Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ?

Gịnị Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ?

 ISI NKE 26

Gịnị Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ?

“Ndị na-eto eto na-eme enyi nwoke ma ọ bụ enyi nwaanyị naanị ka ha mara ma onye ahụ ọ̀ ga-ekwe ka ha nwee mmekọahụ, nakwa ka ha chọpụta mmadụ ole ha na ha nwere ike inwe mmekọahụ.”—Penny.

“Ụmụ okorobịa anaghị ezo ọnụ ekwu ya. Ha na-etu ọnụ na ha nwere enyi nwaanyị, ha na ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ ana-enwekwa mmekọahụ.”—Edward.

TAA, ọtụtụ ndị na-eto eto na-etu ọnụ na ha na mmadụ nwere mmekọahụ n’agbanyeghị na o nweghị ihe jikọrọ ha na onye ahụ. Ụfọdụ nwere ndị ha na-agakwuru ka ha na ha nwee mmekọahụ n’enyeghị onwe ha “nsogbu” maka ihe gbasara ịhụnanya nwoke na nwaanyị.

Ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ ime otú ahụ! (Jeremaya 17:9) Edward ahụ e dere ihe o kwuru ná  mmalite sịrị: “Ọtụtụ ụmụ agbọghọ agwala m ka mụ na ha nwee mmekọahụ. Imeri ọnwụnwa ahụ bụ ihe kacha siere m ike kemgbe m bụ Onye Kraịst. Ọ na-esiri m ike ịsị mba!” Mmadụ gwa gị ka gị na ya nwee mmekọahụ, olee ihe Baịbụl kwuru i kwesịrị icheta?

Mata Ihe Mere Ịkwa Iko Ji Dị Njọ

Ịkwa iko bụ mmehie dị oké njọ nke na ndị na-eme ya “agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) Ọ bụ mmehie, ma mmadụ abụọ ahụ hà sịrị na ha hụrụ ibe ha n’anya ma ọ bụ na o nweghị ihe jikọrọ ha. Ihe ga-enyere gị aka imeri ụdị ọnwụnwa ahụ bụ ile ịkwa iko anya otú Jehova si ele ya.

“Obi siri m ike na ọ bụ ibi ndụ otú Jehova chọrọ kacha mma.”—Karen, bi na Kanada.

“Cheta na i nwere papa na mama, nwee ndị enyi, nakwa ndị gị na ha nọ n’otu ọgbakọ. Ị ga-emechu ha niile ihu ma ị kwaa iko!”—Pita, bi na Briten.

Ọ bụrụ na ị na-ele ịkwa iko anya otú Jehova si ele ya, ị ga-enwe ike ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị,’ ọ bụrụgodị na ọ na-agụ gị agụụ.—Abụ Ọma 97:10.

Ebe i nwere ike ịgụ: Jenesis 39:7-9. Ghọta na Josef ji obi ike merie ọnwụnwa a nwara ya ka ọ kwaa iko. Ghọtakwa ihe nyeere ya aka imeri ya.

Jiri Ihe I Kweere Na-eme Ọnụ

Ndị na-eto eto na-ejikarị ihe ha kweere eme ọnụ. Ọ bụụrụ gị ihe ùgwù ịna-akpa àgwà gosiri na iwu Chineke dị mma. Ka otú i si ele ịkwa iko anya ghara ịna-eme gị ihere.

 “Mee ka o doo anya ozugbo na ị naghị eme omume rụrụ arụ.”—Allen, bi na Jamanị.

“Ụmụ okorobịa mụ na ha gakọrọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ma onye m bụ, ha makwa na ịgbalị inweta m bụ igbu oge.”—Vicky, bi n’Amerịka.

Ịnọsi ike n’ihe i kweere na-egosi na ị ghọwala Onye Kraịst tozuru okè.—1 Ndị Kọrịnt 14:20.

Ebe i nwere ike ịgụ: Ilu 27:11. Ghọta na omume ọma gị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa!

Kpebisie Ike na Ị Gaghị Akwa Iko!

Ọ dị mkpa ka ị sị mba. Ma ụfọdụ nwere ike iche na ihe mere i ji jụ bụ ka a sị na ị chọghị.

“Ihe niile ị na-eme, ma ejiji gị ma okwu gị ma ụdị ndị gị na ha na-akparịta ụka ma otú i si emeso ndị mmadụ, kwesịrị igosi na ị chọghị ịkwa iko.”—Joy, bi na Naịjirịa.

“I kwesịrị ime ka o doo anya na o nweghị ihe ga-eme ka i kwe. Anatala ụmụ okorobịa na-achụ gị ihe ọ bụla. Ha nwere ike iji ya nweta gị, ka à ga-asị na i ji ha ụgwọ.”—Lara, bi na Briten.

Jehova ga-enyere gị aka ma i kpebisie ike na ị gaghị akwa iko. Ihe Jehova meere Devid mere ka Devid kwuo banyere ya, sị: “Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe.”—Abụ Ọma 18:25.

 Ebe i nwere ike ịgụ: 2 Ihe E Mere 16:9. Ghọta na Jehova chọsiri ike inyere ndị chọrọ ime ihe ziri ezi aka.

Mara Ihe

Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Olee otú ị ga-esi mee ya? Ọ bụ igosi na ị ma ihe!

“Zere ndị na-ekwukarị banyere ụdị ihe ahụ.”—Neomi, bi na Japan.

“Ọ bụghị onye ọ bụla ị hụrụ ka i kwesịrị inye adres gị ma ọ bụ nọmba ekwe ntị gị.”—Diana, bi na Briten.

Chee echiche banyere okwu gị, omume gị, na ndị gị na ha na-akpa, na ebe ndị ị na-agakarị. Jụzie onwe gị,  sị, ‘Ò nwere otú ọ bụla m si eme ka ndị ọzọ chewe na m chọrọ ka mụ na ha nwee mmekọahụ?’

Ebe i nwere ike ịgụ: Jenesis 34:1, 2. Ị ga-ahụ otú otu nwa agbọghọ aha ya bụ Daịna si baa ná nsogbu n’ihi na ọ gara ebe ọ na-ekwesịghị ịga.

Cheta na ịkwa iko abụghị ihe egwuregwu n’anya Jehova Chineke; i kwesịghị iwere ya ka ihe egwuregwu. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ziri ezi, ị ga-eji akọnuche dị ọcha na-ejere Chineke ozi, ị gaghịkwa ere ùgwù gị. Dị ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Carly si kwuo, “gịnị mere ị ga-eji kwe ka onye ọzọ jiri gị gboo onwe ya agụụ mmekọahụ na-agụ ya? Lezie anya ka ị ghara imebi ihe ị tara ahụhụ nweta!”

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Olee ụdị ụmụ agbọghọ ụmụ okorobịa kwuru na-amasị ha n’eziokwu? O nwere ike iju gị anya ma ị chọpụta!

AMAOKWU BAỊBỤL

‘Gbalịsienụ ike ka Chineke wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ na ndị nọ n’udo.’—2 Pita 3:14.

NDỤMỌDỤ

Mee ka àgwà gị ka mma. (1 Pita 3:3, 4) Ọ bụrụ na ị na-akpa àgwà ọma, ndị ị ga-emeta enyi ga-abụ ndị na-akpakwa àgwà ọma.

Ị̀ MA NA . . . ?

Jehova chọrọ ka i nwee mmekọahụ otú kwesịrị ekwesị, ya bụ, mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Ọ ga-eme gị obi ụtọ mgbe ahụ. Obi agaghị ekoro gị n’elu, ị gaghịkwa akwa mmakwaara, bụ́ nsogbu ịkwa iko na-akpatakarị.

IHE M GA-EME!

Otú m nwere ike isi gbaara ịkwa iko ọsọ otú ahụ Josef mere bụ ․․․․․

Ihe m ga-eme iji zere nzuzu Daịna zuzuru bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịna-agụsi gị ike ka i nwee mmekọahụ tupu ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, gịnị mere na i kwesịghị ime ya?

● Gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ gwa gị ka i nwee mmekọahụ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 185]

“Emela anya ụra! Mgbe otu nwa okorobịa konyere m aka n’olu, agwara m ya, sị, ‘Wepụ aka gị n’olu m!’ M gbarụrụ ihu, si ebe ahụ pụọ.”—Ellen

[Foto dị na peeji nke 187]

Ị kwaa iko, i reela ùgwù gị