Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 29

“Ịmara Ịhụnanya nke Kraịst Ahụ”

“Ịmara Ịhụnanya nke Kraịst Ahụ”

1-3. (a) Gịnị kpaliri Jizọs ịchọ ịdị ka Nna ya? (b) Akụkụ dịgasị aṅaa nke ịhụnanya Jizọs ka anyị ga-enyocha?

Ị̀ HỤTỤLA obere nwatakịrị nwoke nke na-agbalị ime ka nna ya? Nwatakịrị ahụ pụrụ iṅomi otú nna ya si eje ije, ekwu okwu, ma ọ bụ eme omume. Ka oge na-aga, nwata ahụ pụrụ ọbụna ịdị na-agbaso ụdị ụkpụrụ omume nke nna ya ma jiri ihe ime mmụọ kpọrọ ihe otú nna si jiri ya kpọrọ ihe. Ee, ịhụnanya na mmasị nwatakịrị na-enwe n’ebe nna ya na-ahụ n’anya nọ na-akpali nwatakịrị ahụ ịchọ ịdị ka papa ya.

2 Gịnị banyere mmekọrịta dị n’etiti Jizọs na Nna ya nke eluigwe? Jizọs kwuru n’otu oge, sị: “[Ahụrụ m] Nna m n’anya.” (Jọn 14:31) Ọ dịghị onye pụrụ ịhụ Jehova n’anya karịa Ọkpara a, bụ́ onye ya na Nna ahụ nọ ogologo oge tupu e kee ihe ọ bụla ọzọ. Ọ bụ ịhụnanya a kpaliri Ọkpara a hụrụ nna ya n’anya ịchọ ịdị ka Nna ya.—Jọn 14:9.

3 N’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ n’akwụkwọ a, anyị tụlere otú Jizọs si ṅomie ike, ikpe ziri ezi, na amamihe Jehova n’ụzọ zuru okè. Otú ọ dị, olee otú Jizọs si gosipụta ụdị ịhụnanya ahụ Nna ya nwere? Ka anyị nyochaa akụkụ atọ nke ịhụnanya Jizọs—mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà ya, ọmịiko ya, na njikere ọ dị ịgbaghara.

“Ọ Dịghị Onye Nwere Ịhụnanya Ka Nke A Ukwuu”

4. Olee otú Jizọs si setịpụ ihe nlereanya kasịnụ nke ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà nke mmadụ gositụworo?

4 Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya dị ịrịba ama nke ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà. Ịchụ onwe onye n’àjà na-agụnye ibute mkpa na nchegbu nke ndị ọzọ ụzọ n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị. Olee otú Jizọs si gosipụta ụdị ịhụnanya ahụ? Ya onwe ya kọwara, sị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya ka  nke a ukwuu, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) Jizọs ji ọchịchọ obi ya nye ndụ ya zuru okè maka anyị. Ọ bụ ịhụnanya kasịnụ nke mmadụ ọ bụla gositụworo. Ma Jizọs gosipụtakwara ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà n’ụzọ ndị ọzọ.

5. N’ihi gịnị ka ịhapụ eluigwe ji bụrụ àjà ịhụnanya n’akụkụ nke Ọkpara Chineke?

5 Tupu ya aghọọ mmadụ, Ọkpara Chineke ọ mụrụ nanị ya nọ n’ọkwá dị elu n’eluigwe. Ya na Jehova na ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị mmụọ e kere nwere mkpakọrịta chiri anya. N’agbanyeghị ihe ùgwù ndị a o nwere, Ọkpara a a hụrụ n’anya “mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi nke mmadụ.” (Ndị Filipaị 2:7) O ji ọchịchọ obi ya bịa biri n’etiti ụmụ mmadụ na-emehie emehie n’ime ụwa nke “dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Nke ahụ ọ́ bụghị àjà ịhụnanya n’akụkụ nke Ọkpara Chineke?

6, 7. (a) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jizọs si gosipụta ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà n’oge ọ na-eje ozi n’elu ala? (b) Ihe atụ dị aṅaa na-emetụ n’ahụ́ nke ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị ka e dekọrọ na Jọn 19:25-27?

6 N’oge nile Jizọs jere ozi n’elu ala, o gosipụtara ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà n’ụzọ dịgasị iche iche. Ọ dịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị ma ọlị. O tinyere obi ya dum n’ozi ya nke na ọ dị njikere ịhapụ ihe ntụsara ahụ́ ndị na-amasịkarị ụmụ mmadụ. “Nkịta ọhịa nwere ọgba, anụ ufe nke eluigwe nwekwara akwụ́,” ka o kwuru, “ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ bụla ịtọgbọ isi ya.” (Matiu 8:20) Ebe Jizọs bụ ọkwa nkà bụ́ ọkà, ọ gaara ewepụtawo oge wuoro onwe ya ụlọ mmadụ ga-anọrọ na ya nwee ntụsara ahụ́ ma ọ bụ rụọ ezigbo oche mara mma ọ ga-ere ka o wee nwee ike inwetakwu ego. Ma o jighị nkà ndị o nwere mee ihe iji nweta ihe onwunwe.

7 E dekọrọ otu ihe atụ na-emetụ n’ahụ́ nke ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà nke Jizọs nwere na Jọn 19:25-27. Cheedị echiche ọtụtụ ihe na-aghaghị ịdịwo Jizọs n’uche na n’obi  n’ehihie nke ụbọchị ahụ ọ nwụrụ. Ka ọ nọ n’ihe mgbu n’elu osisi ịta ahụhụ, ọ na-echegbu onwe ya banyere ndị na-eso ụzọ ya, ọrụ nkwusa ahụ, na karịsịa iguzosi ike n’ezi ihe ya na otú ọ ga-esi emetụta aha Nna ya. N’ezie, ọdịnihu dum nke ihe a kpọrọ mmadụ dị ya n’aka! N’agbanyeghị nke ahụ, ntakịrị oge kpọmkwem tupu ya anwụọ, Jizọs gosikwara nchegbu maka nne ya, bụ́ Meri, bụ́ onye o yiri ka ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ mgbe ahụ. Jizọs gwara Jọn onyeozi ka o lekọtawa Meri dị ka a ga-asị na Meri bụ nne Jọn, mgbe nke ahụ gasịkwara, onyeozi ahụ kpọọrọ Meri laa n’ụlọ ya. N’ụzọ dị otú a, Jizọs mere ndokwa maka nlekọta ime mmụọ na nke anụ ahụ́ nke nne ya. Lee ngosipụta nke nchegbu ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị nke ahụ bụ!

“O Nwere Ọmịiko”

8. Gịnị ka okwu Grik Bible ji kọwaa ọmịiko Jizọs pụtara?

8 Dị ka Nna ya, Jizọs nwere ọmịiko. Akwụkwọ Nsọ na-akọwa Jizọs dị ka onye mere mgbalị siri ike iji nyere ndị na-ata ahụhụ aka n’ihi na o metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu. Bible ji okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “nwere ọmịiko” mee ihe iji kọwaa ọmịiko Jizọs. Otu ọkà mmụta na-ekwu, sị: “Ọ na-akọwa . . . mmetụta nke na-akpali mmadụ site n’ala ala obi ya. Ọ bụ okwu Grik kasị ike e ji eme ihe maka mmetụta ọmịiko.” Tụlee ọnọdụ ụfọdụ ebe ọmịiko dị ukwuu kpaliri Jizọs ime ihe.

9, 10. (a) Olee ọnọdụ mere ka Jizọs na ndịozi ya chọọ ebe dị jụụ? (b) Olee otú Jizọs si meghachi omume mgbe a na-ekweghị ya zuru ike, n’ihi gịnịkwa?

9 A kpaliri ya igbo mkpa ime mmụọ. Ihe ndekọ dị na Mak 6:30-34 na-egosi isi ihe nke kpaliri Jizọs igosipụta ọmịiko ya. Were anya nke uche gị lee ihe na-emenụ. Obi dị ndịozi ụtọ n’ihi na ha ka mesịrị njem nkwusa sara mbara. Ha laghachikwutere Jizọs ma jiri ịnụ ọkụ n’obi kọọrọ ya ihe nile ha hụworo ma nụ. Ma ìgwè mmadụ buru ibu gbakọtara. Ha enyeghịkwa Jizọs na ndịozi ya ohere ọbụna iji rie ihe. N’ịbụ onye na-eleru anya ala mgbe nile, Jizọs chọpụtara na ike gwụrụ ndịozi ya. Ọ sịrị ha: “Unu onwe unu, bịanụ nanị unu  n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị ma zurutụ ike.” Mgbe ha banyere n’ụgbọ mmiri, ha gawara n’akụkụ ọnụ ọnụ ebe ugwu nke Oké Osimiri Galili, n’ebe dị jụụ. Ma ìgwè mmadụ ahụ hụrụ ha mgbe ha na-apụ. Ndị ọzọ nụkwara banyere ya. Ha nile gbaara ọsọ na-aga n’ụsọ osimiri ahụ, n’akụkụ ebe ugwu, wee buru ụgbọ mmiri ahụ ụzọ ruo n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ!

10 Iwe ò were Jizọs na e kweghị ya zuru ike? Ọ dịghị ma ọlị! O metụrụ ya n’obi mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ a ọnụ ọgụgụ ha ruru ọtụtụ puku, bụ́ ndị nọ na-eche ya. Mak dere, sị: “Ọ hụrụ oké ìgwè mmadụ, ma o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.” Jizọs lere ndị a anya dị ka ndị nwere mkpa ime mmụọ. Ha yiri atụrụ ndị na-awagharị n’enweghị enyemaka, ebe ha na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ ga na-eduzi ha ma ọ bụ ga-echebe ha. Jizọs maara na ndị ndú okpukpe obi tara mmiri, bụ́ ndị kwesịrị ịbụ ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya, leghaara ndị nkịtị anya. (Jọn 7:47-49) O meere ha ebere, n’ihi ya, ọ malitere ịkụziri ha “banyere alaeze Chineke.” Rịba ama na Jizọs nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị ahụ ọbụna tupu ya ahụ otú ha ga-esi meghachi omume n’ihe ọ ga-akụziri ha. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mmetụta ọmịiko o nwere abụghị n’ihi mmeghachi omume ìgwè mmadụ ahụ n’ihe ọ kụziiri ha, kama ọ bụ ya kpaliri ya ịkụziri ha ya.

‘Ọ matịrị aka ya bitụ ya aka’

11, 12. (a) Olee otú e si ele ndị ekpenta anya n’oge Bible, ma olee otú Jizọs si meghachi omume mgbe otu nwoke nke “ekpenta zuru ahụ́” bịakwutere ya? (b) Olee otú aka Jizọs metụrụ onye ekpenta ahụ pụrụ ịdịworị ya, oleekwa otú ahụmahụ nke otu dọkịta nwere si egosi nke a?

11 A kpaliri ya ibelata nhụsianya. Ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche chọpụtara na Jizọs nwere ọmịiko, ya mere, a dọtara ha n’ebe ọ nọ. Nke a pụtara ìhè karịsịa mgbe otu nwoke “ekpenta zuru ahụ́” bịakwutere Jizọs, ka ìgwè mmadụ na-eso ya. (Luk 5:12) N’oge Bible, a na-ekewapụ ndị ekpenta iche iji chebe ndị ọzọ ka ha ghara ibute ọrịa ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 5:1-4) Otú ọ dị, ka oge na-aga, ndị rabaị, bụ́ ndị na-edu ndú mere ka e jiri obi  ịta mmiri na-ele ọrịa ekpenta anya, ha tụkwasịkwara iwu ndị nke ha bụ́ ndị siri ike idebe. * Otú ọ dị, rịba ama otú Jizọs si zaghachi onye ekpenta ahụ: “Otu onye ekpenta bịakwutekwara ya, ọbụna gbuo ikpere n’ala na-arịọsi ya arịrịọ ike, na-asị ya: ‘Ọ bụrụ nnọọ na ị chọọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.’ N’ihi nke ahụ o nwere ọmịiko, o wee matịa aka ya bitụ ya aka, wee sị ya: ‘Achọrọ m. Ka e mee ka ị dị ọcha.’ Ozugbo ahụkwa, ekpenta ahụ pụrụ n’ahụ́ ya.” (Mak 1:40-42) Jizọs maara na iwu megidere onye ekpenta ahụ ọbụna ịnọ n’ebe ahụ. Ma, kama ịchụpụ ya, Jizọs nwere ọmịiko dị ukwuu nke na o mere ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche. Jizọs metụrụ ya aka!

12 Cheedị echiche otú aka ahụ e metụrụ onye ekpenta ahụ na-aghaghị ịdịworị ya n’obi? Iji maa atụ, tụlee otu ahụmahụ. Dr. Paul Brand, bụ́ ọkachamara n’ọrịa ekpenta, na-akọ banyere otu onye ekpenta ọ gwọrọ n’India. Mgbe ọ na-ele onye ekpenta ahụ ahụ́, dọkịta ahụ tụkwasịrị aka ya n’ubu onye ekpenta ahụ ma kọwaara nwoke ahụ site n’ọnụ onye ntụgharị okwu ụdị ọgwụgwọ a ga-enye ya. Na mberede, onye ekpenta ahụ malitere ibe ákwá. “Ọ̀ dị ihe m kwuru nke na-adịghị mma?” ka dọkịta ahụ jụrụ. Onye ahụ na-atụgharị okwu jụrụ nwa okorobịa ahụ ajụjụ ahụ n’asụsụ ya wee zaa, sị: “Ee e, dọkịta. Ọ sịrị na ya na-ebe ákwá n’ihi na ị tụkwasịrị ya aka n’ubu. Ọ dịbeghị onye metụrụla ya kemgbe ọtụtụ afọ ruo ugbu a ọ bịara ebe a.” Nye onye ekpenta ahụ bịakwutere Jizọs, ịbụ onye e metụrụ aka nwere ọbụna mmetụta ka ukwuu. Mgbe o metụsịrị ya aka ahụ, ọrịa ahụ nke mere ka ọ bụrụ onye a na-asọ asọ lara!

13, 14. (a) Ìgwè mmadụ dị aṅaa ka Jizọs zutere mgbe ọ na-abịaru obodo Nen nso, gịnịkwa mere ka ọnọdụ a bụrụ nke dị mwute karịsịa? (b) Gịnị ka ọmịiko Jizọs kpaliri ya imere nwanyị Nen ahụ di ya nwụrụ?

 13 A kpaliri ya iwepụ iru újú. Iru újú nke ndị ọzọ metụrụ Jizọs n’ahụ́ nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ndekọ dị na Luk 7:11-15. O mere mgbe Jizọs na-abịaru otu obodo dị na Galili bụ́ Nen nso, mgbe ọ gaworo ọkara n’ozi ya. Ka Jizọs na-abịaru nso n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, ọ hụrụ ndị na-aga ili ozu. Ọnọdụ ahụ dị nnọọ mwute. Otu nwa okorobịa, nke bụ nanị otu nwa nne ya mụrụ anwụwo, nne ya bụkwa nwanyị di ya nwụrụ. N’otu oge tupu mgbe ahụ, eleghị anya o sowo gaa lie ozu otú ahụ—ozu di ya. Na nke ugbu a, ọ bụ nwa ya nwoke, onye bụ́ ma eleghị anya, nanị onye inyeaka o nwere. Ọ pụrụ ịbụ na ndị ọzọ na-eru újú bụ́ ndị na-abụ abụ ákwá nakwa ndị na-agụ egwú bụ́ ndị na-agụ egwú iru újú so n’ìgwè mmadụ ahụ. (Jeremaịa 9:17, 18; Matiu 9:23) Otú ọ dị, Jizọs lekwasịrị nne ahụ na-eru nnọọ újú anya, bụ́ onye ihe ịrụ ụka ọ bụla na-adịghị ya na ọ nọ n’akụkụ ndị bu ozu nwa ya na-aga.

14 Jizọs “nwere ọmịiko” n’ahụ́ nne ahụ nwa ya nwụrụ. O ji olu na-emesi obi ike sị ya: “Kwụsị ịkwa ákwá.” N’echeghị ka a kpọọ ya akpọọ, ọ garuru nso ma bitụ ihe ahụ e ji ebu ozu aka. Ndị ahụ bu ozu ahụ—nakwa ma eleghị anya ndị ọzọ so n’ìgwè mmadụ ahụ—kwụụrụ otu ebe. Jizọs ji olu inye iwu sị ozu ahụ: “Nwa okorobịa, asị m gị, Bilie!” Gịnị meziri? “Onye ahụ nwụrụ anwụ wee bilie nọrọ ọdụ ma malite ikwu okwu” dị ka a ga-asị na a kpọtere ya n’oké ụra! Okwu kasị emetụ n’ahụ́ sochiziri: “[Jizọs] wee kpọnye ya nne ya.”

15. (a) Ihe ndekọ Bible banyere Jizọs ịbụ onye ọmịiko kpaliri na-egosi njikọ dị aṅaa dị n’etiti inwe ọmịiko na ime ihe? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs n’akụkụ a?

15 Gịnị ka anyị na-amụta site n’ihe ndekọ ndị a? Na nke ọ bụla, rịba ama otú e si jikọta ọmịiko na ime ihe. Jizọs apụghị ịhụ ahụhụ ndị ọzọ na-ata ma ghara inwe ọmịiko n’ahụ́ ha, ọ pụghịkwa inwe ọmịiko dị otú ahụ ma ghara ime ihe. Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya ya? Dị ka Ndị Kraịst, anyị nwere ibu ọrụ nke ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ.  N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali anyị. Otú ọ dị, ka anyị cheta na ọrụ a bụ ọrụ chọrọ ọmịiko. Mgbe anyị nwere ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ dị ka Jizọs nwere, obi anyị ga-akpali anyị ime ihe nile anyị nwere ike ime iji soro ha kerịta ozi ọma ahụ. (Matiu 22:37-39) Olee banyere igosi ndị kwere ekwe ibe anyị bụ́ ndị na-ahụju anya ma ọ bụ na-eru újú ọmịiko? Anyị apụghị ịkwụsị nhụjuanya nkịtị ma ọ bụ ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ n’ụzọ ọrụ ebube. Otú ọ dị, anyị pụrụ igosipụta ọmịiko site n’ibute ụzọ n’igosipụta nchegbu anyị ma ọ bụ inye aka kwesịrị ekwesị n’ụzọ dị irè.—Ndị Efesọs 4:32.

“Nna, Gbaghara Ha”

16. Olee otú njikere Jizọs dị ịgbaghara si pụta ìhè ọbụna mgbe ọ nọ n’elu osisi ịta ahụhụ?

16 N’ụzọ zuru nnọọ okè, Jizọs gosipụtara ịhụnanya Nna ya nwere n’ụzọ ọzọ dị mkpa—ọ ‘dị njikere ịgbaghara.’ (Abụ Ọma 86:5, NW) Njikere a ọ dị ime otú ahụ pụtara ìhè ọbụna mgbe ọ nọ n’elu osisi ịta ahụhụ. Mgbe e mere ka ọ nwụọ ọnwụ ihere, kpọọ ya ntu n’ụkwụ na n’aka, gịnị ka Jizọs kwuru okwu banyere ya? Ọ̀ kpọkuru Jehova ka ọ taa ndị gburu ya ahụhụ? Kama nke ahụ, otu n’ime ihe ndị ikpeazụ Jizọs kwuru bụ: “Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.”—Luk 23:34. *

17-19. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jizọs si gosipụta na ya gbaghaara Pita onyeozi maka ịgọnahụ Ya ugboro atọ?

17 A pụrụ ịhụ ihe atụ kasị emetụ n’ahụ́ ma eleghị anya, nke mgbaghara Jizọs na-agbaghara mmehie n’ụzọ o si mesoo Pita onyeozi. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Pita hụrụ Jizọs n’anya nke ukwuu. Na Naịsan 14, n’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa,  Pita sịrị ya: “Onyenwe anyị, adị m njikere iso gị baa, ma n’ụlọ mkpọrọ ma n’ọnwụ.” N’agbanyeghị nke ahụ, nanị awa ole na ole ka nke ahụ gasịrị, Pita gọrọ ugboro atọ na ya amaghịdị Jizọs! Bible na-akọrọ anyị ihe mere mgbe Pita gọrọ agụgọ nke atọ ya: “Onyenwe anyị wee tụgharịa legide Pita anya.” N’ịbụ onye ịdị njọ nke mmehie ya wutere nke ukwuu, Pita ‘pụrụ n’èzí kwaa ákwá n’ụzọ dị ilu.’ Mgbe Jizọs nwụrụ ka oge gatụkwuru n’ụbọchị ahụ, onyeozi ahụ pụrụ ịnọworị na-eche sị, ‘Onyenwe m ọ̀ gbaghaara m?’—Luk 22:33, 61, 62.

18 Pita echereghị ruo ogologo oge tupu ya enweta azịza ya. A kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’ụtụtụ Naịsan 16, dị ka ihe àmà na-egosikwa, ọ gara otu ụbọchị ahụ gaa hụ Pita. (Luk 24:34; 1 Ndị Kọrint 15:4-8) Gịnị mere Jizọs ji gosi onyeozi ahụ gọnahụrụ Ya kpam kpam ụdị nchebara echiche pụrụ iche otú ahụ? Ọ pụrụ ịbụ na Jizọs chọrọ imesi Pita ahụ nwere nchegharị obi ike na Onyenwe ya ka hụrụ ya n’anya ma jiri ya kpọrọ ihe. Ma Jizọs mere ọbụna ihe karịrị nke ahụ iji mesighachi Pita obi ike.

19 Oge ụfọdụ ka e mesịrị, Jizọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya n’Oké Osimiri Galili. N’oge a, Jizọs jụrụ Pita (bụ́ onye gọnahụrụrịị Onyenwe ya ugboro atọ) ajụjụ ugboro atọ banyere ịhụnanya Pita nwere n’ebe ọ nọ. Mgbe ọ jụrụ ya nke ugboro atọ, Pita zara, sị: “Onyenwe anyị, ị maara ihe nile; ị maara na m nwere mmetụta na-ekpo ọkụ n’ebe ị nọ.” N’ezie, Jizọs, bụ́ onye pụrụ ịma ihe dị mmadụ n’obi, maara nke ọma ịhụnanya na mmetụta na-ekpo ọkụ Pita nwere n’ebe ọ nọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs nyere Pita ohere ikwupụta n’ụzọ doro anya ịhụnanya o nwere. Tụkwasị na nke ahụ, Jizọs nyere Pita ọrụ ‘ịzụ’ “obere ụmụ atụrụ” Ya. (Jọn 21:15-17) Tupu mgbe ahụ, e nyere Pita ọrụ ime nkwusa. (Luk 5:10) Ma ugbu a, n’igosipụta n’ụzọ dị ịrịba ama ntụkwasị obi o nwere n’ebe ọ nọ, Jizọs nyere ya ọrụ ọzọ bụ́ nnukwute ọrụ—ilekọta ndị ga-aghọ ụmụazụ Kraịst. Ntakịrị oge ka e mesịrị, Jizọs mere ka Pita kere òkè pụtara ìhè n’ọrụ ndị ahụ na-eso ụzọ rụrụ. (Ọrụ 2:1-41) Lee ka obi na-aghaghị isiworị ruo Pita ala ịmata na Jizọs agbagharawo ya, na ọ ka tụkwasịkwara ya obi!

 Ị̀ ‘Maara Ịhụnanya nke Kraịst Ahụ’?

20, 21. Olee otú anyị pụrụ isi ‘mara ịhụnanya nke Kraịst’ ahụ n’ụzọ zuru ezu?

20 N’ezie, Okwu Jehova kọwara ịhụnanya Kraịst n’ụzọ mara mma. Otú ọ dị, olee otú anyị kwesịrị isi gosighachi Jizọs ịhụnanya? Bible na-agba anyị ume “ịmara ịhụnanya nke Kraịst ahụ bụ́ nke karịrị ihe ọmụma.” (Ndị Efesọs 3:19) Dị ka anyị hụworo, ihe ndị e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ banyere ndụ na ije ozi Jizọs na-akụziri anyị ihe dị ukwuu banyere ịhụnanya Kraịst. Otú ọ dị, “ịmara ịhụnanya nke Kraịst ahụ” n’ụzọ zuru ezu na-agụnye ihe karịrị nanị ịma ihe Bible kwuru banyere Ya.

21 Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ịmara” pụtara ịmara ihe “site n’omume, site n’ahụmahụ.” Mgbe anyị gosiri ịhụnanya otú Jizọs si gosi ya—jiri achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-enye onwe anyị n’ihi ndị ọzọ, jiri ọmịiko na-eme ihe banyere mkpa ha, na-agbaghara ha site n’obi anyị—mgbe ahụ anyị pụrụ ịghọta n’ezie mmetụta o nwere. N’ụzọ dị otú a, anyị na-esite n’ahụmahụ ‘mara ịhụnanya nke Kraịst ahụ bụ́ nke karịrị ihe ọmụma.’ Ka anyị gharakwa ichefu ya echefu na ka anyị na-adịkwu ka Kraịst, otú ahụ ka anyị ga na-abịarukwu onye ahụ Jizọs ṅomiri n’ụzọ zuru okè nso, bụ́ Chineke anyị nke na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova.

^ par. 11 Iwu ndị rabaị nyere kwuru na ọ dịghị onye kwesịrị ịbịaru onye ekpenta nso ruo kubit anọ (ihe dị ka mita 1.8). Ma ọ bụrụ na ifufe na-efe, onye ekpenta ahụ aghaghị ịnọ 100 kubit (ihe dị ka mita 45) ma ọ dịkarịa ala site n’ebe onye ahụ́ dị nọ. Akwụkwọ bụ́ Midrash Rabbah kọrọ banyere otu onye rabaị nke zopụnahụrụ ndị ekpenta nakwa banyere onye rabaị ọzọ nke tụrụ ndị ekpenta nkume iji chụọ ha. Ya mere, ndị ekpenta maara otú ịbụ onye a jụrụ ajụ si egbu mgbu n’obi nakwa otú ọ na-adị ịbụ onye a na-asọ oyi na onye a na-achọghị.

^ par. 16 E wepụrụ akụkụ nke mbụ nke Luk 23:34 n’ụfọdụ ihe odide oge ochie. Otú ọ dị, n’ihi na okwu ndị a dị n’ọtụtụ ihe odide ndị ọzọ a nakweere, e tinyere ha ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na n’ọtụtụ nsụgharị ndị ọzọ. Ihe àmà na-egosi na Jizọs na-ekwu banyere ndị agha Rom, bụ́ ndị kpọgburu ya. Ha amaghị ihe ha na-eme, ha amaghị onye Jizọs bụ n’ezie. N’ezie, ikpe mara nnọọ ndị ndú okpukpe ahụ karị, bụ́ ndị mere ka e gbuo ya, n’ihi na ha ma ụma jiri obi ọjọọ mee ihe ha mere. Nye ọtụtụ n’ime ha, ọ gaghị ekwe omume ịgbaghara ha.—Jọn 11:45-53.