Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịna-elebara Onwe M Anya?

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịna-elebara Onwe M Anya?

 ISI NKE 10

Gịnị Mere M Ji Kwesị Ịna-elebara Onwe M Anya?

Kanye ✔ na nke ọ bụla ị chọrọ ime.

□ Ịkwụsịlata ichegbu onwe m

□ Ịkwụsị iwe oké iwe

□ Obi isikwu m ike

□ Ịdịkwu garagara

□ Inwekwu ume

□ Ime ka akpụkpọ ahụ́ m dịkwuo mma n’anya

□ Ifelatatụ

E NWERE ihe ụfọdụ gịnwa bụ́ onye na-eto eto na-enweghị ike iji aka gị họrọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ga-abụ ndị mụrụ gị, ụmụnne gị, na ebe ị ga-ebi. Ma, e nwere ihe ndị i nwere ike ime ka ahụ́ dịkwuo gị mma. N’agbanyeghị na otú ahụ́ gị dị nwere ike isi gị  n’ọbara, ọ bụ otú i kpebiri isi na-ebi ndụ gị ga-akacha mee ka ahụ́ dị gị mma ma ọ bụ ghara ịdị gị mma. *

I nwere ike ikwu, sị: ‘Ma etorubeghị m ichewe otú ahụ́ ga-esi dị mụ mma!’ Ì chere na ọ bụ eziokwu? Legodị anya na peeji nke 71 n’ebe ahụ e dere ihe ndị ị chọrọ ime. Ole n’ime ha ka ị kanyere ihe? Nke bụ́ eziokwu bụ na ahụ́ kwesịrị ịdị gị mma tupu i nwee ike ime nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ.

N’eziokwu, i nwere ike ịna-eche ụdị ihe otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asaa aha ya bụ Amber na-eche. Ọ sịrị: “O nweghị otú m ga-esi na-eri naanị nri e ji ọka wit mee, nri na-adịghị emecha ka mmadụ buo ibu ma ọ bụkwanụ nri shuga na-adịghị!” Ọ bụrụ ụdị ihe a ka ị na-eche, wetuo obi. Ọ pụtaghị na ị ga-akwụsị iri ihe ọ bụla na-atọ ụtọ ma ọ bụ na-agbagbu onwe gị n’ọsọ kwa izu. Nke bụ́ eziokwu bụ na naanị ihe ole na ole ka ọ ga-abụ i mewe, gị adịkwuo mma n’anya, dịkwuo garagara, na-arụkwa ọrụ gị nke ọma. Ka anyị hụ otú ụfọdụ ndị ọgbọ gị si mee ya.

Na-eri Ihe I Kwesịrị Iri Ka Ị Dịkwuo Mma n’Anya!

Baịbụl kwuru ka anyị ghara imebiga ihe ókè. Ilu 23:20 sịrị: “Eribigala . . . nri ókè.” (Contemporary English Version) Ọ bụghị mgbe niile ka ime ihe ahụ Baịbụl kwuru na-adị mfe.

“Agụụ na-agụkarị m otú ọ na-agụkarị ọtụtụ ndị na-eto eto. Ndị mụrụ m na-ekwu na afọ m bụ olulu na-anaghị eju eju!”—Andru, dị afọ iri na ise.

“Ebe ọ bụ na o nwebeghị ihe ọjọọ m chọpụtara nri ụfọdụ m na-eri na-eme m ugbu a, ọ na-esiri m ike ikweta na ha adịghị mụ mma n’ahụ́.”—Danielle, dị afọ iri na itoolu.

Ì kwesịrị ịna-ejide onwe gị ka ị ghara ịna-eri oké nri? Lee ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru na-enyere ha aka.

 Mara mgbe afọ juru gị. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Julia sịrị: “Mgbe mbụ, m na-erife nri ókè ma ọ bụrụhaala ụdị nri na-anaghị eme ka mmadụ buo ibu. Ma ugbu a, ọ bụ mgbe afọ juru m ka m na-akwụsị iri nri.”

Erila nri na-anaghị edozi ahụ́. Otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na otu aha ya bụ Peter sịrị: “M kwụsịrị ịṅụ mmanya ọtọ bịrịbịrị. Tupu otu ọnwa agachaa, efelatara m!”

Kwụsị irife nri ókè. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Erin sịrị: “Ana m agbalị ka m ghara ịga kurukwuo nri ma m richaa nke mbụ m kuuru.”

 Ihe Ga-enyere Gị Aka: Ebula ọnụ! I buo ọnụ, agụụ ga-agụsi gị ike, mee ka i rifee nri ókè mgbe ọ bụla ị ga-eri nri.

Na-emegakwu Ahụ́, Ị Ga-adịkwu Garagara!

Baịbụl sịrị: ‘Ọzụzụ nke ahụ́ bara uru.’ (1 Timoti 4:8) Ma o yiri ka ọtụtụ ndị na-eto eto anaghị achọ imega ahụ́.

“Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, mmega ahụ́ so n’ule ndị anyị na-ele. Ma ọtụtụ ụmụ akwụkwọ anyị na-ada ya. Amaghị m ihe mere ha ji ada ya, ebe ọ bụ na mmega ahụ́ dị mfe ka iri nri!”—Richard, dị afọ iri abụọ na otu.

“Ihe ụfọdụ ndị na-eche bụ, ‘Gịnị mere m ga-eji na-agbagharị n’èzí mgbe anwụ na-acha, ọsụsọ ana-agba m, ike agwụkwa m, ebe m nwere ike ịnọ n’ime ụlọ na-egwu egwuregwu vidio, nke na-eme ka ọ dị m ka m̀ so ndị ahụ egwu egwuregwu ahụ?’”—Rut, dị afọ iri abụọ na abụọ.

Ọ̀ na-abụ e kwute okwu “imega ahụ́,” ike agwụ gị? Ọ bụrụ otú ahụ, lee uru atọ ị ga-erite ma ị na-emega ahụ́ mgbe niile.

Uru nke mbụ. Imega ahụ́ ga-eme ka ahụ́ gị na-alụsokwu ọrịa ọgụ. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Rechel sịrị: “Papa m na-ekwukarị, sị, ‘Ọ bụrụ na ị chọghị iwepụta oge maka imega ahụ́, jikerekwa iwepụta oge maka ịrịa ọrịa.’”

Uru nke abụọ. Imega ahụ́ ga-eme ka ahụ́ ruo gị ala. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Emily sịrị: “E nwee ọtụtụ  ihe na-echu m ụra, ịgba ọsọ na-eme ka ahụ́ ruo m ala. Ọ na-eme ka ahụ́ dị mụ mma, obi adịkwa m ụtọ.”

Uru nke atọ. Imega ahụ́ nwere ike ime ka ị na-emekwu ihe ndị na-atọ gị ụtọ. Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Rut sịrị: “Mmega ahụ́ ndị a na-eme n’èzí na-atọ m ụtọ. N’ihi ya, mmega ahụ́ ndị m na-eme bụ ịga ije, igwu mmiri, na ịgba ígwè.”

Ihe Ga-enyere Gị Aka: Jiri nkeji iri abụọ ma ọ dịkarịa ala na-emega ahụ́ ugboro atọ kwa izu. I nwere ike ịna-eme nke ọ bụla na-atọ gị ụtọ, nke ga-emekwa ka ọsụsọ gbaa gị nke ọma.

Na-ehi Ụra nke Ọma, Ị Ga Na-arụ Ọrụ Gị nke Ọma!

Baịbụl sịrị: “Obere ezumike dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè na ịchụso ifufe.” (Ekliziastis 4:6) Ọ bụrụ na ị naghị ehi ụra nke ọma, ị gaghị na-arụ ọrụ nke ọma!

“Ọ bụrụ na mụ arahụghị ụra nke ọma, anaghị m ama ihe m na-eme eme. Ọ na-esiri m ike ime ka obi m dịrị n’ihe m na-eme!”—Rechel, dị afọ iri na itoolu.

“Elekere abụọ nke ehihie kụhaala, ike na-agwụ m nke na ọ na-afọ obere ka ụra buru m mgbe mụ na mmadụ na-ekwu okwu!”—Kristine, dị afọ iri na itoolu.

Ì kwesịrị ịna-ehikwu ụra? Lee ihe ndị na-eto eto ibe gị mere.

 Na-alakpu n’oge. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Catherine sịrị: “M na-agbalị ka m na-alakpu n’oge.”

Ekwela ka ndị enyi gị na-akpọ gị n’ime abalị. Otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na otu aha ya bụ Richard sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ndị enyi m na-akpọ m n’ime abalị ma ọ bụ zitere m ozi n’ekwe ntị. Ma ugbu a, amụtala m ịgwa ha ka ọ dị mgbe ọzọ ka m nwee ike ihi ụra.”

Nwee oge i ji alakpu. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ aha ya bụ Jennifer sịrị: “N’oge na-adịbeghị anya, amalitere m ịlakpu ụra kwa ụbọchị mgbe m kpebiri ịna-alakpu ma teta mgbe m kpebiri iteta.”

Ihe Ga-enyere Gị Aka: Gbalịa ka ị na-ehiru ụra awa asatọ n’abalị ọ bụla.

Ọ bụrụ na i mee ihe ole na ole iji lebara onwe gị anya, ị ga-erite ọtụtụ uru. Cheta na ọ bụrụ na ahụ́ siri gị ike, ị ga-adịkwu mma n’anya, dịkwuo garagara, na-arụkwa ọrụ nke ọma. E nwere ihe ụfọdụ ị na-enweghị ike ikpebi otú ha ga-adị. Ma i nwere ike iji aka gị kpebie otú ahụ́ ga-adị gị. Nwa agbọghọ ahụ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Erin sịrị: “Mee elu mee ala, ọ bụ naanị gị ga-ekpebi otú ahụ́ ga-adị gị.”

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ụdị uwe ị chọrọ iyi ọ̀ na-esere gị na papa gị na mama gị okwu? Chọpụta ihe ị ga-eme ka ọ ghara ịna-esere unu okwu!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Anyị ma na e nwere ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa ma ọ bụ ndị nwere nkwarụ, ma o nweghị ihe ha nwere ike ime banyere ya. Isiokwu a nwere ike inyere ndị dị otú ahụ aka ka ahụ́ dịtụ ha mma otú ike kwere ha.

AMAOKWU BAỊBỤL

‘Ọzụzụ nke ahụ́ bara uru.’—1 Timoti 4:8.

NDỤMỌDỤ

Nwee onye gị na ya ga na-eso emega ahụ́. Ọ ga-eme ka ọ ghara ịgwụ gị ike n’ihi na onye ahụ pụta ka unu gawa, ị gaghị achọ ịgwa ya na ị gaghị aga.

Ị̀ MA NA . . . ?

Mmega ahụ́ na-eme ka ahụ́ mmadụ na-emepụta ihe ga-eme ka ahụ́ mgbu ya belata, meekwa ka ahụ́ dịkwuo ya mma.

IHE M GA-EME!

Ezigbo ihe m nwere ike ikpebi ịna-eme banyere otú m si eri nri bụ ․․․․․

Ezigbo ihe m nwere ike ikpebi ịna-eme banyere mmega ahụ́ bụ ․․․․․

M ga-agbalịsi ike ihiru ụra awa  n’abalị ọ bụla n’ọnwa ọzọ. ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee otú ilebara onwe gị anya ga-esi nyere gị aka inwe obi ike?

● Olee ihe dị mkpa karịa ilebara ahụ́ gị anya?—1 Timoti 4:8.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 74]

“M bido imega ahụ́, otú ahụ́ na-adị m na-eme m obi ụtọ. Ọ na-emekwa ka obi sikwuo m ike n’ihi na m na-adịkwu mma n’anya!”—Emily

[Igbe dị na peeji nke 73]

“Agbanwere m otú m si ebi ndụ”

“O nwere mgbe m bụ akpa akpụ, nke bụ́ ihe m na-achọghị. Otú m dị mgbe ahụ na otú ahụ́ si anyị m arọ mere ka obi na-ajọ mụ njọ! Mgbe ụfọdụ, m na-eri ụdị nri ga-enyere m aka ifelata, ma e mechaa, mụ ebuokwa ibu. N’ihi ya, mgbe m dị afọ iri na ise, ekpebiri m ilebara onwe m anya. Achọrọ m ifelata. Ma m chọrọ ime ya otú kwesịrị ekwesị, ya bụ, ịna-eme ihe m ga na-eme mgbe niile ka m ghara ibu ibu ọzọ. Azụtara m otu akwụkwọ kọwara ụdị nri mmadụ kwesịrị ịna-eri na otú mmadụ ga-esi na-emega ahụ́. Amalitekwara m ime ihe m gụtara n’akwụkwọ ahụ. Ekpebisiri m ike na agaghị m akwụsị ya, ọ bụrụgodị na e nwee ihe mere ka m kwụsịtụ ma ọ bụ ihe kụdara m mmụọ. Ị̀ ma ihe merenụ? Ihe ahụ m mere nyeere m ezigbo aka! N’ime otu afọ, esepụrụ m kilogram iri abụọ na asaa. Afọ abụọ agaala kemgbe ahụ, ebubeghị m ibu ọzọ. Amabughị m na ọ ga-ekwe m omume! Ihe m chere mere o ji kwe m omume abụghị na m bidoro iri naanị ụdị nri m kwesịrị ịna-eri kama ọ bụ n’ihi na agbanwere m otú m si ebi ndụ.”—Catherine, dị afọ iri na asatọ.

[Foto dị na peeji nke 74]

E nwere ike iji ahụ́ gị tụnyere ụgbọala. Ọ bụrụ na i lebaraghị ya anya nke ọma, ọ ga-akwụsị ịrụ ọrụ