Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 27

“Lee Ka Ịdị Mma Ya Si Dị Ukwuu!”

“Lee Ka Ịdị Mma Ya Si Dị Ukwuu!”

1, 2. Ókè ha aṅaa ka ịdị mma Chineke saruru mbara, oleekwa otú Bible si emesi àgwà a ike?

MMADỤ ole na ole malitere ịbụ enyi eri ogologo oge nọ n’èzí n’uhuruchi, na-erikọ nri ọnụ, na-achị ọchị, na-akọrị akụkọ ka ha ji obi ụtọ na-ekiri anwụ ahụ na-ada ada. N’ebe dị anya site n’ebe ahụ, otu onye ọrụ ugbo lere anya n’ubi ya, mụmụo ọnụ ọchị n’obi ụtọ n’ihi na mmiri eruola, mmiri ozuzo mbụ na-ezokwasịkwa ihe ndị ọ kụrụ, bụ́ ndị ụkọ mmiri ji aka ọjọọ. N’ebe ọzọ, otu di na nwunye nwere obi ụtọ ịhụ ka nwa ha malitere ịzọpụ ụkwụ ije ya mbụ ndị na-ama jijiji.

2 Ma ha maara ma ha amaghị, ha nile na-erite uru site n’otu ihe—ịdị mma Jehova Chineke. Ọtụtụ mgbe, ndị ji okpukpe kpọrọ ihe na-ekwu sị, “Chineke dị mma.” Bible mesiri ya nnọọ ike karị. Ọ na-asị: “Lee ka ịdị mma Ya si dị ukwuu!” (Zekaraịa 9:17) Ma o yiri ka ọ bụ mmadụ ole na ole taa maara n’ezie ihe okwu ndị ahụ pụtara. Gịnị ka ịdị mma Jehova Chineke na-agụnye n’ezie, oleekwa otú àgwà a nke Chineke si emetụta onye ọ bụla n’ime anyị?

Akụkụ Dị Ịrịba Ama nke Ịhụnanya Chineke

3, 4. Gịnị bụ ịdị mma, n’ihi gịnịkwa ka a pụrụ iji kọwaa ịdị mma Jehova n’ụzọ kasị mma dị ka ngosipụta nke ịhụnanya Chineke?

3 N’ọtụtụ asụsụ ndị a na-asụ n’oge a, “ịdị mma” bụ okwu pụtara ọtụtụ ihe. Otú ọ dị, dị ka e kpughere n’ime Bible, ịdị mma abụghị okwu pụtara ọtụtụ ihe ma ọlị. N’ụzọ bụ́ isi, ọ na-ezo aka n’omume ọma. Ya mere, n’otu echiche, anyị pụrụ ikwu na Jehova jupụtara n’ịdị mma. Àgwà ya nile—gụnyere ike ya, ikpe ziri ezi ya, na amamihe ya—dịcha mma n’ụzọ nile. N’agbanyeghị nke ahụ, a pụrụ ịkọwa ịdị mma n’ụzọ kasị mma dị ka ngosipụta nke ịhụnanya Jehova. N’ihi gịnị?

4 Ịdị mma bụ àgwà a na-egosi ndị ọzọ site n’omume. Pọl  onyeozi gosiri na n’ebe ụmụ mmadụ nọ, na ọ na-adọrọ adọrọ ọbụna karịa ezi omume. (Ndị Rom 5:7) A pụrụ ịtụ anya ka onye ezi omume jiri ikwesị ntụkwasị obi gbasosie ihe iwu kwuru ike, ma onye dị mma na-eme ihe karịrị nke ahụ. Ọ na-ebute ụzọ n’ime ihe, na-achọ ụzọ isi mee ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Dị ka anyị gaje ịhụ, Jehova dị mma n’ezie n’echiche ahụ. N’ụzọ doro anya, ịdị mma dị otú ahụ na-esite n’ịhụnanya a na-akparaghị ókè nke Jehova.

5-7. N’ihi gịnị ka Jizọs na-ejighị kwe ka a kpọọ ya “Ezi Onye Ozizi,” eziokwu dịkwa aṅaa gbara ọkpụrụkpụ ka o si otú ahụ kwadoo?

5 Jehova pụkwara iche n’ịdị mma ya. Oge na-adịghị anya tupu Jizọs anwụọ, otu nwoke bịakwutere ya ịbịa jụọ ya ajụjụ wee kpọọ ya “Ezi Onye Ozizi.” Jizọs zaghachiri, sị: “Gịnị mere i ji akpọ m ezi onye? Ọ dịghị onye bụ ezi onye, ma e wezụga otu onye, bụ́ Chineke.” (Mak 10:17, 18) Ihe ahụ ọ zara pụrụ iju gị anya. N’ihi gịnị ka Jizọs ga-eji gbazie nwoke ahụ olu? Ọ̀ bụ na Jizọs abụghị “Ezi Onye Ozizi” n’ezie?

6 N’ụzọ doro anya, nwoke ahụ ji okwu ahụ bụ́ “Ezi Onye Ozizi” mee ihe dị ka utu aha iji nye otuto ọnụ efu. Jizọs ji ịdị umeala n’obi wegara Nna ya nke eluigwe, bụ́ onye dị mma n’echiche kasịnụ, otuto dị otú ahụ. (Ilu 11:2) Ma Jizọs nọkwa na-akwado otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ. Ọ bụ nanị Jehova bụ ihe nlereanya nke ịdị mma. Ọ bụ nanị ya nwere ikike kasịnụ ikpebi ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. Adam na Iv chọrọ iweghara ikike ahụ n’onwe ha site n’iji nnupụisi rie mkpụrụ nke osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ ahụ. N’adịghị ka ha, Jizọs ji ịdị umeala n’obi hapụrụ Nna ya ọrụ isetịpụ ụkpụrụ nke ịdị mma.

7 Ọzọkwa, Jizọs maara na ọ bụ Jehova bụ onye ihe nile dị mma si n’aka n’ezie. Ọ bụ ya bụ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè.” (Jems 1:17) Ka anyị nyochaa otú ịdị mma Jehova si apụta ìhè ná mmesapụ aka ya.

Ihe Àmà nke Ịdị Mma Bara Ụba nke Jehova

8. Olee otú Jehova siworo gosi ihe nile a kpọrọ mmadụ ịdị mma?

8 Onye ọ bụla dịworo ndụ eritewo uru n’ịdị mma Jehova. Abụ Ọma 145:9 na-ekwu, sị: “Jehova dị mma n’ebe ihe nile  e kere eke dị.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Olee ihe atụ ụfọdụ nke ịdị mma ya na-eru mmadụ nile? Bible na-asị: “Ọ hapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma, na-enye unu mmiri ozuzo site n’eluigwe na oge mkpụrụ ji amị, na-emejupụta obi unu n’ihe oriri na ezi obi ụtọ.” (Ọrụ 14:17) Ì nwetụwo nnọọ obi ụtọ mgbe ị na-eri nri dị ụtọ? E wezụga ịdị mma Jehova gosipụtara n’ike ụwa a nakwa mmiri dị ọcha dị n’ime ya, bụ́ nke a na-eme mgbe nile ka ọ dịghachi ọcha nakwa “oge mkpụrụ ji amị” iji na-emepụta ihe oriri n’ụba, a garaghị na-eri nri. Jehova na-egosi mmadụ nile ịdị mma dị otú ahụ, ọ bụghị nanị ndị hụrụ ya n’anya. Jizọs sịrị: “Ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri na-ezokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.”—Matiu 5:45.

Jehova “na-enye unu mmiri ozuzo site n’eluigwe na oge mkpụrụ ji amị”

9. Olee otú mkpụrụ osisi apụl si egosipụta ịdị mma Jehova?

9 Ọtụtụ ndị adịghị eji oké mmesapụ aka a na-egosi ihe a  kpọrọ mmadụ akpọrọ ihe n’ihi na anwụ nọgidere na-acha, a na-enwe mmiri ozuzo, na oge mkpụrụ ji amị. Dị ka ihe atụ, cheedị echiche banyere mkpụrụ osisi apụl. Ọ bụ mkpụrụ osisi a na-ahụkarị n’ógbè nile anwụ na-adịghị achasi ike na ha n’ụwa. Ma, ọ mara mma, na-atọ ụtọ, nweekwa nnọọ mmiri na-enye ume ndụ na ihe ndị dị oké mkpa na-edozi ahụ́. Ị̀ maara na n’ụwa nile, e nwere ihe dị ka ụdị mkpụrụ osisi apụl 7,500, malite ná ndị na-acha ọbara ọbara ruo ná ndị na-acha ọlaedo ọlaedo ruo ná ndị na-acha odo odo ruo ná ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, malitekwa na ndị ji ntakịrị ihe kara mkpụrụ cherry ruo ná ndị ha ka grep? Ọ bụrụ na i jide mkpụrụ nke osisi apụl pere mpe n’aka gị, ọ na-eyi ihe na-abaghị uru. Ma otu n’ime osisi ndị kasị mma na-esi na  ya etolite. (Abụ nke Abụ 2:3) N’oge opupu ihe ubi ọ bụla, osisi apụl na-ama ifuru n’ụba; n’oge mgbụsị akwụkwọ ọ bụla, ọ na-amị mkpụrụ. Kwa afọ—ruo ihe dị ka afọ 75—otu osisi apụl ga-amị mkpụrụ nwere ike iju katọn 20 nke ịdị arọ otu katọn n’ime ha bụ kilogram 19!

Osisi nke ndị mmadụ pụrụ isi na ya na-enweta ihe oriri ma na-enwe obi ụtọ ruo ọtụtụ iri afọ na-esi ná mkpụrụ a pere nnọọ mpe epulite

10, 11. Olee otú ikike dị iche iche nke ịmata ihe si egosipụta ịdị mma Chineke?

10 N’ịdị mma ya na-enweghị nsọtụ, Jehova enyewo anyị ahụ́ nke ‘e ji ihe dị iche iche dị egwu mee,’ nke nwere ikike dị iche iche nke ịmata ihe bụ́ ndị e mere iji nyere anyị aka ịghọta ọrụ ya na inweta obi ụtọ na ha. (Abụ Ọma 139:14) Cheedị echiche ọzọ banyere ọnọdụ ndị ahụ a kọwara ná mmalite isiakwụkwọ a. Olee ihe ndị a hụrụ bụ́ ndị na-eme ka oge ndị ahụ bụrụ ndị na-enye ọṅụ? Nwatakịrị obi dị nnọọ ụtọ. Mmiri ozuzo nke na-ezo n’ubi. Ọdịda anyanwụ nke na-acha ọbara ọbara, ọlaedo ọlaedo, na anụnụ anụnụ. E mere anya mmadụ ịhụ ihe karịrị àgwà 300,000! Ikike ịnụ ihe anyị na-emekwa ka anyị ghọta ụda dịgasị iche iche nke ụda olu mara mma, ụda ifufe ka ọ na-efefere osisi, na ọchị obi ụtọ nke nwa na-amụ ije. Gịnị mere anyị ji enwe ike na-ahụ ihe ndị dị otú ahụ, na-anụkwa ụda ndị dị otú ahụ bụ́ ndị na-enye anyị obi ụtọ? Bible na-ekwu, sị: “Ntị nke na-anụ ihe, na anya nke na-ahụ ụzọ, Jehova emewo ọbụna ha abụọ.” (Ilu 20:12) Ma ndị a bụ nanị abụọ n’ime ikike ịmata ihe ndị anyị nwere.

11 Ikike ịnụ ísì bụ ihe àmà ọzọ nke ịdị mma Jehova. Imi mmadụ pụrụ ịnụ ihe dị ka ụdị ísì 10,000. Cheedị echiche banyere nanị ole na ole n’ime ha: nri kasị amasị gị nke a ka na-esi esi, okooko osisi, mkpá akwụkwọ ndị dara n’ala, ntakịrị anwụrụ ọkụ si n’ebe e menwuru ọkụ a na-anya anya. Ikike i nwere ịmata mgbe ihe mesara gị n’ahụ́ na-eme ka i nwee ike ịmata mgbe ikuku fesara gị n’ihu, inwe mmetụta nke mmakụ na-emesi obi ike nke onye ị hụrụ n’anya makụrụ gị, ịmata otú mkpụrụ osisi i ji n’aka si akwọ mụrụmụrụ n’ụzọ na-enye obi ụtọ. Mgbe ị tabiiri ya, ikike i nwere ịnụ ụtọ ihe na-amalite ịrụ ọrụ. Ị na-anụ ụdị ụtọ dị iche iche nke mkpụrụ osisi ahụ ka ikike gị nke ịnụ ụtọ ihe na-eme ka ị nụ ụtọ nke ihe dị iche iche  mejupụtara mmiri mkpụrụ osisi ahụ. Ee, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji tie banyere Jehova, sị: “Lee ka [ịdị mma, NW] Gị si baa ụba, nke Ị tụkọbaworo nye ndị na-atụ egwu Gị.” (Abụ Ọma 31:19) Otú ọ dị, olee otú Jehova siworo ‘tụkọbara’ ndị na-atụ egwu Chineke ịdị mma?

Ịdị Mma nke Nwere Abamuru Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi

12. Olee ihe ndị Jehova na-enye anyị bụ́ ndị kasị mkpa, n’ihi gịnịkwa?

12 Jizọs kwuru, sị: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị nanị n’achịcha ka mmadụ ga-esi dị ndụ, kama ọ bụ n’okwu ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta.’” (Matiu 4:4) N’ezie, ihe ime mmụọ ndị Jehova na-enye anyị pụrụ ịbara anyị uru ọbụna karịa ndị nke anụ ahụ́, n’ihi na ha na-eduba ná ndụ ebighị ebi. N’Isi nke 8 nke akwụkwọ a, anyị hụrụ na Jehova ejiriwo ike mweghachi ya mee ihe n’ụbọchị ikpeazụ ndị a iji mee ka e nwee paradaịs ime mmụọ. Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ a na-ahụ na paradaịs ahụ bụ ụbara nri ime mmụọ.

13, 14. (a) Gịnị ka Izikiel onye amụma hụrụ n’ọhụụ, gịnịkwa ka ọ pụtara nye anyị taa? (b) Onyinye ime mmụọ dịgasị aṅaa ndị na-enye ndụ ka Jehova na-enye ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi?

13 N’otu n’ime oké amụma mweghachi ndị dị na Bible, e mere ka Izikiel onye amụma hụ ọhụụ nke ụlọ nsọ e weghachiri eweghachi, nke e mekwara ka ọ dị ebube. Mmiri si n’ụlọ nsọ ahụ na-asọpụta, na-asawanye mbara ma na-adịwanye ogbu ka ọ na-asọ na-aga ruo mgbe ọ ghọrọ “osimiri abụọ.” N’ebe ọ bụla ọ sọọrọ gafee, osimiri ahụ na-eweta ngọzi. N’akụkụ ya abụọ, e nwere osisi ndị e si na ha na-enweta ihe oriri na ihe iji gwọọ ọrịa. Osimiri ahụ ọbụna mekwara ka e nwee ihe ndị dị ndụ n’ime osimiri nnu ahụ, nke na-enweghị ihe dị ndụ n’ime ya, bụ́ Osimiri Nwụrụ Anwụ! (Ezikiel 47:1-12) Ma gịnị ka ihe a nile pụtara?

14 Ọhụụ ahụ pụtara na Jehova ga-eweghachi ndokwa o mere maka ezi ofufe, dị ka ụlọ nsọ ahụ Izikiel hụrụ n’ọhụụ sere onyinyo ya. Dị ka osimiri ahụ a hụrụ n’ọhụụ, onyinye Chineke maka ndụ ga na-asọpụtara ndị ya n’ụzọ ga-anọgide  na-abawanye ụba. Kemgbe e weghachiri ofufe dị ọcha na 1919, Jehova enyewo ndị ya onyinye dị iche iche maka ndụ. N’ụzọ dị aṅaa? Bible, akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, nzukọ dị iche iche, na mgbakọ dị iche iche enyewo aka n’ime ka eziokwu ndị dị oké mkpa ruo ọtụtụ nde mmadụ aka. Site n’ụzọ ndị dị otú ahụ, Jehova akụziworo ndị mmadụ banyere onyinye kasị mkpa o nyere maka ndụ—àjà mgbapụta Kraịst, bụ́ nke na-eme ka mmadụ dị ọcha n’anya Jehova, na-emekwa ka ndị nile hụrụ Chineke n’anya n’ezie ma na-atụ egwu ya nwee olileanya maka ndụ ebighị ebi. * N’ihi ya, n’ime ụbọchị ikpeazụ a nile, ka ụwa nọ n’ụnwụ nri n’ụzọ ime mmụọ, ndị Jehova nọ na-eriju afọ n’ụzọ ime mmụọ.—Aịsaịa 65:13.

15. N’echiche dị aṅaa ka ịdị mma Jehova ga-erutere ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst?

15 Ma osimiri ahụ Izikiel hụrụ n’ọhụụ agaghị akwụsị ịsọ mgbe usoro ihe ochie a bịara ná njedebe. Kama nke ahụ, ọ ga-asọkwu n’ụzọ buru ibu ọbụna karị n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst. Mgbe ahụ, site n’Alaeze Mezaịa ahụ, Jehova ga-eji uru nke àjà Jizọs mee ihe n’ụzọ zuru ezu, jiri nke nta nke nta mee ka ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị zuo okè. Lee ka anyị ga-esi ṅụrịa ọṅụ mgbe ahụ n’ihi ịdị mma Jehova!

Akụkụ Ndị Ọzọ nke Ịdị Mma Jehova

16. Olee otú Bible si egosi na ịdị mma Jehova gụnyere àgwà ndị ọzọ, gịnịkwa bụ ụfọdụ n’ime ha?

16 Ịdị mma Jehova na-agụnye ihe karịrị imesapụ aka. Chineke gwara Mozis, sị: “Mụ onwe m ga-eme ka ịdị mma m nile gabiga n’ihu gị, M ga-akpọkwa òkù banyere aha Jehova n’ihu gị.” Ihe ndekọ ahụ mesịrị kwuo, sị: “Jehova wee gabiga n’ihu ya, kpọọ òkù, sị, Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,  Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 33:19; 34:6) Ya mere, ịdị mma Jehova gụnyere ọtụtụ àgwà mara mma. Ka anyị tụlee nanị abụọ n’ime ha.

17. Gịnị bụ ime amara, oleekwa otú Jehova siworo gosi ya ụmụ mmadụ nkịtị na-ezughị okè?

17 “Na-eme amara.” Àgwà a na-ekpughere anyị ihe dị ukwuu banyere ụzọ Jehova si emeso ihe ndị o kere eke ihe. Kama ịbụ onye na-adịghị echebara mmetụta nke ndị ọzọ echiche, onye obi kpọrọ nkụ, ma ọ bụ onye ọchịchị aka ike, dị ka ndị nwere ikike na-emekarị, Jehova dị nwayọọ ma nwee obiọma. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara Ebram, sị: “Biko, welie anya gị abụọ, si n’ọnọdụ a, ebe gị onwe gị nọ, lee anya n’Ugwu na na Ndịda na n’Ihu anyanwụ na n’Ọdịda anyanwụ.” (Jenesis 13:14) Ọtụtụ nsụgharị na-ewepụ okwu ahụ bụ́ “biko.” Ma ndị ọkà mmụta nke Bible na-ekwu na okwu ahụ n’asụsụ Hibru e ji dee Bible nwere okwu ndị na-eme ka okwu ahụ gbanwee site n’ịbụ inye iwu gaa n’ịbụ arịrịọ obiọma. E nwere ihe atụ ndị ọzọ yiri ya. (Jenesis 31:12; Ezikiel 8:5) Cheedị echiche, Eze eluigwe na ala ịsị ụmụ mmadụ nkịtị “biko”! N’ime ụwa ebe imeso ndị ọzọ ihe n’obi ọjọọ, ịchụ ihe ọkụ ọkụ gabiga ókè, na enweghị nkwanye ùgwù jupụtara, ọ́ bụghị ihe na-enye obi ụtọ ịtụgharị uche n’otú Chineke anyị, bụ́ Jehova, si eme amara?

18. N’echiche dị aṅaa ka Jehova ‘na-aba ụba n’eziokwu,’ n’ihi gịnịkwa ka okwu ndị ahụ ji emesi obi ike?

18 ‘na-aba ụba n’eziokwu.’ Emeghị ihe n’eziokwu aghọwo omume jupụtara n’ụwa taa. Ma Bible na-echetara anyị, sị: “Chineke abụghị mmadụ, nke Ọ ga-ekwu okwu ụgha.” (Ọnụ Ọgụgụ 23:19) N’ezie, Taịtọs 1:2 na-ekwu na ‘Chineke apụghị ịgha ụgha.’ Ịdị mma ya agaghị ekwe ma ọlị ka o mee otú ahụ. Ya mere, a pụrụ ịtụkwasị nkwa dị iche iche Jehova kwere obi n’ụzọ nile; ihe ọ bụla o kwuru aghaghịkwa imezu mgbe nile. Ọbụna na a kpọrọ Jehova “Chineke nke eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) Ọ bụghị nanị na ọ dịghị agha ụgha, kama ọ na-eme ka e nwee eziokwu n’ụba. Ọ dịghị ejichi ihe ọmụma, ma ọ bụ na-ezochi ya; kama nke ahụ, ọ na-eme ka ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi mụta ihe n’ụba site n’amamihe ya na-enweghị  nsọtụ. * Ọ na-akụziri ha ọbụna ụzọ isi bie ndụ kwekọrọ n’eziokwu ahụ ọ na-eme ka ha mụta ka ha wee nwee ike ‘ịnọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ.’ (3 Jọn 3) N’ozuzu, mmetụta dị aṅaa ka ịdị mma Jehova kwesịrị inwe n’ebe anyị nọ n’otu n’otu?

‘Gbukepụ n’Ihi Ịdị Mma nke Jehova’

19, 20. (a) Olee otú Setan si gbalịa imebi obi ike Iv nwere n’ịdị mma Jehova, gịnịkwa si na ya pụta? (b) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ịdị mma Jehova kwesịrị inwe mmetụta dị aṅaa n’ahụ́ anyị, n’ihi gịnịkwa?

19 Mgbe Setan nwara Iv ọnwụnwa n’ogige Iden, ọ malitere site n’iji aghụghọ mebie obi ike o nwere n’ịdị mma Jehova. Jehova gwararị Adam, sị: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a a gbara ogige ka ị ga na-eri eri.” N’ime ọtụtụ puku osisi ndị na-aghaghị ịchọworị ubi ahụ mma, ọ bụ nanị otu ka Jehova sịrị ha akpala aka. Ma, rịba ama otú Setan si jụọ Iv ajụjụ mbụ ọ jụrụ ya: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a a gbara ogige?” (Jenesis 2:9, 16; 3:1) Setan tụgharịrị ihe Jehova kwuru iji mee ka Iv chee na ọ dị ihe ọma Jehova na-egbochi ya inweta. N’ụzọ dị mwute, atụmatụ ahụ gara nke ọma. Iv, dị ka ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom ndị ọzọ dịrị ndụ mgbe ọ nwụsịrị, malitere inwe obi abụọ banyere ịdị mma Chineke, bụ́ onye nyere ya ihe nile o nwere.

20 Anyị maara oké ihe mgbu na nhụsianya obi abụọ dị otú ahụ kpatara. Ya mere, ka anyị buru ihe e kwuru na Jeremaịa 31:12 (NW) n’uche: ‘Ha ga na-egbukepụ egbukepụ n’ezie n’ihi ịdị mma Jehova.’ N’ezie, ịdị mma Jehova kwesịrị ime ka anyị na-egbukepụ egbukepụ n’ihi ọṅụ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị kwesịrị ịdị na-enyo ebumnobi nke Chineke anyị enyo, bụ́ onye jupụtara nnọọ n’ịdị mma. Anyị pụrụ ịtụkwasị ya obi n’ụzọ zuru ezu, n’ihi na ọ dịghị ihe ọzọ ọ chọrọ ma ọ bụghị ka ndị hụrụ ya n’anya nweta ihe kasị mma.

21, 22. (a) Olee ụzọ ụfọdụ ị ga-achọ isi meghachi omume n’ịdị mma Jehova? (b) Àgwà dị aṅaa ka anyị ga-atụle n’isiakwụkwọ na-esonụ, oleekwa otú o si dị iche n’ịdị mma?

 21 Ọzọkwa, mgbe anyị nwere ohere ịgwa ndị ọzọ okwu banyere ịdị mma Chineke, anyị na-enwe obi ụtọ. Banyere ndị Jehova, Abụ Ọma 145:7 na-asị: “Ncheta nke ịba ụba nke ịdị mma Gị ka ha ga-ekwuwa.” Ụbọchị ọ bụla anyị dị ndụ, anyị na-erite uru n’ụzọ ụfọdụ site n’ịdị mma Jehova. Gịnị ma i mee ka ọ bụrụ omume gị ikele Jehova kwa ụbọchị maka ịdị mma ya, na-akpọ okwu aha ruo ókè o kwere mee? Iche banyere àgwà ahụ, ikele Jehova maka ya kwa ụbọchị, na ịgwa ndị ọzọ banyere ya ga-enyere anyị aka iṅomi Chineke anyị dị mma. Ka anyị na-achọkwa ụzọ isi na-eme ihe ọma, dị ka Jehova na-eme, anyị ga-anọgide na-abịarukwu ya nso. Onyeozi ahụ meworo agadi bụ́ Jọn dere, sị: “Onye m hụrụ n’anya, bụrụ onye na-eṅomi, ọ bụghị ihe ọjọọ, kama ihe ọma. Onye na-eme ihe ọma sitere na Chineke.”—3 Jọn 11.

22 E jikọtakwara ịdị mma Jehova na àgwà ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, Chineke “na-aba ụba n’ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW],” ma ọ bụ ịhụnanya nke na-eguzosi ike n’ihe. (Ọpụpụ 34:6) Àgwà a abụghị maka onye ọ bụla otú ịdị mma bụ, n’ihi na Jehova na-egosi ya karịsịa n’ebe ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi nọ. N’isiakwụkwọ na-esonụ, anyị ga-amụta otú o si eme nke a.

^ par. 14 Ọ dịghị ihe atụ ọzọ a pụrụ inwe banyere ịdị mma Jehova nke pụrụ ịkarị ihe mgbapụta ahụ. N’ime ọtụtụ nde ndị mmụọ nile e kere eke ọ pụrụ isi n’etiti ha họrọ otu onye, Jehova họọrọ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, onye ọ mụrụ nanị ya, ka ọ nwụọ n’ihi anyị.

^ par. 18 N’inwe ezi ihe kpatara ya, Bible na-ejikọta eziokwu na ìhè. “Zipụta ìhè Gị na eziokwu Gị,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ n’abụ. (Abụ Ọma 43:3) Jehova na-amụkwasị ndị dị njikere ịbụ ndị o ziri ihe, ma ọ bụ ịbụ ndị o mere ka ha mụta ihe, ìhè ime mmụọ.—2 Ndị Kọrint 4:6; 1 Jọn 1:5.