Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Hapụ M Ịna-ekpebi Ihe M Ga-eme?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Hapụ M Ịna-ekpebi Ihe M Ga-eme?

 ISI NKE 3

Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Hapụ M Ịna-ekpebi Ihe M Ga-eme?

“Ọ ga-adị m mma ma a sị na ndị mụrụ m na-ekwe m mgbe ụfọdụ ka m gaa ebe m chọrọ ịga.”—Sera, dị afọ iri na asatọ.

“M na-ajụkarị ndị mụrụ m ihe mere na ha anaghị atụkwasị m obi mgbe ọ bụla m chọrọ iso ndị enyi m kpapụ. Ha na-agwakarị m: ‘Anyị tụkwasịrị gị obi, ma anyị atụkwasịghị ndị enyi gị obi.’”—Christine, dị afọ iri na asatọ.

 DỊ KA Sera na Christine, ị̀ chọrọ ka ndị mụrụ gị hapụ gị ka ị na-ekpebi ihe ị ga-eme? Tupu ha ahapụ gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ị ga-eme, i kwesịrị ime ka ha tụkwasị gị obi. Ma e nwere ike iji ịtụkwasị mmadụ obi tụnyere ego. Ịkpata ego na-esi ike, ma imefu ya dị mfe. N’agbanyeghị ego ole e nyere gị, o nwere ike ịdị gị ka o zubeghị. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Iliana kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m chọrọ ịpụ apụ, ndị mụrụ m na-ajụ m ọtụtụ ajụjụ banyere ebe m na-aga, ndị mụ na ha so aga, ihe m na-aga ime, na mgbe m ga-alọta. Ama m na ọ bụ ha mụrụ m, ma mgbe ọ bụla ha jụrụ m ụdị ajụjụ ahụ, ọ na-ewe m iwe!”

Gịnị ka ị ga-eme ka ndị mụrụ gị tụkwasịkwuo gị obi ma kwe ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ị ga-eme? Tupu anyị azaa ajụjụ a, ka anyị buru ụzọ tụlee ihe mere ihe banyere ntụkwasị obi ji esere ọtụtụ ndị nne na nna na ụmụ ha bụ́ ndị na-eto eto ezigbo okwu.

Nsogbu Ndị Na-eto Eto Na-enwe

Baịbụl kwuru na ‘nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya.’ (Jenesis 2:24) N’eziokwu, nwaanyị ga-ahapụkwa nna ya na nne ya. Ma ị̀ bụ nwoke ma ị̀ bụ nwaanyị, otu ihe dị oké mkpa i kwesịrị ịmụta n’oge ị na-eto eto bụ otú ị ga-esi bie ndụ mgbe i toro, ya bụ, mgbe ị ga-enwe ike ịhapụ ndị mụrụ gị, ma eleghị anya, nweekwa ezinụlọ nke gị. *

Ka e were ya na e nwere ọnụ ụzọ a sịrị na mmadụ ga-agafe ma o ruhaala afọ dị otú a. Mmadụ ịghọ onye toro eto adịghị ka isi n’ọnụ ụzọ ahụ gafee mgbe o ruru afọ ole ahụ e kwuru. Mmadụ na-eji nwayọọ nwayọọ aghọ onye toro eto, dị ka ebe mmadụ na-arị steepụ ụlọ elu. Ọ ga na-arị ya otu otu. O nwere ike ịbụ na ebe ndị mụrụ gị chere na i ruola na steepụ ahụ abụghị ebe gịnwa chere na i ruola. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Maria chere na ndị mụrụ ya anaghị atụkwasị ya obi  n’ihe banyere ụdị ndị ọ na-emeta enyi. O kwuru, sị: “Adị m afọ iri abụọ, ma ụdị ihe a ka na-esere mụ na ndị mụrụ m okwu! Ha chere na mụ enweghị ike izere ọnwụnwa. Agbalịala m ịgwa ha na e nweela ọnwụnwa ndị m zeere, ma o meghị ka obi sie ha ike!”

Ihe Maria kwuru gosiri na ihe banyere ntụkwasị obi nwere ike ịna-esere ndị na-eto eto na ndị mụrụ ha ezigbo okwu. Ọ̀ bụ otú ọ dị n’ezinụlọ unu? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị ga-eme ka ndị mụrụ gị tụkwasịkwuo gị obi? Ọ bụrụ na ha anaghịzi atụkwasị gị obi n’ihi àgwà na-adịghị mma ị kpara n’oge gara aga, gịnị ka ị ga-eme ka ha malite ịtụkwasị gị obi ọzọ?

Gosi na E Kwesịrị Ịtụkwasị Gị Obi

Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwụkwọ ozi, sị: “Na-anwapụtanụ ihe unu onwe unu bụ.” (2 Ndị Kọrịnt 13:5) Ọ bụghị ndị na-eto eto ka ọ gwara okwu ahụ, ma ihe ahụ o kwuru ga-abara ha uru. I gosi na e kwesịrị ịtụkwasị gị obi, ọ ga-eme ka ndị mụrụ gị na-ahapụ gị ka ị na-ekpebi ihe ndị ị ga-eme. Ọ pụtaghị na i kwesịrị izu okè.  A sị ka e kwuwe, mmadụ niile na-emehie. (Ekliziastis 7:20) Ma, otú i si akpa àgwà ọ̀ na-eme ka ndị mụrụ gị ghara ịtụkwasị gị obi?

Dị ka ihe atụ, Pọl dere, sị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” (Ndị Hibru 13:18) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agwa ndị mụrụ m eziokwu mgbe m na-agwa ha ebe m gara na ihe m mere?’ Ụfọdụ ndị na-eto eto achọpụtala na ha kwesịrị ịgbanwe otú ha si akpa àgwà. Ka anyị tụlee ihe ha kwuru. Ị gụchaa ya, zaa ajụjụ ndị e dere n’okpuru ya.

Lori: “O nwere mgbe m na-ezigara otu nwa okorobịa m hụrụ n’anya ozi iimel na nzuzo. Ndị mụrụ m chọpụtara, gwa m ka m kwụsị ya. M kwere ha nkwa na m ga-akwụsị ya, ma akwụsịghị m. M nọ na-ezigara ya ozi ruo otu afọ. Ọ na-abụ, m zigara nwa okorobịa ahụ ozi iimel, ndị mụrụ m achọpụta, mụ arịọ ha, kwe ha nkwa na m ga-akwụsị ya. Ma e mechaa, mụ emee ya ọzọ. O nwere ebe o ruru, ha anaghịzi ekweta ihe ọ bụla m gwara ha!”

Gịnị ka i chere mere ndị mụrụ Lori ji kwụsị ịtụkwasị ya obi? ․․․․․

Ọ bụrụ na ị bụ papa Lori ma ọ bụ mama ya, gịnị ka ị gaara eme, maka gịnị? ․․․․․

Mgbe mbụ ahụ ndị mụrụ Lori gwara ya ka ọ kwụsị izigara onye ahụ ozi iimel, gịnị ka ọ gaara eme iji gosi na e kwesịrị ịtụkwasị ya obi? ․․․․․

Beverly: “O nwere mgbe ndị mụrụ m na-atụkwasịghị m obi  n’ihe gbasara ụmụ nwoke. Ma, aghọtala m ihe kpatara ya. N’oge ahụ, mụ na ụmụ nwoke abụọ ndị ji afọ abụọ tọọ m na-akpachi anya. Mụ na ha na-ekwu okwu n’ekwe ntị ruo ọtụtụ awa. Anyị gaa oriri na nkwari, ọ na-afọ obere ka ọ bụrụ naanị ha ka mụ na ha na-ekwurịta okwu. Ndị mụrụ m naara m ekwe ntị m ruo otu ọnwa. Ha ekweghịkwa m gaa ebe ọ bụla m ga-ahụ ụmụ okorobịa ahụ.”

Ọ bụrụ na ị bụ papa Beverly na mama ya, gịnị ka ị gaara eme, maka gịnị? ․․․․․

Ì chere na ihe ahụ papa Beverly na mama ya mere ya adịghị mma? Ọ bụrụ na i chere otú ahụ, ọ̀ bụ maka gịnị? ․․․․․

Gịnị ka Beverly gaara eme ka ndị mụrụ ya malitekwa ịtụkwasị ya obi? ․․․․․

Ihe Ị Ga-eme Ka Ndị Mụrụ Gị Malitekwa Ịtụkwasị Gị Obi

Dị ka Lori na Beverly, ì meela ihe mere ka ndị mụrụ gị ghara ịna-atụkwasị gị obi? Ọ bụrụ otú ahụ, ka obi sie gị ike na e nwere ihe ị ga-eme ka ndị mụrụ gị malitekwa ịtụkwasị gị obi. Olee ihe ọ bụ?

Ọ bụrụ na ị na-akpa àgwà ga-eme ka ndị mụrụ gị tụkwasị gị obi, o nwere ike ime ka ha tụkwasịkwuo gị obi ma hapụ gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ị ga-eme. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Annette ghọtara na ihe ahụ bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Mgbe mmadụ ka dị obere, onye ahụ agaghị aghọtacha na ọ bara uru ịbụ onye  a tụkwasịrị obi. Ugbu a, etoola m, m na-agbalịsikwa ike ime ihe ga-eme ka ndị mụrụ m na-atụkwasị m obi.” Gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’ihe a? Kama iwe iwe na ndị mụrụ gị anaghị atụkwasị gị obi, gbalịa ka ị na-eme ihe ga-eme ka ha na-atụkwasị gị obi. Ime otú ahụ nwere ike ime ka ha hapụ gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ị ga-eme.

Dị ka ihe atụ, è nwere ike ịtụkwasị gị obi n’ihe ndị a e dere n’okpuru ebe a? Kanye ✔ n’àgwà nke ọ bụla i kwesịrị ịgbalịsi ike na-eme nke ọma na ya.

□ Ịlọta mgbe a gwara m lọta

□ Imezu nkwa m

□ Ịga ihe n’oge

□ Iji ego m eme ihe bara uru

□ Ịrụcha ọrụ e nyere m n’ụlọ

□ Iteta n’ụra n’echeghị ka mmadụ kpọtee m

□ Idebe ime ụlọ m ọcha

□ Ikwu eziokwu

□ Iji ekwe ntị ma ọ bụ kọmputa eme ihe bara uru

□ Ikweta ihe m mejọrọ na ịrịọ mgbaghara

□ Ihe ọzọ ․․․․․

Ọ́ gaghị adị mma ma i kpebisie ike na ị ga na-egosi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi? Mee ihe ndị a Baịbụl kwuru: ‘Yipụnụ  mmadụ ochie ahụ, nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga.’ (Ndị Efesọs 4:22) “Ka Ee unu bụrụ Ee.” (Jems 5:12) “Ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.” (Ndị Efesọs 4:25) “Na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile.” (Ndị Kọlọsi 3:20) Ka oge na-aga, ọganihu gị ga-apụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ. Ndị mụrụ gị ga-ahụkwa ya.—1 Timoti 4:15.

Ma, ọ́ bụrụkwanụ na i chere na ndị mụrụ gị anaghị ahapụ gị mgbe ụfọdụ ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ị ga-eme n’agbanyeghị mgbalị gị niile? Ọ́ gaghị aka mma ka gị na ha kwurịta ya? Kama iji iwe na-agwa ha na ha kwesịrị ịna-atụkwasịkwu gị obi, jiri obiọma jụọ ha ihe ha chere kwesịrị ime ka ha wee na-atụkwasịkwu gị obi. Kọwaara ha nke ọma ihe ị chọrọ ime banyere ya.

Echela na ndị mụrụ gị ga-agbanwe obi ha ozugbo. O doro anya na ha ga-achọ ka obi sie ha ike na ị ga-eme ihe i kwuru. Gosi ha ugbu a na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ka oge na-aga, ndị mụrụ gị nwere ike ịtụkwasịkwu gị obi, na-ahapụkwu gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ị ga-eme. Beverly ahụ e dere ihe o kwuru ná mmalite mere otú ahụ. O kwuru, sị: “Ime ka ndị ọzọ tụkwasị gị obi anaghị adị mfe, ma ọ naghị esi ike ime ihe ga-eme ka ha kwụsị ịtụkwasị gị obi.” O kwukwara, sị, “Emeela m ka ndị mụrụ m na-atụkwasị m obi. Obi dịkwa m ụtọ n’ihi ya!”

GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 22 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Papa gị na mama gị hà agbaala alụkwaghịm? Ọ bụrụ na alụkwaghịm ha gbara mere ka ike ụwa gwụ gị, olee otú ị ga-esi die ya?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 7 n’akwụkwọ a.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Ka nnwere onwe unu ghara ịbụ ihe unu ga-eji na-ekpuchi ihe ọjọọ.”—1 Pita 2:16.

NDỤMỌDỤ

Kama iwe iwe na a naghị ekwe gị mee ihe ụfọdụ nwanne gị tọrọ gị na-eme, ka obi dị gị ụtọ na a na-ekwe gị mee ihe ụfọdụ a na-anabughị ekwe gị mee mgbe ị dị obere.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị na-ahapụ gị ka ị na-eme ihe ọ bụla sọrọ gị, ọ naghị egosi na ha hụrụ gị n’anya, kama ọ na-egosi na ha na-eleghara gị anya.

IHE M GA-EME!

Ihe ndị m chọrọ ka papa m na mama m na-atụkwasịkwu m obi na ha bụ: ․․․․․

Ọ bụrụ na papa m na mama m akwụsị ịtụkwasị m obi, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị nwere ike ime ka o siere papa gị na mama gị ike ikwe ka i jiri aka gị na-ekpebi ọtụtụ ihe ị na-eme n’agbanyeghị na ị na-agbalịsi ike igosi na e kwesịrị ịtụkwasị gị obi?

● Ọ bụrụ na ị mata otú gị na papa gị na mama gị ga-esi na-ekwurịta okwu nke ọma, olee otú ọ ga-esi mee ka ha na-ekwe ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ụfọdụ ị ga-eme?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 24]

“Mgbe m na-agwa ndị mụrụ m okwu, anaghị m ezoro ha nsogbu m na ihe na-echegbu m. Achọpụtara m na o meela ka ọ dịrị ndị mụrụ m mfe ịtụkwasị m obi.”—Dianna

[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 23]

Ịghọ onye toro eto a tụkwasịrị obi dị ka ebe mmadụ ji nwayọọ nwayọọ na-arị steepụ ụlọ elu, na-arị ya otu otu

[Ihe Osise]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NWATAKỊRỊ

ONYE NA-ETO ETO

ONYE TORO ETO