Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 23

“O Bu Ụzọ Hụ Anyị n’Anya”

“O Bu Ụzọ Hụ Anyị n’Anya”

1-3. Gịnị bụ ihe ụfọdụ mere ka ọnwụ Jizọs dị iche n’ọnwụ onye ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme?

OTU ụbọchị n’oge opupu ihe ubi, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, e kpere otu nwoke aka ya dị ọcha ikpe, maa ya ikpe maka mpụ ọ na-emeghị ma ọlị, ma tagide ya ahụhụ ruo mgbe ọ nwụrụ. Ọ bụghị ya bụ nke mbụ e ji obi ọjọọ gbuo mmadụ n’ụzọ na-ezighị ezi n’akụkọ ihe mere eme; n’ụzọ dị mwute, ọ bụghịkwa ya bụ nke ikpeazụ. Ma, ọnwụ nwoke ahụ dị iche n’ọnwụ onye ọ bụla ọzọ.

2 Ka nwoke ahụ nọ na-ata ahụhụ n’awa ndị ikpeazụ ya ndị o ji ezé kpee ekwere na ha, eluigwe nkịtị gosiri ịdị mkpa nke ihe omume ahụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ n’etiti ehihie, ọchịchịrị gbara na mberede n’ala ahụ. Dị ka otu ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo ya, “ìhè anyanwụ apụtaghị.” (Luk 23:44, 45) Mgbe ahụ, nwa oge tupu nwoke ahụ ekubie ume, o kwuru okwu ndị a a na-apụghị ichefu echefu: “E mechawo ya!” N’ezie, site n’ịtọgbọ ndụ ya, o mezuru otu ihe dị ebube. Àjà ọ chụrụ bụ omume ịhụnanya kachasị mmadụ ọ bụla metụworo.—Jọn 15:13; 19:30.

3 N’ezie, nwoke ahụ bụ Jizọs Kraịst. Ahụhụ ọ tara na ọnwụ ọ nwụrụ n’ụbọchị ọjọọ ahụ, bụ́ Naịsan 14, 33 O.A., bụ ihe a maara nke ọma. Otú ọ dị, a na-eleghara otu eziokwu dị mkpa anya ọtụtụ mgbe. Ọ bụ ezie na Jizọs tara ahụhụ nke ukwuu, ọ dị onye ọzọ tara ahụhụ ọbụna karịa ya. N’ezie, onye ọzọ chụrụ ọbụna àjà ka ukwuu n’ụbọchị ahụ—omume ịhụnanya kachasịnụ onye ọ bụla metụworo n’eluigwe na ala. Gịnị ka o mere? Azịza ya bụ okwu mmeghe kwesịrị ekwesị nke isiokwu kasị mkpa: ịhụnanya Jehova.

Omume Ịhụnanya Kasịnụ

4. Olee otú otu onye agha Rom si bịa ghọta na Jizọs abụghị mmadụ nkịtị, gịnịkwa ka onye agha ahụ kwubiri?

4 Ma ọchịchịrị nke gbara tupu Jizọs anwụọ ma oké ala ọma jijiji  nke mere mgbe ọ nwụsịrị juru ọchịagha ndị Rom nke e nyere ọrụ ịhụ maka ogbugbu e gburu Jizọs, anya. Ọ sịrị: “N’ezie onye a bụ Ọkpara Chineke.” (Matiu 27:54) O doro anya na Jizọs abụghị mmadụ nkịtị. Onye agha ahụ nyere aka gbuo Ọkpara Chineke Onye Kasị Ihe Nile Elu mụrụ nanị ya! Olee nnọọ otú Ọkpara a dịruru oké ọnụ ahịa nye Nna ya?

5. Olee otú a pụrụ isi maa atụ nnukwute oge Jehova na Ọkpara ya nọkọworo n’eluigwe?

5 Bible kpọrọ Jizọs, “onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Cheedị echiche—Ọkpara Jehova dị adị tupu eluigwe na ala nkịtị amalite ịdị. Ya bụrụ otú ahụ, ogologo oge ha aṅaa ka Nna ahụ na Ọkpara ahụ nọkọworo? Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na eluigwe na ala dị ijeri afọ 13. Ị̀ pụrụ ọbụna iji uche gị chee otú afọ ahụ ha n’ogologo? Iji nyere ndị mmadụ aka ịghọta afọ ole eluigwe na ala dịworo dị ka ndị ọkà mmụta sayensị na-eche, otu ụlọ ebe a na-egosi ụwa mbara ígwé dị iche iche na otú ha si agagharị nwere otu eriri e ji agụ oge, nke dị mita 110 n’ogologo. Ka ndị bịara ilegharị anya na-aga ije n’akụkụ eriri ahụ, ụkwụ ọ bụla ha zọrọ na-anọchite anya ihe dị ka nde afọ 75 eluigwe na ala dịruworo. N’isi njedebe nke eriri ahụ, e ji otu kpọm nke ha ibu ka otu agịrị isi mmadụ nọchite anya oge nile mmadụ dịworo ndụ! Ma, ọ bụrụgodị na afọ ole a ha na-eme atụmatụ na eluigwe na ala dị ziri ezi, ogologo eriri ahụ dum agaghị ezu iji gosi afọ ole Ọkpara Jehova dịworo ndụ! Gịnị ka ọ nọ na-arụ oge ahụ nile?

6. (a) Gịnị ka Ọkpara Jehova nọ na-arụ tupu ya aghọọ mmadụ? (b) Ụdị nkekọ dị aṅaa dị n’etiti Jehova na Ọkpara ya?

6 Ọkpara ahụ ji obi ụtọ jee ozi dị ka “onye ọkà” nke Nna ya. (Ilu 8:30) Bible na-ekwu, sị: “Ma ọ́ bụghịkwa site n’aka [Ọkpara ahụ] ọ dịghị ọbụna otu ihe e mere ka ọ dịrị.” (Jọn 1:3) Ya mere, Jehova na Ọkpara ya rụkọrọ ọrụ ọnụ iji kee ihe ndị ọzọ nile. Lee oge na-akpali akpali, nke na-enye obi ụtọ ọ bụụrụ ha! Ọtụtụ ndị ga-ekweta na ịhụnanya nke na-adị n’etiti nne ma ọ bụ nna na nwa ya na-esi ike nke ukwuu. Ịhụnanya ‘bụkwa ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.’ (Ndị Kọlọsi 3:14) Mgbe ahụ, ònye n’ime anyị pụrụ ịghọta n’ụzọ zuru ezu otú nkekọ nke dịworo n’ime ogologo oge dị otú ahụ siruru ike? N’ụzọ doro anya, nkekọ  ịhụnanya kasị ike e nwetụrụla jikọtara Jehova Chineke na Ọkpara ya.

7. Mgbe e mere Jizọs baptizim, olee otú Jehova si gosipụta mmetụta ya banyere Ọkpara ya?

7 Ka o sina dị, Nna ahụ zitere Ọkpara ya n’ụwa ka a mụọ ya dị ka nwa ọhụrụ bụ́ mmadụ. Ya ime otú ahụ pụtara na ruo iri afọ ole na ole, Jehova ga-akwụsị iso Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na-enwe mmekọrịta chiri anya n’eluigwe. O ji oké mmasị na-ekiri site n’eluigwe ka Jizọs tolitere ma ghọọ nwoke zuru okè. Mgbe Jizọs dị ihe dị ka afọ 30, e mere ya baptizim. Ọ baghịrị anyị uru ịkọwa nkọ otú obi dị Jehova n’ebe ọ nọ. Nna ya si n’eluigwe kwuo okwu n’onwe ya, sị: “Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.” (Matiu 3:17) Nna Jizọs aghaghị inweworịị obi ụtọ dị ukwuu ịhụ na o ji ikwesị ntụkwasị obi mezuo ihe nile e buru n’amụma, ihe nile a chọrọ ka o mee!—Jọn 5:36; 17:4.

8, 9. (a) Gịnị ka Jizọs gabigara na Naịsan 14, 33 O.A., oleekwa otú ọ dị Nna ya nke eluigwe? (b) Gịnị mere Jehova ji kwe ka Ọkpara ya taa ahụhụ ma nwụọ?

8 Otú ọ dị, olee otú obi dị Jehova na Naịsan 14, 33 O.A.? Olee otú obi dị ya mgbe a raara Jizọs nye, mgbe ìgwè na-eme ihe ike jidekwara ya n’abalị ahụ? Mgbe ndị enyi Jizọs gbahapụrụ ya na mgbe e kpere ya ikpe n’ụzọ iwu na-akwadoghị? Mgbe a na-akwa ya emo, na-abụ ya asọ mmiri, ma na-esu ya ọkpọ? Mgbe a na-apịa ya ihe, pịarisie ya azụ? Mgbe a kpọrọ ya ntú n’ụkwụ na n’aka, kpọgide ya n’otu ogologo ogwe osisi ma hapụ ya n’elu ebe ahụ ebe ndị mmadụ nọ na-akwa ya emo? Olee otú ọ dị Nna ya mgbe Ọkpara ọ hụrụ n’anya tikuru ya n’ihi oké ihe mgbu? Olee otú obi dị Jehova mgbe Jizọs kubiri ume nakwa nke mbụ ya kemgbe a malitere ike ihe, mgbe Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na-adịkwaghị?—Matiu 26:14-16, 46, 47, 56, 59, 67; 27:38-44, 46; Jọn 19:1.

“Chineke . . nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya”

9 Anyị agaghị akọli ya. Ebe ọ bụ na Jehova nwere mmetụta, anyị agaghị akọwali mwute o nwere n’ihi ọnwụ nke Ọkpara ya. Ihe a ga-akọwali bụ nzube Jehova mere o ji kwe ka o mee. Gịnị mere Nna ya ji tinye onwe ya n’ọnọdụ ga-eme ka o nwee mmetụta dị otú ahụ? Jehova na-ekpughere anyị otu ihe magburu onwe ya na Jọn 3:16—amaokwu Bible nke dị oké mkpa nke na a kpọwo ya Oziọma n’ụdị dị ntakịrị. Ọ na-ekwu, sị: “Chineke hụrụ ụwa  n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Ya mere, nzube Jehova ji kwe ka o mee bụ nke a: ịhụnanya. Onyinye Jehova—nzite o zitere Ọkpara ya ịbịa taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị—bụ omume ịhụnanya kasịnụ e metụworo.

A Kọwaa Ihe Ịhụnanya Chineke Bụ

10. Mkpa dị aṅaa ka ụmụ mmadụ nwere, gịnịkwa meworo ihe okwu ahụ bụ́ “ịhụnanya” pụtara?

10 Gịnị ka okwu a bụ́ “ịhụnanya” pụtara? A kọwawo ịhụnanya dị ka mkpa kasị ukwuu ụmụ mmadụ nwere. Malite mgbe a mụrụ ha ruo mgbe ha nwụrụ, ụmụ mmadụ na-achọsi ịhụnanya ike, ha na-eme nke ọma mgbe ọ dị, ọbụna na-enwe nkụda mmụọ ma jiri nke nta nke nta nwụọ n’ihi na ha enwetaghị ya. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ụzọ na-eju anya, o siri ike ịkọwa ihe ọ bụ. Otú ọ dị, ndị mmadụ na-ekwusi okwu ike banyere ịhụnanya. E nwere ọtụtụ akwụkwọ, abụ, na uri ndị e dere banyere ya. Ihe ndị a na-enweta na ha adịghị eme mgbe nile ka ihe ịhụnanya pụtara doo anya. N’ezie, a na-eji okwu ahụ eme ihe gabiga ókè nke na o yiri nnọọ ka ọ na-esiwanye ike ịghọta ihe ọ pụtara n’ezie.

11, 12. (a) Ebee ka anyị pụrụ isi mụta ihe dị ukwuu banyere ịhụnanya, n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ n’ebe ahụ? (b) Ụdị ịhụnanya dịgasị aṅaa ka a kpọrọ aha kpọmkwem n’asụsụ Grik oge ochie, okwu dịkwa aṅaa maka “ịhụnanya” ka e jikarịsị mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst? (Leekwa ihe odide ala ala peeji) (ch) Gịnị bụ a·gaʹpe?

11 Otú ọ dị, Bible na-akụzi ihe banyere ịhụnanya n’ụzọ doro anya. Akwụkwọ bụ́ Expository Dictionary of New Testament Words nke Vine dere na-ekwu, sị: “A pụrụ ịmata ịhụnanya nanị site n’ihe ndị ọ na-akpali mmadụ ime.” Ihe ndekọ Bible banyere ihe dị iche iche Jehova meworo na-akụziri anyị ihe dị ukwuu banyere ịhụnanya ya—obiọma ịhụnanya o nwere n’ebe ihe o kere eke nọ. Dị ka ihe atụ, olee ihe ga-eme ka a mata àgwà a nke ọma karịa omume ịhụnanya kasịnụ a kọwara n’elu nke Jehova n’onwe ya mere? N’isiakwụkwọ ndị na-esonụ, anyị ga-ahụ ọtụtụ ihe atụ ndị ọzọ nke ebe Jehova gosipụtara ịhụnanya ya. Ọzọkwa, anyị pụrụ ịghọta ya nke ọma site n’okwu ndị e ji mee ihe na mbụ maka  “ịhụnanya” n’ime Bible. N’asụsụ Grik oge ochie, e nwere okwu anọ a na-eji eme ihe maka “ịhụnanya.” * N’ime ha anọ, nke e jikarịsịrị mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst bụ a·gaʹpe. Otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Bible kpọrọ ya “okwu kasị mkpa a pụrụ ichetụ n’echiche maka ịhụnanya.” N’ihi gịnị?

12 A·gaʹpe na-ezo aka n’ịhụnanya nke ụkpụrụ na-achịkwa. Ya mere, ọ bụghị nanị imeghachi omume n’ihe mmadụ kwuru ma ọ bụ mee n’ihi mmetụta uche. Ọ na-agụnye ọtụtụ ihe karị, ọ na-esite n’ichemi echiche na ịkpachapụ anya mee ihe. Karịsịa, a·gaʹpe adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị ma ọlị. Dị ka ihe atụ, lee anya ọzọ na Jọn 3:16. Olee “ụwa” Chineke hụrụ n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya? Ọ bụ ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta. Nke ahụ na-agụnye ọtụtụ ndị, bụ́ ndị na-agbaso ụzọ mmehie ná ndụ ha. Jehova ọ̀ hụrụ onye nke ọ bụla n’anya dị ka enyi ya, otú o si hụ Ebreham kwesịrị ntụkwasị obi n’anya? (Jems 2:23) Ee e, ma Jehova ji ịhụnanya mee ka ịdị mma ya ruo mmadụ nile, ọbụna n’agbanyeghị oké ihe o furu ya. Ọ chọrọ ka mmadụ nile chegharịa ma gbanwee ụzọ ha. (2 Pita 3:9) Ọtụtụ ndị na-eme otú ahụ. Ọ na-eji obi ụtọ anabata ndị a dị ka ndị enyi ya.

13, 14. Gịnị na-egosi na a·gaʹpe na-agụnyekarị mmetụta na-ekpo ọkụ?

13 Otú ọ dị, ụfọdụ ndị nwere echiche na-ezighị ezi banyere a·gaʹpe. Ha na-eche na ọ pụtara ụdị ịhụnanya nke mmetụta na-adịghị na ya, nke na-esighị n’ala ala obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na a·gaʹpe na-agụnyekarị mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe mmadụ nọ. Dị ka ihe atụ, mgbe Jọn dere sị, “Nna ahụ hụrụ Ọkpara ya n’anya,” o ji otu ụdị nke okwu ahụ bụ́ a·gaʹpe mee ihe.  Ịhụnanya ahụ ọ̀ bụ nke mmetụta na-ekpo ọkụ na-adịghị na ya? Rịba ama na Jizọs kwuru, sị, “Nna m nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe Ọkpara ya nọ,” jiri otu ụdị nke okwu bụ́ phi·leʹo mee ihe. (Jọn 3:35; 5:20) Ịhụnanya Jehova na-agụnyekarị mmetụta dị nro. Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe mmetụta uche nkịtị na-agbanwe ịhụnanya ya. Ụkpụrụ ya ndị amamihe dị na ha, ndị zikwara ezi na-achịkwa ya mgbe nile.

14 Dị ka anyị hụworo, àgwà nile nke Jehova magburu onwe ha, zuo okè, ma na-adọrọ adọrọ. Ma ịhụnanya bụ nke kasị adọrọ adọrọ n’ime ha nile. Ọ dịghị ihe na-adọta anyị n’ụzọ dị ike n’ebe Jehova nọ ka ya. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ bụkwa ịhụnanya bụ àgwà ya bụ́ isi. Olee otú anyị si mara?

“Chineke Bụ Ịhụnanya”

15. Olee ihe Bible kwuru banyere àgwà Jehova bụ́ ịhụnanya, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka ihe a o kwuru si pụọ iche? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.)

15 Ọ dị ihe Bible kwuru banyere ịhụnanya nke ọ na-adịtụghị mgbe o kwuru ya banyere àgwà ndị ọzọ bụ́ isi nke Jehova. Akwụkwọ Nsọ ekwughị na Chineke bụ ike ma ọ bụ na Chineke bụ ikpe ziri ezi ma ọ bụ ọbụna na Chineke bụ amamihe. O nwere àgwà ndị a, ọ bụ ya bụ isi iyi kasịnụ nke àgwà ndị a, o nweghịkwa onye a pụrụ iji tụnyere ya ma a bịa na ha atọ. Otú ọ dị, e kwuru ihe gbara ọkpụrụkpụ karị banyere àgwà nke anọ: “Chineke bụ ịhụnanya.” * (1 Jọn 4:8) Gịnị ka nke ahụ pụtara?

16-18. (a) N’ihi gịnị ka Bible ji kwuo na “Chineke bụ ịhụnanya”? (b) N’ime ihe nile e kere eke nọ n’ụwa, n’ihi gịnị ka mmadụ ji bụrụ ihe atụ kwesịrị ekwesị nke àgwà Jehova bụ́ ịhụnanya?

16 “Chineke bụ ịhụnanya” abụghị nanị ikwu na otu ihe na ihe ọzọ ha nhata, dị ka a ga-asị na “Chineke na ịhụnanya ha nhata.”  Anyị apụghị ịsụgharị okwu ahụ isi n’ụzọ ziri ezi ma kwuo na “ịhụnanya bụ Chineke.” Jehova karịrị nnọọ àgwà a na-apụghị ịhụ anya ma ọ bụ bitụ aka. Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ụdị mmetụta na àgwà, tụkwasị n’ịhụnanya. Ma, ịhụnanya gbanyere mkpọrọgwụ n’ụzọ miri emi n’ime Jehova. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru banyere amaokwu a, sị: “Ịhụnanya bụ ọdịdị nke Chineke.” N’ozuzu, anyị pụrụ isi otú a lee ya anya: ike Jehova na-eme ka o nwee ike ime ihe. Ikpe ziri ezi na amamihe ya na-eduzi ụzọ o si eme ihe. Ma ịhụnanya Jehova na-akpali ya ime ihe. A na-ahụkwa ịhụnanya ya mgbe nile n’ụzọ o si eji àgwà ya ndị nke ọzọ eme ihe.

17 A na-ekwukarị na Jehova bụ ịhụnanya n’onwe ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmụta banyere ịhụnanya nke ụkpụrụ na-achịkwa, anyị aghaghị ịmụta onye Jehova bụ. N’ezie, anyị pụkwara ịhụ àgwà a mara mma n’ime ụmụ mmadụ. Ma gịnị mere e ji na-ahụ ya? N’oge ọ na-eke ihe, dị ka ihe àmà na-egosi, Jehova sịrị Ọkpara ya: “Ka anyị kpụọ mmadụ n’onyinyo anyị, dị ka oyiyi anyị si dị.” (Jenesis 1:26) N’ime ihe nile e kere eke nọ n’ụwa a, ọ bụ nanị ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị pụrụ ikpebi igosi ịhụnanya, si otú a na-eṅomi Nna ha nke eluigwe. Cheta na Jehova ji ihe dị iche iche e kere eke mee ihe atụ àgwà ya ndị bụ́ isi. Ma, Jehova kpebiri iji ihe kasị elu o kere nọ n’ụwa, nke bụ́ mmadụ, mee ihe atụ nke àgwà Ya bụ́ isi, bụ́ ịhụnanya.—Ezikiel 1:10.

18 Mgbe anyị na-ahụ n’anya n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị, n’ụzọ ụkpụrụ na-achịkwa, anyị na-egosipụta àgwà bụ́ isi nke Jehova. Ọ bụ nnọọ dị ka Jọn onyeozi si dee ya: “Ma anyị onwe anyị, anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:19) Ma n’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova si buru ụzọ hụ anyị n’anya?

Jehova Bu Ụzọ Mee Ihe

19. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịhụnanya keere òkè dị mkpa n’ọrụ ike ihe nke Jehova?

19 Ịhụnanya abụghị ihe ọhụrụ. E kwuwerị, gịnị kpaliri Jehova ịmalite ike ihe? Ọ bụghị n’ihi na owu na-ama ya, ya adịkwa ya mkpa inwe onye ibe. Jehova nwezuru ihe nile, ọ dịghị ihe kọrọ ya nke onye ọzọ pụrụ inye ya. Ma ịhụnanya ya, bụ́ àgwà nke a na-egosipụta site n’ime ihe, kpaliri ya, dị ka o kwesịrị, ịchọ iso  ihe e kere eke nwere ọgụgụ isi, ndị pụrụ iji onyinye dị otú ahụ kpọrọ ihe, kerịta ọṅụ nke ịdị ndụ. Ọ bụ Ọkpara ọ mụrụ nanị ya bụ “mmalite nke ihe Chineke kere.” (Mkpughe 3:14) Jehova jizi Onye Ọkà a kee ihe ndị ọzọ, malite ná ndị mmụọ ozi. (Job 38:4, 7; Ndị Kọlọsi 1:16) N’ịbụ ndị e nyere nnwere onwe, ọgụgụ isi, na mmetụta, ndị mmụọ a dị ike nwere ohere nke iji uche nke aka ha kpebie isoro ndị ọzọ nwee mmekọrịta ịhụnanya—ha na ndị ibe ha, nakwa karịsịa, ha na Jehova Chineke. (2 Ndị Kọrint 3:17) N’ụzọ dị otú a, ha na-ahụ n’anya n’ihi na e bu ụzọ hụ ha n’anya.

20, 21. Adam na Iv hụrụ ihe àmà dị aṅaa nke gosiri na Jehova hụrụ ha n’anya, n’agbanyeghị nke ahụ, olee otú ha si meghachi omume?

20 Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Site ná mmalite, e gosiri nnọọ Adam na Iv ịhụnanya nke ukwuu. Ebe ọ bụla ha lere anya n’ebe obibi ha bụ́ Paradaịs nke dị n’Iden, ha pụrụ ịhụ ihe àmà nke ịhụnanya Nna ha nwere n’ebe ha nọ. Rịba ama ihe Bible kwuru: “Jehova, bụ́ Chineke, wee kụọ ubi nke a gbara ogige n’Iden, n’Ihu anyanwụ; O wee tinye mmadụ ahụ n’ebe ahụ, bụ́ onye Ọ kpụrụrịị.” (Jenesis 2:8) Ị̀ gatụwo n’ogige mara nnọọ mma n’ezie? Olee ihe ị kasị nwee mmasị na ya? Ọ̀ bụ ìhè nke si n’etiti mkpá akwụkwọ na-enwubata n’ebe ndị zoro ezo? Ọ̀ bụ ụdị àgwà dịgasị iche iche nke okooko osisi ndị mara mma? Ọ̀ bụ ụda nke mmiri iyi na-asọfenụ, ụmụ nnụnụ na-ebe ube, na ụmụ ahụhụ na-ebe ube? Gịnị banyere ísì ọma nke osisi, mkpụrụ osisi, na ifuru osisi dị iche iche? Nke ọ bụla ọ sọkwara ya bụrụ, ọ dịghị ogige ọ bụla e nwere taa nke a pụrụ iji tụnyere nke ahụ dị n’Iden. N’ihi gịnị?

21 Ọ bụ Jehova ji aka ya kụọ ubi ahụ! Ọ ghaghị ịmawo mma nke ukwuu. Osisi ọ bụla mara mma ma ọ bụ nke na-amị mkpụrụ dị ụtọ dị n’ebe ahụ. Mmiri na-ede ubi ahụ nke ọma, ọ sara mbara, jupụtakwa n’ụdị ụmụ anụmanụ dị iche iche na-adọrọ mmasị. Adam na Iv nwere ihe nile ga-eme ka ndụ ha bụrụ nke na-enye obi ụtọ na nke na-eweta afọ ojuju, gụnyere ọrụ na-eweta afọ ojuju na mkpakọrịta magburu onwe ya. Jehova bu ụzọ hụ ha n’anya, ha nwekwara ọtụtụ ihe mere ha ga-eji hụkwa ya n’anya. Ma, ha emeghị otú ahụ. Kama iji ịhụnanya rubere Nna ha nke  eluigwe isi, ha ji ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nupụrụ ya isi.—Jenesis, isi 2.

22. Olee otú ụzọ Jehova si meghachi omume ná nnupụisi ahụ weere ọnọdụ n’Iden si egosipụta na ịhụnanya ya na-eguzosi ike n’ihe?

22 Lee ka nke ahụ na-aghaghị isiworị wute Jehova! Ma nnupụisi a ò mere ka obi jọọ ya njọ? Ee e! “Ruo mgbe ebighị ebi ka [“obiọma sitere n’ịhụnanya” ma ọ bụ, “ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe,” ihe odide ala ala peeji nke NW] ya dị.” (Abụ Ọma 136:1) N’ihi ya, o zubere ozugbo ime ndokwa ịhụnanya iji gbapụta nwa ọ bụla obi ya ziri ezi nke ga-esite n’Adam na Iv. Dị ka anyị hụworo, ndokwa ndị ahụ gụnyere àjà mgbapụta nke Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya chụrụ, bụ́ nke furu Nna ahụ ihe dị nnọọ ukwuu.—1 Jọn 4:10.

23. Gịnị bụ otu n’ime ihe ndị mere Jehova ji bụrụ “Chineke onye obi ụtọ,” ajụjụ dịkwa aṅaa dị oké mkpa ka a ga-eleba anya na ya n’isiakwụkwọ na-esonụ?

23 Ee, site ná mmalite, Jehova ebutewo ụzọ n’igosi ihe a kpọrọ mmadụ ịhụnanya. N’ọtụtụ ụzọ, “o bu ụzọ hụ anyị n’anya.” Ịhụnanya na-eme ka e nwee nkwekọrịta na ọṅụ, ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na a kọwara Jehova dị ka “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) Otú ọ dị, otu ajụjụ dị mkpa na-ebilite. Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya n’ezie n’otu n’otu? Isiakwụkwọ na-esonụ ga-eleba anya n’okwu ahụ.

^ par. 11 E ji ngwaa bụ́ phi·leʹo, nke pụtara “inwe mmetụta ịhụnanya maka, ịhụ n’anya, ma ọ bụ inwe mmasị (dị ka mmadụ pụrụ inwe n’ebe ezigbo enyi ma ọ bụ nwanne ya nọ),” mee ihe ọtụtụ ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. E ji otu ụdị nke okwu bụ́ stor·geʹ, ma ọ bụ ịhụnanya maka ndị òtù ezinụlọ, mee ihe na 2 Timoti 3:3 iji gosi na ịhụnanya dị otú ahụ ga-adị nnọọ ụkọ n’ụbọchị ikpeazụ. E jighị eʹros, ma ọ bụ ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ nke na-adị n’etiti nwoke na nwanyị, mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọ bụ ezie na e kwuru okwu banyere ụdị ịhụnanya ahụ n’ime Bible.—Ilu 5:15-20.

^ par. 15 E nwekwara ihe ndị ọzọ e si otú a kwuo n’Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, “Chineke bụ ìhè” na “Chineke . . . bụkwa ọkụ na-erepịa erepịa.” (1 Jọn 1:5; Ndị Hibru 12:29) Ma a ghaghị ịghọta okwu ndị a dị ka okwu ihe atụ nke na-ekwu na otu ihe bụ ihe ọzọ, n’ihi na ha ji Jehova na-atụnyere ihe ndị a na-ahụ anya. Jehova dị ka ìhè, n’ihi na ọ dị nsọ ma zie ezi. Ọ dịghị “ọchịchịrị,” ma ọ bụ adịghị ọcha dị n’ime ya. A pụkwara iji ya tụnyere ọkụ n’ihi otú o si eji ike o nwere ibibi ihe eme ihe.