Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E Mere Ncheta Ọnwụ Jizọs na Fraịdee, Eprel 3, 2015

E Mere Ncheta Ọnwụ Jizọs na Fraịdee, Eprel 3, 2015

NA Satọdee abalị asaa n’ọnwa Mach afọ 2015, ọgbakọ niile nọ́ n’ụwa malitere ịkpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs Kraịst, ka ha nụkwa okwu a ga-ekwu banyere uru ọnwụ ya baara anyị. Ọgbakọ niile ji izu anọ kpọọ ndị mmadụ òkù a. N’ọtụtụ nde mmadụ a kpọrọ òkù a, e nwere ndị e nyere akwụkwọ ịkpọ òkù, nwee ndị a kpọrọ n’ekwentị, nweekwa ndị e zigaara ozi iimel. Ndị mmadụ hà zara òkù a a kpọrọ ha? Obi dị Ndịàmà Jehova ụtọ na nde mmadụ iri na itoolu, narị puku asatọ na iri isii na abụọ, na narị asaa na iri asatọ na atọ bịara soro ha cheta ọnwụ Jizọs na Fraịdee abalị atọ n’ọnwa Eprel. Ugbu a, anyị na-eme ike anyị niile iji nyere ndị niile bịaranụ aka ka ha na-abịachi ọmụmụ ihe anya, soro anyị na-efe ezi Chineke, sorokwa ná ndị ọ hụrụ n’anya na ndị ọ ga-agọzi.—Maị. 4:2.