Jehova
Aha ya
Aha ahụ bụ́ Jehova pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ”
Gịnị ka Jehova na-abụ, ma ọ bụ, gịnị ka ọ na-eme ka o wee lekọta ndị na-efe ya?
Ọma 19:14; 68:5; Aịza. 33:22; 40:11; 2 Kọr. 1:3, 4
I nwekwara ike ịgụ Ọma 118:14; Aịza. 30:20; Jere. 3:14; Zek. 2:5
Gịnị mere mmadụ niile ji kwesị ịma na Jehova dị nsọ nakwa na ọ bụ naanị ya bụ ezi Chineke?
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-erubere Jehova, bụ́ Ọkaakaa Eluigwe na Ala, isi?
Aha ụfọdụ a na-etu Jehova
Onye Pụrụ Ime Ihe Niile—Jen. 17:1; Mkpu. 19:6
Nna—Mat. 6:9; Jọn 5:21
Onye Ozizi Kachanụ—Aịza. 30:20
Jehova nke ụsụụ ndị agha—1 Sam. 1:11
Eze mgbe ebighị ebi—1 Tim. 1:17; Mkpu. 15:3
Onye Ukwu—Hib. 1:3; 8:1
Onye Kacha Elu—Jen. 14:18-22; Ọma 7:17
Oké Nkume—Diut. 32:4; Aịza. 26:4
Ọkaakaa Onyenwe anyị—Aịza. 25:8; Emọs 3:7
Ụfọdụ n’ime àgwà ndị kachanụ Jehova nwere
Olee otú Jehova si eme ka o doo ewu na ọkụkọ anya na ya dị nsọ? Gịnị ka ịmata na ọ dị nsọ kwesịrị inyere anyị aka ime?
Ọpụ. 28:36; Lev. 19:2; 2 Kọr. 7:1; 1 Pita 1:13-16
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Aịza. 6:1-8—Mgbe Aịzaya onye amụma hụrụ otú Jehova dịruru nsọ n’ọhụụ, o chere na ya erughị eru ịbụ onye amụma ya, ma otu seraf chetaara ya na ụmụ mmadụ na-eme mmehie nwere ike ịdị ọcha n’anya Chineke
-
Rom 6:12-23; 12:1, 2—Pọl onyeozi kwuru otú anyị nwere ike isi na-agba mbọ ka anyị na-ebi “ndụ dị nsọ” ma ghara ịna-eme mmehie ezughị okè na-akpatara anyị
-
Olee otú Jehova siruru ike? Oleekwa otú dị iche iche o si akpa ike?
Ọpụ. 15:3-6; 2 Ihe 16:9; Aịza. 40:22, 25, 26, 28-31
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Diut. 8:12-18—Mosis onye amụma chetaara ndị Izrel na ọ bụ Jehova ji ike ya nye ha ihe ọma niile ha nwere
-
1 Eze 19:9-14—Mgbe Ịlaịja onye amụma dara mbà, Jehova ji ike ya gbaa ya ume
-
Gịnị mere anyị ji kwesị ịtụkwasị otú Jehova si ekpe ikpe obi?
Diut. 32:4; Job 34:10; 37:23; Ọma 37:28; Aịza. 33:22
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Diut. 24:16-22—Iwu Mosis gosiri na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi, na-eme ebere ma hụ ndị ọzọ n’anya
-
2 Ihe 19:4-7—Eze Jehoshafat gwara ndị ọ họpụtara ka ha na-ekpe ikpe na ha kwesịrị ịna-ekpe ikpe otú dị Jehova mma, ọ bụghị otú ga-adị ndị mmadụ mma
-
Gịnị na-egosi na amamihe Jehova enweghị oyiri?
Ọma 104:24; Ilu 2:1-8; Jere. 10:12; Rom 11:33; 16:27
I nwekwara ike ịgụ Ọma 139:14; Jere. 17:10
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Eze 4:29-34—Jehova mere ka Eze Solomọn nwee amamihe karịa mmadụ ọ bụla ọzọ dị ndụ n’oge ahụ
-
Luk 11:31; Jọn 7:14-18—Jizọs nwere amamihe karịa Solomọn. Otú o si dị umeala n’obi mere o ji kwuo na ọ bụ Jehova nyere ya amamihe
-
Olee otú Jehova si gosi na ọ bụ ịhụnanya bụ àgwà kachanụ o nwere?
Jọn 3:16; Rom 8:32; 1 Jọn 4:8-10, 19
I nwekwara ike ịgụ Zef. 3:17; Jọn 3:35
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mat. 10:29-31—Jizọs ji ihe atụ o ji nza mee gosi otú Jehova si hụ ụmụ mmadụ na-efe ya n’anya nakwa otú o si jiri ha kpọrọ ihe
-
Mak 1:9-11—Jehova si n’eluigwe gwa Ọkpara ya na ya hụrụ ya n’anya nakwa na ihe ya masịrị ya. Ihe a Jehova mere ka nne ma ọ bụ nna ọ bụla kwesịrị ịna-eme maka na obi na-adị nwa ọ bụla ụtọ ịnụ ụdị ihe a n’ọnụ ndị mụrụ ya
-
Olee ihe ndị ọzọ mere anyị ji hụ Jehova n’anya? Baịbụl kwukwara ihe ndị ọzọ magburu onwe ha e ji mara Jehova. Ụfọdụ n’ime ha bụ na . . .
Ọ na-ahụ ihe niile—2 Ihe 16:9; Ilu 15:3
Ọ naghị agbanwe agbanwe; a na-atụkwasị ya obi—Mal. 3:6; Jems 1:17
Ọ na-eme ebere—Aịza. 49:15; 63:9; Zek. 2:8
Ọ naghị anwụ anwụ; o nweghị mmalite, o nweghịkwa ọgwụgwụ—Ọma 90:2; 93:2
Ọ na-emesapụ aka—Ọma 104:13-15; 145:16
Ọ dị egwu—Mkpu. 4:1-6
Ọ bụ onye obi ụtọ—1 Tim. 1:11
Ọ dị umeala n’obi—Ọma 18:35
Ọ dị obiọma—Luk 6:35; Rom 2:4
Mkpu. 15:4
O kwesịrị ntụkwasị obi—Ọ dị ebube—Ọma 8:1; 148:13
Ọ na-eme ebere—Ọpụ. 34:6
O nwere ndidi—Aịza. 30:18; 2 Pita 3:9
Ọ bụ onye udo—Fil. 4:9
Ọ bụ onye ezi omume—Ọma 7:9
Olee otú obi ga-adị anyị ma anyị matakwuo Jehova nke ọma?
Otú anyị ga-esi na-efe Jehova
Gịnị na-egosi na Jehova anaghị atụ anya ka anyị na-eme ihe anyị na-agaghị emeli?
Diut. 10:12; Maị. 6:8; 1 Jọn 5:3
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Diut. 30:11-14—Iwu Jehova si n’aka Mosis onye amụma nye ndị Izrel esighị ike
-
Mat. 11:28-30—Jizọs na-eme nnọọ ka Nna ya. Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya na ya dị obiọma
-
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eto Jehova?
Ọma 105:1, 2; Aịza. 43:10-12, 21
I nwekwara ike ịgụ Jere. 20:9; Luk 6:45; Ọrụ 4:19, 20
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọma 104:1, 2, 10-20, 33, 34—Otu ọbụ abụ toro Jehova maka ihe ndị o kere eke
-
Ọma 148:1-14—Anyị kwesịrị ịna-eto Jehova otú ihe niile e kere eke na ndị mmụọ ozi na-eto ya
-
Olee otú àgwà anyị na-akpa nwere ike isi mee ka a na-eto Jehova?
Mat. 5:16; Jọn 15:8; 1 Pita 2:12
I nwekwara ike ịgụ Jems 3:13
Olee otú anyị nwere ike isi bụrụ ndị enyi Jehova?
Gịnị mere anyị ji kwesị ịdị umeala n’obi ma anyị chọọ ịbụ ndị enyi Chineke?
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-agụ Baịbụl ma na-atụgharị uche n’ihe anyị gụrụ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị enyi Jehova?
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme ihe anyị mụtara banyere Jehova eme?
Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịnwa ka anyị zochiere Jehova ihe ọ bụla?
Job 34:22; Ilu 28:13; Jere. 23:24; 1 Tim. 5:24, 25
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Eze 5:20-27—Gehezaị nwara ka o zochie mmehie ya, ma Jehova kpugheere ya Ịlaịsha onye amụma
-
Ọrụ 5:1-11—Ananayas na Safaịra nwara ka ha zochie ụgha ha ghaara mmụọ nsọ, ma Jehova kpughere ya ma gbuo ha
-