ISI NKE 36
Nkwa Jefta Kwere
Ndị Izrel hapụrụ Jehova ọzọ ma malite ife arụsị dị iche iche. Mgbe ndị Amọn lụsoro ndị Izrel agha, chi ndị ahụ ha na-efe enyereghị ha aka. Ndị Izrel tara ahụhụ ọtụtụ afọ. Ha mechara gwa Jehova, sị: ‘Anyị emehiela. Biko, napụta anyị n’aka ndị iro anyị.’ Ndị Izrel bibiri arụsị ha niile, maliteghachi ife Jehova. Jehova achọghị ka ha nọgide na-ata ahụhụ.
Jehova họpụtara otu dike aha ya bụ Jefta ka o duru ndị Izrel gaa lụso ndị Amọn agha. Jefta gwara Jehova, sị: ‘Ọ bụrụ na i mee ka anyị merie n’agha a, m lọta, m ga-enye gị onye mbụ si n’ụlọ m pụta izute m.’ Jehova zara ekpere Jefta ma nyere ya aka ya emerie n’agha ahụ.
Mgbe Jefta lọtara, onye mbụ pụtara izute ya bụ nwa ya nwaanyị. Ọ bụ naanị ya ka ọ mụrụ. Ọ kụụrụ ịgbà, gbara egwú na-apụta izute nna ya. Gịnị ka Jefta ga-emezi? O chetara nkwa o kwere ma sị: ‘Ewoo, ada m! I mewaala m obi. Ekwere m Jehova nkwa. Ka m nwee ike imezu nkwa a, m ga-eziga gị n’ụlọikwuu dị na Shaịlo ka i jewere ya ozi.’ Ma, ọ gwara nna ya, sị: ‘Ọ bụrụ na i kwere Jehova nkwa, mezuo ya. Biko, tupu mụ agaa, nye m ọnwa abụọ ka mụ na ndị enyi m gaa n’ugwu nọọ. Anyị lọta, mụ agawa.’ Ada Jefta ji obi ya niile jeere Chineke ozi n’ụlọikwuu n’oge niile ọ dị ndụ. N’afọ ọ bụla, ndị enyi ya na-aga eleta ya na Shaịlo.
“Onye hụkwara nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’anya karịa m erughị eru ịbụ onye na-eso ụzọ m.”—Matiu 10:37