Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ànyị Ejikerela n’Eziokwu Ịlụ?

Ànyị Ejikerela n’Eziokwu Ịlụ?

 ISI NKE 30

Ànyị Ejikerela n’Eziokwu Ịlụ?

Ka e were ya na ị hụla onye ị chọrọ ịlụ, gị na ya akpakatala gị achọpụta na ị hụrụ ya n’anya. Obi ọ̀ dị gị ụtọ na unu ga-agba akwụkwọ n’oge na-adịghị anya? Ka ị na-eche banyere ihe ị ga-eme n’okwu a dị ezigbo mkpa, ị malitere iche, sị, . . .

Ànyị Ejikerela n’Eziokwu Ịlụ?

Ọ BỤRỤGODỊ na ị hụrụ onye ị chọrọ ịlụ n’anya, o nweghị ihe o mere ma ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ. Ebe ọ bụ na ọtụtụ di na nwunye anaghị enwe obi ụtọ,  ọtụtụ na-agbakwa alụkwaghịm, o doro anya na i kwesịrị ịkpachara anya ugbu a ị chọrọ ikpebi ihe a ga-agbanwe ọtụtụ ihe ná ndụ gị. Olee otú ị ga-esi mara ma ì jikerela? Ọ bụrụ na ị na-amụ anya arọ nrọ banyere ịlụ di ma ọ bụ nwunye, ugbu a ka i kwesịrị ịkwụsị ya ma chewe ihe ndị bụ́ eziokwu. Dị ka ihe atụ:

NRỌ NKE 1 “Anyị hụhaala ibe anyị n’anya, nsogbu agwụla.”

Nke bụ́ eziokwu: Ịhụnanya agaghị akwụrụ unu ụgwọ ụlọ na ụgwọ ihe ndị ọzọ, ọ gaghịkwa ewepụrụ unu ihe isi ike. N’eziokwu, a chọpụtala na ọ bụ ego kacha akpatara di na nwunye esemokwu, na-emekwa ka ha gbaa alụkwaghịm. Ile ego anya otú na-ekwesịghị ekwesị nwere ike ime ka obi ghara iru gị ala, mee ka gị na Chineke ghara ịdị ná mma, meekwa ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ghara ịdị ná mma. (1 Timoti 6:9, 10) Gịnị ka ihe a kwesịrị ịkụziri gị? Echela ka unu lụọ tupu unu akpaa otú unu ga-esi na-emefu ego!

Baịbụl kwuru, sị: “Ọ̀ dị onye n’ime unu nke chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu?”—Luk 14:28.

Aro: Ugbu a unu na-alụbeghị, gị na onye ị chọrọ ịlụ kpaa otú unu ga-esi emefu ego. (Ilu 13:10) Ajụjụ ụfọdụ unu nwere ike ichebara echiche bụ: Olee otú anyị ga-esi na-emefu ego anyị ga na-akpata? Ànyị ga na-edebe ego anyị iche iche n’ụlọ akụ̀, ka ànyị ga na-edebekọ ya ọnụ? Olee onye idekọ ego ka doo anya nke ga na-edekọ ego anyị mefuru ma na-akwụ ụgwọ anyị ji? * Ego ole ka onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike imefu n’ebughị ụzọ gwa onye nke ọzọ? Unu kwesịrị imekọwa ihe ọnụ ugbu a!Ekliziastis 4:9, 10.

NRỌ NKE 2 “Anyị lụọ, anyị agaghị enwe nsogbu ọ bụla n’ihi na obi anyị bụ otu n’ihe niile!”

Nke bụ́ eziokwu: Ọ bụrụ na obi unu na-abụ otu n’ihe niile, o nwere ike ịbụ na unu na-akpachapụ anya ezere ihe ọ bụla  nwere ike isere unu okwu. Ma unu ga-ekwurịrị banyere ihe ndị ahụ ma unu mechaa lụọ! Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị mmadụ abụọ na-ezughị okè obi ha ga-abụ otu mgbe niile. N’ihi ya, ha ga na-enwe nghọtahie mgbe ụfọdụ. (Ndị Rom 3:23; Jems 3:2) Ihe unu kwesịrị ichebara echiche abụghị naanị otú obi unu si bụrụ otu, kamakwa ihe na-eme mgbe obi unu na-abụghị otu. Di na nwunye ga-adị n’ezigbo mma ma ọ bụrụ na ha ekweta na ha nwere nghọtahie ma jiri amamihe na obiọma dozie ya.

Baịbụl kwuru, sị: “Ebula iwe n’obi lakpuo ụra.”—Ndị Efesọs 4:26, Contemporary English Version.

Aro: Cheta ihe i mere iji dozie nghọtahie gị na papa gị na mama gị nakwa ụmụnne gị nwere n’oge gara aga. Were mpempe akwụkwọ dee ụdị ihe ahụ e dere na peeji nke 93 n’akwụkwọ a ma ọ bụkwanụ nke dị na peeji nke 221 na nwanne ya bụ́ Nke 2. Cheta ihe ndị seere unu okwu, ihe i mere, na ihe ka mma ị gaara eme. Di ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe batara gị n’obi mgbe unu sere okwu bụ iji iwe baa n’ụlọ ma kwachie ụzọ, dee ihe ka mma ị gaara eme nke ga-enye aka dozie nsogbu ahụ kama ime ka ọ ka njọ. Ọ bụrụ na ị mụta ugbu a ihe i kwesịrị ime ma unu see okwu, ọ ga-abara gị uru ma ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, meekwa ka obi na-adị unu ụtọ.

NRỌ NKE 3 “M lụhaala di ma ọ bụ nwunye, m ga na-enwe mmekọahụ mgbe ọ bụla m chọrọ.”

Nke bụ́ eziokwu: Ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, ọ pụtaghị na ị ga na-enwe mmekọahụ mgbe ọ bụla ị chọrọ. Cheta na onye  ị na-alụ bụ mmadụ, i kwesịkwara ịna-eche banyere ya. N’eziokwu, o nwere mgbe ọ na-agaghị achọ inwe mmekọahụ. I kwesịghị isi ọnwụ na unu ga na-enwerịrị mmekọahụ otú ị chọrọ n’ihi na unu alụọla. (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Nke bụ́ eziokwu bụ na i kwesịrị ịna-ejide onwe gị ma ị̀ lụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ị lụbeghị.—Ndị Galeshia 5:22, 23.

Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu mara otú ọ ga-esi jide arịa nke ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ, ọ bụghị iji anyaukwu na-enwe agụụ mmekọahụ.”—1 Ndị Tesalonaịka 4:4, 5.

Aro: Chee echiche banyere otú mmekọahụ si agụ gị na otú i si ele mmekọahụ anya, cheekwa nsogbu o nwere ike ịkpatara gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị. Dị ka ihe atụ, ị̀ na-eji aka gị egbo onwe gị agụụ mmekọahụ, nke bụ́ àgwà na-eme ka mmadụ na-eche banyere naanị onwe ya? Ị̀ na-ele ndị gba ọtọ? Ị̀ na-eji anya achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị? Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na ọ na-esiri m ike ijide onwe m ugbu a m na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, olee otú m ga-esi mụta ya mgbe m lụrụ?’ (Matiu 5:27, 28) Ihe ọzọ bụ: Ị̀ na-achụkarị nwoke ma ọ bụ nwaanyị, nke mere ka a mara gị ka onye na-eji obi ụmụ nwoke ma ọ bụ obi ụmụ nwaanyị egwuri egwu? Ọ bụrụ otú ahụ, oleekwanụ otú ị ga-esi kwụsị ụdị àgwà ahụ ma ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, ebe ọ bụ naanị onye ahụ ka i kwesịrị ilekwasị anya?—Ilu 5:15-17.

NRỌ NKE 4 “Ọ bụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-eme ka m nwee obi ụtọ.”

Nke bụ́ eziokwu: Onye na-anaghị enwe obi ụtọ mgbe ọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ọ gaghịkwa enwe obi ụtọ ma ọ lụọ. Maka gịnị? Ihe na-emekarị ka mmadụ nwee obi ụtọ abụghị ọnọdụ mmadụ, kama ọ bụ otú mmadụ si ele ihe anya. (Ilu 15:15) Ndị na-akwa ụwa  na-echekarị banyere ihe enyi ha na-anaghị emere ha kama iche banyere ihe ọ na-emere ha. Ọ bụ ugbu a ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ka i kwesịrị ịmụta otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ. Ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, ọ ga-eme ka a hụ àgwà ọma gị, gị enyekwara onye ị lụrụ aka ịna-akpa àgwà ọma.

Baịbụl kwuru, sị: “Ọ ka mma inwe afọ ojuju n’ihe mmadụ nwere karịa ịnọgide na-achọ ihe ndị ọzọ.”—Ekliziastis 6:9, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Aro: Mgbe ụfọdụ, ihe na-eme ka mmadụ na-ele ihe anya otú na-ekwesịghị ekwesị bụ ịtụ anya ihe na-agaghị ekwe omume. Were akwụkwọ dee uru abụọ ma ọ bụ atọ ị na-atụ anya irite ma ị lụọ di ma ọ bụ nwunye. Gụọ ihe i dere, jụzie onwe gị, sị: ‘Ihe ndị m na-atụ anya ha hà bụ nrọ ka hà bụ ihe ga-eme eme? Ọ̀ bụ ihe m lere na fim ma ọ bụ ihe m gụtara n’akwụkwọ  banyere ịhụnanya nwoke na nwaanyị mere m ji atụ anya ihe ndị ahụ? Ihe mere m ji atụ anya ihe ndị ahụ ọ̀ bụ ihe m ga-enweta ma m lụọ di ma ọ bụ nwunye, ikekwe ka m nwee onye mụ na ya ga na-anọ, ka m na-enwe mmekọahụ, nakwa ka ndị ọgbọ m na-akwanyekwuru m ùgwù?’ Ọ bụrụ otú ahụ, i kwesịrị ịkwụsị iche banyere naanị onwe gị, chewekwuo banyere onye ị ga-alụ. Ihe ga-enyere gị aka ime otú ahụ bụ ide uru abụọ ma ọ bụ atọ ị na-atụ anya na gị na onye ị ga-alụ ga-erite.

Nrọ ndị a nwere ike ime ka ị ghara inwe obi ụtọ ma ị lụọ di ma ọ bụ nwunye. N’ihi ya, kwụsị iche ụdị ihe ndị ahụ, ma chewe ihe ndị ga-ekwe omume. Ihe e dere na peeji nke 216 na nke 217 nwere ike inyere gị na onye ị ga-alụ aka ugbu a unu na-atụ anya ịbụ di na nwunye nwere obi ụtọ, nke so ná ngọzi kachanụ mmadụ nwere ike inweta!—Diuterọnọmi 24:5; Ilu 5:18.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Gị na onye ị chọrọ ịlụ gbasaa, o nwere ike ime ka ike ụwa gwụ gị. Olee otú ị ga-esi die ya?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ilu 31:10-28 kwuru na “ezigbo nwunye” na-arụ ọtụtụ ọrụ dị mkpa gbasara ego ezinụlọ ya na-akpata. Gụọ amaokwu nke 13, 14, 16, 18, na nke 24.

AMAOKWU BAỊBỤL

‘Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.’—Jenesis 2:24.

NDỤMỌDỤ

Jụọ di na nwunye katarala ahụ́ ndụmọdụ ha ga-enye ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ nke ga-enyere ha aka ịna-ebi n’udo.—Ilu 27:17.

Ị̀ MA NA . . . ?

Di na nwunye chọọ ịna-ebi n’udo, ha kwesịrị ịna-eme ka enyi na enyi, na-akparịta ụka nke ọma, mara otú ha ga-esi na-edozi esemokwu ha, ghọtakwa na ọ bụ naanị ọnwụ kwesịrị ikewa ha.

IHE M GA-EME!

Àgwà m chọrọ ịna-emekwu nke ọma na ya ugbu a, nke ga-eme ka mụ na onye m ga-alụ na-adịkwu ná mma, bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● N’obodo ụfọdụ, ọtụtụ di na nwunye na-agba alụkwaghịm. Gịnị ka i chere na-akpata ya?

● Ị lụọ di ma ọ bụ nwunye naanị ka ị gbaara nsogbu dị n’ụlọ unu ọsọ, olee nsogbu ndị i nwere ike inwe?

● Gịnị mere o ji dị mkpa ka gị na onye ị ga-alụ na-eme ihe Baịbụl kwuru ma unu lụọ?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 220]

“Ịlụ di ma ọ bụ nwunye abụghị obere ihe. I kwesịrị ịma ihe ị chọrọ ịbanye na ya, matakwa onye ọ ga-abụ gị na ya.”—Audra

 [Igbe/Foto dị na peeji nke 216, 217]

Ebe M Dere Ihe

Ì Jikerela Ịlụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye?

Chebara ajụjụ ndị a jụrụ na peeji a na nke na-eso ya echiche. Gị na onye ị chọrọ ịlụ nwedịrị ike iji ya kparịta ụka. Gụọkwanụ amaokwu Baịbụl ndị e dere ebe a.

Okwu Ego

□ Olee otú i si ele ego anya?—Ndị Hibru 13:5, 6.

□ Olee otú i si egosi ugbu a na i nwere ike iji aka gị na-akpata ego ị ga-eji na-egbo mkpa gị?—Matiu 6:19-21.

□ È nwere ụgwọ i ji ugbu a? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị na-eme ugbu a iji kwụọ ya?—Ilu 22:7.

□ Ego ole ka unu ga-eji gbaa akwụkwọ? Ego ole ka i chere i kwesịrị ịgbazite?—Luk 14:28.

□ Unu lụọ, gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ùnu ga na-arụ ọrụ ego? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú unu ga-esi hazie oge unu ji aga ọrụ na mgbe unu ji alọta nakwa ihe banyere ego ụgbọ?—Ilu 15:22.

□ Olee ebe gị na onye ị ga-alụ ga-ebi? Ego ole ka ụgwọ ụlọ, nri, uwe na ihe ndị ọzọ ga-efu unu? Olee otú unu ga-esi nweta ego ahụ?—Ilu 24:27.

 Ihe Banyere Ezinụlọ

□ Gị na papa gị na mama gị na ụmụnne gị ùnu na-adị ná mma?—Ọpụpụ 20:12; Ndị Rom 12:18.

□ Olee otú ị na-esi edozi esemokwu gị na onye ezinụlọ unu nwere?—Ndị Kọlọsi 3:13.

□ Ọ bụrụ na ị bụ nwa agbọghọ, olee otú i si egosi na i nwere “mmụọ dị jụụ, nke dịkwa nwayọọ”?—1 Pita 3:4.

□ Ùnu chọrọ ịmụ ụmụ? (Abụ Ọma 127:3) Ọ bụrụ na unu achọghị ịmụ, olee otú unu ga-esi egbochi afọ ime?

□ Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorobịa, olee otú ị ga-esi na-enyere ezinụlọ gị aka ka ha na Jehova dịrị ná mma?—Matiu 5:3.

Àgwà Gị

□ Olee otú i sirila gosi na ị na-arụsi ọrụ ike? —Ilu 6:9-11; 31:17, 19, 21, 22, 27.

□ Olee otú i sirila gosi na ị na-enyere ndị ọzọ aka? —Ndị Filipaị 2:4.

□ Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorobịa, olee otú i sirila gosi na ị ga na-elekọta ezinụlọ gị otú ahụ Kraịst si elekọta ọgbakọ ya?—Ndị Efesọs 5:25, 28, 29.

□ Ọ bụrụ na ị bụ nwa agbọghọ, gịnị na-egosi na ị ga na-erubere di gị isi?—Ndị Efesọs 5:22-24.

[Foto dị na peeji nke 219]

Ịlụ di na nwunye yiri ịbanye na mmiri. Abanyela n’ebughị ụzọ mata ihe dị na ya