Nká; Ndị Agadi
Gịnị na-eme anyị ma anyị kawa nká?
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Nkasi Obi—Ndị ọrịa na nká na-egbochi ime ihe ha chọrọ ime”
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ekli. 12:1-8—Eze Solomọn kwuru ihe ụfọdụ na-eme ma mmadụ kawa nká, dị ka, a hụchaghị ụzọ nke ọma (ya bụ, ‘anya ịgba ụmụ nwaanyị ndị na-elepụ anya na windo ọchịchịrị’) na a nụchaghị ihe nke ọma (ya bụ, ‘olu ụmụ nwaanyị niile na-abụ abụ adapụtaghị ụda’)
-
Ndị agadi hà nwere ike ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ndị ha na-enwe na ihe ndị ha na-agaghị emelizi maka na ha emeela agadi?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Sam. 12:2, 23—Mgbe Samuel onye amụma kara nká, ọ ma na ọ dị ezigbo mkpa ka ọ na-ekpe ekpere maka ndị Jehova
-
2 Sam. 19:31-39—Eze Devid kelere Bazilaị merela agadi maka otú o si kwado ya. Bazilaị gosiri na ya ma ebe ike ya ruru mgbe a gwara ya mee ihe ọ ma na ọ gaghị emeli
-
Ọma 71:9, 18—Mgbe Eze Devid nọ na-atụ ụjọ na ọ gaghịzi abara Jehova uru ma ọ kaa nká, ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya ike ọ ga-eji kụziere ọgbọ na-eso ya banyere ya
-
Luk 2:36-38—A gọziri onye amụma nwaanyị aha ya bụ Anna maka na o ji obi ya niile na-efe Chineke. Nwaanyị a emeela agadi, bụrụkwa nwaanyị di ya nwụrụ
-
Olee otú Jehova si emesi ndị agadi obi ike na o ji ha kpọrọ ihe?
Ọma 92:12-14; Ilu 16:31; 20:29; Aịza. 46:4; Taị. 2:2-5
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 12:1-4—Mgbe Ebreham dị afọ iri asaa na ise, Jehova gwara ya ka ọ hapụ obodo ya kwapụ
-
Dan. 10:11, 19; 12:13—Otu mmụọ ozi gara leta Daniel onye amụma mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri itoolu. Ọ gwara Daniel na Jehova hụrụ ya n’anya nakwa na ọ ga-akwụ ya ụgwọ maka na o ji obi ya na-efe ya
-
Luk 1:5-13—Jehova gọziri Zekaraya na Elizabet merela agadi, mee ka ha mụta nwa nwoke aha ya bụ Jọn
-
Luk 2:25-35—Jehova meere Simiọn, nwoke merela agadi, amara kwe ka ọ hụ nwa ọhụrụ ga-emecha bụrụ Mezaya. Simiọn buru amụma banyere nwa ahụ
-
Ọrụ 7:23, 30-36—Mosis onye amụma dị afọ iri asatọ mgbe Jehova mere ya onye ndú ndị ya bụ́ ndị Izrel
-
Olee otú e kwesịrị isi na-emeso ụmụnna ndị merela agadi?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 45:9-11; 47:12—Josef ziri ozi, a kpọtara ya Jekọb nna ya merela agadi. Josef lekọtakwara ya ruo mgbe ọ nwụrụ
-
Rut 1:14-17; 2:2, 17, 18, 23—Rut gwara agadi nwaanyị bụ́ Naomi okwu ọma, nyekwara ya aka. O si otú ahụ kwado Naomi
-
Jọn 19:26, 27—Tupu Jizọs anwụọ n’elu osisi ịta ahụhụ, ọ gwara Jọn onyeozi ka o lekọtara ya mama ya merela agadi
-
Olee ihe anyị nwere ike ime iji nyere ndị agadi nọ n’ọgbakọ aka?