Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 28

“Nanị Gị Na-eguzosi Ike n’Ihe”

“Nanị Gị Na-eguzosi Ike n’Ihe”

1, 2. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na eguzosighị ike n’ihe abụghịrị Eze Devid ihe ọhụrụ?

EGUZOSIGHỊ ike n’ihe abụghịrị Eze Devid ihe ọhụrụ. N’otu oge, a gbara ọchịchị ya nọ n’ọgba aghara mgba okpuru ugboro ugboro, ndị so ná mba ya gbakwara izu imegide ya. Ọzọkwa, ụfọdụ n’ime ndị anyị ga-atụ anya na ha kwesịrị ịbụ ezigbo ndị enyi ya gbara Devid mgba okpuru. Cheedị echiche banyere Maịkal, bụ́ nwunye Devid nke mbụ. Ná mmalite, ọ “hụrụ Devid n’anya,” ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ na-akwado ya n’ihe ndị ọ na-eme dị ka eze. Otú ọ dị, ka oge na-aga, o ‘ledara ya anya n’obi ya,’ ọbụna na-ewere Devid “dị ka otu n’ime ndị ikom efu.”—1 Samuel 18:20; 2 Samuel 6:16, 20.

2 Onye ọzọ bụkwa onye ndụmọdụ Devid, bụ́ Ahitofel. E ji ndụmọdụ ya kpọrọ oké ihe dị ka a ga-asị na ọ bụ Jehova n’onwe ya nyere ya. (2 Samuel 16:23) Ma, ka oge na-aga, onye a ọ tụkwasịrị obi, onye ọ na-akọrọ izu nzuzo ya ghọrọ sabo ma sonye ná nnupụisi a haziri ahazi megide Devid. Ònyekwanụ kpaliri izu mmegide ahụ? Ọ bụ Absalọm, nwa Devid! Onye nrigbu ahụ nke na-akpa nkata ọjọọ nọgidere ‘na-ezuru obi ndị Izrel n’ohi,’ si otú ahụ mee onwe ya onye ya na eze na-asọrịta mpi. Nnupụisi Absalọm bịara sie ike nke na a manyere Eze Devid ịgba ọsọ ndụ.—2 Samuel 15:1-6, 12-17.

3. Obi ike dị aṅaa ka Devid nwere?

3 Ọ̀ bụ na ọ dịghị onye guzosiri ike n’ihe nye Devid? N’oge nile Devid nọ ná nsogbu, ọ maara n’ezie na e nwere. Ònye? Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ ma ọ bụghị Jehova Chineke. Devid kwuru banyere Jehova, sị: “N’ebe onye [“na-eguzosi ike n’ihe,” NW] nọ Ị ga-egosi Onwe gị onye [“na-eguzosi ike n’ihe,” NW].” (2 Samuel 22:26) Gịnị bụ iguzosi ike n’ihe, oleekwa otú Jehova si esetịpụ ihe nlereanya kasịnụ nke àgwà a?

 Gịnị Bụ Iguzosi Ike n’Ihe?

4, 5. (a) Gịnị bụ “iguzosi ike n’ihe”? (b) Olee ihe dị iche n’iguzosi ike n’ihe na ikwesị ntụkwasị obi?

4 “Iguzosi ike n’ihe” dị ka e si jiri ya mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ obiọma nke na-eji ịhụnanya arapagidesi ike n’ihe ma ghara ịhapụ ya ruo mgbe nzube ya n’ebe ihe ahụ dị mezuru. Ọ gụnyere ihe karịrị ikwesị ntụkwasị obi. E kwuwerị, mmadụ pụrụ ikwesị ntụkwasị obi nanị n’ihi na ọ bụ ihe ọ na-aghaghị ime. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, iguzosi ike n’ihe gbanyere mkpọrọgwụ n’ịhụnanya. * Ọzọkwa, a pụrụ iji okwu bụ́ “ikwesị ntụkwasị obi” mee ihe n’ebe ihe ndị na-adịghị ndụ dị. Dị ka ihe atụ, ọbụ abụ ahụ kpọrọ ọnwa “Onye àmà Nke nọ na mbara igwe kwesịrị ntụkwasị obi” n’ihi otú o si na-apụta mgbe nile n’abalị. (Abụ Ọma 89:37) Ma a pụghị ikwu na ọnwa na-eguzosi ike n’ihe. N’ihi gịnị? N’ihi na iguzosi ike n’ihe bụ ngosipụta nke ịhụnanya—àgwà ihe ndị na-adịghị ndụ na-apụghị igosipụta.

A kpọrọ ọnwa onye àmà na-ekwesị ntụkwasị obi, ma, ọ bụ nanị ihe ndị e kere eke nwere ọgụgụ isi pụrụ n’ezie igosipụta iguzosi ike n’ihe nke Jehova

5 N’echiche Akwụkwọ Nsọ, iguzosi ike n’ihe na-egosi mmetụta. Igosipụta ya na-egosi na e nwere mmekọrịta dịnụ n’etiti onye nwere àgwà ahụ na onye e nwere ya n’ebe ọ nọ. Iguzosi ike n’ihe dị otú ahụ adịghị abụ e gosikata ya a kwụsị igosi ya.  Ọ dịghị ka ebili mmiri nke oké ifufe na-agbanwe agbanwe na-ebugharị. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, iguzosi ike n’ihe, ma ọ bụ ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe, na-akwụsi ike ma nwee ike iji merie ihe mgbochi ndị kasị taa akpụ.

6. (a) Olee otú iguzosi ike n’ihe dịruru ụkọ n’etiti ụmụ mmadụ, oleekwa otú e si gosipụta nke a n’ime Bible? (b) Olee ụzọ kasị mma isi mụta ihe iguzosi ike n’ihe gụnyere, n’ihi gịnịkwa?

6 N’eziokwu, iguzosi ike n’ihe dị otú ahụ dị ụkọ taa. Ọtụtụ mgbe, ndị bụ́ ezi ndị enyi ‘na-ebibi onwe ha.’ N’ụzọ na-arịwanye elu, anyị na-anụ banyere ndị di ma ọ bụ ndị nwunye na-agbahapụ ndị òtù ọlụlụ ha. (Ilu 18:24; Malakaị 2:14-16) Omume aghụghọ juru nnọọ ebe nile nke na anyị pụrụ ịhụ ka anyị onwe anyị na-ekwughachi ihe ahụ Maịka onye amụma kwuru, sị: “Onye [“na-eguzosi ike n’ihe,” NW] alawo n’iyi pụọ n’ụwa.” (Maịka 7:2) Ọ bụ ezie na, ọtụtụ mgbe, ụmụ mmadụ adịghị egosi obiọma sitere n’ịhụnanya, e ji iguzosi ike n’ihe mara Jehova n’ụzọ dị ịrịba ama. N’ezie, kpọmkwem ụzọ kasị mma isi mụta ihe iguzosi ike n’ihe gụnyere bụ inyocha otú Jehova si egosipụta akụkụ a magburu onwe ya nke ịhụnanya ya.

Iguzosi Ike n’Ihe Na-enweghị Atụ nke Jehova

7, 8. Olee otú a pụrụ isi kwuo na ọ bụ nanị Jehova na-eguzosi ike n’ihe?

7 Bible na-ekwu banyere Jehova, sị: “Nanị gị na-eguzosi ike n’ihe.” (Mkpughe 15:4) Olee otú nke ahụ pụrụ isi bụrụ eziokwu? Ọ̀ bụ na ma ụmụ mmadụ ma ndị mmụọ ozi egosipụtabeghị iguzosi ike n’ihe dị ịrịba ama mgbe ụfọdụ? (Job 1:1; Mkpughe 4:8) Gịnịkwa banyere Jizọs Kraịst? Ọ́ bụghị onye bụ́ isi “na-eguzosi ike n’ihe” nye Chineke? (Abụ Ọma 16:10, NW) Oleezi otú a pụrụ isi kwuo na ọ bụ nanị Jehova na-eguzosi ike n’ihe?

8 Nke mbụ, cheta na iguzosi ike n’ihe bụ otu akụkụ nke ịhụnanya. Ebe ọ bụ na “Chineke bụ ịhụnanya”—n’ihi na ọ bụ àgwà a n’onwe ya—olee onye pụrụ igosipụta iguzosi ike n’ihe n’ụzọ zuru nnọọ ezu karịa Jehova? (1 Jọn 4:8) N’ezie, ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ pụrụ igosipụta àgwà dị iche iche nke Chineke, ma, ọ bụ nanị Jehova na-eguzosi ike n’ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasịnụ. Dị  ka “Onye ochie” ahụ, ọ nọwo na-egosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ruo ogologo oge karịa ihe ọ bụla e kere eke, n’ụwa ma ọ bụ n’eluigwe. (Daniel 7:9) N’ihi ya, Jehova bụ onye kasị eguzosi ike n’ihe. Ọ na-egosipụta àgwà a n’ụzọ ihe ọ bụla e kere eke na-apughị isi gosipụta ya. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

9. Olee otú Jehova si bụrụ onye “na-eguzosi ike n’ihe n’ọrụ ya nile”?

9 Jehova ‘[“na-eguzosi ike n’ihe,” NW] n’ọrụ Ya nile.’ (Abụ Ọma 145:17) N’ụzọ dị aṅaa? Abụ Ọma nke 136 zara ya. N’ebe ahụ, e hotara ọtụtụ ọrụ nzọpụta Jehova rụrụ, gụnyere nnapụta ahụ ọ napụtara ụmụ Izrel gabiga Oké Osimiri Uhie n’ụzọ dị ịrịba ama. N’ụzọ kwesịrị ịrịba ama, e ji nkebi ahịrịokwu bụ́: “N’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW, ma ọ bụ, iguzosi ike n’ihe] Ya dị,” mesie amaokwu nke ọ bụla nke abụ ọma a ike. Abụ ọma a so n’Ajụjụ Maka Ntụgharị Uche ndị dị na peeji nke 289. Ka ị na-agụ amaokwu ndị ahụ, ị ghaghị inwe mmasị nke ukwuu n’ọtụtụ ụzọ Jehova si gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe ndị ya nọ. Ee, Jehova na-egosipụta iguzosi ike n’ihe nye ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi site n’ịnụ mkpu nile ha na-eti maka enyemaka nakwa site n’ime ihe n’oge a kara aka. (Abụ Ọma 34:6) Ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe nke Jehova nwere n’ebe ndị ohu ya nọ adịghị ada ada ma ọ bụrụhaala na ha anọgide na-eguzosi ike n’ihe nye ya.

10. Olee otú Jehova si egosipụta iguzosi ike n’ihe n’ihe banyere ụkpụrụ ya?

10 Ọzọkwa, Jehova na-eguzosi ike n’ihe nye ndị ohu ya site n’ijigidesi ụkpụrụ ya ike. N’adịghị ka ụmụ mmadụ ụfọdụ na-adịghị eguzo otu ebe, ndị mkpali na mmetụta ọ bụla na-achịkwa, Jehova adịghị agbanwe agbanwe n’ihe ọ na-ewere dị ka ezi ihe na ihe ọjọọ. Kemgbe ọtụtụ puku afọ, echiche ya banyere ihe ndị dị ka mgbaasị, ikpere arụsị, na igbu ọchụ agbanwebeghị. “Ruo agadi Mụ onwe m bụ Onye ahụ,” ka o kwuru site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaịa. (Aịsaịa 46:4) Ya mere, anyị pụrụ inwe obi ike na anyị ga-erite uru site n’ịgbaso nduzi doro anya banyere omume nke dị n’ime Okwu Chineke.—Aịsaịa 48:17-19.

11. Nye ihe atụ iji gosi na Jehova na-emezu ihe o kwere ná nkwa.

 11 Jehova na-egosipụtakwa iguzosi ike n’ihe site n’imezu ihe ndị o kwere ná nkwa. Mgbe o buru amụma, ọ na-emezu. N’ihi ya, Jehova kwuru, sị: “Okwu m . . . nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.” (Aịsaịa 55:11) Site n’ime ihe o kwuru, Jehova na-eguzosi ike n’ihe nye ndị ya. Ọ dịghị eme ha ka ha nọrọ na-atụsi anya ihe ọ na-ebughị n’uche imezu ike. A ma Jehova ama na nke a nke na ohu ya bụ́ Jọshụa nwere ike ikwu, sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova gwara ụlọ Izrel; ha nile mere.” (Joshua 21:45) Ya mere, anyị pụrụ inwe obi ike na ọ dịghị mgbe olileanya anyị ga-akụ afọ n’ala n’ihi na Jehova emezughị nkwa ya.—Aịsaịa 49:23; Ndị Rom 5:5.

12, 13. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova ‘na-adịru mgbe ebighị ebi’?

12 Dị ka anyị kwuru na mbụ, Bible na-agwa anyị na obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova ‘na-adịru mgbe ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 136:1) N’ụzọ dị aṅaa? Otu ụzọ bụ na Jehova na-agbaghara mmehie kpam kpam. Dị ka anyị tụlere n’Isi nke 26, Jehova adịghị emegide mmadụ n’ihi mmehie ọ gbaghawooro ya n’oge gara aga. Ebe ọ bụ na “mmadụ nile emehiewo, gharakwa iru ebube Chineke,” onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị inwe ekele na obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi.—Ndị Rom 3:23.

13 Ma obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova na-adịrukwa mgbe ebighị ebi n’echiche ọzọ. Okwu ya na-asị na onye ezi omume “ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” (Abụ Ọma 1:3) Cheedị echiche osisi na-ama poko poko, nke akwụkwọ ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ! N’otu aka ahụkwa, ọ bụrụ na Okwu Chineke na-atọ anyị ụtọ n’ezie, anyị ga-adị ogologo ndụ nke dị jụụ, nke bakwara uru. Ngọzi Jehova ji iguzosi ike n’ihe na-enye ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi na-adịru mgbe ebighị ebi. N’eziokwu, n’ime ụwa  ọhụrụ ezi omume ahụ nke Jehova ga-eweta, ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga na-ahụ obiọma sitere n’ịhụnanya ya ruo mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 21:3, 4.

Jehova ‘Agaghị Ahapụ Ndị Ya Na-eguzosi Ike n’Ihe’

14. Olee otú Jehova si egosi na o ji iguzosi ike n’ihe nke ndị ohu ya akpọrọ ihe?

14 Jehova egosipụtawo iguzosi ike n’ihe ya ugboro ugboro. Ebe ọ bụ na Jehova adịghị agha agha, iguzosi ike n’ihe ọ na-egosipụta n’ebe ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi nọ adịghị ada ada. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri. N’ihi na Jehova na-ahụ ezi ikpe n’anya, Ọ dịghị ahapụkwa ndị ebere Ya [“ndị ya na-eguzosi ike n’ihe nye ya,” NW].” (Abụ Ọma 37:25, 28) N’ezie, dị ka Onye Okike, Jehova kwesịrị ka anyị fee ya ofufe. (Mkpughe 4:11) N’agbanyeghị nke ahụ, n’ihi na ọ na-eguzosi ike n’ihe, Jehova na-eji ọrụ ndị anyị ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ akpọrọ ihe.— Malakaị 3:16, 17.

15. Kọwaa otú ụzọ Jehova si mesoo ndị Izrel ihe si eme ka iguzosi ike n’ihe Ya pụta ìhè.

15 N’obiọma sitere n’ịhụnanya ya, Jehova na-enyere ndị ya aka ọtụtụ ugboro mgbe ha nọ ná nsogbu. Ọbụ abụ ahụ na-agwa anyị, sị: “Ọ na-edebe mkpụrụ obi ndị ebere Ya [“ndị ya na-eguzosi ike n’ihe,” NW]; Ọ na-anapụta ha n’aka ndị na-emebi iwu.” (Abụ Ọma 97:10) Tụlee otú o si mesoo mba Izrel. Mgbe a napụtasịrị ha n’ụzọ ọrụ ebube gabiga Oké Osimiri Uhie, ụmụ Izrel kwuru n’abụ ha bụụrụ Jehova, sị: “N’ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW, ma ọ bụ, “ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe,” nkọwa ala ala peeji nke NW] Gị ka I duworo ndị nke Ị gbapụtaworo.” (Ọpụpụ 15:13) N’ezie, nnapụta ahụ a napụtara ha gabiga Oké Osimiri Uhie ahụ bụ omume ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe n’akụkụ nke Jehova. N’ihi ya, Mozis gwara ụmụ Izrel, sị: “Ọ bụghị na unu bara ụba karịa ndị nile ka Jehova hụrụ unu n’anya sie ike, wee họpụta unu; n’ihi na unu  onwe unu dị ole na ole karịa ndị nile ọzọ: kama ọ bụ n’ihi na Jehova hụrụ unu n’anya, na n’ihi na O debere iyi Ọ ṅụụrụ nna unu hà, ka Jehova weere aka dị ike mee ka unu pụta, O wee gbapụta unu n’ụlọ ndị ohu, n’aka Fero, bụ́ eze Ijipt.”—Deuterọnọmi 7:7, 8.

16, 17. (a) Enweghị ekele dị aṅaa jọgburu onwe ya ka ụmụ Izrel gosipụtara, n’agbanyeghị nke ahụ, olee otú Jehova si gosi ha ọmịiko? (b) Olee otú ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ Izrel si gosipụta na ‘ngwọta adịghịrị’ ha, ihe atụ ịdọ aka ná ntị dịkwa aṅaa ka nke a bụ nye anyị?

16 Otú ọ dị, dị ka otu mba, ụmụ Izrel egosipụtaghị ekele maka obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova, n’ihi na mgbe a napụtasịrị ha, ‘ha nọgidere na-emehie imegide Jehova site n’inupụ isi n’okpuru Onye kachasị ihe nile elu.’ (Abụ Ọma 78:17) Ruo ọtụtụ narị afọ, ha nupụrụ isi ugboro ugboro. Ha na-ahapụ Jehova ma na-echigharịkwuru chi ụgha dị iche iche na omume nke ndị na-ekpere arụsị, bụ́ ndị nanị ihe ha rụpụtaara ha bụ mweda n’ala. Ma, Jehova emebighị ọgbụgba ndụ ya. Kama nke ahụ, site n’ọnụ Jeremaịa onye amụma, Jehova rịọrọ ndị ya, sị: “Lọta, gị Izrel nke na-adaghachi azụ . . . M gaghị edo unu iru iwe: n’ihi na onye ebere [“onye na-eguzosi ike n’ihe,” NW] ka M bụ.” (Jeremaịa 3:12) Otú ọ dị, dị ka e kwuru n’Isi nke 25, nke a akpalighị ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ụmụ Izrel ime mgbanwe. N’ezie, ha nọgidere “na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu Ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma Ya nọ.” Gịnị si na ya pụta? N’ikpeazụ, “ọnụma Jehova lara elu imegide ndị Ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.”—2 Ihe E Mere 36:15, 16.

17 Gịnị ka anyị na-amụta site na nke a? Na iguzosi ike n’ihe Jehova ekpughị isi, a pụghịkwa ịghọgbu ya. N’ezie, Jehova “na-aba ụba n’ebere [“n’obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW],” ọ na-enwekwa obi ụtọ ime ebere mgbe e nwere ihe mere ọ ga-eji mee otú ahụ. Ma, gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na onye mmehie anọgide na-eme ihe ọjọọ n’enweghị nchegharị? N’ọnọdụ dị otú ahụ, Jehova na-agbasosi ụkpụrụ ezi omume ya ike ma maa onye ahụ ikpe. Dị ka a gwara Mozis, “ọ dịghị ụzọ ọ bụla [Jehova] ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.”—Ọpụpụ 34:6, 7.

18, 19. (a) Olee otú ntaramahụhụ Jehova na-enye ndị ajọ omume si bụrụ n’onwe ya iguzosi ike n’ihe? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova ga-esi gosipụta iguzosi ike n’ihe ya nye ndị ohu ya, bụ́ ndị a kpagbuworo ruo ọnwụ?

 18 Ntaramahụhụ Chineke na-enye ndị ajọ omume bụkwa n’onwe ya iguzosi ike n’ihe. N’ụzọ dị aṅaa? A na-ahụ otu ihe na-egosipụta nke a n’akwụkwọ Mkpughe, n’ime iwu ndị ahụ Jehova nyere ndị mmụọ ozi asaa, na-asị: “Jeenụ wụpụ ọkwá asaa nke iwe Chineke n’ime ụwa.” Mgbe mmụọ ozi nke atọ wụpụrụ ọkwá ya “n’ime osimiri na isi mmiri dị iche iche,” ha ghọrọ ọbara. Mmụọ ozi ahụ sịziri Jehova: “Gị, Onye ahụ dị adị na onye dịburị, Onye na-eguzosi ike n’ihe, bụ onye ezi omume, n’ihi na i mewo mkpebi ndị a, n’ihi na ha wụfuru ọbara nke ndị nsọ na nke ndị amụma, i nyewokwa ha ọbara ka ha ṅụọ. O kwesịrị ha.”—Mkpughe 16:1-6.

Jehova ga-eji iguzosi ike n’ihe cheta ma mee ka ndị guzosiworo ike n’ihe ọbụna ruo n’ọnwụ si n’ọnwụ bilie

19 Rịba ama na mgbe ọ nọ na-akpọsa ozi ikpe ọmụma ahụ, mmụọ ozi ahụ zoro aka n’ebe Jehova nọ dị ka “Onye na-eguzosi ike n’ihe.” N’ihi gịnị? N’ihi na site n’ibibi ndị ajọ omume, Jehova na-egosi iguzosi ike n’ihe nye ndị ohu ya, bụ́ ndị a kpagbuworo ọtụtụ n’ime ha ruo ọnwụ. Jehova ji iguzosi ike n’ihe na-echeta ndị dị otú ahụ. Ọ na-agụsi ya agụụ ike  ịhụ ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi nwụrụ anwụ ọzọ, Bible na-egosipụtakwa na nzube ya bụ iji mbilite n’ọnwụ kwụọ ha ụgwọ ọrụ. (Job 14:14, 15) Jehova adịghị echefu ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe nanị n’ihi na ha adịkwaghị ndụ. Kama ime otú ahụ, “nye ya, ha nile dị ndụ.” (Luk 20:37, 38) Nzube Jehova nke bụ́ ime ka ndị nile ọ na-echeta dịghachi ndụ bụ ihe àmà dị ike nke na-egosi iguzosi ike n’ihe ya.

Ndị Nazi gburu Bernard Luimes (n’aka ekpe) na Wolfgang Kusserow (n’etiti)

Otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ji ube magbuo Moses Nyamussua (n’aka nri)

Ịhụnanya Na-eguzosi Ike n’Ihe nke Jehova Na-emeghe Ụzọ Maka Nzọpụta

20. Olee ndị bụ “arịa ndị dịịrị ebere,” oleekwa otú Jehova si gosipụta iguzosi ike n’ihe nye ha?

20 N’akụkọ ihe mere eme nile, Jehova egosipụtawo iguzosi ike n’ihe dị ịrịba ama n’ebe ụmụ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi nọ. N’ezie, ruo ọtụtụ puku afọ, Jehova ‘ejiwo ogologo ntachi obi dị ukwuu hapụ arịa ndị dịịrị ọnụma, bụ́ ndị e mere ka ha kwesị mbibi.’ N’ihi gịnị? “Ka o wee mee ka a mara akụ̀ nke ebube  ya n’ebe arịa ndị dịịrị ebere dị, bụ́ ndị ọ kwadebere maka ebube tupu oge eruo.” (Ndị Rom 9:22, 23) ‘Arịa ndị a dịịrị ebere’ bụ ndị nwere ezi ọchịchọ obi, bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ịbụ ndị ha na Kraịst ga-eketakọ ihe n’Alaeze ya. (Matiu 19:28) Site n’imeghere arịa ndị a dịịrị ebere ụzọ nzọpụta, Jehova nọgidere na-eguzosi ike n’ihe nye Ebreham, bụ́ onye o kwere nkwa a bụ́ ọgbụgba ndụ, sị: “Ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.”—Jenesis 22:18.

N’ihi iguzosi ike n’ihe Jehova, ndị ohu ya nile na-ekwesị ntụkwasị nwere olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu

21. (a) Olee otú Jehova si egosi iguzosi ike n’ihe nye “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị nwere ohere nke isi “n’oké mkpagbu ahụ” pụta? (b) Gịnị ka iguzosi ike n’ihe Jehova na-akpali gị ime?

21 Jehova na-egosi iguzosi ike n’ihe yiri nke ahụ nye “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị nwere ohere nke isi “n’oké mkpagbu ahụ” pụta nakwa nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa paradaịs. (Mkpughe 7:9, 10, 14) Ọ bụ ezie na ndị ohu ya ezughị okè, Jehova ji iguzosi ike n’ihe na-enye ha ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Olee otú o si na-eme nke ahụ? Ọ bụ site n’ihe mgbapụta ahụ—ngosipụta kasịnụ nke iguzosi ike n’ihe Jehova. (Jọn 3:16; Ndị Rom 5:8) Iguzosi ike n’ihe Jehova na-adọta ndị agụụ ezi omume na-agụ n’ime obi ha. (Jeremaịa 31:3) Ị́ dịghị enwe mmetụta nke ịbịaru Jehova nso karị n’ihi oké iguzosi ike n’ihe o gosiworo na nke ọ ka ga-egosi? Ebe ọ bụ ọchịchọ anyị ịbịaru Chineke nso, ka anyị mee ihe banyere ịhụnanya ya site n’iwusikwu mkpebi anyị mere iji iguzosi ike n’ihe na-ejere ya ozi ike.

^ par. 4 N’ụzọ na-adọrọ mmasị, n’ebe ndị ọzọ, a sụgharịrị okwu a sụgharịrị “iguzosi ike n’ihe” na 2 Samuel 22:26 (NW) ịbụ “obiọma sitere n’ịhụnanya” ma ọ bụ “ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe.”