Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Emeta Ezigbo Ndị Enyi?

Olee Otú M Ga-esi Emeta Ezigbo Ndị Enyi?

 ISI NKE 8

Olee Otú M Ga-esi Emeta Ezigbo Ndị Enyi?

“Mgbe iwe na-ewe m, m na-achọ onye m ga-akọrọ otú obi dị m. Mgbe obi na-adịghị mụ mma, m na-achọ onye ga-akasi m obi. Mgbe obi dị m ụtọ, m na-achọ onye ga-eso m ṅụrịa. A sị m kwuo, inwe ndị enyi dị ezigbo mkpa.”—Brittany.

ỤFỌDỤ ndị na-ekwu na ụmụaka chọrọ ndị ha na ha ga na-egwuri egwu, ma ndị na-eto eto chọrọ ndị enyi. Gịnị dị iche n’enyi na onye ya na mmadụ na-egwuri egwu?

Onye gị na ya na-egwuri egwu bụ onye gị na ya na-anọ.

Enyi gị bụ onye ihe na-amasị gị na-amasị ya.

 Baịbụl kwukwara na “ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) Enyi e kwuru okwu ya n’ebe a nwere ike ọ bụghị ụdị enyi nwatakịrị na-emeta n’ebe ha na-egwuri egwu!

Eziokwu: Ka ị na-etokwu, i kwesịrị inwe ndị enyi

1. Nwere àgwà ọma

2. Na-ebi ndụ otú Chineke chọrọ

3. Ndị ị ga-amụta àgwà ọma n’aka ha

Ajụjụ: Olee otú ị ga-esi nweta ụdị ndị enyi ahụ? Ka anyị tụlee ha otu otu.

Ihe Mbụ E Ji Ama Ezigbo Enyi​—Àgwà Ọma

Ihe i kwesịrị ịma. Ọ bụghị onye ọ bụla kwuru na ya bụ enyi gị ga-abụ ezigbo enyi. Baịbụl kwudịrị na “e nwere ndị enyi na-achọkarị ịkụrisị ibe ha.” (Ilu 18:24) I nwere ike iche na o siri ike ịhụ enyi ga-eme ụdị ihe a. Ma chegodị echiche: Ò nwetụla onye sịrị na ya bụ enyi gị ma ya aghọọ gị aghụghọ? Ò nwetụla nke kwuru gị okwu azụ ma ọ bụ jiri gị gbaa asịrị? Ụdị ihe ahụ nwere ike ime ka ị ghara ịtụkwasị onye ọ bụla sịrị na ya bụ enyi gị obi. * Ma cheta na ihe ka mkpa abụghị inwe ọtụtụ ndị enyi, kama ọ bụ inwe ezigbo ndị enyi!

Ihe i nwere ike ime. Ka ndị ị na-emeta enyi bụrụ ndị ị ga-amụta àgwà ọma n’aka ha.

“Onye ọ bụla na-ekwu na enyi m bụ́ Fiona bụ ezigbo mmadụ. Achọkwara m ka ndị mmadụ na-ekwu na m bụ ezigbo mmadụ. Achọrọ m ịdị ka  ya. Àgwà ọma ya na-atọ m ụtọ.”—Yvette, dị afọ iri na asaa.

Megodị ihe a.

1. Gụọ Ndị Galeshia 5:22, 23.

2. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ndị enyi m hà na-akpa àgwà ndị so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”?’

3. Dee aha ndị kacha bụrụ ezigbo enyi gị n’okpuru ebe a. I dee aha onye nke ọ bụla, gị edee àgwà e ji mara ya.

Aha

․․․․․

Àgwà

․․․․․

Ihe Nwere Ike Inyere Gị Aka: Ọ bụrụ naanị àgwà ọjọọ onye ahụ ka ị na-echeta, mara na o nwere ike ịbụ na i kwesịrị imeta ndị enyi ka mma!

Ihe nke Abụọ E Ji Ama Ezigbo Enyi​—Ibi Ndụ Otú Chineke Chọrọ

Ihe i kwesịrị ịma. Ọ bụrụ na ọ dị gị ọkụ n’ahụ́ inweta ndị enyi, o nwere ike ime ka nke ọ bụla ị hụrụ dị gị mma, a sịgodị na ọ bụghị ezigbo mmadụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” (Ilu 13:20) “Ndị nzuzu” e kwuru okwu ha ebe a abụghị ndị na-ada n’ule ma ọ bụ  ndị na-amaghị ihe, kama ọ bụ ndị na-anaghị achọ iji ntị anụ ndụmọdụ bara uru. Ha na-akpakwa àgwà ọjọọ. Ọ bụ ụdị ndị enyi ahụ ka ị na-ekwesịghị inwe!

Ihe i nwere ike ime. Kama imeta onye ọ bụla ị hụrụ enyi, na-ahọ ndị ga-abụ enyi gị ahọ. (Abụ Ọma 26:4) Ọ pụtaghị na ị ga-akpọ ndị mmadụ asị. Ịhọ ndị ga-abụ ndị enyi gị ahọ pụtara na anya ruru gị ala ịmata “ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume, n’etiti onye na-ejere Chineke ozi na onye na-adịghị ejere ya ozi.”—Malakaị 3:18.

“Obi dị m ụtọ na ndị mụrụ m nyeere m aka inweta ndị enyi na-ebi ndụ otú Chineke chọrọ, ndị mụ na ha bụ ọgbọ.”—Christopher, dị afọ iri na atọ.

Zaa ajụjụ ndị a:

Mụ na ndị enyi m nọrọ, ụjọ ọ̀ na-atụ m na ha nwere ike ime ka m mee ihe m ma na ọ dịghị mma?

□ Ee

□ Mba

Ọ̀ na-esiri m ike igosi ndị mụrụ m ndị bụ́ ndị enyi m n’ihi na ụjọ na-atụ m na ha nwere ike ikwu na ha abụghị ezigbo ndị enyi?

□ Ee

□ Mba

Ihe Nwere Ike Inyere Gị Aka: Ọ bụrụ na ị zara ee n’ajụjụ abụọ ahụ, chọọ ndị na-erubere Chineke isi ị ga-emeta enyi, ya bụ, ndị na-akpa àgwà ọma e ji mara Ndị Kraịst.

 Ihe nke Atọ E Ji Ama Ezigbo Enyi​—Ime Ka Ị Mụta Àgwà Ọma

Ihe i kwesịrị ịma. Baịbụl kwuru, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lauren sịrị: “Naanị mgbe ụmụ akwụkwọ ibe m na-ekwe ka mụ na ha na-akpa bụ ma m mee ihe ha gwara m. N’ihi ya, enweghị m enyi ná mmalite. Ma m mechara kpebie ịkpawa àgwà ka ha, ka mụ na ha bụrụ enyi.” Lauren chọpụtara na ọ bụrụ na mmadụ na-eme ihe ọ bụla ndị ọzọ chọrọ ka  o mee, onye ahụ ga-adị ka okwe ha ji eti epele, nke ha na-ewere tinye n’ebe ọ bụla sọrọ ha. E kwesịghị ime gị otú ahụ!

Ihe i nwere ike ime. Ọ bụrụ na ndị gị na ha na-akpa na-esi ọnwụ na ị ga-agbanwe àgwà gị ma mewe ka ha, gị na ha kwụsị ịkpa. I mee otú ahụ, o nwere ike ndị enyi gị agaghịzi adị ọtụtụ; ma obi ga-adịkwu gị ụtọ. Ọ ga-emekwa ka i nwetakwuo ezigbo ndị enyi, ya bụ, ụdị ndị enyi ga-eme ka ị mụta àgwà ọma.—Ndị Rom 12:2.

“Ezigbo enyi m bụ́ Clint bụ nwa okorobịa isi jụrụ oyi na onye na-aghọta otú obi dị ndị ọzọ. Ọ na-agbakwa m ezigbo ume.”Jason, dị afọ iri abụọ na otu.

Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a:

M̀ na-agbanwe ụdị uwe m na-eyi, otú m si ekwu okwu, ma ọ bụ otú m si akpa àgwà iji mee ka obi dị ndị enyi m mma?

□ Ee

□ Mba

M̀ na-aga ebe a na-akpa àgwà ọjọọ, bụ́ ebe m na-agaghị achọ ịga ma e wezụga na ndị enyi m na-aga ebe ahụ?

□ Ee

□ Mba

 Ihe Nwere Ike Inyere Gị Aka: Ọ bụrụ na ị zara ee n’ajụjụ abụọ ndị ahụ, gakwuru ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye ọzọ toro eto ka ha gwa gị ihe ị ga-eme. Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, i nwere ike ịgakwuru okenye ọgbakọ ma gwa ya ka o nyere gị aka imeta ndị enyi ga-eme ka ị mụta àgwà ọma.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 9 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Onye sịrị na ya bụ enyi gị ọ̀ na-enye gị nsogbu ka i mee ihe ọjọọ? Obi gị ọ̀ chọrọ ịrafu gị ka i mee ihe ọjọọ? Chọpụta otú ị ga-esi merie ọnwụnwa ahụ!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 N’eziokwu, ọ dịghị onye na-adịghị emehie. (Ndị Rom 3:23) N’ihi ya, ọ bụrụ na enyi gị emee ihe wutere gị ma mechaa rịọ gị mgbaghara, cheta na “ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”—1 Pita 4:8.

AMAOKWU BAỊBỤL

“E nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.”—Ilu 18:24.

NDỤMỌDỤ

Na-ebi ndụ otú Chineke chọrọ. O nwere ike ime ka ndị na-agbalị ibi ndụ otú ahụ chọọ ka gị na ha bụrụ enyi. Ha ga-abụ ụdị ndị enyi kacha mma i nwere!

Ị̀ MA NA . . . ?

Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, ma ọ na-ahọ ndị ‘ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu ya’ ahọ.—Abụ Ọma 15:1-5.

IHE M GA-EME!

Ihe m ga-eme ka m nweta ezigbo ndị enyi bụ ․․․․․

Ụfọdụ ndị tọrọ m m chọrọ ịmata nke ọma bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee àgwà ndị kacha amasị gị ị chọrọ ka enyi gị nwee, n’ihi gịnịkwa?

● Olee àgwà ndị i kwesịrị inwe iji bụrụ ezigbo enyi?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 60]

“Mgbe ndị mụrụ m gwara m ka mụ na ụfọdụ ndị enyi m kwụsị ịna-akpa, obi m gwara m na ọ bụ naanị ha ka m chọrọ ka mụ na ha na-akpa. Ma ihe ahụ ndị mụrụ m gwara m bụ ezigbo ndụmọdụ. Mgbe anya mepere m, achọpụtara m na ezigbo ndị enyi juru eju.”—Cole

[Igbe dị na peeji nke 61]

Megodị Ihe Ndị A

Jụọ ndị mụrụ gị ihe ụfọdụ banyere imeta ndị enyi. Jụọ ha ụdị ndị enyi ha nwere mgbe ha hà ka gị. Hà na-akwa mmakwaara ma ha cheta ụdị ndị ha metara enyi n’oge ahụ? Ọ bụrụ na ha na-akwa mmakwaara, ọ̀ bụ maka gịnị? Jụọ ha otú ị ga-esi zere ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ha nwere.

Mee ka ndị mụrụ gị mata ndị enyi gị. Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ime otú ahụ, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị mere o ji esiri m ike?’ È nwere ihe ndị enyi gị na-eme ị maara na ndị mụrụ gị ga-asị na ọ dịghị mma? Ọ bụrụ na e nwere, mara na i kwesịrị ilezikwu anya n’ụdị ndị ị na-emeta enyi.

Na-ege ntị nke ọma. Gosi na ihe banyere ndị enyi gị na-emetụ gị n’obi nakwa na ị chọrọ ka ihe dịrị ha mma.—Ndị Filipaị 2:4.

Na-agbaghara. Atụla anya na ha ga na-emetacha ihe niile. “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.”—Jems 3:2.

Hapụtụ ndị enyi gị aka. Echela na gị na ha ga na-anọ mgbe niile. Ezigbo ndị enyi gị ga-anọ ya mgbe ọ bụla ị chọrọ ha.—Ekliziastis 4:9, 10.

[Foto dị na peeji nke 63]

Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọ bụla ndị ọzọ chọrọ ka i mee, ka gị na ha dịrị ná mma, ị ga-adị ka okwe ha ji eti epele, nke ha na-ewere tinye n’ebe ọ bụla sọrọ ha