Inye Onyinye
Olee ihe na-egosi anyị na o nweghị onye na-enye ndị ọzọ onyinye ka Jehova?
Jọn 3:16; Ọrụ 17:25; Rom 6:23; Jems 1:17
I nwekwara ike ịgụ Ọma 145:15, 16; 2 Kọr. 9:15
Olee ụdị onyinye na-anaghị amasị Chineke?
Mat. 6:1, 2; 2 Kọr. 9:7; 1 Pita 4:9
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 4:3-7; 1 Jọn 3:11, 12—Ihe mere Chineke ji jụ àjà Ken chụụrụ ya
-
Ọrụ 5:1-11—Chineke gburu Ananayas na Safaịra maka na ha ghara ụgha gbasara onyinye ha nyere, ha ebughịkwa ezigbo ihe n’obi nye ya
-
Olee ụdị onyinye na-atọ Chineke ụtọ?
Mat. 6:3, 4; Rom 12:8; 2 Kọr. 9:7; Hib. 13:16
I nwekwara ike ịgụ Ọrụ 20:35
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 21:1-4—Jizọs jara otu nwaanyị di ya nwụrụ, onye dakwara ogbenye, mma maka onyinye si ya n’obi o nyere n’agbanyeghị na ego o nyere pere ezigbo mpe
-
Olee otú Ndị Kraịst oge ochie si hazie ka e si na-enye onyinye n’ọgbakọ?
Ọrụ 11:29, 30; Rom 15:25-27; 1 Kọr. 16:1-3; 2 Kọr. 9:5, 7
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọrụ 4:34, 35—Ọgbakọ Ndị Kraịst ji obi ha niile nye onyinye. Ndịozi wekwaara ego e nwetara nye ndị a chọrọ iji ya nyere aka
-
2 Kọr. 8:1, 4, 6, 14—Ọgbakọ haziri ka a gbatara ndị ihe na-esiri ike ọsọ enyemaka
-
Olee ihe dị mkpa Ndị Kraịst kwesịrị ịna-emere ma ndị ezinụlọ ha ma ụmụnna ha?
Rom 12:13; 1 Tim. 5:4, 8; Jems 2:15, 16; 1 Jọn 3:17, 18
I nwekwara ike ịgụ Mat. 25:34-36, 40; 3 Jọn 5-8
Gịnị ka Baịbụl kwuru ka anyị na-emere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha?
Diut. 15:7, 8; Ọma 41:1; Ilu 19:17; Jems 1:27
I nwekwara ike ịgụ Ilu 28:27; Luk 14:12-14; Jems 2:1-4
Gịnị na-egosi na ihe kacha mma anyị kwesịrị imere ndị mmadụ bụ ime ka ha na Chineke dịrị ná mma?
Mat. 5:3, 6; Jọn 6:26, 27; 1 Kọr. 9:23
I nwekwara ike ịgụ Ilu 2:1-5; 3:13; Ekli. 7:12; Mat. 11:4, 5; 24:14
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 10:39-42—Jizọs nyeere Mata aka ka ọ ghọta na ihe o kwesịrị ibute ụzọ ná ndụ bụ ihe ga-eme ka ya na Chineke dịrịkwuo ná mma
-