Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 3

‘Nsọ, Nsọ, Nsọ Ka Jehova Dị’

‘Nsọ, Nsọ, Nsọ Ka Jehova Dị’

1, 2. Olee ọhụụ Aịzaịa onye amụma hụrụ, gịnịkwa ka ọ na-akụziri anyị banyere Jehova?

IHE Aịzaịa hụrụ—ọhụụ sitere n’aka Chineke—mere ka ụjọ jide ya. O yiri nnọọ ihe mere eme! Aịzaịa mesịrị dee na ya ‘hụrụ Onyenwe anyị’ n’ezie n’ocheeze Ya dị elu. Uwe Jehova nke na-azaru ala sachiri nnukwu ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem.—Aịsaịa 6:1, 2.

2 Ihe Aịzaịa nụrụ—abụ nke a na-abụsi nnọọ ike nke na o mere ka ụlọ nsọ ahụ dum, ọbụna ntọala ya, maa jijiji—mekwara ka ụjọ tụọ ya. Ọ bụ ndị seraf, ndị bụ́ ndị mmụọ e kere eke nọ n’ọkwá dị nnọọ elu, nọ na-abụ abụ ahụ. Ha nọ na-ekwu okwu otuto ndị dị mfe n’abụ ha nke ha ji otu olu na-abụ, na-asị: “Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha dị: uju ụwa nile bụ ebube Ya.” (Aịsaịa 6:3, 4) Ịbụ okwu ahụ bụ́ “nsọ” n’abụ ugboro atọ mesiri ya ike n’ụzọ pụrụ iche, nke ahụ kwesịkwara ekwesị, n’ihi na Jehova dị nsọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu. (Mkpughe 4:8) E mesiri ịdị nsọ Jehova ike n’ime Bible dum. Ọtụtụ narị amaokwu na-ejikọta aha ya na okwu ndị bụ́ “nsọ” na “ịdị nsọ.”

3. Olee otú inwe echiche hiere ụzọ banyere ịdị nsọ Jehova si eme ka ọtụtụ ndị wezụga onwe ha n’ebe Chineke nọ kama ịbịaru ya nso?

3 Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, otu n’ime ihe ndị bụ́ isi Jehova chọrọ ka anyị ghọta banyere ya bụ na ọ dị nsọ. Ma, ọtụtụ ndị taa achọghị iji ntị anụ nke ahụ. Ụfọdụ na-eji ihie ụzọ ejikọta ịdị nsọ na ịbụ onye ezi omume n’anya onwe onye ma ọ bụ ime nsọ nsọ. Ndị na-enwe echiche na-ezighị ezi banyere onwe ha pụrụ iwere ịdị nsọ Chineke dị ka ihe na-emenye ụjọ kama ịbụ ihe na-adọrọ adọrọ. Ha pụrụ ịtụ ụjọ na ọ dịghị mgbe ha ga-enwe ike iru eru ịbịaru Chineke a dị nsọ nso. N’ihi ya, ọtụtụ ndị na-ewezụga onwe ha n’ebe Chineke nọ n’ihi ịdị nsọ ya. Nke ahụ dị mwute, n’ihi na ịdị nsọ Chineke bụ n’ezie ihe gbara ọkpụrụkpụ na-eme ka a bịaruo ya nso.  N’ihi gịnị? Tupu anyị azaa ajụjụ ahụ, ka anyị tụlee ihe ịdị nsọ n’ezie bụ.

Gịnị Bụ Ịdị Nsọ?

4, 5. (a) Gịnị ka ịdị nsọ pụtara, gịnịkwa ka ọ na-apụtaghị? (b) Olee ụzọ abụọ dị mkpa Jehova si ‘doo onwe ya iche’?

4 Na Chineke dị nsọ apụtaghị na ọ bụ onye onwe ya jubigara afọ ókè, onye mpako, ma ọ bụ onye na-elelị ndị ọzọ. Kama nke ahụ, ọ kpọrọ àgwà ndị dị otú ahụ asị. (Ilu 16:5; Jems 4:6) Ya mere, gịnị ka okwu ahụ bụ́ “nsọ” pụtara n’ezie? N’asụsụ Hibru e ji dee Bible, e si n’okwu pụtara “e doro iche” nweta ya. N’ihe metụtara ofufe, “nsọ” na-ezo aka n’ihe e doro iche ka a ghara iji ya na-eme ihe nkịtị. Ịdị nsọ na-enyekwa nnọọ n’ụzọ siri ike echiche nke ịdị ọcha. Olee otú okwu a si emetụta Jehova? Ọ̀ pụtara na o ‘doro onwe ya iche’ pụọ n’ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ,’ n’enwetụghị ihe jikọrọ anyị na ya?

5 Ọ dịghị ma ọlị. Dị ka “Onye Nsọ nke Izrel,” Jehova kọwara onwe ya dị ka onye bi “n’etiti” ndị ya, n’agbanyeghị na ha na-emehie emehie. (Aịsaịa 12:6; Hosea 11:9) Ya mere, ịdị nsọ ya adịghị eme ka ọ nọrọ anyị n’ebe dị anya. Oleezi otú o si ‘doo onwe ya iche’? Ọ bụ n’ụzọ abụọ dị mkpa. Nke mbụ, o doro onwe ya iche pụọ n’ebe ihe nile e kere eke nọ n’echiche bụ́ na ọ bụ nanị ya bụ Onye Kachasị Ihe Nile Elu. Ịdị ọcha ya enweghị ntụpọ ọ bụla, o nweghịkwa nsọtụ. (Abụ Ọma 40:5; 83:18) Nke abụọ, Jehova doro onwe ya iche kpam kpam pụọ ná mmehie nile, nke ahụ bụkwa ihe na-akasi obi. N’ihi gịnị?

6. Gịnị mere anyị pụrụ iji nweta nkasi obi n’odido Jehova doro onwe ya iche kpam kpam pụọ ná mmehie?

6 Anyị bi n’ime ụwa ebe ezi ịdị nsọ dị ụkọ. E metọrọ ihe nile banyere ọha mmadụ nke e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ emetọ n’ụzọ ụfọdụ, bụrụ nke mmehie nakwa ezughị okè metọrọ. Anyị nile aghaghị ịlụso mmehie nke dị n’ime anyị agha. Anyị nile nọkwa n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị mmehie ga-emeri ma ọ bụrụ na anyị anọghị na nche. (Ndị Rom 7:15-25; 1 Ndị Kọrint 10:12) Jehova anọghị n’ihe ize ndụ dị otú ahụ. N’ịbụ onye doro onwe ya iche kpam kpam pụọ ná mmehie,  ọ dịghị mgbe mmehie nke pekarịsịrị mpe ga-emetọ ya. Nke a na-emesighachi echiche anyị nwere banyere Jehova dị ka ezigbo Nna ike, n’ihi na ọ pụtara na a pụrụ ịdabere n’ebe ọ nọ kpam kpam. N’adịghị ka ọtụtụ ndị nna bụ́ mmadụ na-emehie emehie, ọ dịghị mgbe Jehova ga-aghọ onye e merụrụ emerụ, onye na-adịghị achịkwa omume ya, ma ọ bụ onye mmegbu. Ịdị nsọ ya na-eme ka nke ọ bụla n’ime ihe ndị dị otú ahụ bụrụ nnọọ ihe na-agaghị ekwe omume. Jehova ọbụna ejiriwo ịdị nsọ ya ṅụọ iyi mgbe ụfọdụ, n’ihi na ọ dịghị ihe a pụrụ ịtụkwasị obi karịa ya. (Emọs 4:2) Nke ahụ ọ́ bụghị ihe na-emesi obi ike?

7. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịdị nsọ bụ nnọọ ọdịdị Jehova?

7 Ịdị nsọ bụ nnọọ ọdịdị Jehova. Gịnị ka nke ahụ pụtara? Iji maa atụ: Tụlee okwu bụ́ “mmadụ” na “ezughị okè.” Ị pụghị ịkọwa okwu nke mbụ ahụ n’echetaghị nke abụọ. Ezughị okè zuru anyị ahụ́ ma na-emetụta ihe nile anyị na-eme. Ugbu a, tụlee okwu abụọ dị nnọọ iche—“Jehova” na “nsọ.” Ịdị nsọ zuru Jehova ahụ́. Ihe nile banyere ya dị ọcha ma zie ezi. Anyị apụghị ịmata Jehova otú ọ dị n’ezie n’ebughị ụzọ ghọta okwu a dị omimi—“nsọ.”

“Jehova Nwe Ịdị Nsọ”

8, 9. Gịnị na-egosi na Jehova na-enyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè aka ịghọ ndị dị nsọ ruo n’ókè ụfọdụ?

8 Ebe ịdị nsọ bụ akụkụ dị oké mkpa nke Jehova, a pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi na ọ bụ isi iyi nke ịdị nsọ nile. Ọ dịghị eji n’ihi ịchọ ọdịmma onwe ya nanị ejichi àgwà a dị oké ọnụ ahịa; ọ na-enye ya ndị ọzọ, ọ na-enyekwa ha ya n’ụba. Leenụ, mgbe Chineke si n’ọnụ mmụọ ozi gwa Mozis okwu n’osisi ahụ na-agba ọkụ, ọbụna ala dị ya gburugburu ghọrọ ihe dị nsọ n’ihi otú e si jikọta ya na Jehova!—Ọpụpụ 3:5.

9 Ụmụ mmadụ na-ezughị okè hà pụrụ ịghọ ndị dị nsọ site n’enyemaka Jehova? Ee, ruo n’ókè ụfọdụ. Chineke nyere ndị ya bụ́ Izrel ohere nke ịghọ “mba dị nsọ.” (Ọpụpụ 19:6) O ji usoro ife ofufe nke dị nsọ ma dị ọcha gọzie mba ahụ. N’ihi ya, ịdị nsọ bụ ihe e kwuru okwu ya ugboro ugboro n’Iwu Mozis.  N’ezie, nnukwu onye nchụàjà kekwasịrị mbadamba ihe e ji ọlaedo mee n’ihu ákwà nkuku isi ya, bụ́ ebe onye ọ bụla ga-enwe ike ịhụ ya ka ọ na-egbukepụ mgbe ìhè nwukwasịrị ya. E dekwasịrị n’elu ya okwu bụ́: “Jehova nwe ịdị nsọ.” (Ọpụpụ 28:36, NW) N’ihi ya, a gaje iji ụkpụrụ dị elu nke ịdị ọcha mara ofufe ha nakwa, n’ezie, ụzọ ndụ ha. Jehova gwara ha, sị: “Nsọ ka unu ga-adị: n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m, bụ́ Jehova, Chineke unu, dị.” (Levitikọs 19:2) Ọ bụrụhaala na ụmụ Izrel anọgide na-ebi ndụ kwekọrọ na ndụmọdụ Chineke ruo n’ókè o kwere ụmụ mmadụ na-ezughị okè mee, ha ga-adị nsọ ruo n’ókè ụfọdụ.

10. A bịa n’ihe banyere ịdị nsọ, olee ọdịiche dị n’etiti Izrel oge ochie na mba ndị gbara ha gburugburu?

10 Mmesi a e mesiri ịdị nsọ ike dị nnọọ iche n’otú ọ dị n’ofufe nke mba ndị gbara Izrel gburugburu. Mba ndị ahụ na-ekpere arụsị fere chi ndị na-adịghị adị n’ezie, chi ndị e gosipụtara dị ka ndị na-eme ihe ike, ndị dị anyaukwu, na ndị na-enwe mmekọahụ aghara aghara. Ha adịtụghị nsọ. Ife chi ndị dị otú ahụ ofufe mere ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-adịghị nsọ. N’ihi ya, Jehova dọrọ ndị ohu ya aka ná ntị ka ha doo onwe ha iche pụọ n’ebe ndị na-ekpere arụsị nọ nakwa n’ebe ofufe ha rụrụ arụ dị.—Levitikọs 18:24-28; 1 Ndị Eze 11:1, 2.

11. Olee otú ịdị nsọ nke nzukọ eluigwe Jehova si pụta ìhè n’ebe (a) ndị mmụọ ozi nọ? (b) ndị seraf nọ? (ch) Jizọs nọ?

11 Ọbụna n’ọnọdụ ndị kasị mma, mba Jehova họọrọ, bụ́ Izrel oge ochie, nwere ike igosipụta nanị ntakịrị n’ime ịdị nsọ nke nzukọ eluigwe nke Chineke. A na-ezo aka n’ebe ọtụtụ nde ndị mmụọ e kere eke ji iguzosi ike n’ihe na-ejere Chineke ozi nọ dị ka “ndị nsọ a na-apụghị ịgụta ọnụ.” (Deuterọnọmi 33:2; Jud 14, Bible Nsọ nke Union Version) Ha na-egosipụta, n’ụzọ zuru okè, ezi ịma mma nke na-egbuke egbuke nke ịdị nsọ Chineke. Chetakwa ndị seraf ahụ Aịzaịa hụrụ n’ọhụụ ya. Ihe ha na-abụ n’abụ na-egosi na ndị mmụọ a e kere eke dị ike na-ekere òkè dị mkpa n’ime ka a mara ịdị nsọ Jehova n’eluigwe na ala dum. Otú ọ dị, otu mmụọ e kere eke kachasị ha nile ukwuu—Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya. Jizọs bụ onye  kasị egosipụta ịdị nsọ Jehova. N’ụzọ ziri ezi, a maara ya dị ka “Onye Nsọ nke Chineke.”—Jọn 6:68, 69.

Aha Dị Nsọ, Mmụọ Nsọ

12, 13. (a) Gịnị mere e ji akọwa aha Chineke n’ụzọ dabara adaba dị ka ihe dị nsọ? (b) N’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji doo aha Chineke nsọ?

12 Gịnị banyere aha Chineke n’onwe ya? Dị ka anyị hụrụ n’Isiakwụkwọ nke 1, aha ahụ abụghị utu aha nkịtị. Ọ na-anọchite anya Jehova Chineke, na-agụnye àgwà ya nile. N’ihi ya, Bible na-agwa anyị na “aha ya dị nsọ.” (Aịsaịa 57:15, NW) Iwu Mozis mere ka ikwutọ aha Chineke bụrụ ịda iwu nke ntaramahụhụ ya bụ ọnwụ. (Levitikọs 24:16) Rịbakwa ama ihe Jizọs butere ụzọ n’ekpere: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ido ihe nsọ pụtara ido ya iche na inye ya nsọpụrụ, iwere ya dị ka ihe dị nsọ. Ma gịnị mere ọ ga-eji dị mkpa ido ihe dị ọcha dị ka aha Chineke, nsọ?

13 A katọwo aha Chineke, jiri ụgha na nkwutọ metọọ ya. N’Iden, Setan ghagidere Jehova ụgha, ma nye echiche na Ọ bụ Eze na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi. (Jenesis 3:1-5) Kemgbe ahụ, Setan—onye na-achị ụwa a na-adịghị nsọ—emewo ihe iji hụ na a mụbara ụgha a na-aghagide Chineke. (Jọn 8:44; 12:31; Mkpughe 12:9) Okpukpe dị iche iche egosipụtawo Chineke dị ka onye dị aka ike, onye na-enweghị ịhụnanya, ma ọ bụ onye nwere obi ọjọọ. Ha ekwuwo na ọ na-akwado ha n’agha ndị ha ji emeju agụụ ha nwere maka ịkwafu ọbara. Ọtụtụ mgbe, e werewo otuto e kwesịrị inye Chineke maka ọrụ okike ya ndị dị ebube nye ihe ndabara, ma ọ bụ evolushọn. Ee, e kwutọwo aha Chineke n’ụzọ jọgburu onwe ya. A ghaghị ido ya nsọ; a ghaghị iweghachi ebube kwesịịrị ya. Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ka e doo aha ya nsọ ma gosi oruru o ruuru ya ịbụ eze, obi dịkwa anyị ụtọ ikere òkè n’ụzọ ọ bụla ná nzube ahụ dị ebube.

14. Gịnị mere e ji kpọọ mmụọ Chineke ihe dị nsọ, gịnịkwa mere ikwulu mmụọ nsọ ji bụrụ mmehie dị oké njọ?

14 Ọ dị ihe ọzọ e jikọtara ya na Jehova n’ụzọ chiri anya nke a  na-akpọ ihe dị nsọ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbe nile—mmụọ ya, ma ọ bụ ike ya nọ n’ọrụ. (Jenesis 1:2) Jehova na-eji ike a kasị ike nile emezu nzube ya. Ihe nile Chineke na-eme, ọ na-eme ha n’ụzọ dị nsọ na n’ụzọ dị ọcha, ya mere n’ụzọ dabara adaba, a na-akpọ ike ya nọ n’ọrụ mmụọ nsọ, ma ọ bụ mmụọ nke ịdị nsọ. (Luk 11:13; Ndị Rom 1:4) Ikwulu mmụọ nsọ ahụ, nke na-agụnye ịkpachara anya na-emegide nzube Jehova, bụ mmehie na-enweghị mgbaghara.—Mak 3:29.

Ihe Mere Ịdị Nsọ Jehova Ji Adọta Anyị n’Ebe Ọ Nọ

15. Gịnị mere ịtụ egwu Jehova ji bụrụ mmeghachi omume kwesịrị ekwesị n’ebe ịdị nsọ ya dị, gịnịkwa ka egwu dị otú ahụ na-agụnye?

15 Mgbe ahụ, o sighị ike ịhụ ihe mere Bible ji na-ejikọta ịdị nsọ Chineke na mmadụ ịtụ egwu Chineke. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 99:3 na-agụ, sị: “Ka ha kelee aha Gị nke dị ukwuu, nke a na-atụkwa egwu ya: [ihe dị] nsọ ka Ọ bụ.” Otú ọ dị, egwu a abụghị oké egwu na-enweghị isi. Kama nke ahụ, ọ bụ inwe egwu nsọpụrụ dị omimi, nkwanye ùgwù n’ụdị ya kasị elu. Inwe mmetụta dị otú ahụ kwesịrị ekwesị, ebe ọ bụ na ịdị nsọ Chineke karịrị anyị nnọọ akarị. Ọ dị ọcha n’ụzọ na-egbukepụ egbukepụ, dị ebube. N’agbanyeghị nke ahụ, o kwesịghị ime ka anyị na-agbara ya ọsọ. Kama nke ahụ, inwe echiche kwesịrị ekwesị banyere ịdị nsọ Chineke ga-eme ka anyị bịarukwuo ya nso. N’ihi gịnị?

Dị ka ịma mma si adọrọ mmasị anyị, otú ahụ ka ịdị nsọ kwesịrị isi na-adọrọ mmasị anyị

16. (a) Olee ihe jikọrọ ịdị nsọ na ịma mma? Nye ihe atụ. (b) N’ụzọ dị aṅaa ka otú e si kọwaa Jehova n’ọhụụ dị iche iche si egosipụta ịdị ọcha na ìhè?

16 Otu ihe bụ na Bible na-ejikọta ịdị nsọ na ịma mma. N’Aịsaịa 63:15, a kọwara eluigwe dị ka ‘ebe obibi nke ịdị nsọ na nke ịma mma’ nke Chineke. Ihe mara mma na-adọrọ mmasị anyị. Dị ka ihe atụ, lee anya n’ihe osise dị na peeji nke 33. Ọ́ dịghị adọrọ mmasị gị? Gịnị mere ka ọ bụrụ nnọọ ihe na-adọrọ mmasị? Rịba ama otú mmiri ahụ si dị ọcha n’anya. Ọbụna ikuku dị n’ebe ahụ aghaghị ịdị ọcha, n’ihi na ihu igwe ya na-acha anụnụ anụnụ, ìhè dị n’ebe ahụ yikwara ka ọ na-egbukepụ egbukepụ. Ugbu a, ọ bụrụ na e metọọ ebe ahụ —kponyejuo ihe ndị ruru unyi n’ime mmiri ahụ, sekasịa ihe n’ahụ́ osisi na n’elu oké nkume ndị ahụ, jiri anwụrụ ọjọọ metọọ ikuku ya—ọ gakwaghị na-adọrọ mmasị anyị; ọ ga na-asọ anyị oyi. Dị ka ọ na-adịkarị, anyị na-ejikọta ịma mma na ịdị ọcha nakwa ìhè. A pụrụ iji okwu ndị a kọwaa ịdị nsọ Jehova. Ka a sịkwa ihe mere otú ahụ e si kọwaa Jehova n’ọhụụ dị iche iche ji na-adọrọ mmasị anyị! Ihe na-egbukepụ ìhè, ihe na-egbuke egbuke dị ka nkume dị oké ọnụ ahịa, ihe na-egbu maramara dị ka ọkụ ma ọ bụ dị ka ọla dị oké ọnụ ahịa nke a na-agwatụghị agwa, nke kasị egbuke egbuke—otú ahụ ka e si akọwa ịma mma nke Chineke anyị dị nsọ.—Ezikiel 1:25-28; Mkpughe 4:2, 3.

17, 18. (a) Olee mmetụta ọhụụ Aịzaịa nwere n’ahụ́ ya ná mmalite? (b) Olee otú Jehova si jiri otu seraf kasie Aịzaịa obi, gịnịkwa ka ihe seraf ahụ mere pụtara?

17 Otú ọ dị, ịdị nsọ Chineke ò kwesịrị ime ka anyị chewe na anyị dị ala ma e jiri anyị tụnyere ya? N’ezie, azịza ya bụ ee. E kwuwerị, anyị dị ala ma e jiri anyị tụnyere Jehova—ọ baghịdị uru ikwuwe ya ekwuwe. Ịmara nke ahụ ò kwesịrị ime ka anyị kewapụ onwe anyị n’ebe ọ nọ? Tụlee ihe Aịzaịa mere mgbe ọ nụrụ ka ndị seraf ahụ na-akpọsa ịdị nsọ Jehova. “M wee sị, Ahụhụ na-adịrị m, n’ihi na alawo m n’iyi; n’ihi na onye egbugbere ọnụ ya abụọ rụrụ arụ ka m bụ, ọ bụkwa n’etiti ndị egbugbere ọnụ ha rụrụ arụ ka m na-ebi: n’ihi na ọ bụ Eze anyị, bụ́ Jehova nke usuu nile nke ndị agha, ka anya m abụọ hụworo.” (Aịsaịa 6:5) Ee, ịdị nsọ na-enweghị nsọtụ nke Jehova chetaara Aịzaịa otú ọ bụruru onye mmehie na onye na-ezughị okè. Ná mmalite, ike gwụrụ nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Ma Jehova ahapụghị ya n’ọnọdụ ahụ.

18 Otu seraf bịara kasie onye amụma ahụ obi ozugbo. N’ụzọ dị aṅaa? Mmụọ ahụ dị ike feere gaa n’ebe ịchụàjà, gụrụ icheku ọkụ na ya, ma metụ ya n’egbugbere ọnụ Aịzaịa. Nke ahụ pụrụ iyi ihe na-afụ ụfụ kama ịbụ ihe na-akasi obi. Otú ọ dị, cheta na ihe a bụ ọhụụ, nke nwere ọtụtụ ihe ọ pụtara n’ụzọ ihe atụ. Aịzaịa, bụ́ onye Juu kwesịrị ntụkwasị obi, maara nke ọma na a na-achụ àjà kwa ụbọchị n’ebe ịchụàjà nke  dị n’ụlọ nsọ ahụ iji kpuchie mmehie. Seraf ahụ jikwa ịhụnanya chetara onye amụma ahụ na n’agbanyeghị na ọ bụ onye na-ezughị okè n’ezie, na “onye egbugbere ọnụ ya abụọ rụrụ arụ,” ọ ka pụrụ ịbụ onye dị ọcha n’anya Chineke. * Jehova dị njikere ile mmadụ na-ezughị okè, nke na-eme mmehie anya dị ka onye dị nsọ—ma ọ́ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ.—Aịsaịa 6:6, 7.

19. Olee otú ọ ga-esi kwe anyị omume ịdị nsọ ruo n’ókè ụfọdụ, n’agbanyeghị na anyị ezughị okè?

19 Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Àjà ahụ nile a chụrụ n’ebe ịchụàjà dị na Jeruselem bụ nanị onyinyo nke ihe ka ukwuu—otu àjà zuru okè, nke Jizọs Kraịst chụrụ na 33 O.A. (Ndị Hibru 9:11-14) Ọ bụrụ na anyị echegharịa n’ezie ná mmehie anyị, gbanwee ụzọ ọjọọ anyị, ma gosipụta okwukwe n’àjà ahụ, a na-agbaghara anyị. (1 Jọn 2:2) Anyị onwe anyị kwa pụrụ ịbụ ndị dị ọcha n’anya Chineke. N’ihi ya, Pita onyeozi na-echetara anyị, sị: “E dere, sị: ‘Unu aghaghị ịdị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.’”  (1 Pita 1:16) Rịba ama na Jehova asịghị na anyị aghaghị ịdịru nsọ otú ọ dị. Ọ dịghị mgbe ọ na-atụ anya n’aka anyị ka anyị mee ihe na-agaghị ekwe omume. (Abụ Ọma 103:13, 14) Kama nke ahụ, Jehova na-agwa anyị ka anyị dị nsọ n’ihi na ọ dị nsọ. “Dị ka ụmụ a hụrụ n’anya,” anyị na-achọ iṅomi ya ruo n’ókè anyị nwere ike dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. (Ndị Efesọs 5:1) Ya mere, iru ịdị nsọ bụ ihe a ga-anọgide na-eme. Ka anyị na-eto n’ụzọ ime mmụọ, anyị na-arụ ọrụ ‘n’ime ka ịdị nsọ zuo okè’ kwa ụbọchị.—2 Ndị Kọrint 7:1.

20. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ịghọta na anyị pụrụ ịdị ọcha n’anya Chineke anyị dị nsọ? (b) Olee mmetụta Aịzaịa nwere mgbe ọ matara na e kpuchiwo mmehie ya?

20 Jehova hụrụ ihe ziri ezi ma dị ọcha n’anya. Ọ kpọrọ mmehie asị. (Habakuk 1:13) Ma ọ kpọghị anyị asị. Ọ bụrụhaala na anyị na-ele mmehie anya otú o si ele ya—na-akpọ ihe ọjọọ asị, na-ahụ ezi ihe n’anya—ma na-agbalịsi ike ịgbaso nzọụkwụ zuru okè nke Kraịst Jizọs, Jehova ga-agbaghara anyị mmehie anyị. (Emọs 5:15; 1 Pita 2:21) Mgbe anyị ghọtara na anyị pụrụ ịdị ọcha n’anya Chineke anyị dị nsọ, mmetụta ọ na-enwe n’ahụ́ anyị na-adị ukwuu. Cheta na ná mmalite, ịdị nsọ Jehova chetaara Aịzaịa adịghị ọcha nke ya. O tiri mkpu, sị: “Ahụhụ na-adịrị m.” Ma ozugbo ọ ghọtara na e kpuchiwo mmehie ya, echiche ya gbanwere. Mgbe Jehova jụrụ onye ga-ewepụta onwe ya maka ịrụ otu ọrụ, Aịzaịa wepụtara onwe ya ozugbo, n’agbanyeghị na ọ maghịdị ihe nke ahụ ga-agụnye. O kwuru, sị: “Lee m; ziga m.”—Aịsaịa 6:5-8.

21. Olee ihe ndabere anyị nwere iji nwee obi ike na anyị pụrụ ịzụlite àgwà nke ịdị nsọ?

21 E kere anyị n’onyinyo nke Chineke dị nsọ, nye anyị àgwà ime omume ọma na ikike nke ịghọta ihe ime mmụọ. (Jenesis 1:26) Anyị nile pụrụ ịbụ ndị dị nsọ. Ka anyị na-anọgide na-azụlite ịdị nsọ, Jehova na-enwe obi ụtọ inyere anyị aka. Ka anyị na-eme nke ahụ, anyị ga na-abịarukwu Chineke anyị dị nsọ nso. Ọzọkwa, ka anyị na-atụle àgwà dị iche iche nke Jehova n’isiakwụkwọ ndị na-esonụ, anyị ga-ahụ na e nwere ọtụtụ ezi ihe mere anyị ga-eji bịaruo ya nso!

^ par. 18 Okwu bụ́ “egbugbere ọnụ ya abụọ rụrụ arụ” dabara adaba, n’ihi na a na-ejikarị egbugbere ọnụ eme ihe n’ụzọ ihe atụ n’ime Bible dị ka ihe na-anọchite anya okwu ma ọ bụ asụsụ. N’ebe mmadụ nile na-ezughị okè nọ, a pụrụ ịchọpụta na ihe dị ukwuu ná mmehie ha na-eme bụ n’otú anyị si eji ikike nke ikwu okwu eme ihe.—Ilu 10:19; Jems 3:2, 6.