Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Mara ma Ọ̀ Bụ Ezi Ịhụnanya?

Olee Otú M Ga-esi Mara ma Ọ̀ Bụ Ezi Ịhụnanya?

 ISI NKE 29

Olee Otú M Ga-esi Mara ma Ọ̀ Bụ Ezi Ịhụnanya?

Zaa ajụjụ ndị a:

1. Olee otú ị ga-esi kọwaa “ịhụnanya”? ․․․․․

2. Olee otú ị ga-esi kọwaa “ịhụnanya nzuzu”? ․․․․․

3. Gịnị ka i chere dị iche na ha abụọ? ․․․․․

O NWERE ike o sicharaghị gị ike ịza ajụjụ ndị ahụ. A sị ka e kwuwe, ọ dị mfe ịma ihe dị iche n’ezi ịhụnanya na ịhụnanya nzuzu ma i kwuwe ya n’ọnụ.

Ma ihe niile nwere ike ịgbanwe ozugbo ị hụrụ nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọ dị gị mma. Mma ya nwere ike iri gị isi, o nweghịzi ihe ọzọ ị ga na-eche. Ị hụrụ ya n’anya. Ọ̀ kwa ya? Ma, ọ̀ bụ ezi ịhụnanya ka ọ̀ bụ ịhụnanya nzuzu? Olee otú ị ga-esi mara? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị buru ụzọ chọpụta ma otú i si ele  ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị anya ọ̀ gbanweela n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Dị ka ihe atụ, jụọ onwe gị ajụjụ ndị a:

● Mgbe ị dị afọ ise, olee otú i si ele ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị anya?

● Olee otú i si ele ha anya ugbu a?

Ihe ị zara nwere ike igosi na otú i si ele ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị anya gbanwere mgbe ị ghọwara okorobịa ma ọ bụ agbọghọ. Otu nwata nwoke dị afọ iri na abụọ aha ya bụ Brian kwuru, sị, “Ugbu a ka m malitere ịchọpụta na ụmụ agbọghọ na-ama ezigbo mma.” Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Elaine chetara otú ihe si gbanwee n’afọ ole na ole gara aga. O kwuru, sị, “Ndị enyi m nwaanyị niile malitere ikwu banyere ụmụ okorobịa. Anya m na-adịkwa n’ebe nwa okorobịa ọ bụla m hụrụ nọ.”

Ugbu a anya gị na-adị n’ebe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nọ, gịnị ka i kwesịrị ime? Ime ka à ga-asị na obi gị adịghị n’ebe ha nọ ga-eme ka obi gị ghara ịpụ apụ n’ebe ha nọ. Kama ime otú ahụ, i nwere ike iji oge a magburu onwe ya mụta ihe ụfọdụ gbasara mma elu ahụ́, ịhụnanya nzuzu, na ezi ịhụnanya. Ịghọta ihe atọ a gbasara ịhụnanya nwoke na nwaanyị ga-eme ka i zere nsogbu na-enweghị isi, meekwa ka i mechaa chọta onye ị hụrụ n’anya n’eziokwu.

MMA ELU AHỤ́ Ihe ị hụrụ

“Mụ na ndị enyi m na-ekwukarị banyere ụmụ agbọghọ. Anyị na-agbalị ikwu ihe ndị ọzọ, ma ozugbo nwa agbọghọ mara mma gafewere, anyị na-echefu ihe anyị na-ekwu!”—Alex.

“Nwa okorobịa ihe ya na-amasị m bụ onye na-ele m anya n’ihu, na-amụmụrụ m ọnụ ọchị ma nwee obi ike.”—Laurie.

 Ọ bụghị ihe ọjọọ ma ị hụ onye mara mma, ihe ya amasịwa gị. Ma nsogbu bụ na ọ bụghị ihe ị hụrụ ka ị ga-enweta mgbe niile. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na mma elu ahụ́ nwere ike imegharị gị anya. Baịbụl kwuru, sị: “Dị ka ọla imi e ji ọlaedo mee nke dị n’imi ézì, otú ahụ ka nwaanyị mara mma nke na-ajụ inwe ezi uche dị.” (Ilu 11:22) Otú ahụ ka ọ dịkwa nwa okorobịa.

ỊHỤNANYA NZUZU Otú ọ dị gị n’obi

“Mgbe m dị afọ iri na abụọ, obi m ekweghị apụ apụ n’ebe otu nwata nwoke nọ. Mgbe anya doro m, achọpụtara m na naanị ihe mere ihe ya ji masị m bụ na ihe gbasara ụmụ okorobịa na-atọ ndị enyi m niile ụtọ. Ebe yanwa bụ nwa okorobịa, ihe ya masịrị m!”—Elaine.

“E nweela ọtụtụ ụmụ agbọghọ obi m na-apụghị apụ n’ebe ha nọ, ma ọtụtụ mgbe, ihe m hụrụ bụ naanị mma ha mara. M chọpụtahaala ụdị onye ọ bụ, m na-aghọta na ihe agaghị adabara mụ na ya otú m cheburu.”—Mak.

Ịhụnanya nzuzu na-adịcha ka ezi ịhụnanya. N’eziokwu, ezi ịhụnanya gbasara ịhụnanya nwoke na nwaanyị. Ma ọ bụghị otu ihe na-akpata ha abụọ. Mmadụ nwere ike inwe ịhụnanya nzuzu n’ihi na o kwere ka mma elu ahụ́ megharịa ya anya. Ịhụnanya nzuzu anaghịkwa ekwe ka mmadụ hụ ihe onye nke ọzọ na-anaghị emeta, ọ na-eme ka o chewe na onye ahụ zuru okè. N’ihi ya, ịhụnanya nzuzu dị ka ụlọ ájá ụmụaka rụrụ. Otu nwa agbọghọ aha  ya bụ Fiona kwuru, sị: “Ọ naghị adịte aka. I nwere ike ịhụ mmadụ taa, ihe ya amasị gị, ma otu ọnwa gafee, gị ahụ onye ọzọ ihe ya masịkwara gị, obi gị apụọ n’ebe onye nke mbụ nọ!”

EZI ỊHỤNANYA Ihe ị ma

“Echere m na ị hụ mmadụ n’anya, e nwere ezigbo ihe mere ihe ya ji masị gị, ọ bụghị n’ihi ihe ị ga-erite n’aka ya.”—Devid.

“Ezi ịhụnanya yiri ihe a kụrụ akụ, ọ naghị eto n’otu ụbọchị. Gị na mmadụ nwere ike ịdị ná mma. Ka oge na-aga, ihe ị chọpụtara banyere onye ahụ amasịwa gị, obi gị adịwa n’ebe ọ nọ.”—Judith.

Tupu gị ahụ mmadụ n’anya n’eziokwu, ị ga-ebu ụzọ mata ihe onye ahụ na-emeta na ihe ọ na-anaghị emeta. Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji kwuo na ezi ịhụnanya abụghị naanị otú obi dị mmadụ. O kwuru na ezi ịhụnanya “nwere ogologo ntachi obi na obiọma. . . . Ọ na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile. Ịhụnanya adịghị ada ada.” (1 Ndị Kọrịnt 13:4, 7, 8) Ịhụnanya na-eme ka mmadụ na-eme ihe ndị a n’ihi na ọ matala onye ahụ nke ọma, ọ bụghị n’ihi na ọ maghị ya ma ọ bụ na o kwetara ihe niile ọ gwara ya.

Onye Gosiri Ezi Ịhụnanya

Ihe Baịbụl kọrọ banyere Jekọb na Rechel mere ka a ghọta ihe ezi ịhụnanya bụ. Ha abụọ zutere n’akụkụ olulu mmiri, bụ́  ebe Rechel gara inye atụrụ nna ya mmiri. Ozugbo Jekọb hụrụ Rechel, ihe ya masịrị ya. Maka gịnị? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na Rechel “mara mma n’ahụ́, maakwa mma ihu.”—Jenesis 29:17.

Ma cheta na ọ bụghị naanị mma elu ahụ́ na-eme ka nwa okorobịa hụ nwa agbọghọ n’anya n’eziokwu. Ihe Jekọb chọpụtara abụghị naanị na Rechel mara mma. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na Jekọb “hụrụ Rechel n’anya,” nke gosiri na ọ dịghị anya, ya enwee ezigbo mmasị n’ebe Rechel nọ.—Jenesis 29:18.

Ọ̀ bụ ebe ahụ ka okwu gwụrụ? Mbanụ. Nna Rechel mere ka Jekọb chere afọ asaa tupu ya alụọ Rechel. Ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ, ọ ga-eme ka a mara ma Jekọb ọ̀ hụrụ Rechel n’anya n’eziokwu. A sị na ịhụnanya Jekọb bụ nke nzuzu, ọ garaghị echere Rechel. Ọ bụ naanị ezi ịhụnanya nwere ike ịdịte aka otú ahụ. Gịnị meziri? Baịbụl kwuru, sị: “Jekọb wee jee ozi afọ asaa maka Rechel, ma n’anya ya, ọ dị ka ụbọchị ole na ole n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe ọ nọ.”—Jenesis 29:20.

 Gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe a Jekọb na Rechel mere? I kwesịrị ịmụta na ezi ịhụnanya na-adịte ezigbo aka. Ihe ọzọ bụ na ọ bụghị otú mmadụ dị n’anya na-eme ka ezi ịhụnanya dịtee aka. N’eziokwu, onye i nwere ike ịlụ nwere ike ọ maghị gị oké mma n’anya mgbe mbụ ị hụrụ ya. Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị aha ya bụ Barbara hụrụ otu nwa okorobịa, ma mechaa kwuo na ọ machaghị ya mma mgbe mbụ ọ hụrụ ya. O kwuru, sị: “Ma otú m si ele Stivin anya gbanwere mgbe m matara ya nke ọma. Achọpụtara m na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. Ọ na-achọkwa ọdịmma ndị ọzọ mgbe niile. Ama m na onye nwere àgwà ndị a ga-abụ ezigbo di. Ihe ya masịwara m, mụ ahụwa ya n’anya.” Ha abụọ lụrụ ma biri n’udo.

I toruo ịlụ di ma ọ bụ nwunye, olee otú ị ga-esi mata ma onye ị hụrụ ọ̀ hụrụ gị n’anya n’eziokwu? Kama ime ihe obi gị gwara gị, mee ihe akọnuche gị e ji Baịbụl zụọ gwara gị. Chọpụta àgwà onye ahụ, ọ bụghị naanị otú ọ dị n’anya. Achụla ya ọkụ ọkụ. Cheta na ịhụnanya nzuzu na-akwụsị n’oge na-adịghị anya. Ezi ịhụnanya na-esikwu ike ka oge na-aga, mechaa bụrụ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”—Ndị Kọlọsi 3:14.

Ka obi sie gị ike na ị ga-emecha nweta onye ga-ahụ gị n’anya otú ahụ, ma ọ bụrụ na i wepụ obi gị ná mma elu ahụ́ (ya bụ, ihe ị na-ahụ) nakwa n’ịhụnanya nzuzu (ya bụ, otú ọ dị gị n’obi). Ihe e dere na peeji atọ na-eso nke a ga-enyere gị aka ime otú ahụ.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 1 NA NKE 3 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ka e were ya na ị hụla onye ị hụrụ n’anya n’eziokwu. Olee otú ị ga-esi mata ma ì jikerela ịlụ di ma ọ bụ nwunye?

AMAOKWU BAỊBỤL

“Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya, osimiri apụghịkwa ibupụ ya.”—Abụ Sọlọmọn 8:7.

NDỤMỌDỤ

Ị hụ onye i chere na ihe ya masịrị gị, ma chọọ ịchọpụta ma ị̀ ma ya nke ọma, zaa ajụjụ ndị dị n’igbe dị na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2, na peeji nke 39 (maka ụmụ agbọghọ) nakwa peeji nke 40 (maka ụmụ okorobịa).

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọ na-abụ ọ tatụ ụfọdụ ndị na-eto eto n’isi, ha ahapụ onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha ha na ha na-akpa. Ime otú ahụ bụ “ịmụ” otú e si agba alụkwaghịm.

IHE M GA-EME!

E nwee onye ihe ya masịrị m, ihe ga-enyere m aka ịmata ma ịhụnanya m ọ̀ bụ nke ezigbo ya ka ọ̀ bu nke nzuzu bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere Chineke ji kee mmadụ ka ihe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na-amasị ya?

● Gịnị mere adịm ná mma nwoke na nwaanyị, bụ́ ndị na-eto eto, ji akụkarị afọ n’ala?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 207]

“Ezi ịhụnanya nwere ike imeri nsogbu, ma ịhụnanya nzuzu na-akwụsị ma e nwehaala nsogbu ma ọ bụkwanụ ma ihe gbanwee. Ịhụ mmadụ n’anya n’eziokwu na-ewe ezigbo oge.”—Daniella

 [Igbe dị na peeji nke 209]

Ebe M Dere Ihe

Gịnị Ka Ị Ga-eme?

Maịkel na Juliana akpaala ọnwa atọ, Juliana sịrị na ịhụnanya na-egbu ya ka mmanya. Maịkel hụrụ ya n’anya nke na ọ na-agwa ya ụdị ejiji ọ ga na-eji, ndị ya na ha ga na-akpa na ndị ọ ga-ezere. Ọ na-eme Juliana ka ọ̀ bụ àkwá ugo. Ma n’izu gara aga, Maịkel mara Juliana ụra n’ihi na ọ hụrụ ka ya na nwa okorobịa ọzọ na-akparịta ụka.

Maịkel kwuru, sị: “Juliana kwesịrị ịma na egwu na-atụ m na ọ ga-ahapụ m. N’eziokwu, ezigbo iwe na-ewe m ma m cheta na nwa okorobịa ọzọ nwere ike ịnara m nwa agbọghọ m chọrọ ịlụ! O wutere m na m mara Juliana ụra. Naanị ihe mere m ji maa ya ụra bụ na achọghịdị m ka o lee nwa okorobịa ọzọ anya. Ma, emechara m rịọ ya mgbaghara!”

Juliana sịrị: “Papa m na mama m gwara m na Maịkel dị aka ike, ma m chọpụtara na Maịkel anaghị achọ ime ihe a na-enyo enyo. Ihe m na-ekwu bụ na o nwetụbeghị mgbe ọ chọrọ ịmanye m ka anyị mee omume rụrụ arụ. Maịkel mara m ụra mgbe mụ na nwa okorobịa ọzọ na-akparịta ụka, ma agwaghị m ndị mụrụ m banyere ya. Obi anaghị adị ya mma ma mụ na nwa okorobịa ọzọ na-akparịta ụka. Ma mgbe ụfọdụ, ihe ahụ ọ na-eme na-atọ m ụtọ. Ma, ọ rịọla m mgbaghara, kwekwa m nkwa na ya agaghị eme ya ọzọ.”

Gịnị ka i chere? È nwere ihe ndị ị chọpụtara gosiri na ha nwere ike inwe nsogbu ma ha lụọ? Ọ bụrụ na e nwere, dee ha ebe a. ․․․․․

Gịnị ka Juliana kwesịrị ime? ․․․․․

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ gị? ․․․․․

 [Igbe dị na peeji nke 210]

Ebe M Dere Ihe

Gịnị Ka Ị Ga-eme?

Jọn na Lidia akpaala ọnwa abụọ. Jọn achọpụtala na Lidia na ndị mmadụ na-esekarị okwu, nke ka nke, ya na ndị mụrụ ya. N’eziokwu, ya na ha na-ese okwu mgbe niile. Okwu na-ebi n’ọnụ ya mgbe niile. Ọ mụọla isi ọnwụ. Ọ na-esikata ọnwụ ike agwụ ndị mụrụ ya. Lidia etuorola Jọn ọnụ na ndị mụrụ ya na-eme ihe ọ bụla ọ gwara ha.

Jọn kwuru, sị: “Lidia na-ekwu ihe ọ bụla dị ya n’obi. O nweghị onye ọ na-ege ntị, ma ndị mụrụ ya. Papa ya na-eme ihe na-ewe mmadụ iwe. Ka a sịkwa ihe mere Lidia ji abakarịrị ya mba. Ma ọ bụghị naanị mba ka Lidia na-abara ndị mụrụ ya. Ọ na-eme ihe ọ bụla o nwere ike ime, ma ibe ákwá ma ịgbarụ ihu ma ime ka ezigbo mmadụ, ka ndị mụrụ ya meere ya ihe ọ bụla ọ chọrọ.”

Lidia kwuru, sị: “Achọghị m ịma onye ị bụ ma ọ bụ ihe ị bụ. M ga-agwa gị okwu otú ọ dị m n’obi. Agaghị m agwa gị ya otú ọ na-agaghị ewe gị iwe. Jọn, bụ́ onye chọrọ ịlụ m, ma na ọ bụ otú m na-eme. Ọ hụla ebe m na-agwa ndị mụrụ m okwu.”

Gịnị ka i chere? È nwere ihe ndị ị chọpụtara gosiri na ha nwere ike inwe nsogbu ma ha lụọ? Ọ bụrụ na e nwere, dee ha ebe a. ․․․․․

Gịnị ka Jọn kwesịrị ime? ․․․․․

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ gị? ․․․․․

 [Igbe dị na peeji nke 211]

Ebe M Dere Ihe

Ọ̀ Bụ Ezi Ịhụnanya Ka Ọ̀ Bụ Ịhụnanya Nzuzu?

Gbalịa ịmata okwu na-adịghị n’ihe ndị a ndị mmadụ kwuru. N’ebe ndị ahụ a na-edeghị ihe, dee ezi ịhụnanya ma ọ bụ ịhụnanya nzuzu.

1. “․․․․․ kpuru ìsì, ọ naghị achọ ịhụ ụzọ. Ọ naghị achọ ịhụ nke bụ́ eziokwu.”—Calvin.

2. “Ọ bụrụ na ọ na-abụ mụ na nwa agbọghọ ihe ya masịrị m nọrọ, mụ agbanwee otú m si akpa àgwà, ọ bụ ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․.”—Tọmọs.

3. Onye ọ bụ gị na ya nwere ike ime ihe ga-akpasu gị iwe. Ma ọ bụrụ ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․, ị ka ga-achọ ka gị na onye ahụ na-akpa, unu ga-edozikwa nsogbu ahụ.”—Ryan.

4. “Ọ bụrụ ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․, naanị ihe ị ga na-eche bụ ebe ihe na-adabara gị na onye gị na ya na-akpa.”—Claudia.

5. “Ọ bụrụ ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․, ị gaghị na-agbalị ka a ghara ịma ụdị mmadụ ị bụ.”—Iv.

6. “․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․ bụ ihe nwa agbọghọ na-eji enweta ihe ọ chọrọ, ikekwe ka a sị na o nwere enyi nwoke.”—Allison.

7. “Mmadụ nwee ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․, ọ ga-ahụ ebe onye nke ọzọ na-emejọ, ma ọ gaghị ahapụ onye ahụ.”—April.

8. “Ọ bụrụ ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․, ị gaghị ama ihe mere ihe onye ahụ ji amasị gị, naanị ihe ị ma bụ na ihe ya masịrị gị.”—Devid.

9. “Ọ bụrụ ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․, ihe ọ bụla onye nke ọzọ mere dị mma.”—Chelsea.

10. “Ọ bụrụ ․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․․, anya gị agaghịzi adị n’ebe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nọ n’ihi na ị chọrọ ka obi gị dịrị naanị n’ebe onye ahụ nọ.”—Daniel.

Azịza: Ịhụnanya nzuzu: 1, 2, 4, 6, 8, 9. Ezi ịhụnanya: 3, 5, 7, 10.

[Foto dị na peeji nke 206, 207]

Ịhụnanya nzuzu dị ka ụlọ ájá ụmụaka rụrụ. Ọ na-ada n’oge na-adịghị anya