Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 ISI NKE 6

Ike Ibibi Ihe—“Jehova Bụ Onye Agha”

Ike Ibibi Ihe—“Jehova Bụ Onye Agha”

1-3. (a) Ihe iyi egwu dị aṅaa ka ụmụ Izrel chere ihu n’aka ndị Ijipt? (b) Olee otú Jehova si buoro ndị ya agha?

ỤMỤ Izrel tọrọ atọ—ha tọrọ atọ n’agbata ugwu pịrị ọnụ, bụ́ ndị dị oké elu na oké osimiri a na-apụghị ịgafe agafe. Usuu ndị agha Ijipt, bụ́ ìgwè ndị obi tara mmiri na-egbu mmadụ, nọ na-achụ ha ọnwụ ọnwụ, kpebisie ike ikpochapụ ha. * N’agbanyeghị nke ahụ, Mozis gwara ndị Chineke ka ha nwee olileanya. “Jehova ga-eburu unu agha,” ka o mesiri ha obi ike.—Ọpụpụ 14:14.

2 N’agbanyeghị nke ahụ, o doro anya na Mozis kpọkuru Jehova, Chineke zakwara ya, sị: “Gịnị mere ị na-etiku m? . . . Weliekwa mkpanaka gị elu, setịpụ aka gị n’elu oké osimiri, kewaa ya.” (Ọpụpụ 14:15, 16) Weregodị anya nke uche gị hụ ihe ndị malitere ime. Jehova nyere mmụọ ozi ya iwu ozugbo, ogidi ígwé ojii wee gaa guzoro n’azụ ụmụ Izrel, ikekwe gbasaa dị ka mgbidi ma nọchie ndị agha Ijipt ihu ka ha ghara ịwakpo ha. (Ọpụpụ 14:19, 20; Abụ Ọma 105:39) Mozis wee setipụ aka ya. N’ịbụ nke oké ifufe fekwasịrị, oké osimiri ahụ kewara abụọ. N’ụzọ ụfọdụ, mmiri ahụ kpụkọrọ ma guzorochaa dị ka mgbidi, wee mee ka e nwee okporo ụzọ sara nnọọ mbara ịbata mba ahụ dum!—Ọpụpụ 14:21; 15:8.

3 Ebe Fero hụworo ngosipụta a nke ike, o kwesịrị inye ndị agha ya iwu ka ha laghachi. Kama nke ahụ, Fero dị mpako nyere iwu ka ha wakpo ha. (Ọpụpụ 14:23) Ndị Ijipt chụụrụ ha banye n’ala oké osimiri ahụ, ma n’oge na-adịghị anya, mwakpo ha ghọrọ ọgba aghara ka ụkwụ ụgbọ ịnyịnya  ha malitere ịhịọpụsị. Ozugbo ụmụ Izrel ruru n’ofe nke ọzọ n’udo, Jehova nyere Mozis iwu, sị: “Setịpụ aka gị n’elu oké osimiri, mmiri ahụ ga-alọtakwa n’ahụ́ ndị Ijipt, n’ahụ́ ụgbọala ha, na n’ahụ́ ndị ịnyịnya ha.” Mmiri ahụ yiri mgbidi dara, wee rikpuo Fero na ndị agha ya!—Ọpụpụ 14:24-28; Abụ Ọma 136:15.

N’Oké Osimiri Uhie, Jehova gosiri na ya bụ “onye agha”

4. (a) N’Oké Osimiri Uhie, gịnị ka Jehova gosipụtara na ya bụ? (b) Olee otú ụfọdụ ndị pụrụ isi meghachi omume n’otú a e si kọwaa Jehova?

4 Nnapụta a napụtara ụmụ Izrel n’Oké Osimiri Uhie ahụ bụ ihe omume dị mkpa n’akụkọ banyere otú Chineke si emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe. N’ebe ahụ, Jehova gosiri na ya bụ “onye agha.” (Ọpụpụ 15:3) Otú ọ dị, gịnị bụ mmeghachi omume gị banyere otú a e si kọwaa Jehova? N’ikwu eziokwu, agha akpataworo ihe a kpọrọ mmadụ oké ihe mgbu na nhụsianya. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ojiji Chineke ji ike ibibi ihe na-eme ihe yiri ka ọ na-egbochi gị ịbịaru ya nso kama ịbụ ihe ga-eme ka ị bịaruo ya nso?

Agha Chineke na Ọgụ Ụmụ Mmadụ Na-alụ

5, 6. (a) N’ihi gịnị ka e ji na-akpọ Chineke “Jehova nke usuu nile nke ndị agha” n’ụzọ kwesịrị ekwesị? (b) Olee otú agha Chineke na-alụ si dị iche n’agha mmadụ na-alụ?

5 N’asụsụ ndị mbụ e ji dee Bible, e nyere Chineke utu aha bụ́ “Jehova nke usuu nile nke ndị agha” ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị ugboro atọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na ugboro abụọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (1 Samuel 1:11) Dị ka Eze Kasị Elu, Jehova nwere usuu ndị agha bara ụba bụ́ ndị mmụọ ozi. (Joshua 5:13-15; 1 Ndị Eze 22:19) Ike usuu ndị agha a nwere ibibi ihe dị egwu. (Aịsaịa 37:36) Ibibi ụmụ mmadụ abụghị ihe na-enye obi ụtọ iche n’echiche. Otú ọ dị, anyị aghaghị icheta na agha ndị Chineke na-alụ adịghị ka ụmụ obere ọgụ ụmụ mmadụ na-alụ. Ndị ọchịagha na ndị  ọchịchị pụrụ ịgbalị ikwu ezi ihe mere ha ji na-ebu agha. Ma ọ na-abụkarị anyaukwu na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akpata agha ụmụ mmadụ na-alụ.

6 N’ụzọ dị iche na nke ahụ, mmetụta uche na-enweghị isi adịghị emegharị Jehova anya. Deuterọnọmi 32:4 na-ekwu, sị: “Oké nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ Ya bụ: n’ihi na ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” Okwu Chineke katọrọ iwe a na-achịkwaghị achịkwa, obi ọjọọ, na ime ihe ike. (Jenesis 49:7; Abụ Ọma 11:5) Ya mere, Jehova adịghị eme ihe ma ọlị n’enweghị ihe kpatara ya. Ọ dịghị ejikebe ike ibibi ihe o nwere eme ihe, ọ na-abụkwa mgbe ọ na-enweghị ihe ọzọ ọ ga-eme ka ọ na-eji ya eme ihe. Ọ bụ dị ka o kwuru site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Izikiel, sị: “Ọ̀ na-atọ m ụtọ ma ọlị, bụ́ ọnwụ nke onye na-emebi iwu? (ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị Jehova pụta): ọ́ dịghị atọ m ụtọ mgbe o si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ?”—Ezikiel 18:23.

7, 8. (a) Gịnị ka Job kwubiri n’ụzọ na-ezighị ezi banyere ahụhụ ọ na-ata? (b) Olee otú Elaịhu si gbazie echiche Job na nke a? (ch) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ Job?

7 Gịnịzi mere Jehova ji eji ike ibibi ihe eme ihe? Tupu anyị azaa ya, anyị pụrụ icheta nwoke ahụ bụ́ onye ezi omume, bụ́ Job. Setan mara aka na Job—n’ezie, mmadụ ọ bụla—agaghị na-eguzosi ike n’ezi ihe mgbe e lere ya ule. Jehova zaghachiri ihe ịma aka ahụ site n’ikwe ka Setan nwalee iguzosi ike n’ezi ihe Job. N’ihi ya, Job rịara ọrịa, ihe onwunwe ya funahụrụ ya, ụmụ ya nwụnahụkwara ya. (Job 1:1–2:8) N’amaghị banyere ihe iseokwu ndị kpatara ya, Job kwubiri n’ụzọ na-ezighị ezi na ahụhụ ya na-ata bụ ntaramahụhụ na-ezighị ezi nke sitere n’aka Chineke. Ọ jụrụ Chineke ihe mere O ji mee ya ‘onye ọ ga-adakwasị,’ ya bụ “onye iro” Ya.—Job 7:20; 13:24.

8 Otu nwa okorobịa aha ya bụ Elaịhu kpughere ebe Job na-echezighị echiche, na-ajụ, sị: “Ị̀ sịwo, Ezi omume m karịrị  nke Chineke?” (Job 35:2) Ee, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya iche na anyị maara ihe karịa Chineke ma ọ bụ iche na o mere ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. “Ya bụrụ Chineke ihe arụ, bụ́ imebi iwu, ya bụrụkwa Onye pụrụ ime ihe nile ihe arụ, bụ́ ime ajọ omume,” ka Elaịhu kwuru. Ka e mesịrị, o kwuru, sị: “Onye pụrụ ime ihe nile, anyị achọpụtaghị Ya; Ọ dị ukwuu n’ike: n’ikpe na ịba ụba nke ezi omume Ọ dịghị eweda n’ala.” (Job 34:10; 36:22, 23; 37:23) Anyị pụrụ ijide n’aka na mgbe ọ bụla Chineke buru agha, ọ na-enwe ezi ihe kpatara ya. N’iburu nke ahụ n’uche, ka anyị nyochaa ụfọdụ n’ime ihe ndị mere Chineke nke udo ji aghọ onye agha mgbe ụfọdụ.—1 Ndị Kọrint 14:33.

Ihe E Ji Akwali Chineke nke Udo Ibu Agha

9. N’ihi gịnị ka Chineke nke udo ji ebu agha?

9 Mgbe o tosịrị Chineke dị ka “onye agha,” Mozis kwuru, sị: “Ònye dị ka Gị n’etiti chi nile, Jehova? Ònye dị ka Gị, dị ebube n’ịdị nsọ?” (Ọpụpụ 15:11) Habakọk onye amụma dere ihe yiri nke ahụ, sị: “Gị onye anya Gị abụọ dị ọcha karị ịhụ ihe ọjọọ, Onye na-apụghịkwa ilegide mmegbu anya.” (Habakuk 1:13) Ọ bụ ezie na Jehova bụ Chineke nke ịhụnanya, ọ bụkwa Chineke nke ịdị nsọ, ezi omume, na ikpe ziri ezi. Mgbe ụfọdụ, àgwà ndị dị otú ahụ na-akwali ya iji ike o nwere ibibi ihe eme ihe. (Aịsaịa 59:15-19; Luk 18:7) Ya mere, Chineke adịghị emerụ ịdị nsọ ya mgbe o buru agha. Kama nke ahụ, ọ na-ebu agha n’ihi na Ọ dị nsọ.—Levitikọs 19:2.

10. (a) Olee mgbe mbụ ọ bịara dị mkpa ka Chineke buo agha, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka mkpa ahụ si bilite? (b) Nanị n’ụzọ dị aṅaa ka a pụrụ isi kwụsị ibu iro ahụ e buru n’amụma na Jenesis 3:15, uru ndị dịkwa aṅaa ka ọ ga-abara ihe a kpọrọ mmadụ bụ́ ndị ezi omume?

10 Tụlee ọnọdụ biliterenụ mgbe mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, nupụsịịrị Chineke isi. (Jenesis 3:1-6) A sị na Jehova gbachiri nkịtị n’ajọ omume ha, ọ gaara emebiwo ọnọdụ ya dị ka Eze Eluigwe na Ala. Dị ka Chineke nke ezi omume, ọ ghaghị ịma ha ikpe ọnwụ. (Ndị Rom 6:23) N’amụma mbụ e dekọrọ n’ime Bible, o buru amụma na iro ga-adị  n’etiti ndị ohu ya na ndị na-agbaso “agwọ” ahụ, bụ́ Setan. (Mkpughe 12:9; Jenesis 3:15) N’ikpeazụ, ọ bụ nanị site n’igwepịa Setan ka ibu iro a ga-akwụsị. (Ndị Rom 16:20) Ma imezu ihe ahụ e kpere n’ikpe ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ bụ́ ndị ezi omume ngọzi dị ukwuu, na-ekpochapụ mmetụta Setan n’ụwa ma meghee ụzọ maka paradaịs ga-ezu ụwa ọnụ. (Matiu 19:28) Tupu mgbe ahụ, ndị na-akwado Setan ga-anọgide na-abụ ihe iyi egwu nye ọdịmma anụ ahụ́ na nke ime mmụọ nke ndị Chineke. Site n’oge ruo n’oge, Jehova aghaghị ime ihe.

Chineke Emee Ihe Iji Wepụ Ajọ Omume

11. N’ihi gịnị ka Chineke ji hụ na ọ dị mkpa iweta iju mmiri ga-ezu ụwa ọnụ?

11 Iju Mmiri nke ụbọchị Noa bụ otu ihe atụ nke ime ihe dị otú ahụ. Jenesis 6:11, 12 na-asị: “E bibiri ụwa n’ihu Chineke, ụwa jupụtakwara n’ihe ike. Chineke wee hụ ụwa, ma, lee, e bibiri ya; n’ihi na anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ, bibiri ụzọ ya n’elu ụwa.” Chineke ọ̀ ga-ekwe ka ndị ajọ omume kpochapụ omume ọma fọdụrụ n’ụwa? Ee e. Jehova hụrụ na ọ dị mkpa ya iweta iju mmiri ga-ezu ụwa ọnụ iji kpochapụ ndị siri ọnwụ na-eme ihe ike na omume rụrụ arụ n’ụwa.

12. (a) Gịnị ka Jehova buru n’amụma banyere “mkpụrụ” Ebreham? (b) N’ihi gịnị ka a ga-eji kpochapụ ndị Amọraịt?

12 Otú ahụ ka ọ dịkwa banyere ikpe Chineke mara ndị Kenan. Jehova kpughere na otu “mkpụrụ” nke a ga-esite na ya gọzie ezinụlọ nile nke ụwa ga-esi n’eriri Ebreham pụta. N’ikwekọ ná nzube ahụ, Chineke kpebiri na a ga-enye ụmụ Ebreham ala Kenan, bụ́ ala nke ndị a na-akpọ ndị Amọraịt bi na ya. Olee otú ọ pụrụ isi bụrụ ihe ziri ezi bụ́ Chineke ịchụpụ ndị a n’ala ha n’ike? Jehova buru n’amụma na a gaghị achụpụ ha ruo mgbe ihe dị ka afọ 400 gasịrị—ruo mgbe ‘ajọ omume nke ndị Amọraịt ga-ezu.’ * (Jenesis 12:1-3; 13:14, 15;  15:13, 16; 22:18) N’ime oge ahụ, ndị Amọraịt mikpukwuru nnọọ n’omume rụrụ arụ karị. Kenan ghọrọ ala nke ikpere arụsị, mwụfu ọbara, na nke mmekọahụ rụrụ arụ. (Ọpụpụ 23:24; 34:12, 13; Ọnụ Ọgụgụ 33:52) Ndị bi n’ala ahụ ọbụna ji ọkụ e ji achụ àjà regbuo ụmụaka. Chineke dị nsọ ọ̀ pụrụ ịhapụ ndị ya ka ha daba n’ajọ omume dị otú ahụ? Ee e! O kwuru, sị: “Ala ahụ rụkwara arụ: M na-ewerekwa ajọ omume ya leta ya, ala ahụ na-agbọpụtakwa ndị bi n’ime ya.” (Levitikọs 18:21-25) Otú ọ dị, Jehova egbughị ndị ahụ aghara aghara. E gbughị ndị Kenan nwere ezi ọchịchọ obi, dị ka Rehab na ndị Gibiọn.—Joshua 6:25; 9:3-27.

Ibu Agha n’Ihi Aha Ya

13, 14. (a) N’ihi gịnị ka Jehova na-aghaghị iji doo aha ya nsọ? (b) Olee otú Jehova si wepụ nkọcha ndị e wetaara aha ya?

13 N’ihi na Jehova dị nsọ, aha ya dị nsọ. (Levitikọs 22:32) Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Nnupụisi ahụ nke weere ọnọdụ n’Iden merụrụ aha Chineke, mee ka e nyowe aha ọma Chineke na ụzọ o si achị achị enyo. Jehova enweghị ike ịgbachi nkịtị ná nkwutọ na nnupụisi dị otú ahụ. Ọ ghaghị ịhụ na o wepụrụ nkọcha ndị e wetaara aha ya.—Aịsaịa 48:11.

14 Ọzọ, tụlee ihe banyere ụmụ Izrel. N’ime oge nile ha bụ ndị ohu n’Ijipt, nkwa Chineke kwere Ebreham na ezinụlọ nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha site ná Mkpụrụ ya, ga-eyi ihe na-agaghị enwe isi. Ma site n’ịnapụta ha na ime ka ha ghọọ otu mba, Jehova wepụrụ nkọcha nile e wetaara aha ya. N’ihi ya, Daniel onye amụma chetara n’ekpere ya, sị: “Onyenwe anyị Chineke anyị, [i weere] aka dị ike mee ka ndị Gị si n’ala Ijipt pụta, I wee meere Onwe gị aha.”—Daniel 9:15.

15. N’ihi gịnị ka Jehova ji napụta ndị Juu ná ndọrọ n’agha na Babilọn?

15 N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Daniel si otú a kpee ekpere mgbe ọ dị ndị Juu mkpa ka Jehova mee ihe ọzọ n’ihi aha Ya. Ndị Juu ahụ na-enupụ isi nọ ná ndọrọ n’agha, na nke ugbu a na  Babilọn. Isi obodo ha, bụ́ Jeruselem, bụ mkpọmkpọ ebe. Daniel maara na iweghachi ndị Juu n’ala nna ha ga-ebuli aha Jehova elu. N’ihi ya, Daniel kpere ekpere, sị: “Onyenwe anyị, gbaghara: Onyenwe anyị, ṅaa ntị mee ihe: anọla ọdụ: n’ihi Gị onwe gị, Chineke m, n’ihi na aha Gị ka a kpọkwasịworo obodo Gị na ndị Gị.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.)—Daniel 9:18, 19.

Ịlụ Ọgụ n’Ihi Ndị Ya

16. Kọwaa ihe mere na mmasị Jehova nwere n’ichebe aha ya apụtaghị na ọ bụ onye ihe na-adịghị emetụ n’ahụ́ na onye na-achọ nanị ọdịmma onwe ya.

16 Mmasị Jehova nwere n’ichebe aha ya ọ̀ pụtara na ọ bụ onye ihe na-adịghị emetụ n’ahụ́ na onye na-achọ nanị ọdịmma onwe ya? Ee e, n’ihi na site n’ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ịdị nsọ ya na ịhụnanya o nwere maka ikpe ziri ezi, ọ na-echebe ndị ya. Tụlee Jenesis isi 14. N’ebe ahụ, anyị na-agụ banyere ndị eze anọ mere mwakpo, bụ́ ndị tọọrọ nwa nwanne Ebreham bụ́ Lọt, na ezinụlọ Lọt. Site n’enyemaka Chineke, Ebreham meriri usuu ndị agha karịrị ya ike nke ukwuu, n’ụzọ na-atụ n’anya! Ikekwe ihe ndekọ banyere mmeri a bụ ihe mbụ e dekọro “n’akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova,” nke bụ́ ma eleghị anya akwụkwọ ebe e dekọkwara ụfọdụ agha ndị e buru bụ́ ndị a na-edeghị na Bible. (Ọnụ Ọgụgụ 21:14) Ọtụtụ mmeri ndị ọzọ gaje isochi ya.

17. Gịnị na-egosi na Jehova buuru ụmụ Izrel agha mgbe ha banyesịrị n’ala Kenan? Nye ihe atụ.

17 Ntakịrị oge tupu ụmụ Izrel abanye n’ala Kenan, Mozis mesiri ha obi ike, sị: “Jehova, bụ́ Chineke unu, Onye na-eje n’ihu unu, Ya onwe ya ga-eburu unu agha, dị ka ihe nile si dị nke O mere banyere unu n’Ijipt.” (Deuterọnọmi 1:30; 20:1) Malite n’onye nọchiri Mozis, bụ́ Jọshụa, ruo n’oge Ndị Ikpe na n’oge ọchịchị nke ndị eze kwesịrị ntụkwasị obi nke Juda, Jehova buuru ndị ya agha n’ezie, na-eme ka ha merie ndị iro ha ọtụtụ mmeri dị ịtụnanya.—Joshua 10:1-14; Ndị Ikpe 4:12-17; 2 Samuel 5:17-21.

18. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee ekele na Jehova agbanwebeghị? (b) Gịnị ga-eme mgbe ibu iro ahụ a kọwara na Jenesis 3:15 ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu?

 18 Jehova agbanwebeghị; nzube ya ime ka ụwa a ghọọ paradaịs nke udo dị na ya agbanwebeghịkwa. (Jenesis 1:27, 28) Chineke ka kpọrọ ajọ omume asị. Otú ọ dị, ọ hụrụ ndị ya n’anya nke ukwuu, ọ ga-emekwa ihe n’isi nso n’ihi ha. (Abụ Ọma 11:7) N’ezie, a na-atụ anya na ibu iro ahụ a kọwara na Jenesis 3:15 ga-eru n’oge ọ ga-adagharị n’ụzọ dị ịrịba ama ma dị egwu n’isi nso. Iji doo aha ya nsọ ma chebe ndị ya, Jehova ga-aghọghachi “onye agha”!—Zekaraịa 14:3; Mkpughe 16:14, 16.

19. (a) Nye ihe atụ iji gosi na ojiji Chineke na-eji ike ibibi ihe eme ihe pụrụ ime ka anyị bịaruo ya nso. (b) Mmetụta dị aṅaa ka ịdị njikere Chineke ibu agha kwesịrị inwe n’ahụ́ anyị?

19 Tụlee otu ihe atụ: Were ya na ajọ anụ ọhịa nọ na-awakpo ezinụlọ otu nwoke nakwa na nwoke ahụ bịara tinye aka ma gbuo ya. Ị̀ ga-atụ anya ka ihe a o mere mee ka nwunye ya na ụmụ ya gbawara ya ọsọ? Kama nke ahụ, ị ga-atụ anya ka ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị nke o nwere n’ebe ha nọ metụ ha n’ahụ́. N’otu aka ahụ, ojiji Chineke ji ike ibibi ihe eme ihe ekwesịghị ime ka anyị gbawara ya ọsọ. Njikere ọ dị ibu agha iji chebe anyị kwesịrị ime ka anyị  hụkwuo ya n’anya. Nkwanye ùgwù anyị nwere maka ike ya a na-akparaghị ókè kwesịkwara ibukwu ibu. N’ụzọ dị otú a, anyị ga-enwe ike ‘ijere Chineke ozi dị nsọ site n’egwu Chineke na ụjọ.’—Ndị Hibru 12:28.

Bịaruo “Onye Agha” ahụ Nso

20. Mgbe anyị gụrụ ihe ndekọ Bible banyere agha ndị Chineke buru bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na anyị aghọtaghị nke ọma, olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume, n’ihi gịnịkwa?

20 N’ezie, Bible adịghị akọwa n’ọnọdụ nke ọ bụla ihe nile mere Jehova ji ekpebi ibu agha ndị ọ na-ebu. Ma, otu ihe anyị pụrụ ijide n’aka mgbe nile bụ: Ọ dịghị mgbe Jehova na-eji ike mbibi ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, n’enweghị ezi ihe kpatara ya, ma ọ bụ n’obi ọjọọ. Ọtụtụ mgbe, ịtụle ihe ndị gbara otu ihe ndekọ Bible gburugburu ma ọ bụ ihe ụfọdụ banyere ebe o mere pụrụ inyere anyị aka ịghọta ihe nile banyere ya. (Ilu 18:13) Ọbụna mgbe anyị na-amaghị ihe nile banyere ya, nanị ịmụtakwu ihe banyere Jehova na ịtụgharị uche n’àgwà ya ndị dị oké ọnụ ahịa pụrụ inyere anyị aka iwepụ obi abụọ ọ bụla pụrụ ibilite. Mgbe anyị mere nke a, anyị na-abịa hụ na anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji tụkwasị Chineke anyị, bụ́ Jehova obi.—Job 34:12.

21. Ọ bụ ezie na Jehova na-abụ “onye agha” mgbe ụfọdụ, olee ụdị onye ọ bụ kpọmkwem?

21 Ọ bụ ezie na Jehova na-abụ “onye agha” mgbe ọnọdụ mere ka ọ dị mkpa, nke a apụtaghị na obi ya jupụtara n’ibu agha. N’ọhụụ Izikiel hụrụ banyere ụgbọ ịnyịnya eluigwe ahụ, a kọwara Jehova dị ka onye nọ na-ejikere ibuso ndị iro ya agha. N’agbanyeghị nke ahụ, Izikiel hụrụ ka eke na ogwurugwu gbara Chineke gburugburu—ihe nnọchianya nke udo. (Jenesis 9:13; Ezikiel 1:28; Mkpughe 4:3) N’ụzọ doro anya, Jehova dị nwayọọ ma na-eme udo. “Chineke bụ ịhụnanya,” ka Jọn onyeozi dere. (1 Jọn 4:8) Àgwà nile nke Jehova na-agakọ nnọọ ọnụ n’ụzọ zuru okè. Lezienụ ihe ùgwù anyị nwere ịbịaru Chineke dị otú ahụ nso bụ́ onye dị ike ma nwee ịhụnanya!

^ par. 1 Dị ka Josephus onye Juu, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, ọ bụ “ụgbọ ịnyịnya 600 na ndị ịnyịnya 50,000 na ndị agha ji ụkwụ aga bu ọtụtụ ngwá agha bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha ruru 200,000, chụsoro” ndị Hibru.—Jewish Antiquities, II, 324 [xv, 3].

^ par. 12 Dị ka ihe àmà na-egosi, n’ebe a, okwu bụ́ “ndị Amọraịt” na-agụnye ndị Kenan nile.—Deuterọnọmi 1:6-8, 19-21, 27; Joshua 24:15, 18.