Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Papa M na Mama M Ji Gbasaa?

Gịnị Mere Papa M na Mama M Ji Gbasaa?

 ISI NKE 4

Gịnị Mere Papa M na Mama M Ji Gbasaa?

“Mụ na mama m nọ n’ụlọ n’ụbọchị papa m hapụrụ anyị pụọ. Aghọtaghị m ihe na-emenụ n’ihi na adị m naanị afọ isii. Anọ m ọdụ n’ala nkịtị na-ele tiivi. Anụkwara m ka mama m na-ebe ákwá, na-arịọ papa m ka ọ ghara ịhapụ anyị. Papa m bu akpa ya si n’elu gbadata, gbuo ikpere n’ala ma susuo m ọnụ, sị m: ‘Ahụrụ m gị n’anya. Agaghị m echefu gị.’ Ka o kwuchara ihe ahụ, ọ pụwara. Ahụghị m ya anya ọzọ ruo ọtụtụ afọ. Kemgbe ahụ, ụjọ na-atụ m na mama m nwere ike ịhapụkwa m.”—Elaine, dị afọ iri na itoolu.

 NDỊ mụrụ gị gbaa alụkwaghịm, o nwere ike ịdị gị ka ụwa agwụla, ya eyie gị ka nsogbu ga-adịru ebighị ebi. O nwere ike ịna-eme gị ihere, na-ewe gị iwe, na-echu gị ụra, meekwa ka ụjọ na-atụ gị na ndị mụrụ gị ga-ahapụ gị. Obi nwere ike ịna-ama gị ikpe, ike ụwa agwụ gị, ya adị gị ka ị̀ gbazi aka. I nwedịrị ike ịchọ otú ị ga-esi mesie papa gị ma ọ bụ mama gị ike.

Ọ bụrụ na ọ dịbeghị anya ndị mụrụ gị gbara alụkwaghịm, o kwesịghị iju gị anya ma ọ bụrụ na obi na-adị gị otú ahụ, n’ihi na Onye kere anyị chọrọ ka nne na nna gbakọọ aka zụọ ụmụ ha. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ihe ọ pụtara bụ na gị na mama gị ma ọ bụ papa gị ị hụrụ n’anya nke ukwuu agaghịzi na-anọ kwa ụbọchị. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Daniel dị afọ asaa mgbe papa ya na mama ya gbara alụkwaghịm. O kwuru, sị: “Ahụrụ m papa m n’anya nke ukwuu, chọọkwa ka mụ na ya na-anọ mgbe niile. Ma, ọ bụ mama m ka ụlọikpe nyere ikike ịkpọrọ mụ na ụmụnne m.”

Ihe Mere Ndị Nne na Nna Ji Agbasa

Ebe ọ bụ na ndị nne na nna na-ezochiri ụmụ ha nsogbu ndị ha na-enwe, ọ na-ejukarị ụmụ ha anya ma ha gbasaa. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Rechel dị afọ iri na ise mgbe papa ya na mama ya gbara alụkwaghịm. O kwuru, sị: “Ọ gbara m gharịị n’ihi na echere m na ha hụrụ ibe ha n’anya.” Ọ bụrụgodị na nne na nna na-ese okwu mgbe ụfọdụ, ọ ka nwere ike ịgbawa ụmụ ha obi ma ọ bụrụ na ha agbasaa!

Ihe na-emekarị ka di na nwunye gbasaa bụ ma otu n’ime ha kwaa iko. Ọ bụrụ na otu n’ime ha akwaa iko, Chineke nyere onye nke aka ya dị ọcha ikike ịgba onye nke kwara iko alụkwaghịm. Onye nke aka ya dị ọcha nwekwara ike ịlụ di ma ọ bụ nwunye ọzọ. (Matiu 19:9) Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na “ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị” kpatara tigbuo zọgbuo, mee ka di ma ọ bụ nwunye tụwa ụjọ na e nwere ike imerụ ya na ụmụ ya ahụ́.—Ndị Efesọs 4:31.

N’eziokwu, ụfọdụ di na nwunye na-agbasa n’ihi ihe na-enwechaghị isi. Kama idozi ihe na-esere ha, ụfọdụ na-agba alụkwaghịm n’ihi na ha na-ekwu na ha “anaghịzi enwe obi ụtọ” ma ọ bụkwanụ na ha “ahụghịzi di ha ma ọ bụ nwunye ha n’anya.” Ụdị ihe  ahụ na-akpasu Chineke iwe, n’ihi na ọ ‘kpọrọ ụdị ịgba alụkwaghịm ahụ asị.’ (Malakaị 2:16) Ihe Jizọs kwuru gosiri na nsogbu nwere ike ịdị n’ezinụlọ ma di ma ọ bụ nwunye ghọọ Onye Kraịst.—Matiu 10:34-36.

N’agbanyeghị ihe mere papa gị na mama gị ji gbaa alụkwaghịm, ha ka hụrụ gị n’anya ọ bụrụgodị na ha gbachiri gị nkịtị ma ọ bụ zaa gị ihe na-edochaghị anya mgbe ị jụrụ ha ajụjụ banyere alụkwaghịm ahụ ha gbara. O nwere ike ịbụ na iwe juru ndị mụrụ gị obi, nke mere ka o siere ha ike ikwu ihe ọ bụla banyere alụkwaghịm ahụ ha gbara. (Ilu 24:10) O nwekwara ike isiri ha ike ma na-eme ha ihere ikweta na ha abụọ edozilighị ihe na-esere ha.

Ihe I Nwere Ike Ime

Ghọta ihe na-echegbu gị. Ebe ọ bụ na alụkwaghịm ndị mụrụ gị gbara nwere ike ime ka ọtụtụ ihe gbanwee ná ndụ gị, o nwere ike ime ka ị na-echegbu onwe gị banyere ihe ọ na-enweghị ihe ị kpọrọ ha n’oge gara aga. Ma, i nwere ike ime ka ihe ndị na-echegbu gị belata ma i buru ụzọ ghọta ihe ha bụ. N’okpuru ebe a, kanye ✔ n’ihe kacha echegbu gị ma ọ bụkwanụ gị edee ihe ọzọ na-echegbu gị n’ebe e dere “Ihe ọzọ.”

□ Papa m ma ọ bụ mama m ga-ahapụkwa m.

□ Ego ga-akọ ezinụlọ anyị.

□ M so kpata alụkwaghịm ahụ ha gbara.

□ M lụọ di ma ọ bụ nwunye, anyị ga-agbakwa alụkwaghịm.

□ Ihe ọzọ ․․․․․

Gwa ndị ọzọ ihe na-echegbu gị. Eze Sọlọmọn sịrị na e nwere “oge ikwu okwu.” (Ekliziastis 3:7) N’ihi ya, gbalịsie ike chọpụta oge ga-akacha mma ị ga-eji gwa ndị mụrụ gị ihe ndị ahụ na-echegbu gị, bụ́ ndị i depụtara n’elu. Gwa ha na obi adịghị gị mma ma ọ bụ na ị maghị ihe ị ga-eme. Ha nwere ike ịkọrọ gị ihe na-emenụ, nke nwere ike ime ka obi rutụ gị ala. Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị achọghị ime ka obi ruo gị ala ugbu a  ma ọ bụkwanụ na ha enweghị ike ime otú ahụ, i nwere ike ịkọrọ ya enyi gị ma nke a na-akọ. Gakwuru ụdị onye ahụ. Obi nwere ike iru gị ala ma ị hụ onye wepụtara oge gee gị ntị.—Ilu 17:17.

Nke kacha mkpa bụ na Nna gị nke eluigwe, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” ga-ege ntị n’ekpere gị. (Abụ Ọma 65:2) Kọọrọ ya otú ọ dị gị n’obi “n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:7.

Ihe Ị Na-ekwesịghị Ime

Eburula ndị mụrụ gị iwe n’obi. Daniel ahụ e dere ihe o kwuru ná mmalite sịrị, “Papa m na mama m chere naanị banyere onwe ha. Ha echeghịdị banyere anyị nakwa nsogbu ihe ha chọrọ ime ga-akpatara anyị.” Ihe ahụ Daniel kwuru ekwesịghị iju anyị anya. O nwekwara ike ịbụ eziokwu. Ma olee ihe ị ga-aza n’ajụjụ ndị a jụrụ n’okpuru ebe a? Dee azịza gị n’ahịrị dị n’okpuru ajụjụ nke ọ bụla.

Olee nsogbu Daniel nwere ike inwe ma ọ bụrụ na o kweghị akwụsị iwe ahụ ọ na-ewe? (Gụọ Ilu 29:22.) ․․․․․

N’agbanyeghị na ọ dịghị mfe, gịnị mere o ji dị mma ka Daniel gbalịsie ike gbaghara papa ya na mama ya ihe ọjọọ ha mere ya? (Gụọ Ndị Efesọs 4:31, 32.) ․․․․․

Olee otú eziokwu ahụ dị ná Ndị Rom 3:23 nwere ike isi nyere Daniel aka ile ndị mụrụ ya anya otú kwesịrị ekwesị? ․․․․․

Akpala àgwà ga-akpatara gị nsogbu. Otu nwa okorobịa  aha ya bụ Denny kwuru, sị: “Mgbe papa m na mama m gbara alụkwaghịm, iwe juru m obi. Ike ụwa gwụkwara m. Anaghịzi m eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Adakwara m otu afọ. Aghọziri m onye na-eme ihe ọchị na klas anyị. Mụ na ọtụtụ ndị lụrụ ọgụ.”

Gịnị ka i chere mere Denny ji ghọzie onye na-eme ihe ọchị na klas ha? ․․․․․

Gịnị ka i chere mere ya na ọtụtụ ndị ji na-alụ ọgụ? ․․․․․

Ọ bụrụ na obi gị agwa gị kpawa àgwà ọjọọ iji taa ndị mụrụ gị ahụhụ, olee otú ihe e kwuru ná Ndị Galeshia 6:7 ga-esi nyere gị aka ịkpa àgwà ọma? ․․․․․

 Ihe I Kwesịrị Ịtụ Anya Ya n’Ọdịnihu

Ị gbajie aka, ọtụtụ izu ma ọ bụ ọtụtụ ọnwa nwere ike ịgafe tupu ya alachaa. Otú ahụ ka ihe wutere mmadụ na-adị. Ọ na-ewe oge tupu onye ahụ enweta onwe ya. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na ọ́ dịkarịa ala, afọ atọ ga-agacha tupu mmadụ enweta onwe ya ma ndị mụrụ ya gbaa alụkwaghịm. O nwere ike ịdị gị ka ọ gaghị eru eru, ma cheta na ọ ga-ewe oge tupu i nwetachaa onwe gị.

Otu n’ime ihe mere ọ ga-eji wee oge bụ na, n’ihi alụkwaghịm ahụ ha gbara, e kwesịrị ịhazigharị ihe a na-eme n’ezinụlọ unu. Ọ ga-ewekwa oge tupu obi adịwakwa papa gị na mama gị mma. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha nwere ike inyere gị aka ka obi ruo gị ala. Ma, ka i ji nwayọọ nwayọọ malitekwa ịrụ ihe ndị ị na-arụbu, ị ga-amalite inweta onwe gị.

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 25 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ọ̀ na-ewute gị na papa gị lụgharịrị nwunye ma ọ bụ na mama gị lụgharịrị di? Olee otú ị ga-esi die ya?

AMAOKWU BAỊBỤL

Ihe ahụ na-ewute gị ga-akwụsị ka oge na-aga.—Ekliziastis 3:1, 3.

NDỤMỌDỤ

Ọ bụrụ na papa gị na mama gị gbara alụkwaghịm, ma eleghị anya, otu n’ime ha ma ọ bụkwanụ ha abụọ mejọrọ. Gbalịa chọpụta ihe ndị ahụ ha mejọrọ ka ị ghara ime ha ma ị lụọ di ma ọ bụ nwunye.—Ilu 27:12.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọ bụrụ na papa gị na mama gị anaghị enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha, ọ pụtaghị na ị gaghị enwe obi ụtọ ma ị lụọ di ma ọ bụ nwunye.

IHE M GA-EME!

Onye ma nke a na-akọ m nwere ike ịkọrọ ihe na-echegbu m bụ (dee aha onye ahụ) ․․․․․

Ọ bụrụ na obi m agwa m kpawa àgwà ọjọọ iji taa ndị mụrụ m ahụhụ, otú m nwere ike isi jide onwe m bụ: ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị nwere ike ime ka papa gị na mama gị ghara ịchọ ịgwa gị ihe ọ bụla banyere alụkwaghịm ha gbara?

● Gịnị mere o ji dị mkpa ka i cheta na alụkwaghịm papa gị na mama gị gbara bụ okwu ha abụọ, ọ bụghị okwu gị na ha?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 32]

“Mgbe mama m hapụrụ anyị, obi gbawara m, ebekwara m ákwá kwa ụbọchị. Ma ekpere m ekpere mgbe niile, na-enyere ndị ọzọ aka. Mụ na ndị enyi m ma nke a na-akọ na-akpachikwa anya. Ọ bụ otú ahụ ka m chere Jehova Chineke si nyere m aka idi nsogbu ahụ.”—Natalie

[Foto dị na peeji nke 33]

Ichefu alụkwaghịm papa gị na mama gị gbara yiri ịgbake mgbe aka gbajiri gị. Ọ naghị adị mfe, ma ọ ga-emecha kwụsị iwute gị