Mmadụ Inyefe Chineke Onwe Ya
Olee ihe anyị kwesịrị iji maka ya nyefee Jehova Chineke onwe anyị?
Diut. 6:5; Luk 10:25-28; Mkpu. 4:11
I nwekwara ike ịgụ Ọpụ. 20:5
Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele Baịbụl anya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ife Chineke?
Ọma 119:105; 1 Tesa. 2:13; 2 Tim. 3:16
I nwekwara ike ịgụ Jọn 17:17; Hib. 4:12
Gịnị ka anyị kwesịrị ịma gbasara otú Chineke si anapụta anyị ná mmehie?
Gịnị ka anyị ichegharị ná mmehie anyị mere n’oge gara aga pụtara?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 19:1-10—Zakịọs, onyeisi ndị ọnaụtụ, na-apụnara ndị mmadụ ihe, ma o mechara chegharịa, nyeghachikwa ndị mmadụ ihe ọ pụnaara ha
-
1 Tim. 1:12-16—Pọl onyeozi kọọrọ anyị otú Chineke si meere ya ebere ma gbaghara ya mgbe ọ kwụsịrị ime ihe ọjọọ ndị ọ na-emebu
-
Anyị kwụsịchaa ime ihe ọjọọ, oleekwa ihe ọzọ anyị kwesịrị ime?
Olee iwu ndị anyị ga-edebe ma anyị chọọ ka Chineke nabata ofufe anyị?
1 Kọr. 6:9-11; Kọl. 3:5-9; 1 Pita 1:14, 15; 4:3, 4
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Kọr. 5:1-13—Pọl onyeozi gwara ndị nọ n’ọgbakọ dị na Kọrịnt ka ha si n’ọgbakọ chụpụ otu nwoke na-akwa iko
-
2 Tim. 2:16-19—Pọl onyeozi gwara Timoti ka ọ ghara ige ihe ndị si n’ọgbakọ pụọ na-ekwu, bụ́ ihe ndị na-agbasa ka ọnyá na-aba aba
-
Gịnị mere na ndị na-efe Chineke ekwesịghị ịkwado ndị ọchịchị ụwa a?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jọn 6:10-15—Mgbe Jizọs rụchara ọrụ ebube o ji nye ìgwè mmadụ nri, ndị mmadụ chọwara ime ya eze, ma Jizọs si ebe ahụ pụọ
-
Jọn 18:33-36—Jizọs mere ka o doo anya na e nweghị ihe jikọrọ Alaeze ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa a
-
Olee otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka ife Chineke?
I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 20:28; Efe. 5:18
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọrụ 15:28, 29—Mmụọ nsọ duziri òtù na-achị isi nọ na Jeruselem ha ekpebie otu ihe gbara ọkpụrụkpụ gbasara ibi úgwù
-
Olee otú anyị ga-esi na-ejere Chineke ozi otú Jizọs Kraịst si jeere ya?
Gịnị mere Ndị Kraịst nyefere Chineke onwe ha kwesịrị iji mee baptizim?
Mat. 28:19, 20; Ọrụ 2:40, 41; 8:12; 1 Pita 3:21
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mat. 3:13-17—Ihe kacha Jizọs mkpa bụ ime uche Nna ya, o mekwara baptizim iji gosi na ọ bụ ya bụ ihe kacha ya mkpa
-
Ọrụ 8:26-39—Otu nwoke na-eje ozi n’obí eze ndị Etiopia, onye na-ekpe okpukpe ndị Juu, kwuru ka e mee ya baptizim mgbe ọ matara eziokwu gbasara Jizọs
-