Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 25

“Obi Ọmịiko nke Chineke Anyị”

“Obi Ọmịiko nke Chineke Anyị”

1, 2. (a) Olee otú nne na-esi emeghachi omume, dị ka e si kee ya, n’ákwá obere nwa ya na-ebe? (b) Olee mmetụta nke karịrị ọbụna ọmịiko nne?

N’ETITI abalị, nwa ọhụrụ ebee ákwá. Nne ya eteta ozugbo. Ọ nakwaghị ehi ụra nke ọma otú ọ na-ehibu—kemgbe ọ mụsịrị nwa. Ọ mụtawo ịmata ụdị ákwá dị iche iche nwa ya na-ebe. N’ihi ya, ọtụtụ mgbe ọ pụrụ ịmata ma nwa ọhụrụ ya ọ̀ chọrọ ịṅụ ara, ọ̀ chọrọ ka e kuru ya, ma ọ bụ ka e lekọta ya n’ụzọ ndị ọzọ. Ma n’agbanyeghị ihe ọ bụ ya mere nwa ahụ ji na-ebe ákwá, nne ya na-eme ihe. Obi agaghị ekwe ya leghara mkpa nwa ahụ anya.

2 Ọmịiko nne na-enwe n’ebe nwa ọ mụrụ nọ bụ otu n’ime mmetụta kasị nro ụmụ mmadụ maara. Otú ọ dị, e nwere mmetụta nke karịrị ya nke ukwuu—obi ọmịiko nke Chineke anyị, bụ́ Jehova. Ịtụle àgwà a na-adọrọ adọrọ pụrụ inyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso. Mgbe ahụ, ka anyị tụlee ihe bụ́ ọmịiko na otú Chineke anyị si egosipụta ya.

Gịnị Bụ Ọmịiko?

3. Gịnị ka ngwaa Hibru a sụgharịrị ịbụ “mee ebere” ma ọ bụ “nwee obi ebere” pụtara?

3 N’ime Bible, e nwere njikọ chiri anya n’agbata ọmịiko na ebere. Ọtụtụ okwu Hibru na okwu Grik na-enye echiche nke obi ọmịiko. Dị ka ihe atụ, tụlee ngwaa Hibru bụ́ ra·chamʹ, bụ́ nke a na-asụgharịkarị ịbụ “mee ebere” ma ọ bụ “nwee obi ebere.” Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha na-akọwa na ngwaa bụ́ ra·chamʹ “na-egosi mmetụta ọmịiko miri emi, nke dịkwa nro, dị ka ụdị a na-akpali anyị inwe mgbe anyị hụrụ adịghị ike ma ọ bụ nhụsianya nke  ndị anyị hụrụ n’anya ma ọ bụ ndị chọrọ enyemaka anyị.” Okwu Hibru a, nke Jehova ji mee ihe n’izo aka n’ebe ya onwe ya nọ, na okwu e ji eme ihe maka “akpa nwa” nwere njikọ, a pụkwara ịkọwa ya dị ka “ụdị ọmịiko nne na-enwe.” *Ọpụpụ 33:19; Jeremaịa 33:26.

“Nwanyị ọ̀ pụrụ ichefu nwa nke ya?”

4, 5. Olee otú Bible si jiri mmetụta nke nne na-enwe n’ebe nwa ọhụrụ ya nọ kụziere anyị banyere ọmịiko Jehova?

4 Bible ji mmetụta nne na-enwe n’ebe obere nwa ya nọ mee ihe iji kụziere anyị ihe ọmịiko Jehova pụtara. N’Aịsaịa 49:15, anyị na-agụ, sị: “Nwanyị ọ̀ pụrụ ichefu nwa ya ka na-aṅụ ara, nke na ọ gaghị enwe ọmịiko [ra·chamʹ] n’ahụ́ nwa ọ mụrụ? Ee, ha pụrụ ichefu, ma agaghị m echefu gị.” (The Amplified Bible) Nkọwa ahụ na-emetụ n’ahụ́ na-eme ka ịdị omimi nke ọmịiko Jehova nwere n’ebe ndị ya nọ pụta ìhè. N’ụzọ dị aṅaa?

5 O siri ike iche n’echiche na nne ga-echefu inye nwa ya ka na-aṅụ ara ara na ilekọta ya. E kwuwerị, nwa ọhụrụ apụghị inyere onwe ya aka; ma n’ehihie ma n’abalị mmetụta ịhụnanya na nlekọta nke nne ya na-adị nwa ọhụrụ mkpa. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, a na-anụ banyere ndị nne ileghara ụmụ ha anya, karịsịa ‘n’oge ndị a pụrụ iche’ nke e ji enweghị “obi mmadụ” mara. (2 Timoti 3:1, 3) “Ma,” ka Jehova na-ekwu, “agaghị m echefu gị.” Obi ọmịiko Jehova nwere n’ebe ndị na-ejere ya ozi nọ adịghị ada ada. O siri ike nke ukwuu karịa mmetụta kasị dị nro e bu pụta ụwa nke anyị pụrụ ichetụ n’echiche—ọmịiko nke nne na-enwe n’ebe nwa ọhụrụ ya nọ. Ka a sịkwa ihe mere otu onye na-enye nkọwa ji kwuo banyere Aịsaịa 49:15, sị: “Nke a bụ otu n’ime okwu ndị kasị egosipụta ịhụnanya Chineke n’Agba Ochie, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ya kachasị egosi ya.”

6. Olee otú ọtụtụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè siworo lee ọmịiko anya, ma gịnị ka Jehova na-emesi anyị obi ike banyere ya?

 6 Obi ọmịiko ọ̀ bụ ihe na-egosi adịghị ike? Ọtụtụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè echewo otú ahụ. Dị ka ihe atụ, onye Rom bụ́ ọkà ihe ọmụma bụ́ Seneca, onye ya na Jizọs dịkọrọ ndụ, onye a makwa ama nke gụrụ ezigbo akwụkwọ na Rom, kụziri na “obi ebere bụ adịghị ike nke uche.” Seneca na-akwado nkà ihe ọmụma ndị Stọik, bụ́ nkà ihe ọmụma nke na-emesi ike ịnọ jụụ n’egosipụtaghị mmetụta ọ bụla. Onye maara ihe nwere ike inyere ndị nọ ná nsogbu aka, ka Seneca kwuru, ma ọ gaghị enwe obi ebere, maka na mmetụta dị otú ahụ ga-eme ka ọ ghara inwe obi dị jụụ. Echiche dị otú ahụ nke ịchọ nanị ọdịmma onwe onye ná ndụ adịghị ekwe ka e nwee ọmịiko si n’ala ala obi. Ma Jehova adịghị otú ahụ ma ọlị! N’Okwu ya, Jehova na-emesi anyị obi ike na ya “nwere mmetụta dị nnọọ nro, na-emekwa ebere [n’ụzọ nkịtị, “na-enwe ọmịiko”].” (Jems 5:11) Dị ka anyị ga-ahụ, ọmịiko abụghị adịghị ike kama ọ bụ àgwà siri ike, nke dị oké mkpa. Ka anyị nyochaa otú Jehova, dị ka nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya, si egosipụta ya.

Mgbe Jehova Gosiri Otu Mba Ọmịiko

7, 8. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Izrel si taa ahụhụ n’Ijipt oge ochie, oleekwa ihe Jehova mere banyere ahụhụ ha na-ata?

7 A na-ahụ ọmịiko Jehova nke ọma n’ụzọ o si mesoo mba Izrel. Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke narị afọ nke 16 T.O.A., ọtụtụ nde ndị Izrel bụ ohu n’Ijipt oge ochie, bụ́ ebe e megburu ha nke ukwuu. Ndị Ijipt “wee were ofufe siri ike mee ka ndụ ha dị ilu, n’ụrọ, na n’ime brick.” (Ọpụpụ 1:11, 14) Ka ha nọ na-ata ahụhụ, ụmụ Izrel tikuru Jehova maka enyemaka. Olee otú Chineke nke obi ọmịiko si meghachi omume?

8 O metụrụ Jehova n’obi. Ọ sịrị: “Ahụwo m n’ezie  mweda n’ala nke ndị m nke dị n’Ijipt, anụwokwa m iti mkpu ha n’ihi ndị na-achị ha n’ihe ike; n’ihi na amawo m ihe mgbu ha nile.” (Ọpụpụ 3:7) Jehova agaghị ahụ ahụhụ ndị ya na-ata ma ọ bụ nụ mkpu ákwá ha ma ghara imere ha ebere. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 24 nke akwụkwọ a, Jehova bụ Chineke nke nwere mmetụta ọmịiko. E jikọtakwara mmetụta ọmịiko—ikike ịghọta ihe mgbu ndị ọzọ na-enwe—na ọmịiko n’ụzọ chiri anya. Ma, ọ bụghị nanị na Jehova meere ndị ya ebere; a kpaliri ya ime ihe n’ihi ha. Aịsaịa 63:9 na-ekwu, sị: “N’ịhụnanya Ya na n’ọmịiko Ya Ya onwe ya gbapụtara ha.” “N’aka dị ike,” Jehova napụtara ndị Izrel n’Ijipt. (Deuterọnọmi 4:34) Mgbe nke ahụ gasịrị, o nyere ha ihe oriri n’ụzọ ọrụ ebube ma mee ka ha baa n’ala nke ha, ala nke na-amị mkpụrụ n’ụba.

9, 10. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji napụta ndị Izrel ugboro ugboro mgbe ha biriwooro n’Ala Nkwa ahụ? (b) N’oge Jefta, Jehova napụtara ndị Izrel ná mmegbu dị aṅaa, gịnịkwa kpaliri ya ime otú ahụ?

9 Ọmịiko Jehova akwụsịghị n’ebe ahụ. Mgbe ụmụ Izrel biiri n’Ala Nkwa ahụ, ha dabara ugboro ugboro n’ekwesịghị ntụkwasị obi ma taa ahụhụ n’ihi ya. Ma anya na-emesịa doo ha, ha akpọkuokwa Jehova. Ọ napụtara ha ugboro ugboro. N’ihi gịnị? “N’ihi na O nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị Ya.”—2 Ihe E Mere 36:15; Ndị Ikpe 2:11-16.

10 Tụlee ihe mere n’oge Jefta. Ebe ụmụ Izrel laghachiworo n’ife chi ụgha dị iche iche, Jehova kwere ka ndị Amọn megbuo ha ruo afọ 18. N’ikpeazụ, ndị Izrel chegharịrị. Bible na-agwa anyị, sị: “Ha wee si n’etiti ha wezụga chi ala ọzọ nile, fee Jehova ofufe: mkpụrụ obi Ya enweghịkwa ntachi obi n’ihi ọnọdụ ọjọọ nke Izrel.” * (Ndị Ikpe 10:6-16) Ozugbo  ndị ya gosipụtara ezigbo nchegharị, Jehova anọlighịkwa na-ele ha ka ha na-ata ahụhụ. Ya mere, Chineke nke obi ọmịiko nyere Jefta ike ịnapụta ụmụ Izrel site n’aka ndị iro ha.—Ndị Ikpe 11:30-33.

11. Site n’otú Jehova si mesoo ndị Izrel ihe, gịnị ka anyị na-amụta banyere ọmịiko?

11 Gịnị ka ụzọ Jehova si mesoo mba Izrel na-akụziri anyị banyere obi ọmịiko? Otu bụ, anyị na-ahụ na ọ gụnyere ihe karịrị nanị iji obi ebere na-egosi na anyị maara ahụhụ ndị mmadụ na-ata. Cheta ihe atụ ahụ banyere nne, onye ọmịiko kpaliri ime ihe banyere ákwá nwa ọhụrụ ya na-ebe. N’otu aka ahụ, Jehova adịghị eleghara ákwá ndị ya na-ebe anya. Obi ọmịiko ya na-akpali ya ime ihe iji kwụsị nhụjuanya ha. Ọzọkwa, ụzọ Jehova si mesoo ndị Izrel ihe na-akụziri anyị na ọmịiko enweghị ụzọ o si bụrụ adịghị ike, n’ihi na àgwà a dị nro kpaliri ya ime ihe doro anya n’ihi ndị ya. Ma Jehova ọ̀ na-egosi ndị ohu ya ọmịiko nanị dị ka otu ìgwè?

Ọmịiko Jehova Nwere n’Ebe Ndị Mmadụ Nọ n’Otu n’Otu

12. Olee otú Iwu ahụ si gosipụta ọmịiko Jehova nwere n’ebe ndị mmadụ nọ n’otu n’otu?

12 Iwu Chineke nyere mba Izrel gosipụtara ọmịiko o nwere n’ebe ndị mmadụ nọ n’otu n’otu. Were dị ka ihe atụ, nchegbu o nwere n’ebe ndị ogbenye nọ. Jehova maara na a pụrụ inwe ọnọdụ ndị a na-atụghị anya ha, bụ́ ndị pụrụ ime ka onye Izrel ghọọ ogbenye. Olee otú a ga-esi mesoo ndị dara ogbenye? Jehova nyesiri ndị Izrel iwu ike, sị: “Agbala obi gị ume, akwụkwụbala aka gị n’ebe nwanne gị, bụ́ ogbenye, nọ. Ị ghaghị inye ya, ọ gaghị ajọkwara obi gị njọ mgbe ị na-enye ya: n’ihi na ọ bụ n’ihi ihe a ka Jehova, bụ́ Chineke gị, ga-agọzi gị n’omume gị nile.” (Deuterọnọmi 15:7, 10) Jehova nyekwasịrị iwu ka ụmụ Izrel ghara iwerecha ihe dị n’akụkụ ubi ha kpam kpam ma ọ bụ were ihe ọ bụla fọdụrụ n’ubi ha. Ọ bụ  ndị ụwa na-atụ n’ọnụ ga-achịkọta ihe ndị ahụ fọdụrụnụ. (Levitikọs 23:22; Rut 2:2-7) Mgbe mba ahụ debere iwu a na-egosi ichebara ndị ọzọ echiche, bụ́ nke e nyere n’ihi ndị ogbenye nọ n’etiti ha, ọ dịghị ihe ga-eme ka ndị nọ ná mkpa n’Izrel rịọ nri. Nke ahụ ọ́ bụghị ngosipụta nke obi ọmịiko Jehova?

13, 14. (a) Olee otú ihe Devid kwuru si na-emesi anyị obi ike na Jehova nwere nchegbu miri emi banyere anyị n’otu n’otu? (b) Olee ihe atụ a pụrụ iji gosi na Jehova nọ ndị “obi ha tiwara etiwa” ma ọ bụ “ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha” nso?

13 Taakwa, Chineke anyị na-ahụ n’anya na-enwe nchegbu miri emi maka anyị n’otu n’otu. Anyị pụrụ ijide n’aka na ọ maara nke ọma, nhụjuanya ọ bụla anyị pụrụ ịdị na-enwe. Ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ́ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ ghekwaara oghe ná mkpu ha na-etiku Ya. Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:15, 18) N’ikwu okwu banyere ndị okwu ndị ahụ na-akọwa, otu onye na-akọwa Bible na-ekwu, sị: “Ha bụ ndị obi ha tiwara etiwa nakwa ndị na-enwe mwute na mmụọ ha, ya bu, ndị e wedara n’ala n’ihi mmehie ha, ndị e wepụworo ùgwù onwe onye ha nwere; ha dị ala n’anya onwe ha, ha enweghịkwa obi ike n’uru ha bara.” Ndị dị otú ahụ pụrụ iche na Jehova nọ nnọọ n’ebe dị anya nakwa na ha dị nnọọ nta nke ukwuu nke na ọ gaghị na-eche banyere ha. Ma ọ dịghị otú ahụ. Ihe Devid kwuru na-emesi anyị obi ike na Jehova adịghị agbahapụ ndị “dị ala n’anya onwe ha.” Chineke anyị nke nwere ọmịiko maara na ya dị anyị mkpa karịsịa n’oge ndị dị otú ahụ, ọ nọkwa anyị nso.

14 Tụlee otu ahụmahụ. Otu nne na United States ji ọsọ kpọga nwa ya nwoke dị afọ abụọ ụlọ ọgwụ n’ihi na ọ na-arịa ụkwara ume ọkụ. Mgbe ha lesịrị nwatakịrị ahụ ahụ́, ndị dọkịta gwara nne ya na ha ga-enye ya àkwà n’ụlọ ọgwụ ruo echi ya. Olee ebe nne ya rahụrụ n’abalị ahụ? Ọ bụ n’elu otu oche dị n’ụlọ ọgwụ ahụ, kpọmkwem n’akụkụ  àkwà ebe nwa ya nwoke dina! Ahụ́ adịghị obere nwa ya nwoke, ọ ghaghịkwa ịnọ ya nso. N’ezie, anyị pụrụ ịtụ anya ọbụna ihe karịrị nke ahụ n’aka Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya! E kwuwerị, e mere anyị n’onyinyo ya. (Jenesis 1:26) Ihe ndị na-emetụ n’ahụ́ e kwuru n’Abụ Ọma 34:18 na-agwa anyị na mgbe ‘obi anyị tiwara etiwa’ ma ọ bụ mgbe ‘a zọpịaworo anyị na mmụọ,’ na Jehova, dị ka nna na-ahụ n’anya, “nọ nso”—na-enwe ọmịiko ma dị njikere inye aka mgbe nile.

15. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova si enyere anyị aka n’otu n’otu?

15 Oleezi otú Jehova si enyere anyị aka n’otu n’otu? Ọ bụghị na ọ ga-ewepụrịrị ihe na-akpatara anyị nhụjuanya. Kama Jehova emewo ndokwa bara ụba n’ihi ndị na-etiku ya maka enyemaka. Okwu ya, bụ́ Bible, na-enye ndụmọdụ dị irè nke pụrụ ime ka e nwee ọdịiche pụtara ìhè. N’ime ọgbakọ, Jehova na-enye anyị ndị nlekọta ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ ndị na-agbalị igosipụta ọmịiko ahụ o nwere mgbe ha na-enyere ndị kwere ekwe ibe ha aka. (Jems 5:14, 15) Dị ka “Onye na-anụ ekpere,” ọ na-enye “ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ” ihe ha rịọrọ. (Abụ Ọma 65:2; Luk 11:13) Mmụọ ahụ pụrụ inye anyị “ike karịrị ike nkịtị” iji nwee ike ịtachi obi ruo mgbe Alaeze Chineke ga-ewepụ nsogbu nile na-akpata nchegbu. (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọ̀ bụ na anyị enweghị ekele maka ndokwa a nile? Ka anyị ghara ichefu na ha bụ ngosipụta nke obi ọmịiko Jehova.

16. Gịnị bụ ihe atụ kasịnụ nke ọmịiko Jehova, oleekwa otú o si emetụta anyị n’otu n’otu?

16 N’ezie, ihe atụ kasịnụ nke ọmịiko Jehova bụ onyinye o nyere Onye ọ kasị hụ n’anya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka anyị. Ọ bụ àjà Jehova ji ịhụnanya chụọ, o meghekwara ụzọ maka nzọpụta anyị. Cheta, ihe mgbapụta ahụ baara anyị uru n’otu n’otu. N’inwe ezi ihe kpatara ya, Zekaraịa, bụ́ nna Jọn Onye Na-eme Baptizim, buru amụma na onyinye a mere ka “obi ọmịiko nke Chineke anyị” pụta ìhè.—Luk 1:78.

 Mgbe Jehova Na-ajụ Igosi Ọmịiko

17-19. (a) Olee otú Bible si gosi na ọmịiko Jehova nwere ebe njedebe? (b) Gịnị mere ka ọmịiko Jehova nwere n’ebe ndị ya nọ ruo ná njedebe ya?

17 Ànyị ga-ewere ya na obi ọmịiko Jehova enweghị ebe njedebe? N’ụzọ megidere nke ahụ, Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na n’ihe banyere ndị na-emegide ụzọ ezi omume ya, n’ụzọ ziri ezi, Jehova adịghị egosi ha ọmịiko. (Ndị Hibru 10:28) Iji ghọta ihe mere na ọ dịghị egosi ha ọmịiko, cheta ihe atụ nke mba Izrel.

18 Ọ bụ ezie na Jehova napụtara ndị Izrel ọtụtụ ugboro site n’aka ndị iro ha, n’ikpeazụ, ọmịiko ya ruru ná njedebe ya. Ndị a dị isi ike fere arụsị, ọbụna webata arụsị ha ndị bụ́ ihe arụ n’ime ụlọ nsọ Jehova kpọmkwem! (Ezikiel 5:11; 8:17, 18) Ọzọkwa, a gwara anyị, sị: “Ha wee na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu Ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma Ya nọ, ruo mgbe ọnụma Jehova lara elu imegide ndị Ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.” (2 Ihe E Mere 36:16) Ndị Izrel ruru n’ókè nke na e nweghịzi ihe ndabere ọ bụla kwesịrị ekwesị iji igosi ha ọmịiko, ha kpalikwara Jehova iwe iwe ezi omume. Gịnị si na ya pụta?

19 Jehova apụkwaghị inwe ọmịiko n’ebe ndị ya nọ. O kwupụtara, sị: “M gaghị enwe ọmịiko, M gaghị emekwa ebere, M gaghị enwekwa obi ebere, ka M wee ghara ibibi ha.” (Jeremaịa 13:14) N’ihi ya, e bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya, a dọkwaara ndị Izrel n’agha gaa Babilọn. Lee ọdachi ọ bụ mgbe ụmụ mmadụ na-emehie emehie nupụgidere isi ruo n’ókè nke na Chineke apụkwaghị inwe ọmịiko n’ebe ha nọ!—Abụ Ákwá 2:21.

20, 21. (a) Gịnị ga-eme mgbe ọmịiko Chineke ruru ná njedebe ya n’oge anyị? (b) Olee onyinye ọmịiko sitere n’aka Jehova nke a ga-atụle n’isiakwụkwọ na-esonụ?

20 Olee banyere taa? Jehova agbanwebeghị. N’ihi ọmịiko,  o nyewo Ndịàmà ya ọrụ ikwusa ‘ozi ọma nke alaeze’ n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Matiu 24:14) Mgbe ndị obi ha ziri ezi ṅara ntị na ya, Jehova na-enyere ha aka ịghọta ozi Alaeze ahụ. (Ọrụ 16:14) Ma a gaghị anọgide na-arụ ọrụ a ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gaghị abụ Jehova inwe ọmịiko bụ́ ya ikwe ka ajọ ụwa a, tinyere nhụsianya na ihe mgbu nile dị n’ime ya, dịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ọmịiko Chineke ruru ná njedebe ya, Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe megide usoro ihe a. Ọbụna n’oge ahụ, ọ ga-eme ihe n’ihi ọmịiko—ọmịiko o nwere n’ebe “aha nsọ” ya dị na nke o nwere n’ebe ndị ohu ya raara onwe ha nye ya nọ. (Ezikiel 36:20-23) Jehova ga-ekpochapụ ajọ omume nile ma webata ụwa ọhụrụ nke ezi omume. Banyere ndị ajọ omume, Jehova na-ekwu, sị: “Anya m agaghị enwe ebere, M gaghị enwekwa ọmịiko, ụzọ ha ka M ga-etinyekwasị n’isi ha.”—Ezikiel 9:10.

21 Tupu oge ahụ, Jehova na-enwe ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ, ọbụna ndị na-eche mbibi ihu. Ụmụ mmadụ na-emehie emehie bụ́ ndị nwere nchegharị n’ezie pụrụ irite uru n’otu n’ime onyinye ọmịiko kasịnụ Jehova nyeworo—mgbaghara mmehie. N’isiakwụkwọ na-esonụ, anyị ga-atụle ihe atụ ụfọdụ mara mma ndị dị n’ime Bible bụ́ ndị na-egosi otú Jehova si agbaghara mmehie kpam kpam.

^ par. 3 Otú ọ dị, n’ụzọ na-adọrọ mmasị, n’Abụ Ọma 103:13 ngwaa Hibru ahụ bụ́ ra·chamʹ na-enye echiche nke ebere, ma ọ bụ ọmịiko, nke nna na-egosi ụmụ ya.

^ par. 10 Okwu bụ́ “mkpụrụ obi Ya enweghịkwa ntachi obi” pụtara n’ụzọ nkịtị na “e mere ka mkpụrụ obi ya dị mkpụmkpụ; o nwekwaghị ndidi.” The New English Bible na-agụ, sị: “O kwekwaghị ya odidi ịnọ na-ele ọnọdụ ọjọọ nke ụmụ Izrel nọ na ya.” TanakhA New Translation of the Holy Scriptures sụgharịrị ya ịbụ: “Ọ pụkwaghị idi nhụsianya nke ụmụ Izrel.”