Nchegharị
Gịnị mere mmadụ niile ji kwesị ichegharị ná mmehie ha ma rịọ Jehova Chineke mgbaghara?
I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 26:20
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 18:9-14—Jizọs mere ihe atụ iji gosi na anyị kwesịrị ikwupụta mmehie anyị ma rịọ Chineke ka o nyere anyị aka
-
Rom 7:15-25—N’agbanyeghị na Pọl bụ onyeozi nwere ezigbo okwukwe, o wutere ya na ime ihe ọjọọ na-agụ ya agụụ oge ụfọdụ
-
Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere otú obi na-adị Jehova ma ndị na-eme ihe ọjọọ chegharịa?
Ezik. 33:11; Rom 2:4; 2 Pita 3:9
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 15:1-10—Jizọs mere ihe atụ iji gosi na Jehova na ndị mmụọ ozi na-aṅụrị ọṅụ ma onye mmehie chegharịa
-
Luk 19:1-10—Mgbe Zakịọs, onye ọnaụtụ nke na-apụnara ndị mmadụ ihe, chegharịrị ma gbanwee, a gbaghaara ya
-
Olee otú anyị si egosi na anyị echegharịala n’eziokwu?
Ezik. 18:21-23; Ọrụ 3:19; Efe. 4:17, 22-24; Kọl. 3:5-10
I nwekwara ike ịgụ 1 Pita 4:1-3
Olee otú ịmata eziokwu dị na Baịbụl nke ọma si enyere onye ji obi ya niile chegharịa aka?
Rom 12:2; Kọl. 3:9, 10; 2 Tim. 2:25
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọrụ 17:29-31—Pọl onyeozi gwara ndị Atens na ọ bụ amaghị ihe mere ndị mmadu ji ekpere arụsị, gbaakwa ha ume ka ha chegharịa
-
1 Tim. 1:12-15—Tupu Pọl amara eziokwu gbasara Jizọs Kraịst, o mere ọtụtụ ihe jọgburu onwe ha n’ihi na ọ maghị ihe mgbe ahụ
-
Olee otú nchegharị dịruru ná mkpa?
Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị echegharịa, Jehova ga-agbaghara anyị ọ bụrụgodị na anyị mehiere ọtụtụ ugboro?
Olee otú Jehova si emeso ndị kwupụtara mmehie ha ma gbanwee àgwà ha?
Ọma 32:5; Ilu 28:13; 1 Jọn 1:9
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ebere”
Olee otú anyị si mara na mmadụ ichegharị abụghị naanị onye ahụ ikwu na ihe o mere wutere ya?
2 Ihe 7:14; Ilu 28:13; Ezik. 18:30, 31; 33:14-16; Mat. 3:8; Ọrụ 3:19; 26:20
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Ihe 33:1-6, 10-16—N’agbanyeghị na Eze Manase mere ihe ọjọọ ruo ogologo oge, o mere ihe ndị gosiri na o chegharịrị n’eziokwu. O weturu onwe ya ala, na-ekpechi ekpere anya, gbanweekwa àgwà ya
-
Ọma 32:1-6; 51:1-4, 17—Eze Devid gosiri na o chegharịrị mgbe o mehiere Jehova. Otú o si mee ya bụ na ihe o mere wutere ya nke ukwuu, ya ekwupụta mmehie ya, rịọkwa Jehova mgbaghara
-
Gịnị mere anyị ga-eji gbaghara ndị mejọrọ anyị ma ha chegharịa?
Mat. 6:14, 15; 18:21, 22; Luk 17:3, 4
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ịgbaghara Mmehie”