Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 31

“Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”

“Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”

1-3. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere ọdịdị ụmụ mmadụ site n’ịhụ otú nne na nna na nwa ọhụrụ ha si emekọrịta? (b) Gịnị na-emekarị mgbe mmadụ gosiri anyị ịhụnanya, oleekwa ajụjụ dị mkpa anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?

NDỊ mụrụ ụmụ na-enwe obi ụtọ ịhụ ka nwa ọhụrụ ha na-amụmụ ọnụ ọchị. Ọtụtụ mgbe, ha na-emetụ ihu ha n’ihu nwa ọhụrụ ahụ, na-agwa ya okwu n’olu dị ala ma na-amụmụrụ ya ọnụ ọchị. Ọ na-agụsi ha agụụ ike ịhụ mmeghachi omume ya. N’egbughịkwa oge, ọ na-emeghachi omume—ntì nwa ahụ na-abanye n’ime, egbugbere ọnụ ya agbasaa, ọ na-amụmụ ọnụ ọchị obi ụtọ. N’ụzọ nke ya, ọchị ahụ yiri ka ọ na-egosipụta mmetụta ịhụnanya, mmalite ngosipụta ịhụnanya nke nwa ọhụrụ ahụ n’ihi ịhụnanya ndị mụrụ ya nwere n’ebe ọ nọ.

2 Ọchị nwatakịrị ahụ na-echetara anyị otu ihe dị mkpa banyere ọdịdị ụmụ mmadụ. Mmeghachi omume anyị bu pụta ụwa mgbe e gosiri anyị ịhụnanya bụ igosipụta ịhụnanya. Nke ahụ bụ nnọọ otú e si kee anyị. (Abụ Ọma 22:9) Ka anyị na-eto, anyị na-etozu okè n’ikike anyị nwere igosighachi ịhụnanya n’ihi ịhụnanya e gosiri anyị. Ikekwe ị pụrụ icheta otú ndị mụrụ gị, ndị ikwu gị, ma ọ bụ ndị enyi gị si gosi gị ịhụnanya n’oge ị bụ nwata. Mmetụta ịhụnanya bịara gbanye mkpọrọgwụ n’ime obi gị, too ma bụrụ nke ị na-emepụta n’omume. I gosighachiri ịhụnanya n’ihi ịhụnanya e gosiri gị. Usoro yiri nke ahụ ọ̀ na-ewere ọnọdụ ná mmekọrịta gị na Jehova Chineke?

3 Bible na-ekwu, sị: “Ma anyị onwe anyị, anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:19) Ná Nkebi nke 1 ruo nke 3 nke akwụkwọ a, e chetaara gị na Jehova Chineke ejiriwo ịhụnanya gosipụta ike ya, ikpe ziri ezi ya, na amamihe ya n’ụzọ ndị baara gị uru. Ná Nkebi nke 4 kwa, ị hụrụ na o gosipụtawo ịhụnanya ya kpọmkwem n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ—nakwa n’ebe ị nọ—n’ụzọ ndị dị ịrịba ama. Ugbu a, otu  ajụjụ na-ebilite. N’otu ụzọ, ọ bụ ajụjụ kasị mkpa ị pụrụ ịjụ onwe gị: ‘Olee otú m ga-esi emeghachi omume n’ịhụnanya Jehova?’

Ihe Ịhụ Chineke n’Anya Pụtara

4. N’ụzọ dị aṅaa ka ụmụ mmadụ si nọrọ ná mgbagwoju anya banyere ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara?

4 Jehova, bụ́ Isi Iyi nke ịhụnanya, maara nke ọma na ịhụnanya nwere ike dị ukwuu nke ime ka ndị ọzọ gosipụta àgwà ha kasị mma. Ya mere, n’agbanyeghị isi ihe a kpọrọ mmadụ na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi nọgidere na-enupụ, ọ nọgidewo na-enwe obi ike na ụmụ mmadụ ụfọdụ ga-egosighachi ya ịhụnanya. N’eziekwa, ọtụtụ nde mmadụ emewo otú ahụ. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, okpukpe ndị dị n’ụwa a rụrụ arụ emewo ka ndị mmadụ nọrọ ná mgbagwoju anya banyere ihe bụ́ ịhụ Chineke n’anya. Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha hụrụ Chineke n’anya, ma o yiri ka ha na-eche na ịhụnanya dị otú ahụ bụ mmetụta a na-ekwupụta nanị n’ọnụ. Ịhụnanya maka Chineke pụrụ isi otú ahụ malite, dị nnọọ ka ịhụnanya nwa ọhụrụ nwere n’ebe ndị mụrụ ya nọ pụrụ ibu ụzọ pụta ìhè site ná mmụmụ ọnụ ọchị. Otú ọ dị, n’ebe ndị toruworo ogo mmadụ nọ, ịhụnanya na-agụnye ihe karịrị nke ahụ.

5. Olee otú Bible si kọwaa ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, n’ihi gịnịkwa ka nkọwa ahụ kwesịrị iji masị anyị?

5 Jehova na-akọwa ihe ịhụ ya n’anya pụtara. Okwu ya na-asị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu.” Mgbe ahụ, ọ dị mkpa igosipụta ịhụnanya e nwere n’ebe Chineke nọ n’omume. N’eziokwu, echiche nke irube isi adịghị amasị ọtụtụ ndị. Ma otu amaokwu ahụ ji obiọma gbakwụnye, sị: “Ma ihe ndị [Chineke] nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (1 Jọn 5:3) E mere iwu na ụkpụrụ Jehova ka ha baara anyị uru, ọ bụghị iji megbuo anyị. (Aịsaịa 48:17, 18) Okwu Chineke jupụtara n’ụkpụrụ ndị na-enyere anyị aka ịbịarukwu Chineke nso. N’ụzọ dị aṅaa? Ka anyị tụlee akụkụ atọ nke mmekọrịta anyị na Chineke. Ha na-agụnye nkwurịta okwu, ofufe, na iṅomi ya.

 Iso Jehova Na-ekwurịta Okwu

6-8. (a) Olee ụzọ anyị pụrụ isi na-anụ ihe Jehova na-ekwu? (b) Mgbe anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ, olee otú anyị pụrụ isi mee ka ihe ọ na-ekwu yie ihe na-eme mgbe ahụ?

6 Isi 1 ji ajụjụ a malite, “Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche iso Chineke na-akparịta ụka?” Anyị hụrụ na nke a abụghị ihe a na-eche nanị n’echiche. A pụrụ ikwu na Mozis na Chineke nwere mkparịta ụka dị otú ahụ. Gịnị banyere anyị? Ugbu a abụghị oge Jehova na-ezipụ ndị mmụọ ozi ya iso ụmụ mmadụ na-akparịta ụka. Ma Jehova nwere ụzọ magburu onwe ya o si na-agwa anyị okwu taa. Olee otú anyị pụrụ isi nụ ihe Jehova na-ekwu?

7 Ebe ọ bụ na “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke,” anyị na-anụ ihe Jehova na-ekwu site n’ịgụ Okwu ya, bụ́ Bible. (2 Timoti 3:16) Ya mere, ọbụ abụ ahụ gbara ndị ohu Jehova ume ịgụ ya “ehihie na abalị.” (Abụ Ọma 1:1, 2) Ime otú ahụ chọrọ mgbalị siri ike n’aka anyị. Ma mgbalị ahụ nile kwesịrị ya. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke 18, Bible yiri akwụkwọ ozi dị oké ọnụ ahịa nke sitere n’aka Nna anyị nke eluigwe. Ya mere, ịgụ ya ekwesịghị ịbụ ọrụ na-agwụ ike. Mgbe anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ anyị aghaghị ime ka ihe ndị ọ na-ekwu yie ihe na-eme mgbe ahụ. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ?

8 Jiri anya nke uche gị hụ ihe ndekọ Bible ka ị na-agụ ya. Gbalịa ịhụ ndị a kpọtụrụ aha n’ime Bible dị ka ndị dịrị ndụ n’ezie. Gbalịa ịghọta ihe banyere ha, ọnọdụ ha, na ebumnobi ha. Mgbe ahụ, chemie echiche n’ihe ị na-agụ, na-ajụ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘Gịnị ka ihe ndekọ a na-akụziri m banyere Jehova? Olee nke n’ime àgwà ya ka ihe ndekọ a na-eme ka ọ pụta ìhè? Olee ụkpụrụ Jehova chọrọ ka m mụta, oleekwa otú m pụrụ isi tinye ya n’ọrụ ná ndụ m?’ Gụọ ya, tụgharịa uche na ya, tinyekwa ya n’ọrụ—ka ị na-eme otú ahụ, Okwu Chineke ga na-adọrọ mmasị gị.—Abụ Ọma 77:12; Jems 1:23-25.

9. Ònye bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị na-ege “ohu” ahụ ntị nke ọma?

9 Jehova na-agwakwa anyị okwu site n’ọnụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” Dị ka Jizọs buru n’amụma, a họpụtawo Ndị Kraịst ole na ole e tere mmanụ ka ha na-enye  anyị ‘nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị’ n’ụbọchị ikpeazụ ndị a siri ike. (Matiu 24:45-47) Mgbe anyị na-agụ akwụkwọ ndị a kwadebere iji nyere anyị aka inweta ezi ihe ọmụma Bible, mgbe anyị na-agakwa nzukọ na mgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst, ohu ahụ na-azụ anyị n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi na ọ bụ ohu Kraịst, anyị ji amamihe na-eme ihe Jizọs kwuru: “Lezienụ anya otú unu si aṅa ntị.” (Luk 8:18) Anyị na-ege ntị nke ọma n’ihi na anyị maara na ohu ahụ bụ otu ụzọ Jehova si agwa anyị okwu.

10-12. (a) N’ihi gịnị ka ekpere ji bụrụ onyinye magburu onwe ya nke sitere n’aka Jehova? (b) Olee otú anyị pụrụ isi kpee ekpere n’ụzọ ga-atọ Jehova ụtọ, gịnịkwa mere anyị ga-eji nwee obi ike na o ji ekpere anyị akpọrọ ihe?

10 Ma gịnị banyere ịgwa Chineke okwu? Ànyị pụrụ ịgwa Jehova okwu? Iche ya n’echiche na-anwụ ibobo n’ahụ́. Ọ bụrụ na ị nwaa ịgakwuru onye ọchịchị kasị ike n’obodo gị ịga gwa ya otu ihe na-enye gị nsogbu n’obi, ò yiri gị ka ị ga-enwe ike iso ya kwurịta okwu? Mgbe ụfọdụ, nanị ịnwa ya anwa pụrụ ịdị ize ndụ! N’oge Esta na Mọdekaị, a pụrụ igbu mmadụ n’ihi ịgakwuru eze Peasia ma eze akpọghị ya. (Esta 4:10, 11) Ugbu a, cheedị echiche ịgakwuru Eze Onyenwe eluigwe na ala, bụ́ onye ọbụna ụmụ mmadụ kasị ike “dị ka ogugu” ma e jiri ha tụnyere ya. (Aịsaịa 40:22) Ụjọ ò kwesịrị ịdị na-atụbiga anyị ókè ịgakwuru ya? Ọ dịghị ma ọlị!

11 Jehova emewo ka e nwee ụzọ dị mfe, nke mmadụ nile pụrụ isi bịakwute ya—ekpere. Ọbụna obere nwa pụrụ iji okwukwe kpegara Jehova ekpere, na-eme otú ahụ n’aha Jizọs. (Jọn 14:6; Ndị Hibru 11:6) Ma, ekpere na-emekwa ka anyị nwee ike ikwupụta echiche na mmetụta anyị ndị siri ike nkọwa, ndị si anyị n’ala ala obi—ọbụna ndị dị mwute, bụ́ ndị siiri anyị ike ikwupụta. (Ndị Rom 8:26) Ọ baghị uru ịgbalị ime ka Jehova nwee mmasị n’ekpere anyị site n’ikwu okwu ire ụtọ, ọtụtụ okwu, okwu ndị na-egosi oké mmụta n’ekpere anyị. (Matiu 6:7, 8) N’aka nke ọzọ, Jehova ekwughị otú oge anyị ga-eji gwa ya okwu ga-aha ma ọ bụ ugboro ole anyị ga-agwa ya okwu. Okwu ya ọbụna na-agba anyị ume ịdị ‘na-ekpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị.’—1 Ndị Tesalonaịka 5:17.

 12 Cheta na ọ bụ nanị Jehova ka a kpọrọ “Onye na-anụ ekpere,” ọ na-ejikwa ezi mmetụta ọmịiko aṅa ntị. (Abụ Ọma 65:2) Ọ̀ bụ nanị odidi ka ọ na-edi ekpere ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi? Ee e, ha na-atọ ya ụtọ n’ezie. Okwu ya ji ekpere ndị dị otú ahụ tụnyere ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ndị isure ha ọkụ na-eme ka anwụrụ ọkụ na-esi ísì ụtọ, nke na-eme ka obi ya jụrụ, kwụgoo n’eluigwe. (Abụ Ọma 141:2; Mkpughe 5:8; 8:4) Ọ́ dịghị eme ka obi ruo anyị ala iche na ekpere ndị anyị ji ezi obi na-ekpe na-arịgokwa n’eluigwe n’otu aka ahụ ma na-atọ Eze Onyenwe anyị ụtọ? Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ịbịaru Jehova nso, jiri obi umeala na-ekpegara ya ekpere mgbe nile, kwa ụbọchị. Na-agwa ya ihe nile dị gị n’obi; ezochila ihe ọ bụla. (Abụ Ọma 62:8) Mee ka Nna gị nke eluigwe mara ihe ndị na-echegbu gị, ọṅụ gị, ekele gị, na otuto gị. Ihe ga-esi na ya pụta bụ na nkekọ dị n’etiti gị na ya ga na-esiwanye ike.

Ife Jehova Ofufe

13, 14. Gịnị ka ife Jehova ofufe pụtara, n’ihi gịnịkwa ka o ji kwesị ekwesị ka anyị mee otú ahụ?

13 Mgbe anyị na Jehova Chineke na-ekwurịta okwu, ihe anyị na-eme abụghị nanị ige ntị na ikwu okwu otú anyị nwere ike ịdị na-eme mgbe anyị na enyi anyị ma ọ bụ onye ikwu anyị na-ekwurịta okwu. Anyị na-efe Jehova ofufe n’ezie, na-enye ya nsọpụrụ ofufe nke ruuru ya. Ezi ofufe na-achịkwa ụzọ ndụ anyị dum. Ọ bụ otú anyị si egosi Jehova ịhụnanya na nsọpụrụ nke sitere ná mkpụrụ obi anyị dum, ọ na-emekwa ka ihe nile Jehova kere eke bụ́ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, ma n’eluigwe ma n’ụwa, dị n’otu. N’otu ọhụụ, Jọn onyeozi nụrụ ka otu mmụọ ozi na-akpọsa iwu a, sị: “Na-efenụ Onye ahụ nke mere eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri dị iche iche.”—Mkpughe 14:7.

14 N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji fee Jehova ofufe? Cheedị echiche àgwà ndị anyị tụleworo, ndị dị ka ịdị nsọ, ike, njide onwe onye, ikpe ziri ezi, obi ike, ebere, amamihe, ịdị umeala n’obi, ịhụnanya, ọmịiko, iguzosi ike n’ihe, na ịdị mma. Anyị ahụwo na ọ bụ Jehova bụ onye kasị egosipụta àgwà ọ bụla dị oké ọnụ  ahịa, onye a bụ ihe nlereanya kasịnụ. Mgbe anyị gbalịrị ịghọta àgwà ya dum n’ozuzu ha, anyị na-achọpụta na Jehova abụghị nanị Onye ukwu a na-akwanyere ùgwù. Ọ dị nnọọ ebube nke ukwuu, dịkwa elu karịa anyị n’ụzọ na-enweghị atụ. (Aịsaịa 55:9) N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, Jehova bụ Eze anyị. O ruuru ya, o kwesịkwara ịnara ofufe anyị n’ezie. Otú ọ dị, olee otú anyị kwesịrị isi na-efe Jehova?

15. Olee otú anyị pụrụ isi fee Jehova ofufe “n’ime mmụọ na n’eziokwu,” ohere dịkwa aṅaa ka anyị nwere ime otú ahụ ná nzukọ Ndị Kraịst?

15 Jizọs sịrị: “Chineke bụ Mmụọ, ndị na-efe ya aghaghịkwa ife ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Nke ahụ pụtara iji obi jupụtara n’okwukwe na ịhụnanya, nakwa nke mmụọ ya na-eduzi, na-efe Jehova. Ọ pụtakwara ife ya ofufe n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu ahụ, bụ́ ezi ihe ọmụma nke dị n’ime Okwu Chineke. Anyị na-enwe ohere magburu onwe ya nke ife Jehova ofufe  “n’ime mmụọ na n’eziokwu” mgbe ọ bụla anyị na ndị anyị na ha na-efekọ ofufe zukọtara. (Ndị Hibru 10:24, 25) Mgbe anyị na-abụ abụ otuto nye Jehova, na-ekpekọ ekpere ọnụ kpegara ya, na-ege ntị ma na-ekere òkè mgbe a na-atụle Okwu ya, anyị na-egosipụta ịhụnanya anyị n’ebe ọ nọ site n’ife ya ofufe dị ọcha.

Nzukọ Ndị Kraịst bụ oge ndị na-enye obi ụtọ iji fee Jehova

16. Olee otu n’ime iwu ndị kasịnụ e nyere ezi Ndị Kraịst, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji enwe mkpali irube isi na ya?

16 Anyị na-efekwa Jehova ofufe mgbe anyị na-akọrọ ndị ọzọ banyere ya, na-eto ya n’ihu ọha. (Ndị Hibru 13:15) N’ezie, ikwusa ozi ọma nke Alaeze Jehova bụ otu n’ime iwu ndị kasịnụ e nyere ezi Ndị Kraịst. (Matiu 24:14) Anyị ji oké mmasị na-erube isi na ya n’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya. Mgbe anyị chere echiche otú “chi nke usoro ihe a,” bụ́ Setan Ekwensu, siworo mee “ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì,” na-akpalite ụgha ọjọọ dị iche iche megide Jehova, ọ̀ bụ na ọ dịghị agụsi anyị agụụ ike ije ozi dị ka Ndịàmà n’ihi Chineke anyị, na-egosi na nkwutọ ndị dị otú ahụ bụ ụgha? (2 Ndị Kọrint 4:4; Aịsaịa 43:10-12) Mgbe anyị tụgharịkwara uche n’àgwà dị iche iche dị ebube nke Jehova, ọ̀ bụ na ọ dịghị agụ anyị agụụ ịkọrọ ndị ọzọ banyere ya? N’ezie, ọ dịghị ihe ùgwù ọ bụla karịrị inyere ndị ọzọ aka ịbịa mara Nna anyị nke eluigwe ma hụ ya n’anya otú anyị maara ya ma hụ ya n’anya.

17. Gịnị ka ofufe anyị na-efe Jehova na-agụnye, gịnịkwa mere anyị na-aghaghị iji na-efe ya ofufe n’iguzosi ike n’ezi ihe?

17 Ofufe anyị na-efe Jehova gụnyere ọbụna ihe karịrị nke ahụ. Ọ na-emetụta akụkụ nile nke ndụ anyị. (Ndị Kọlọsi 3:23) Ọ bụrụ na anyị anabata Jehova n’ezie dị ka Eze Onyenwe anyị, anyị ga-achọ ịdị na-eme uche ya n’ihe nile—ndụ ezinụlọ anyị, ọrụ ego anyị, otú anyị si emeso ndị ọzọ, oge ntụsara ahụ́ anyị. Anyị ga-achọ iji “obi zuru okè” na-ejere Jehova ozi, n’iguzosi ike n’ezi ihe. (1 Ihe E Mere 28:9) Ofufe dị otú ahụ adịghị ekwe ka e nwee obi abụọ ma ọ bụ na-ebi ụdị ndụ abụọ—omume ihu abụọ nke iyi onye na-ejere Jehova ozi n’otu mgbe ahụ na-eme mmehie dị oké njọ na nzuzo. Iguzosi ike n’ezi ihe na-eme ka omume ihu abụọ dị otú ahụ ghara ikwe omume; ịhụnanya na-eme ka ọ bụrụ ihe na-asọ oyi. Egwu Chineke ga-enyekwa aka. Bible na-ejikọta  nsọpụrụ ofufe dị otú ahụ na anyị na Jehova ịnọgide na-enwe mmekọrịta chiri anya.—Abụ Ọma 25:14.

Iṅomi Jehova

18, 19. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya iche na ụmụ mmadụ nkịtị na-ezughị okè pụrụ iṅomi Jehova Chineke?

18 Nkebi nke ọ bụla n’ime akwụkwọ a ejiriwo isiakwụkwọ banyere ụzọ isi ‘ghọọ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya,’ mechie. (Ndị Efesọs 5:1) Ọ dị mkpa icheta na ọ bụ ezie na anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị pụrụ n’ezie iṅomi ụzọ zuru okè Jehova si eji ike ya eme ihe, ụzọ o si ekpe ikpe ziri ezi, ụzọ o si eji amamihe ya eme ihe, na ụzọ o si egosi ịhụnanya. Olee otú anyị si mara na ọ ga-ekwe omume n’ezie iṅomi Onye Pụrụ Ime Ihe Nile? Cheta na ihe aha Jehova pụtara na-akụziri anyị na ọ na-eme onwe ya ka ọ ghọọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịghọ iji mezuo nzube ya. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, ikike ime otú ahụ na-emenye anyị ụjọ, ma, ọ̀ bụ na anyị apụghị iṅomi ya ma ọlị? Ee e.

19 E mere anyị n’onyinyo Chineke. (Jenesis 1:26) N’ihi ya, ụmụ mmadụ dị iche n’ihe ọ bụla ọzọ e kere eke nọ n’ụwa. Ọ bụghị amamihe efu e bu pụta ụwa, mkpụrụ ndụ ihe nketa, ma ọ bụ ihe ndị na-eme gburugburu ebe obibi anyị na-achịkwa anyị. Jehova nyere anyị onyinye dị oké ọnụ ahịa—nnwere onwe ime nhọrọ. N’agbanyeghị adịghị ike na ezughị okè anyị, anyị nweere onwe anyị ịhọrọ ihe anyị ga-abụ. Ị̀ chọrọ ịbụ onye na-ahụ n’anya, onye maara ihe, onye na-eme ihe n’ụzọ ziri ezi, onye na-eji ike eme ihe n’ụzọ ziri ezi? Site n’enyemaka nke mmụọ Jehova, ị pụrụ ịghọ ụdị mmadụ ahụ kpọmkwem! Cheedị echiche ọtụtụ ezi ihe ị ga-enwe ike ịrụzu n’ihi nke ahụ.

20. Ihe ọma dị aṅaa ka anyị na-arụzu mgbe anyị na-eṅomi Jehova?

20 Ị ga-eme ka obi dị Nna gị nke eluigwe ụtọ, mee ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11) Ị pụrụ ọbụna ịdị “na-eme ihe na-amasị [Jehova] n’ụzọ zuru ezu,” n’ihi na ọ maara adịghị ike gị. (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Ọ bụrụkwa na ị nọgide na-azụlite àgwà ndị dị mma n’iṅomi Nna gị ị hụrụ n’anya, a ga-eji oké ihe ùgwù gọzie gị. N’ime ụwa nke nọ n’ọchịchịrị, nke e kewapụkwara n’ebe Chineke nọ, ị ga-abụ onye na-enye ìhè. (Matiu 5:1, 2, 14) Ị ga-enye aka mee  ka a na-ahụ mgbukepụ ụfọdụ nke ụdị onye dị ebube Jehova bụ n’ebe nile n’ime ụwa. Lee ihe ùgwù nke ahụ bụ!

“Bịaruonụ Chineke Nso, Ọ Ga-abịarukwa Unu Nso”

Na-abịaru Jehova nso mgbe nile

21, 22. Olee njem na-adịghị ebi ebi nke na-echere ndị nile hụrụ Jehova n’anya?

21 Agbamume ahụ dị mfe e dekọrọ na Jems 4:8 abụghị nanị ebe mgbaru ọsọ. Ọ bụ njem. Ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi, njem ahụ agaghị ebi ebi. Ọ dịghị mgbe anyị ga-akwụsị ịbịarukwu Jehova nso. E kwuwerị, ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe ihe ndị ọzọ a ga-amụ banyere ya. Anyị ekwesịghị iwere ya na akwụkwọ a akụziworo anyị ihe nile banyere Jehova. Leenụ, anyị ka na-amalite amalite n’ịtụle ihe nile Bible kwuru banyere Chineke anyị! Ọbụna Bible n’onwe ya akọghịrị anyị ihe nile banyere Jehova. Jọn onyeozi kwuru na ọ bụrụ na e detuo ihe nile Jizọs mere n’oge o jere ozi n’elu ala, “ụwa apụghị ịba akwụkwọ mpịakọta ndị e dere.” (Jọn 21:25) Ọ bụrụ na a pụrụ ikwu ihe dị otú ahụ banyere Ọkpara ahụ, oleezi ihe a ga-ekwu banyere Nna ahụ?

 22 Ọbụna ndụ ebighị ebi agaghị eme ka anyị mụtachaa ihe nile banyere Jehova. (Eklisiastis 3:11) Mgbe ahụ, chegodị echiche ohere na-echere anyị. Mgbe anyị biworo ndụ ruo ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ puku afọ, ọtụtụ nde afọ, ọbụna ọtụtụ ijeri afọ, anyị ga-amụta nnọọ ọtụtụ ihe banyere Jehova Chineke karịa otú anyị maara ugbu a. Ma ọ ka ga-adịkwa anyị ka e nwere ọtụtụ ihe ndị dị ebube anyị ga-amụta. Ọ ga na-agụsi anyị agụụ ike ịmụtakwu ihe, n’ihi na anyị ga-enwe mgbe nile, ihe mere anyị ga-eji na-enwe ụdị mmetụta ọbụ abụ ahụ nwere, bụ́ onye bụrụ, sị: “Ịbịaru Chineke nso dị m mma.” (Abụ Ọma 73:28) Ndụ ebighị ebi ga na-eweta afọ ojuju dị ukwuu, a ga-enwekwa ihe dịgasị iche iche a ga-eme—ịbịarukwu Jehova nso ga-anọgidekwa na-abụ akụkụ kasị eweta afọ ojuju na ya.

23. Gịnị ka a na-agba gị ume ime?

23 Gosighachi Jehova ịhụnanya ugbu a site n’iji obi gị dum, mkpụrụ obi gị dum, uche gị dum, na ike gị dum hụ ya n’anya. (Mak 12:29, 30) Ka ịhụnanya gị bụrụ nke na-eguzosi ike n’ihe nakwa nke kwụ chịm. Ka mkpebi nile ị na-eme kwa ụbọchị, malite n’ihe kasị nta ruo n’ihe kasị ukwuu, na-egosipụta na ị na-agbaso otu ụkpụrụ nduzi ahụ—na ị ga-ahọrọ mgbe nile ụzọ ahụ nke ga-eme ka gị na Nna gị nke eluigwe nwee mmekọrịta chiri anya karị. Nke ka nke, nọgide na-abịarukwu Jehova nso, ka ya onwe ya nọgidekwa na-abịarukwu gị nso—ruo mgbe nile ebighị ebi!