Ịhụnanya
Olee otú Jehova sirila gosi na ya hụrụ ndị ọzọ n’anya?
Jere. 31:3; Jọn 3:16; Rom 5:8; 1 Jọn 4:8, 19
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
Jen. 1:1, 26-31; 2:8, 9, 15, 16—Ọ bụ ịhụnanya mere Jehova ji mee ka ụwa maa mma, nyekwa Adam na Iv ọtụtụ ihe ga-eme ka ndụ tọọ ha ụtọ n’ogige Iden
Ọma 104:27-30—Ọbụ abụ toro Jehova maka na ọ na-elekọta ihe niile e kere eke n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya
Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya?
Jọn 13:34, 35; 15:12, 13; 1 Pita 4:8; 1 Jọn 4:10, 11; 5:3
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
Mat. 22:36-39—Jizọs kwuru na iwu abụọ kachanụ bụ ịhụ Chineke na ndị ọzọ n’anya
1 Kọr. 13:1-8—Pọl onyeozi kwuru na ịhụnanya dị ezigbo mkpa. Ọ gwakwara anyị otú anyị ga-esi na-egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya