Amamihe
Gịnị ka mmadụ kwesịrị ime ma ọ chọọ inweta ezigbo amamihe?
Olee ebe anyị ga-esi nweta ezigbo amamihe?
Ànyị kwesịrị ịrịọ Chineke n’ekpere maka amamihe?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
2 Ihe 1:8-12—Mgbe Eze Solomọn malitere ịchị, ọ rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe ọ ga-eji chịa nke ọma, Jehova nyekwara ya amamihe
-
Ilu 2:1-5—E ji amamihe na nghọta tụnyere akụ̀ ndị zoro ezo anyị kwesịrị ịna-achọsi ike. Jehova na-agọzikwa mbọ anyị na-agba ịchọta ha
-
Olee otú Jehova si enye anyị amamihe?
Aịza. 11:2; 1 Kọr. 1:24, 30; 2:13; Efe. 1:17; Kọl. 2:2, 3
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Ilu 8:1-3, 22-31—A kọwara amamihe ka à ga-si na ọ bụ mmadụ. Ihe ndị a kọwara gbasara ya ka e ji mara Jizọs, bụ́ onye Jehova kere tupu o kee ihe ndị ọzọ niile
-
Mat. 13:51-54—Ọtụtụ ndị na-ege Jizọs ntị aghọtaghị otú onye ha ma kemgbe ọ bụ nwata ga-esi mara ihe otú ahụ
-
Olee otú anyị si egosi na anyị nwere amamihe si n’aka Chineke?
Ọma 111:10; Ekli. 8:1; Jems 3:13-17
I nwekwara ike ịgụ Ọma 107:43; Ilu 1:1-5
Olee otú amamihe si enyere anyị aka ma na-echebe anyị?
I nwekwara ike ịgụ Ilu 7:2-5; Ekli. 7:12
Olee uru amamihe si n’aka Chineke bara?
I nwekwara ike ịgụ Job 28:18
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Job 28:12, 15-19—N’agbanyeghị na Job nọ na-ata nnukwu ahụhụ, o kwuru ihe gosiri na o ji amamihe si n’aka Chineke kpọrọ ihe
-
Ọma 19:7-9—Eze Devid kwuru na iwu Jehova na ihe Jehova na-echetara anyị nwedịrị ike ime ka onye na-amaghị ihe mara ihe
-
Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-ege amamihe ụwa, bụ́ nke si n’aka ndị na-eleghara Chineke anya?
1 Kọr. 1:19, 20; 3:19; Kọl. 2:8; 1 Tim. 6:20
I nwekwara ike ịgụ Ekli. 12:11, 12; Rom 1:22, 23