Ime Mkpebi
Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-eme mkpebi ndị dị mma?
Ọma 1:1-3; Ilu 19:20; Rom 14:13; 1 Kọr. 10:6-11
I nwekwara ike ịgụ Ezra 7:10
Olee ihe mere na o kwesịghị ịdị anyị ọkụ ọkụ n’ahụ́ mgbe anyị chọrọ ikpebi ihe dị mkpa?
I nwekwara ike ịgụ Ilu 19:2; Ekli. 5:2; 1 Tim. 5:22
Mgbe anyị chọrọ ikpebi ihe, gịnị mere na anyị ekwesịghị ime ihe uche anyị na-ezughị okè gwara anyị?
I nwekwara ike ịgụ Ọnụ Ọgụ. 15:39; Ilu 14:12; Ekli. 11:9, 10
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Ihe 35:20-24—Ezigbo eze bụ́ Josaya lụsoro Fero Niko agha n’agbanyeghị na e ziri ya ozi si n’aka Jehova ka ọ ghara ime otú ahụ
-
Gịnị mere anyị ji kwesị ibu ụzọ kpee ekpere tupu anyị ekpebie ihe dị mkpa?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Luk 6:12-16—Tupu Jizọs ahọrọ mmadụ iri na abụọ ka ha bụrụ ndịozi ya, o ji otu abalị zuru ezu kpee ekpere
-
2 Eze 19:10-20, 35—Mgbe ndị Asiria bịara ịlụso Eze Hezekaya agha, ọ kpọkuru Jehova n’ekpere, ya anapụta ya
-
Ònye ga-akacha enyere anyị aka ikpebi ihe dị mma? Oleekwa otú o si enyere anyị aka ime ya?
Ọma 119:105; Ilu 3:5, 6; 2 Tim. 3:16, 17
I nwekwara ike ịgụ Ọma 19:7; Ilu 6:23; Aịza. 51:4
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọrụ 15:13-18—Mgbe òtù na-achị isi nọ na Jeruselem chọrọ ime mkpebi dị ezigbo mkpa, ha mere nchọnchọ n’Akwụkwọ Nsọ
-
Mgbe anyị chọrọ ime mkpebi banyere:
Ihe ọ bụla anyị na-eme
Ọrụ
Gụọ isiokwu bụ́ “Ọrụ”
Ihe e ji atụrụ ndụ
Gụọ isiokwu bụ́ “Ntụrụndụ”
Alụmdi na nwunye
Gụọ isiokwu bụ́ “Alụmdi na Nwunye”
Ịgwọ ọrịa
Lev. 19:26; Diut. 12:16, 23; Luk 5:31; Ọrụ 15:28, 29
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọrụ 19:18-20—Ndị Kraịst nọ n’Efesọs mere ihe gosiri na ha ajụla mgbaasị na anwansi
-
Ihe ndị anyị ga-eme n’ozi Jehova
Ihe anyị ji oge eme
I nwekwara ike ịgụ Rom 12:11
Olee otú ndị ụkwụ siri ike n’ọgbakọ nwere ike isi nyere anyị aka ime mkpebi ndị dị mma?
Job 12:12; Ilu 11:14; Hib. 5:14
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
1 Eze 1:11-31, 51-53—Bat-shiba mere ihe Netan onye amụma gwara ya. Ọ bụ ihe a o mere zọrọ ndụ ya na Solomọn nwa ya
-
Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịhapụ ndị ọzọ ka ha na-ekpebiri anyị ihe anyị ga-eme?
Gịnị mere anyị ji kwesị ikpebisi ike na anyị ga na-erube isi na ndụmọdụ Chineke na-enye anyị ma ghara ileghara ya anya?
I nwekwara ike ịgụ Luk 7:30
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Jen. 19:12-14, 24, 25—Lọt gwara ụmụ nwoke ndị chọrọ ịlụ ụmụ ya banyere mbibi Chineke ga-ebibi Sọdọm, ma ha egeghị ya ntị
-
2 Eze 17:5-17—A dọọrọ ndị Izrel n’agha n’ihi na ha egeghị ntị na ndụmọdụ Jehova nyere ha ugboro ugboro
-
Olee ihe mere anyị ji kwesị ige akọnuche anyị ntị mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?
Gịnị mere o ji dị mma ka anyị chebara ihe mkpebi anyị mere nwere ike ịkpata echiche?
Otú ihe anyị kpebiri ga-esi gbasa ndị ọzọ
Otú ihe anyị kpebiri ga-esi gbasa otú ihe ga-adịrị anyị n’ọdịnihu
I nwekwara ike ịgụ Ilu 2:20, 21; 5:3-5
Otú ihe anyị kpebiri ga-esi gbasa adịm ná mma anyị na Jehova
Gịnị mere anyị ga-eji jiri isi anyị buru ihe ọ bụla ihe anyị kpebiri kpatara?
I nwekwara ike ịgụ 2 Kọr. 5:10