Irube Isi
Olee otú irube isi dịruru mkpa?
Ọpụ. 19:5; Diut. 10:12, 13; Ekli. 12:13; Jems 1:22
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Sam. 15:17-23—Samuel onye amụma baara Eze Sọl ezigbo mba maka na o nupụụrụ Jehova isi, gwakwa ya na irube isi bara ezigbo uru
-
Hib. 5:7-10—N’agbanyeghị na Jizọs bụ Ọkpara Chineke zuru okè, mgbe ọ nọ n’ụwa, o si n’ahụhụ ndị mmadụ tara ya mụta irubere Nna ya isi
-
Gịnị ka Onye Kraịst kwesịrị ime ma ndị ọchịchị gwa ya ka o nupụrụ Chineke isi?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Dan. 3:13-18—Ndị Hibru atọ jụrụ ịkpọrọ ihe Eze Nebukadneza kpụrụ isiala n’agbanyeghị na a gaara egbu ha
-
Mat. 22:15-22—Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya na-erubere ndị ọchịchi isi, ma ha agaghị erubere ha isi ma ha chọọ ka ha nupụrụ Jehova Chineke isi
-
Ọrụ 4:18-31—Ndị na-eso ụzọ Jizọs katara obi na-ekwusasi ozi ọma ike n’agbanyeghị na ndị ọchịchị nyere ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ya
-
Gịnị ka anyị ga-emerịrị iji na-erubere Jehova isi?
Diut. 6:1-5; Ọma 112:1; 1 Jọn 5:2, 3
I nwekwara ike ịgụ Ọma 119:11, 112; Rom 6:17
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ezra 7:7-10—Onye nchụàjà aha ya bụ Ezra ji obi ya niile na-efe Jehova. Ọ kwadebere obi ya ka o nwee ike ime ihe Iwu Chineke kwuru ma kụziere ya ndị ọzọ
-
Jọn 14:31—Jizọs kwuru ihe mere o ji eme ihe niile Nna ya nyere ya iwu ka o mee
-
Gịnị mere anyị ga-eji na-erubere Jehova na Jizọs isi?
Olee otú isi anyị na-erubere Chineke si egosi na anyị nwere okwukwe?
Rom 1:5; 10:16, 17; Jems 2:20-23
I nwekwara ike ịgụ Diut. 9:23
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 6:9-22; Hib. 11:7—Noa gosiri na o nwere okwukwe ma rụọ ụgbọ Jehova sịrị ya rụọ. “O mere nnọọ otú ahụ”
-
Hib. 11:8, 9, 17—Mgbe Jehova gwara Ebreham ka o si na Ọọ kwapụ nakwa ka o jiri nwa ya nwoke chụọ àjà, Ebreham rubeere ya isi, si otú ahụ gosi na o nwere okwukwe
-
Olee otú Jehova si agọzi ndị na-erubere ya isi?
Jere. 7:23; Mat. 7:21; 1 Jọn 3:22
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Lev. 26:3-6—Jehova kwere nkwa na ọ ga-agọzi ndị na-erubere ya isi, lekọtakwa ha
-
Ọnụ Ọgụ. 13:30, 31; 14:22-24—Keleb rubeere Jehova isi, ọ gọzikwara ya
-
Gịnị ga-eme anyị ma anyị nupụ isi?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 2:16, 17; 3:17-19—Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Jehova Chineke isi, e si na paradaịs chụpụ ha, ha ezughịzi okè, ha agaghịkwa enweta ndụ ebighị ebi
-
Diut. 18:18, 19; Ọrụ 3:12, 18, 22, 23—Jehova kwuru na a ga-enwe onye amụma ga-aka Mosis nakwa na a ga-ata onye ọ bụla ga-enupụrụ onye amụma ahụ isi ahụhụ
-
Jud 6, 7—Ndị Sọdọm na Gọmọra na ndị mmụọ ozi ndị nupụụrụ Jehova isi kpasuru Jehova iwe
-
Gịnị mere anyị ga-eji na-erubere Jizọs Kraịst isi?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jọn 12:46-48; 14:24—Jizọs kwuru na a ga-ekpe ndị na-enupụrụ ya isi ikpe
-
Gịnị mere Ndị Kraịst ji erubere ndị okenye ọgbakọ isi?
Gịnị mere nwanna nwaanyị ga-eji na-erubere di ya isi?
Gịnị mere ụmụaka ga-eji na-erubere nne na nna ha isi?
Ilu 23:22; Efe. 6:1; Kọl. 3:20
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 37:3, 4, 8, 11-13, 18—Mgbe Josef bụ nwa okorobịa, o rubeere nna ya isi ma gawa ịhụ ụmụnne ya n’agbanyeghị na ha kpọrọ ya asị
-
Luk 2:51—Jizọs na-erubere Josef na Meri bụ́ nne na nna ya isi n’agbanyeghị na o zuru okè ma hanwa ezughị okè
-
Gịnị mere anyị ga-eji na-erubere onye anyị na-arụrụ ọrụ isi ọ bụrụgodị na e nweghị onye na-ahụ anyị?
Gịnị mere Ndị Kraịst ji erubere ndị ọchịchị isi?