Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Igbo Onwe M Agụụ Mmekọahụ?

Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Igbo Onwe M Agụụ Mmekọahụ?

 ISI NKE 25

Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Igbo Onwe M Agụụ Mmekọahụ?

“Amalitere m igbo onwe m agụụ mmekọahụ mgbe m dị afọ asatọ. M mechara mụta otú Chineke si ele omume ahụ anya. O wutere m nke ukwuu mgbe ọ bụla m mere ya. M na-ajụ onwe m, sị, ‘Olee otú Chineke ga-esi hụ onye dị ka m n’anya?’”—Luiz.

MGBE ị ghọwara okorobịa ma ọ bụ agbọghọ, mmekọahụ nwere ike ịgụsiwe gị ike, mee ka ị malite igbo onwe gị agụụ mmekọahụ. * Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụghị ihe ọjọọ. Ha na-asị: “O nweghị onye ọ na-akpatara nsogbu.” Ma, e nwere ezi ihe mere ị ga-eji zere ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu . . . nwụọ n’ihe banyere . . . agụụ mmekọahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:5) Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ anaghị eme ka agụụ mmekọahụ ya nwụọ, kama ọ na-afụnye ya ọkụ. Ihe ndị ọzọ ị ga-echebara echiche bụ:

● Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ na-eme ka onye ahụ na-eche banyere naanị onwe ya. Dị ka ihe atụ, mgbe mmadụ na-egbo onwe ya agụụ mmekọahụ, naanị ihe dị ya mkpa bụ otú ihe ahụ ọ na-eme si atọ ya ụtọ.

● Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ na-eme ka ọ na-ele onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya anya ka ihe e ji enwe mmekọahụ.

 ● Ebe ọ bụ na onye na-egbo onwe ya agụụ mmekọahụ na-eche banyere naanị onwe ya, o nwere ike ime ka mmekọahụ ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya na-enwe ghara ịna-eju ya afọ.

Kama igbo onwe gị agụụ mmekọahụ na-agụ gị, gbalịa ịna-ejide onwe gị. (1 Ndị Tesalonaịka 4:4, 5) Iji nyere gị aka ime otú ahụ, Baịbụl kwuru na i kwesịrị izere ihe ọ bụla ma ọ bụ ebe ọ bụla nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gụwa gị. (Ilu 5:8, 9) Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na igbo onwe gị agụụ mmekọahụ eriela gị isi? O nwere ike ịbụ na ị gbalịala ịkwụsị ya, ma o kwebeghị gị. I nwere ike iche ozugbo na ị gaghị akwụsịli ya, na i nweghị ike ime ihe Chineke chọrọ. Otú ahụ ka otu nwa okorobịa aha ya bụ Pedro si na-ele onwe ya anya. O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m mere ya, ọ na-ewute m nke ukwuu. M chere na o nweghị ihe ga-eme ka Chineke gbaghara m. O siiri m ike ikpe ekpere.”

Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, adala mbà. Olileanya ka dị. Ọtụtụ ndị, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, akwụsịla àgwà ọjọọ ahụ. I nwekwara ike ịkwụsị ya!

Ihe Ị Ga-eme Mgbe Obi Na-ama Gị Ikpe

Dị ka anyị kwurula, obi na-amakarị ndị na-egbo onwe ha agụụ mmekọahụ ikpe. O doro anya na ọ bụrụ na ị na-enwe “mwute dị ka uche Chineke si dị,” o nwere ike ime ka ị kwụsị àgwà ahụ. (2 Ndị Kọrịnt 7:11) Ma obi gị mawa gị ikpe gafee ókè, o nwere ike imebiri gị ihe. O nwere ike ime ka ị daa mbà, nke ga-eme ka ị chọọ ịkwụsị ịgbalị imeri àgwà ahụ.—Ilu 24:10.

N’ihi ya, gbalịsie ike ile nsogbu ahụ anya otú kwesịrị ekwesị. Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ bụ adịghị ọcha. O nwere ike ime ka ị “bụrụ ohu  nke ọchịchọ na ihe ụtọ dị iche iche.” Ọ na-emekwa ka mmadụ na-eche echiche na-ezighị ezi. (Taịtọs 3:3) Ma, àgwà a abụghị mmekọahụ jọgburu onwe ya dị ka ịkwa iko. (Jud 7) N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-egbo onwe gị agụụ mmekọahụ, i kwesịghị iche na i meela mmehie Chineke na-agaghị agbaghara. Ihe i kwesịrị ime bụ ịrụ ahụ́ gị ụka ma na-agbalị mgbe niile izere ya!

Mgbe ọ bụla i mere omume ahụ, o nwere ike ime ka obi daa gị mbà. Mgbe ụdị ihe ahụ mere, cheta ihe e kwuru n’Ilu 24:16, nke bụ́: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha; ma ọdachi ga-eme ka ndị ajọ omume sụọ ngọngọ.” Ime ya ọzọ apụtaghị na ị bụ onye ajọ omume. N’ihi ya, adala mbà. Kama, chọpụta ihe mere i ji mee ya ọzọ. Gbalịakwa ka i zere ihe ahụ.

Na-atụgharị uche n’ịhụnanya Chineke na ebere ya. E nwere mgbe ọbụ abụ bụ́ Devid mehiere n’ihi ezughị okè. O kwuru, sị: “Jehova emeworo ndị na-atụ egwu ya ebere dị ka nna si emere ụmụ ya ebere. N’ihi na ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” (Abụ Ọma 103:13, 14) N’eziokwu, Jehova ghọtara na anyị ezughị okè. Ọ “dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.” (Abụ Ọma 86:5) Ma ọ chọrọ ka anyị na-agbalị imekwu nke ọma. N’ihi ya, gịnị ka i nwere ike ime iji kwụsị àgwà ọjọọ a?

 Chebara ihe i ji atụrụ ndụ echiche. Ihe ị na-ele na tiivi ma ọ bụ na fim ma ọ bụ ebe ị na-aga n’Ịntanet ọ̀ na-eme ka mmekọahụ gụwa gị? Ọbụ abụ kpegaara Chineke ekpere gosiri na ọ ma ihe, sị: “Mee ka anya m ghara ịhụ ihe na-abaghị uru.” *Abụ Ọma 119:37.

Jisie ike chewe ihe ndị ọzọ. Otu nwanna nwoke aha ya bụ William kwuru, sị: “Tupu ị lakpuo ụra, gụọ Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ọ dị mkpa ka ihe ikpeazụ ị ga-eche n’ụbọchị bụrụ ihe gbasara ofufe Chineke.”—Ndị Filipaị 4:8.

Gwa mmadụ nsogbu ị na-enwe. Ihere nwere ike ime ka o siere gị ike ịkọrọ ya onye ị tụkwasịrị obi. Ma, ịkọrọ ya  mmadụ nwere ike inyere gị aka ịkwụsị àgwà a! Otu nwanna nwoke aha ya bụ Devid chọpụtara na ọ bụ eziokwu. O kwuru, sị: “M gara gwa papa m nsogbu m nwere. Agaghị m echefu ihe ọ gwara m. Ọ mụmụrụ ọnụ ọchị, sị m: ‘Eji m gị eme ọnụ n’ihi omume gị.’ Ọ ma na o siiri m ike ịkata obi gwa ya ihe ahụ. Ihe o kwuru gbara m ume, nyekwara m aka ikpebisi ike ịkwụsị àgwà ahụ.

“Papa m gosiri m ebe ụfọdụ n’Akwụkwọ Nsọ iji nyere m aka ịghọta na abụghị m onye ọjọọ, gosikwa m ebe ndị ọzọ iji chọpụta ma m̀ ghọtara na ihe m mere bụ ihe ọjọọ. Ọ gwara m mgbe ọzọ mụ na ya ga-ekwu banyere ya, sịkwa m jisie ike ka m ghara ime ya ruo mgbe ahụ. Ọ sịrị m adala mbà ma m mee ya ọzọ, sịkwa m nọtee aka n’emeghị ya.” Gịnị ka Devid mechara kwuo? O kwuru, sị: “Ihe baara m ezigbo uru bụ ịgwa mmadụ nsogbu m nwere, onye ahụ ana-enyekwara m aka.” *

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Chọpụta ihe mere na e kwesịghị iji inwe mmekọahụ na-egwuri egwu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ na mmekọahụ ịnọkata gụwa mmadụ abụghị otu ihe. Dị ka ihe atụ, nwa okorobịa nwere ike iteta n’ụra, mmekọahụ agụwa ya ma ọ bụ ya achọpụta na ọbara ọcha gbapụrụ ya n’ahụ́ mgbe ọ na-arahụ ụra. Otú ahụkwa ka agụụ mmekọahụ nwere ike ịnọkata gụwa nwa agbọghọ mgbe nsọ ya chọrọ ịmalite ma ọ bụ mgbe nsọ ya kwụsịchara. Ma, onye na-egbo onwe ya agụụ mmekọahụ na-eji aka ya eme ka mmekọahụ gụsiwe ya ike.

^ par. 15 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 33 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2.

^ par. 18 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ peeji nke 239 ruo 241 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Gbaara ọchịchọ a na-enwe n’oge ntorobịa ọsọ, kama chụsoo ezi omume, okwukwe, ịhụnanya, udo, gị na ndị ji obi dị ọcha na-akpọku Onyenwe anyị.”—2 Timoti 2:22.

NDỤMỌDỤ

Kpee ekpere tupu mmekọahụ na-agụ gị agụsiwe gị ike. Rịọ Jehova ka o nye gị “ike karịrị ike nkịtị” ị ga-eji merie ọnwụnwa.—2 Ndị Kọrịnt 4:7.

Ị̀ MA NA . . . ?

Onye ọ bụla na-adịghị ike nwere ike iji aka ya gboo onwe ya agụụ mmekọahụ na-agụ ya. Ma onye bụ́ dimkpa na-ejide onwe ya ọ bụrụgodị na ọ nọ naanị ya.

IHE M GA-EME!

Ihe m ga na-eme ka m nwee ike ịna-eche banyere ihe dị ọcha bụ ․․․․․

Kama igbo onwe m agụụ mmekọahụ, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere o ji dị mkpa ka i cheta na Jehova ‘dị njikere ịgbaghara mmehie’?—Abụ Ọma 86:5.

● Ebe Chineke, bụ́ onye kere mmadụ ka ọ na-enwe mmekọahụ, kwuru na i kwesịrị ịna-ejide onwe gị, gịnị ka obi siri Chineke ike na ị ga-eme?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 182]

“Kemgbe m meriri nsogbu ahụ, ejizi m akọnuche dị ọcha efe Jehova. O nweghị ihe m ga-eji tụnyere ya!”—Sera

[Foto dị na peeji nke 180]

Ị daa ada mgbe ị na-agba ọsọ, ọ pụtaghị na ị ga-ebido n’isi—ọ bụrụ na ị na-agbalị ka ị kwụsị igbo onwe gị agụụ mmekọahụ, ime ya ọzọ apụtaghị na ị kụọla afọ n’ala ná mbọ ị na-agba