Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 30

‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Ịhụnanya’

‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Ịhụnanya’

1-3. Gịnị na-esi na ya apụta mgbe anyị na-eṅomi ihe nlereanya Jehova nke igosi ịhụnanya?

“A NA-ENWE obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Okwu ndị ahụ Jizọs kwuru na-emesi eziokwu a dị mkpa ike: Ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị na-eweta ụgwọ ọrụ n’onwe ya. Ọ bụ ezie na a na-enweta obi ụtọ dị ukwuu n’ịbụ onye e gosiri ịhụnanya, a na-enwe ọbụna obi ụtọ ka ukwuu n’igosi ndị ọzọ ịhụnanya.

2 Ọ dịghị onye maara nke a karịa Nna anyị nke eluigwe. Dị ka anyị hụrụ n’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ ná nkebi a, Jehova bụ ihe nlereanya kasịnụ nke ịhụnanya. Ọ dịghị onye gosiworo ịhụnanya n’ụzọ dị ukwuu ma ọ bụ ruo ogologo oge karịa ya. Mgbe ahụ, ọ̀ bụ ihe ijuanya na a kpọrọ Jehova “Chineke onye obi ụtọ”?—1 Timoti 1:11.

3 Chineke anyị nke na-ahụ n’anya chọrọ ka anyị gbalịa ịdị ka ya, karịsịa ma a bịa n’igosi ịhụnanya. Ndị Efesọs 5:1, 2 na-agwa anyị, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, nọgidekwanụ na-eje ije n’ịhụnanya.” Mgbe anyị na-eṅomi ihe nlereanya Jehova nke igosi ịhụnanya, anyị na-enweta obi ụtọ ka ukwuu nke na-abịa site n’inye ihe. Anyị na-enwekwa afọ ojuju nke na-abịa site n’ịmara na anyị na-eme ihe dị Jehova ụtọ, n’ihi na Okwu ya na-adụ anyị ọdụ ka anyị ‘na-ahụrịta ibe anyị n’anya.’ (Ndị Rom 13:8) Ma a ka nwere ihe ndị ọzọ mere anyị kwesịrị iji ‘nọgide na-eje ije n’ịhụnanya.’

Ihe Mere Ịhụnanya Ji Dị Oké Mkpa

4, 5. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-egosi ndị kwere ekwe ibe anyị ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà?

4 Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-egosi ndị kwere ekwe ibe anyị ịhụnanya? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ịhụnanya bụ ụzọ bụ́ isi nke isi gosipụta ezi Iso Ụzọ Kraịst. Ma ịhụnanya adịghị, anyị na Ndị Kraịst ibe anyị apụghị inwe nkekọ chiri anya, nke kakwa  mkpa, anyị agaghị abụ ihe ọ bụla n’anya Jehova. Tụlee otú Okwu Chineke si eme ka eziokwu ndị a pụta ìhè.

5 N’abalị ikpeazụ ọ dịrị ndụ n’elu ala, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) “Dị nnọọ ka m hụworo unu n’anya”—ee, e nyere anyị iwu igosi ụdị ịhụnanya ahụ Jizọs gosipụtara. N’Isi nke 29, anyị hụrụ na Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya n’igosi ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà, na-ebute mkpa na ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ tupu ndị nke ya. Anyị onwe anyị kwa aghaghị igosipụta ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị, anyị ga na-egosipụtakwa ya n’ụzọ pụtara ìhè nke na ndị na-anọghị n’ọgbakọ Ndị Kraịst ga na-ahụ ya. N’ezie, ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà maka ụmụnna bụ akara e ji amata anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst n’ezie.

6, 7. (a) Olee otú anyị si mara na Okwu Jehova ji igosi ịhụnanya kpọrọ ihe nke ukwuu? (b) Okwu Pọl nke e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 13:4-8 lekwasịrị anya n’akụkụ dị aṅaa nke ịhụnanya?

6 Gịnị ma ọ bụrụ na anyị enweghị ịhụnanya? “Ọ bụrụ na . . . enweghị m ịhụnanya,” ka Pọl onyeozi kwuru, “aghọwo m ngwá egwú bras na-ada ụda ma ọ bụ ngwá egwú simbal na-akụkọta ọnụ.” (1 Ndị Kọrint 13:1) Ngwá egwú simbal na-akụkọta ọnụ na-ada ụda na-agba agba ná ntị. Gịnị banyere ngwá egwú bras na-ada ụda? Nsụgharị ndị ọzọ na-ekwu, “ogele nke na-eme ụzụ” ma ọ bụ “ogele na-adasi ụda ike.” Lee ihe atụ dabara adaba ha bụ! Onye na-adịghị ahụ n’anya yiri ngwá egwú na-ada oké ụda, ụda na-adachi ntị, nke ndị mmadụ na-agbara ọsọ kama inwe mmasị igere ya. Olee otú onye dị otú ahụ na ndị ọzọ pụrụ isi na-enwe mmekọrịta chiri anya? Pọl kwukwara, sị: “Ọ bụrụkwa na m nwere okwukwe nile iji bufee ugwu n’ebe ọzọ, ma enweghị m ịhụnanya, ọ dịghị ihe m bụ.” (1 Ndị Kọrint 13:2) Cheedị echiche, onye na-adịghị ahụ n’anya bụ “onye na-abaghị uru ọ bụla,” ọrụ ọ bụla ọ sọkwara ya rụọ! (The Amplified Bible) Ọ̀ bụ na o doghị anya na Okwu Jehova ji igosi ịhụnanya kpọrọ ihe nke ukwuu?

7 Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi gosipụta àgwà a n’ụzọ anyị si  emeso ndị ọzọ? Iji zaa ya, ka anyị nyochaa ihe Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrint 13:4-8. Ihe e mesiri ike n’amaokwu ndị a abụghị ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ ma ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ. Kama nke ahụ, Pọl lekwasịrị anya n’otú anyị kwesịrị isi na-egosirịta ibe anyị ịhụnanya. Ọ kọwara ihe ịhụnanya na-eme na ihe ọ na-adịghị eme.

Ihe Ịhụnanya Na-eme

8. Olee otú ogologo ntachi obi pụrụ isi nyere anyị aka ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ?

8 “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi.” Inwe ogologo ntachi obi pụtara iji ndidi na-anagide ihe ndị ọzọ na-eme. (Ndị Kọlọsi 3:13) Ọ̀ bụ na ndidi dị otú ahụ adịghị anyị mkpa? Ebe anyị bụ ndị e kere eke na-ezughị okè, ndị na-ejekọ ozi ọnụ, ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na site n’oge ruo n’oge, ụmụnna anyị Ndị Kraịst pụrụ ịkpasu anyị iwe, anyị pụkwara ịkpasu ha iwe. Ma ndidi  na ntachi obi pụrụ inyere anyị aka idi nghọtahie na ụmụ obere mkpasu iwe ndị na-ebilite mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe—n’akpaghasịghị udo nke ọgbakọ.

9. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi na-egosi ndị ọzọ obiọma?

9 “Ịhụnanya nwere . . . obiọma.” A na-egosi obiọma site n’omume na-enye aka nakwa okwu ndị na-egosi nchebara echiche. Ịhụnanya na-akpali anyị ịchọ ụzọ isi gosi obiọma, karịsịa n’ebe ndị nọ n’oké mkpa nọ. Dị ka ihe atụ, owu pụrụ ịdị na-ama onye kwere ekwe ibe anyị nke meworo agadi, ọ pụkwara ịchọ nleta na-agba ume. Nne nanị ya na-azụ ụmụ ma ọ bụ nwanna nwanyị nke bi n’ezinụlọ kewara ekewa n’ụzọ okpukpe pụrụ ịchọ enyemaka ụfọdụ. Onye ahụ́ na-adịghị ma ọ bụ onye na-enwe nsogbu pụrụ ịchọ ịnụ okwu ọma site n’ọnụ otu ezigbo enyi ya. (Ilu 12:25; 17:17) Mgbe anyị na-ebute ụzọ n’igosi obiọma n’ụzọ ndị dị otú ahụ, anyị na-egosipụta na ịhụnanya anyị bụ nke ezigbo ya.—2 Ndị Kọrint 8:8.

10. Olee otú ịhụnanya si enyere anyị aka ịkwado nakwa ikwu eziokwu, ọbụna mgbe ime otú ahụ na-adịghị mfe?

10 “Ịhụnanya . . . na-aṅụrịrị eziokwu ọṅụ.” Nsụgharị ọzọ sịrị: “Ịhụnanya . . . na-eji ọṅụ adụnyere eziokwu úkwù.” Ịhụnanya na-akwali anyị ịkwado eziokwu na ‘ịgwa ibe anyị eziokwu.’ (Zekaraịa 8:16) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye anyị hụrụ n’anya mere mmehie dị oké njọ, ịhụnanya anyị n’ebe Jehova nọ—nakwa n’ebe onye ahụ mere mmehie nọ—ga-enyere anyị aka ịkwado ụkpụrụ Chineke kama ịnwa izochi mmehie ahụ, inye ihe ngọpụ, ma ọ bụ ọbụna ịgha ụgha banyere ya. N’eziokwu, ọ pụrụ isi ike ikweta ihe ndị merenụ. Ma n’iburu ọdịmma nke onye anyị hụrụ n’anya n’obi, anyị ga-achọ ka o nweta ma nakwere ịdọ aka ná ntị Chineke ji ịhụnanya na-enye. (Ilu 3:11, 12) Dị ka Ndị Kraịst na-ahụ n’anya, anyị na-achọkwa “ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.”—Ndị Hibru 13:18.

11. N’ihi na ịhụnanya “na-edi ihe nile,” gịnị ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ime banyere amaghị eme nke ndị kwere ekwe ibe anyị?

11 “Ịhụnanya . . . na-edi ihe nile.” Okwu ahụ pụtara n’ụzọ nkịtị, “ihe nile ka ọ na-ekpuchi.” (Kingdom Interlinear) Pita nke Mbụ 4:8 na-ekwu, sị: “Ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” Ee, ọ naghị adị Onye Kraịst nke ịhụnanya na-eduzi ọkụ n’obi ịgba ezughị  okè na amaghị eme nile nke ụmụnna ya Ndị Kraịst n’anwụ. Ọtụtụ mgbe, njehie na mmejọ nke ndị kwere ekwe ibe anyị na-adị obere, a pụkwara iji ịhụnanya kpuchie ha.—Ilu 10:12; 17:9.

Ịhụnanya na-akpali anyị ikwupụta na anyị nwere obi ike n’ebe ụmụnna anyị nọ

12. Olee otú Pọl onyeozi si gosi na ya kwere ihe kasị mma banyere Faịlimọn, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Pọl?

12 “Ịhụnanya . . . na-ekwere ihe nile.” Nsụgharị nke Moffatt na-ekwu na ịhụnanya “na-achọsi ike mgbe nile ikwere ihe kasị mma.” Anyị adịghị enyo ndị kwere ekwe ibe anyị enyo gabiga ókè, na-enyo ebumnobi ha nile enyo. Ịhụnanya na-enyere anyị aka “ikwere ihe kasị mma” banyere ụmụnna anyị na ịtụkwasị ha obi. * Lee otu ihe atụ n’akwụkwọ ozi Pọl degaara Faịlimọn. Pọl dere akwụkwọ ozi ahụ iji gbaa Faịlimọn ume ka o jiri obiọma nabata ohu ya gbapụrụ agbapụ bụ́ Onesịmọs, onye ghọworo Onye Kraịst. Kama ịnwa ịrụgide Faịlimọn, Pọl rịọrọ ya arịrịọ na-adabere n’ịhụnanya. O kwupụtara obi ike o nwere na Faịlimọn ga-eme ihe kwesịrị ekwesị, na-asị: “N’ịtụkwasị obi na ị ga-ekwere, ana m edetara gị akwụkwọ, ebe m maara na ị ga-eme ọbụna karịa ihe ndị m na-ekwu.” (Faị Amaokwu 21) Mgbe ịhụnanya kpaliri anyị ikwupụta na anyị nwere obi ike dị otú ahụ n’ebe ụmụnna anyị nọ, anyị na-eme ka ha gosipụta àgwà ha kasị mma.

13. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-atụ anya ihe kasị mma maka ụmụnna anyị?

13 “Ịhụnanya . . . na-enwe olileanya ihe nile.” N’agbanyeghị na ịhụnanya na-atụkwasị obi n’ihe, ọ na-enwekwa olileanya. N’ịbụ ndị ịhụnanya na-akwali, anyị na-atụ anya ihe kasị mma maka ụmụnna anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwanna “azọhie ụkwụ tupu ya amara banyere ya,” anyị na-enwe olileanya na ọ ga-anakwere mgbalị ndị e ji ịhụnanya na-eme iji gbazie ya. (Ndị Galeshia 6:1) Anyị na-enwekwa olileanya na ndị na-adịghị ike n’okwukwe ga-enwetaghachi onwe ha. Anyị na-enwe ndidi n’ebe ndị dị otú ahụ nọ, na-eme ihe anyị nwere ike ime iji nyere ha aka ịghọ ndị dị ike n’okwukwe. (Ndị Rom 15:1; 1 Ndị Tesalonaịka  5:14) Ọ bụrụgodị na onye anyị hụrụ n’anya agahie, anyị adịghị akwụsị inwe olileanya na otu ụbọchị, anya ga-edo ya, ya alaghachikwutekwa Jehova, dị ka nwa mmefu ahụ a kọrọ maka ya n’ilu Jizọs mere.—Luk 15:17, 18.

14. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka a pụrụ isi lee ntachi obi anyị ule n’ime ọgbakọ, oleekwa otú ịhụnanya ga-esi nyere anyị aka imeghachi omume?

14 “Ịhụnanya . . . na-atachiri ihe nile obi.” Ntachi obi na-eme ka anyị nwee ike ịkwụsi ike mgbe anyị na-enwetaghị ihe anyị tụrụ anya ya ma ọ bụ mgbe anyị zutere ihe isi ike. Ule nke ntachi obi adịghị abịa nanị site n’aka ndị na-anọghị n’ọgbakọ. Mgbe ụfọdụ, a pụrụ ile anyị ule site n’aka ndị nọ n’ọgbakọ. N’ihi ezughị okè, ụmụnna anyị pụrụ mgbe ụfọdụ ime ihe anyị na-atụghị anya ya. Okwu a na-echeghị eche pụrụ iwe anyị iwe. (Ilu 12:18) Ikekwe, e lebaraghị otu okwu metụtara ọgbakọ anya otú anyị chere e kwesịrị isi lebara ya anya. Ihe nwanna a na-akwanyere ùgwù mere pụrụ iwute anyị, mee ka anyị chee, sị, ‘Olee otú Onye Kraịst ga-esi mee ụdị ihe a?’ Mgbe ọnọdụ ndị dị otú ahụ chere anyị ihu, ànyị ga-ahapụ ọgbakọ ma kwụsị ijere Jehova ozi? Anyị agaghị eme otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị nwere ịhụnanya! Ee, ịhụnanya na-eme ka anyị ghara ịbụ ndị mmejọ nke otu nwanna kpuchiri nnọọ anya nke na anyị apụkwaghị ịhụ ihe ọ bụla dị mma n’ebe ọ nọ ma ọ bụ n’ebe ọgbakọ dum n’ozuzu ya dị. Ịhụnanya na-eme ka anyị nwee ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke ma na-akwado ọgbakọ n’agbanyeghị ihe mmadụ ọzọ na-ezughị okè pụrụ ikwu ma ọ bụ mee.—Abụ Ọma 119:165.

Ihe Ịhụnanya Na-adịghị Eme

15. Gịnị bụ ekworo na-ekwesịghị ekwesị, oleekwa otú ịhụnanya si enyere anyị aka izere mmetụta uche a na-emebi ihe?

15 “Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.” Ekworo na-ekwesịghị ekwesị pụrụ ime ka anyị na-enwe anyaụfụ n’ihe ndị ọzọ nwere—ihe onwunwe ha, ngọzi ndị ha nwere, ma ọ bụ ikike ha. Udị ekworo ahụ bụ mmetụta uche na-emebi ihe, nke na-achọ ọdịmma onwe ya nanị, ọ pụrụ ịkpaghasị udo nke ọgbakọ ma ọ bụrụ na a chịkwaghị ya. Gịnị ga-enyere anyị aka iguzogide ‘ọchịchọ inwe anyaụfụ’? (Jems 4:5) N’otu okwu, ọ bụ ịhụnanya. Àgwà a dị oké  ọnụ ahịa pụrụ ime ka anyị nwee ike iso ndị o yiri ka ha nwere ihe ndabara ụfọdụ ná ndụ, ndị anyị na-enweghị, na-aṅụrị ọṅụ. (Ndị Rom 12:15) Ịhụnanya na-enyere anyị aka ịghara iwere ya dị ka ịma aka mgbe a jara mmadụ mma maka ikike pụrụ iche o nwere ma ọ bụ maka ihe dị ịrịba ama o mere.

16. Ọ bụrụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya n’ezie, gịnị mere anyị ga-eji zere iji ihe ndị anyị na-eme n’ozi Jehova na-etu ọnụ?

16 “Ịhụnanya . . . [adịghị] etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu.” Ịhụnanya na-egbochi anyị ime ihe n’ụzọ ime ka a hụ nkà ndị anyị nwere ma ọ bụ ihe ndị anyị rụzuru. Ọ bụrụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya n’ezie, olee otú anyị ga-esi jiri ihe ịga nke ọma ndị anyị na-enwe n’ozi ma ọ bụ ihe ùgwù ndị anyị nwere n’ọgbakọ na-etu ọnụ mgbe nile? Udị itu ọnụ ahụ pụrụ ime ka ndị ọzọ nwee nkụda mmụọ, ka ha na-eche na anyị karịrị ha. Ịhụnanya adịghị ekwe ka anyị jiri ihe ndị Chineke kwere ka anyị na-eme n’ozi ya na-etu ọnụ. (1 Ndị Kọrint 3:5-9) E kwuwerị, ịhụnanya ‘adịghị afụli onwe ya elu,’ ma ọ bụ dị ka The New Testament in Modern English si kwuo ya, ọ dịghị “enwe mmasị n’inwe echiche gabigara ókè banyere mkpa ya onwe ya dị.” Ịhụnanya na-egbochi anyị iwere onwe anyị dị ka ndị dị oké mkpa.—Ndị Rom 12:3.

17. Ịhụnanya na-akpali anyị igosi nchebara echiche dị aṅaa n’ebe ndị ọzọ nọ, ụdị omume dịkwa aṅaa ka anyị ga-esi otú a zere?

17 “Ịhụnanya . . . [adịghị] akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị.” Onye na-akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị na-eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma ma ọ bụ n’ụzọ na-akpasu iwe. Ime otú ahụ adịghị egosi ịhụnanya, n’ihi na ọ na-egosi ejighị mmetụta na ọdịmma nke ndị ọzọ kpọrọ ihe ma ọlị. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ịhụnanya nwere àgwà ọma nke na-akpali anyị ichebara ndị ọzọ echiche. Ịhụnanya na-eme ka a na-akpa ezi àgwà, ka a na-eme omume ndị Chineke kwadoro ma na-akwanyere ndị kwere ekwe ibe anyị ùgwù. Ya mere, ịhụnanya agaghị ekwe ka anyị tinye aka ‘n’omume na-eweta ihere’—n’ezie, omume ọ bụla ga-awụ ụmụnna anyị Ndị Kraịst akpata oyi n’ahụ́ ma ọ bụ wute ha.—Ndị Efesọs 5:3, 4.

18. Gịnị mere onye na-ahụ n’anya na-adịghị eji achọ ka a na-eme ihe nile otú ọ chọrọ?

18 “Ịhụnanya . . . [adịghị] achọ ọdịmma nke ya.” Nsụgharị Revised Standard Version na-ekwu n’ebe a, sị: “Ịhụnanya adịghị esi  ọnwụ ka e mee ihe otú ya onwe ya chọrọ.” Onye na-ahụ n’anya adịghị achọ ka a na-eme ihe nile otú ọ chọrọ, dị ka a ga-asị na echiche ya na-abụ nke ziri ezi mgbe nile. Ọ dịghị eji aghụghọ achịkwa ndị ọzọ, jiri ikike o nwere ime ka ndị ọzọ kwere ihe ọ na-ekwu eme ka ike gwụ ndị nwere echiche dị iche na nke ya. Ụdị ịgba isi akwara ahụ ga-egosi na onye ahụ dịtụ mpako, Bible na-ekwukwa, sị: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga.” (Ilu 16:18) Ọ bụrụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya n’ezie, anyị ga na-akwanyere echiche ha ùgwù, n’ebe o kwekwara mee, anyị ga-egosi na anyị dị njikere ịhapụ echiche nke anyị. Mmụọ ịhapụ echiche onwe onye ma kwenye na nke onye ọzọ kwekọrọ n’ihe Pọl kwuru: “Ka onye ọ bụla nọgide na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.”—1 Ndị Kọrint 10:24.

19. Olee ihe ịhụnanya na-akpali anyị ime mgbe ndị ọzọ kpasuru anyị iwe?

19 “Ịhụnanya . . . [adịghị] abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ.” Ihe ndị ọzọ kwuru ma ọ bụ mee adịghị akpasu ịhụnanya iwe ngwa ngwa. N’eziokwu, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị bụ́ iwe iwe mgbe ndị ọzọ mejọrọ anyị. Ma ọ bụrụgodị na anyị ewee iwe n’ụzọ ziri ezi, ịhụnanya adịghị ekwe ka anyị nọgide na-ewe iwe. (Ndị Efesọs 4:26, 27) Anyị agaghị na-agụkọ okwu ma ọ bụ omume ndị were anyị iwe, dị ka ànyị na-edetu ha n’akwụkwọ ndekọ ihe ka anyị ghara ichefu ha echefu. Kama nke ahụ, ịhụnanya na-akpali anyị iṅomi Chineke anyị nke na-ahụ n’anya. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 26, Jehova na-agbaghara mgbe e nwere ezigbo ihe mere ọ ga-eji mee otú ahụ. Mgbe ọ gbaghaara anyị, ọ na-echefu ya, ya bụ, ọ dịghị enye anyị ahụhụ n’ọdịnihu n’ihi mmehie ndị ahụ. Ọ̀ bụ na anyị enweghị ekele na Jehova adịghị agụkọ ihe ọjọọ?

20. Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume ma ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe anyị adaba ná mmehie ma nọrọ ná nsogbu n’ihi ya?

20 “Ịhụnanya . . . [adịghị] aṅụrịrị ajọ omume ọṅụ.” The New English Bible na-ekwu n’ebe a, sị: “Ịhụnanya . . . adịghị enwe obi ụtọ ná mmehie nke ndị ọzọ.” Nsụgharị nke Moffatt na-ekwu, sị: “Ọ dịghị mgbe ịhụnanya na-enwe obi ụtọ mgbe ndị ọzọ mere mmehie.” Ajọ omume adịghị atọ ịhụnanya ụtọ, n’ihi ya, anyị adịghị elefuru ụdị omume ọ bụla rụrụ arụ anya. Olee ihe anyị na-eme ma ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe anyị adaba ná mmehie ma  nọrọ ná nsogbu n’ihi ya? Ịhụnanya agaghị ekwe ka anyị ṅụrịa ọṅụ, dị ka ànyị na-asị, ‘Ehee! Ọ bụ ihe kwesịrị ya!’ (Ilu 17:5) Otú ọ dị, anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe nwanna nke mehieworonụ mere ihe pụtara ìhè iji si n’ada ọ dara n’ụzọ ime mmụọ bilie.

“Ụzọ Kasị Mma”

21-23. (a) Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị na “ịhụnanya adịghị ada ada”? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiakwụkwọ nke ikpeazụ?

21 “Ịhụnanya adịghị ada ada.” Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe o kwuru nke a? Dị ka ihe ndị gbara ya gburugburu na-egosi, ọ nọ na-ekwu okwu banyere onyinye dị iche iche nke mmụọ nsọ nke Ndị Kraịst oge mbụ nwere. Onyinye ndị ahụ bụ ihe ịrịba ama ndị na-egosi na Chineke nọnyeere ọgbakọ ahụ e guzobere ọhụrụ. Ma ọ bụghị Ndị Kraịst nile pụrụ ịgwọ ọrịa, ibu amụma, ma ọ bụ ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche. Otú ọ dị, ọ dịghị ihe nke  ahụ mere; onyinye ọrụ ebube ndị ahụ ga-emesịa kwụsị. Ma, ọ dị ihe ga-afọdụ, bụ́ ihe Onye Kraịst ọ bụla pụrụ ịzụlite. Ọ dị mkpa, na-adịtekwa aka karịa onyinye ọrụ ebube ọ bụla. N’ezie, Pọl kpọrọ ya “ụzọ kasị mma.” (1 Ndị Kọrint 12:31) Gịnị bụ ‘ụzọ a kasị mma’? Ọ bụ ụzọ nke ịhụnanya.

E ji ịhụnanya ndị Jehova nwere n’ebe ibe ha nọ amata ha

22 N’ezie, ịhụnanya Ndị Kraịst nke Pọl kọwara “adịghị ada ada,” ya bụ, ọ dịghị mgbe ọ ga-abịa ná njedebe. Ruo taa, e ji ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà maka ụmụnna amata ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ọ̀ bụ na anyị adịghị ahụ ihe àmà nke ịhụnanya dị otú ahụ n’ọgbakọ nke ndị na-efe Jehova ofufe n’ụwa nile? Ịhụnanya ahụ ga-adịru mgbe ebighị ebi, n’ihi na Jehova kwere ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi nkwa ndụ ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:9-11, 29) Ka anyị nọgide na-eme ike anyị nile iji ‘nọgide na-eje ije n’ịhụnanya.’ Site n’ime otú ahụ, anyị pụrụ inweta obi ụtọ ka ukwuu nke na-abịa site n’inye ihe. Nke ka nke, anyị pụrụ ịdịrị ndụ na-aga—ee, ịnọgide na-ahụ n’anya—ruo mgbe nile ebighị ebi, n’iṅomi Chineke anyị nke na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova.

23 N’isiakwụkwọ a bụ́ nke ikpeazụ ná nkebi na-ekwu banyere ịhụnanya, anyị atụlewo otú anyị pụrụ isi na-egosirịta ibe anyị ịhụnanya. Ma n’iburu n’uche ọtụtụ ụzọ ndị anyị si erite uru n’ịhụnanya Jehova—sitekwa n’ike ya, ikpe ziri ezi ya, na amamihe ya—anyị kwesịrị ịjụ, sị, ‘Olee otú m pụrụ isi gosi Jehova na m hụrụ ya n’anya n’ezie?’ A ga-aza ajụjụ ahụ n’isiakwụkwọ ikpeazụ anyị.

^ par. 12 Otú ọ dị, ọ pụtaghị ma ọlị na ịhụnanya Ndị Kraịst dị mfe nghọgbu. Bible na-agba anyị ume, sị: “Na-elegide ha anya bụ́ ndị na-akpata nkewa na ọnọdụ ndị na-akpata ịsụ ngọngọ . . . , na-ezerekwanụ ha.”—Ndị Rom 16:17.