mweghachi dị otú ahụ—o nwekwara ezi ihe mere o ji kwere.  Mgbe Ebreham dị 100 afọ, Sera adịkwa afọ 90, Jehova weghachiri ikike ha nwụworo anwụ nke ịmụ nwa, mee ka Sera nwee ike ịmụ nwa nwoke n’ụzọ ọrụ ebube. (Jenesis 17:17; 21:2, 3) Ka oge na-aga, mgbe nwatakịrị nwoke ahụ toruru ogo mmadụ, Jehova gwara Ebreham ka o jiri nwa ya nwoke chụọ àjà. Ebreham gosipụtara okwukwe, na-ewere ya na Jehova pụrụ ime ka Aịzik ọ hụrụ n’anya dịghachi ndụ. (Ndị Hibru 11:17-19) Okwukwe siri ike dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe mere Ebreham, tupu ya arịgoro n’elu ugwu ahụ ịga jiri nwa ya nwoke chụọ àjà, ji mesie ndị ohu ya obi ike na ya na Aịzik ga-eso lọghachi.—Jenesis 22:5.

“Lee, nwa gị na-adị ndụ”!

20 Jehova zọpụtara Aịzik, ya mere mbilite n’ọnwụ adịghị mkpa n’oge ahụ. Otú ọ dị, n’ihe banyere Ịlaịja, nwa nwanyị ahụ di ya nwụrụ anwụọla anwụọ—ma o tebeghị aka. Jehova kwụghachiri okwukwe onye amụma ahụ ụgwọ site n’ịkpọlite nwa ahụ n’ọnwụ! Ịlaịja wee kpọrọ nwatakịrị nwoke ahụ kpọnye nne ya, ma kwuo okwu ndị a a na-apụghị ichefu echefu: “Lee, nwa gị na-adị ndụ”!—1 Ndị Eze 17:22-24.

21, 22. (a) Gịnị bụ nzube nke mbilite n’ọnwụ ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ? (b) N’ime Paradaịs, ruo n’ókè hà aṅaa ka ọ ga-akpọliteru ndị mmadụ n’ọnwụ, ònyekwa ga-eme ya?

21 Otú a ka anyị si hụ, na nke mbụ ya n’ihe ndekọ Bible, ebe Jehova ji ike ya weghachi ndụ mmadụ. Mgbe e mesịrị, Jehova nyekwara Ịlaịsha, Jizọs, Pọl, na Pita ike ime ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ. Otú ọ dị, ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ mesịrị nwụọ ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndekọ Bible ndị dị otú ahụ na-eme ka anyị hụperetụ n’ụzọ dị ebube ihe ndị na-abịa n’ọdịnihu.

22 N’ime Paradaịs, Jizọs ga-arụzu ọrụ ya dị ka “mbilite n’ọnwụ na ndụ.” (Jọn 11:25) Ọ ga-akpọlite ọtụtụ nde mmadụ n’ọnwụ, nye ha ohere ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala. (Jọn 5:28, 29) Cheedị echiche banyere njikọghachi a ga-enwe mgbe ndị ikwu na ibe a hụrụ n’anya, bụ́ ndị ọnwụ kewara ruo ogologo oge, na-amakụ ibe ha, na-enwe nnọọ oké ọṅụ! Ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-eto Jehova maka ike mweghachi ihe ya.

23. Olee ngosipụta kachasịnụ n’ime ngosipụta nile nke ike Jehova, oleekwa otú nke a si eme ka olileanya anyị maka ọdịnihu bụrụ ihe e ji n’aka?

 23 Jehova enyewo mmesi obi ike bụ́ ịgba na olileanya dị otú ahụ bụ ihe e ji n’aka. Ná ngosipụta kachasịnụ nke ike ya, ọ kpọlitere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, n’ọnwụ, dị ka mmụọ e kere eke dị ike, mee ka ọ bụrụ onye na-esote Ya onwe ya. Jizọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite mere ka ọtụtụ narị mmadụ hụ ya anya. (1 Ndị Kọrint 15:5, 6) Ọbụna nye ndị na-arụ ụka, ihe àmà dị otú ahụ ezuola. Jehova nwere ike ime ka a dịghachi ndụ.

24. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na Jehova ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, oleekwa olileanya onye ọ bụla n’ime anyị ga-eji kpọrọ ihe?

24 Ọ bụghị nanị na Jehova nwere ike ime ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ kama o nwekwara ọchịchọ ime otú ahụ. E ji ike mmụọ nsọ kpalie nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job ikwu na ọ na-agụ Jehova agụụ n’ezie ime ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ. (Job 14:15) Á dịghị eme ka ị bịaruo Chineke anyị nso, bụ́ onye nwere oké mmasị iji ike mweghachi ihe ya mee ihe n’ụzọ ịhụnanya dị otú ahụ? Otú ọ dị, cheta na mbilite n’ọnwụ bụ nanị otu akụkụ nke ọrụ mweghachi dị ukwuu Jehova ga-arụ n’ọdịnihu. Ka ị na-anọgide na-abịarukwu ya nso, jiri olileanya ahụ dị oké ọnụ ahịa na-akpọrọ ihe mgbe nile nke bụ́ na ị pụrụ ịnọ ebe ahụ ma hụ mgbe Jehova ga ‘na-eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.—Mkpughe 21:5.

^ par. 3 “Oge mweghachi nke ihe nile” malitere mgbe e guzobere Alaeze Mezaịa bụ́ nke onye nketa nke Eze Devid kwesịrị ntụkwasị obi nọkwasịrị n’ocheeze ya. Jehova kwere Devid nkwa na onye bụ́ onye nketa ya ga-achị ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 89:35-37) Ma mgbe Babilọn bibisịrị Jeruselem na 607 T.O.A., ọ dịghị mmadụ sitere n’eriri Devid nke nọkwasịrị n’ocheeze Chineke. Jizọs, bụ́ onye a mụrụ n’ụwa dị ka onye bụ́ onye nketa Devid, ghọrọ Eze ahụ e kwere nkwa ya eri oge mgbe e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze n’eluigwe.

^ par. 6 Dị ka ihe atụ, Mozis, Aịzaịa, Jeremaịa, Izikiel, Hozia, Joel, Emọs, Obadaịa, Maịka, na Zefanaịa, ha nile kwuru okwu n’isiokwu a.