Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Na-ahazi Oge M?

Olee Otú M Ga-esi Na-ahazi Oge M?

 ISI NKE 21

Olee Otú M Ga-esi Na-ahazi Oge M?

Awa ole ka ị chọrọ ka e tinyekwuo n’ụbọchị? ․․․․․

Gịnị ka ị ga-eji ya eme?

□ Iso ndị enyi m nọrịa

□ Ihi ụra

□ Ịmụ ihe

□ Ihe ọzọ ․․․․․

OGE yiri ịnyịnya na-awụ gam gam. Ị chọọ ka ọ baara gị uru, i kwesịrị ịmụta otú ị ga-esi na-ahazi ya. Ị hazie oge gị ahazi, o nwere ike ime ka obi ruo gị ala, gị emekwuo nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, meekwa ka ndị mụrụ gị tụkwasịkwuo gị obi. I nwere ike iche, sị, “Ọ ga-amagbu onwe ya, ma ọ dị mfe ikwu ya ekwu karịa ime ya eme!” N’eziokwu, ọ ga-esiri gị ike. Ma i nwere ike imeri ya. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ nwere ike isiri gị ike.

Nsogbu nke mbụ: Ịhazi Ihe Ndị Ị Chọrọ Ime

Ihe nwere ike igbochi gị. I nwere ike iche na ịhazi ihe ị chọrọ ime ahazi ga-eke gị agbụ! Ị chọrọ ịna-eme ihe ọ bụla ozugbo i chetara ya, ọ bụghị ime ihe e dere ede.

Ihe mere ị ga-eji mee ya. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru.” (Ilu 21:5) Sọlọmọn bụ nwoke  na-arụ ọrụ mgbe niile. Ọ bụ di, nna, na eze. Ọ dị ka ò nwekwuru ọtụtụ ihe ọ na-arụ ka oge na-aga. Dị ka Sọlọmọn, i nwere ọtụtụ ihe ị na-eme ugbu a. Ma ọrụ nwere ike izukwu gị ahụ́ ka ị na-etokwu. Ọ ka mma ka ị malite ugbu a haziwe ihe ndị ị na-eme kama ịhapụ ka ọ bụrụ mgbe e mechara!

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru. “Ihe dị ka ọnwa isii gara aga, amalitere m ịhazi ihe ndị m na-eme ahazi. Mgbe ahụ, achọrọ m ime ka ihe dịkwuoro m mfe. Ọ dị ka ịhazi oge m ahazi ò nyeere m aka!”—Joey.

“Ide ihe ndị m ga-eme ede na-enyere m aka ime ha otú m si hazie ha. M nwee ihe ndị ọzọ m kwesịrị ime, mụ na mama m na-anọdụ ala dee ihe ahụ niile iji mata otú anyị ga-esi nyere ibe anyị aka imecha ha niile.”—Mallory.

Ihe ga-enyere gị aka. Sigodị otú a lee ya anya: Weregodị ya na o nwere ebe gị na ndị ezinụlọ unu chọrọ iji ụgbọala jee. Onye bịa, ya atụnye akpa ya na buutu ụgbọala ahụ. Ya adịzie ka ngwongwo unu niile agaghị abacha n’ime buutu ahụ. Gịnị ka i nwere ike ime? I nwere ike ibupụta ihe niile ma bido n’isi bubawa ha, buru ụzọ dọnye akpa ndị kacha ibu, dọnyekwa akpa ndị obere n’ebe fọrọ afọ.

I nwere ike ime ụdị ihe ahụ n’ihe ndị i kwesịrị ime n’ụbọchị. Ọ bụrụ na ihe ndị na-adịchaghị mkpa eburu ụzọ richaa oge gị, o nwere ike ime ka ị ghara inwe oge ị ga-eji mee ihe ndị ka mkpa. Buru ụzọ wepụta oge maka ihe ndị ka mkpa. Ọ ga-eju gị anya na ị ka ga-enwe oge ime ihe ndị ọzọ ị chọrọ ime!—Ndị Filipaị 1:10.

Olee ihe ndị kacha mkpa i kwesịrị ime?

․․․․․

 Lee anya n’ihe ndị ahụ i dere, ma dee 1 na nke kacha mkpa, dee 2 na nke na-eso ya, derezie ya otú ahụ gawa. Ọ bụrụ na i buru ụzọ mee ihe ndị kacha mkpa, ọ ga-eju gị anya na ị ka ga-enwe oge ime ihe ndị na-adịchaghị mkpa.

Ihe i nwere ike ime. Nweta akwụkwọ e ji ede ihe, nke na-aba n’akpa uwe, ma dee ihe niile ị chọrọ ime, malite na nke kacha mkpa. Ma ọ bụkwanụ, i nwere ike iji otu n’ime ihe ndị a na-ede ha.

□ Kalenda na-adị n’ekwe ntị

□ Obere akwụkwọ

□ Kalenda na-adị na kọmputa

□ Obere kalenda na-adị na tebụl

Nsogbu nke abụọ: Ime Ihe Otú I Si Dee Ya

Ihe nwere ike igbochi gị. Ka e were ya na i si n’ụlọ akwụkwọ lọta, sị ka i zurutụ ike ma jiri nkeji ole na ole lee tiivi. Ma ọ bụkwanụ, ya abụrụ na ị chọrọ ịmụ ihe unu ga-ele n’ule, gị enweta ozi n’ekwe ntị gị ka ị bịa soro lee fim. I nweghị ike ịgbanwe mgbe a ga-eme fim ahụ, ma i nwere ike ịmụ ihe ahụ n’abalị ma ị lọta. I nwere ike iche, sị, ‘Ọ dị ka m̀ na-aka amụta ihe ma m mụwa ihe mgbe oge na-akụ kwarapụ kwarapụ.’

Ihe mere ị ga-eji mee ya. Ị ga-aka eme nke ọma n’ule ma ị gụọ akwụkwọ mgbe uche gị na-aka adị n’ihe ị na-agụ. Ihe ọzọ bụ, ọ̀ bara uru ịkwanye onwe gị ọkụ n’ahụ́ n’elu nsogbu ndị i nwere enwe? Gịnị mere ị ga-eji mụwa ihe ọkụ ọkụ n’ime abalị ka ị gafee n’ule, si otú ahụ na-enyekwu onwe gị nsogbu? Olee otú ahụ́ ga-adị gị ma chi bọọ? I nwere ike ihife ụra, ahụ́ agaghị eru gị ala, ị ga-eji ọsọ si n’ụlọ pụọ. I nwekwara ike ị gaghị aga ụlọ akwụkwọ n’oge.—Ilu 6:10, 11.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru. “Ile tiivi, ịkpọ ụbọ na iso ndị enyi m nọrịa na-atọ m ụtọ. Ihe ndị ahụ adịghị njọ; ma mgbe ụfọdụ, ha na-eme ka m ghara ime ihe ndị ka mkpa, nke na-eme ka m mewe ihe niile ọkụ ọkụ.”—Julian.

Ihe ga-enyere gị aka. Ahazila  naanị ihe ndị i kwesịrị ime. Haziekwa ihe ndị na-atọ gị ụtọ. Julian sịrị: “Ọ na-akara m mfe ime ihe ndị m kwesịrị ime ma m cheta na e nwere ihe ndị na-atọ m ụtọ m ga-eme ma m mechaa.” I nwekwara ike ikpebi otu ihe ị chọrọ ime, ma hazie otú ị ga-esi jiri nwayọọ nwayọọ mee ya.

Ihe i nwere ike ime. Olee otu ihe ma ọ bụ abụọ i nwere ike ime n’ime ọnwa isii na-abịanụ?

․․․․․

Olee otu ihe i nwere ike ime n’ime afọ abụọ na-abịanụ, oleekwa ihe i kwesịrị imewe ugbu a iji mee ya? *

․․․․․

Nsogbu nke atọ: Ịdị Ọcha na Ịkpakọ Ihe Ọnụ

Ihe nwere ike igbochi gị. O nwere ike ị ghọtaghị otú ịdị ọcha na ịkpakọ ihe ọnụ si gbasa ịhazi oge gị ahazi. Ọ dịkwa ka idewe ihe aghara aghara  ọ̀ na-aka mfe. I cheta idebe ụlọ gị ọcha, gị asị ka ọ dịwa echi, ma ọ bụkwanụ gị echefuzie ya! I nwere ike iche na otú ụlọ gị dị enweghị ihe o mere. Ma, ọ̀ bụ eziokwu?

Ihe mere ị ga-eji mee ya. Idebe ihe niile ọcha na idebe ha ebe ha kwesịrị ịdị ga-eme ka ọ dịrị gị mfe ịchọta ihe n’ụlọ gị n’egbughị oge. Ọ ga-eme ka obi rukwuo gị ala, nke ga-abara gị uru.—1 Ndị Kọrịnt 14:40.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru. “Mgbe ụfọdụ, mgbe m na-enweghị ohere dewe uwe m n’ebe ha kwesịrị ịdị, ọ na-esiri m ike ịhụ ihe m na-achọ ngwa ngwa n’ihi na ebe niile dị ghaa ghaa ghaa!”—Mandy.

“Achọgidere m wọlet m ruo otu izu. O mere ka obi ghara ịdị mụ mma. Emechara m hụ ya mgbe m zachara ụlọ m.”—Frank.

Ihe ga-enyere gị aka. Gbalịa weghachi ihe ebe i si wepụta ya ozugbo i mechara. Na-eme otú ahụ mgbe niile kama ịhapụ ka ebe niile dị ghaa ghaa ghaa.

Ihe i nwere ike ime. Mụta idewe ihe ọcha mgbe niile. Na-edewe  ihe ọcha karịa otú ị na-emebu, ma lee ma ọ̀ ga-eme ka ihe kara gị mfe.

Oge bụ akụ̀. Nke i nwere n’ụbọchị hà ka nke ndị ọzọ, ma ndị ọgbọ gị ma papa gị na mama gị. I mefusịa ya, ị ga-ata ahụhụ ya. Ị hazie ya nke ọma, ị ga-erite uru ya. Ọ bụ gị ga-ekpebi nke ị chọrọ.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Papa gị na mama gị hà kpọ gị kwaga obodo ọzọ? Ọ̀ dị gị ka ị̀ na-agbapụ iche ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ụlọ unu? Mụta otú ị ga-esi mee ka ọnọdụ gị baara gị uru.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 32 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 39 n’akwụkwọ a.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”—Ndị Filipaị 1:10.

NDỤMỌDỤ

Agbalịla ka i mee ihe niile a tụrụ aro ha n’isiokwu a otu mgbe. Kama ime otú ahụ, mee naanị otu n’otu ọnwa na-abịanụ. Ozugbo ị mụtachara nke ahụ, họrọ ọzọ ị ga-eme.

Ị̀ MA NA . . . ?

I kpebie ime ihe karịrị akarị n’ụbọchị, ọ ga-ekowe gị obi n’elu. Ị chọpụta ihe ndị kacha mkpa, ị ga-amata ndị i kwesịrị ime na ndị i kwesịrị ịhapụ.

IHE M GA-EME!

Ihe m na-agaghị ekwe ka o rie m oge bụ ․․․․․

Ihe m ga-eji oge ahụ mee bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Ị mụta ịhazi oge gị ahazi ugbu a, olee otú ọ ga-esi baara gị uru ma i biri nke onwe gị?

● Olee ihe ndị i nwere ike ịmụta n’aka ndị mụrụ gị banyere otú ị ga-esi na-ahazi oge gị?

● Ọ bụrụ na ị na-ahazi oge gị, olee ihe ndị i nwere ike ịgbanwe ka i nwee ike ịna-eji oge gị emekwu ihe bara uru?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 154]

“Anụpeere m ka mmadụ ji egwuregwu na-agwa onye ọzọ na mmadụ chọọ ka m bịa ihe n’elekere anọ, na o kwesịrị ịgwa m ka m bịa n’elekere atọ. Mgbe ahụ ka m ghọtara na m kwesịrị ịna-ahazi oge m nke ọma!”—Ricky

[Igbe dị na peeji nke 155]

Gịnị Ka M Ji Oge M Eme?

Ná nkezi, ihe ndị na-eto eto dị n’agbata afọ 8 na afọ 18 ji oge ha mee n’otu izu bụ:

Awa 17

ha na ndị mụrụ ha ịnọrị

Awa 30

ịnọ n’ụlọ akwụkwọ

Awa 44

ile tiivi, igwu egwuregwu vidio, iji kọmputa ezirịta ozi, na ige egwú

Gbakọọ awa niile i ji eme ihe ndị a n’izu

ile tiivi ․․․․․

igwu egwuregwu vidio ․․․․․

ịchọ ihe n’Ịntanet ․․․․․

ige egwú ․․․․․

Ngụkọta ․․․․․

Awa ole m nwere ike iji mee ihe ndị ka mkpa ․․․․․

[Foto dị na peeji nke 153]

Oge yiri ịnyịnya na-awụ gam gam—i kwesịrị ịmụta otú ị ga-esi na-ahazi ya nke ọma