Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 24

Ọ Dịghị Ihe Pụrụ “Ikewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke”

Ọ Dịghị Ihe Pụrụ “Ikewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke”

1. Olee echiche na-ezighị ezi ọtụtụ ndị, gụnyere ụfọdụ ezi Ndị Kraịst, na-enwe?

JEHOVA CHINEKE ọ̀ hụrụ gị onwe gị n’anya? Ụfọdụ ndị kwetara na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’ozuzu ha n’anya, dị ka Jọn 3:16 na-ekwu. Ma ha na-eche dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị: ‘Chineke apụghị ịhụ mụ onwe m n’anya.’ Ọbụna ezi Ndị Kraịst pụrụ mgbe ụfọdụ inwe obi abụọ banyere nke a. N’ịbụ onye nwere nkụda mmụọ, otu nwoke kwuru, sị: “Ọ na-esiri m oké ike ikweta na Chineke na-eche banyere m ma ọlị.” Ị̀ na-enwe ụdị obi abụọ ahụ mgbe ụfọdụ?

2, 3. Ònye chọrọ ime ka anyị kweta na anyị abaghị n’ihe ma ọ bụ na anyị bụ ndị Jehova na-apụghị ịhụ n’anya, oleekwa otú anyị pụrụ isi lụsoo echiche ahụ ọgụ?

2 Ọ na-agụsi Setan agụụ ike ime ka anyị kweta na Jehova Chineke ahụghị anyị n’anya, na o jighịkwa anyị kpọrọ ihe. N’eziokwu, Setan na-arafukarị ndị mmadụ site n’ime ka onwe ha na-ebu ha isi, nakwa ka ha na-adị mpako. (2 Ndị Kọrint 11:3) Ma ọ na-enwekwa mmasị n’ibibi ùgwù onwe onye nke ndị dịịrị ya mfe inweta nwere. (Jọn 7:47-49; 8:13, 44) Ọ na-eme otú ahụ karịsịa “n’ụbọchị ikpeazụ” ndị a pụrụ iche. Ọtụtụ ndị taa na-etolite n’ezinụlọ ebe a na-adịghị egosi mmetụta “obi mmadụ.” Ndị ọzọ na-ezute mgbe nile ndị na-eme ihe ike ike, ndị na-achọ nanị ọdịmma onwe ha, na ndị isi ike. (2 Timoti 3:1-5) Ọtụtụ afọ ha nọworo na-edi mmeso ọjọọ, ịkpa ókè agbụrụ, ma ọ bụ ịkpọasị pụrụ imeworị ka ndị dị otú ahụ kwenyesie ike na ha abaghị uru ma ọ bụ na ha bụ ndị a na-apụghị ịhụ n’anya.

3 Ọ bụrụ na ị chọpụta na ị na-enwe mmetụta dị otú ahụ na-ezighị ezi n’ime onwe gị, adala mbà. Ọtụtụ n’ime anyị na-ama onwe anyị ikpe n’ụzọ ezi uche na-adịghị na ya site n’oge ruo n’oge. Ma cheta na e dere Okwu Chineke iji ‘mee ka ihe guzozie’  nakwa maka “ikpu ihe ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike ihu.” (2 Timoti 3:16; 2 Ndị Kọrint 10:4) Bible na-ekwu, sị: “Anyị ga-emekwa ka obi sie anyị ike n’ihu ya banyere ihe ọ bụla obi anyị nwere ike ịma anyị ikpe na ya, n’ihi na Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe nile.” (1 Jọn 3:19, 20) Ka anyị tụlee ụzọ anọ Akwụkwọ Nsọ si na-enyere anyị aka ‘ime ka obi sie anyị ike’ na Jehova hụrụ anyị n’anya.

Jehova Ji Gị Kpọrọ Ihe

4, 5. Olee otú ilu Jizọs banyere nza si egosi na Jehova ji anyị kpọrọ ihe?

4 Nke mbụ, Bible na-akụzi kpọmkwem na Chineke na-ahụ ihe bara uru n’ime onye ọ bụla ná ndị na-ejere ya ozi. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na a dịghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego nke ga-azụta nanị ihe dị nta? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala Nna unu aghara ịma. Ma a gụwo ntutu nile nke isi unu ọnụ. Ya mere unu atụla egwu: Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” (Matiu 10:29-31) Tụlee ihe okwu ndị ahụ pụtara nye ndị na-ege Jizọs ntị na narị afọ mbụ.

“Unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza”

5 Anyị pụrụ ịdị na-eche ihe mere mmadụ ga-eji gaa zụọ otu nza. N’oge Jizọs, nza bụ nnụnụ a na-eri eri nke kasị ọnụ ala a na-ere ere. Rịba ama na mmadụ na-eji otu mkpụrụ ego nke dị nta azụta nza abụọ. Ma Jizọs mesịrị kwuo na ọ bụrụ na mmadụ dị njikere imefu mkpụrụ ego abụọ, ọ ga-azụta nza ise, ọ bụghị anọ. A na-eji otu nnụnụ meere ya mmezi dị ka a ga-asị na ọ baghị uru ọ bụla ma ọlị. Ikekwe, ihe ndị a e kere eke abaghị uru n’anya mmadụ, ma olee otú Onye Okike si ele ha anya? Jizọs sịrị: “A dịghị echefu otu n’ime ha [ọbụna nke ahụ e ji mee mmezi] n’ihu Chineke.” (Luk 12:6, 7) Ugbu a, anyị pụrụ ịmalite ịghọta isi ihe Jizọs na-ekwu. Ọ bụrụ na Jehova ji otu nza kpọrọ ihe otú ahụ, lee otú mmadụ si baa nnọọ uru karị! Dị ka Jizọs kọwara, Jehova maara ihe nile banyere anyị. Leenụ, a gụrụ ọbụna ntutu isi anyị ọnụ!

6. N’ihi gịnị ka anyị ji jide n’aka na ezi uche dị n’ihe Jizọs kwuru mgbe o kwuru banyere ntutu isi anyị ịbụ ndị a gụrụ ọnụ?

6 Na a gụrụ ntutu isi anyị ọnụ? Ụfọdụ pụrụ iwere ya na Jizọs  na-ekwu ihe ezi uche na-adịghị na ya n’ebe a. Otú ọ dị, chegodị echiche banyere olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ. Lee nnọọ otú Jehova na-aghaghị isi mara anyị nke ọma iji nwee ike ikeghachi anyị! O ji anyị kpọrọ ihe nke ukwuu nke na ọ na-echeta ihe nile, gụnyere ụkpụrụ nke mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị na ihe nile anyị na-echeta na ahụmahụ nile anyị nwere n’ime afọ nile anyị dịworo ndụ. * Ịgụ ntutu isi anyị ọnụ—nke ihe dị ka 100,000 na-etopụta n’isi otu onye—ga-abụ ihe ga-adị mfe omume ma e jiri ya tụnyere nke ahụ.

Gịnị Ka Jehova Na-ahụ n’Ime Anyị nke O Ji Kpọrọ Ihe?

7, 8. (a) Olee ụfọdụ àgwà Jehova na-enwe obi ụtọ ịhụ ka ọ na-enyocha obi ụmụ mmadụ? (b) Olee ụfọdụ n’ime ọrụ ndị anyị na-arụ ndị Jehova ji kpọrọ ihe?

7 Nke abụọ, Bible na-akụziri anyị ihe Jehova ji kpọrọ ihe n’ime ndị na-ejere ya ozi. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ezi àgwà anyị nakwa mgbalị ndị anyị na-etinye na-enye ya obi ụtọ. Eze Devid gwara nwa ya nwoke bụ́ Solomọn, sị: “Mkpụrụ obi nile ka Jehova na-enyocha, Ọ na-aghọtakwa nchepụta nile ọ bụla nke echiche.” (1 Ihe E Mere 28:9) Ka Chineke na-enyocha ọtụtụ ijeri obi ụmụ mmadụ n’ime ụwa a nke jupụtara n’ime ihe ike na ịkpọasị, lee ka ọ ga-esi nwee obi ụtọ mgbe ọ hụtara obi nke hụrụ udo, eziokwu, na ezi omume n’anya! Gịnị na-eme mgbe Chineke chọtara obi nke hụrụ ya n’anya nke ukwuu, nke na-achọ ịmụta banyere ya na ime ka ndị ọzọ nweta ihe ọmụma dị otú ahụ? Jehova na-agwa anyị na ya na-arịba ndị na-agwa ndị ọzọ banyere ya ama. O nwere ọbụna “akwụkwọ ncheta” maka ndị nile “ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha Ya.” (Malakaị 3:16) Àgwà ndị dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa nye ya.

 8 Gịnị bụ ọrụ ọma ụfọdụ ndị Jehova ji kpọrọ ihe? N’ezie, ọ bụ mgbalị anyị na-eme iṅomi Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. (1 Pita 2:21) Otu ọrụ dị oké mkpa nke Chineke ji kpọrọ ihe bụ ịgbasa ozi ọma nke Alaeze ya. Ná Ndị Rom 10:15, anyị na-agụ, sị: “Lee otú ha si maa mma ile anya bụ́ ụkwụ nke ndị na-akpọsa ozi ọma nke ihe ndị dị mma!” Anyị nwere ike anyị agaghị na-eche na ụkwụ nkịtị anyị ‘mara mma ile anya.’ Ma n’ebe a, ha na-anọchite anya mgbalị ndị na-ejere Jehova ozi na-eme n’ikwusa ozi ọma ahụ. Mgbalị nile dị otú ahụ mara mma ma dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

9, 10. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova na-eji ntachi obi anyị akpọrọ ihe n’agbanyeghị ihe isi ike dị iche iche? (b) Olee echiche na-ezighị ezi nke Jehova na-adịghị enwe banyere ndị na-ejere ya ozi kwesịrị ntụkwasị obi?

9 Jehova na-ejikwa ntachi obi anyị akpọrọ ihe. (Matiu 24:13) Cheta na Setan chọrọ ka ị gbakụta Jehova azụ. Ụbọchị ọ bụla i guzosiri ike n’ihe nye Jehova bụ ụbọchị ọzọ i nyeworo aka mee ka e nwee ihe a ga-eji zaghachi ịta ụta Setan. (Ilu 27:11) Mgbe ụfọdụ ịtachi obi anaghị adị mfe. Nsogbu ahụ́ ike, ihe isi ike ego,  nsogbu mmetụta uche, na ihe mgbochi ndị ọzọ pụrụ ime ka ụbọchị nke ọ bụla bụrụ ule. Atụmanya na-emezughị emezu pụkwara ịkpata nkụda mmụọ. (Ilu 13:12) Ntachi obi n’agbanyeghị ihe ịma aka ndị dị otú ahụ dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova ọbụna karị. Ọ bụ ya mere Eze Devid ji rịọ Jehova ka ọ gbanye anya mmiri ya n’ime “karama akpụkpọ,” jiri obi ike kwukwasị: “Hà adịghị n’akwụkwọ Gị?” (Abụ Ọma 56:8) Ee, Jehova na-eji anya mmiri nile na ahụhụ anyị na-ata ka anyị na-anọgidesi ike n’ihe nye ya akpọrọ ihe, ọ na-echetakwa ha. Ha dịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.

Jehova ji ntachi obi anyị na-enwe n’agbanyeghị ule kpọrọ ihe

10 Ugbu a, obi nke na-ama onye nwe ya ikpe pụrụ ịjụ ihe àmà dị otú ahụ nke na-egosi na Chineke ji anyị kpọrọ ihe. Ọ pụrụ ịnọgide na-atakwụnyere mmadụ, sị: ‘Ma e nwere ọtụtụ ndị ọzọ bụ́ ezi ihe nlereanya karịa m. Lee ka ọ na-aghaghị isi wute Jehova ma o jiri m tụnyere ha!’ Jehova adịghị eji mmadụ atụnyere ibe ya; ọ bụghịkwa onye na-adịghị agbanwe echiche ya ma ọ bụ onye nwere obi ọjọọ. (Ndị Galeshia 6:4) Ọ na-eji oké nghọta na-enyocha obi anyị, ọ na-ejikwa ihe ndị dị mma akpọrọ ihe—ọbụna mgbe e nwere ha n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta.

Jehova Na-ayọchapụta Ihe Ọma n’Ebe Ihe Ọjọọ Dị

11. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere Jehova n’ụzọ o si mee ihe n’ihe banyere Abaịja?

11 Nke atọ, ka Jehova na-enyocha anyị, ọ na-eji nlezianya na-eme myọcha, na-achọ ihe ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova kpebiri na a ga-egbu usoro ndị eze dum nke Eze Jeroboam bụ́ ndị si n’ezi ofufe dapụ, O nyere iwu ka e lie otu n’ime ụmụ eze, bụ́ Abaịja, otú kwesịrị ekwesị. N’ihi gịnị? “N’ihi na a hụrụ n’ime ya ezi ihe n’ebe Jehova, bụ́ Chineke [Izrel], nọ.” (1 Ndị Eze 14:1, 10-13) Ya bụ, Jehova yọchara obi nwa okorobịa ahụ ma chọta “ezi ihe” n’ebe ahụ. N’agbanyeghị otú ezi ihe ahụ dịruru ntakịrị, Jehova weere ya na ọ bụ ihe kwesịrị ka e detuo ya n’Okwu ya. Ọbụna na ọ kwụghachiri ya ụgwọ, meere otu onye ahụ si n’ezinụlọ ahụ nke si n’ezi ofufe dapụ ebere ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị.

12, 13. (a) Olee otú ihe banyere Eze Jehoshafat si egosi na Jehova na-achọ ezi ihe n’ime anyị ọbụna mgbe anyị mere mmehie? (b) Mgbe a bịara n’ihe banyere ọrụ na àgwà anyị ndị dị mma, olee otú Jehova si eme omume dị ka Nna hụrụ ụmụ ya n’anya?

 12 A pụrụ ịhụ ihe atụ kwesịrị ịrịba ama ọbụna karị n’ihe banyere ezigbo Eze Jehoshafat. Mgbe eze ahụ mere omume nzuzu, onye amụma Jehova gwara ya, sị: “N’ihi ihe a iwe dịkwasị[rị] gị site n’ihu Jehova.” Lee okwu na-akpali iche echiche nke ahụ bụ! Ma ozi Jehova akwụsịghị n’ebe ahụ. Ọ gara n’ihu, na-asị: “Otú ọ dị, a chọtawo ezi ihe n’aka gị.” (2 Ihe E Mere 19:1-3) Ya mere, iwe ezi omume Jehova emeghị ka ọ ghara ịhụta ezi ihe nke dị n’ime Jehoshafat. Lee ka o si dị iche n’ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ! Mgbe ndị ọzọ kpasuru anyị iwe, anyị pụrụ ileghara akụkụ ndị ha na-eme nke ọma na ha anya. Mgbe anyị mehiekwara, mmechuihu, ihere, na obi amamikpe nke anyị na-enwe pụrụ ime ka anyị ghara ịhụ ezi ihe n’ime onwe anyị. Otú ọ dị, cheta na ọ bụrụ na anyị echegharịa ná mmehie anyị ma gbalịsie ike ịghara ime ha ọzọ, Jehova na-agbaghara anyị.

13 Ka Jehova na-enyocha gị, ọ na-atụfusị mmehie ndị ahụ, dị nnọọ ka onye na-achọ ọlaedo nke ji ihe na-asachapụta ọlaedo si atụfusị ajịrịja nkume ndị na-abaghị uru. Gịnị  banyere àgwà na ọrụ gị ndị dị mma? Ee, ndị a bụ “mkpụrụ ọlaedo” ọ na-edebe! Ị̀ hụtụwo otú ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya si eji ihe osise ma ọ bụ ihe omume ụmụ ha mere n’ụlọ akwụkwọ akpọrọ ihe, mgbe ụfọdụ ruo ọtụtụ iri afọ mgbe ụmụaka ahụ chefuchaworo ha? Jehova bụ Nna kasị hụ ụmụ ya n’anya. Ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye ya, ọ dịghị mgbe ọ ga-echefu ọrụ ọma anyị na àgwà anyị ndị dị mma. N’eziokwu, ọ ga-ele ya anya dị ka ajọ omume ichefu ha, ọ bụghịkwanụ onye ajọ omume ma ọlị. (Ndị Hibru 6:10) Ọ na-ayọchakwa anyị n’ụzọ ọzọ.

14, 15. (a) Gịnị mere na ezughị okè anyị adịghị eme ma ọlị ka Jehova ghara ịhụ ezi ihe dị n’ime anyị? Nye ihe atụ. (b) Gịnị ka Jehova ga-eji ezi ihe ndị ọ hụtara n’ime anyị mee, oleekwa otú o si ele ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi anya?

14 Jehova na-ele anya gabiga ezughị okè anyị ma na-ahụ ihe anyị ga-emeli. Iji maa atụ: Ndị hụrụ ọrụ nkà n’anya na-etinye mgbalị pụrụ iche iji dozie ihe osise ma ọ bụ ọrụ nkà ndị ọzọ e mebiri n’ụzọ dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, mgbe otu onye nke ji égbè mebiri otu ihe osise ọnụ ahịa ya ruru nde $30 nke Leonardo da Vinci sere, nke dị n’Ụlọ Ngosi Ihe Nkà dị na London, England, ọ dịghị onye tụrụ aro na ebe ọ bụ na e mebiela ihe osise ahụ, ka a tụfuo ya. A malitere ọrụ idozigharị ọrụ nkà a bụ́ ịgba nke nọruworo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 500 ozugbo. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ dị oké ọnụ ahịa n’anya ndị hụrụ ọrụ nkà n’anya. Ọ̀ bụ na ị baghị uru karịa ihe e ji chọọkụ na unyi see? N’ezie, ị bara uru karịa ya n’anya Chineke—n’agbanyeghị otú i nweruru ntụpọ n’ihi mmehie e ketara eketa. (Abụ Ọma 72:12-14) Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike dị nkà, onye kere ezinụlọ mmadụ, ga-eme ihe dị mkpa iji mee ka ndị nile nabatara nlekọta ịhụnanya ya zughachi okè.—Ọrụ 3:21; Ndị Rom 8:20-22.

15 Ee, Jehova na-ahụ ihe ọma ndị dị n’ime anyị bụ́ ndị anyị nwere ike anyị agaghị ahụ n’ime onwe anyị. Ka anyị na-ejekwara ya ozi, ọ ga-eme ka ihe ọma ahụ na-eto ruo mgbe anyị ga-emesịa zuo okè. N’agbanyeghị otú ụwa Setan siworo mesoo anyị, Jehova ji ndị na-ejere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi kpọrọ ihe dị ka ihe a na-achọsi ike.—Hagaị 2:7.

 Jehova Na-egosipụta Ịhụnanya Ya n’Ụzọ Pụtara Ìhè

16. Gịnị bụ ihe àmà kasịnụ nke ịhụnanya Jehova n’ebe anyị nọ, oleekwa otú anyị si mara na onyinye a bụ maka anyị onwe anyị?

16 Nke anọ, Jehova na-eme ihe dị ukwuu iji gosipụta na ya hụrụ anyị n’anya. N’ezie, àjà mgbapụta Kraịst bụ azịza kasị dị irè nye ụgha Setan nke bụ́ na anyị bụ ndị na-abaghị uru ma ọ bụ ndị a na-apụghị ịhụ n’anya. Ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla na ọnwụ ahụhụ Jizọs nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ nakwa ọbụna ihe mgbu ka ukwuu nke Jehova diri ka ọ nọ na-ele Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ya anwụọ bụ ihe àmà nke ịhụnanya ha nwere n’ebe anyị nọ. N’ụzọ dị mwute, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta na onyinye a bụ maka ha. Ha na-eche na ha erughị eru. Otú ọ dị, cheta na Pọl onyeozi bụbu onye na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ma, o dere, sị: “Ọkpara Chineke . . . hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.”Ndị Galeshia 1:13; 2:20.

17. Site na gịnị ka Jehova na-adọta anyị n’ebe ya na Ọkpara ya nọ?

17 Jehova na-egosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ site n’inyere anyị aka n’otu n’otu irite uru n’àjà Kraịst. Jizọs sịrị: “Mmadụ ọ bụla apụghị ịbịakwute m ọ gwụla ma Nna m, bụ́ onye zitere m, ọ̀ dọtara ya.” (Jọn 6:44) Ee, Jehova n’onwe ya na-adọta anyị n’otu n’otu n’ebe Ọkpara ya nọ nakwa n’ebe olileanya nke ndụ ebighị ebi dị. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ọrụ nkwusa ahụ, bụ́ nke na-erute anyị n’otu n’otu, sitekwa na mmụọ nsọ ya, nke Jehova na-eji enyere anyị aka ịghọta eziokwu ime mmụọ nakwa itinye ha n’ọrụ n’agbanyeghị adịghị ike anyị na ezughị okè anyị. N’ihi ya, Jehova pụrụ ikwu banyere anyị dị ka o kwuru banyere Izrel, sị: “Ọ bụ ịhụnanya nke dị mgbe ebighị ebi ka m jiworo hụ gị n’anya: n’ihi nke a ka m meworo ka ebere m dịgidere gị.”—Jeremaịa 31:3.

18, 19. (a) Olee ụzọ kasịnụ Jehova si egosipụta ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ, gịnịkwa na-egosi na ọ bụ ya onwe ya na-aza ya? (b) Olee otú Okwu Chineke si emesi anyị obi ike na Jehova bụ onye na-eji ọmịiko ege ntị?

18 Ma eleghị anya ọ bụ site n’ihe ùgwù nke ikpe ekpere ka anyị na-ahụ ịhụnanya Jehova karịsịa. Bible na-akpọ onye ọ bụla n’ime anyị òkù ‘ikpegara Chineke ekpere n’akwụsịghị  akwụsị.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) Ọ na-ege ntị. Ọbụna na a na-akpọ ya “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) O nyefeghị onye ọzọ ọrụ a, ọbụnadị Ọkpara ya. Cheedị echiche: Onye Okike nke eluigwe na ala na-agba anyị ume iji nkwuwa okwu na-abịakwute ya n’ekpere. Ụdị onye dịkwa aṅaa nke na-ege ntị ka ọ bụ? Ọ̀ bụ onye ihe na-adịghị emetụ n’ahụ́, nke na-enweghị mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ? Ọ dịghị ma ọlị.

19 Jehova nwere ọmịiko. Gịnị bụ mmetụta ọmịiko? Otu Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nke meworo agadi kwuru, sị: “Mmetụta ọmịiko bụ ihe mgbu gị nke dị n’obi m.” Ihe mgbu anyị ọ̀ na-emetụ Jehova n’obi n’ezie? Anyị na-agụ banyere ahụhụ nke ndị ya bụ́ Izrel, sị: “Ná mkpagbu nile ha Ya ka a na-akpagbu.” (Aịsaịa 63:9) Ọ bụghị nanị na Jehova na-ahụ nsogbu ha; o nwere ọmịiko n’ebe ndị ya nọ. E gosipụtara oké mmetụta ọ na-enwe site n’ihe Jehova n’onwe ya gwara ndị na-ejere ya ozi, sị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ nwa anya [m NW].” * (Zekaraịa 2:8) Lee ka nke ahụ ga-esi na-afụ ụfụ! Ee, Jehova na-eche banyere anyị. Mgbe ihe na-ewute anyị, ọ na-ewutekwa ya.

20. Olee echiche na-ezighị ezi anyị na-aghaghị izere ma ọ bụrụ na anyị ga-erube isi na ndụmọdụ dị ná Ndị Rom 12:3?

20 Ọ dịghị Onye Kraịst isi zuru okè nke ga-ewere ihe àmà nke ịhụnanya Chineke na ojiji o ji ndị ohu ya kpọrọ ihe mere ihe ọ ga-eji na-anya isi ma ọ bụ na-etu ọnụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Site n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke e nyere m, ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka ọ dị mkpa iche; kama ka ọ na-eche echiche iji wee nwee uche zuru okè, onye ọ bụla dị ka Chineke kenyeworo ya ọ̀tụ̀tụ̀ nke okwukwe.” (Ndị Rom 12:3) Nsụgharị ọzọ na-ekwu n’ebe a, sị: “M ga-asị onye ọ bụla n’ime unu ka ọ ghara ibuli onwe ya elu karịa otú ọ hà n’ezie, kama ka ọ mara otú ọ hà n’ezie.” (A Translation in the Language of the People, nke Charles B. Williams,  sụgharịrị) Ya mere, ka anyị na-aṅụrị ọṅụ n’ịhụnanya nke Nna anyị nke eluigwe, ka anyị nwee uche zuru okè ma na-echeta na anyị erughị eru, anyị ekwesịghịkwa ekwesị inweta ịhụnanya Chineke.—Luk 17:10.

21. Olee ụgha ndị sitere n’aka Setan ndị anyị na-aghaghị ịnọgide na-ajụ, eziokwu dịkwa aṅaa nke dị n’ime Bible ka anyị pụrụ ịnọgide jiri na-emesi onwe anyị obi ike?

21 Ka onye ọ bụla n’ime anyị mee ihe nile o nwere ike ime iji jụ ụgha nile nke Setan, gụnyere ụgha ahụ bụ́ na anyị abaghị uru ma ọ bụ na anyị bụ ndị a na-apụghị ịhụ n’anya. Ọ bụrụ na ahụmahụ ndị i nwere ná ndụ emewo ka ị na-ele onwe gị anya dị ka nnukwute ihe mgbochi nke na ọbụna ịhụnanya dị ukwuu nke Chineke apụghị imeri ya, ma ọ bụ na ezi ọrụ gị pere mpe nke na ọbụna anya ya nke na-ahụ ihe nile apụghị ịhụ ha, ma ọ bụ na mmehie gị buru oké ibu nke na ọbụna ọnwụ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya nwụrụ apụghị ikpuchi ha, ọ bụ ụgha. Jiri obi gị dum jụ ụgha ndị dị otú ahụ! Ka anyị nọgide na-emesi onwe anyị obi ike site n’eziokwu ahụ e kwupụtara n’ihe Pọl ji ike mmụọ nsọ kwuo, sị: “Ekwetara m na ọnwụ ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndị dị ugbu a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa ma ọ bụ ike ma ọ bụ ịdị elu ma ọ bụ ịdị omimi ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke agaghị enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke dị n’ime Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 8:38, 39.

^ par. 6 Ugboro ugboro, Bible na-ejikọta olileanya mbilite n’ọnwu na ikike icheta ihe Jehova. Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job gwara Jehova, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma . . . ma a sị na Ị kpaara m ókè, wee cheta m!” (Job 14:13, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Jizọs zoro aka ná mbilite n’ọnwụ nke “ndị nile nọ n’ili ncheta.” Nke a kwesịrị ekwesị n’ihi na Jehova na-echeta n’ụzọ zuru ezu ndị nile nwụrụ anwụ ọ na-ezube ịkpọlite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.

^ par. 19 N’ebe a, ụfọdụ ndị nsụgharị na-enye echiche bụ́ na onye na-emetụ ndị Chineke aka na-emetụ anya nke ya ma ọ bụ anya Izrel aka, ọ bụghị anya Chineke. Ọ bụ ndị odeakwụkwọ ụfọdụ, ndị lere akụkụ a anya dị ka mkparị ma dezigharịa ya, webatara ndehie ihe a. Mgbalị ha nke hiere ụzọ mere ka a ghara ịhụ otú Jehova nweruru mmetụta ọmịiko.