Obi
Olee otú anyị si mara na Baịbụl kwuwe banyere “obi” na ọ na-ekwu banyere ihe mmadụ bụ, dị ka, ihe onye ahụ na-eche, ihe ọ chọrọ ime, àgwà ya, nakwa otú obi na-adị ya?
Ọma 49:3; Ilu 16:9; Luk 5:22; Ọrụ 2:26
I nwekwara ike ịgụ Diut. 15:7; Ọma 19:8
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 9:46-48—Jizọs gbaziri ndịozi ya maka na ọ ma na ihe dị ha n’obi bụ ka ha bụrụ ndị ukwu
-
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-echebe obi anyị?
1 Ihe 28:9; Ilu 4:23; Jere. 17:9
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 6:5-7—Ihe ọjọọ ndị mmadụ nọ na-eche n’obi ha mere ka e nwee tigbuo zọgbuo, bụ́kwanụ ihe mere Chineke ji jiri Iju Mmiri bibie ụwa
-
1 Eze 11:1-10—Eze Solomọn echebeghị obi ya. Ọ bụ ya mere o ji lụọ ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ, bụ́ ndị mere ka obi ya gharazie ịdị n’ife Jehova
-
Mak 7:18-23—Jizọs kwuru na ọ bụ n’obi mmadụ ka echiche ọjọọ niile si apụta nakwa na o nwere ike ime ka anyị mehie Chineke
-
Olee otú anyị ga-esi echebe obi anyị?
Ọma 19:14; Ilu 3:3-6; Luk 21:34; Fil. 4:8
I nwekwara ike ịgụ Ezra 7:8-10; Ọma 119:11
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Efe. 6:14-18; 1 Tesa. 5:8—Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu banyere ekike agha Ndị Kraịst, o kwuru na ezi omume, okwukwe, na ịhụnanya na-echebe mmadụ otú ahụ ekike agha a na-eke n’obi si echebe obi mmadụ
-
Olee otú anyị nwere ike isi mata ma obi anyị ò nwere nsogbu?
I nwekwara ike ịgụ Ilu 6:12-14
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Ihe 25:1, 2, 17-27—Eze Amazaya nwere mgbe o mere ihe dị Chineke mma. Mana, o jighị obi ya niile mee ya. Ka oge na-aga, ọ bịara dị mpako ma malite ime ihe na-adịghị Chineke mma, bụ́kwanụ ihe kpataara ya nsogbu
-
Mat. 7:17-20—Jizọs kwuru na otú ahụ osisi na-adịghị mma si amị mkpụrụ na-adịghị mma ka obi na-adịghị mma si echepụta ihe na-adịghị mma
-
Gịnị mere anyị ji kwesị ịgba mbọ ka anyị nwee ezigbo obi? Oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ya?
I nwekwara ike ịgụ Ọma 119:97, 104; Rom 12:9-16; 1 Tim. 1:5
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Eze 20:1-6—Mgbe Eze Hezekaya nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka ọ gbakee n’ihi otú o si jiri obi ya niile na-efe ya
-
Mat. 21:28-32—Jizọs ji ihe atụ gosi na ihe e ji amata ihe dị mmadụ n’obi bụ ihe onye ahụ na-eme, ọ bụghị naanị ihe o kwuru na ya ga-eme
-
Olee ihe ịmara na Jehova ma ihe dị anyị n’obi ji akasi anyị obi?
I nwekwara ike ịgụ 1 Sam. 2:3
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Sam. 16:1-13—A gwara Samuel onye amụma na ihe dị Jehova mkpa abụghị otú mmadụ dị n’elu ahụ́, kama, ọ na-ahụ ihe dị mmadụ n’obi
-
2 Ihe 6:28-31—Ekpere Eze Solomọn kpere mgbe a na-enyefe ụlọ nsọ Jehova gosiri na Chineke ma ihe dị n’obi ụmụ mmadụ nke ọma nakwa na ọ na-elekọta ụmụ mmadụ
-