Ebere
Olee àgwà ndị ọzọ ha na ebere na-agakọ?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọma 51:1, 2—Mgbe Eze Devid rịọrọ Jehova ka o meere ya ebere, ihe ọ na-arịọ ya bụ ka ọ gbaghara ya ma sachapụ mmehie ya
-
Luk 10:29-37—Jizọs kọrọ otu akụkọ iji kụziere anyị otú anyị ga-esi na-eme ebere. Ọ kọrọ banyere onye Sameria nke meere otu onye Juu ihe ọma
-
Gịnị mere e ji kwesị imere mmadụ niile ebere?
Ọma 130:3; Ekli. 7:20; 1 Jọn 1:8
I nwekwara ike ịgụ 1 Eze 8:46-50
Olee otú anyị si mara na Jehova na-eme ebere?
Ọpụ. 34:6; Nehe. 9:17; Ọma 103:8; 2 Kọr. 1:3
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Job 42:1, 2, 6-10; Jems 5:11—Jehova meere Job ebere ma kụziere ya ka ọ na-emere ndị ọzọ ebere
-
Luk 15:11-32—Jizọs mere ihe atụ otú otu nna si meso nwa ya nupụrụ isi. O ji ya gosi otú Jehova si emere anyị ebere
-
Gịnị mere Jehova ji emere anyị ebere?
I nwekwara ike ịgụ Taị. 3:4, 5
Olee otú àjà Kraịst chụrụ si eme ka a gbaghara anyị mmehie?
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-arịọ Chineke ka o meere anyị ebere? Gịnịkwa mere na anyị ekwesịghị iji onyinye a egwu egwu?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ọma 51:1-4—Mmehie Eze Devid mere wutere ya nke ukwuu, ya ewetuo onwe ya ala rịọ Jehova ka o meere ya ebere
-
Luk 18:9-14—Jizọs mere ihe atụ iji nyere anyị aka ịghọta na Jehova na-emere ndị mere mmehie ebere ma ha wetuo onwe ha ala, kwetakwa na ha mejọrọ
-
Gịnị mere na ndị medịrị mmehie dị oké njọ nwere ike ịtụ anya na a ga-emere ha ebere?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Ihe 33:9-13, 15—Manase bụ ajọ eze, ma o mechara chegharịa, rịọ Chineke ka o meere ya ebere. O mechara bụrụ eze ọzọ, ihe ndị o mekwara gosiri na o chegharịrị n’eziokwu
-
Jona 3:4-10—E ji tigbuo zọgbuo na igbu ndị mmadụ mara ndị Ninive. Ma ha mechara chegharịa, Chineke emeekwara ha ebere
-
Gịnị mere anyị ji kwesị ikwupụtara Jehova mmehie anyị ma gbanwee ka o wee meere anyị ebere?
Na Jehova meere anyị ebere apụtaghị na anyị agaghị ata ahụhụ mmehie anyị mere kpatara
Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-emere ndị ọzọ ebere?
Ọ bụrụ na anyị anaghị emere ndị ọzọ ebere, gịnị nwere ike ime adịm ná mma anyị na Jehova?
I nwekwara ike ịgụ Ilu 21:13
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Mat. 18:23-35—Jizọs mere ihe atụ nke gosiri na ọ bụrụ na anyị ajụ imere ndị ọzọ ebere, Jehova agaghị emere anyị ebere
-
Luk 10:29-37—Jizọs mere ihe atụ nke gosiri na obi anaghị adị ya na Jehova ụtọ ma mmadụ ghara imere ndị ọzọ ebere. Kama, obi na-adị ha ụtọ ma anyị na-eme ka onye Sameria ahụ meteere onye Juu ebere
-
Olee otú Jehova si emeso ndị na-eme ebere?