Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 2

Ị̀ Pụrụ ‘Ịbịaru Chineke Nso’ n’Ezie?

Ị̀ Pụrụ ‘Ịbịaru Chineke Nso’ n’Ezie?

1, 2. (a) Gịnị pụrụ iyi ihe na-agaghị eme eme nye ọtụtụ ndị, ma gịnị ka Bible na-emesi anyị obi ike banyere ya? (b) Mmekọrịta dị aṅaa chiri anya ka e nyere Ebreham ohere inwe, n’ihi gịnịkwa?

OLEE otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na Onye Okike nke eluigwe na ala ekwuo banyere gị, sị, “Onye a bụ enyi m”? Nye ọtụtụ ndị, nke ahụ pụrụ iyi ihe na-agaghị eme eme. E kwuwerị, olee otú mmadụ nkịtị na Jehova Chineke ga-esi bụrụ enyi? Ma, Bible na-emesi anyị obi ike na anyị na Chineke pụrụ ịbụ enyi n’ezie.

2 Ebreham nke oge ochie bụ otu onye nke ya na Jehova bụ enyi otú ahụ. Jehova kọwara nna ochie ahụ dị ka “enyi m.” (Aịsaịa 41:8, NW) Ee, Jehova weere Ebreham dị ka enyi ya. O kwere ka Ebreham soro ya nwee mmekọrịta chiri anya otú ahụ n’ihi na o “tinyere okwukwe na Jehova.” (Jems 2:23) Taakwa, Jehova na-achọ ohere iji “rapara” n’ahụ́ ndị ji ịhụnanya na-ejere ya ozi. (Deuterọnọmi 10:15, NW) Okwu ya na-agba ume, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) N’okwu ndị a, anyị na-ahụ ma ịkpọ òkù ma nkwa.

3. Òkù dị aṅaa ka Jehova na-akpọ anyị, oleekwa nkwa e jikọtara ya na ya?

3 Jehova na-akpọ anyị òkù ịbịaru ya nso. Ọ dị njikere ma chọọ ịnabata anyị dị ka ndị enyi ya. N’otu oge ahụ, ọ na-ekwe nkwa na ọ bụrụ na anyị emee ihe iji bịaruo ya nso, na ya onwe ya ga-emekwa ihe. Ọ ga-abịaru anyị nso. N’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ ịbanye n’ihe dị oké ọnụ ahịa n’ezie—“iso Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya.” * (Abụ Ọma 25:14, NW)  “Mmekọrịta chiri anya” na-enye echiche nke iso onye bụ́ ezigbo enyi na-ekwurịta izu nzuzo.

4. Olee otú ị ga-esi akọwa onye bụ ezigbo enyi, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka Jehova si egosi na ọ bụ enyi dị otú ahụ nye ndị na-abịaru ya nso?

4 Ì nwere enyi gị na ya na-enwe mmekọrịta chiri anya bụ́ onye ị pụrụ ịkọrọ izu nzuzo gị? Ụdị enyi ahụ bụ onye na-eche banyere gị. Ị tụkwasịrị ya obi, n’ihi na o gosiwo na ọ bụ onye na-eguzosi ike n’ihe. Ị na-enwekwu ọṅụ mgbe gị na ya na-ekerịta ọṅụ ahụ. Ọ na-adịrị gị mfe karị idi ihe ndị na-ewute gị n’ihi na ọ na-eji ọmịiko ege gị ntị. Ọ na-aghọta gị, ọbụna mgbe ọ na-adịghị onye ọzọ yiri ka ọ na-aghọta gị. N’otu aka ahụ, mgbe ị bịaruru Chineke nso, ị na-abịa nwee Enyi pụrụ iche, onye ji gị kpọrọ ihe n’ezie, onye na-eche banyere gị nke ukwuu, ma na-aghọta gị nnọọ nke ọma. (Abụ Ọma 103:14; 1 Pita 5:7) Ị na-akọrọ ya ihe dị n’ime ime obi gị, n’ihi na ị maara na ọ na-eguzosi ike n’ihe n’ebe ndị na-eguzosi ike n’ihe nye ya nọ. (Abụ Ọma 18:25) Otú ọ dị, anyị pụrụ inweta ihe ùgwù a nke iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya nanị n’ihi na o mewo ka o kwe omume.

Jehova Emepewo Ụzọ

5. Gịnị ka Jehova mere iji mee ka o kwe anyị omume ịbịaru ya nso?

5 Ọ bụrụ na a hapụ nanị anyị, anyị apụghị ịbịaru Chineke nso n’ihi na anyị bụ ndị mmehie. (Abụ Ọma 5:4) Pọl onyeozi dere, sị: “Ma Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya nke ya n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ maka anyị.” (Ndị Rom 5:8) Ee, Jehova mere ndokwa ka Jizọs “nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Okwukwe anyị nwere n’àjà mgbapụta ahụ na-eme ka o kwe anyị omume ịbịaru Chineke nso. Ebe Chineke “bu ụzọ hụ anyị n’anya,” ọ tọrọ ntọala ka anyị na ya bụrụ enyi.—1 Jọn 4:19.

6, 7. (a) Olee otú anyị si mara na Jehova abụghị Chineke nke zoro ezo, nke a na-apụghị ịmata onye ọ bụ? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova siworo kpughee onwe ya?

6 Jehova emewo ihe ọzọ: O kpugheworo anyị onwe ya.  N’ọbụbụenyi ọ bụla, ịkpachi anya na-adabere n’ịmata mmadụ n’ezie, inwe mmasị n’àgwà ya na ụzọ ndụ ya. Ya mere, ọ bụrụ na Jehova bụ Chineke nke zoro ezo, nke a na-apụghị ịmata onye ọ bụ, ọ dịghị mgbe anyị ga-enwe ike ịbịaru ya nso. Ma, kama izochi onwe ya, ọ chọrọ ka anyị mata onye ọ bụ. (Aịsaịa 45:19) Ọzọkwa, mmadụ nile, ọbụna ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ndị a pụrụ ile anya dị ka ndị dị ala n’ụzọ ụwa si ele ihe anya, pụrụ ịmata ihe ndị ọ na-ekpughe banyere onwe ya.—Matiu 11:25.

Jehova ekpughewo onye ọ bụ site n’ihe ndị o kere na site n’Okwu ya e dere ede

7 Olee otú Jehova siworo kpugheere anyị onwe ya? Ihe ndị o kere eke na-eme ka a mata akụkụ ụfọdụ nke ụdị onye ọ bụ—otú ike ya hà, ịdị ukwuu nke amamihe ya, otú ịhụnanya ya bururu ibu. (Ndị Rom 1:20) Ma ọ bụghị nanị site n’ihe ndị o kere eke ka Jehova na-ekpughe onwe ya. Ebe ọ bụ Onye Ukwu Na-enye Ihe Ọmụma mgbe nile, o mere ka e nwee ihe ndekọ nke ihe ndị o kpughere banyere onwe ya n’ime Okwu ya, bụ́ Bible.

Ịhụ “Ịdị Ụtọ nke Onyenwe Anyị”

8. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Bible n’onwe ya bụ ihe àmà na-egosi ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ?

8 Bible n’onwe ya bụ ihe àmà na-egosi ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ. N’ime Okwu ya, o ji okwu ndị anyị pụrụ ịghọta kpughee onwe ya—ihe àmà na-egosi na ọ bụghị nanị na ọ hụrụ anyị n’anya kamakwa na ọ chọrọ ka anyị mata ya ma hụ ya n’anya. Ihe anyị na-agụta n’akwụkwọ a dị oké ọnụ ahịa na-eme ka anyị nwee ike ịhụ “ịdị ụtọ nke Onyenwe anyị,” na-akwalikwa anyị ịchọ ịbịaru ya nso. (Abụ Ọma 90:17) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ụzọ ndị na-enye obi ụtọ Jehova si na-ekpughe onwe ya n’ime Okwu ya.

9. Olee ụfọdụ n’ime okwu ndị kpọrọ àgwà ụfọdụ nke Chineke aha kpọmkwem n’ime Bible?

9 E nwere ọtụtụ okwu ndị dị n’ime Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị kpọrọ àgwà Chineke aha kpọmkwem. Lee ụfọdụ ihe atụ. “Jehova na-ahụ [ikpe ziri ezi, NW] n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) Chineke “dị ukwuu n’ike.” (Job 37:23) “Nanị  gị [Jehova] na-eguzosi ike n’ihe.” (Mkpughe 15:4) “O nwere obi nke maara ihe.” (Job 9:4) Ọ bụ “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6) “Gị onwe gị, Onyenwe anyị, dị mma, Ị bụkwa onye na-agbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Dịkwa ka e kwuru n’isiakwụkwọ bu nke a ụzọ, otu àgwà kasị pụta ìhè: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ka ị na-atụgharịkwa uche n’àgwà ndị a mara mma, ọ̀ bụ na ọ dịghị eme ka ị bịaruo Chineke a na-enweghị atụ nso?

Bible na-enyere anyị aka ịbịaru Jehova nso

10, 11. (a) Iji nyere anyị aka ịhụ ụdị onye ọ bụ nke ọma karị, gịnị ka Jehova meworo ka e denye n’ime Okwu ya? (b) Ihe atụ dị aṅaa sitere na Bible na-enyere anyị aka iji anya nke uche hụ otú Chineke si eji ike ya eme ihe?

10 Tụkwasị n’ịgwa anyị àgwà ya dị iche iche, Jehova ji ịhụnanya mee ka e denye n’ime Okwu ya, ihe atụ ụfọdụ kpọmkwem nke ebe ndị o gosipụtara àgwà ndị a. Ihe ndekọ ndị dị otú ahụ na-ese onyinyo ndị doro anya n’uche anyị, bụ́ ndị na-enyere anyị aka ịhụ akụkụ dị iche iche nke ụdị onye ọ bụ n’ụzọ doro anya karị. Nke ahụ, n’aka nke ọzọ, na-enyere anyị aka ịbịaru ya nso. Tụlee otu ihe atụ.

11 Ịgụta na Chineke “nwere ume n’ike” bụ otu ihe. (Aịsaịa 40:26) Ma ọ bụ nnọọ ihe ọzọ ịgụ otú o si napụta Izrel gabiga Oké Osimiri Uhie ahụ ma kwadoo mba ahụ n’ọzara ruo afọ 40. Ị pụrụ iji anya nke uche gị hụ ka mmiri ahụ na-ekwo ekwo na-ekewa. Ị pụrụ iji uche gị hụ ka mba ahụ—nke dị mmadụ 3,000,000 ná ngụkọta ma eleghị anya—na-agafe n’ala akọrọ, mmiri ahụ nke kpụkọrọ akpụkọ wee guzoro dị ka nnukwute mgbidi n’akụkụ ha abụọ. (Ọpụpụ 14:21; 15:8) Ị  pụrụ ịhụ ihe àmà na-egosi nchebe nke Chineke n’ọzara ahụ. Mmiri si n’oké nkume gbapụta. Ihe oriri, bụ́ ndị yiri mkpụrụ akụ̀kụ̀ na-acha ọcha tụsasịrị n’ala. (Ọpụpụ 16:31; Ọnụ Ọgụgụ 20:11) N’ebe a, Jehova na-ekpughe ọ bụghị nanị na o nwere ike kama na ọ na-eji ya eme ihe n’ihi ndị ya. Ọ́ bụghị ihe na-emesi obi ike ịmata na ekpere anyị na-agakwuru Chineke nke dị ike, bụ́ onye “bụụrụ anyị ebe mgbaba na ike, O mewo ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu na mkpagbu nile”?—Abụ Ọma 46:1.

12. Olee otú Jehova si enyere anyị aka “ịhụ” ya anya site n’iji okwu ndị anyị pụrụ ịghọta na-eme ihe?

12 Jehova, onye bụ́ mmụọ, emewo ọbụna ihe karịrị nke ahụ iji nyere anyị aka ịmata onye ọ bụ. Dị ka ụmụ mmadụ, ọ bụ nanị ihe ndị a pụrụ imetụ aka ka anyị ga-enwe ike ịhụ anya, n’ihi ya kwa, anyị apụghị ịhụ ógbè ndị mmụọ. Chineke iji okwu ndị mmụọ kọwaara anyị onwe ya ga-adị ka gị ịkọwara onye kpuru ìsì site n’ọmụmụ otú ị dị, dị ka otú anya gị na-acha ma ọ bụ ntụpọ ndị dị gị n’ahụ́. Kama nke ahụ, Jehova ji obiọma na-enyere anyị aka “ịhụ” ya anya site n’iji okwu ndị anyị pụrụ ịghọta na-eme ihe. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji okwu ndị na-ekwu na ihe bụ ihe ọzọ na okwu ndị na-ekwu na ihe yiri ihe ọzọ eme ihe, jiri onwe ya na-atụnyere ihe ndị anyị maara. Ọ na-akọwa onwe ya ọbụna dị ka onye nwere ọdịdị ụfọdụ nke ụmụ mmadụ. *

13. Onyinyo dị aṅaa ka Aịsaịa 40:11 na-ese, oleekwa otú o si emetụta gị?

13 Rịba ama otú e si kọwaa Jehova n’Aịsaịa 40:11: “Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ka Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ Ya, n’ogwe aka Ya ka Ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha.” N’ebe a, e ji Jehova tụnyere onye ọzụzụ atụrụ nke na-ekuru  ụmụ atụrụ “n’ogwe aka Ya.” Nke a na-egosi ikike Chineke nwere ichebe na inyere ndị ya aka, ọbụna ndị a pụrụ imerụ ahụ́ ngwa ngwa. Obi pụrụ iru anyị ala mgbe anyị nọ n’ogwe aka ya dị ike, n’ihi na ọ bụrụ na anyị eguzosie ike n’ihe nye ya, ọ dịghị mgbe ọ ga-agbahapụ anyị. (Ndị Rom 8:38, 39) Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ na-ekuru ụmụ atụrụ “n’obi Ya”—okwu nke na-ezo aka n’ebe ndị fụkọrọ afụkọ n’uwe elu, bụ́ ebe onye ọzụzụ atụrụ na-ekunye nwa atụrụ a mụrụ ọhụrụ mgbe ụfọdụ. N’ụzọ dị otú a, a na-emesi anyị obi ike na Jehova ji anyị kpọrọ ihe ma jiri ịhụnanya na-elekọta anyị. Ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị bụ́ ịchọ ịbịaru ya nso.

“Ọkpara ahụ Chọrọ Ikpughe Ya”

14. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jehova na-ekpughe onwe ya n’ụzọ kasị mie emi site n’aka Jizọs?

14 N’ime Okwu ya, Jehova kpughere onwe ya n’ụzọ kasị mie emi site n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs. Ọ dịghị onye pụrụ igosipụta ụdị echiche na mmetụta Chineke nke ọma ma ọ bụ kọwaa Ya n’ụzọ doro anya karịa otú Jizọs mere. E kwuwerị, Ọkpara ahụ e bu ụzọ mụọ na  Nna ya nọ tupu e kee ndị mmụọ ndị ọzọ nakwa mbara igwe na ụwa a na-ahụ anya. (Ndị Kọlọsi 1:15) Jizọs maara Jehova nke ọma. Ọ bụ ya mere ọ pụrụ iji kwuo, sị: “Ọ dịghịkwa onye maara onye Ọkpara ahụ bụ ma e wezụga Nna ya; ọ dịghịkwa onye maara onye Nna ahụ bụ ma e wezụga Ọkpara ya, nakwa onye Ọkpara ahụ chọrọ ikpughe Ya nye.” (Luk 10:22) Mgbe ọ nọ n’ụwa dị ka mmadụ, Jizọs kpughere onye Nna ya bụ n’ụzọ abụọ dị mkpa.

15, 16. N’ụzọ abụọ dị aṅaa ka Jizọs si kpughee onye Nna ya bụ?

15 Nke mbụ, izi ihe Jizọs na-enyere anyị aka ịmata Nna ya. Jizọs ji okwu ndị na-emetụ anyị n’obi kọwaa Jehova. Dị ka ihe atụ, iji kọwaa Chineke ahụ dị ebere bụ́ onye na-anabataghachi ndị mmehie nwere nchegharị, Jizọs ji Jehova tụnyere nna nke na-agbaghara mmehie bụ́ onye nwere mmetụta dị ukwuu mgbe ọ hụrụ nwa ya bụ́ nwa mmefu ka ọ na-alọta nke na ọ gbaara ọsọ gaa dakwasị ya n’olu ma susuo ya ọnụ n’ụzọ dị nro. (Luk 15:11-24) Jizọs kọwakwara Jehova dị ka Chineke nke ‘na-adọta’ ndị nwere obi eziokwu n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya n’otu n’otu. (Jọn 6:44) Ọ maara ọbụna mgbe otu ntakịrị nza dara n’ala. “Unu atụla egwu,” ka Jizọs kọwara, “unu dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.” (Matiu 10:29, 31) N’ezie, a na-adọta anyị n’ebe Chineke dị otú ahụ nke na-ahụ n’anya nọ.

16 Nke abụọ, ihe nlereanya Jizọs na-egosi anyị ụdị onye Jehova bụ. Jizọs gosipụtara àgwà Nna ya nke ọma nke na ọ pụrụ ikwu, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) Ya mere, mgbe anyị na-agụ banyere Jizọs n’ime Oziọma ndị ahụ—mmetụta ndị o gosipụtara nakwa ụzọ o si mesoo ndị ọzọ ihe—n’otu echiche, anyị na-ahụ onyinyo dị ndụ nke Nna ya. Ọ dịghị ụzọ doro anya karịa nke ahụ nke Jehova gaara esiwo kpugheere anyị àgwà ya. N’ihi gịnị?

17. Nye ihe atụ nke ihe Jehova meworo iji nyere anyị aka ịghọta otú ọ dị.

17 Iji maa atụ: Ka anyị were ya na ị na-achọ ịkọwara mmadụ ihe bụ obiọma. Ị pụrụ iji okwu ọnụ kọwaa ya. Ma ọ bụrụ na ị ga-enwe ike ịtụ onye na-egosi obiọma aka ma kwuo sị, “Lee  ihe bụ́ obiọma,” okwu ahụ bụ́ “obiọma” ga-enwekwu mmetụta ma kwe nghọta karị. Jehova emewo ihe yiri ya iji nyere anyị aka ịghọta otú ọ dị. Tụkwasị n’iji okwu ọnụ kọwaa onwe ya, o nyewo anyị ihe atụ a na-ahụ anya nke bụ́ Ọkpara ya. N’ime Jizọs, anyị na-ahụ àgwà Chineke ka a na-egosipụta ha. Site n’ihe ndekọ ndị ahụ na-akọwa Jizọs bụ́ ndị dị n’Oziọma ndị ahụ, Jehova na-ekwu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị: “Lee otú m dị.” Olee otú ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ si kọwaa Jizọs mgbe ọ nọ n’ụwa?

18. Olee otú Jizọs si gosipụta ike, ikpe ziri ezi, na amamihe?

18 Àgwà anọ bụ́ isi nke Chineke pụtara ìhè n’ụzọ magburu onwe ha n’ime Jizọs. O nwere ike n’ebe nrịanrịa, agụụ, na ọbụna ọnwụ dị. Ma, n’adịghị ka ụmụ mmadụ na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, bụ́ ndị na-eji ike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ọ dịghị mgbe o ji ikike ịrụ ọrụ ebube ya mee ihe maka ọdịmma onwe ya ma ọ bụ iji megide ndị ọzọ. (Matiu 4:2-4) Ọ hụrụ ikpe ziri ezi n’anya. O were iwe ezi omume mgbe ọ hụrụ ka ndị ahịa, bụ́ ndị na-adịghị eme ihe n’ụzọ ziri ezi na-erigbu ndị mmadụ. (Matiu 21:12, 13) O mesoro ndị ogbenye na ndị e wedara n’ala ihe n’ụzọ eleghị mmadụ anya n’ihu, na-enyere ndị dị otú ahụ aka ‘inwetara mkpụrụ obi ha ume ọhụrụ.’ (Matiu 11:4, 5, 28-30) Amamihe na-enweghị atụ dị n’izi ihe Jizọs, bụ́ onye “ka Solomọn” ukwuu. (Matiu 12:42) Ma ọ dịghị mgbe Jizọs ji amamihe ya mee ngosi. Ihe ndị o kwuru ruru ndị nkịtị n’obi, n’ihi na ihe ndị ọ na-akụzi doro anya, dị mfe, ma bụrụ ndị a pụrụ iji mee ihe.

19, 20. (a) Olee otú Jizọs si bụrụ ihe atụ pụrụ iche nke ịhụnanya? (b) Ka anyị na-agụ ma na-atụgharị uche n’ihe atụ nke Jizọs, gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche?

19 Jizọs bụ ihe atụ pụrụ iche nke ịhụnanya. N’oge nile ọ nọ na-eje ozi ya, o gosipụtara ịhụnanya n’ụdị ya dị iche iche, gụnyere ọmịiko na itinye onwe ya n’ọnọdụ nke ndị ọzọ. Ọ pụghị ịhụ ahụhụ ndị ọzọ na-ata n’emeghịrị ha ebere. Ọtụtụ ugboro, mmetụta ọmịiko ahụ kpaliri ya ime ihe. (Matiu 14:14) Ọ bụ ezie na ọ gwọrọ ndị ọrịa, nyekwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri, Jizọs gosiri ọmịiko n’ụzọ dị nnọọ mkpa karị.  O nyeere ndị ọzọ aka ịmata, ịnakwere, na inwe mmasị n’eziokwu banyere Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ ngọzi na-adịgide adịgide. (Mak 6:34; Luk 4:43) Nke kasịnụ, Jizọs gosipụtara ịhụnanya nke ịchụ onwe ya n’àjà site n’iji ọchịchọ obi ya nye mkpụrụ obi ya n’ihi ndị ọzọ.—Jọn 15:13.

20 Ka a sịkwa ihe mere ndị nọ n’afọ ndụ nile na ndị si n’ụdị ọnọdụ dị iche iche ji bụrụ ndị a dọtara n’ebe nwoke a nwere oké mmetụta ịhụnanya nọ. (Mak 10:13-16) Otú ọ dị, ka anyị na-agụ ma na-atụgharị uche n’ihe atụ a hụrụ anya nke Jizọs, ka anyị buru n’uche mgbe nile na anyị na-ahụ ụdị onye Nna ahụ bụ́ n’ime Ọkpara ya.—Ndị Hibru 1:3.

Akwụkwọ E Ji Amụ Ihe Iji Nyere Anyị Aka

21, 22. Gịnị ka ịchọ Jehova na-agụnye, gịnịkwa dị n’ime akwụkwọ a e ji amụ ihe nke ga-enyere anyị aka ime nke a?

21 Site n’ikpughe onwe ya n’ụzọ doro anya n’ime Okwu ya, Jehova na-eme ka o doo anya na ọ chọrọ ka anyị bịaruo ya nso. N’otu oge ahụ, ọ dịghị amanye anyị ịchọ iso ya nwee mmekọrịta a nwapụtara anwapụta. Ọ dị anyị n’aka ịchọ Jehova “mgbe a na-achọta Ya.” (Aịsaịa 55:6) Ịchọ Jehova na-agụnye ịmata àgwà ya na ụzọ ya dị ka e kpughere ha n’ime Bible. E mere akwụkwọ a e ji amụ ihe nke ị na-agụ ugbu a iji nyere gị aka ime nke a.

 22 Ị ga-achọpụta na e kewara akwụkwọ a ná nkebi ná nkebi n’ikwekọ n’àgwà anọ bụ́ isi nke Jehova: ike, ikpe ziri ezi, amamihe, na ịhụnanya. Nkebi nke ọ bụla ji ntụle dị mkpirikpi nke àgwà ahụ malite. Isiakwụkwọ ole na ole na-eso ya na-atụle otú Jehova si egosipụta àgwà ahụ n’ụdị ya dị iche iche. Nkebi nke ọ bụla nwekwara isiakwụkwọ nke na-egosi otú Jizọs si gosipụta àgwà ahụ, tinyere isiakwụkwọ nke na-enyocha otú anyị pụrụ isi na-egosipụta ya ná ndụ anyị.

23, 24. (a) Kọwaa akụkụ ahụ pụrụ iche bụ́ “Ajụjụ Maka Ntụgharị Uche.” (b) Olee otú ntụgharị uche si enyere anyị aka ịnọgide na-abịarukwu Chineke nso?

23 Malite n’isiakwụkwọ a, e nwere akụkụ pụrụ iche nke a kpọrọ “Ajụjụ Maka Ntụgharị Uche.” Dị ka ihe atụ, lee anya n’igbe dị na peeji nke 24. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ na ajụjụ ndị dị n’ebe ahụ abụghị maka ntụleghachi nke isiakwụkwọ a. Kama nke ahụ, nzube e ji tinye ha bụ iji nyere gị aka ịtụgharị uche n’akụkụ ndị ọzọ dị mkpa nke isiokwu a. Olee otú ị pụrụ isi jiri ya mee ihe n’ụzọ dị irè? Sapeta ma jiri nlezianya gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọ bụla e zoro aka na ya. Mgbe ahụ, tụlee ajụjụ ndị ya na akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ọ bụla e zoro aka na ya so. Chebara azịza ha echiche. Ị pụrụ ime nchọpụta ụfọdụ. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị ọzọ: ‘Gịnị ka ihe ọmụma a na-agwa m banyere Jehova? Olee otú o si emetụta ndụ m? Olee otú m pụrụ isi jiri ya nyere ndị ọzọ aka?’

24 Ntụgharị uche dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ịnọgide na-abịarukwu Jehova nso. N’ihi gịnị? Bible na-ejikọta ntụgharị uche na obi. (Abụ Ọma 19:14) Mgbe anyị ji ekele na-atụgharị uche n’ihe anyị na-amụta banyere Chineke, ihe ọmụma ahụ na-abami n’obi ihe atụ anyị, bụ́ ebe ọ na-emetụta ụzọ anyị si eche echiche, na-akpali mmetụta anyị, n’ikpeazụkwa na-akpali anyị ime ihe. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ na-ebuwanye ibu, ịhụnanya ahụkwa, n’aka nke ya, na-akpali anyị ịchọ ime ihe na-atọ ya ụtọ dị ka Enyi anyị nke anyị kasị hụ n’anya. (1 Jọn 5:3) Iji zụlite ụdị mmekọrịta ahụ, anyị aghaghị ịmata àgwà na ụzọ Jehova. Otú ọ dị, ka anyị buru ụzọ tụlee otu akụkụ nke ụdị onye Chineke bụ bụ́ nke na-amanye anyị ịbịarukwu ya nso—ịdị nsọ ya.

^ par. 3 N’ụzọ na-adọrọ mmasị, e ji okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ “mmekọrịta chiri anya” mee ihe n’Emọs 3:7, bụ́ nke na-asị na Eze Onyenwe anyị Jehova na-ekpughere ndị ohu ya “izu nzuzo” ya, na-eme ka ha mara ihe ọ na-ezube ime tupu o mee ya.

^ par. 12 Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu banyere ihu Chineke, anya ya, ntị ya, imi ya, ọnụ ya, ogwe aka ya, na ụkwụ ya. (Abụ Ọma 18:15; 27:8; 44:3; Aịsaịa 60:13; Matiu 4:4; 1 Pita 3:12) E kwesịghị ịghọta okwu ihe atụ ndị dị otú ahụ n’ụzọ nkịtị, dịkwa ka a na-agaghị aghọta aka ndị e zoro n’ebe Jehova nọ dị ka “Oké nkume ahụ” ma ọ bụ “ọta” n’ụzọ nkịtị.—Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 84:11.