ISI NKE 26

Ndị Nnyopụta Iri na Abụọ

Ndị Nnyopụta Iri na Abụọ

Ndị Izrel hapụrụ Ugwu Saịnaị ma si n’ala ịkpa Peran ruo n’ebe a na-akpọ Kedesh. N’ebe ahụ, Jehova gwara Mosis, sị: ‘Zie ụmụ nwoke iri na abụọ, otu onye ga-esi n’otu ebo, ka ha gaa nyopụta otú ala Kenan dị, bụ́ ala m ga-enye ndị Izrel.’ N’ihi ya, Mosis họọrọ ụmụ nwoke iri na abụọ ma gwa ha, sị: ‘Gaanụ Kenan, chọpụtanụ ma ala ya ọ̀ na-eme nri nke ọma. Chọpụtanụ ma ndị bi na ya hà siri ike ka ọ̀ bụ na ha esighị ike, ma hà bi n’ụlọikwuu ka ọ̀ bụ n’obodo a rụsiri ike.’ Ndị nnyopụta iri na abụọ ahụ gawara Kenan, ma Joshụa ma Keleb.

Mgbe ụbọchị iri anọ gachara, ndị nnyopụta iri na abụọ ahụ lọtara. Ha wetara mkpụrụ fig, mkpụrụ pọmigranet, nakwa mkpụrụ vaịn. Ha kwuru, sị: ‘Ala ahụ bụ ezigbo ala, ma ndị bi na ya siri ike. Mgbidi obodo ha dị elu.’ Keleb kwuziri, sị: ‘Anyị ga-emeri ha. Ka anyị gawa ozugbo.’ Ị̀ ma ihe mere Keleb ji kwuo ihe a? Ọ bụ n’ihi na ya na Joshụa tụkwasịrị Jehova obi. Ma ndị nnyopụta ndị nke ọzọ sịrị: ‘Mba, ndị bi n’ala ahụ gbara ajọ dimkpa. Anyị dị ka ụkpara n’ebe ha nọ.’

Mgbe ndị Izrel nụrụ ihe a, ike gwụrụ ha. Ha malitere ịtamu ntamu ma na-agwa ibe ha, si: ‘Ka anyị họrọ onye ndú ọzọ ka o duru anyị laghachi Ijipt. Gịnị mere anyị ga-eji gaa ebe ahụ ka e gbuo anyị?’ Joshụa na Keleb gwara ha, sị: ‘Unu enupụrụla Jehova isi, unu atụkwala egwu. Jehova ga-anọnyere anyị.’ Ma ndị Izrel egeghị ha ntị. Ha chọdịrị igbu Joshụa na Keleb.

Gịnị ka Jehova mere? Ọ gwara Mosis, sị: ‘Ndị Izrel ka na-enupụrụ m isi n’agbanyeghị ihe niile m meere ha. N’ihi ya, ha ga-anọ afọ iri anọ n’ala ịkpa a, ha ga-anọkwa na ya nwụọ. Ọ bụ naanị ụmụ ha na Joshụa na Keleb ga-ebi n’ala ahụ m kwere nkwa na m ga-enye ha.’

“Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu, unu ndị okwukwe nta?”​—Matiu 8:26