ISI NKE 36

Nkwa Jefta Kwere

Nkwa Jefta Kwere

Ndị Izrel hapụrụ Jehova ọzọ ma malite ife arụsị dị iche iche. Mgbe ndị Amọn lụsoro ndị Izrel agha, chi ndị ahụ ha na-efe enyereghị ha aka. Ndị Izrel tara ahụhụ ọtụtụ afọ. Ha mechara gwa Jehova, sị: ‘Anyị emehiela. Biko, napụta anyị n’aka ndị iro anyị.’ Ndị Izrel bibiri arụsị ha niile, maliteghachi ife Jehova. Jehova achọghị ka ha nọgide na-ata ahụhụ.

Jehova họpụtara otu dike aha ya bụ Jefta ka o duru ndị Izrel gaa lụso ndị Amọn agha. Jefta gwara Jehova, sị: ‘Ọ bụrụ na i mee ka anyị merie n’agha a, m lọta, m ga-enye gị onye mbụ si n’ụlọ m pụta izute m.’ Jehova zara ekpere Jefta ma nyere ya aka ya emerie n’agha ahụ.

Mgbe Jefta lọtara, onye mbụ pụtara izute ya bụ nwa ya nwaanyị. Ọ bụ naanị ya ka ọ mụrụ. Ọ kụụrụ ịgbà, gbara egwú na-apụta izute nna ya. Gịnị ka Jefta ga-emezi? O chetara nkwa o kwere ma sị: ‘Ewoo, ada m! I mewaala m obi. Ekwere m Jehova nkwa. Ka m nwee ike imezu nkwa a, m ga-eziga gị n’ụlọikwuu dị na Shaịlo ka i jewere ya ozi.’ Ma, ọ gwara nna ya, sị: ‘Ọ bụrụ na i kwere Jehova nkwa, mezuo ya. Biko, tupu mụ agaa, nye m ọnwa abụọ ka mụ na ndị enyi m gaa n’ugwu nọọ. Anyị lọta, mụ agawa.’ Ada Jefta ji obi ya niile jeere Chineke ozi n’ụlọikwuu n’oge niile ọ dị ndụ. N’afọ ọ bụla, ndị enyi ya na-aga eleta ya na Shaịlo.

“Onye hụkwara nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’anya karịa m erughị eru ịbụ onye na-eso ụzọ m.”​—Matiu 10:37