Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISI NKE 1

“Lee, Chineke Anyị Ka Onye A Bụ”

“Lee, Chineke Anyị Ka Onye A Bụ”

1, 2. (a) Olee ajụjụ ndị ị ga-enwe mmasị ịjụ Chineke? (b) Gịnị ka Mozis jụrụ Chineke?

Ị̀ PỤRỤ ichetụ n’echiche iso Chineke na-akparịta ụka? Echiche ahụ na-emenye nnọọ ụjọ—Eze eluigwe na ala ịgwa gị okwu! Na mbụ, obi esichaghị gị ike, ma i mesịrị jisie ike zaghachi. O wee gee gị ntị, zaghachi, o mekwara ọbụna ka obi ruo gị ala ịjụ ajụjụ ọ bụla ị chọrọ ịjụ. Ugbu a, olee ajụjụ ị ga-ajụ?

2 Ogologo oge gara aga, e nwere otu nwoke nọ nnọọ n’ọnọdụ dị otú ahụ. Aha ya bụ Mozis. Otú ọ dị, ajụjụ o kpebiri ịjụ Chineke pụrụ iju gị anya. Ọ jụghị ajụjụ banyere onwe ya, ọdịnihu ya, ma ọ bụ ọbụna banyere ọnọdụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Kama nke ahụ, ọ jụrụ Chineke aha ya. Nke ahụ pụrụ iyi gị ihe nzuzu, n’ihi na Mozis amaraworị aha Chineke nwere n’onwe ya. Ya mere, ajụjụ ya aghaghị inwe ihe miri emi karị ọ pụtara. N’ezie, ọ bụ ajụjụ kasị mkpa Mozis pụrụ ịjụworị. Azịza ya na-emetụta anyị nile. Ọ pụrụ inyere gị aka ime ihe dị oké mkpa iji bịaruo Chineke nso. N’ụzọ dị aṅaa? Ka anyị leba anya ná mkparịta ụka ahụ dị ịrịba ama.

3, 4. Ihe omume dịgasị aṅaa dugara ná mkparịta ụka Mozis na Chineke, oleekwa ihe ha kparịtara?

3 Mozis dị afọ 80. O ruwo iri afọ anọ o si n’etiti ndị obodo ya, bụ́ ụmụ Izrel, ndị bụ́ ohu n’Ijipt, gbapụ. Otu ụbọchị, ka ọ nọ na-elekọta ìgwè atụrụ nna nwunye ya, ọ hụrụ otu ihe dị ịtụnanya. Ọkụ nọ na-agba otu osisi ogwu, ma ọkụ adịghị erepịa ya. Ọ nọgidere nnọọ na-agba ya, na-enwu dị ka ogidi ọkụ nke dị n’akụkụ ugwu. Mozis garuru nso iji leruo ya anya. Lee otú ọ na-aghaghị isiworị kụja mgbe otu olu si n’etiti ọkụ ahụ gwa ya okwu! Site n’ọnụ otu mmụọ ozi nke na-ekwuchitere ya, Chineke na Mozis kparịtaziri ụka ruo ogologo oge. Dịkwa ka ị pụrụ ịmawo, Chineke nyere Mozis bụ́ onye nọ na-ala azụ n’ihi egwu ọrụ ịhapụ ndụ dị jụụ ọ  nọ na-ebi ma laghachi Ijipt ịga napụta ụmụ Izrel n’ohu.—Ọpụpụ 3:1-12.

4 N’oge ahụ, Mozis gaara ajụworị Chineke ajụjụ ọ bụla masịrị ya. Otú ọ dị, rịba ama ajụjụ o kpebiri ịjụ: “Lee, mgbe mụ onwe m na-abịakwute ụmụ [Izrel], sị ha, Chineke nke nna unu hà ezitewo m n’ebe unu nọ; mgbe ha ga-asịkwa m, Gịnị bụ aha Ya? ọ̀ bụ gịnị ka m ga-asị ha?”—Ọpụpụ 3:13.

5, 6. (a) Olee eziokwu doro anya nke dịkwa oké mkpa nke ajụjụ Mozis na-akụziri anyị? (b) Olee ihe na-adịghị mma e meworo aha Chineke? (ch) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe dị ịrịba ama na Chineke ekpugheworo ihe a kpọrọ mmadụ aha ya?

5 Nke mbụ, ajụjụ ahụ na-akụziri anyị na Chineke nwere aha. Anyị ekwesịghị iwere eziokwu a doro anya dị ka ihe na-erijughị afọ. Ma, ọtụtụ ndị na-ewere ya otú ahụ. E wepụwo aha aka Chineke n’ọtụtụ nsụgharị Bible ma jiri utu aha ndị dị ka “Onyenwe anyị” na “Chineke” dochie ya. Nke a bụ otu n’ime ihe ndị kasị mwute, bụ́ ihe ndị kwesịkwara nkatọ karịsịa ndị e meworo n’aha okpukpe. E kwuwerị, olee ihe mbụ ị na-eme mgbe i zutere mmadụ? Ị́ dịghị ajụ ya aha ya? Otú ahụ ka ọ dị n’ịmara Chineke. Ọ bụghị onye na-enweghị aha, nke nọ n’ebe dị anya, onye a na-apụghị ịmata ma ọ bụ ghọta onye ọ bụ. Ọ bụ ezie na a pụghị ịhụ ya anya, ọ bụ onye dị adị, o nwekwara aha—Jehova.

6 Ihe ọzọ bụ na mgbe Chineke kpughere aha ya, ihe dị ịrịba ama nke na-akpali akpali na-aga ime. Ọ na-akpọ anyị òkù ka anyị mara ya. Ọ chọrọ ka anyị mee mkpebi kasị mma anyị pụrụ ime ná ndụ, ya bụ, ikpebi ka anyị bịaruo ya nso. Ma Jehova emewo ihe karịrị ịgwa anyị aha ya. Ọ kụziwokwara anyị banyere onye nwe aha ahụ.

Ihe Aha Chineke Pụtara

7. (a) Gịnị ka aha Chineke pụtara? (b) Gịnị ka Mozis chọrọ ịmata mgbe ọ jụrụ Chineke aha Ya?

7 Jehova ji aka ya họrọ aha ya, nke nwere nnukwu ihe ọ pụtara. “Jehova” pụtara “Ọ Na-abụ Ihe Ọ Bụla Ọ Chọrọ Ịbụ.” O nweghị onye dị ka ya n’eluigwe na ala n’ihi na ọ bụ ya  mere ka ihe nile dịrị. N’eziokwu, Chineke dị egwu. Ma, ihe aha a na-akụziri anyị gbasara Chineke ọ̀ bụ nanị na ọ bụ ya kere ihe nile? Dị ka ihe àmà na-egosi, Mozis chọrọ ịmatakwu gbasara Chineke. N’eziokwu, ọ ma na ọ bụ Chineke kere ihe nile, ọ makwa na aha ya bụ Jehova. Ndị mmadụ akpọwala aha ahụ ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. N’ezie, n’ịjụ Chineke aha ya, Mozis na-ajụ ajụjụ banyere onye aha ahụ na-anọchite anya ya. Ihe ọ na-ajụ Chineke bụ: ‘Gịnị ka m ga-agwa ndị gị bụ́ Izrel banyere gị nke ga-ewulite okwukwe ha nwere n’ebe ị nọ, nke ga-eme ka ha kwenye na ị ga-anapụta ha n’ezie?’

8, 9. (a) Olee otú Jehova si zaa ajụjụ Mozis, gịnịkwa dị njọ n’ụzọ a na-esikarị asụgharị ihe ọ zara? (b) Gịnị ka okwu bụ́ “M ga-abụ ihe m chọrọ ịbụ” pụtara?

8 Jehova kọwaara ya ụdị onye ọ bụ. Ihe ọ kọwaara ya gosiri ihe aha ya pụtara. Ọ gwara Mozis, sị: “M ga-abụ ihe m chọrọ.” (Ọpụpụ 3:14, NW) Ọtụtụ nsụgharị Bible na-ekwu n’ebe a, sị: “Abụ m ihe m bụ.” Ma Bible ndị e ji nlezianya sụgharịa na-egosi na Chineke anaghị ekwu nanị na ya dị adị. Kama nke ahụ, ọ nọ na-akụziri Mozis—nakwa anyị nile—na ya “ga-abụ” ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo nkwa ya. Nsụgharị nke J. B. Rotherham sụgharịrị amaokwu a n’ụzọ a kapịrị ọnụ, sị: “M ga-aghọ ihe ọ bụla masịrị m.” Otu ọkachamara n’asụsụ Hibru e ji dee Bible si otú a kọwaa nkebi ahịrịokwu a: “N’agbanyeghị nsogbu ma ọ bụ mkpa mmadụ nwere . . . , Chineke ga-ewepụ nsogbu ahụ ma ọ bụ gboo mkpa ahụ.”

9 Gịnị ka nke ahụ pụtara nye ụmụ Izrel? N’agbanyeghị ihe mgbochi ọ bụla chere ha ihu, otú ọ sọrọ ọnọdụ ha nọ na ya ya taa akpụ, Jehova ga-abụ ihe ọ bụla ọ dị mkpa ka ọ bụrụ iji napụta ha n’ohu ma kpọba ha n’Ala Nkwa ahụ. N’ezie, aha ahụ mere ka ha nwee obi ike n’ebe Chineke nọ. Ọ pụrụ imere anyị otu ihe ahụ taa. (Abụ Ọma 9:10) N’ihi gịnị?

10, 11. Olee otú aha Jehova si eme ka anyị were ya ka Nna nwere ike ịbụ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịbụ na Nna kasị mma a pụrụ ichetụ n’echiche? Kọwaa.

10 Iji maa atụ: Ndị nne na nna maara na ọrụ ha na-arụ n’ilekọta ụmụ ha aghaghị ịdị na-agbanwe. N’ime otu ụbọchị,  nne ma ọ bụ nna pụrụ ịrụ ọrụ dị ka nọọsụ, onye na-esi nri, onye nkụzi, onye ndụmọdụ, ọkàikpe, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ọtụtụ na-abụ ndị ọtụtụ ọrụ a na-atụ anya ka ha rụọ na-akarị akụkụ. Ha na-ahụ obi ike zuru ezu ụmụ ha nwere n’ebe ha nọ, bụ́ ndị na-enwetụghị obi abụọ ọ bụla na Papa ma ọ bụ Mama pụrụ ibelata ụfụ nke mmerụ ahụ́ ha, dozie esemokwu nile, rụzie ihe ọ bụla e ji egwuri egwu nke mebiri emebi ma zaa ajụjụ ọ bụla gbatara n’uche ha nke na-adịghị akwụsị ịchọ ịmata ihe. Ndị nne na nna ụfọdụ na-eche na ha erughị eru, mgbe ụfọdụkwa, ha na-enwe nkụda mmụọ n’ihi erughị eru ha. Ha na-eche na ha erughị eru ma ọlị ịrụ ọtụtụ n’ime ọrụ ndị a.

11 Jehova n’onwe ya bụkwa Nna nke na-ahụ n’anya. Ma, n’emebighị ụkpụrụ ya ndị zuru okè, ọ dịghị ihe ọ na-apụghị ịbụ iji lekọta ụmụ ya ndị nọ n’elu ala n’ụzọ kasị mma kwere mee. N’ihi ya, aha ya, bụ́ Jehova, na-eme ka anyị na-eche banyere ya dị ka Nna kasị mma anyị pụrụ ichetụ n’echiche. (Jems 1:17) N’oge na-adịghị anya, Mozis na ụmụ Izrel ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi matara na Jehova na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’aha ya. Ha ji ụjọ na-ekiri ihe na-emenụ mgbe o mere onwe ya ka ọ bụrụ Ọchịagha a na-apụghị imeri emeri, Onye Na-achịkwa ike ndị sitere n’okike, Onye Na-enye Iwu n’ụzọ na-enweghị atụ, Onyeikpe, Onye Na-atụpụta Ụkpụrụ, Onye Na-enye ihe oriri na mmiri, Onye Na-echekwa uwe na akpụkpọ ụkwụ—na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

12. Olee otú omume Fero n’ebe Jehova nọ si dị iche na nke Mozis?

12 Chineke emewo ka a mara aha ya, meekwa ka a mata ọtụtụ ihe gbasara yanwa bụ́ onye na-aza aha ahụ. O gosikwara na ihe o kwuru gbasara onwe ya bụ eziokwu. Obi abụọ adịghị ya na Chineke chọrọ ka anyị mara onye ọ bụ. Olee ihe anyị kwesịziri ime? Mozis chọsiri ike ịmara onye Chineke bụ. Ọ bụ ya mere o ji jiri ndụ ya mee ihe o kwesịrị ime ma bịaruo Nna ya nke eluigwe nso. (Ọnụ Ọgụgụ 12:6-8; Ndị Hibru 11:27) Ọ dị mwute na ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime  ndị ha na Mozis dịkọrọ ndụ chọrọ ịmara onye Chineke bụ. Mgbe Mozis kpọọrọ Fero aha Jehova, eze Ijipt ahụ dị mpako zaghachiri n’ike, sị: “Ònye bụ Jehova?” (Ọpụpụ 5:2) Fero achọghị ịmatakwu onye Jehova bụ. Kama o lelịrị Chineke nke Izrel ma were ya ka onye na-abaghị uru. Ọ bụ otú a ka ọtụtụ ndị si were Chineke taa. Otú a ha si eche echiche na-eme ka ha ghara ịma otu n’ime eziokwu ndị kasị mkpa, ya bụ, na Jehova bụ Eze Onyenwe anyị.

Eze Onyenwe Anyị Bụ́ Jehova

13, 14. (a) N’ihi gịnị ka e ji nye Jehova ọtụtụ utu aha n’ime Bible, oleekwa ụfọdụ n’ime ha? (Lee igbe dị na peeji nke 14.) (b) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị Jehova ruru eru ka a kpọọ ya ‘Eze Onyenwe anyị’?

13 N’ụzọ ziri ezi, Jehova na-aghọ nnọọ ọtụtụ ihe nke na n’ụzọ kwesịrị ekwesị o nwere ọtụtụ utu aha n’Akwụkwọ Nsọ. Utu aha ndị a na aha aka ahaghị nhata; kama nke ahụ, ha na-akụzikwuru anyị ihe aha ya nọchiri anya ya. Dị ka ihe atụ, a na-akpọ ya “[Eze] Onyenwe anyị Jehova.” (2 Samuel 7:22) Utu aha ahụ dị elu, bụ́ nke pụtara ọtụtụ narị ugboro n’ihe odide mbụ nke Bible, na-agwa anyị ọkwá Jehova. Ọ bụ nanị ya nwere ikike nke ịbụ Onye Ọchịchị nke eluigwe na ala. Tụlee ihe mere o jiri bụrụ otú ahụ.

14 Jehova pụrụ iche dị ka Onye Okike. Mkpughe 4:11 na-ekwu, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, ọbụna Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na i kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha ji dịrị, ka e jikwa kee ha.” Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ dị ndụ nke okwu ndị a dị ebube pụrụ ịdaba adaba n’ebe ọ nọ. Ihe ọ bụla dị n’eluigwe na ala sitere n’aka Jehova! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova ruru eru ịnara nsọpụrụ, ike, na otuto ndị kwesịịrị Eze Onyenwe anyị na Onye Okike nke ihe nile.

15. N’ihi gịnị ka e ji akpọ Jehova “Eze mgbe ebighị ebi”?

15 Utu aha ọzọ a na-eji eme ihe nanị maka Jehova bụ “Eze mgbe ebighị ebi.” (1 Timoti 1:17; Mkpughe 15:3) Gịnị ka nke a pụtara? O siiri uche anyị na-apụghị ịmata ihe nile ike  ịghọta, ma Jehova dị adị site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi. Abụ Ọma 90:2 na-ekwu, sị: “Ọbụna site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, Gị onwe gị bụ Chineke.” Ya mere Jehova enweghị mmalite; ọ dị adị mgbe nile. N’ụzọ ziri ezi, a na-akpọ ya “Onye ochie ahụ”—ọ dị adị eri mgbe ebighị ebi tupu onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla dị n’eluigwe na ala amalite ịdị! (Daniel 7:9, 13, 22) Ònye pụrụ ịgbagha n’ụzọ ziri ezi oruru o ruuru ya ịbụ Eze Onyenwe anyị?

16, 17. (a) Gịnị mere na anyị apụghị ịhụ Jehova anya, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ na-ekwesịghị iji ju anyị anya? (b) N’echiche dị aṅaa ka Jehova dị adị n’ezie karịa ihe ọ bụla anyị pụrụ ịhụ anya ma ọ bụ metụ aka?

16 Ma, ụfọdụ ndị na-agbagha oruru ahụ o ruuru ya, dị ka Fero gbaghara ya. Otu n’ime nsogbu ndị e nwere bụ na ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-atụkwasị obi gabiga ókè n’ihe ha pụrụ iji anya ha hụ. Anyị apụghị ịhụ Eze Onyenwe anyị anya. Ọ bụ mmụọ, onye mmadụ na-apụghị ịhụ anya. (Jọn 4:24) E wezụga nke ahụ, ọ bụrụ na mmadụ nke nwere anụ ahụ́ na ọbara eguzoro kpọmkwem n’ihu Jehova Chineke, ọ ga-anwụ. Jehova n’onwe ya gwara Mozis, sị: “Ị pụghị ịhụ ihu m anya: n’ihi na mmadụ agaghị ahụ m anya, dịkwa ndụ.”—Ọpụpụ 33:20; Jọn 1:18.

17 Nke ahụ ekwesịghị iju anyị anya. Mozis hụrụ nanị akụkụ ụfọdụ nke ebube Jehova, dị ka ihe àmà na-egosi site n’aka mmụọ ozi nke nọchitere anya Ya. Gịnị ka ọ rụpụtara? Ihu Mozis nọ “na-enwupụta ìhè” ruo oge ụfọdụ mgbe nke ahụ gasịrị. Ụmụ Izrel tụrụ egwu ọbụna ile Mozis anya n’ihu kpọmkwem. (Ọpụpụ 33:21-23; 34:5-7, 29, 30) Ya mere, n’ezie, ọ dịghị mmadụ nkịtị pụrụ ilekwasị Eze Onyenwe anyị n’onwe ya anya n’ebube ya nile! Nke a ọ̀ pụtara na ọ bụghị onye dị adị n’ezie otú ihe ndị anyị pụrụ ịhụ anya ma metụ aka dị adị? Ee e, anyị na-ekweta n’egbughị oge na ọtụtụ ihe ndị anyị na-apụghị ịhụ anya dị adị—dị ka ihe atụ, ifufe, ụzarị redio, na echiche uche. Ọzọkwa, Jehova na-adịgide  adịgide, ọ dịghị agbanwe ka oge na-aga, ọbụna ijeri afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ adịghị eme ka ọ gbanwee! N’echiche ahụ, ọ dị nnọọ adị n’ezie karịa ihe ọ bụla anyị pụrụ imetụ aka ma ọ bụ hụ anya, n’ihi na ihe ndị a na-ahụ anya na-eme agadi ma na-eretọ eretọ. (Matiu 6:19) Otú ọ dị, ànyị kwesịrị iche na ọ bụ nanị ikike nke na-abụghị onye ma ọ bụ Ihe Mbụ Mere Ka Ihe Malite Ịdị nke na-edochaghị anya? Ka anyị lee.

Chineke nke Bụ́ Onye

18. Ọhụụ dị aṅaa ka e mere ka Izikiel hụ, gịnịkwa ka ihu anọ nke ‘ihe ndị ahụ e kere eke dị ndụ,’ ndị na-anọ Jehova nso na-anọchite anya ha?

18 Ọ bụ ezie na anyị apụghị ịhụ Chineke anya, e nwere ihe odide ndị na-akpali akpali n’ime Bible bụ́ ndị na-eme ka anyị hụperetụ eluigwe n’onwe ya. Isi mbụ nke Ezikiel bụ otu n’ime ha. E mere ka Izikiel hụ ọhụụ nke nzukọ eluigwe Jehova, bụ́ nke ọ hụrụ dị ka ụgbọ ịnyịnya eluigwe buru nnọọ ibu. Ihe kasị akpali akpali bụ otú e si kọwaa ndị mmụọ e kere eke dị ike ndị gbara Jehova gburugburu. (Ezikiel 1:4-10) ‘Ihe ndị a e kere eke dị ndụ’ na Jehova na-akpachi anya, ọdịdị ha na-agwakwa anyị ihe dị mkpa banyere Chineke ha na-ejere ozi. Nke ọ bụla nwere ihu anọ—ihu oké ehi, ihu ọdụm, ihu ugo, na ihu mmadụ. O doro anya na ha na-anọchi anya àgwà anọ ndị pụtara ìhè n’ụdị onye Jehova bụ.—Mkpughe 4:6-8, 10.

19. Àgwà dị aṅaa ka ihe ndị na-esonụ na-anọchite anya ha? (a) ihu oké ehi? (b) ihu ọdụm? (ch) ihu ugo? (d) ihu mmadụ?

19 N’ime Bible, oké ehi na-anọchitekarị anya ike, nke ahụ kwesịkwara ekwesị, n’ihi na ọ bụ anụ siri nnọọ ike. N’aka nke ọzọ, ọdụm na-esekarị onyinyo ikpe ziri ezi, n’ihi na ezigbo ikpe ziri ezi chọrọ obi ike, bụ́ àgwà e ji mara ọdụm. A maara ugo nke ọma maka ịhụ ụzọ nke ọma ha, ha na-anọ ọbụna n’ebe gafere otu kilomita ahụ ihe ndị pere mpe. Ya mere, ihu ugo ahụ ga-ese nnọọ onyinyo amamihe Chineke nwere nke na-egosi na ọ na-elepụ anya n’ihu. Gịnịkwanụ  banyere ihu mmadụ ahụ? Mmadụ, bụ́ onye e mere n’onyinyo Chineke, pụrụ iche n’ikike o nwere igosipụta àgwà bụ́ isi nke Chineke—ịhụnanya. (Jenesis 1:26) E mere ka akụkụ ndị a nke ụdị onye Jehova bụ—ike, ikpe ziri ezi, amamihe, na ịhụnanya—pụta ìhè ọtụtụ ugboro n’ime Akwụkwọ Nsọ nke na a pụrụ izo aka na ha dị ka àgwà Chineke ndị bụ́ isi.

20. Ọ̀ dị anyị mkpa ichegbuwe onwe anyị na ọ pụrụ ịbụ na Jehova agbanwewo ụdị onye ọ bụ, gịnịkwa mere i ji zaa otú ahụ?

20 Ànyị kwesịrị ịdị na-echegbu onwe anyị na ọ pụrụ ịbụ na Chineke agbanwewo n’ime ọtụtụ puku afọ ndị gafeworonụ kemgbe a kọwasịrị ya n’ime Bible? Ee e, Chineke adịghị agbanwe ụdị onye ọ bụ. Ọ na-agwa anyị, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, agbanweghị.” (Malakaị 3:6) Kama ịgbanwe uche ya mgbe ọ bụla o nwere mkpali ime otú ahụ, Jehova na-egosipụta na ya bụ ezigbo Nna n’ụzọ o si emeghachi omume n’ọnọdụ nke ọ bụla. Ọ na-egosipụta akụkụ ndị ahụ kasị daba adaba nke ụdị onye ọ bụ. N’ime àgwà anọ ahụ, nke kasị pụta ìhè bụ ịhụnanya. A na-ahụ ya n’ihe ọ bụla Chineke na-eme. Ọ na-egosipụta ike, ikpe ziri ezi, na amamihe ya n’ụzọ ịhụnanya. N’ezie, Bible na-ekwu ihe kwesịrị ịrịba ama banyere Chineke na àgwà a. Ọ na-ekwu, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Rịba ama na ọ sịghị na Chineke nwere ịhụnanya  ma ọ bụ na Chineke na-ahụ n’anya. Kama nke ahụ, ọ sịrị na Chineke bụ ịhụnanya. Ịhụnanya, nke bụ́ ihe ọ bụ n’ezie, na-akwali ya n’ihe nile ọ na-eme.

“Lee, Chineke Anyị Ka Onye A Bụ”

21. Olee mmetụta anyị ga-enwe ka anyị na-amatakwu àgwà dị iche iche nke Jehova?

21 Ị̀ hụtụwo ebe obere nwa na-atụrụ ndị enyi ya aka n’ebe nna ya nọ ma jirizie ezi ọṅụ na obi ụtọ kwuo, sị, “Lee papa m”? Ndị na-efe Chineke nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji na-enwe mmetụta dị otú ahụ banyere Jehova. Bible na-ebu amụma banyere oge ndị nwere okwukwe ga-eji oké olu kwuo, sị: “Lee, Chineke anyị ka [Onye] a bụ.” (Aịsaịa 25:8, 9) Ka ị na-aghọtakwu àgwà dị iche iche nke Jehova, otú ahụ ka ị ga na-enwekwu mmetụta na i nwere Nna kasị mma a pụrụ ichetụ n’echiche.

22, 23. Olee otú Bible si akọwa Nna anyị nke eluigwe, oleekwa otú anyị si mara na ọ chọrọ ka anyị nọrọ ya nso?

22 Nna a abụghị onye na-enweghị mmetụta ịhụnanya, nke na-anọ n’ebe dị anya—n’agbanyeghị ihe ndị ụfọdụ ji okpukpe kpọrọ ihe bụ́ ndị na-anapụ onwe ha ihe ụtọ na ndị ọkà ihe ọmụma kụziworo. Ọ ga-esi ike anyị ịbụ ndị a dọtara n’ebe Chineke na-enweghị mmetụta ịhụnanya nọ, Bible adịghịkwa akọwa na Nna anyị nke eluigwe dị otú ahụ. Kama nke ahụ, ọ kpọrọ ya “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) O nwere ma mmetụta siri ike ma nke dị nro. Ọ ‘na-ewute Ya n’obi’ mgbe ihe o kere eke nwere ọgụgụ isi na-emebi ụkpụrụ nduzi ndị ọ na-enye ha maka ọdịmma ha. (Jenesis 6:6; Abụ Ọma 78:41) Ma mgbe anyị mere omume n’ụzọ amamihe dị ka Okwu ya si dị, anyị na-eme “ka obi [ya] ṅụrịa.”—Ilu 27:11.

23 Nna anyị chọrọ ka anyị nọrọ ya nso. Okwu ya na-agba anyị ume “[ịsọ] ìsì ma chọta ya n’ezie, ọ bụ ezie na, n’eziokwu, ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ 17:27) Otú ọ dị, ọ̀ ga-ekwe omume ụmụ mmadụ nkịtị ịbịaru Eze Onyenwe eluigwe na ala nso?