Ile Ihe Anya Otú Kwesịrị Ekwesị
Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị?
I nwekwara ike ịgụ 1 Tim. 3:2, 3
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
Jen. 18:23-33—Jehova nwere ndidi ma hapụ Ebreham ka ọ jụọ ya ajụjụ gbasara mbibi ọ chọrọ ibibi ndị Sọdọm na Gọmọra
Jen. 19:16-22, 30—Jehova chebaara Lọt echiche ma kweta ka ọ gbaga na Zoa otú ọ rịọrọ ya kama ịgbaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu
Mat. 15:21-28—Jizọs chebaara nwaanyị Finishia echiche ma kweta ime ihe ọ rịọrọ ya n’ihi na o nwere ezigbo okwukwe